Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Jun 2014

Ị̀ Na-ewere Ndị Na-adịghị Ike Otú Jehova Si Were Ha?

Ị̀ Na-ewere Ndị Na-adịghị Ike Otú Jehova Si Were Ha?

“Akụkụ ahụ́ ndị dị ka ọ̀ bụ na ha adịghị ike dị mkpa”—1 KỌR. 12:22.

1, 2. Gịnị mere Pọl ji ghọta otú obi na-adị ndị na-adịghị ike?

IKE na-agwụ anyị niile mgbe ụfọdụ. Mgbe anyị na-arịa ọrịa, ike nwere ike ịgwụ anyị, ya esiere anyị ike ime ihe ndị anyị kwesịrị ime. Ka e were ya na ọ dị mmadụ otú ahụ ruo ọtụtụ ọnwa. Ọ̀ bụ na obi agaghị adị ya ụtọ ma ọ bụrụ na ndị ọzọ emee ihe gosiri na ha na-emetere ya ebere?

2 Mgbe ụfọdụ, ike gwụrụ Pọl onyeozi n’ihi nsogbu ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ na ndị na-anọghị n’ọgbakọ na-enye ya. E nwere oge ụfọdụ ọ dị ya ka ọ gaghị edili ya. (2 Kọr. 1:8; 7:5) Ahụhụ niile ọ tara mere ka ọ ghọta otú obi na-adị ndị na-adịghị ike. O kwuru, sị: “Ònye bụ onye na-adịghị ike, m wee ghara ịbụ onye na-adịghị ike?” (2 Kọr. 11:29) Pọl ji ndị nọ n’ọgbakọ tụnyere akụkụ ahụ́ mmadụ ma kwuo na “akụkụ ahụ́ ndị dị ka ọ̀ bụ na ha adịghị ike dị mkpa.” (1 Kọr. 12:22) Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara? Gịnị mere anyị ji kwesị iwere ndị na-adịghị ike otú Jehova si were ha? Olee uru anyị ga-erite ma anyị mee otú ahụ?

OTÚ JEHOVA SI EWERE NDỊ NA-ADỊGHỊ IKE

3. Anyị hụ ụmụnna ndị e kwesịrị inyere aka, gịnị nwere ike ime ka o siere anyị ike inyere ha aka?

3 N’ụwa taa, ọtụtụ ndị na-emegbu ndị na-adịghị ike ka ha nwee ike inweta ihe ha chọrọ. Ha chere na ọ bụ ụmụ okorobịa  na ndị siri ike na-enweta ihe ha chọrọ. Ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, anyị nwere ike ịna-akpa àgwà ka ha. Anyị hụ ụmụnna ihe na-esiri ike, anyị nwere ike ịna-eche na inyere ha aka abaghị uru. Olee otú anyị ga-esi were onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ otú Jehova si were ya?

4, 5. (a) Gịnị ka ihe atụ ahụ Pọl mere ná 1 Ndị Kọrịnt 12:21-23 na-akụziri anyị gbasara otú Jehova si were ndị na-adịghị ike? (b) Olee uru anyị ga-erite ma ọ bụrụ na anyị enyere ndị na-adịghị ike aka?

4 Ọ bụrụ na anyị eleba anya n’ihe atụ Pọl mere n’akwụkwọ ozi mbụ o degaara ndị Kọrịnt, ọ ga-enyere anyị aka ka anyị ghọta otú Jehova si were ndị na-adịghị ike. N’isi nke iri na abụọ, Pọl kwuru na akụkụ ahụ́ ndị e nwere ike iche na ha adịghị mkpa nwere ihe ha na-arụ. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 12:12, 18, 21-23.) Ụfọdụ ndị kweere n’ozizi evolushọn kwuru na e nwere ihe ụfọdụ dị n’ahụ́ anyị na-abaghị uru. Ma, ihe ndị na-amụ gbasara ahụ́ mmadụ chọpụtara gosiri na ihe ndị e cheburu na ha abaghị uru n’ahụ́ mmadụ na-arụ ihe ndị dị mkpa. * Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị cheburu na mkpịsị ụkwụ nke obere abaghị uru. Ma, ndị sayensị achọpụtala na ọ na-eme ka ụkwụ sie anyị ike n’ala.

5 Ihe atụ ahụ Pọl mere gbasara akụkụ ahụ́ mmadụ gosiri na onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ bara uru. Setan chọrọ ka anyị chee na anyị abaghị uru. Ma, Jehova weere ndị ohu ya niile ka ndị “dị mkpa,” ma ndị anyị nwere ike iche na ha adịghị ike. (Job 4:18, 19) Otú a Jehova si were anyị kwesịrị ime ka obi dị anyị mma na anyị dị mkpa n’ọgbakọ anyị nakwa ná nzukọ Chineke zuru ụwa ọnụ. Ka e were ya na e nwetụla mgbe i nyeere onye agadi aka. O nwere ike ịbụ na ị kwụsịtụrụ, jide ya aka, jiri nwayọọ soro ya na-aga. O doro anya na aka ahụ i nyeere ya baara ya uru, meekwa ka obi dị gị ụtọ. Ọ bụrụ na anyị enyere ndị ọzọ aka, obi na-adị anyị ụtọ, anyị na-enwekwu ndidi, hụkwuo ụmụnna anyị n’anya, na-akpakwu àgwà ka Ndị Kraịst. (Efe. 4:15, 16) Jehova chọrọ ka anyị were ụmụnna anyị niile ka ndị bara uru, ma ndị anyị nwere ike iche na ha adịghị ike. Ọ bụrụ na anyị ewere ụmụnna anyị otú a, anyị agaghị atụ anya ka ha mee ihe ha na-agaghị emeli. Mmadụ niile nọ n’ọgbakọ ga-ahụkwu ibe ha n’anya.

6. Gịnị ka Pọl bu n’obi mgbe o kwuru gbasara “ndị na-adịghị ike” na “ndị siri ike”?

6 Mgbe Pọl na-edegara ndị Kọrịnt akwụkwọ ozi, o kwuru gbasara “ndị na-adịghị ike” n’ọgbakọ. Ihe mere o ji kwuo ya bụ na ụfọdụ ndị na-abụghị Ndị Kraịst na-ewere Ndị Kraịst ka ndị na-adịghị ike. O kwukwara na e nwere mgbe ụfọdụ yanwa na-adịghị ike. (1 Kọr. 1:26, 27; 2:3) Mgbe Pọl kwuru na e nwere “ndị siri ike,” ọ pụtaghị na e nwere Ndị Kraịst na-abaghị uru. (Rom 15:1) Kama, ihe ọ na-ekwu bụ na Ndị Kraịst ụkwụ siri ike n’ọgbakọ kwesịrị inwere ndị ụkwụ na-esibeghị ike ndidi.

ÀNYỊ KWESỊRỊ ỊGBANWE OTÚ ANYỊ SI WERE NDỊ ỌZỌ?

7. Anyị hụ nwanna e kwesịrị inyere aka, gịnị nwere ike ime ka o siere anyị ike inyere ya aka?

7 Ọ bụrụ na anyị enyere “onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya” aka, o gosiri na anyị na-eme ka Jehova. Obi ga-adịkwa Jehova ụtọ. (Ọma 41:1; Efe. 5:1) Ma, ọ bụghị mgbe niile ka ime otú ahụ na-adịrị anyị mfe. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na anyị nwere ike ịna-eche na nwanna kwesịrị ịna-egboro onwe ya mkpa ya. Anyị nwekwara ike ịna-agbara ya ọsọ n’ihi na anyị amaghị ihe anyị ga-agwa ya. Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Linda. * Mgbe di ya hapụrụ ya,  o kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ụmụnna na-agbara nwanna ha ọsọ ma ọ bụ ghara ime ihe ọ tụrụ anya na ezigbo enyi ga-eme, o nwere ike ime ka obi gbawaa ya. Ọ ga-achọ ka ụmụnna na-abịa eleta ya mgbe nsogbu bịaara ya.” Obi gbawara Eze Devid mgbe ndị enyi ya gbaara ya ọsọ.—Ọma 31:12.

8. Gịnị ga-enyere anyị aka imetere ụmụnna anyị ebere?

8 Anyị ga na-emetekwuru ụmụnna anyị ebere ma ọ bụrụ na anyị echeta na ọ bụ nsogbu ụwa mere ka ụfọdụ n’ime ha ghara ịdị ike. E nwere ndị na-arịa ọrịa, nwee ndị naanị ha bụ Ndịàmà Jehova n’ezinụlọ ha, nweekwa ndị nsogbu ndị ọzọ mere ka obi ghara izu ha ike. Ụdị nsogbu ahụ nwere ike ịbịara anyị otu ụbọchị. Mgbe ndị Izrel nọ n’Ijipt, ha bụ ndị ogbenye na ndị na-adịghị ike. Tupu ha abanye n’Ala Nkwa, Jehova gwara ha “akpọchila obi” ma ha hụ ụmụnne ha nọ ná nsogbu. Jehova chọrọ ka ha nyere ndị ogbenye na ndị na-adịghị ike aka.—Diut. 15:7, 11; Lev. 25:35-38.

9. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma anyị hụ nwanna nsogbu bịaara? Nye ihe atụ.

9 Anyị hụ ụmụnna nsogbu bịaara, anyị kwesịrị iji Akwụkwọ Nsọ na-akasi ha obi kama ịkatọwa ha ma ọ bụ mawa ha ikpe. (Job 33:6, 7; Mat. 7:1) Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na mmadụ merụrụ ezigbo ahụ́ n’ihe mberede okporo ụzọ, e buga ya ụlọ ọgwụ, ndị dọkịta hà ga-asị ka e bu ụzọ chọpụta ma ọ̀ bụ ya kpatara ihe mberede ahụ? Mbanụ. Ha ga-enyewe ya ọgwụ ozugbo. Otú ahụ ka anyị kwesịrị ime. Ọ bụrụ na anyị ahụ nwanna ike gwụrụ n’ihi nsogbu bịaara ya, ihe anyị kwesịrị ime ozugbo bụ iji Okwu Chineke nyere ya aka.—Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 5:14.

10. Olee ihe gosiri na ụfọdụ ndị anyị nwere ike iche na ha adịghị ike “bara ọgaranya n’okwukwe”?

10 Anyị nwere ike ịhụ nwanna, chee na ọ dịghị ike. Ma, ọ bụrụ na anyị echebara otú ihe si dịrị ya echiche, anyị nwere ike ịghọta na ọ dị ike. Chegodị banyere ụmụnna nwaanyị na-edi nsogbu ndị ezinụlọ ha na-enye ha kemgbe ọtụtụ afọ. I lee ụfọdụ n’ime ha anya, i nwere ike iche na o nweghị ihe ha ga-emeli. Ma, ihe ndị ha na-eme gosiri na okwukwe ha siri ezigbo ike. Ọ bụrụ na ị hụ nwanna nwaanyị naanị ya na-azụ ụmụ ya ka ya na ụmụ ya na-abịa ọmụmụ ihe mgbe niile, ọ̀ bụ na okwukwe ya na otú o si jiri ofufe Jehova kpọrọ ihe anaghị eme gị obi ụtọ? E nwekwara ndị na-eto eto nọsiri ike n’ọgbakọ n’agbanyeghị ọnwụnwa ndị na-abịara ha n’ụlọ akwụkwọ. Ọ bụrụ na anyị echebara ihe ụmụnna ndị a na-eme echiche, anyị ga-aghọta na ha “bara ọgaranya n’okwukwe” n’agbanyeghị na o yiri ka ha adịghị ike.—Jems 2:5.

WERE ỤMỤNNA OTÚ JEHOVA SI WERE HA

11, 12. (a) Olee ihe ga-enyere anyị aka iwere ndị na-adịghị ike otú Jehova si were ha? (b) Olee ihe anyị ga-amụta n’ihe Jehova mere mgbe Erọn mejọrọ?

11 Ọ bụrụ na anyị eleba anya n’otú Jehova si mesoo ụfọdụ ndị ohu ya, ọ ga-eme ka anyị were ndị na-adịghị ike otú Jehova si were ha. (Gụọ Abụ Ọma 130:3.) Dị ka ihe atụ, ka e were ya na ị nọ mgbe Erọn na-akọrọ Mozis ihe na-enweghị isi na ọdụ mere o ji kpụọ nwa ehi ọlaedo. Olee otú ị gaara esi were Erọn? (Ọpụ. 32:21-24) Olee otú obi gaara adị gị mgbe ahụ Erọn gere Miriam ntị ma katọwa Mozis maka na ọ lụrụ onye na-abụghị onye Izrel? (Ọnụ Ọgụ. 12:1, 2) Gịnị ka ị gaara eme mgbe ahụ Erọn na Mozis na-asọpụrụghị Jehova, ya bụ, mgbe Jehova mere ka mmiri si n’okwute gbapụtara ụmụ Izrel?—Ọnụ Ọgụ. 20:10-13.

12 Jehova gaara ata Erọn ahụhụ ozugbo o mere ihe ndị a. Ma, ọ ma na Erọn abụghị onye ọjọọ n’agbanyeghị na e nwere  mgbe ụfọdụ o mere ihe gosiri na ọ dịghị ike. O yiri ka Erọn ò kwere ka nsogbu ndị ọzọ na-enye ya mee ka ọ ghara ime ihe ziri ezi. Ma, mgbe a gwara ya gbasara ihe o mere, o kwetara na ya mere ihe na-adịghị mma ma kwado ihe Jehova kpebiri. (Ọpụ. 32:26; Ọnụ Ọgụ. 12:11; 20:23-27) Jehova gbaghaara Erọn n’ihi na o nwere okwukwe, gosikwa na ihe o mere wutere ya. Ọ bụ ya mere na mgbe ọtụtụ afọ gara, otu ọbụ abụ chetara otú Erọn na ezinụlọ ya si jiri obi ha niile jeere Jehova ozi.—Ọma 115:10-12; 135:19, 20.

13. Gịnị ka anyị kwesịrị ichebara echiche ma mmadụ mejọọ ihe?

13 Anyị kwesịrị ichebara otú anyị si were ndị na-adịghị ike echiche n’ihi na ọ ga-eme ka anyị were ha otú Jehova si were ha. (1 Sam. 16:7) Dị ka ihe atụ, gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na onye na-eto eto ezuzuo nzuzu n’ihe gbasara ntụrụndụ ma ọ bụ mee ihe gosiri na o jighị ihe kpọrọ ihe? Echela ozugbo na ọ bụ onye ọjọọ. Kama ime otú ahụ, ọ́ gaghị adị mma ka i chee otú ị ga-esi nyere ya aka? Kụziere ya otú ọ ga-esi na-ekpebi ihe ndị dị mma ọ ga-eme. Ọ bụrụ na anyị ana-enyere ụmụnna anyị aka otú a, ọ ga-eme ka anyị na-enwekwuru ha ndidi ma hụkwuo ha n’anya.

14, 15. (a) Olee otú obi dị Jehova mgbe ọ chọpụtara na ụjọ ji Ịlaịja? (b) Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’otú Jehova si nyere Ịlaịja aka?

14 Ọ bụrụ na anyị ejiri otú anyị si were ndị ọzọ tụnyere otú Jehova si mesoo ụfọdụ ndị ohu ya obi na-adịghị mma, ọ ga-eme ka anyị matakwuo otú anyị kwesịrị isi were ndị ọzọ. Ka anyị were Ịlaịja dị ka ihe atụ. Ọ katara obi maa narị ndị amụma Bel anọ na iri ise aka. Ma, mgbe ọ nụrụ na Jezibel nwunye eze chọrọ igbu ya, ụjọ bịara ya, ya ejiri ụkwụ gaa otu narị kilomita na iri ise ruo  Bia-shiba. O sikwa ebe ahụ banye n’ime ime ala ịkpa. Ije niile ọ gara na anwụ niile chara ya mere ka ike gwụ ya, ya agaa nọrọ ọdụ n’okpuru otu osisi ma rịọ Jehova ka “ya nwụọ.”—1 Eze 18:19; 19:1-4.

Jehova ghọtara ihe ya na Ịlaịja na-alụ ma dunye otu mmụọ ozi ka ọ gaa nyere ya aka (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14 na nke 15)

15 Olee otú obi dị Jehova mgbe o si n’eluigwe ledata anya ma hụ na ike ụwa agwụla onye amụma ya kwesịrị ntụkwasị obi? Jehova ọ̀ hapụrụ ya maka na ụjọ ji ya n’oge ahụ? Mbanụ. Jehova ghọtara ihe ya na Ịlaịja na-alụ ma dunye otu mmụọ ozi ka ọ gaa nyere ya aka. Mmụọ ozi ahụ nyere Ịlaịja nri ugboro abụọ ka o nweta ume ọ ga-eji garuo ebe ọ na-aga. (Gụọ 1 Ndị Eze 19:5-8.) Tupu Jehova agwa Ịlaịja ihe ọ ga-eme, o gere ya ntị ma nyere ya aka.

16, 17. Olee otú anyị nwere ike isi nyere ụmụnna anyị aka otú ahụ Jehova si meere Ịlaịja?

16 Olee otú anyị nwere ike isi nyere nwanna aka otú ahụ Jehova si nyere Ịlaịja? Nwanna nwee nsogbu, anyị ekwesịghị iji ọsọ gwawa ya ihe ọ ga-eme. (Ilu 18:13) Ọ bụrụ na obi adịghị ya mma ma ọ bụ na o chere na ya abaghị uru, anyị kwesịrị ibu ụzọ gee ya ntị ma mee ka ọ ghọta na ihe gbasara ya na-emetụ anyị n’obi. (1 Kọr. 12:23) Ọ bụ mgbe ahụ ka anyị ga-ama ihe bụ́ mkpa ya ma nwee ike inyere ya aka.

17 Ná mmalite isiokwu a, anyị kwuru gbasara otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Linda. Mgbe di ya hapụrụ ya na ụmụ ha nwaanyị abụọ, ọ dị ha ka hà bụ ndị a jụrụ ajụ. Olee otú ụmụnna ụfọdụ si nyere ha aka? O kwuru, sị: “Mgbe anyị kpọrọ ha n’ekwentị gwa ha ihe merenụ, tupu nkeji iri anọ na ise agafee, ha erutela n’ụlọ anyị. Anya mmiri gbara ha. Ha ahapụghị anyị ka naanị anyị nọrọ. Ha nọnyeere anyị ruo abalị abụọ ma ọ bụ abalị atọ. O nwere mgbe o ruru, ha akpọrọ anyị ka anyị biri n’ụlọ ha n’ihi na obi adịghị anyị mma, afọ machikwara anyị.” Ihe a nwere ike ime ka i cheta ihe Jems kwuru. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwaanyị gba ọtọ, n’enweghịkwa ihe oriri ga-ezuru ya n’ụbọchị, ma otu onye n’ime unu asị ya: ‘Laa n’udo, nyaa ọkụ, rijuokwa afọ,’ ma unu enyeghị ya ihe na-akpa ahụ́ ya, olee uru ọ bara? Otú ahụkwa, ọ bụrụ na okwukwe enweghị ọrụ, ọ nwụrụ anwụ.” (Jems 2:15-17) Otú ahụ ụmụnna si gbatara ha ọsọ enyemaka ozugbo baara ha ezigbo uru. Naanị ọnwa isii ihe a mechara, ha sụrụ ụzọ inyeaka.—2 Kọr. 12:10.

Ọ GA-ABARA ỌTỤTỤ NDỊ URU

18, 19. (a) Olee otú anyị nwere ike isi nyere ndị na-adịghị ike aka? (b) Ọ bụrụ na anyị enyere ndị na-adịghị ike aka, olee ndị ọ ga-abara uru?

18 O nwere ike ịbụ na ị chọpụtala na ọ bụrụ na mmadụ arịatee ọrịa aka, o nwere ike iwe oge tupu onye ahụ agbakee. Otú ahụ ka ọ na-adị ma ọ bụrụ na nwanna emejọọ ihe ma ọ bụkwanụ na nsogbu bịaara ya. O nwere ike iwe oge tupu ya enweta onwe ya. Ọ bụ eziokwu na o kwesịrị ịna-amụ Baịbụl, na-ekpe ekpere, na-agakwa ọmụmụ ihe ka okwukwe ya sie ike, anyị kwesịrị ịna-enyere ya aka. N’oge ahụ ọ na-agbalị ka o nweta onwe ya, anyị kwesịrị inwere ya ndidi. Anyị kwesịkwara ịna-egosi ya na anyị hụrụ ya n’anya nakwa na ọ dị mkpa n’ọgbakọ.—2 Kọr. 8:8.

19 Anyị kwesịrị ịna-echeta na ọ bụrụ na anyị ana-enyere ụmụnna anyị aka, anyị ga-enwe obi ụtọ na-enweghị atụ. Ọ ga-emekwa ka anyị na-emetere ndị ọzọ ebere, na-enwekwara ha ndidi. Ma, ọ bụghị naanị anyị ka ọ na-abara uru. Ọ na-abara ọgbakọ uru n’ihi na ndị niile nọ na ya ga-ahụkwu ibe ha n’anya. Nke ka nke bụ na ọ bụrụ na anyị ana-enyere “ndị na-adịghị ike” aka, anyị na-egosi na anyị na-eme ka Jehova, bụ́ Nna anyị hụrụ anyị n’anya. O weere mmadụ niile ka ndị dị mkpa.—Ọrụ 20:35.

^ para. 4 N’otu akwụkwọ otu nwoke aha ya bụ Charles Darwin dere, o kwuru na e nwere ọtụtụ ihe na-abaghị uru n’ahụ́ mmadụ.

^ para. 7 Aha a kpọrọ ya abụghị ezigbo aha ya.