Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Jun 2014

“Hụ Onye Agbata Obi Gị n’Anya Dị Ka Onwe Gị”

“Hụ Onye Agbata Obi Gị n’Anya Dị Ka Onwe Gị”

“Nke abụọ, nke dị ka ya, bụ, ‘Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.’”—MAT. 22:39.

1, 2. (a) Olee iwu Jizọs kwuru na ọ bụ ya bụ iwu nke abụọ kachanụ? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle n’isiokwu a?

MGBE otu onye Farisii chọrọ ịnwa Jizọs ọnwụnwa, ọ jụrụ Jizọs, sị: “Onye Ozizi, olee iwu kasị ukwuu n’ime Iwu ahụ?” Jizọs zara ya, sị: “Jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.” Jizọs kwuru na ọ bụ iwu a bụ “iwu kasị ukwuu, bụrụkwa nke mbụ.” N’isiokwu bu nke a ụzọ, anyị lebara anya n’ihe ihe a Jizọs kwuru pụtara. Jizọs gwakwara nwoke ahụ, sị: “Nke abụọ, nke dị ka ya, bụ, ‘Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.’”—Mat. 22:34-39.

2 Jizọs kwuru na anyị kwesịrị ịhụ ndị agbata obi anyị n’anya otú ahụ anyị hụrụ onwe anyị. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: Ònye bụ onye agbata obi anyị? Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị hụrụ onye agbata obi anyị n’anya?

ÒNYE BỤ ONYE AGBATA OBI ANYỊ?

3, 4. (a) Olee ihe atụ Jizọs mere mgbe otu nwoke jụrụ ya, sị: “Ònye n’ezie bụ onye agbata obi m”? (b) Mgbe ndị ohi jidere otu onye Juu, nara ya ihe niile o ji, kụọ ya ihe ma hapụ ya ọdị ndụ ọnwụ ka mma, olee otú onye Sameria si nyere ya aka? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

3 Anyị nwere ike iche na onye agbata obi anyị bụ onye bi anyị nso. (Ilu 27:10) Ma, chegodị ihe Jizọs kwuru mgbe otu nwoke nke chọrọ igosi na ya bụ onye ezi omume jụrụ ya, sị: “Ònye n’ezie bụ  onye agbata obi m?” Otú Jizọs si zaa ya ajụjụ ahụ bụ ịkọrọ ya gbasara onye Sameria bụ́ ezigbo onye agbata obi. (Gụọ Luk 10:29-37.) Jizọs kwuru na ndị ohi jidere otu onye Juu, nara ya ihe niile o ji, kụọ ya ihe ma hapụ ya ọdị ndụ ọnwụ ka mma. Mmadụ nwere ike iche na ọ bụ onye nchụàjà na onye Livaị bụ́ ndị Juu ibe ya ga-enyere ya aka. Ma, mgbe ha hụrụ ya, ha leghaara ya anya kama inyere ya aka. Ọ bụ onye Sameria nyeere nwoke ahụ aka. N’oge ahụ, ndị Sameria anaghị eji Iwu Mozis egwu egwu, ma ha na ndị Juu anaghị emekọ ihe.—Jọn 4:9.

4 Onye Sameria ahụ wụsara ọnyá nwoke ahụ mmanụ na mmanya ka o nwee ike ịla. Ọ kpọgara ya n’ụlọ ndị njem ma nye onye na-elekọta ebe ahụ mkpụrụ ego dinarịọs abụọ. Ego ahụ bụ ego a na-akwụ mmadụ ma ọ rụọ ọrụ ụbọchị abụọ. (Mat. 20:2) Otú onye Sameria ahụ si nyere onye Juu ahụ aka gosiri na ọ bụ ya bụ ezigbo onye agbata obi ya. Ihe atụ a Jizọs mere na-akụziri anyị na anyị kwesịrị ịhụ ndị agbata obi anyị n’anya ma na-emetere ha ebere.

Ndịàmà Jehova anaghị egbu oge enyere ndị ọzọ aka (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5)

5. Olee otú Ndịàmà Jehova si gosi na ha hụrụ ndị agbata obi ha n’anya mgbe oké ifufe kpara mkpamkpa na Niu Yọk Siti n’afọ 2012?

5 Ọ na-esi ike ịhụ ndị nwere obi ebere ka onye Sameria ahụ. Ọ kadị njọ ‘n’oge ikpeazụ a’ dị oké egwu n’ihi na ọtụtụ ndị enweghị obi mmadụ, ha na-eme ihe ike, ha adịghịkwa ahụ ezi ihe n’anya. (2 Tim. 3:1-3) Dị ka ihe atụ, ihe nwere ike isiri ndị mmadụ ezigbo ike ma e nwee ọdachi. Ka anyị tụlee ihe mere mgbe oké ifufe kpara mkpamkpa na Niu Yọk Siti n’ọnwa iri n’afọ 2012. N’otu ebe ifufe ahụ kacha mebie ihe n’obodo ahụ, a ka nọ na-ekwu na ndị mmadụ na-ata ahụhụ n’ihi na ha enweghị ọkụ eletrik na ihe ndị ọzọ e ji enyere ndụ aka, ndị ohi agaa na-ebukọrọ ngwongwo ha. N’otu ebe ahụ, Ndịàmà Jehova haziri otú ha ga-esi nyere ma ụmụnna ha ma ndị ọzọ aka. Ihe mere Ndị Kraịst ji eme otú ahụ bụ na ha hụrụ ndị agbata obi ha n’anya. Olee ụzọ ndị ọzọ anyị nwere ike isi gosi na anyị hụrụ ndị agbata obi anyị n’anya?

OTÚ ANYỊ GA-ESI GOSI NA ANYỊ HỤRỤ ONYE AGBATA OBI ANYỊ N’ANYA

6. Olee otú anyị ga-esi jiri Baịbụl nyere ndị agbata obi anyị aka?

6 Jiri Baịbụl nyere ndị mmadụ aka. Otú anyị ga-esi eme ya bụ iji ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ na-akasi ha obi. (Rom 15:4) Ọ bụrụ na anyị na-akọrọ ndị agbata obi anyị ihe Baịbụl kwuru ma anyị gaa ozi ọma, o gosiri na anyị hụrụ ha n’anya. (Mat. 24:14) Baịbụl kwuru na Chineke bụ “onye na-enye olileanya.” Ozi ọma anyị na-ekwusa banyere Alaeze ya bụ ezigbo ihe ùgwù.—Rom 15:13.

7. Olee àgwà ọma Jizọs kụziri? Gịnị ga-eme ma anyị na-akpa àgwà ọma ahụ?

7 Na-akpa àgwà ọma Jizọs kụziri. Mgbe Jizọs na-akụzi ihe n’elu ugwu, o kwuru àgwà ọma anyị kwesịrị ịna-akpa. Ọ sịrị: “Ihe niile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ; n’eziokwu, nke a bụ ihe Iwu ahụ na ihe ndị amụma kụziri pụtara.” (Mat. 7:12) “Iwu” Jizọs kwuru okwu ya bụ ihe ndị e dere malite na Jenesis ruo Diuterọnọmi. “Ihe ndị amụma kụziri” abụrụ ihe ndị amụma dere n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe ahụ Jizọs kwuru, ọ pụtara na anyị na-eme ihe Chineke bu n’obi nye Iwu ahụ. Ihe ndị ahụ e dere n’Akwụkwọ Nsọ Hibru gosiri na Chineke na-agọzi ndị niile hụrụ ndị ọzọ n’anya. Dị ka ihe atụ, Jehova si n’ọnụ Aịzaya kwuo, sị: “Na-emenụ ihe ziri ezi, na-emekwanụ ezi omume . . . Obi ụtọ na-adịrị mmadụ efu nke na-eme ihe a.” (Aịza. 56:1, 2) Ọ bụrụ na anyị ahụ ndị agbata obi anyị n’anya ma na-akpa àgwà ọma ahụ Jizọs kụziri, obi ga-adị anyị ụtọ.

8. Olee ihe mere anyị kwesịrị iji hụ ndị iro anyị n’anya? Gịnị nwere ike ime ma anyị hụ ha n’anya?

8 Hụ ndị iro gị n’anya. Jizọs kwuru, sị: “Unu nụrụ na a sịrị, ‘Hụ onye agbata obi gị n’anya ma kpọọ onye iro gị asị.’ Otú ọ dị, ana m asị unu: Na-ahụnụ ndị iro unu n’anya, na-ekpekwanụ ekpere maka ndị na-akpagbu unu; ka unu wee bụrụ ụmụ nke Nna unu nọ n’eluigwe.” (Mat. 5:43-45) Pọl  onyeozi kwuru ụdị ihe ahụ mgbe o dere, sị: “Ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, nye ya nri; ọ bụrụ na akpịrị na-akpọ ya nkụ, nye ya mmiri ka ọ ṅụọ.” (Rom 12:20; Ilu 25:21) N’oge ochie, iwu Chineke nyere ndị Izrel kwuru na ha kwesịrị inyere ma ndị iro ha ma anụmanụ ndị iro ha aka. (Ọpụ. 23:5) Ọ bụrụ na e mee ihe a Chineke kwuru, ndị bụbu ndị iro nwere ike ịghọ ezigbo ndị enyi. Ndị Kraịst hụrụ ndị iro ha n’anya. Ọ bụ ya mere ọtụtụ ndị bụbu ndị iro anyị jirila gbanwee obi ha. Ọ bụrụ na anyị ahụ ma ndị iro anyị ma ndị na-emesi anyị ike n’anya, obi ga-adị anyị ụtọ ma ụfọdụ n’ime ha ghọọ ezigbo Ndị Kraịst.

9. Gịnị ka Jizọs gwara anyị mee ma anyị na nwanna anyị nwee nghọtahie?

9 Gbalịa ka gị na mmadụ niile dịrị n’udo. (Hib. 12:14) Ụmụnna anyị so ná ndị anyị na ha kwesịrị ịdị n’udo n’ihi na Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụrụ na i ji onyinye gị gaa n’ebe ịchụàjà, i wee nọrọ n’ebe ahụ cheta na obi adịghị nwanne gị mma n’ebe ị nọ, hapụ onyinye gị n’ebe ahụ n’ihu ebe ịchụàjà gawa; buru ụzọ mee ka gị na nwanne gị dị n’udo, mgbe ị bịaghachikwara, nye onyinye gị.” (Mat. 5:23, 24) Ọ bụrụ na anyị na nwanna anyị enwee nghọtahie, anyị kwesịrị ịgba mbọ dozie ya ngwa ngwa. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, ọ ga-egosi na anyị hụrụ onye ahụ n’anya, Jehova ga-agọzikwa anyị.

10. Gịnị mere na anyị ekwesịghị ikpe ndị ọzọ ikpe?

10 Ekpela ndị ọzọ ikpe. Jizọs kwuru, sị: “Kwụsịnụ ikpe ikpe, ka a ghara ikpe unu ikpe; n’ihi na otú unu si ekpe ikpe ka a ga-esi kpee unu ikpe; ihe unu jikwa atụ̀ ihe ka ha ga-eji tụọrọ unu ihe. Gịnịzi mere i ji ele irighiri ahịhịa nke dị n’anya nwanna gị, ma i chebaraghị ntụhie dị n’anya nke gị echiche? Ma ọ bụ, olee otú ị pụrụ isi sị nwanna gị, ‘Chere ka m wepụ irighiri ahịhịa n’anya gị’; ma, lee! ntụhie dị n’anya nke gị? Onye ihu abụọ! Buru ụzọ wepụ ntụhie dị n’anya nke gị, mgbe ahụ ka ị ga-ahụ nke ọma otú ị ga-esi wepụ irighiri ahịhịa n’anya nwanna gị.” (Mat. 7:1-5) Ihe anyị kwesịrị ịmụta n’ihe a Jizọs kwuru bụ na anyị ekwesịghị ịna-ekpe ụmụnna anyị ikpe maka obere ihe ha mejọrọ ebe ọ bụ na nke anyị na-emejọ nwere ike ịka nke ha.

OTÚ KACHA MMA ANYỊ GA-ESI HỤ NDỊ AGBATA OBI ANYỊ N’ANYA

11, 12. Olee ụzọ dị mkpa anyị si egosi na anyị hụrụ ndị agbata obi anyị n’anya?

11 E nwere ọtụtụ ụzọ anyị nwere ike isi gosi na anyị hụrụ ndị agbata obi anyị  n’anya. Ma, Jizọs kụziiri anyị na ụzọ kacha mma anyị ga-esi eme ya bụ izi ha ozi ọma Alaeze Chineke. (Luk 8:1) Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.” (Mat. 28:19, 20) Anyị na-agba mbọ enyere ndị agbata obi anyị aka ka ha hapụ ụzọ ahụ dị obosara nke na-eduga ná mbibi ma bata n’ụzọ ahụ dị mkpagide nke na-eduga ná ndụ. Anyị si otú a egosi na anyị na-eme ihe ahụ Jizọs kwuru. (Mat. 7:13, 14) O doro anya na Jehova ga-agọzi anyị ma anyị mee otú ahụ.

12 Anyị na-eme ka Jizọs n’ihi na anyị na-enyere ndị mmadụ aka ka ha ghọta na ha kwesịrị ife Jehova. (Mat. 5:3) Anyị na-enyere ndị chọrọnụ aka ka ha bịa fewe Chineke. Otú anyị si eme ya bụ ịna-ezi ha “ozi ọma nke Chineke.” (Rom 1:1) Ọ bụrụ na ndị anyị ziri ozi ọma echegharịa, àjà ahụ Jizọs chụrụ ga-eme ka ha na Chineke dị ná mma. (2 Kọr. 5:18, 19) Ikwusa ozi ọma bụ otu ụzọ dị mkpa anyị si egosi na anyị hụrụ ndị agbata obi anyị n’anya.

13. Olee otú obi na-adị gị ma ị na-akụziri ndị ọzọ gbasara Jehova?

13 Tupu anyị agawa nletaghachi ma ọ bụ ịmụrụ mmadụ Baịbụl, anyị kwesịrị ịkwado nke ọma. Ọ bụrụ na anyị ana-eme otú ahụ, anyị ga-enwe ike ịkụziri ndị mmadụ otú ha ga-esi na-erubere Jehova isi. O nwere ike ime ka onye anyị na-amụrụ Baịbụl gbanwee ọtụtụ ihe n’otú o si ebi ndụ. (1 Kọr. 6:9-11) Obi na-adị anyị ụtọ ma anyị hụ otú Chineke si enyere ndị chọrọ “inweta ndụ ebighị ebi” aka ka ha gbanwee àgwà ọjọọ ha, ha na ya adịrịkwa ná mma. (Ọrụ 13:48) Ịmụ Baịbụl emeela ka ọtụtụ ndị ike ụwa gwụrụ na-enwezi obi ụtọ, meekwa ka ọtụtụ ndị kwụsị ichegbu onwe ha ma tụkwasị Jehova obi. Obi na-adị anyị ezigbo ụtọ ma anyị hụ ka ndị batara ọhụrụ n’ọgbakọ na-eme nke ọma. Ozi ọma Alaeze Chineke anyị na-ekwusa gosiri na anyị hụrụ ndị agbata obi anyị n’anya. Ọ bụkwa ezigbo ihe ùgwù.

OTÚ BAỊBỤL SI KỌWAA IHE ỊHỤNANYA BỤ

14. Olee otú Pọl si kọwaa ịhụnanya ná 1 Ndị Kọrịnt 13:4-8?

14 Mgbe anyị na ndị agbata obi anyị na-emekọ ihe, ọ bụrụ na anyị emee ihe Pọl kwuru gbasara ịhụnanya, ọ ga-eme ka anyị gbaara ọtụtụ nsogbu ọsọ, mee ka anyị nwee obi ụtọ, meekwa ka Chineke gọzie anyị. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 13:4-8.) Ka anyị leba anya n’ihe ụfọdụ Pọl kwuru banyere ịhụnanya ma hụ otú anyị nwere ike isi mee ihe o kwuru mgbe anyị na ndị agbata obi anyị na-emekọ ihe.

15. (a) Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-enwere ndị ọzọ ndidi na obiọma? (b) Gịnị mere na anyị ekwesịghị inwe anyaụfụ ma ọ bụ na-etu ọnụ?

15 Baịbụl kwuru na “ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi na obiọma.” Ihe Chineke na-emere ụmụ mmadụ na-ezughị okè gosiri na ọ na-enwere ha ndidi na obiọma. N’ihi ya, mgbe ndị ọzọ mejọrọ ihe ma ọ bụ kwuo okwu ka ndị na-enweghị uche ma ọ bụkwanụ kparịa anyị, anyị kwesịrị inwere ha ndidi na obiọma. Ihe ọzọ bụ na “ịhụnanya adịghị ekwo ekworo.” Ụfọdụ ụmụnna nwere ihe ùgwù ma ọ bụ ihe ndị ọzọ anyị na-enweghị. Ma, ọ bụrụ na anyị hụrụ ha n’anya n’eziokwu, anyị agaghị enwere ha anyaụfụ. Anyị agaghịkwa eji ihe anyị nwere na-etu ọnụ ma ọ bụ na-akpara ndị ọzọ nganga. A sị ka e kwuwe, Baịbụl kwuru na “anya dị mpako na obi dị nganga, ya bụ, oriọna ndị ajọ omume, bụ mmehie.”—Ilu 21:4.

16, 17. Olee otú anyị nwere ike isi mee ihe e kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 13:5, 6?

16 Baịbụl kwukwara na ịhụnanya adịghị “akpa àgwà na-ekwesịghị ekwesị.” Ọ bụrụ na anyị hụrụ onye agbata obi anyị n’anya, anyị agaghị aghara ya ụgha, zuo ya ohi, ma ọ bụ mee ya ihe ọzọ Jehova kpọrọ asị. Ịhụnanya ga-emekwa ka anyị na-eme ihe ga-abara ndị ọzọ uru kama ime ihe ga-abara naanị anyị uru.—Fil. 2:4.

17 Ihe ọzọ bụ na a dịghị akpasu ịhụnanya iwe ngwa ngwa, ọ dịghịkwa “agụkọ ihe ọjọọ.” Anyị ekwesịghị ịna-agụkọ ugboro ole mmadụ mere anyị ihe ọjọọ, dị ka à ga-asị na  anyị na-edekọ ya n’akwụkwọ. (1 Tesa. 5:15) Ọ bụrụ na anyị eburu iwe n’obi, obi agaghị adị Jehova mma. Ọ ga-adị ka ànyị na-amụnye ọkụ nwere ike ire ma anyịnwa ma ndị ọzọ. (Lev. 19:18) Ịhụnanya na-eme ka anyị ‘soro eziokwu na-aṅụrị ọṅụ.’ Ma, ọ gaghị eme ka anyị ‘na-aṅụrị ọṅụ n’ihi ajọ omume,’ ọ bụrụgodị na a na-emegbu onye kpọrọ anyị asị ma ọ bụ na-emesi ya ike.—Gụọ Ilu 24:17, 18.

18. Gịnị na gịnị ka 1 Ndị Kọrịnt 13:7, 8 kụziiri anyị gbasara ịhụnanya?

18 Ka anyị tụlee ihe ọzọ Pọl kwuru banyere ịhụnanya. O kwuru na ịhụnanya “na-edi ihe niile.” Ọ bụrụ na mmadụ emejọọ anyị ma rịọ anyị mgbaghara, ịhụnanya ga-eme ka anyị gbaghara ya. Ịhụnanya “na-ekwere ihe niile” dị n’Okwu Chineke. Ọ na-emekwa ka anyị na-ekele Jehova maka ihe ọ na-akụziri anyị. Ịhụnanya “na-enwe olileanya” na ihe niile Baịbụl kwuru ga-emezu. Ọ bụkwa ya na-eme ka anyị na-agwa ndị ọzọ ihe mere anyị ji nwee olileanya. (1 Pita 3:15) Ọ bụrụ na nsogbu abịara anyị, anyị ga na-ekpe ekpere, nweekwa olileanya na ihe ga-emecha dị mma. Ịhụnanya “na-atachi obi n’ihe niile.” Ọ bụ ya mere anyị ji atachi obi ọ bụrụgodị na mmadụ emee anyị ihe ọjọọ, na-akpagbu anyị ma ọ bụ si n’ụzọ ọzọ nwaa anyị ọnwụnwa. Baịbụl kwukwara na “ịhụnanya adịghị ada ada.” Ndị na-erubere Jehova isi ga-ahụ ndị agbata obi ha n’anya ruo mgbe ebighị ebi.

AKWỤSỊLA ỊHỤ NDỊ AGBATA OBI GỊ N’ANYA OTÚ Ị HỤRỤ ONWE GỊ

19, 20. Olee ihe Baịbụl kwuru nke kwesịrị ime ka anyị ghara ịkwụsị ịhụ ndị agbata obi anyị n’anya?

19 Ọ bụrụ na anyị na-eme ihe Baịbụl kwuru, anyị ga na-ahụ ndị agbata obi anyị n’anya. Anyị kwesịrị ịhụ mmadụ niile n’anya, ọ bụghị naanị ndị obodo anyị. Anyị kwesịkwara icheta na Jizọs kwuru, sị: “Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.” (Mat. 22:39) Ma Chineke ma Kraịst chọrọ ka anyị hụ ndị agbata obi anyị n’anya. E nwee ihe merenụ, ya abụrụ na anyị amaghị otú anyị ga-esi gosi onye agbata obi anyị na anyị hụrụ ya n’anya, anyị kwesịrị ikpe ekpere ka Chineke jiri mmụọ nsọ ya mee ka anyị mata ihe anyị ga-eme. Anyị mee otú ahụ, Jehova ga-agọzi anyị ma nyere anyị aka ka anyị na-eme ihe ziri ezi.—Rom 8:26, 27.

20 Iwu ahụ Jizọs nyere ka anyị hụ ndị agbata obi anyị n’anya otú anyị hụrụ onwe anyị dị ezigbo mkpa. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kpọọ ya “iwu nke eze nyere.” (Jems 2:8) Mgbe Pọl kwuchara gbasara ihe ụfọdụ e kwuru n’Iwu Mozis, o dere, sị: “Ihe ọ bụla ọzọ e nyere n’iwu ka a chịkọtara n’okwu a, ya bụ, ‘Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.’ Ịhụnanya adịghị eme onye agbata obi mmadụ ihe ọjọọ; ya mere, ịhụnanya bụ idebezu iwu ahụ.” (Rom 13:8-10) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịhụ ndị agbata obi anyị n’anya mgbe niile.

21, 22. Gịnị mere anyị kwesịrị iji hụ Chineke na ndị agbata obi anyị n’anya?

21 Ka anyị na-echebara ihe mere anyị kwesịrị iji hụ ndị agbata obi anyị n’anya echiche, anyị ekwesịghị ichefu ihe Jizọs kwuru. Ọ sịrị na Nna ya “na-eme ka anyanwụ ya waara ndị ọjọọ na ndị ọma, na-emekwa ka mmiri zooro ndị ezi omume na ndị ajọ omume.” (Mat. 5:43-45) Anyị kwesịrị igosi onye agbata obi anyị na anyị hụrụ ya n’anya, ma ọ̀ bụ onye ezi omume ma ọ̀ bụ onye ajọ omume. Dị ka anyị kwuburu, otu ụzọ dị mkpa anyị ga-esi gosi ya na anyị hụrụ ya n’anya bụ izi ya ozi ọma Alaeze Chineke. Ọ bụrụ na o mee ihe ọ mụtara na Baịbụl, ọ ga-abụ enyi Chineke ma na-enwe obi ụtọ.

22 E nwere ọtụtụ ihe kwesịrị ime ka anyị jiri obi anyị niile hụ Jehova n’anya. E nwekwara ọtụtụ ụzọ anyị nwere ike isi gosi onye agbata obi anyị na anyị hụrụ ya n’anya. Ọ bụrụ na anyị ahụ Chineke na ndị agbata obi anyị n’anya, anyị na-egosi na anyị na-erube isi n’iwu abụọ ahụ kacha mkpa Jizọs kwuru gbasara ha. Nke ka nke bụ na anyị ga-eme ka obi na-atọ Jehova bụ́ Nna anyị nke eluigwe ụtọ.