Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JULAỊ 2014

“Unu Bụ Ndị Àmà M”

“Unu Bụ Ndị Àmà M”

“‘Unu bụ ndị àmà m,’ ka Jehova kwuru.”—AỊZA. 43:10.

1, 2. (a) Ọ bụrụ na a sị na mmadụ bụ onye àmà, gịnị ka ọ pụtara? Gịnị ka ụlọ ọrụ mgbasa ozi na-anaghị akọrọ ndị mmadụ? (b) Gịnị mere na Jehova anaghị atụ anya na ụlọ ọrụ mgbasa ozi ga-eme ka ndị mmadụ mata onye ọ bụ?

Ọ BỤRỤ na a sị na mmadụ bụ onye àmà, gịnị ka ọ pụtara? Otu akwụkwọ ọkọwa okwu kwuru na onye àmà bụ “onye hụrụ ihe ma kọọ otú o si mee.” Dị ka ihe atụ, n’obodo Pitamaritsbọg dị na Saụt Afrịka, e nwere otu akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta n’asụsụ Bekee kemgbe ihe karịrị otu narị afọ na iri isii. Aha ha na-akpọ ya pụtara “onye àmà.” Aha a dabara adaba n’ihi na ihe mere e ji ebipụta akwụkwọ akụkọ bụ ka ọ kọọ nke bụ́ eziokwu gbasara ihe ndị na-eme n’ụwa. Onye malitere ibipụta akwụkwọ akụkọ ahụ kwere nkwa na akwụkwọ akụkọ ahụ ga na-akọ “ihe bụ́ eziokwu, ihe niile merenụ nakwa naanị ihe bụ́ eziokwu.”

2 Ma, ọ dị mwute na ọtụtụ mgbe, ụlọ ọrụ mgbasa ozi anaghị akọ nke bụ́ eziokwu gbasara ihe ndị na-emenụ. Ọ naghị akọ eziokwu gbasara Chineke na ihe ndị o mere. Ma, Jehova bụ́ Ọkaakaa eluigwe na ụwa anaghị atụ anya na ụlọ ọrụ mgbasa ozi ga-eme ka ndị mmadụ mata onye ọ bụ. O si n’ọnụ Ezikiel kwuo, sị: “Mba niile ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova.” (Ezik. 39:7) N’ụwa niile, Jehova nwere ihe dị ka nde Ndịàmà asatọ na-akọrọ ndị mmadụ gbasara ya, ihe ndị o mere n’oge gara aga, na ihe ndị ọ na-eme taa. Ha na-akọkwara ndị ọzọ ihe ọma Chineke kwere nkwa imere ụmụ mmadụ  n’ọdịnihu. Aịzaya 43:10 kwuru, sị: “‘Unu bụ ndị àmà m,’ ka Jehova kwuru, ‘ọbụna ohu m nke m họọrọ.’” Ọ bụrụ na anyị ejiri ikwusa ozi ọma kpọrọ mkpa, anyị na-egosi na anyị bụ Ndịàmà Jehova n’eziokwu.

3, 4. (a) Olee mgbe Ndị Mmụta Baịbụl malitere ịza Ndịàmà Jehova? Olee otú obi dị ha mgbe ahụ? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza?

3 Ịza aha Jehova bụ ezigbo ihe ùgwù n’ihi na Jehova bụ “Eze mgbe ebighị ebi.” O kwuru, sị: “Nke a bụ aha m ruo mgbe ebighị ebi, nke a bụkwa ihe ncheta m site n’otu ọgbọ ruo ọgbọ ọzọ.” (1 Tim. 1:17; Ọpụ. 3:15; tụlee Ekliziastis 2:16.) N’afọ 1931, Ndị Mmụta Baịbụl malitere ịza Ndịàmà Jehova. Ọtụtụ n’ime ha mechara dee akwụkwọ ozi ma kwuo na obi dị ha ụtọ maka aha ọhụrụ a ha na-aza. Na Kanada, otu ọgbakọ dere, sị: “Obi tọrọ anyị ezigbo ụtọ mgbe anyị nụrụ na anyị na-azazi ‘Ndịàmà Jehova.’ O meela ka anyị kpebisikwuo ike ịna-ebi ndụ otú ga-eme ka a na-eto aha Jehova.”

4 Olee otú ị ga-esi gosi na ịza Onyeàmà Jehova bụ ihe ùgwù? Gịnị mere Jehova ji kpọọ anyị Ndịàmà ya n’akwụkwọ Aịzaya?

NDỊ ÀMÀ CHINEKE N’OGE OCHIE

5, 6. (a) Olee otú ndị nne na nna bụ́ ndị Izrel si gbaa àmà banyere Jehova? (b) Olee ihe ọzọ ndị nne na nna bụ́ ndị Izrel kwesịrị ime? Gịnị mere ndị nne na nna kwesịrị iji na-eme otú ahụ taa?

5 N’oge Aịzaya, onye Izrel ọ bụla bụ ‘onye àmà’ Jehova. Mba Izrel abụrụ “ohu” Chineke. (Aịza. 43:10) Otu ụzọ ndị nne na nna bụ́ ndị Izrel si gbaa àmà banyere Jehova bụ ịkụziri ụmụ ha gbasara ihe Chineke meere ndị nna nna ha. Dị ka ihe atụ, mgbe a na-enye ha iwu ka ha na-eme Ememme Ngabiga kwa afọ, a gwara ha, sị: “Mgbe ụmụ unu ga-asị unu, ‘Gịnị ka ememme a unu na-eme pụtara?’ unu ga-asị, ‘Ọ bụ àjà ememme ngabiga nke  a na-achụrụ Jehova, bụ́ onye gabigara ụlọ ụmụ Izrel n’Ijipt mgbe o tiri ndị Ijipt ihe otiti, ma ọ napụtara ezinụlọ anyị.’” (Ọpụ. 12:26, 27) O nwekwara ike ịbụ na ha kọọrọ ụmụ ha na mgbe mbụ Mozis gara gwa Fero bụ́ eze Ijipt n’oge ahụ ka ọ hapụ ụmụ Izrel ka ha gaa fee Jehova n’ala ịkpa, Fero kwuru, sị: “Ònye bụ Jehova, nke mere m ga-eji rube isi n’ihe o kwuru wee hapụ ndị Izrel ka ha laa?” (Ọpụ. 5:2) O nwere ike ndị nne na nna kọkwaara ụmụ ha otú Jehova si zaa ajụjụ ahụ Fero jụrụ na otú o si gosi na ya bụ Ọkaakaa. O tiri ndị Ijipt ihe otiti iri ma napụta ndị Izrel n’aka ndị agha Ijipt n’Oké Osimiri Uhie. Ụmụ Izrel hụrụ na ọ bụ Jehova bụ ezi Chineke nakwa na ọ na-emezu nkwa o kwere.

6 Ụmụ Izrel ghọtara na ịgba àmà banyere Jehova bụ ihe ùgwù. Ha kọọrọ ma ụmụ ha ma ndị mba ọzọ bụ́ ndị ohu bi n’ụlọ ha ihe ndị a Jehova mere. Ụmụ Izrel ghọtakwara na ha kwesịrị ịdị nsọ n’anya Chineke. Jehova gwara ha, sị: “Unu ga-adị nsọ, n’ihi na mụ onwe m bụ́ Jehova Chineke unu dị nsọ.” Ndị nne na nna bụ́ ndị Izrel kwesịrị ịkụziri ụmụ ha ka ha dị nsọ, ya bụ, ka ha na-eme ihe Jehova kwuru. (Lev. 19:2; Diut. 6:6, 7) Ndị nne na nna kwesịkwara ime otú ahụ taa. Ha kwesịrị ịkụziri ụmụ ha ka ha na-ebi ndụ otú ga-eme ka ndị mmadụ na-asọpụrụ aha Jehova dị ebube.—Gụọ Ilu 1:8; Ndị Efesọs 6:4.

Ịkụziri ụmụ anyị gbasara Jehova na-eme ka a na-asọpụrụ aha ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5 na nke 6)

7. (a) Mgbe ọ bụla ụmụ Izrel rubeere Jehova isi, gịnị ka mba ndị gbara ha gburugburu na-eme? (b) Olee ihe ndị niile na-aza aha Jehova kwesịrị ime?

7 Mgbe ọ bụla ụmụ Izrel rubeere Jehova isi, ha na-esi otú ahụ agba àmà gbasara aha Jehova. A gwara ha, sị: “Ndị niile nke ụwa ga-ahụ na a kpọkwasịwo gị aha Jehova, ha ga-atụkwa gị egwu.” (Diut. 28:10) Ma, ọ dị mwute na ọtụtụ mgbe, ụmụ Izrel nupụụrụ Jehova isi. Ugboro ugboro, ha kpeere arụsị. Obi bịara kpọọ ha nkụ otú ahụ ọ kpọrọ chi ndị Kenan ha na-efe. Ha jikwa ụmụ ha na-achụrụ ya àjà ma na-emegbu ndị ogbenye. Anyị kwesịrị ịmụta ihe dị mkpa n’ihe ahụ ha mere. Anyị kwesịrị ime ka Jehova ma dịrị nsọ n’ihi na ọ bụ ya bụ Onye Kacha Nsọ anyị na-aza aha ya.

“LEE! ANA M EME IHE ỌHỤRỤ”

8. Gịnị ka Jehova gwara Aịzaya ka o mee? Olee ihe Aịzaya mere?

8 Jehova si n’ọnụ Aịzaya gwa ndị Izrel na ya ga-ebibi Jeruselem bụ́ isi obodo ha, kwekwa ka a kpụrụ ndị ya gaa mba ọzọ. O bukwara amụma na ya ga-eme “ihe ọhụrụ,” meekwa ka ndị Izrel si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta. (Aịza. 43:19) Jehova ma na ụmụ Izrel agaghị echegharị. Ma, ọ gwara Aịzaya ka ọ na-adọ ha aka ná ntị. Ihe a kacha dee n’Aịzaya isi nke mbụ ruo n’isi nke isii bụ aka ná ntị a dọrọ ha gbasara mbibi a ga-ebibi Jeruselem. Ihe a juru Aịzaya anya, ya achọọ ịma mgbe ndị Izrel ga-akwụsị inupụrụ Chineke isi. Chineke zara ya, sị: “Ruo mgbe obodo niile ghọrọ mkpọmkpọ ebe, n’enweghị onye bi ha, ruo mgbe ụlọ niile na-enweghị mmadụ nọ ha, mgbe e bibiwokwara ala a mee ka ọ tọgbọrọ n’efu.”—Gụọ Aịzaya 6:8-11.

9. (a) Olee mgbe amụma Aịzaya buru banyere Jeruselem mezuru? (b) Olee ihe a na-agwa anyị taa nke anyị kwesịrị ige ntị na ya?

9 Ọ bụ n’afọ ikpeazụ nke ọchịchị Eze Ọzaya, ya bụ, n’afọ 778 Tupu Oge Ndị Kraịst, ka Jehova gwara Aịzaya ka ọ gaa dọọ ndị Izrel aka ná ntị. Ọ rụrụ ọrụ ahụ ruo ihe dị ka afọ iri anọ na isii, ya bụ, ruo mgbe Eze Hezekaya na-achị, n’ihe dị ka n’afọ 732 Tupu Oge Ndị Kraịst. N’oge ahụ, ọ fọrọ otu narị afọ na iri abụọ na ise ka e bibie Jeruselem. E bibiri ya n’afọ 607 Tupu Oge Ndị Kraịst. N’ihi ya, a dọrọ ndị Chineke aka ná ntị ọtụtụ afọ gbasara ihe  na-aga ime obodo ha. Taa, Jehova ji ndị ya na-adọ ndị mmadụ aka ná ntị banyere ihe ọ ga-eme n’ọdịnihu. Kemgbe otu narị afọ na iri atọ na ise, Ụlọ Nche na-agwa ndị mmadụ na n’oge na-adịghị anya, ọchịchị ọjọọ Setan ga-akwụsị, ọchịchị otu puku afọ Jizọs Kraịst amalite.—Mkpu. 20:1-3, 6.

10, 11. Olee ihe Aịzaya buru n’amụma nke ụmụ Izrel nọ na Babịlọn ji anya ha hụ mgbe o mezuru?

10 Mgbe e bibiri Jeruselem, e nwere ndị Juu a na-egbughị. Ọ bụ n’ihi na ha chịliiri ndị Babịlọn aka elu otú ahụ Chineke gwara ha, a dọrọ ha n’agha laa Babịlọn. (Jere. 27:11, 12) Mgbe afọ iri asaa gara, ụfọdụ n’ime ha ji anya ha hụ otú amụma ọzọ Aịzaya buru si mezuo. Ọ sịrị: “Nke a bụ ihe Jehova, Onye Mgbapụta unu, bụ́ Onye Nsọ Izrel, kwuru: ‘Ọ bụ n’ihi unu ka m ga-eziga ha na Babịlọn ma mee ka ihe e ji tụchie ụlọ mkpọrọ dapụsịa.’”—Aịza. 43:14.

11 Otú Jehova si mezuo amụma ahụ dị egwu. N’otu abalị n’ọnwa Ọktoba n’afọ 539 Tupu Oge Ndị Kraịst, eze Babịlọn na ndị a ma ama n’ọchịchị ya nọ na-eri oriri ma na-eto chi ha. Ha jidị iko ha zuuru n’ụlọ nsọ Jehova na-aṅụ mmanya. Ma, n’abalị ahụ, Eze Saịrọs na ndị agha ya batara na Babịlọn ma merie ya. N’afọ 538 ma ọ bụ 537 Tupu Oge Ndị Kraịst, Saịrọs nyere ndị Juu iwu ka ha laghachi Jeruselem ma rụghachi ụlọ nsọ Chineke. Mgbe ndị Juu na-ala, Jehova gbooro ha mkpa ha ma chebe ha. Ihe a niile mere otú ahụ Aịzaya buru n’amụma. Mgbe ndị Chineke mechara rụghachi ụlọ nsọ ahụ dị na Jeruselem, ha ji anya ha hụ ihe gosiri na Jehova bụ ezi Chineke nakwa na ọ na-emezu nkwa ọ bụla o kwere. Ihe Chineke kpọrọ ha bụ “ndị m kpụụrụ onwe m, ka ha wee kọọ akụkọ otuto m.”—Aịza. 43:21; 44:26-28.

12, 13. (a) Mgbe ndị Izrel laghachiri Jeruselem, olee ndị so ha na-efe Jehova? (b) Gịnị ka “atụrụ ọzọ” kwesịrị ime ka ha na-akwado “Izrel nke Chineke”? Olee ihe ha na-atụ anya ya?

12 Mgbe ndị Izrel laghachiri Jeruselem ka ha gaa rụghachi ụlọ nsọ Chineke, ọtụtụ ndị na-abụghị ndị Izrel so ha na-efe Jehova. E mechara nwekwuo ndị mba ọzọ so ha na-efe ya. (Ezra 2:58, 64, 65; Esta 8:17) Taa, ọ bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ bụ “Izrel nke Chineke.” “Oké ìgwè mmadụ,” ndị so ‘n’atụrụ ọzọ,’ ji obi ha niile na-akwado ha. (Mkpu. 7:9, 10; Jọn 10:16; Gal. 6:16) Ma ndị e tere mmanụ ma atụrụ ọzọ ahụ na-aza Ndịàmà Jehova.

13 N’ọchịchị Otu Puku Afọ Kraịst, oké ìgwè mmadụ ga-enwe ihe ùgwù pụrụ iche. Ha ga-akọrọ ndị a kpọlitere n’ọnwụ  otú obi dị ha mgbe ha na-aza Ndịàmà Jehova n’oge ikpeazụ tupu e bibie ụwa Setan. Ọ bụrụ na anyị chọrọ iso mee otú ahụ, anyị kwesịrị ịna-adị nsọ n’anya Chineke. N’agbanyeghị na anyị na-agbasi mbọ ike ka anyị na-erubere Chineke isi, anyị na-emejọ kwa ụbọchị. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-arịọ Jehova kwa ụbọchị ka ọ gbaghara anyị. Ọ bụrụ na anyị ana-akpa àgwà dị nsọ n’anya Chineke, anyị na-egosi na obi dị anyị ụtọ na Jehova kwere ka anyị na-aza aha ya dị nsọ.—Gụọ 1 Jọn 1:8, 9.

IHE AHA CHINEKE PỤTARA

14. Gịnị ka aha Jehova pụtara?

14 Anyị kwesịrị ịma ihe aha Jehova pụtara n’ihi na ọ ga-eme ka anyị ghọtakwuo na ịza Ndịàmà Jehova bụ ezigbo ihe ùgwù. Okwu Hibru e si nweta aha Jehova pụtara “ịbụ.” N’ihi ya, aha Jehova pụtara “Ọ Na-abụ Ihe Ọ Bụla Ọ Chọrọ Ịbụ.” Ihe a ọ pụtara dabara adaba n’ihi na ọ bụ Jehova kere ma eluigwe ma ụwa ma ndị mmụọ ozi ma ụmụ mmadụ. Ọ na-emezukwa nzube ya. Ihe ndị na-eme n’ụwa taa gosiri na Jehova na-ahụ na nzube ya mezuru, ihe ọ sọkwara ndị iro ya mee. Setan ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ enweghị ike ịkụghasị ihe ọ bụla bụ́ uche Chineke.

15. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta gbasara aha Jehova n’ihe ọ gwara Mozis? (Kwuo ihe dị n’igbe bụ́ “ Aha nke Nwere Ihe Ọ Pụtara.”)

15 Jehova mere ka Mozis ghọtakwuo ihe aha ya pụtara. Mgbe o dunyere ya ka ọ gaa kpọpụta ndị ya n’Ijipt, ọ gwara ya, sị: “M Ga-abụ Ihe M Chọrọ Ịbụ.” Jehova gwakwara ya, sị: “Nke a bụ ihe ị ga-agwa ụmụ Izrel, ‘M Ga-abụ ezitewo m ka m bịakwute unu.’” (Ọpụ. 3:14.) N’ihi ya, Jehova nwere ike ịbụ ihe ọ bụla ọ chọrọ ịbụ ka o nwee ike imezu nzube ya. N’oge ụmụ Izrel, Jehova mere ihe ọ bụla dị mkpa ka o nwee ike ịghọrọ ha Onye Nnapụta, Onye Nchebe, Onye Nduzi, na Onye Na-egbo Mkpa.

OTÚ ANYỊ GA-ESI GOSI NA OBI DỊ ANYỊ ỤTỌ

16, 17. (a) Olee otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe ùgwù anyị nwere ịza aha Chineke? (b) Olee ajụjụ anyị ga-aza n’isiokwu na-esonụ?

16 Taa, Jehova agbanwebeghị. Aha ya na-echetara anyị na ọ ga-abụ ihe ọ bụla ọ chọrọ ịbụ ka o nwee ike ilekọta ndị ya. Dị ka ihe atụ, ọ na-egboro anyị mkpa anyị kwa ụbọchị, na-enyekwa anyị ihe ndị ga-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike. E nwere ihe ọzọ aha Jehova na-akụziri anyị gbasara Jehova. Gịnị ka ọ bụ? Ọ bụ na Jehova nwere ike ime ka ihe ndị o kere bụrụ ihe ọ bụla ọ chọrọ ka o nwee ike imezu nzube ya. Dị ka ihe atụ, ọ na-eji Ndịàmà ya arụ ọrụ ya. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-akpa àgwà ga-eme ka a na-eto ya. Na Nọọwee, e nwere otu nwanna nwoke aha ya bụ Kåre. O ji obi ya niile na-ejere Jehova ozi kemgbe iri afọ asaa. O kwuru, sị: “Eweere m na ijere Jehova, bụ́ Eze mgbe ebighị ebi, ozi na iso ná ndị na-aza aha ya bụ ihe ùgwù na-enweghị atụ. Ọ bụụrụ m ezigbo ihe ùgwù na m na-akọwara ndị mmadụ eziokwu Baịbụl, na-ahụkwa otú obi si adị ha ụtọ ma ha ghọta ya. Dị ka ihe atụ, obi na-adị m ezigbo ụtọ mgbe m na-akụziri ha uru àjà Jizọs chụrụ bara na otú o nwere ike isi mee ka ha dị ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ, bụ́ ebe ndị ezi omume ga-ebi, udo adịkwa na ya.”

17 N’ebe ụfọdụ n’ụwa, ọ na-esi ike ịhụ ndị chọrọ ịmụ gbasara Jehova. Ma, obi na-adị anyị ụtọ otú ahụ ọ na-adị Kåre ma anyị hụ ndị chọrọ ịmụ gbasara aha Jehova, ọ bụrụgodị otu onye. Ma, olee otú anyị ga-esi bụrụ Ndịàmà Jehova, bụrụkwa ndị àmà Jizọs? Anyị ga-aza ajụjụ a n’isiokwu na-esonụ.