Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Jun 2014

“Hụ Jehova Bụ́ Chineke Gị n’Anya”

“Hụ Jehova Bụ́ Chineke Gị n’Anya”

“Jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.”—MAT. 22:37.

1. Gịnị mere Chineke na Ọkpara ya ji hụkwuo ibe ha n’anya?

JIZỌS KRAỊST bụ́ Ọkpara Jehova kwuru, sị: “M hụrụ Nna m n’anya.” (Jọn 14:31) O kwukwara, sị: “Nna m hụrụ Ọkpara ya n’anya nke ukwuu.” (Jọn 5:20) Ihe a o kwuru ekwesịghị iju anyị anya. Tupu ya abịa n’ụwa, ọ bụ “onye ọkà ọrụ” Chineke ruo ọtụtụ ijeri afọ. (Ilu 8:30) Otú ya na Jehova si rụkọọ ọrụ n’oge ahụ mere ka ọ mụta ọtụtụ ihe gbasara àgwà Nna ya, meekwa ka ha hụkwuo ibe ha n’anya.

2. (a) Gịnị ka ịhụ mmadụ n’anya pụtara? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza n’isiokwu a?

2 Ọ bụrụ na ị hụrụ mmadụ n’anya, onye ahụ ga-adị gị n’obi. Devid bụrụ abụ, sị: “M ga-ahụ gị n’anya nke ukwuu, Jehova bụ́ ike m.” (Ọma 18:1) Anyịnwa kwesịkwara ịhụ Chineke n’anya n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya. Ọ bụrụ na anyị ana-erubere Jehova isi, ọ ga-egosi anyị na ya hụrụ anyị n’anya. (Gụọ Diuterọnọmi 7:12, 13.) Ma, ànyị ga-ahụli Jehova n’anya ebe ọ bụ na anyị anaghị ahụ ya anya? Gịnị ka ịhụ Jehova n’anya pụtara? Gịnị mere anyị kwesịrị iji hụ ya n’anya? Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị hụrụ Jehova n’anya?

ANYỊ GA-AHỤLI CHINEKE N’ANYA

3, 4. Gịnị mere o ji bụrụ na ụmụ mmadụ ga-ahụli Jehova n’anya?

3 “Chineke bụ Mmụọ.” N’ihi ya, anyị enweghị ike ịhụ ya anya.  (Jọn 4:24) Ma, anyị ga-ahụli ya n’anya. Baịbụl nyekwara anyị iwu ka anyị hụ ya n’anya. Dị ka ihe atụ, Mozis gwara ụmụ Izrel, sị: “Jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na ike gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.”—Diut. 6:5.

4 Gịnị mere o ji bụrụ na ụmụ mmadụ ga-ahụli Chineke n’anya? Ọ bụ n’ihi na Chineke kere anyị ka anyị nwee ike ife ya, nweekwa ike ịhụ ya na mmadụ ibe anyị n’anya. Ọ bụrụ na anyị amata onye Jehova bụ, anyị ga-ahụkwu ya n’anya, obi adịkwa anyị ụtọ. Jizọs kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha, n’ihi na alaeze eluigwe bụ nke ha.” (Mat. 5:3) Otu nwoke aha ya bụ Morrison kwuru n’otu akwụkwọ o dere na ọ na-atụ ya n’anya na kemgbe ụwa, ụmụ mmadụ na-achọ Chineke, na-achọkwa ikwere na ya. Ọtụtụ ndị ekwuola ụdị ihe a nwoke a kwuru. Ha ghọtara na ịchọ ịmata Chineke dị ndị mmadụ n’ọbara.

5. Olee otú anyị si mara na mbọ anyị na-agba ịchọ Chineke agaghị efu ọhịa?

5 Mbọ anyị na-agba ịchọ Chineke ọ̀ ga-efu ọhịa? Mbanụ. Chineke chọrọ ka anyị chọta ya. Pọl onyeozi mere ka ihe a doo anya n’okwu ọ gwara ndị gbakọtara n’Ariopagọs, nke dị nso n’ụlọ nsọ chi nwaanyị ndị Atens a na-akpọ Atena. Weregodị ya na ị nọ n’ebe ahụ mgbe Pọl na-agwa ha gbasara “Chineke nke kere ụwa na ihe niile dị n’ime ya” ma kwuo na “ọ dịghị ebi n’ụlọ nsọ ndị e ji aka wuo.” O kwuziri na Chineke “sitekwara n’otu mmadụ mee mba ọ bụla nke ụmụ mmadụ, ka ha biri n’elu ala dum, o kpebikwara oge dị iche iche a kara aka, kpaakwara ebe obibi nke ụmụ mmadụ ókè, ka ha wee chọọ Chineke, ka ha wee sọọ ìsì ma chọta ya n’ezie, ọ bụ ezie na ọ nọghị n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ.” (Ọrụ 17:24-27) O doro anya na ndị mmadụ ga-achọtali Chineke. Ihe karịrị nde Ndịàmà Jehova asaa na ọkara ‘achọtala ya.’ Ha hụkwara ya n’anya n’eziokwu.

IHE ỊHỤ JEHOVA N’ANYA PỤTARA

6. Gịnị ka Jizọs kwuru na ọ bụ ya bụ “iwu kasị ukwuu, bụrụkwa nke mbụ”?

6 Anyị ekwesịghị ikwu naanị n’ọnụ na anyị hụrụ Jehova n’anya. O kwesịrị isi anyị n’obi. Mgbe otu onye Farisii jụrụ Jizọs, sị: “Onye Ozizi, olee iwu kasị ukwuu n’ime Iwu ahụ?” Jizọs gwara ya hoo haa, sị: “‘Jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.’ Ọ bụ ya bụ iwu kasị ukwuu, bụrụkwa nke mbụ.”—Mat. 22:34-38.

7. (a) Gịnị ka iji ‘obi anyị dum’ hụ Chineke n’anya pụtara”? (b) Gịnị ka iji ‘mkpụrụ obi anyị dum’ hụ Chineke n’anya pụtara? (ch) Gịnị ka iji ‘uche anyị dum’ hụ Chineke n’anya pụtara?

7 Cheta na Jizọs kwuru na anyị ga-eji ‘obi anyị dum,’ ‘mkpụrụ obi anyị dum,’ na ‘uche anyị dum’ hụ Chineke n’anya. Gịnị ka ọ pụtara? ‘Obi anyị dum’ pụtara otú obi dị anyị na ihe ndị anyị chọrọ ime. ‘Mkpụrụ obi anyị dum’ pụtara ụdị onye anyị bụ na ihe niile anyị na-eme. ‘Uche anyị dum’ pụtara otú anyị si eche echiche na ihe anyị na-eche. Jizọs ji ihe a o kwuru gosi na anyị kwesịrị iji ihe niile anyị nwere hụ Jehova n’anya nakwa na ihe niile anyị na-eme kwesịrị igosi na anyị hụrụ ya n’anya.

8. Gịnị ka anyị ga na-eme ma ọ bụrụ na anyị hụrụ Chineke n’anya n’eziokwu?

8 Ọ bụrụ na anyị ji obi anyị dum, mkpụrụ obi anyị dum, na uche anyị dum hụ Chineke n’anya, anyị ga na-amụsi Baịbụl ike, na-eme ihe niile Chineke gwara anyị mee, na-agachikwa ozi ọma anya. (Mat. 24:14; Rom 12:1, 2) Ọ bụrụ na anyị emee ihe ndị a, anyị na Chineke ga-adịkwu ná mma. (Jems 4:8) O nweghị otú anyị ga-esi depụtachaa ihe niile mere anyị kwesịrị iji hụ Chineke n’anya. Ma, ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ha.

IHE MERE ANYỊ KWESỊRỊ IJI HỤ JEHOVA N’ANYA

9. Gịnị mere i ji hụ Jehova n’anya?

9 Ọ bụ Jehova kere anyị, na-egbokwara anyị mkpa anyị. Pọl kwuru, sị: “Ọ bụ  ya nyere anyị ndụ, meekwa ka anyị na-ejegharị, na-adị ndụ.” (Ọrụ 17:28) Jehova nyere anyị ụwa a mara ezigbo mma ka anyị biri. (Ọma 115:16) Ọ na-enyekwa anyị nri na ihe ndị ọzọ ga-eme ka anyị na-adị ndụ. Ọ bụ ya mere Pọl ji gwa ndị na-ekpere arụsị na Listra, sị: ‘Chineke dị ndụ ahapụghị onwe ya n’enweghị ihe àmà, ebe o mere ihe ọma, na-enye unu mmiri ozuzo site n’eluigwe, na oge mkpụrụ ji amị, na-enyekwa unu nri n’ụba, na-emekwa ka unu nwee obi ụtọ.’ (Ọrụ 14:15-17) Ebe ọ bụ na Onye kere anyị ji obiọma na-egboro anyị mkpa, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịhụ ya n’anya?—Ekli. 12:1.

10. Olee otú obi dị gị maka àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ?

10 Chineke ga-ewepụ mmehie na ọnwụ anyị ketara n’aka Adam. (Rom 5:12) Baịbụl kwuru, sị: “Chineke mere ka anyị mata ịhụnanya ya, n’ihi na, mgbe anyị ka bụ ndị mmehie, Kraịst nwụrụ n’ihi anyị.” (Rom 5:8) Ọ bụrụ na anyị emee mmehie, chegharịa n’eziokwu ma nwee okwukwe n’àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ, Chineke ga-agbaghara anyị. Anyị na-ekele Jehova maka na ọ hụrụ anyị n’anya ma zite Ọkpara ya ka ọ nwụọ n’ihi anyị.—Jọn 3:16.

11, 12. Olee otú Jehova si mee ka anyị nwee olileanya?

11 Jehova emeela ka anyị nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. (Rom 15:13) Olileanya a na-eme ka anyị ghara ịda mbà ma ọnwụnwa bịara anyị. Ọ bụrụ na Ndị Kraịst e tere mmanụ ‘ekwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ,’ ha ga-adị ndụ ebighị ebi n’eluigwe. (Mkpu. 2:10) Ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa. (Luk 23:43) Olee otú obi na-adị anyị ma anyị cheta olileanya anyị nwere? Ọ na-eme ka anyị nwee ọṅụ, obi eruo anyị ala, anyị ahụkwa Chineke n’anya n’ihi na ọ bụ ya na-enye anyị “ezi onyinye ọ bụla na onyinye ọ bụla zuru okè.”—Jems 1:17.

12 Jehova emeela ka obi sie anyị ike na ya ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ. (Ọrụ 24:15) O doro anya na obi na-agbawa anyị ma onye anyị hụrụ n’anya nwụọ. Ma, ‘anyị anaghị eru uju ka ndị na-enweghị olileanya’ n’ihi na Jehova kwere nkwa na ya ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ. (1 Tesa. 4:13) Jehova Chineke hụrụ ndị mmadụ n’anya. Ọ bụ ya mere o ji na-agụsi ya ike ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ, nke ka nke, ndị ji obi ha niile jeere ya ozi, otú ahụ Job mere. (Job 14:15) Chegodị otú obi ga-adị anyị mgbe a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ, ha ahụ ụmụ ha, ndị mụrụ ha, ma ọ bụ ndị enyi ha. Ọ bụ Jehova kwere nkwa na ya ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ. Ọ ga-emekwa ya. Anyị hụrụ Jehova n’anya maka olileanya a magburu onwe ya o mere ka anyị nwee.

13. Olee otú anyị si mara na ihe banyere anyị na-emetụ Chineke n’obi?

13 Ihe banyere anyị na-emetụ Jehova n’obi. (Gụọ Abụ Ọma 34:6, 18, 19; 1 Pita 5:6, 7.) Anyị ma na ezi Chineke anyị na-enyere ndị ji obi ha niile na-ejere ya ozi aka. N’ihi ya, obi na-eru anyị ala na anyị so ‘n’ìgwè atụrụ nke nọ n’ebe ịta nri ya.’ (Ọma 79:13) Ma, ihe Chineke ga-esi n’aka Ọkpara ya mee ga-egosi na ọ hụrụ anyị n’anya. Mgbe Jizọs Kraịst, bụ́ Eze Chineke họpụtara, ga-ewepụcha ime ihe ike, mmegbu, na ajọ omume n’ụwa, Chineke ga-eme ka ndị na-erubere ya isi nwee udo na ihe niile ga-eme ka ndụ na-atọ ha ụtọ. (Ọma 72:7, 12-14, 16) Ọ bụrụ na anyị echebara nkwa ndị a Chineke kwere anyị echiche, ọ ga-eme ka anyị jiri obi anyị dum, mkpụrụ obi anyị dum, na uche anyị dum hụ ya n’anya.—Luk 10:27.

14. Olee ihe ùgwù na-enweghị atụ Chineke mere ka anyị nwee?

14 Jehova emeela ka anyị bụrụ Ndịàmà ya. Ọ bụ ihe ùgwù na-enweghị atụ. (Aịza. 43:10-12) Anyị hụrụ Chineke n’anya n’ihi na o mere ka anyị na-akụziri ndị mmadu gbasara ya, na-akụzikwara ha ihe ndị ga-eme ka ha nwee olileanya n’agbanyeghị na ihe ọjọọ juru n’ụwa ugbu a. Gịnị mere obi ji esi anyị ike ịkụziri ndị mmadụ ihe ndị a? Ọ bụ n’ihi na ihe anyị na-akụziri ha bụ ihe Baịbụl kwuru. Ihe ọzọ abụrụ na nkwa Chineke kwere ga-emezurịrị. (Gụọ Jọshụa 21:45; 23:14.)  E nwere ọtụtụ ihe ọma Jehova ga-emere anyị, nweekwa ọtụtụ ihe mere anyị kwesịrị iji hụ ya n’anya. Ma, olee otú anyị ga-esi gosi na anyị hụrụ ya n’anya?

OTÚ ANYỊ GA-ESI GOSI NA ANYỊ HỤRỤ CHINEKE N’ANYA

15. Olee otú ịmụ Okwu Chineke na ime ihe anyị mụtara ga-esi abara anyị uru?

15 Na-amụ Okwu Chineke mgbe niile, na-emekwa ihe ị mụtara. Ọ bụrụ na anyị ana-eme otú ahụ, anyị na-egosi na anyị hụrụ Jehova n’anya, chọọkwa ka Okwu ya na-eduzi anyị. (Ọma 119:105) Ọ bụrụ na nsogbu abịara anyị, ihe Baịbụl kwuru nwere ike ịkasi anyị obi. Dị ka ihe atụ, o kwuru, sị: “Chineke, ị gaghị eleghara obi tiwara etiwa, nke nọ ná mwute, anya.” “Jehova, obiọma gị nọ na-akwado m. Mgbe m nwere ọtụtụ nchegbu n’ime obi m, nkasi obi gị malitere ime ka ahụ́ ruo mkpụrụ obi m ala.” (Ọma 51:17; 94:18, 19) Ma Jehova ma Jizọs na-emere ndị niile nwere nsogbu ebere. (Aịza. 49:13; Mat. 15:32) Ọ bụrụ na anyị na-amụ Baịbụl, ihe ndị anyị ga-amụta ga-eme ka anyị ghọta na Jehova hụrụ anyị n’anya, meekwa ka anyị hụkwuo ya n’anya.

16. Olee otú ikpe ekpere mgbe niile ga-esi mee ka anyị hụkwuo Chineke n’anya?

16 Na-ekpe ekpere mgbe niile. Ikpe ekpere na-eme ka anyị na “Onye na-anụ ekpere” dịkwuo ná mma. (Ọma 65:2) Ọ bụrụ na anyị aghọta na Chineke zara ekpere anyị, ọ ga-eme ka anyị hụkwuo ya n’anya. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ịchọpụta na Chineke ekweghị ka ọnwụnwa karịrị anyị bịara anyị. (1 Kọr. 10:13) Mgbe ọ bụla anyị na-echegbu onwe anyị, ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile kpee ekpere ka Chineke nyere anyị aka, anyị ga-enwe “udo nke Chineke.” Ọ bụ naanị Jehova ga-eme ka obi ruo anyị ala. (Fil. 4:6, 7) Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike ikpe ekpere n’obi anyị otú ahụ Nehemaya kpere. E mechaa, anyị aghọta na Jehova azala ya. (Nehe. 2:1-6) Ọ bụrụ na anyị ana-ekpe ekpere mgbe niile ma hụ otú Jehova si na-aza ekpere anyị, ọ ga-eme ka anyị hụkwuo ya n’anya, obi esikwuo anyị ike na ọ ga-enyere anyị aka imeri ọnwụnwa ndị ọzọ ga-abịara anyị.—Rom 12:12.

17. Ọ bụrụ na anyị hụrụ Chineke n’anya, olee otú anyị kwesịrị isi were ịga ọmụmụ ihe?

17 Na-aga ọmụmụ ihe na mgbakọ niile. (Hib. 10:24, 25) N’oge ochie, ụmụ Izrel  na-agbakọta ka ha gee ntị ma mụọ gbasara Jehova ka ha nwee ike ịtụ egwu ya ma debe Iwu ya. (Diut. 31:12) Ọ bụrụ na anyị hụrụ Chineke n’anya n’eziokwu, ime ihe ọ gwara anyị agaghị abụrụ anyị ibu arọ. (Gụọ 1 Jọn 5:3.) N’ihi ya, anyị ekwesịghị ikwe ka ihe ọ bụla mee ka anyị jiri ịga ọmụmụ ihe na-egwu egwu. Mgbe mbụ anyị mụtara banyere Jehova, anyị ji obi anyị niile hụ ya n’anya. Anyị achọghị ka ihe ọ bụla mee ka ịhụnanya ahụ nyụọ ka ọkụ ugbu a.—Mkpu. 2:4.

18. Gịnị ka anyị na-eme n’ihi na anyị hụrụ Chineke n’anya?

18 Jiri ịnụ ọkụ n’obi na-akọrọ ndị ọzọ eziokwu dị na Baịbụl. (Gal. 2:5) Anyị hụrụ Chineke n’anya. Ọ bụ ya mere anyị ji akọrọ ndị ọzọ gbasara Alaeze ya. N’Amagedọn, Jizọs, bụ́ Eze Chineke họpụtara, ga-eme ka o doo anya na ọ bụ Jehova kwesịrị ịchị. (Ọma 45:4; Mkpu. 16:14, 16) Obi dị anyị ezigbo ụtọ na anyị so na-eme ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Otú anyị si eme ya bụ na anyị na-enyere ha aka ka ha mụta banyere ịhụnanya Chineke nakwa ụwa ọhụrụ o kwere ná nkwa.—Mat. 28:19, 20.

19. Gịnị mere obi ji kwesị ịdị anyị ụtọ na Jehova haziri otú a ga-esi na-azụ atụrụ ya?

19 Gosi na obi dị gị ụtọ maka na Chineke haziri otú a ga-esi na-azụ atụrụ ya. (Ọrụ 20:28) Ndị okenye ọgbakọ bụ onyinye Jehova nyere anyị. Ha na-arụsi ọrụ ike ka ihe dịrị anyị mma. Ha dị ka “ebe izere ifufe na ebe mgbaba iji zere oké mmiri ozuzo, dị ka mmiri iyi ndị dị n’ala mmiri na-adịghị, dị ka ndò nke oké nkume dị elu n’ala kpọrọ nkụ.” (Aịza. 32:1, 2) E nwee oké ifufe ma ọ bụ oké mmiri ozuzo, obi na-adị anyị ụtọ ma anyị hụ ebe anyị ga-agbaba. Ọ bụrụkwa na anwụ achasiwe ike, obi na-adị anyị ụtọ ma anyị hụ ebe e nwere ndò. E nwere ike iji nsogbu ụwa tụnyere oké ifufe na oké mmiri ozuzo. Mgbe ọ bụla nsogbu bịaara anyị, ndị okenye na-enyere anyị aka ma na-agba anyị ume ka anyị nọsie ike n’ofufe Chineke. Baịbụl kwuru na ndị okenye bụ “onyinye n’ụdị mmadụ.” Ọ bụrụ na anyị na-erubere ha isi, anyị na-egosi na obi dị anyị ụtọ maka onyinye a Chineke nyere anyị. Ọ ga-egosikwa na anyị hụrụ Chineke n’anya nakwa na anyị hụrụ Kraịst, bụ́ Onyeisi ọgbakọ, n’anya.—Efe. 4:8; 5:23; Hib. 13:17.

Jehova nyere anyị ndị ọzụzụ atụrụ na-ege anyị ntị ma na-elekọta anyị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 19)

GBAA MBỌ KA Ị NA-AHỤKWU CHINEKE N’ANYA

20. Ọ bụrụ na ị hụrụ Chineke n’anya, olee otú ị ga-esi gosi na ị na-eme ihe e kwuru na Jems 1:22-25?

20 Ọ bụrụ na gị na Jehova dị n’ezigbo mma, ị ga ‘na-eme okwu ya,’ ọ bụghị naanị ịnụ ya anụ. (Gụọ Jems 1:22-25.) Onye na-eme ihe Chineke kwuru na-egosi na ya nwere okwukwe. Otú o si eme ya bụ ịna-ekwusasi ozi ọma ike, na-azakwa ajụjụ n’ọmụmụ ihe. Ebe ọ bụ na ị hụrụ Jehova n’anya n’eziokwu, ị ga na-erubere ‘iwu ya zuru okè’ isi, ya bụ, ịna-eme ihe niile ọ chọrọ ka ị na-eme.—Ọma 19:7-11.

21. Gịnị ka i nwere ike iji tụnyere ekpere i ji obi gị niile kpee?

21 Ọ bụrụ na ị hụrụ Jehova Chineke n’anya, ị ga-eji obi gị niile na-ekpegara ya ekpere mgbe niile. N’oge ụmụ Izrel, ndị nchụàjà na-esurere Jehova ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ kwa ụbọchị. Eze Devid ji ekpere ya tụnyere ihe nsure ọkụ ahụ. Ọ bụ ya mere o ji bụkuo Jehova abụ, sị: “Ka ekpere m bụrụ ihe a kwadebere n’ihu gị dị ka ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ, ka mgbasa m na-agbasa ọbụ aka m dịrị ka àjà ọka a na-achụ ná mgbede.” (Ọma 141:2; Ọpụ. 30:7, 8) Jehova zara ekpere Devid. Mgbe anyị na-ekpe ekpere, ọ bụrụ na anyị adị umeala n’obi, jiri obi anyị niile na-agwa Chineke okwu ma na-ekele ya, ekpere anyị ga-adịkwa ka ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ, Jehova ga-anabatakwa ya.—Mkpu. 5:8.

22. Gịnị ka anyị ga-eleba anya n’isiokwu na-esonụ?

22 Jizọs gwara anyị ka anyị hụ Chineke na ndị agbata obi anyị n’anya. (Mat. 22:37-39) Ọ bụrụ na anyị ahụ Jehova na iwu ya n’anya, ọ ga-eme ka anyị hụ ndị agbata obi anyị n’anya. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-eleba anya n’otú anyị nwere ike isi mee ya.