MGBE ndị Izrel hapụrụ Babịlọn lawa Jeruselem n’afọ 537 Tupu Oge Ndị Kraịst, Jehova chọrọ ka ije ha gaa siriri werere. Ọ bụ ya mere o ji gwa ha, sị: “Wepụnụ ihe nọchiiri ndị m ụzọ. Wụọnụ ájá n’ụzọ, wụọnụ ájá n’okporo ụzọ. Wepụsịanụ nkume dị na ya.” (Aịza. 62:10) Olee otú ha si mee ihe a Jehova gwara ha? O nwere ike ịbụ na ụfọdụ n’ime ha bu ụzọ gaa kpochie olulu ndị dị n’ụzọ ma ọ bụ mezie ebe ndị mebiri emebi. O doro anya na ihe a ha mere baara ndị Izrel ndị ọzọ uru mgbe ha na-ala Jeruselem.

Anyị nwere ike iji ihe a ha mere tụnyere ụzọ dị iche iche anyị nwere ike isi jekwuoro Jehova ozi. Jehova achọghị ka ihe ọ bụla nọchiere anyị ụzọ. Baịbụl gwara anyị, sị: “Mee ka ụzọ nke ụkwụ gị na-aga dị larịị, ka e meekwa ka ụzọ gị niile guzosie ike.” (Ilu 4:26) Ọ ga-abara anyị niile uru ma anyị mee ihe a Baịbụl kwuru.

KPEBIE IME IHE DỊ MMA

O nwere ike ịbụ na ị nụtụla ebe mmadụ kwuru banyere nwa okorobịa ma ọ bụ nwa agbọghọ, sị: ‘Onye a ga-abụ onye e ji eje mba’ ma ọ bụ ‘Onye a ga-abụ ebe a nọ.’ Ahụ́ gbasiri ọtụtụ ndị na-eto eto ike. Ụbụrụ na-aghọ ha nkọ. Ha na-achọkwa ime ihe ndị ga-abara ha uru. Baịbụl kwuru eziokwu mgbe ọ sịrị: “Ịma mma nke ụmụ okorobịa bụ ike ha.” (Ilu 20:29) Ọ bụrụ na onye na-eto eto ejiri amamihe ya na ike ya na-ejere Jehova ozi, ọ ga-enwe ezigbo obi ụtọ.

Taa, ụfọdụ ndị ụwa anaghị eji amamihe ndị na-eto eto egwu egwu. Ọ bụrụ na Onyeàmà Jehova na-eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ, onye nkụzi ya ma ọ bụ ụmụ akwụkwọ ibe ya nwere ike ịna-agwa ya ka ọ gaa mahadum ka o nwee ike bụrụ ọgaranya n’ụwa ochie a. E nwee nwanna ụkwụ na-aghọ nkọ n’ịgba bọl ma ọ bụ n’ịgba ọsọ, ndị mmadụ nwere ike ịgwa ya ka ọ gbalịa jiri ya mere aka ọrụ.  À gwatụla gịnwa ma ọ bụ onye ị ma ụdị ihe a? Gịnị ga-enyere Onye Kraịst aka ikpebi ime ihe dị mma?

Ihe Baịbụl kwuru nwere ike inyere mmadụ aka ime ihe o kwesịrị ime ka ihe gaziere ya n’ozi Jehova. Ekliziastis 12:1 kwuru, sị: “Cheta Onye Okike Ukwu gị n’oge ị bụ okorobịa.” Olee otú gịnwa ma ọ bụ onye na-eto eto nwere ike isi cheta Jehova?

Chegodị banyere otu nwa okorobịa bi n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Afrịka. Aha ya bụ Eric. * Ịgba bọl na-atọ ya ụtọ. Mgbe ọ dị afọ iri na ise, ọ gbawarala obodo ya bọl. Ọ pụtara na ọ gaghị adị anya ya agaa ala Bekee ka a kụzikwuoro ya otú e si agba bọl. O nweziri ike ime ka o jiri ịgba bọl mere aka ọrụ. Gịnị ka ọ ga-eme ka o nwee ike ‘icheta Onye Okike Ukwu ya’? Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe Eric mere?

Mgbe Eric nọ n’ụlọ akwụkwọ, ya na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl. Ọ mụtara na Chineke ga-akwụsị nsogbu niile ụmụ mmadụ na-enwe. N’ihi ya, ọ ghọtara na ime uche Chineke dị mkpa karịa ịgba bọl. E mere ya baptizim, ya ejirizie oge ya na ike ya na-ejere Jehova ozi. O mechara ghọọ ohu na-eje ozi ma na-enyere ọgbakọ aka. Kama ịgbawa mbọ ka o jiri ịgba bọl mere aka ọrụ, ọ gara Ụlọ Akwụkwọ Ọmụmụ Baịbụl Maka Ụmụnna Na-alụbeghị Nwaanyị.

A sị na Eric ji ịgba bọl mere aka ọrụ, o nwere ike inwe ezigbo ego, bụrụkwa onye a ma ama. Ma, ọ ghọtara na ihe Ilu 18:11 kwuru bụ eziokwu. Ebe ahụ sịrị: “Ihe dị oké ọnụ ahịa nke ọgaranya bụ obodo ya siri ike, ha dịkwa ka mgbidi nchebe n’echiche ya.” Ego nwere ike imegharị mmadụ anya. Ọ naghị eme ka obi ruo mmadụ ala. Kama, ndị chọrọ ịbụ ọgaranya ‘na-eji ọtụtụ ihe mgbu maa onwe ha aghara aghara dị ka mma.’—1 Tim. 6:9, 10.

Ọtụtụ ndị na-eto eto abanyela n’ozi oge niile. N’ihi ya, obi na-adị ha ezigbo ụtọ, na-erukwa ha ala. Eric kwuru, sị: ‘Esorola m n’ọtụtụ ndị ji oge ha niile na-ejere Jehova ozi. E nwere ike ikwu na ọ bụ ha bụzi òtù egwuregwu nke m. O nweghị ihe m ga-eji tụnyere ya. Ana m ekele Jehova maka na o mere ka m mata otú obi ga-esi na-adị m ụtọ, ihe ana-agazikwara m.’

Gịnwa kwanụ? Kama ịchọwa otú ị ga-esi bụrụ onye a ma ama n’ụwa a, ọ́ gaghị aka mma ka ị bụrụ ọsụ ụzọ oge niile, si otú ahụ ‘mee ka ụzọ gị dị larịị’ n’anya Jehova?—Gụọ igbe bụ́ ‘ M Ritere Uru M Na-agaraghị Erite na Mahadum.’

WEPỤ IHE Ọ BỤLA NỌCHIIRI GỊ ỤZỌ

Mgbe otu nwanna na nwunye ya gara alaka ụlọ ọrụ anyị dị n’Amerịka, ha hụrụ otú obi si dị ndị na-eje ozi na Betel ụtọ. Nwunye nwanna ahụ mechara dee, sị: “Mere nke a mere nke ọzọ anaghị ekwe anyị mara ihe anyị kwesịrị ime.” N’ihi ya, ha kpebiri iji oge ha na ike ha jekwuoro Jehova ozi.

Ná mmalite, ọ dịghịrị ha mfe ịhapụ ihe ndị na-eri ha oge. Ma, otu ụbọchị ha gụchara ihe mmụta dịịrị ụbọchị, ha chebaara ihe ha gụrụ echiche. Ihe mmụta dịịrị ụbọchị ahụ si na Jọn 8:31, bụ́ ebe Jizọs sịrị: “Ọ bụrụ na unu anọgide n’okwu m, unu bụ n’ezie ndị na-eso ụzọ m.” N’ihi ya, ha malitere iche, sị: “Mbọ ọ bụla anyị gbara ka anyị nwee ike wepụta oge jekwuoro Chineke ozi agaghị efu ọhịa.” Ha rere nnukwu ụlọ ha, hapụ ihe ndị ọzọ na-eri ha oge ma kwaga n’ebe e nwere ọgbakọ chọrọ enyemaka. Ha bụ ndị ọsụ ụzọ ugbu a. Ha na-eso arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze, na-ewepụtakwa onwe ha arụ ọrụ ná mgbakọ distrikti. Olee otú obi dị ha? Ha kwuru, sị: “Ugbu a anyị hapụrụ ihe ndị na-eri anyị oge, ụdị obi ụtọ anyị nwere enweghị atụ n’ihi na anyị mere ihe nzukọ Jehova na-agwa anyị mee.”

NỌSIE IKE N’ỤZỌ NKE NDỤ

Sọlọmọn dere, sị: “Anya gị abụọ kwesịrị ilegide n’ihu, ee, anya gị nke na-enwu gbaa kwesịrị ilegide n’ihu gị.” (Ilu 4:25) Onye na-anya ụgbọala ekwesịghị ikwe ka ihe ọ bụla megharịa ya anya. O kwesịrị ịna-ele anya n’ihu. Ọ bụ otú ahụ ka anyị kwesịrị ịna-agba mbọ ka ihe ọ bụla ghara imegharị anyị anya, mee ka anyị ghara ikpebi otú anyị ga-esi jekwuoro Jehova ozi ma gbalịa mee ya.

Olee ụzọ ụfọdụ i nwere ike isi jekwuoro Jehova ozi? I nwere ike ịbanye n’ozi oge niile. I nwekwara ike ịkwaga n’ebe e nwere ọgbakọ ókèala ya buru ibu ma ndị nkwusa nọ na ya adịrị ole na ole. Ọgbakọ ụfọdụ nwere ọtụtụ ndị nkwusa  ma ndị okenye ha na ndị ohu na-eje ozi adịrị ole na ole. Ọ bụrụ na ị bụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi, i nwere ike ịga nyere ha aka. I nwere ike ịjụ onye nlekọta sekit unu ma è nwere ụdị ọgbakọ ahụ na sekit unu. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịga jewe ozi n’ebe dị anya, i nwere ike ịgba mbọ chọpụta gbasara ọgbakọ ndị e kwesịrị inyere aka n’ebe ahụ. *

Ka anyị gaghachi n’ihe ahụ e kwuru n’Aịzaya 62:10. O nwere ike ịbụ na ụfọdụ ndị Juu rụsiri ọrụ ike ka ha wepụ ihe ndị nọchiri ụzọ ka ndị Chineke nwee ike ịlaghachi Jeruselem. Ọ bụrụ na ị na-agba mbọ ka i jekwuoro Jehova ozi, ike agwụla gị. Jehova ga-enyere gị aka ka i mee ihe ndị i kpebiri ime. Ka ị na-agba mbọ iwepụ ihe ndị nọchiiri gị ụzọ, na-arịọ ya ka o nye gị amamihe. Ị ga-emecha hụ otú Chineke ga-esi nyere gị aka ka ‘ụzọ gị dị larịị.’—Ilu 4:26.

^ para. 8 Aha a kpọrọ ya abụghị ezigbo aha ya.

^ para. 18 Gụọ akwụkwọ bụ́ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova, peeji nke 111 ruo 112.