Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Septemba 2014

Ndị Nne na Nna, Na-azụnụ Ụmụ Unu

Ndị Nne na Nna, Na-azụnụ Ụmụ Unu

“I kwesịrị ịmara ọdịdị ìgwè ewu na atụrụ gị nke ọma.”—ILU 27:23.

1, 2. (a) Olee ọrụ ụfọdụ onye ọzụzụ atụrụ na-arụ n’oge ụmụ Izrel? (b) Olee otú ndị nne na nna ga-esi gosi na ha na-eme ka ndị ọzụzụ atụrụ?

N’IZREL oge ochie, ọrụ ndị ọzụzụ atụrụ anaghị adị mfe. Ha na-anọ n’èzí ma anwụ ọ̀ na-acha ma oyi ọ̀ na-atụ. Ha na-echebe atụrụ ha ka anụ ọhịa ghara ịdọgbu ya nakwa ka ndị ohi ghara izuru ya. Ha na-eleru ya anya mgbe niile. E nwee nke na-arịa ọrịa ma ọ bụ nke merụrụ ahụ́, ha na-elebara ya anya ka ọ gbakee. Ha na-akacha elebara ụmụ atụrụ anya n’ihi na ha esighị ike ka ndị nke torola eto.—Jen. 33:13.

2 E nwere ike iji ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst tụnyere ndị ọzụzụ atụrụ. Ha kwesịrị ịna-akpa àgwà ka ha. Baịbụl gwara ha ka ha na-azụ ụmụ ha “n’ọzụzụ na nduzi echiche nke si n’aka Jehova.” (Efe. 6:4) Ọrụ a ha na-arụ ọ̀ dị mfe? Mba. Setan na-achọkarị iji ozizi ụgha ọ na-akụzi nweta ụmụaka. Ihe ọzọ bụ na ụmụaka bụ ndị na-ezughị okè. (2 Tim. 2:22; 1 Jọn 2:16) Ọ bụrụ na i nwere ụmụ, olee otú ị ga-esi nyere ha aka? Ka anyị leba anya n’ihe atọ ị ga-eme ka i nwee ike ịzụ ụmụ gị. Ha bụ: Mara ha nke ọma, na-akụziri ha ihe, na-eduzi ha.

 MARA ỤMỤ GỊ NKE ỌMA

3. Olee otú ndị nne na nna ga-esi mara ụmụ ha nke ọma?

3 Ezigbo onye ọzụzụ atụrụ na-eleru atụrụ ya nke ọ bụla anya n’ihi na ọ chọrọ ka ahụ́ gbasie ya ike. I nwere ike imere ụmụ gị ụdị ihe ahụ. Baịbụl kwuru, sị: “I kwesịrị ịmara ọdịdị ìgwè ewu na atụrụ gị nke ọma.” (Ilu 27:23) Otú ị ga-esi eme ya bụ na ị ga-amara àgwà ụmụ gị, ihe ha na-eche, na otú obi dị ha. Ma, olee otú ị ga-esi amara ihe ndị a? Otu ụzọ kacha mma ị ga-esi eme ya bụ gị na ha ịna-ekwurịta okwu mgbe niile.

4, 5. (a) Olee ihe ụfọdụ nwere ike ime ka ọ dịrị ụmụaka mfe ịkọrọ papa ha na mama ha ihe ha chere na otú obi dị ha? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Olee otú gịnwa sirila mee ka ọ dịrị ụmụ gị mfe ịkọrọ gị obi ha?

4 Ụfọdụ ndị nne na nna achọpụtala na ọ bụ mgbe ụmụ ha na-eto eto ka ọ na-akacha esi ike ha na ha ikwurịta okwu. Ụmụ ha nwere ike ha agaghị ekwu ihe ha na-eche na otú obi dị ha. Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ụmụ gị na-eme otú ahụ? Kama ịchọwa ka gị na ha kwugide okwu ruo ogologo oge ma ọ bụkwanụ gwakasịwa ha okwu ahụ́, gbalịa jiri ohere ọ bụla na-agwa ha okwu mgbe ahụ́ ruru ha ala. (Diut. 6:6, 7) Wepụta oge ka gị na ha na-emekọ ihe ụfọdụ ọnụ. Gị na ha nwere ike iso gaa legharịa anya, gwuo egwuregwu, ma ọ bụkwanụ rụọ ọrụ ụfọdụ dị n’ụlọ. Ọ bụrụ na i mee ka ahụ́ ruo ha ala, ọ ga-adịrị ha mfe ịkọrọ gị ihe ha na-eche na otú obi dị ha.

5 Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụ na o yiri ka nwa gị achọghị ịkọrọ gị obi ya? E nwere ihe i nwere ike ime. Dị ka ihe atụ, kama ịjụwa nwa gị ihe ndị mere n’ụbọchị, i nwere ike ịkọrọ ya ihe ndị gịnwa mere n’ụbọchị. O nwere ike ime ka ọ dịrị ya mfe ịkọrọ gị ihe ndị o mere. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịma ihe o chere gbasara otu ihe, jụọ ya ajụjụ gbasara ihe ahụ, ọ bụghị ịjụwa ya gbasara onwe ya. I nwere ike ịjụ ya ihe ndị enyi ya chere gbasara ihe ahụ. I nweziri ike ịjụ ya ndụmọdụ o nwere ike inye ha.

6. Olee otú ị ga-esi mee ka ọ dịrị ụmụ gị mfe ịna-agwa gị okwu, meekwa ka ha ghọta na ị na-ewepụtara ha oge?

6 Ọ bụrụ na ị chọrọ ka ụmụ gị na-akọrọ gị obi ha, i kwesịrị ịna-ewepụtara ha oge, meekwa ka ọ dịrị ha mfe ịna-agwa gị okwu. Ọ bụrụ na i mee ka ha chee na ị naghị enwe efe ka gị na ha nọrịa, ha agaghị akọrọ gị nsogbu ndị ha na-enwe. Olee otú ị ga-esi mee ka ọ dịrị ha mfe ịna-agwa gị okwu? Ihe ị ga-eme abụghị naanị ịgwa ha, sị, “Unu nwere ike ịgwa m okwu mgbe ọ bụla unu chọrọ.” I kwesịrị ime ka ha ghọta na ị gaghị ewe iwe ma ha gwa gị okwu nakwa na ị gaghị eleghara nsogbu ha anya. Ọ bụ otú a ka ọtụtụ ndị nne na nna na-eme. Dị ka ihe atụ, otu nwa agbọghọ dị afọ iri na itoolu aha ya bụ Kayla kwuru, sị: “O nweghị ihe m na-anaghị akọrọ papa m. Ọ naghị anabiri m okwu n’ọnụ ma ọ bụ kpewe m ikpe. Ọ na-ege m ntị, nyezie m ndụmọdụ ga-abara m ezigbo uru.”

7. (a) Olee otú nne ma ọ bụ nna kwesịrị isi gwa nwa ya ihe gbasara otú nwoke na nwaanyị ga-esi na-akpa? (b) Olee otú nne na nna nwere ike isi kpasuo ụmụ ha iwe?

7 Mgbe ụfọdụ, gị na ụmụ gị nwere ike ikwurịta gbasara ihe na-adịchaghị mfe. O nwere ike ịbụ otú nwoke na nwaanyị kwesịrị isi na-akpa. Mgbe unu na-ekwurịta ya, gbalịa kụziere ha ihe ha kwesịrị ime. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na ị gara iri nri n’ebe a na-ere nri. Mgbe i lere anya n’ebe a na-ede nri ndị e nwere, naanị ihe ha dere bụ na nri ọ bụla i riri ebe ahụ nwere ike ịkpatara gị ọrịa. I nwere ike isi ebe ahụ pụọ gaa chọrọ ebe ọzọ ị ga-eri nri. Ụmụ gị nwere ike ime ụdị ihe ahụ ma ọ bụrụ na ọ na-abụ, ha bịa ka ị dụọ ha ọdụ, naanị ihe ị na-eme abụrụ ịbara ha mba. (Gụọ Ndị Kọlọsi 3:21.) Kama ime otú ahụ, gbalịa mata otú i kwesịrị isi nyere ha aka. Otu nwanna nwaanyị dị afọ iri abụọ na ise aha ya bụ Emily kwuru, sị: “Mgbe ọ bụla papa m na  mama m na-agwa m gbasara nwoke mụ na ya ga na-akpa, ha anaghị eme ka m chewe na ọ bụ ihe ọjọọ. Ha na-eme ka o doo m anya na ọ ga-eme m obi ụtọ ma m matakwuo onye ahụ ma chọpụta na ọ bụ ya ka m ga-alụ. O meela ka ahụ́ ruo m ala mgbe m na-akọrọ ha gbasara ya. E nwee nwoke ọ bụla mụ na ya na-akpa, m ga-agwa ha gbasara ya. Agaghị m ezochiri ha ya.”

8, 9. (a) Ọ bụrụ na nne ma ọ bụ nna ewetuo obi na-ege nwa ya ntị, olee uru ọ ga-aba? (b) Olee otú i sirila nwee ike ige ụmụ gị ntị?

8 Ihe ahụ Kayla kwuru gosiri na otú ị ga-esi mee ka ọ dịrị ụmụ gị mfe ịgwa gị okwu bụ iwetu obi gee ha ntị. (Gụọ Jems 1:19.) E nwere otu nwaanyị aha ya bụ Katia. Ọ bụ naanị ya na-azụ otu nwa nwaanyị ọ mụtara. O kwuru, sị, “N’oge gara aga, anaghị m enwere nwa m nwaanyị ndidi. E nwee ihe ọ chọrọ ikwu, anaghị m ekwe ka o kwuchaa. Anaghị m ege ya ntị, ma ọ́ bụghị n’ihi ike ọgwụgwụ, ya abụrụ n’ihi na achọghị m ihe ga-enye m nsogbu. Ma ugbu a, agbanweela m àgwà m, nwa m nwaanyị agbanweekwa nke ya. Ọ na-akọziri m otú obi dị ya.”

Na-ege ha ntị ka i nwee ike ịmara ha nke ọma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 3 ruo nke 9)

9 Otu nna aha ya bụ Ronald kọkwara ụdị ihe ahụ gbasara nwa ya nwaanyị dị afọ iri na isii. O kwuru, sị: “Ụbọchị ọ gwara m na e nwere otu nwa okorobịa ya na ya na-akpa n’ụlọ akwụkwọ, ezigbo iwe were m. Ma, mgbe m chechara otú Jehova si na-enwere ndị ya ndidi ma na-aghọta ihe ha na ya na-alụ, m ghọtara na ọ ga-aka mma ka m hapụ nwa m ka o kwuo otú obi dị ya tupu mụ enyewe ya ndụmọdụ. Obi dị m ụtọ na m mere otú ahụ. Ọ bụ ya bụ mgbe mbụ m ghọtara otú obi dị nwa m nwaanyị. Mgbe o kwuchara, ọ dịziiri m mfe iji obiọma gwa ya okwu. O juru m anya na ọ nabatara ndụmọdụ m nyere ya ma jiri obi ya niile kwuo na ya ga-agbanwe àgwà ya.” Ọ bụrụ na gị na ụmụ gị na-ekwurịta okwu mgbe niile, ọ ga-enyere gị aka ịmata ihe ha chere na otú obi dị ha. Ọ ga-emezi ka i nwee ike ịna-enyere ha aka mgbe ha na-ekpebi ihe ha ga-eme. *

NA-AKỤZIRI ỤMỤ GỊ IHE

10, 11. Olee otú ị ga-esi nyere ụmụ gị aka ka ha ghara ịkpafu?

10 Ezigbo onye ọzụzụ atụrụ ma na atụrụ ya nwere ike ịkpafu. O nwere ike isi n’ebe atụrụ ndị ọzọ nọ tara ahịhịa na-aga nwayọọ nwayọọ. Ka a na-eme ka a na-eme, ya agaruo ebe dị anya, si otú ahụ kpafuo.  Ụdị ihe ahụ nwere ike ime nwatakịrị. O nwere ike iji nwayọọ nwayọọ na-ala azụ n’ọgbakọ. Ma eleghị anya, ihe Ekwensu ji na-arata ya bụ ndị enyi ọjọọ ma ọ bụ ntụrụndụ na-adịghị mma. (Ilu 13:20) Gịnị ka ị ga-eme ka ụdị ihe a ghara ime nwa gị?

11 Mgbe ị na-akụziri ụmụ gị ihe, egbula oge ọ bụla inyere ha aka ma ọ bụrụ na ị chọpụta àgwà na-adịghị mma ha na-akpa. Nyekwara ha aka ka ha nwee ike ịna-akpakwu àgwà ọma ndị ha nwere. (2 Pita 1:5-8) Oge magburu onwe ya ị ga-eji eme ya bụ mgbe unu na-enwe ofufe ezinụlọ. Ozi Alaeze Anyị nke ọnwa Ọktoba afọ 2008 kwuru gbasara ofufe ezinụlọ, sị: “A na-agba ndị isi ezinụlọ ume ka ha hụ na ha na-arụ ọrụ Jehova nyere ha nke bụ́ inwe ọmụmụ Baịbụl ezinụlọ chiri anya nke ga na-abara ndị ezinụlọ ha uru.” Ị̀ na-eji oge unu na-enwe ofufe ezinụlọ azụ ụmụ gị? Ka obi sie gị ike na ụmụ gị agaghị echefu mbọ niile ị na-agba ka i nyere ha aka.—Mat. 5:3; Fil. 1:10.

Na-akụziri ha ihe nke ọma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10 ruo nke 12)

12. (a) Olee otú inwe ofufe ezinụlọ mgbe niile sirila baara ndị na-eto eto uru? (Kwuokwa ihe dị n’igbe bụ́ “ Obi Dị Ha Ụtọ Maka Ya.”) (b) Olee otú ofufe ezinụlọ sirila baara gịnwa uru?

12 Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na itoolu aha ya bụ Carissa kwuru otú Ofufe Ezinụlọ sirila baara ezinụlọ ha uru. Ọ sịrị: “Obi dị m ụtọ na anyị niile na-anọkọ kwurịta okwu. Ka anyị na-eme ya, anyị na-adịkwu ná mma, na-amụkwa ihe ndị ọ ga-abụ anyị cheta, obi adị anyị ụtọ. Papa m na-agba mbọ ka anyị nwee Ofufe Ezinụlọ anyị mgbe niile. Otú o si jiri ya kpọrọ ihe na-agba m ume, na-emekwa ka mụnwa jirikwa ya kpọrọ ihe. Ihe a ọ na-eme mekwara ka m ghọta na m kwesịrị ịna-akwanyere ya ùgwù n’ihi na ọ bụ ya bụ papa m na onyeisi ezinụlọ nke na-akụziri m Okwu Chineke.” Otu nwanna nwaanyị dị afọ iri abụọ na atọ aha ya bụ Brittney kwuru, sị: “Ofufe ezinụlọ emeela ka mụ na papa m na mama m dịkwuo ná mma. Ọ na-eme ka m ghọta na ha chọrọ ịma nsogbu ndị m na-enwe nakwa na ihe gbasara m na-emetụ ha n’obi. O meela ka okwukwe anyị sikwuo ike, ezinụlọ anyị adịkwa n’otu.” O doro anya na ụzọ dị mkpa i nwere ike isi bụrụ ezigbo onye ọzụzụ atụrụ bụ ịna-akụziri ụmụ gị Okwu Chineke. Otu ụzọ kacha mma ị ga-esi eme ya bụ ịna-enwe ofufe ezinụlọ. *

NA-EDUZI ỤMỤ GỊ

13. Olee otú i nwere ike isi mee ka nwa gị kpebie ijere Jehova ozi?

13 Ezigbo onye ọzụzụ atụrụ na-eji mkpara eduzi atụrụ ya ma na-echebe ha. Ọ na-agbalịsi ike ka o duru ha gaa “n’ebe ịta nri dị mma.” (Ezik. 34:13, 14) Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, ọ̀ bụ na i kwesịghị imere ụmụ gị ụdị ihe a? I kwesịrị iduzi ha ka ha nwee ike ịna-ejere Jehova ozi. Ị chọrọ ka obi dị ha otú ahụ ọ dị otu ọbụ abụ bụ́ onye dere, sị: “Chineke m, ime uche gị na-atọ m ụtọ, iwu gị dịkwa n’ime obi m.” (Ọma 40:8) Ọ bụrụ na obi adị ha otú a, ha ga-achọ inyefe Jehova onwe ha, e meekwa ha baptizim. Ha kwesịrị ime otú ahụ mgbe ha toruru iji aka ha kpebie ijere Jehova ozi, chọsiekwa ike ime otú ahụ.

14, 15. (a) Gịnị ka ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị ime? (b) Gịnị nwere ike ime ka ihe nzukọ Jehova na-akụzi na-eme onye na-eto eto obi abụọ?

14 Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na o yiri ka nwa gị anaghị eme nke ọma n’ọgbakọ ma ọ bụdị na-enwe obi abụọ ma ihe nzukọ Jehova na-akụzi ọ̀ bụ eziokwu? Gbalịa kụziere ya ka o jiri obi ya niile hụ Jehova Chineke n’anya. Meekwa ka ọ ghọta na obi kwesịrị ịdị ya ụtọ maka ihe niile Jehova meere ya. (Mkpu. 4:11) Mgbe o jikeere, ọ ga-ejizi aka ya kpebie ijere Chineke ozi.

15 Ọ bụrụ na ị chọpụta na nwa gị na-enwe obi abụọ ma ihe nzukọ Jehova na-akụzi ọ̀ bụ eziokwu, olee otú i nwere ike isi  mee ka ọ ghọta na ijere Jehova ozi bụ ihe kacha mma mmadụ kwesịrị ime nakwa na ọ ga-eme ka o nwee ezigbo obi ụtọ? Gbalịa mata ihe mere o ji na-enwe obi abụọ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ọ bụ nwoke, ihe bụ́ nsogbu ya ọ̀ bụ na o kwetaghị na ihe Baịbụl na-akụzi bụ eziokwu, ka ọ̀ bụ na ụjọ na-atụ ya izi ụmụaka ibe ya ozi ọma? Ọ bụrụ na ọ bụ nwaanyị, nsogbu ya ọ̀ bụ na ọ na-eme ya obi abụọ ma iwu Jehova ọ̀ bara uru, ka ọ̀ bụ na ọ dị ya ka ndị ọzọ hà jụrụ ya ma na-agbara ya ọsọ?

Na-eduzi ha ka ha mara ihe ha kwesịrị ime (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13 ruo nke 18)

16, 17. Olee otú ndị nne na nna nwere ike isi nyere ụmụ ha aka ka ha na Jehova dịrị ná mma?

16 Ihe ọ sọkwara ya bụrụ ya kpatara, i nwere ike inyere nwa gị aka ka ihe nzukọ Jehova na-akụzi ghara ịna-eme ya obi abụọ. Olee otú ị ga-esi eme ya? Otu ụzọ ọtụtụ ndị nne na nna sirila nyere nwa ha aka bụ ịjụ ya, sị: “Olee otú obi dị gị maka na ị bụ Onye Kraịst? Olee uru ịbụ Onye Kraịst baara gị? Olee nsogbu ndị ọ na-akpatara gị? Ì chere na uru ya karịrị nsogbu ya, nke ka nke, ma i cheta uru ndị anyị na-erite ugbu a na ndị anyị ga-erite n’ọdịnihu? Gịnị mere i ji chee otú ahụ?” Gbalịa jụọ ya ajụjụ ndị a n’okwu nke aka gị. Jiri obiọma jụọ ha otú ga-eme ka ọ ghọta na ị chọrọ ka ihe dịrị ya ná mma, ọ bụghị ime ka o chewe na ị na-ajụkasị ya ajụjụ ahụ́. Unu nwere ike ịtụle ihe e kwuru na Mak 10:29, 30. Ụfọdụ ụmụaka nwere ike ide ihe ha chere n’akwụkwọ. Ha dee uru ịbụ Onye Kraịst na-aba n’aka ekpe, ha edee nsogbu ọ na-akpata n’aka nri. Ihe ha dere nwere ike inyere gị na ha aka ịma nsogbu ndị ha na-enwe na otú ha ga-esi merie ha. Ebe ọ bụ na anyị na-amụrụ ndị nwere mmasị akwụkwọ Bible Na-akụzi na akwụkwọ Ịhụnanya Chineke,” anyị kwesịrị imere ụmụ anyị otú ahụ. Ị̀ na-eme ya?

17 Ka oge na-aga, ọ bụ ụmụ gị ga-eji aka ha kpebie onye ha ga-efe. Echela na ha ga-ekpebi ife Jehova maka na ị na-efe ya. Ọ bụ ha ga-eji aka ha mee ka ha na Jehova dịrị ná mma. (Ilu 3:1, 2) Gịnịkwanụ ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na o siere nwa gị ike ime otú ahụ? Gbaa ya ume ka o chebara ajụjụ ndị a echiche: “Olee otú si mara na Chineke dị? Olee otú si mara na ihe banyere m na-emetụ Chineke n’obi? Gịnị mere ji kweta na iwu Jehova ga-abara m uru”? Ndị nne na nna, gosinụ na unu bụ ezigbo ndị ọzụzụ atụrụ. Otú unu ga-esi eme ya bụ iji ndidi na-eduzi ụmụ unu. Meenụ ka ha chọpụta na ife Jehova bụ ihe kacha mma mmadụ kwesịrị ime. *Rom 12:2.

18. Olee otú ndị nne na nna nwere ike isi na-eme ka Jehova, bụ́ Nnukwu Onye Ọzụzụ Atụrụ?

18 Ezigbo Ndị Kraịst niile kwesịrị ịgba mbọ na-eme ka Jehova, bụ́ Nnukwu Onye Ọzụzụ Atụrụ. (Efe. 5:1; 1 Pita 2:25) Ndị nne na nna kwesịrị ịma ụmụ ha nke ọma ma gbalịsie ike na-eduzi ha ka ha nwee ike inweta ihe ọma Jehova kwere ná nkwa. N’ihi ya, ndị nne na nna, gbalịanụ na-azụ ụmụ unu ma na-akụziri ha ka ha hụ Jehova n’anya.

^ para. 9 Ị chọọ ịma ihe ndị ọzọ i nwere ike ime, gụọ Ụlọ Nche August 1, 2008, peeji nke 10-12.

^ para. 12 Ị chọọ ịma uru ndị ọzọ inwe ofufe ezinụlọ bara, gụọ isiokwu bụ́ “Ofufe Ezinụlọ Dị Mkpa Maka Nzọpụta!” Ọ gbara n’Ụlọ Nche October 15, 2009, peeji nke 29-31.

^ para. 17 A kọwakwuru ya n’Ụlọ Nche Febụwarị 1, 2012, peeji nke 18-21.