Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) SEPTEMBA 2014

Ihe dị n’Ụlọ Nche a bụ isiokwu ndị a ga-amụ malite n’Ọktoba 27 ruo na Nọvemba 30, 2014.

Ị̀ ‘Na-agbalị Ka I Ruo Eruo’?

Olee otú i kwesịrị isi mee ya?

Obi Ò Siri Gị Ike na Ị Chọtala Eziokwu? N’ihi Gịnị?

Isiokwu a ga-ekwu ihe ụfọdụ mere ọtụtụ ndị ji kweta na Ndịàmà Jehova na-akụzi eziokwu nakwa ihe mere obi ji sie Ndịàmà Jehova ike na ha achọtala eziokwu.

Jiri Obi Gị Niile Na-ejere Chineke Ozi n’Agbanyeghị “Ọtụtụ Mkpagbu”

Nsogbu na-abịara onye ọ bụla bi n’ụwa Setan. Olee ụfọdụ ụzọ Setan si alụso anyị ọgụ? Olee otú anyị ga-esi jikere ejikere?

Ndị Nne na Nna, Na-azụnụ Ụmụ Unu

Baịbụl gwara ndị nne na nna ka ha na-azụ ụmụ ha “n’ọzụzụ na nduzi echiche nke si n’aka Jehova.” (Ndị Efesọs 6:4) Isiokwu a kwuru ihe atọ ha ga-eme ka ha nwee ike ịna-azụ ụmụ ha ma nyere ha aka ịhụ Jehova n’anya.

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ihe Baịbụl kwuru n’Abụ Ọma 37:25 na Matiu 6:33 ọ̀ pụtara na Jehova agaghị ekwe ka nri kọọ Onye Kraịst?

A Ga-eme Ka Ọnwụ, Bụ́ Onye Iro Ikpeazụ, Ghara Ịdị Irè

Ọnwụ na ihe niile na-akpata ya emeela ka ụmụ mmadụ na-ata ahụhụ. Gịnị mere anyị ji anwụ? Olee otú a ga-esi ‘mee ka ọnwụ ghara ịdị irè’? (1 Ndị Kọrịnt 15:26) Mata otú azịza ajụjụ ndị a si egosi amamihe Jehova, ikpe ziri ezi ya, na ịhụnanya ya.

Na-echeta Ndị Nọ n’Ozi Oge Niile

Ọtụtụ ndị ohu Jehova na-agbasi mbọ ike n’ozi oge niile. Olee otú anyị ga-esi egosi na anyị na-echeta ọrụ ha ji ‘ikwesị ntụkwasị obi na ịhụnanya na-arụ’?—1 Ndị Tesalonaịka 1:3.