Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Mee 2014

Na-akpa Àgwà Ọma n’Ozi Ọma

Na-akpa Àgwà Ọma n’Ozi Ọma

“Ihe niile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ.”—MAT. 7:12.

1. Ò nwere ihe otú anyị si akpaso ndị mmadụ àgwà n’ozi ọma mere? Nye ihe atụ. (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

AFỌ ole na ole gara aga, otu nwanna na nwunye ya nọ n’ozi ọma n’obodo Fiji, na-enye ndị mmadụ akwụkwọ ịkpọ òkù ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs. Ha na otu nwaanyị nọ n’èzí na-ekwurịta okwu, mmiri ebido izo. Nwanna nwoke ahụ enye ya otu nche anwụ, ya na nwunye ya ejiri otu. Obi dị di na nwunye ahụ ụtọ mgbe nwaanyị ahụ mechara bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs. Nwaanyị ahụ kwuru na ya echetaghị ihe niile ha gwara ya mgbe ahụ ha bịara. Ma, otú ha si kpaso ya àgwà metụrụ ya n’obi, ya asị ka ya bịa. Ihe ahụ ha mere bụ otú Jizọs kwuru anyị kwesịrị isi na-emeso ndị ọzọ ihe.

2. Olee àgwà ọma Jizọs kwuru na anyị kwesịrị ịna-akpa? Olee otú anyị ga-esi eme ihe o kwuru?

2 Olee àgwà ọma Jizọs kwuru anyị kwesịrị ịna-akpa? Ọ sịrị: “Ihe niile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ.” (Mat. 7:12) Olee otú anyị ga-esi eme ihe a Jizọs kwuru? E nwere ụzọ abụọ anyị ga-esi eme ya. Nke mbụ, jụọ onwe gị, sị, ‘Ọ bụrụ na m bụ onye a, olee otú m ga-achọ ka o si mesoo m?’ Nke abụọ, gbalịsie ike ka i meso onye ahụ otú ahụ ị chọrọ ka o si mesoo gị.—1 Kọr. 10:24.

3, 4. (a) Kọwaa ihe mere anyị kwesịrị iji na-akpaso onye ọ bụla àgwà ọma. (b) Gịnị ka anyị ga-eleba anya n’isiokwu a?

 3 Jizọs ò kwuru na ọ bụ naanị ndị nọ n’ọgbakọ ka anyị ga na-akpaso àgwà ọma? Mba. Ihe ahụ o kwuru bụ otú anyị ga-esi na-emeso mmadụ niile, ma ndị iro anyị. (Gụọ Luk 6:27, 28, 31, 35.) Ọ bụrụ na anyị ga-emeso ndị iro anyị otú ahụ Jizọs kwuru, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị imesokwa ndị anyị bịara izi ozi ọma otú ahụ ebe ọ bụ na ọtụtụ n’ime ha nwere ike ige ntị n’ozi ọma ma nweta “ndụ ebighị ebi”?—Ọrụ 13:48.

4 Ka anyị leba anya n’ajụjụ anọ anyị nwere ike iburu n’obi ma anyị nọrọ n’ozi ọma. Ha bụ: Olee onye m bịara izi ozi ọma? Olee ebe m bịara izi ya ozi ọma? Olee mgbe kacha mma ịbịa na nke ya? Olee otú m ga-esi agwa ya okwu? N’isiokwu a, anyị ga-ahụ otú ajụjụ ndị a ga-esi nyere anyị aka ịghọta otú ndị mmadụ chọrọ ka anyị si na-emeso ha. Anyị ga-amazi otú kacha mma anyị nwere ike isi gwa ha okwu.—1 Kọr. 9:19-23.

OLEE ONYE M BỊARA IZI OZI ỌMA?

5. Olee ajụjụ ndị anyị nwere ike ịjụ onwe anyị?

5 Anyị na-ahụ ụdị mmadụ dị iche iche n’ozi ọma. Onye nke ọ bụla nwere nsogbu nke ya na otú e si zụọ ya. (2 Ihe 6:29) I ziwe mmadụ ozi ọma, jụọ onwe gị, sị: ‘Ọ bụrụ na m bụ onye a, olee otú m ga-achọ ka o si mesoo m? M̀ ga-achọ ka o lewe m anya ọjọọ ozugbo ọ hụrụ m? Ka m̀ ga-achọ ka ọ mata onye m bụ?’ Ọ bụrụ na anyị echebara ajụjụ ndị a echiche, ọ ga-eme ka anyị ghọta otú anyị kwesịrị isi mesoo onye ọ bụla anyị gara izi ozi ọma.

6, 7. Gịnị ka anyị ga-eme ma onye anyị bịara izi ozi oma wewe iwe ma ọ bụ kparịwa anyị?

6 Dị ka ihe atụ, Ndị Kraịst na-agbalị ike ha niile ịna-agwa ndị mmadụ okwu ọma otú ahụ Baịbụl kwuru. (Kọl. 4:6) Ma, anyị ezughị okè. Ihe mere n’ụbọchị nwere ike ime ka obi ghara ịdị anyị mma. N’ihi ya, anyị nwere ike ịgwa mmadụ ihe anyị nwere ike imecha kwaara ụta. (Jems 3:2) Ihe dị otú ahụ mee, anyị ga-achọ ka onye ahụ anyị gwara okwu otú na-adịghị mma ghọta na ọ bụghị ihe anyị dị mbụ eme. Anyị agaghị achọ ka o kwuo na anyị na-akparị mmadụ. Anyị buru ihe a n’obi, ọ ga-eme ka anyị ghọta na ndị mesoro anyị otú na-adịghị mma nwere ike imecha kwaa mmakwaara.

7 Ọ bụrụ na onye ị bịara izi ozi ọma ewewe iwe ma ọ bụ kparịwa gị, ọ́ gaghị adị mma ka ị ghọta ihe mere o ji eme otú ahụ? Ònye ma ma ò nwere ihe ya na ya na-alụ n’ụlọ ọrụ ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ? Ọ̀ ga-abụ na ọrịa ekweghị ya ṅụrụ mmiri tọgbọ iko? E nwere ọtụtụ ndị were iwe mgbe ụmụnna anyị bịara izi ha ozi ọma, ma ha emechaa gee ntị n’ihi na ụmụnna ahụ ji obiọma mesoo ha ihe ma kwanyere ha ùgwù.—Ilu 15:1; 1 Pita 3:15.

8. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-ezi “ụdị mmadụ niile” ozi ọma?

8 O nweghị ụdị ndị anyị na-anaghị ezi ozi ọma. Kemgbe afọ ole na ole, e nweela ihe karịrị mmadụ iri isii a kọrọ akụkọ ha n’isiokwu bụ́ “Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ.” A na-ebipụta isiokwu a n’Ụlọ Nche. Ụfọdụ n’ime ndị a kọrọ akụkọ ha bụbu ndị ohi, ndị aṅụrụma, ndị nọ n’òtù ọjọọ, na ndị ọgwụ ọjọọ riri ahụ́. Ndị ọzọ abụrụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndị isi okpukpe, na ndị ji ndụ ha niile na-achụ ego. E nwekwara ndị nke na-ebi ndụ rụrụ arụ. Ma, ha niile nụrụ ozi ọma, kwe ka a mụwara ha Baịbụl, ha agbanwee ndụ ha ma ghọọ Ndịàmà Jehova. N’ihi ya, anyị ekwesịghị iche na e nwere ụdị ndị na-agaghị  anabata ozi ọma Alaeze Chineke. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 6:9-11.) Anyị ma na “ụdị mmadụ niile” nwere ike ịnata eziokwu.—1 Kọr. 9:22.

OLEE EBE M BỊARA IZI OZI ỌMA?

9. Gịnị mere anyị ji kwesị ịkwanyere mmadụ ùgwù ma anyị gaa n’ụlọ ya izi ya ozi ọma?

9 Olee ebe anyị na-agakarị ekwusa ozi ọma? Ọ bụ n’ụlọ ndị mmadụ. (Mat. 10:11-13) Anyị anaghị eji ụlọ anyị egwu egwu. N’ihi ya, obi na-adị anyị ụtọ ma onye bịara n’ụlọ anyị kwanyere anyị ùgwù ma ghara ịbanye n’ebe anyị na-achọghị ka ọ banye. Anyị chọrọ ka ahụ́ ruo anyị ala ma anyị nọrọ n’ụlọ anyị. Obi agaghị adị anyị mma ma mmadụ bịa n’ụlọ anyị na-enyo ma ò nwere onye nọ. Anyị gaa ozi ọma n’ụlọ ndị mmadụ, anyị ekwesịghị ime ha ụdị ihe ahụ.—Ọrụ 5:42.

10. Olee otú anyị ga-esi mee ka ndị nọ n’ókèala anyị ghara iwe iwe?

10 Ebe ọ bụ na mpụ na arụrụala juru n’ụwa taa, ọtụtụ ndị na-enyo onye ha na-amaghị enyo. (2 Tim. 3:1-5) Anyị ekwesịghị ime ihe ga-eme ka ndị mmadụ na-enyo anyị enyo. Ka e were ya na anyị rutere n’ụlọ ndị mmadụ, kụọ aka n’ụzọ. Ma ó nweghị onye pụtaranụ, o nwere ike ịdị anyị ka ọ̀ bụ anyị nyonye anya na windo ma ọ bụ gaa n’azụ ụlọ lee ma ò nwere onye anyị ga-ahụ. I mee ya n’ókèala unu, onye bi ebe ahụ ọ̀ ga-ewe iwe? Olee ihe ndị agbata obi ya ga-eche? N’eziokwu, anyị kwesịrị izi onye ọ bụla nọ n’ókèala anyị ozi ọma. (Ọrụ 10:42) Anyị chọsiri ike izi ozi ọma. Anyị ebughịkwa ihe ọjọọ n’obi. (Rom 1:14, 15) Ma, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ime ka ndị nọ n’ókèala anyị wewe iwe. Pọl onyeozi dere, sị: “Anyị adịghị eme ihe ịsụ ngọngọ n’ụzọ ọ bụla, ka e wee ghara ịhụta mmejọ n’ozi anyị.” (2 Kọr. 6:3) Ọ bụrụ na anyị akwanyere ndị mmadụ ùgwù ma ghara ịbanye n’ebe ha na-achọghị, àgwà anyị nwere ike ime ka ha bịa fewe Jehova.—Gụọ 1 Pita 2:12.

Na-akwanyere onye ị gara izi ozi ọma ùgwù. Agala na-enyo ma mmadụ ọ̀ nọ n’ụlọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10)

OLEE MGBE KACHA MMA ỊGA ZIE OZI ỌMA?

11. Gịnị mere obi ji adị anyị ụtọ ma ọ bụrụ na mmadụ erighị oge anyị?

11 Ọtụtụ n’ime anyị anaghị enwe efe. Ka anyị nwee ike ime ihe niile dịịrị anyị, anyị kwesịrị ịhazi ihe ndị anyị na-eme ahazi ma mara ndị nke ka mkpa. (Efe. 5:16; Fil. 1:10) Ọ bụrụ na ihe emee ka anyị ghara ime ihe ndị anyị kpebiri ime, o nwere ike iwute anyị. N’ihi ya, obi na-adị anyị ụtọ ma ọ bụrụ na mmadụ aghọta na e nwere ihe ndị ọzọ anyị ji oge anyị eme, gharakwa iri oge anyị. Olee otú àgwà ọma ahụ Jizọs gwara anyị ka anyị na-akpa ga-esi nyere anyị aka ka anyị ghara iri oge ndị ọzọ?

12. Olee otú anyị ga-esi amata mgbe kacha mma anyị ga-aga zie ndị bi n’ókèala anyị ozi ọma?

12 Anyị kwesịrị ịmata mgbe kacha mma anyị ga-aga zie mmadụ ozi ọma. Olee mgbe ndị bi n’ókèala anyị na-anọkarị n’ụlọ? Olee mgbe ha ga-enwe ohere gee anyị ntị? Ọ ga-adị mma ka anyị wepụta ohere mgbe ahụ gaa zie ha ozi ọma. Ná mba ụfọdụ, ọ na-akacha mma ịga ozi ụlọ n’ụlọ ná mgbede. Ọ bụrụ na ọ dị otú ahụ n’ókèala unu, ì nwere ike ịhazi ihe ndị ị na-eme ka i nwee ike na-aga ozi ọma mgbe ahụ? (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 10:24.) Jehova ga-agọzi anyị ma ọ bụrụ na anyị ahapụ ihe ụfọdụ ka anyị nwee ike ịga zie ndị bi n’ókèala anyị ozi ọma mgbe ha nwere efe.

13. Olee otú anyị nwere ike isi kwanyere onye anyị chọrọ izi ozi ọma ùgwù?

13 Olee ụzọ ọzọ anyị nwere ike isi gosi na anyị na-akwanyere onye anyị gara  izi ozi ọma ùgwù? Anyị hụ onye nwere mmasị, anyị kwesịrị izi ya ozi ọma otú dị mma. Ma, anyị ekwesịghị ịnọgide na nke ya ahụ́ agbakasịwa ya. O nwere ike ịbụ na o wepụtara oge ahụ ka o jiri ya mee ihe dị ya mkpa. Ọ bụrụ na o kwuo na ya enweghị ohere, anyị nwere ike ịgwa ya na anyị ga-egbu okwu anyị nkenke. Anyị kwesịkwara ime ihe anyị kwuru. (Mat. 5:37) Anyị na onye ahụ kwuchaa, ọ ga-adị mma ka anyị jụọ ya mgbe ọ chọrọ ka anyị bịaghachi. Ndị nkwusa ụfọdụ na-asị: “M chọrọ ịbịa mgbe ọzọ. Ị̀ ga-achọ ka m kpọọ gị n’ekwentị ma ọ bụ jiri ekwentị zitere gị ozi tupu mụ abịa?” Ọ bụrụ na anyị ewepụta oge gaa ozi ọma mgbe ndị bi n’ókèala anyị nwere ohere, ọ pụtara na anyị na-eme ka Pọl. Pọl kwuru na ya ‘anaghị achọ uru nke onwe ya, kama uru nke ọtụtụ ndị, ka e wee zọpụta ha.’—1 Kọr. 10:33.

OLEE OTÚ M GA-ESI AGWA MMADỤ OKWU N’OZI ỌMA?

14-16. (a) Gịnị mere anyị kwesịrị iji gwa onye anyị chọrọ izi ozi ọma ihe mere anyị ji bịa? Nye ihe atụ. (b) Olee otú otu onye nlekọta sekit na-esi ezi ndị mmadụ ozi ọma?

14 Ka e were ya na onye ị na-amaghị kpọrọ gị n’ekwentị jụọ gị ụdị nri na-amasị gị. I nwere ike ịna-eche onye ọ bụ na ihe mere o ji jụọ gị ajụjụ ahụ. O doro anya na ị gaghị achọ ịkparị ya. N’ihi ya, i nwere ike ikwu ihe ole na ole. Ma ọ dị ka ị gaghị ekwute okwu ahụ aka. Ma, were ya na onye ahụ gwara gị onye ọ bụ, gwa gị na ọrụ ya bụ inyere ndị mmadụ aka ịna-eri ezigbo nri, jirikwa  obiọma kwuo na ya chọrọ ịgwa gị ihe ga-abara gị uru. Ihe ndị a ọ kọwara nwere ike ime ka i gee ya ntị. Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị na-achọ ka ndị mmadụ gwa anyị ndị ha bụ mgbe ha bịara ịgwa anyị okwu. Olee otú anyị ga-esi emere ndị anyị hụrụ n’ozi ọma ụdị ihe a?

15 N’ọtụtụ ókèala, anyị kwesịrị ịgwa onye anyị bịara na nke ya hoo haa ihe mere anyị ji bịa. O doro anya na ozi anyị bịara izi onye ahụ dị mkpa. Ma, ka e weregodị ya na i bughị ụzọ kọwaa onwe gị, gị ajụọ onye ahụ, sị: “Ọ bụrụ na e nwere nsogbu dị n’ụwa a ị ga-ewepụli, olee nke ị ga-ewepụ?” Anyị ma na ihe mere i ji jụọ onye ahụ ajụjụ a bụ ka i jiri ya mata ihe o bu n’obi ma kọwaara ya ihe Baịbụl kwuru. Ma, onye ahụ nwere ike ịna-eche, sị: ‘Ònyekwanụ bụ onye a? Gịnị mere o ji jụọ m ihe a? Ò nwere ihe merenụ?’ Anyị kwesịrị ime ka ahụ́ ruo onye anyị bịara izi ozi ọma ala. (Fil. 2:3, 4) Olee otú anyị nwere ike isi mee ya?

16 Ihe otu onye nlekọta sekit na-eme bụ, ya kelechaa onye ọ bịara izi ozi ọma, ya enye ya traktị bụ́ Ị̀ Chọrọ Ịma nke Bụ́ Eziokwu? ma sị ya: “Anyị na-enye ndị niile bi n’ebe a traktị a taa. Ọ zara ajụjụ isii ndị mmadụ na-ajụkarị. Nke a m nyere gị bụ nke gị.” O kwuru na ahụ́ na-eru ndị mmadụ ala ma ọ bụrụ na ya emee ka ha mata ihe mere ya ji bịa na nke ha. Ọ na-adịkwa mfe izi ha ozi ọma. Nwanna ahụ na-ajụzi onye ahụ, sị: “Ò nwetụla mgbe ị jụrụ otu n’ime ajụjụ ndị a?” Onye ahụ kwuo nke ọ jụtụrụla, ya emeghee traktị ahụ, ya na ya atụlee ihe Baịbụl kwuru banyere ya. Ọ bụrụ na o nweghị nke onye ahụ jụtụrụla, ọ na-eji aka ya ahọrọ nke ha ga-atụle ka ọ ghara imenye onye ahụ ihere. N’eziokwu, e nwere ụzọ dị iche iche anyị na mmadụ nwere ike isi malite mkparịta ụka. N’ebe ụfọdụ, onye anyị bịara na nke ya ga-atụ anya ka anyị kelee ya otú ndị obodo ha si ekele ekele tupu anyị ekwuwe ihe anyị bịara. Ihe dị mkpa bụ ka anyị na-ezi ozi ọma otú ga-eme ka ndị bi n’ókèala anyị gee ntị.

AKWỤSỊLA ỊKPA ÀGWÀ ỌMA N’OZI GỊ

17. Olee ụzọ ụfọdụ anyị mụtara anyị nwere ike isi na-akpa àgwà ọma n’ozi ọma?

17 Olee ihe ndị anyị mụtara ga-enyere anyị aka ịna-akpa àgwà ọma n’ozi ọma? Anyị mụtara na anyị kwesịrị izi onye ọ bụla ozi ọma. Anyị gaa n’ụlọ mmadụ, anyị kwesịrị ịkwanyere ya ùgwù ma ghara ịbanye n’ebe ọ na-achọghị ka anyị banye. Anyị ga-agbalịkwa na-aga ozi ọma mgbe ndị bi n’ókèala anyị na-anọkarị n’ụlọ na mgbe ha ga-enwe ohere gee anyị ntị. Anyị kwesịrị ịmalite ozi anyị otú ga-eme ka ndị bi n’ókèala anyị gee ntị.

18. Ọ bụrụ na anyị na-emeso ndị anyị gara izi ozi ọma otú anyị chọrọ ka e si na-emeso anyị, olee uru ọ ga-aba?

18 Ọ bụrụ na anyị na-emeso ndị anyị gara izi ozi ọma otú anyị chọrọ ka e si na-emeso anyị, ọ ga-aba ezigbo uru. Ọ bụrụ na anyị ejiri obiọma na-emeso ha ihe ma na-echebara ha echiche, ọ pụtara na anyị na-eme ka ìhè anyị na-enwu, na anyị na-eme ihe Baịbụl kwuru nakwa na anyị na-enye Nna anyị nke bi n’eluigwe otuto. (Mat. 5:16) Otú anyị si agwa ndị mmadụ okwu n’ozi ọma nwere ike ime ka ha bịa fewe Jehova. (1 Tim. 4:16) Ma ndị anyị ziri ozi ọma hà gere anyị ntị ma ọ bụ na ha egeghị, obi ga-adị anyị ụtọ na anyị ji ike anyị niile kwusaa ozi ọma. (2 Tim. 4:5) Ka anyị niile mee ka Pọl onyeozi. Pọl sịrị: “Ana m eme ihe niile n’ihi ozi ọma, ka m wee bụrụ onye na-ezisara ya ndị ọzọ.” (1 Kọr. 9:23) N’ihi ya, ka anyị na-akpa àgwà ọma n’ozi anyị.