Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) MEE 2014

Jehova Na-ahazi Ihe Ya Ahazi

Jehova Na-ahazi Ihe Ya Ahazi

“Chineke abụghị Chineke nke aghara, kama nke udo.”—1 KỌR. 14:33.

1, 2. (a) Ònye bụ onye mbụ Chineke kere? Olee ihe Jehova si n’aka ya mee? (b) Olee otú anyị si mara na Chineke haziri ndị mmụọ ozi ahazi?

JEHOVA bụ́ onye kere eluigwe na ụwa na-ahazi ihe ọ na-eme ahazi. O bu ụzọ kee Ọkpara ya bụ́ Jizọs. Baịbụl kpọrọ Jizọs “Okwu ahụ” n’ihi na ọ bụ ya kacha ekwuchite ọnụ Chineke. O jeere Chineke ozi n’eluigwe ọtụtụ nde afọ. Baịbụl kwuru, sị: “Okwu ahụ nọ ná mmalite, Okwu ahụ na Chineke nọkwa.” Ọ sịkwara: “Ihe niile si n’aka ya dịrị, ọ dịghị ọbụna otu ihe e mere ka ọ dịrị ma ọ́ bụghị site n’aka ya.” Ọ karịtụla puku afọ abụọ kemgbe Jehova zitere Okwu ahụ n’ụwa ka ọ bụrụ Jizọs Kraịst. A mụrụ ya ka ọ bụrụ onye zuru okè. O ji obi ya niile mee ihe ọ bụla Nna ya sịrị ya mee.—Jọn 1:1-3, 14.

2 Tupu Jizọs abịa n’ụwa, ọ bụ “onye ọkà ọrụ” nke jeere Chineke ozi. (Ilu 8:30) Jehova si n’aka ya kee ọtụtụ nde ndị mmụọ ozi n’eluigwe. (Kọl. 1:16) Baịbụl kwuru banyere ndị mmụọ ozi Jehova, sị: “E nwere puku kwuru puku ndị nọ na-ejere ya ozi, nakwa iri puku kwuru iri puku ndị guzo n’ihu ya.” (Dan. 7:10) Ndị mmụọ ozi Chineke dị ọtụtụ. Baịbụl kwuru na ha bụ “ụsụụ ndị agha” a haziri nke ọma.—Ọma 103:21.

3. Kpakpando ole ka e nwere? Olee otú e si hazie ha?

3 Mgbe Jehova kere eluigwe na ụwa, o kere ọtụtụ kpakpando a na-agaghị agụtali ọnụ. Ole ka ha dị? Otu akwụkwọ akụkọ e bipụtara n’Amerịka kwuru na ndị sayensị  chọpụtara n’oge na-adịbeghị anya na e nweziri ijeri kwuru ijeri kpakpando, ya bụ na ọ ka ole ha kwuburu okpukpu atọ. * A haziri kpakpando n’ụyọkọ n’ụyọkọ. E nwere ọtụtụ ijeri kpakpando n’ụyọkọ ndị nke obere, nweekwa ọtụtụ puku ijeri kpakpando n’ụyọkọ ndị nke nnukwu. A hazikwara ọtụtụ ụyọkọ kpakpando n’ìgwè n’ìgwè.

4. Olee otú anyị si mara na Chineke na-ahazi ndị ya ahazi?

4 Otú Chineke si hazie ma ndị mmụọ ozi ma kpakpando dị egwu. (Aịza. 40:26) N’ihi ya, obi kwesịrị isi anyị ike na Chineke ga-ahazikwa ndị na-ejere ya ozi n’ụwa ahazi. Ihe mere o ji dị mkpa ka a hazie ha bụ na ha nwere ọtụtụ ọrụ dị mkpa ha ga-arụ. Kemgbe ọtụtụ puku afọ, Jehova na-ahazi ndị ohu ya ka ha nwee ike iji obi ha dum na-efe ya. Otú ọtụtụ ndị ohu Jehova si jiri obi ha niile fee ya ma n’oge ochie ma n’oge anyị a gosiri na Jehova nọnyeere ha nakwa na ọ bụghị “Chineke nke aghara, kama nke udo.”—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 14:33, 40.

CHINEKE HAZIRI NDỊ YA AHAZI N’OGE OCHIE

5. Gịnị mere na ihe Chineke bu n’obi kee ụwa emezughị ozugbo?

5 Mgbe Jehova kere Adam na Iv, ọ gwara ha, sị: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba ma jupụta ụwa, meekwanụ ka ọ dịrị n’okpuru unu, ka azụ̀ ndị dị n’oké osimiri na anụ ufe nke eluigwe na ihe ọ bụla e kere eke dị ndụ nke na-agagharị n’elu ala nọrọkwa n’okpuru unu.” (Jen. 1:28) Jehova ekeghị ọtụtụ nde mmadụ otu mgbe. Adam na Iv ga-amụ ụmụ, ụmụ ha amụọkwa ụmụ, ruo mgbe ha ga-amụju ụwa. Chineke bu n’obi ka ha mee ka ụwa niile bụrụ paradaịs. Isi ahụ Adam na Iv nupụụrụ Chineke mere ka ihe a Chineke bu n’obi ghara ime ozugbo. (Jen. 3:1-6) Ọtụtụ ụmụ Adam na Iv efeghị Jehova. Ka oge na-aga, “Jehova hụrụ na ihe ọjọọ nke mmadụ dị ukwuu n’ụwa nakwa na ihe niile obi ya na-eche mgbe niile bụ naanị ihe ọjọọ.” Ihe ọjọọ a niile mere ka ‘ụwa bụrụ ihe e bibiri ebibi ma jupụta n’ime ihe ike.’ Ọ bụ ya mere Chineke ji kpebie iji Iju Mmiri zuru ụwa ọnụ gbuo ndị ọjọọ ahụ niile.—Jen. 6:5, 11-13, 17.

6, 7. (a) Gịnị mere Jehova ji chebe Noa? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Gịnị mere ndị niile na-egeghị Noa ntị?

6 Ma, ọ bụghị mmadụ niile ka e gburu n’Iju Mmiri ahụ. “Ihe Noa masịrị Jehova” n’ihi na ọ bụ ‘onye ezi omume nke na-enweghị ntụpọ n’etiti ndị ya na ha dịkọrọ ndụ.’ O so “ezi Chineke jee ije.” Ọ bụ ya mere Jehova ji gwa ya ka ọ rụọ nnukwu ụgbọ. (Jen. 6:8, 9, 14-16) Otú e si rụọ ụgbọ ahụ mere ka o see n’elu mmiri ka ndị mmadụ na ụmụ anụmanụ nọ n’ime ya ghara ịnwụ. Noa rubeere Jehova isi ma mee ‘ihe niile o nyere ya n’iwu.’ Ndị ezinụlọ ya kwadokwara ya. Mgbe a kpọbachara ụmụ anụmanụ n’ụgbọ ahụ, “Jehova mechiri ụzọ.”—Jen. 7:5, 16.

7 Iju Mmiri ahụ malitere n’afọ 2370 Tupu Oge Ndị Kraịst, Jehova ejiri ya “kpochapụ ihe ọ bụla dị ndụ n’elu ala.” Ma, o chebere Noa na ezinụlọ ya n’ihi na ha rubeere ya isi. (Jen. 7:23) Mmadụ niile nọ n’ụwa taa si n’agbụrụ Noa, ụmụ ya, na ndị nwunye ha. Ma, ndị ọjọọ ahụ niile na-anọghị n’ime ụgbọ ahụ nwụrụ n’ihi na ha egeghị Noa ntị. Baịbụl kwuru na Noa bụ “onye na-ekwusa ezi omume.”—2 Pita 2:5.

Otú Chineke si hazie ihe nke ọma mere ka e chebe mmadụ asatọ n’Iju Mmiri ahụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6 na nke 7)

8. Mgbe Chineke nyere ụmụ Izrel iwu ka ha baa n’Ala Nkwa, olee ihe gosiri na ọ haziri ha nke ọma?

8 Mgbe Iju Mmiri ahụ gachara, ihe  karịrị narị afọ asatọ agaakwa, Chineke haziri ụmụ Izrel, mee ka ha bụrụ mba. Ọ haziri ihe niile ha na-eme, nke ka nke, otú ha ga-esi na-efe ya. Dị ka ihe atụ, ọ họpụtara ụfọdụ n’ime ha ka ha bụrụ ndị nchụàjà na ndị Livaị. Ọ hazikwara ụfọdụ ụmụ nwaanyị ka ha na-eje ozi “n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute.” (Ọpụ. 38:8) Jehova nyere ụmụ Izrel iwu ka ha gaa biri na Kenan. Ma, ụjọ bịara ọtụtụ n’ime ha, ha ajụ ịga. N’ihi ya, ọ gwara ha, sị: “Unu onwe unu agaghị abanye n’ala ahụ m weliri aka m ṅụọ iyi na mụ na unu ga-ebi n’ime ya, ma e wezụga Keleb nwa Jefọne na Jọshụa nwa Nọn.” Ihe mere Jehova ji kwuo na ọ bụ naanị Jọshụa na Keleb ga-abanye n’Ala Nkwa ahụ ha gara ledoo bụ na ha kwuru okwu ọma banyere ya. (Ọnụ Ọgụ. 14:30, 37, 38) Jehova mechara gwa Mozis ka ọ họpụta Jọshụa ka ọ nọchie ya. (Ọnụ Ọgụ. 27:18-23) Mgbe ọ fọrọ obere ka Jọshụa duru ụmụ Izrel banye na Kenan, Jehova gwara ya, sị: “Nwee obi ike, dịkwa ike. Amala jijiji, atụkwala ụjọ, n’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị nọnyeere gị ebe ọ bụla ị na-aga.”—Jọsh. 1:9.

9. Olee otú obi dị Rehab gbasara Jehova na ndị ya?

9 Jehova Chineke nọnyeere Jọshụa ebe ọ bụla ọ gara. Dị ka ihe atụ, n’afọ 1473 Tupu Oge Ndị Kraịst, ụmụ Izrel mara ụlọikwuu ha n’ebe dị nso na Jeriko dị na Kenan. Jọshụa dunyere ụmụ nwoke abụọ ka ha gaa lee otú Jeriko dị. N’ebe ahụ, ha hụrụ otu nwaanyị akwụna aha ya bụ Rehab. Mgbe ndị obodo ahụ bịara ka ha jide mmadụ abụọ ahụ, Rehab zoro ha n’uko ụlọ ya. Ọ gwara ha, sị: “Amaara m na Jehova ga-enye unu ala a . . . N’ihi na anyị anụwo otú Jehova si mee ka mmiri Oké Osimiri Uhie takọọ n’ihu unu . . . , nụkwa ihe unu mere eze abụọ nke ndị Amọraịt.” Ọ gwakwara ha, sị: “Jehova bụ́ Chineke unu bụ Chineke n’eluigwe nakwa n’ụwa.” (Jọsh. 2:9-11) Rehab na ndị ezinụlọ ya kwadoro ndị Chineke. Ọ bụ ya  mere Jehova ji zọpụta ha mgbe ndị Izrel bibiri Jeriko. (Jọsh. 6:25) Rehab nwere okwukwe, kwanyekwara Jehova na nzukọ ya ùgwù.

CHINEKE HAZIRI NDỊ KRAỊST MBỤ AHAZI

10. Gịnị ka Jizọs gwara ndị ndú okpukpe ndị Juu? Gịnị mere o ji gwa ha ya?

10 Mgbe Jọshụa na-edu ụmụ Izrel, ha meriri obodo dị iche iche dị n’ala Kenan ma bichie ha. Ma, gịnị mechara mee? Ruo ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ ise, ndị Izrel nupụụrụ Chineke isi ugboro ugboro. Mgbe Jizọs bịara n’ụwa, ndị Izrel ka nọkwa na-enupụrụ Jehova na ndị amụma ya isi. Ọ bụ ya mere Jizọs ji kpọọ ndị bi na Jeruselem ndị “na-egbu ndị amụma.” (Gụọ Matiu 23:37, 38.) Chineke jụrụ ndị ndú okpukpe ndị Juu n’ihi na ha anaghị eme ihe o kwuru. Ọ bụ ya mere Jizọs ji gwa ha, sị: “A ga-anapụ unu alaeze Chineke, werekwa ya nye mba nke na-amị mkpụrụ ya.”—Mat. 21:43.

11, 12. (a) N’oge ndịozi Jizọs, gịnị gosiri na Jehova nọnyeere nzukọ ọhụrụ ahụ o ji dochie mba Izrel? (b) Ole ndị batara n’ọgbakọ ọhụrụ ahụ?

11 N’oge ndịozi Jizọs, Jehova jụrụ mba Izrel. Ma, ọ pụtaghị na ọ gaghịzi enwe ndị ọ haziri ga na-ejere ya ozi n’ụwa. Malite n’ụbọchị Pentikọst afọ 33, Jehova nwetara nzukọ ọhụrụ o ji dochie mba Izrel. Nzukọ ahụ na-erubere Jizọs Kraịst isi. N’ụbọchị ahụ, ihe dị ka otu narị ndị na-eso ụzọ Jizọs na iri abụọ zukọrọ n’otu ebe na Jeruselem. “Na mberede, a nụrụ ụzụ si n’eluigwe dị nnọọ ka oké ifufe nke na-efesi ike, o wee ju ụlọ ahụ dum.” Baịbụl kwuru, sị: “Ha hụkwara ihe ndị dị ka ire ọkụ. E kesasịkwara ha, otu dịkwa n’isi onye nke ọ bụla n’ime ha. Ha niile wee jupụta na mmụọ nsọ, malite ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche, dị nnọọ ka mmụọ nsọ nọ na-enye ha ike ikwu okwu.” (Ọrụ 2:1-4) Ihe ahụ merenụ gosiri n’eziokwu na Jehova nọnyeere nzukọ ọhụrụ a, ya bụ, ndị na-eso ụzọ Jizọs.

12 N’otu ụbọchị ahụ, ihe dị ka puku mmadụ atọ ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Baịbụl kwuru na “Jehova nọkwa na-atụkwasịrị ha kwa ụbọchị ndị a na-azọpụta.” (Ọrụ 2:41, 47) Ozi ọma ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ na-ekwusa gara nke ọma. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo, sị: “Okwu Chineke nọ na-eto eto, ọnụ ọgụgụ nke ndị na-eso ụzọ Jizọs nọkwa na-amụba nke ukwuu na Jeruselem; oké ìgwè ndị nchụàjà malitekwara irube isi n’okwukwe Ndị Kraịst.” (Ọrụ 6:7) Ọtụtụ ndị chọrọ ịmụta eziokwu nabatara ozi ọma ndị na-eso ụzọ Jizọs kwusara. Ka oge na-aga, Jehova bidoro ịkpọbata “ndị mba ọzọ” n’ọgbakọ Ndị Kraịst. O si otú ahụ gosi na ọ na-akwado ọgbakọ ahụ.—Gụọ Ọrụ Ndịozi 10:44, 45.

13. Olee ọrụ Chineke nyere ndị na-eso ụzọ Jizọs?

13 O doro anya na e nwere ọrụ Chineke chọrọ ka ndị na-eso ụzọ Kraịst na-arụ. Ọ bụ ọrụ ahụ Jizọs rụrụ mgbe ọ nọ n’ụwa. Mgbe e mechara ya baptizim, ọ malitere ikwusa gbasara “alaeze eluigwe.” (Mat. 4:17) Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-arụ otu ọrụ ahụ. Ọ gwara ha, sị: “Unu ga-abụkwa ndị àmà m ma na Jeruselem ma na Judia dum nakwa na Sameria, ruokwa n’ebe kasị anya n’ụwa.” (Ọrụ 1:8) Ndị na-eso ụzọ Jizọs n’oge ahụ ghọtara ihe Jizọs chọrọ ka ha mee. Dị ka ihe atụ, mgbe Pọl na Banabas nọ n’Antiọk dị na Pisidia, ha gwara ndị Juu na-enye ha nsogbu, sị: “Ọ dị mkpa na unu bụ ndị mbụ a gwara okwu Chineke. Ebe ọ bụ na unu na-ajụ ya, ebe ọ bụkwa na unu na-ewere onwe unu ná ndị na-erughị eru inweta  ndụ ebighị ebi, lee! anyị na-agakwuru ndị mba ọzọ. N’eziokwu, Jehova enyewo anyị iwu site n’ikwu, sị, ‘Ahọpụtawo m gị ka ị bụrụ ìhè nke ndị mba ọzọ, ka i wee bụrụ nzọpụta ruo nsọtụ ụwa.’” (Ọrụ 13:14, 45-47) Kemgbe oge ndịozi Jizọs, nzukọ Chineke na-agwa ndị mmadụ ihe Chineke mere ka o nwee ike ịzọpụta ụmụ mmadụ.

E GBURU ỌTỤTỤ NDỊ, MA E GBUGHỊ NDỊ NA-EFE CHINEKE

14. Gịnị mere Jeruselem n’oge ndịozi Jizọs? Olee ndị a na-egbughị?

14 Ọtụtụ ndị Juu anabataghị ozi ọma e kwusara gbasara Jizọs. Ha egeghịkwa ntị mgbe Jizọs gwara ha na a ga-ebibi Jeruselem. Ọ dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị, sị: “Mgbe unu hụkwara Jeruselem ka ụsụụ ndị agha ndị mara ụlọikwuu gbara ya gburugburu, mgbe ahụ maranụ na ime ka ọ tọgbọrọ n’efu adịwo nso. Mgbe ahụ, ka ndị nọ na Judia malite ịgbaga n’ugwu, ka ndị nọkwa n’ime ya si na ya pụọ, ka ndị nọkwa n’obodo nta dị iche iche ghara ịbanye n’ime ya.” (Luk 21:20, 21) Ihe a Jizọs kwuru mechara mee. Ndị Juu nupụụrụ ndị Rom isi. N’ihi ya n’afọ 66, Sestiọs Galọs du ndị agha Rom gbaa Jeruselem gburugburu ma chọọ ibibi ya. Ma, ndị agha ahụ lawara na mberede, ndị na-eso ụzọ Jizọs enwezie ike isi na Jeruselem na Judia gbapụ. Otu nwoke na-akọ akụkọ ihe mere eme aha ya bụ Yusebiọs kwuru na ọtụtụ n’ime ha gafere Osimiri Jọdan ma gbaga Pela dị na Peria. N’afọ 70, ọchịagha ndị Rom aha ya bụ Taịtọs du ndị agha ya bịa bibie Jeruselem. Ma, e gbughị Ndị Kraịst n’ihi na ha mere ihe Jizọs gwara ha.

15. Olee ihe ndị na-egbochighị ndị mmadụ ịbata n’ọgbakọ n’oge ndịozi Jizọs?

15 N’oge ndịozi Jizọs, ihe siiri Ndị Kraịst ike. A kpagburu ha, ọnwụnwa abịakwara ha. Ma, ọtụtụ ndị ghọrọ Ndị Kraịst. (Ọrụ 11:19-21; 19:1, 19, 20) Ihe kpatara ya bụ na Chineke nọnyeere Ndị Kraịst.—Ilu 10:22.

16. N’oge ndịozi Jizọs, gịnị ka Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ịna-eme ka okwukwe ya sie ike?

16 N’oge ndịozi, ọ bụrụ na Onye Kraịst chọrọ ka okwukwe ya sie ike, o kwesịrị ịna-agbasi mbọ ike. Ọ ga na-amụ Okwu Chineke, na-agachikwa ọmụmụ ihe na ozi ọma anya. Ihe ndị a ndị na-efe Jehova na-eme mere ka ha dịrị n’otu n’oge ahụ. Otú ahụ ka ọ dịkwa taa. N’oge ahụ, a haziri ọgbakọ dị iche iche nke ọma. Ọgbakọ nke ọ bụla nwere ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi, bụ́ ndị ji obi ha niile na-enyere Onye Kraịst ọ bụla aka. Otú ụmụnna ndị a si na-arụsi ọrụ ike bakwaara ọgbakọ dị iche iche uru. (Fil. 1:1; 1 Pita 5:1-4) Pọl na ndị ọzọ bụ́ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na-agakwa eleta ọgbakọ dị iche iche. (Ọrụ 15:36, 40, 41) Obi dị anyị ụtọ ịhụ na e nwere ọtụtụ ụzọ otú anyị si efe Chineke taa si yie otú Ndị Kraịst oge mbụ si fee ya. Anyị na-ekele Jehova na ọ haziri ndị ohu ya ahazi, ma n’oge ahụ ma n’oge anyị a. *

17. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

17 Anyị bi n’oge ikpeazụ. A ga-ebibi ụwa Setan n’oge na-adịghị anya. Ma, nzukọ Jehova nke a na-ahụ anya na-aga n’ihu n’ihu taa karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Ì so nzukọ Jehova na-aga ụkwụ na ụkwụ? Isiokwu na-esonụ ga-akọwa otú i nwere ike isi mee ya.

^ para. 3 Ha chọpụtara na kpakpando e nwere dị ihe dị ka puku ijeri atọ a mụbara ụzọ otu narị ijeri.

^ para. 16 Gụọ isiokwu bụ́ “Ndị Kraịst Na-efe Ofufe n’Ime Mmụọ na n’Eziokwu” na “Ha Nọgidere Na-eje Ije n’Eziokwu Ahụ,” n’Ụlọ Nche July 15, 2002. A kọkwuru gbasara nzukọ Jehova nke a na-ahụ anya na broshọ bụ́ Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa? nakwa n’akwụkwọ bụ́ Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom.