Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) SEPTEMBA 2014

Jiri Obi Gị Niile Na-ejere Chineke Ozi n’Agbanyeghị “Ọtụtụ Mkpagbu”

Jiri Obi Gị Niile Na-ejere Chineke Ozi n’Agbanyeghị “Ọtụtụ Mkpagbu”

“Anyị aghaghị ịbanye n’alaeze Chineke site n’ọtụtụ mkpagbu.”—ỌRỤ 14:22.

1. Gịnị mere ọ naghị eju ndị ohu Chineke anya na nsogbu na-abịara ha?

BAỊBỤL kwuru na anyị ga-enwe “ọtụtụ mkpagbu” tupu anyị enweta ndụ ebighị ebi. Ihe a o kwuru ò juru gị anya? E nwere ike o jughị gị. Ma ị̀ ka batara ọhụrụ n’ọgbakọ ma ị̀ nọọla ọtụtụ afọ n’ọgbakọ, ị ma na nsogbu so n’ihe anyị na-ahụ n’ụwa Setan.—Mkpu. 12:12.

2. (a) E wezụga nsogbu ndị na-abịara mmadụ niile na-ezughị okè, olee ụdị nsogbu ọzọ na-abịara Ndị Kraịst? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Ònye mere ka a na-akpagbu anyị? Olee otú anyị si mara?

2 E wezụga nsogbu ndị na-abịara ụmụ mmadụ na-ezughị okè, e nwere ụdị nsogbu ọzọ na-abịara Ndị Kraịst. (1 Kọr. 10:13) Olee ụdị nsogbu ọ bụ? Ọ bụ mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ a na-akpagbu ha maka na ha kpebisiri ike na ha ga-erubere Chineke isi. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ohu adịghị aka nna ya ukwu. Ọ bụrụ na ha akpagbuwo m, ha ga-akpagbukwa unu.” (Jọn 15:20) Ònye mere ka a na-akpagbu ha? Ọ bụ Setan. Baịbụl kwuru na ọ bụ “ọdụm na-ebigbọ ebigbọ,” nke ‘na-achọ iripịa’ ndị ohu Chineke. (1 Pita 5:8) Setan ga-eme ihe ọ bụla o nwere ike ime ka ndị na-eso ụzọ Jizọs kwụsị irubere Chineke isi. Ka anyị tụlee ihe mere Pọl onyeozi.

 IHE E MERE PỌL NA LISTRA

3-5. (a) Olee otú e si kpagbuo Pọl na Listra? (b) Olee otú ihe o kwuru gbasara mkpagbu si agba anyị ume?

3 Ọtụtụ mgbe, a kpagburu Pọl n’ihi okwukwe ya. (2 Kọr. 11:23-27) Dị ka ihe atụ, na Listra, mgbe ọ gwọchara otu nwoke dara ngwọrọ site n’afọ nne ya, ndị ebe ahụ chere na ya na Banabas bụ chi, chọwa ife ha. Ma, Pọl na Banabas rịọrọ ha ka ha ghara ime otú ahụ. N’oge na-adịghị anya, ndị ndú okpukpe ndị Juu bịara katọwa Pọl na Banabas ma mebie obi ndị ebe ahụ. Egwú dagharịrị. Ndị ebe ahụ malitere ịtụ Pọl nkume. Ọ bụ naanị mgbe ha chere na ọ nwụọla ka ha hapụrụ ya.—Ọrụ 14:8-19.

4 Mgbe Pọl na Banabas gachara Dabe, ha “laghachiri na Listra, na Aịkoniọm, na Antiọk, na-ewusi mkpụrụ obi nke ndị na-eso ụzọ Jizọs ike, na-agba ha ume ka ha nọgide n’okwukwe Ndị Kraịst, sị: ‘Anyị aghaghị ịbanye n’alaeze Chineke site n’ọtụtụ mkpagbu.’” (Ọrụ 14:21, 22) O nwere ike iyi ka e kwesịghị ịgwa mmadụ ụdị ihe ahụ. A sị ka e kwuwe, ịgwa mmadụ na ọ ga-enwe “ọtụtụ mkpagbu” nwere ike imebi ya obi kama ịgba ya ume. Ma, olee otú o si bụrụ na Pọl na Banabas ‘gbara ndị na-eso ụzọ Jizọs ume’ mgbe ha gwara ha na nsogbu ga-abịakwuru ha?

5 Anyị ga-amata azịza ajụjụ a ma anyị leba anya n’ihe Pọl kwuru. Pọl asịghị: “Anyị ga-edirịrị ọtụtụ nsogbu.” Ihe o kwuru bụ: “Anyị aghaghị ịbanye n’alaeze Chineke site n’ọtụtụ mkpagbu.” N’ihi ya, otú Pọl si gbaa ndị na-eso ụzọ Jizọs ume bụ na ọ gwara ha ụgwọ Chineke ga-akwụ ha ma ọ bụrụ na ha erubere ya isi. Ọ bụ ihe ga-eme eme. Jizọs kwuru, sị: “Onye tachiri obi ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.”Mat. 10:22.

6. Olee ụgwọ Chineke ga-akwụ anyị ma ọ bụrụ na anyị edie mkpagbu bịaara anyị?

6 Chineke ga-akwụ anyị ụgwọ ma ọ bụrụ na anyị edie mkpagbu ndị na-abịara anyị. Ụgwọ ọ ga-akwụ Ndị Kraịst e tere mmanụ bụ na ọ ga-eme ka ha bụrụ ndị na-anaghị anwụ anwụ n’eluigwe, bụ́ ebe ha ga-eso Jizọs chịa. Ụgwọ ọ ga-akwụ “atụrụ ọzọ” bụ na ọ ga-eme ka ha dịrị ndụ ebighị ebi n’ụwa bụ́ ebe ‘ezi omume ga-ebi.’ (Jọn 10:16; 2 Pita 3:13) Ma, ihe Pọl kwuru gosiri na ọtụtụ mkpagbu ka ga-abịara anyị. Ka anyị leba anya n’ụdị mkpagbu abụọ nwere ike ịbịara anyị.

MKPAGBU A NA-AHỤ ANYA

7. Olee ụdị mkpagbu e nwere ike ikwu na ọ bụ mkpagbu a na-ahụ anya?

7 Jizọs buru amụma, sị: “Ndị mmadụ ga-akpụrụ unu gaa n’ụlọikpe obodo, a ga-etikwa unu ihe n’ụlọ nzukọ, a ga-emekwa ka unu guzoro n’ihu ndị gọvanọ na ndị eze.” (Mak 13:9) Ihe a Jizọs kwuru gosiri na mkpagbu a na-ahụ anya ga-abịara ụfọdụ Ndị Kraịst, ya bụ, na a ga-emekpọ ha ọnụ. Mgbe ụfọdụ, o nwere ike isi n’aka ndị ndú okpukpe ma ọ bụ ndị ọchịchị. (Ọrụ 5:27, 28) Chegodị gbasara Pọl. Ụjọ ọ̀ tụrụ ya mgbe ọ matara na a ga-emegide ya? Mba.—Gụọ Ọrụ Ndịozi 20:22, 23.

8, 9. Olee otú Pọl si gosi na ya kpebisiri ike idi mkpagbu ndị bịaara ya? Olee otú ụfọdụ ụmụnna si gosi na ha na-eme ka Pọl?

8 Pọl ji obi ike gbalịsie ike ka Setan ghara iji mkpagbu a na-ahụ anya mee ka ọ daa mbà. O kwuru, sị: “Ọ dịghị ihe m ji mkpụrụ obi m kpọrọ, ma ọ bụrụhaala na m ga-agbacha ọsọ m ma jezuo ozi ahụ m natara n’aka Onyenwe anyị Jizọs, ya bụ, ịgbasi àmà ike banyere ozi ọma nke obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ.” (Ọrụ 20:24) Pọl atụghị ụjọ na a ga-akpagbu ya. Kama, o kpebisiri ike idi ụdị mkpagbu ọ bụla. Ihe kacha ya  mkpa bụ “ịgbasi àmà ike” n’agbanyeghị mkpagbu.

9 Taa, ihe ọtụtụ ụmụnna anyị merela gosiri na ha na-eme ka Pọl. Dị ka ihe atụ, n’otu obodo, a tụọla ụfọdụ Ndịàmà Jehova mkpọrọ ihe fọrọ obere ka o ruo afọ iri abụọ n’ihi na ha ekweghị etinye aka n’ihe gbasara ọchịchị. E wepụghị okwu ha n’ụlọikpe n’ihi na iwu obodo ahụ ekwughị na mmadụ nwere ike ịjụ itinye aka n’ọchịchị ma ọ bụrụ na akọnuche ya ekweghị ya. A naghị ekwe ka ndị ezinụlọ ha ma ọ bụ ndị ọzọ gaa hụ ha. E tiela ụfọdụ n’ime ha ihe, sikwa n’ụzọ ndị ọzọ mekpọọ ha ọnụ.

10. Ọ bụrụ na mkpagbu abịara anyị na mberede, gịnị mere na ụjọ ekwesịghị ịtụ anyị?

10 N’ebe ndị ọzọ, ụmụnna anyị na-edi mkpagbu ndị ha na-atụghị anya ha. Ọ bụrụ na ụdị mkpagbu ahụ abịara gị, ụjọ atụla gị. Cheta Josef. E rere ya ka ọ gaa gbawa ohu. Ma, Jehova ‘napụtara ya ná mkpagbu ya niile.’ (Ọrụ 7:9, 10) Jehova nwere ike imere gị ụdị ihe ahụ. Echefula na “Jehova maara otú o si anapụta ndị na-asọpụrụ Chineke n’ọnwụnwa.” (2 Pita 2:9) Ị̀ ga na-atụkwasị Jehova obi, obi esie gị ike na ọ ga-anapụtali gị n’ụwa ochie a ma mee ka i nweta ndụ ebighị ebi mgbe Alaeze ya ga-achịwa ụwa? E nwere ọtụtụ ihe mere i kwesịrị iji tụkwasị Jehova obi ma jiri obi ike na-edi mkpagbu ọ bụla bịaara gị.—1 Pita 5:8, 9.

MKPAGBU A NA-ANAGHỊ AHỤ ANYA

11. Olee ihe dị iche ná mkpagbu a na-ahụ anya na nke a na-anaghị ahụ anya?

11 Ụdị mkpagbu ọzọ nwere ike ịbịara anyị bụ nke a na-anaghị ahụ anya. Olee ihe dị iche na ya na nke a na-ahụ anya? E nwere ike iji mkpagbu a na-ahụ anya tụnyere ajọ ifufe bịara na mberede bibie ụlọ n’otu ntabi anya. Ma, e nwere ike iji nke a na-anaghị ahụ anya tụnyere àkị́kà ji nwayọọ nwayọọ na-eri ụlọ e ji osisi rụọ. Tupu a chọpụta ihe na-emenụ, ihe emebiela, ụlọ ahụ adaa.

12. (a) Olee otu n’ime ụzọ aghụghọ Setan na-esikarị enweta ndị mmadụ? Gịnị mere ọ na-eji enweta ha? (b) Olee ihe ezughị okè mere Pọl?

12 Setan chọrọ ime ka gị na Jehova ghara ịdị ná mma. O nwere ike iji mkpagbu a na-ahụ anya mee ya ma ọ bụkwanụ ya ejiri nke a na-anaghị ahụ anya mee ka okwukwe gị jiri nwayọọ nwayọọ na-anyụ ka ọkụ. Otu ụzọ aghụghọ ọ na-akacha esi enweta ndị mmadụ bụ ime ka obi ghara ịdị ha mma. E nwere mgbe ụfọdụ obi na-adịghị Pọl mma. (Gụọ Ndị Rom 7:21-24.) O doro anya na okwukwe Pọl siri ezigbo ike. O nwekwara ike ịbụ na o so n’òtù na-achị isi n’oge ndịozi. Oleezi ihe mere o ji kwuo na ya ‘nọ ná nhụsianya’? Pọl kwuru na ọ bụ ezughị okè kpatara ya. Ọ chọrọ ime ihe ziri ezi, ma ọ bụghị mgbe niile ka ọ dịịrị ya mfe. Ọ bụrụ na ọ na-adị gị otú ahụ mgbe ụfọdụ, obi ọ́ gaghị esi gị ike ma ị ghọta na ụdị ihe ahụ mere Pọl?

13, 14. (a) Gịnị mere obi ji ajọ ụfọdụ ndị na-efe Chineke njọ? (b) Olee onye chọrọ ime ka okwukwe anyị nyụọ ka ọkụ? N’ihi gịnị?

13 Mgbe ụfọdụ, obi anaghị adị ụfọdụ ụmụnna mma. Ha na-echegbu onwe ha, na-echekwa na ha abaghị uru. Dị ka ihe atụ, otu nwanna nwaanyị ji obi ya niile na-asụ ụzọ kwuru, sị: “M na-eche mgbe niile banyere ihe m mejọrọ n’oge gara aga. Mgbe ọ bụla m chetara ya, obi anaghị adị m mma. Ọ na-abụ, m cheta ihe niile m mejọrọ, ya adị m ka e nweghị otú mmadụ ọ bụla ma ọ bụdị Jehova ga-esi hụ m n’anya.”

14 Gịnị mere obi na-eji ajọ ụfọdụ ndị ji obi ha niile na-ejere Jehova ozi njọ otú a o si ajọ nwanna nwaanyị a? E nwere ọtụtụ ihe nwere ike ịkpata ya. O nwere ike ịbụ n’ihi na ha na-echekarị ihe ọjọọ gbasara onwe ha ma ọ bụ chee na ụwa nke ha kacha njọ. (Ilu 15:15) E nwekwara ndị ọrịa ha na-arịa mere ka obi na-ajọ njọ. Ihe ọ bụla ọ sọrọ ya bụrụ ya kpatara ya,  anyị kwesịrị icheta onye chọrọ iji ya nweta anyị. Ì chetara onye chọrọ ka anyị daa mbà ma kwụsị ife Jehova? Ị̀ ma onye chọrọ ka anyị na-eche na Chineke amala anyị ikpe ọnwụ otú ọ mara ya? (Mkpu. 20:10) Ọ bụ Setan. Otu eziokwu doro anya bụ na, ma ihe o ji alụso anyị ọgụ ọ̀ bụ mkpagbu a na-ahụ anya ma ò si n’ụzọ aghụghọ ndị ọzọ na-alụso anyị ọgụ, mkpa ya bụ ka o nye anyị nsogbu, mee ka anyị dawa mbà ma kwụsị ijere Jehova ozi. Echefula na ndị Chineke nọ n’agha. Anyị agaghị ekwe ka ihe ọ bụla mee ka anyị kwụsị irubere Jehova isi.

15. Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị kpebisiri ike na anyị agaghị ada mbà?

15 Kpebisie ike na ị gaghị ada mbà. Lekwasị anya n’ihe Chineke ga-eji kwụọ gị ụgwọ. Pọl degaara Ndị Kraịst nọ na Kọrịnt akwụkwọ, sị: “Anyị adịghị ada mbà, kama ọ bụrụgodị na mmadụ anyị bụ n’elu ahụ́ na-ala n’iyi, n’ezie, a na-eme ka mmadụ anyị bụ n’ime dị ọhụrụ kwa ụbọchị. N’ihi na ọ bụ ezie na mkpagbu ahụ na-adịru nwa oge, dịkwa mfe, ọ na-arụpụtara anyị ebube nke na-adịwanye ukwuu, nke na-adịrukwa mgbe ebighị ebi.”—2 Kọr. 4:16, 17.

JIKERE UGBU A MAKA MKPAGBU

Ma Ndị Kraịst na-eto eto ma ndị nke torola eto na-azụ onwe ha ka ha nwee ike ịna-akọrọ ndị ọzọ ihe ha kweere (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16)

16. Gịnị mere anyị kwesịrị iji kwadebe ugbu a maka mkpagbu?

16 N’isiokwu a, anyị achọpụtala na Setan nwere ọtụtụ ụzọ aghụghọ ọ chọrọ isi nweta anyị. (Efe. 6:11) N’ihi ya, anyị kwesịrị ime ihe 1 Pita 5:9 kwuru. Ọ sịrị: “Guzogidenụ ya, sienụ ike n’okwukwe.” Ihe ga-enyere anyị aka ime otú ahụ bụ ịkwadebe obi anyị na uche anyị, ya bụ, ịna-azụ onwe anyị ugbu a ka anyị nwee ike ịna-eme ihe ziri ezi. Dị ka ihe atụ, tupu agha adaa, a na-enye ndị agha ọzụzụ pụrụ iche. Ọ bụ otú ahụ ka anyị kwesịrị ime. Anyị amaghị ụdị nsogbu ga-abịara anyị n’ọdịnihu. N’ihi ya, anyị kwesịrị  ịna-azụ onwe anyị ugbu a ọ na-abịabeghị. Pọl gwara Ndị Kraịst nọ na Kọrịnt, sị: “Na-anwalenụ ma ùnu nọ n’okwukwe ahụ, na-anwapụtanụ ihe unu onwe unu bụ.”—2 Kọr. 13:5.

17-19. (a) Olee ajụjụ ndị ga-enyere anyị aka ichebara onwe anyị echiche? (b) Olee otú ndị na-eto eto nwere ike isi jikere ejikere ka ha nwee ike ịgwa ụmụ akwụkwọ ibe ha ihe ndị ha kweere?

17 Otu ụzọ anyị nwere ike isi mee ihe ahụ Pọl kwuru bụ ichebara onwe anyị echiche. Anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘M̀ na-ekpe ekpere mgbe niile? Ọ bụrụ na ndị ọzọ agwa m mee ihe ọjọọ, m̀ na-erubere Chineke isi karịa mmadụ? M̀ na-agachi ọmụmụ ihe anya? M̀ na-eji obi ike agwa ndị ọzọ gbasara ihe m kweere? Ọ bụrụ na nwanna emejọọ m, m̀ na-agbaghara ya otú ahụ m chọrọ ka ndị m mejọrọ gbaghara m? M̀ na-erubere ndị okenye na ndị na-elekọta nzukọ Jehova isi?’

18 I leruo ajụjụ ndị ahụ anya, ị ga-aghọta na e nwere nke kwuru gbasara iji obi ike na-agwa ndị ọzọ gbasara ihe anyị kweere, nweekwa nke kwuru na anyị ekwesịghị ikwe ka ndị ọzọ mee ka anyị nupụrụ Chineke isi. N’ụlọ akwụkwọ, ọtụtụ ụmụnna ndị ka na-eto eto na-eji obi ike akọrọ ndị ọzọ ihe ha kweere. Ha anaghị ekwe ka ihere ma ọ bụ ụjọ mee ka ha ghara ime otú ahụ. Ihe nyeere ha aka bụ aro ụfọdụ a tụrụ n’akwụkwọ anyị. Dị ka ihe atụ, Teta! July–September 2009 kwuru na ọ bụrụ na nwa klas unu ajụọ gị, sị: “Gịnị mere i kweghị n’ozizi evolushọn?” i nwere ike ịsị ya: “Olee ihe mere m ga-eji kwere n’ozizi evolushọn? Ndị ọkà mmụta sayensị o kwesịrị ịka doo anya ekweghịdị n’otu ihe!” Ndị nne na nna, gbaanụ mbọ ka unu na ụmụ unu na-amụgharị ihe ha nwere ike ikwu n’ụlọ akwụkwọ. Ọ ga-eme ka ha mara ihe ha ga-ekwu ma ụmụ akwụkwọ ibe ha jụwa ha ajụjụ gbasara ihe ha kweere.

19 O doro anya na ọ bụghị mgbe niile ka ọ na-adị mfe ịkata obi gwa ndị ọzọ ihe anyị kweere ma ọ bụ mee ihe ndị ọzọ Jehova chọrọ ka anyị mee. Dị ka ihe atụ, anyị gachaa ọrụ lọta, ike nwere ike ịgwụ anyị, ma anyị ejisie ike gaa ọmụmụ ihe. Ike ọgwụgwụ nwekwara ike ime ka o siere anyị ike ibilite n’ụtụtụ gaa ozi ọma. Ma, cheta na ọ bụrụ na anyị emee ka ihe ndị a mara anyị ahụ́ ugbu a, ọ ga-eme ka anyị jikere ejikere maka nnukwu ọnwụnwa ndị ga-abịara anyị n’ọdịnihu.

20, 21. (a) Olee otú ichebara àjà Jizọs chụrụ echiche ga-esi mee ka obi ghara ịna-ajọ anyị njọ? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?

20 Gịnị ka anyị ga-eme ma mkpagbu a na-anaghị ahụ anya bịara anyị? Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na obi na-ajọ anyị njọ, gịnị ka anyị ga-eme ka ọ ghara ime ka anyị daa mbà? Otu ihe dị mkpa anyị ga-eme bụ ichebara àjà Jizọs chụrụ echiche. Ọ bụ ihe Pọl onyeozi mere. Mgbe ụfọdụ, obi anaghị adị ya mma. Ma, ọ ma na Kraịst nwụrụ maka ndị mmehie, ọ bụghị maka ndị zuru okè. Pọl so ná ndị mmehie ọ nwụrụ maka ha. Ọ bụ ya mere o ji dee, sị: ‘M dị ndụ site n’okwukwe nke m nwere n’ebe Ọkpara Chineke nọ, bụ́ onye hụrụ m n’anya ma nyefee onwe ya maka m.’ (Gal. 2:20) Pọl nabatara àjà ahụ Jizọs chụrụ. Ọ ghọtara na ọ baara ya uru.

21 Ọ ga-abara gị ezigbo uru ma ọ bụrụ na ị ghọta na àjà ahụ Jizọs chụrụ bụ onyinye Jehova nyere gị. Ọ pụtaghị na obi ga-akwụsị ịjọ gị njọ ozugbo. Ụfọdụ n’ime anyị nwere ike ịna-edi ihe ụfọdụ na-eme ha obi ọjọọ ruo mgbe anyị ga-aba n’ụwa ọhụrụ. Ma cheta na Chineke ga-akwụ anyị ụgwọ ma ọ bụrụ na anyị adaghị mbà. Mgbe Alaeze Chineke ga-abịa adịla ezigbo nso. Ọ bụ mgbe ahụ ka udo ga-adị n’ụwa, mmadụ niile ezuo okè. Kpebisie ike na o nweghị ihe ga-eme ka ị ghara ịba n’Alaeze Chineke, ọ bụrụgodị na ọtụtụ mkpagbu abịara gị tupu mgbe ahụ.