Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Mee 2014

Ì So Nzukọ Jehova Na-aga Ụkwụ na Ụkwụ?

Ì So Nzukọ Jehova Na-aga Ụkwụ na Ụkwụ?

“Anya Jehova na-elekwasị ndị ezi omume.”—1 PITA 3:12.

1. Mgbe ụmụ Izrel nupụụrụ Jehova isi, olee ndị o ji dochie ha? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

O DORO anya na ọ bụ Jehova mere ka e hiwe ọgbakọ Ndị Kraịst n’oge ndịozi, meekwa ka a malite ife ya otú ọ chọrọ n’oge anyị a. Dị ka e kwuru n’isiokwu bu nke a ụzọ, mba Izrel nupụụrụ Jehova isi. Ọ bụ ya mere o ji were ọgbakọ Ndị Kraịst dochie ha ma kpọkwasị ha aha ya. Mgbe e bibiri Jeruselem n’afọ 70, e bibighị ọgbakọ ahụ n’ihi na ọ bụ ya ka Jehova họọrọ. (Luk 21:20, 21) Ụdị ihe ahụ Jehova meere ọgbakọ Ndị Kraịst n’oge ndịozi ka ọ ga-emere ndị ohu ya n’oge anyị a. A ga-ebibi ụwa Setan n’oge na-adịghị anya, ma a gaghị ebibi nzukọ Jehova. (2 Tim. 3:1) Gịnị mere obi ji sie anyị ike na a gaghị ebibi ya?

2. Gịnị ka Jizọs kwuru gbasara “oké mkpagbu”? Olee otú ọ ga-esi amalite?

2 Jizọs buru amụma banyere ihe ndị ga-eme n’oge ikpeazụ. Ọ sịrị: “Mgbe ahụ ka a ga-enwe oké mkpagbu nke a na-enwetụbeghị ụdị ya kemgbe ụwa malitere ruo ugbu a, ee e, a gaghị enwekwa ya ọzọ.” (Mat. 24:3, 21) Oké mkpagbu ahụ ga-amalite mgbe Jehova ji ndị ọchịchị bibichaa “Babịlọn Ukwu ahụ,” ya bụ, okpukpe ụgha niile e nwere  n’ụwa. (Mkpu. 17:3-5, 16) Gịnị ga-eme ma e bibichaa ya?

AMAGEDỌN GA-AMALITE MA SETAN BỊA ỊLỤSO NDỊ CHINEKE ỌGỤ

3. E bibichaa okpukpe ụgha, gịnị ga-eme ndị Jehova?

3 E bibichaa okpukpe ụgha, Setan na ụwa ya ga-alụso ndị Chineke ọgụ. Dị ka ihe atụ, Baịbụl buru amụma banyere “Gọg nke ala Megọg,” sị: “Ị ga-agbagotekwa. Ị ga-abata dị ka oké ifufe mmiri. Ị ga-adị ka ígwé ojii nke ga-ekpuchi ala a, gị na ìgwè ndị agha gị niile na ọtụtụ ndị so gị.” Ndịàmà Jehova enweghị ndị agha. Ha bụ ndị udo. N’ihi ya, ọ ga-adị Setan ka  hà bụ anụ oriri. Ma, ọgụ ahụ ọ ga-alụso ha ga-aghọ ya ahịa.—Ezik. 38:1, 2, 9-12.

4, 5. Gịnị ka Jehova ga-eme mgbe Setan bịara ịlụso ndị ohu ya ọgụ?

4 Gịnị ka Chineke ga-eme ma Setan bịa ịlụso ndị ya ọgụ? Jehova ga-alụchitere ha ọgụ ma gosi na ọ bụ ya bụ Ọkaakaa. Ọ ga-adị Jehova ka ọ̀ bụ yanwa ka ọ bịara ịlụso ọgụ ahụ. (Gụọ Zekaraya 2:8.) N’ihi ya, Nna anyị nke eluigwe ga-anapụta ndị ohu ya ozugbo. Ọ gaghị ekwe ka e bibie ha. Jehova napụtachaa ndị ya, ọ ga-amalite agha Amagedọn ma bibie ụwa Setan kpamkpam.—Mkpu. 16:14, 16.

5 Baịbụl buru amụma banyere Amagedọn, sị: “‘Jehova na mba niile ga-aba n’ikpe. Ọ ga-ekpe anụ ahụ́ niile ikpe. Ọ ga-enyefe ndị ajọ omume n’aka mma agha,’ ka Jehova kwuru. “Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘Lee! Ọdachi ga-esi n’otu mba ruo ná mba ọzọ, a ga-esikwa n’ime ime ụwa kpalie oké ifufe. N’ụbọchị ahụ, ndị Jehova gburu ga-atọgbọrọ malite n’otu nsọtụ ụwa ruo na nsọtụ ọzọ nke ụwa. A gaghị akwara ha ákwá arịrị, a gaghịkwa achịkọta ha ma ọ bụ lie ha. Ha ga-aghọ nsị anụ n’elu ala.’” (Jere. 25:31-33) A ga-ebibi ụwa ọjọọ a n’Amagedọn. Ụwa Setan agaghị adị ọzọ, ma a gaghị ebibi nzukọ Jehova.

IHE MERE ỌTỤTỤ NDỊ JI NA-ABATA N’ỌGBAKỌ JEHOVA TAA

6, 7. (a) Olee ebe “oké ìgwè mmadụ” ahụ ga-esi? (b) Gịnị gosiri na ọtụtụ ndị na-ege ntị n’ozi ọma anyị na-ekwusa?

6 Ọtụtụ ndị na-abata n’ọgbakọ Jehova taa n’ihi na ndị nọ na ya bụ ndị ihe ha dị Jehova mma. Baịbụl kwuru, sị: “Anya Jehova na-elekwasị ndị ezi omume, ntị ya dịkwa n’arịrịọ ha na-arịọsi ike.” (1 Pita 3:12) Ndị so ná ndị ezi omume ahụ bụ “oké ìgwè mmadụ,” ‘ndị ga-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta.’ (Mkpu. 7:9, 14) Baịbụl ekwughị na ha bụ “ìgwè mmadụ.” O kwuru na ha bụ “oké ìgwè mmadụ,” nke gosiri na ha hiri ezigbo nne. Chegodị otú obi ga-adị gị mgbe ị ‘ga-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta.’

7 Oké ìgwè mmadụ ahụ ga-esi ná mba niile. Ọ bụ ozi ọma anyị na-ekwusa ka Chineke ji na-akpọbata ha n’ọgbakọ. Jizọs buru amụma, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.” (Mat. 24:14) Ọ bụ ya mere na ọrụ kacha mkpa ndị Chineke na-arụ taa bụ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Ozi ọma ha na-ekwusa n’ụwa niile emeela ka ọtụtụ nde mmadụ bịa na-efe Jehova “n’ime mmụọ na n’eziokwu.” (Jọn 4:23, 24) Dị ka ihe atụ, naanị n’afọ iri, ya bụ, malite n’afọ 2003 ruo n’afọ 2012, ihe karịrị nde mmadụ abụọ, narị puku  asaa na puku asaa nyefere Jehova onwe ha, e mee ha baptizim. Taa, Ndịàmà Jehova akarịala nde asaa na narị puku itoolu. Ọtụtụ nde mmadụ na-esokwa ha echeta ọnwụ Jizọs kwa afọ. Anyị anaghị eji mmadụ ole anyị dị etu ọnụ n’ihi na ọ bụ “Chineke na-eme ka o too.” (1 Kọr. 3:5-7) Ma, o doro anya na oké ìgwè mmadụ ahụ na-ebukwu ibu kwa ụbọchị.

8. Gịnị mere ọtụtụ ndị ji na-abata ná nzukọ Jehova?

8 Jehova na-akwado Ndịàmà ya. Ọ bụ ya mere ọtụtụ ndị ji na-aghọ ndị ohu ya n’ike n’ike. (Gụọ Aịzaya 43:10-12.) Amụma Aịzaya buru banyere oge ikpeazụ a na-emezu. O kwuru, sị: “Onye nta ga-aghọ otu puku mmadụ, onye kasị nta ga-aghọkwa mba dị ike. Mụ onwe m, Jehova, ga-eme ka o mezuo ọsọ ọsọ n’oge ya.” (Aịza. 60:22) E nwere mgbe ndị fọdụrụ ná ndị e tere mmanụ dị ka “onye nta.” Ma, mgbe Chineke kpọbatara ndị ọzọ so ‘n’Izrel nke Chineke’ n’ọgbakọ ya, ha bukwuru ibu. (Gal. 6:16) Kemgbe ọtụtụ afọ, ọtụtụ nde ndị nwere olileanya ibi n’ụwa na-abatakwa n’ọgbakọ.

IHE JEHOVA CHỌRỌ KA ANYỊ MEE

9. Gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke meere anyị ihe ọma ndị o kwere anyị ná nkwa?

9 Ma ànyị bụ ndị e tere mmanụ ma ànyị so n’oké ìgwè mmadụ, Chineke kwere anyị nkwa ihe ọma ọ ga-emere anyị. Ọ bụrụ na anyị chọrọ iso nweta ya, anyị ga na-erubere ya isi. (Aịza. 48:17, 18) Chegodị banyere iwu Chineke nyere ụmụ Izrel. Otu n’ime ihe mere o ji nye ha ya bụ ka o chebe ha. Ọ kụziiri ha na ịkwa iko adịghị mma, kụziere ha otú ha ga-esi na-akwụwa aka ọtọ, na-azụ ụmụ ha, na-emere ndị ọzọ ihe ọma, na ihe ndị ọzọ. (Ọpụ. 20:14; Lev. 19:18, 35-37; Diut. 6:6-9) Otú ahụ ka ọ dị anyị taa. Ọ bụrụ na anyị edebe iwu Chineke, ọ ga-abara anyị uru otú ahụ ọ baara ụmụ Izrel. Ime uche Chineke abụghịrị anyị ibu arọ. (Gụọ 1 Jọn 5:3.) Iwu Chineke na-echebe anyị. Ọ bụrụ na anyị na-edebe ya, obi ga na-adịkwu anyị ụtọ. Ọ ga-emekwa ka anyị “nọgidesie ike n’okwukwe.”—Taị. 1:13.

10. Gịnị mere anyị kwesịrị iji wepụta oge na-amụ Baịbụl, na-enwekwa Ofufe Ezinụlọ kwa izu?

10 E nwere ọtụtụ ihe gosiri na nzukọ Jehova na-aga n’ihu n’ihu taa. Dị ka ihe atụ, anyị na-aghọtakwu eziokwu ndị dị na Baịbụl. O kwesịghị iju anyị anya n’ihi na Baịbụl kwuru na “ụzọ ndị ezi omume yiri ìhè nke na-enwupụ enwupụ ka chi na-abọwanye ruo mgbe chi bọchara.” (Ilu 4:18) Ma, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘M̀ ma ihe ndị a gbanwere n’oge na-adịbeghị anya n’otú anyị si ghọta amaokwu ụfọdụ dị na Baịbụl? M̀ na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị? M̀ na-agba mbọ agụ akwụkwọ ọhụrụ ọ bụla nzukọ Jehova wepụtara? Ànyị na-enwe Ofufe Ezinụlọ kwa izu?’ Ọtụtụ n’ime anyị ma na ime ihe ndị a esighị ike. Ma, anyị kwesịrị iwepụta oge na-eme ha. Anyị kwesịrị ịna-amụ Baịbụl, na-eme ihe anyị mụtara, sorokwa nzukọ Chineke na-aga ụkwụ na ụkwụ, nke ka nke, ebe ọ bụ na oké mkpagbu ahụ dịzi ezigbo nso.

11. Olee uru ememme ndị Izrel mere n’oge ochie baara ha? Olee uru ọmụmụ ihe anyị na mgbakọ anyị na-abara anyị taa?

11 Nzukọ Jehova na-agba anyị ume ka anyị mee ihe Pọl kwuru. Ọ sịrị: “Ka anyị na-echebakwara ibe anyị echiche iji kpalie ịhụnanya na ịrụ ezi  ọrụ, ka anyị ghara ịhapụ nzukọ anyị, dị ka ụfọdụ ndị na-emekarị, kama ka anyị na-agbarịta ibe anyị ume, na-emekwa otú ahụ karị, ka unu na-ahụ ụbọchị ahụ ka ọ na-eru nso.” (Hib. 10:24, 25) Ememme ụmụ Izrel na-eme kwa afọ na nzukọ ndị ha na-enwe mere ka ha na Jehova dị ná mma. Ha na-enwe obi ụtọ mgbe ha na-eme ememme ndị ahụ. Otu n’ime ha bụ Ememme Ụlọ Ndò pụrụ iche ha mere n’oge Nehemaya. (Ọpụ. 23:15, 16; Nehe. 8:9-18) Ọ bụ otú ahụ ka ọmụmụ ihe anyị na mgbakọ ndị anyị na-enwe si abara anyị uru. Anyị kwesịrị ịgba mbọ na-aga ha n’ihi na ha na-enyere anyị aka ka anyị na Jehova dịkwuo ná mma, anyị ejiri obi ụtọ na-ejere ya ozi.—Taị. 2:2.

12. Olee otú anyị kwesịrị isi were ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke?

12 Ebe ọ bụ na anyị nọ ná nzukọ Jehova, anyị kwesịrị ịna-ekwusa ozi ọma. Ọ bụ ezigbo ihe ùgwù. Baịbụl kwuru na ọ bụ “ọrụ dị nsọ.” (Rom 15:16) Ozi ọma anyị na-ekwusa mere ka anyị na Jehova bụ́ “Onye Nsọ” na-arụkọ ọrụ. (1 Kọr. 3:9; 1 Pita 1:15) Ikwusa ozi ọma na-emekwa ka e doo aha Jehova nsọ. Ikwusa “ozi ọma dị ebube nke Chineke bụ́ onye obi ụtọ” na-eme ka obi na-atọ anyị ụtọ.—1 Tim. 1:11.

13. Gịnị ga-eme ka anyị dị ndụ, anyị na Jehova adịrịkwa ná mma?

13 Chineke chọrọ ka ihe dịrị anyị ná mma. Ọ bụ ya mere o ji chọọ ka anyị na ya dịrị ná mma, anyị ana-akwadokwa nzukọ ya. Mozis gwara ụmụ Izrel, sị: “Eluigwe na ụwa bụ ndị akaebe m megide unu taa, na edebewo m ndụ na ọnwụ n’ihu unu, ngọzi na nkọcha; ị ga-ahọrọkwa ndụ ka i wee dịrị ndụ, gị na ụmụ gị, site n’ịhụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya, site n’ige ntị n’olu ya na site n’ịrapara ya n’ahụ́; n’ihi na ya onwe ya bụ ndụ gị, bụrụkwa ogologo ụbọchị gị, ka i wee biri n’ala ahụ Jehova ṅụụrụ nna nna gị hà bụ́ Ebreham, Aịzik na Jekọb iyi inye ha.” (Diut. 30:19, 20) Ihe ga-eme ka anyị dị ndụ bụ ime uche Jehova, ịhụ ya n’anya, irubere ya isi, na ịnọsi ike ná nzukọ ya.

14. Olee otú obi dị otu nwanna banyere nzukọ Jehova?

14 E nwere otu nwanna aha ya bụ Pryce Hughes. Ọ batara n’ọgbakọ tupu afọ 1914. O soro nzukọ Jehova na-aga ụkwụ na ụkwụ, fegidekwa Jehova ruo mgbe ọ nwụrụ. Mgbe ọ na-akọ akụkọ ndụ ya, ọ sịrị na ihe kacha mkpa ya mụtara bụ na anyị kwesịrị ịnọsi ike ná nzukọ Jehova kama ịna-eme ihe mmadụ kwuru. Ọ bụ ya mere o ji tachie obi n’agbanyeghị ọnwụnwa niile bịaara ya. Nwanna ahụ kwuru na naanị ihe ga-eme ka Jehova gọzie anyị bụ ịna-eme ihe nzukọ Jehova na-agwa anyị.

SORO NZUKỌ JEHOVA NA-AGA ỤKWỤ NA ỤKWỤ

15. Olee ihe a kọrọ na Baịbụl nke mere ka anyị ghọta ihe anyị kwesịrị ime ma a gbanwee otú anyị si ghọta amaokwu ụfọdụ dị na Baịbụl?

15 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka anyị na Jehova dịrị ná mma nakwa ka ọ gọzie anyị, anyị kwesịrị ịna-akwado nzukọ ya. A gbanwee otú anyị si ghọta amaokwu ụfọdụ dị na Baịbụl, anyị kwesịkwara ịnabata ya. Dị ka ihe atụ, mgbe Jizọs nwụchara, ọtụtụ Ndị Kraịst bụ́ ndị Juu ka chọrọ ịna-edebe Iwu Mozis. O siiri ha ike ịhapụ ya. (Ọrụ 21:17-20) Ma, akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Hibru mere ka ha ghọta na ọ bụghị “àjà ndị a na-achụ dị ka Iwu ahụ si dị” ga-eme ka a gbaghara  ha mmehie ha, kama ọ bụ “àjà e ji ahụ́ Jizọs Kraịst chụọ naanị otu ugboro.” (Hib. 10:5-10) O doro anya na ọtụtụ n’ime ndị Juu ahụ bụ́ Ndị Kraịst nabatara ndụmọdụ ahụ Pọl nyere ha ma gbanwee otú ha si ele Iwu Mozis anya. Anyịnwa kwesịkwara ịna-amụ Baịbụl na akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl. A gbanwee otú anyị si ghọta amaokwu ụfọdụ dị na Baịbụl ma ọ bụ otú anyị si ekwusa ozi ọma, anyị kwesịkwara ịnabata ya.

16. (a) Gịnị mere ibi na Paradaịs ga-eji na-atọ anyị ụtọ? (b) Olee ihe ị na-atụ anya ya n’ụwa ọhụrụ?

16 Jehova ga na-agọzi ndị niile na-erubere ya na nzukọ ya isi. Ndị e tere mmanụ ga-eso Kraịst chịa n’eluigwe. (Rom 8:16, 17) Ọ bụrụ na i nwere olileanya ibi n’ụwa, chegodị otú obi ga-esi dị gị ezigbo ụtọ mgbe ị ga-ebi na Paradaịs. Ebe anyị nọ ná nzukọ Jehova, obi dị anyị ụtọ na anyị so na-agwa ndị ọzọ banyere ụwa ọhụrụ Chineke kwere ná nkwa. (2 Pita 3:13) Abụ Ọma 37:11 kwuru, sị: “Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.” Ndị mmadụ “ga-ewu ụlọ, biri n’ime ha.” Obi ga-adịkwa ha ụtọ n’ihi “ihe aka ha rụpụtara.” (Aịza. 65:21, 22) Mmegbu, ịda ogbenye, na agụụ agaghịzi adị. (Ọma 72:13-16) Babịlọn Ukwu ahụ agaghịzi eduhie ndị mmadụ n’ihi na a ga-ebibi ya. (Mkpu. 18:8, 21) A ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ, nyekwara ha aka ka ha dịrị ndụ ebighị ebi n’ụwa. (Aịza. 25:8; Ọrụ 24:15) Jehova ga-emere ọtụtụ nde ndị na-efe ya ihe ọma a niile. Ọ bụrụ na anyị chọrọ iso ná ndị ọ ga-emere ya, anyị kwesịrị ịgba mbọ ka anyị na ya dịkwuo ná mma, sorokwa nzukọ ya na-aga ụkwụ na ụkwụ.

Chegodị otú obi ga-adị gị mgbe ị ga-anọ na Paradaịs (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16)

17. Olee otú obi kwesịrị ịdị anyị banyere Jehova na nzukọ ya?

17 Ebe ọ bụ na a ga-ebibi ụwa Setan n’oge na-adịghị anya, ka anyị mee ka okwukwe anyị sie ike, jirikwa obi anyị niile na-efe Jehova ná nzukọ ya. Ọ bụ ihe Devid mere. Ọ bụrụ abụ, sị: “Otu ihe ka m rịọrọ Jehova—ọ bụ ihe m ga-achọ, ka m biri n’ụlọ Jehova ụbọchị niile nke ndụ m, ka m wee na-ahụ ịdị mma Jehova, ka m wee jirikwa obi ekele na-ele ụlọ nsọ ya anya.” (Ọma 27:4) Ka onye ọ bụla n’ime anyị gbaa mbọ ka ya na Jehova dịrị ná mma, soro ndị ya na-efe ya ma soro nzukọ ya na-aga ụkwụ na ukwu.