Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Ọgọst 2014

 IHE SI N’EBE ANYỊ NA-EDEBE IHE OCHIE

Fim “Eureka Drama” Nyeere Ọtụtụ Ndị Aka Ịmụta Eziokwu Baịbụl

Fim “Eureka Drama” Nyeere Ọtụtụ Ndị Aka Ịmụta Eziokwu Baịbụl

“EUREKA” pụtara “ahụla m ya.” Mgbe a malitere igwu ọlaedo na Kalịfọnịa dị n’Amerịka n’ihe dị ka n’afọ 1848, ọ bụ ihe ndị mmadụ na-ekwu ma ha gwute ọlaedo. Ma, Nwanna Charles Taze Russell na Ndị Mmụta Baịbụl ibe ya chọtara ihe bara uru karịa ọlaedo, ya bụ, eziokwu Baịbụl. Ha chọsiri ike ịkọrọ ya ndị ọzọ.

Tupu ọnwa Ọgọst afọ 1914, ọtụtụ nde ndị bi n’obodo ndị mepere emepe eleela fim “Photo-Drama of Creation” Ndị Mmụta Baịbụl nke Mba Niile mepụtara. Ọ na-ewe awa asatọ iji lee ya. Ihe mere o ji pụọ iche bụ na ihe a na-egosi na ya mara mma. O nwere ọmarịcha slaịd na egwú nakwa okwu ndị mara mma si na Baịbụl. Fim a mere ka ndị na-ele ya mara ihe ndị mere malite mgbe Chineke bidoro ike ihe ruo n’ihe ndị ga-eme ná ngwụcha Ọchịchị Puku Afọ Jizọs Kraịst.—Mkpu. 20:4. *

Oleekwanụ otú ndị bi n’ime ime obodo ga-esi lee fim ahụ? N’ọnwa Ọgọst afọ 1914, Ndị Mmụta Baịbụl wepụtara “Eureka Drama” ka e jiri ya nyere ndị chọrọ ịmụta eziokwu aka. Ma, ihe ụfọdụ e gosiri na fim “Photo-Drama” adịghị na ya. Ọ dị ụdị atọ e mepụtara n’asụsụ ụfọdụ, mmadụ nwekwara ike ịhọrọ nke ọ chọrọ. E nwere nke a kpọrọ “Eureka X.” Ihe dị na ya bụ naanị egwú na okwu ndị e tinyere na teepụ. Nke ọzọ bụ “Eureka Y.” Ihe dị na ya bụ okwu niile e tinyere na teepụ nakwa slaịd mara mma. E nwekwara nke a kpọrọ “Eureka Family Drama.” E mepụtara ya ka ndị mmadụ na-ege ya n’ụlọ ha. Ihe dị na ya bụ abụ na okwu ndị e tinyere na teepụ. Ndị Mmụta Baịbụl nwere ike iresị mmadụ gramafon na ihe e ji egosi ihe nkiri slaịd n’ọnụ ego dị ala.

Ọ bụ ihe a ka a na-eji egosi slaịd ndị ahụ

Ọ bụrụgodị na Ndị Mmụta Baịbụl ejighị ihe ndị e ji egosi ihe nkiri slaịd, ha ka nwere ike igosi ya ndị bi n’ime ime obodo n’anaghị ha ego ọ bụla, si otú ahụ kwusaa ozi ọma Alaeze Chineke n’ebe ndị ọ na-erubeghị. E nwere ike ịkpọnye nke ahụ a kpọrọ “Eureka X” n’ehihie ma ọ bụ n’abalị. Ọ bụrụ na ọkụ eletrik adịghị, e nwere ike iji ọkụ kabaịd gosi ndị mmadụ ihe ndị dị na “Eureka Y.” Alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Finland kwuru, sị: “Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na anyị nwere ike igosi slaịd ndị ahụ n’ebe ọ bụla.” Ọ bụ eziokwu doro anya.

Ndị Mmụta Baịbụl anaghị aga kwụwa ụgwọ nnukwu ebe a na-anọ ele sinima. Kama, ha na-anọkarị n’ebe ndị ha na-agaghị akwụ ụgwọ egosi ya, ya bụ, n’ụlọ akwụkwọ, n’ụlọikpe, n’ọdụ ụgbọ  okporo ígwè nakwa na palọ ndị mmadụ. Ọtụtụ mgbe, ha na-anọ n’èzí egosi ya. Ha na-ekedo nnukwu ákwà ọcha n’ahụ́ ụlọ ebe ndị ọrụ ugbo na-edowe ihe ndị ha wetara n’ubi. Otu nwanna aha ya bụ Anthony Hambuch kwuru, sị: “Ndị ọrụ ugbo na-ewepụta otu ebe n’ubi ha. A na-enwe ogologo osisi ndị mmadụ nwere ike iji mere oche ha ga-anọ na-ele ihe a na-egosi ha.” Ụmụnna ndị na-egosi sinima ahụ na-eji ụgbọala ịnyịnya na-adọkpụ ebu ma ihe ndị ha ji egosi sinima ahụ ma akpa ha ma ihe ndị ha ji ehi ụra ma ihe ndị ha ji esi nri.

E nwere ebe ụfọdụ ndị bịara kirie ya na-ebuchaghị ibu, nweekwa ebe ndị ha ruru ọtụtụ narị. N’Amerịka, e gosiri ya ugboro ugboro n’ụlọ akwụkwọ dị n’otu obodo ndị bi na ya dị otu narị mmadụ na iri ise. Ndị niile bịara kirie ya dị narị mmadụ anọ. N’ebe ọzọ, ụfọdụ ndị ji ụkwụ gaa kilomita iri na isii, uje na ụla, ka ha nwee ike ile sinima ahụ. Na Swidin, ndị agbata obi otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Charlotte Ahlberg gbakọrọ n’obere ụlọ ya ma gere ihe ahụ e tinyere na teepụ. Ihe ha nụrụ “ruru ha n’obi.” Mgbe e gosiri ya n’otu ime obodo dị n’Ọstrelia, ihe dị ka otu puku mmadụ na narị ise bịara. Ụlọ Nche kwuru na mgbe e gosiri ya na mahadum na n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị, “foto na ihe ndị ahụ e tinyere na teepụ masịrị ndị prọfesọ na ụmụ akwụkwọ.” Ihe nkiri ahụ wukwara ewu n’obodo ndị e nwere ebe a na-egosi sinima.

E NYEERE NDỊ MMADỤ AKA KA HA MỤTAKWUO EZIOKWU

N’oge ahụ, ihe a na-akpọ ọgbakọ bụ klas Ndị Mmụta Baịbụl. A na-esi na ya ziga ụmụnna n’ebe dị iche iche ka ha gaa malite klas ndị ọhụrụ. Ha ruo, ha na-ekwu okwu ihu ọha, gosikwa fim ahụ. O siri ike ịmata mmadụ ole lere ihe nkiri “Eureka Drama.” E nwere ndị nke e gosiri ọtụtụ ugboro. E kere ndị na-egosi fim ahụ ụzọ iri asatọ na isii. N’afọ 1915, ọ bụ naanị ụzọ iri na anọ n’ime ha na-ekwukarị mmadụ ole lere ya. Ọ bụ eziokwu na ihe e dere ná ngwụcha afọ ahụ kwuru na ihe karịrị otu nde mmadụ lere ihe nkiri ahụ, o kwuru na e nwere ebe ndị a na-amaghị mmadụ ole lere ya. Ihe dị ka iri puku mmadụ atọ kwuru ka e wetara ha akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl.

O nwere ike ịbụ mmadụ ole na ole na-echeta “Eureka Drama,” ma o doro anya na ọtụtụ nde mmadụ lere ya n’Ọstrelia, Ajentina, Saụt Afrịka, India, Karịbian nakwa na Briten na Ayaland na àgwàetiti ndị dị ha nso. Ọtụtụ n’ime ndị ahụ lere ya mụtara eziokwu dị na Baịbụl, nke bara uru karịa ọlaedo.

^ para. 4 Gụọ isiokwu bụ́ “Ihe Si n’Ebe Anyị Na-edebe Ihe Ochie—Ihe E Mere Otu Narị Afọ Gara Aga, nke Mere Ka E Nwee Okwukwe.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche, Febụwarị 15, 2014, peeji nke 30-32.