Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Eprel 2014

Ị̀ Na-ahụ “Onye A Na-apụghị Ịhụ Anya”?

Ị̀ Na-ahụ “Onye A Na-apụghị Ịhụ Anya”?

“O guzosiri ike dị ka à ga-asị na ọ na-ahụ onye ahụ anya bụ́ Onye a na-apụghị ịhụ anya.”—HIB. 11:27.

1, 2. (a) Gịnị mere o ji dị ka Mozis ọ̀ nọ ná nsogbu? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Gịnị mere Mozis atụghị iwe eze egwu?

N’OGE ochie, Fero bụ onye ọchịchị dị ike. Ndị Ijipt na-efe ya ka chi. Otu akwụkwọ nke kọrọ banyere mgbe Ijipt na-achị ụwa kwuru na ndị Ijipt weere ya na ‘o nweghị onye amamihe ya na ike ya hà ka nke Fero.’ Fero chọrọ ka ndị Ijipt na-atụ ya egwu. Ọ bụ ya mere o ji ekpu okpueze a kpụnyere agwọ chọrọ ịta mmadụ. Agwọ a chetaara ndị Ijipt na Fero ga-egbu ndị iro ya ozugbo. Chegodị otú obi dị Mozis mgbe Jehova gwara ya na ya ga-eziga ya ka ọ gakwuru Fero, kpọpụtakwa ndị ya, bụ́ ụmụ Izrel, n’Ijipt.—Ọpụ. 3:10.

2 Mozis gara Ijipt, gwa Fero ihe Chineke kwuru. Ezigbo iwe were Fero. Mgbe ihe otiti nke itoolu gachara, Fero gwara Mozis, sị: “Anwala ịhụ ihu m ọzọ, n’ihi na n’ụbọchị ị ga-ahụ ihu m, ị ga-anwụ.” (Ọpụ. 10:28) Tupu Mozis alawa, ọ gwara Fero na ọkpara ya ga-anwụ. (Ọpụ. 11:4-8) Mozis gwaziri ụmụ Izrel ka ezinụlọ ọ bụla gbuo mkpi ma ọ bụ ebule ma fesa ọbara ya n’awara ụzọ ha. Ndị na-efe chi ndị Ijipt a na-akpọ Raa weere ebule ka anụ dị nsọ. (Ọpụ. 12:5-7) Gịnị ka Fero ga-eme? Mozis atụghị ụjọ ihe Fero nwere ike ime. N’ihi gịnị?  N’ihi na o nwere okwukwe ma rubere Jehova isi. “Ọ tụghị iwe eze egwu, n’ihi na o guzosiri ike dị ka à ga-asị na ọ na-ahụ onye ahụ anya bụ́ Onye a na-apụghị ịhụ anya.”—Gụọ Ndị Hibru 11:27, 28.

3. Gịnị ka anyị ga-atụle banyere okwukwe Mozis nwere ‘n’Onye a na-apụghị ịhụ anya’?

3 Okwukwe gị ò siri ike nke na ọ dị gị ka ị̀ ‘na-ahụ Chineke’? (Mat. 5:8) Ka anyị tụlee ihe Mozis mere. Ọ ga-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike ka anyị nwee ike ịhụ “Onye a na-apụghị ịhụ anya.” Olee otú okwukwe o nwere na Jehova si mee ka ọ ghara ịtụ egwu mmadụ? Olee otú o si gosi na obi siri ya ike na Chineke ga-emezu nkwa ya? Olee otú ịhụ “Onye a na-apụghị ịhụ anya” si mee ka obi sie Mozis ike mgbe ya na ndị Izrel nọ ná nsogbu?

“Ọ TỤGHỊ IWE EZE EGWU”

4. Gịnị ka ndị na-enweghị okwukwe nwere ike iche mgbe Mozis gara ịhụ Fero?

4 Ndị na-enweghị okwukwe nwere ike iche na o nweghị ebe ike Mozis ruru nke Fero. O yiri ka ndụ Mozis na ihe niile gbasara ya dị Fero n’aka. Mozis jụdịrị Jehova, sị: ‘Ònye ka m bụ nke na m ga-agakwuru Fero, kpọpụta ụmụ Izrel n’Ijipt?’ (Ọpụ. 3:11) Ihe dị ka afọ iri anọ tupu mgbe ahụ, Mozis si n’Ijipt gbapụ. O nwere ike ịna-eche, sị: ‘Ọ̀ bara uru ka m laghachi Ijipt gaa mee ihe nwere ike ịkpasu eze iwe?’

5, 6. Olee ihe nyeere Mozis aka ịtụ egwu Jehova kama ịtụ egwu Fero?

5 Tupu Mozis alaghachi Ijipt, Chineke kụziiri ya otu ihe dị mkpa. Mozis mechara dee ya n’akwụkwọ Job. O dere, sị: “Ịtụ egwu Jehova—ọ bụ ya bụ amamihe.” (Job 28:28) Jehova chọrọ ka Mozis mụta ịtụ egwu ya na ime ihe gosiri na ọ ma ihe. Ọ bụ ya mere o ji mee ka ọ ghọta na ya na ụmụ mmadụ ahaghị. Ọ jụrụ, sị: “Ònye nyere mmadụ ọnụ ma ọ bụ ònye mere onye na-adịghị ekwu okwu ma ọ bụ onye ntị chiri ma ọ bụ onye na-ahụ ụzọ nke ọma ma ọ bụ onye ìsì? Ọ́ bụghị mụ onwe m, bụ́ Jehova?”—Ọpụ. 4:11.

6 Gịnị ka Mozis kwesịrị ịmụta n’ajụjụ ndị a? O kwesịrị ịmụta na ya ekwesịghị ịtụ ụjọ n’ihi na ọ bụ Jehova dunyere ya ozi. Chineke ga-enye ya ike ọ ga-eji gwa Fero ihe o kwuru. Ike Jehova karịrị nke Fero. A sị ka e kwuwe, ihe a abụghị nke mbụ ndị Chineke nọ ná nsogbu n’Ijipt. O nwere ike ịbụ na Mozis chetara otú Jehova si chebe Ebreham, Josef, na yanwa bụ́ Mozis n’oge Fero ndị chịrị Ijipt tupu mgbe ahụ. (Jen. 12:17-19; 41:14, 39-41; Ọpụ. 1:22–2:10) Mozis nwere okwukwe na Jehova, bụ́ “Onye a na-apụghị ịhụ anya.” Ọ bụ ya mere o ji kata obi gakwuru Fero, gwa ya ihe niile Jehova kwuru.

7. Olee otú okwukwe otu nwanna nwaanyị nwere si mee ka ọ ghara ịtụ egwu mmadụ?

7 E nwere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Ella. Okwukwe o nwere na Jehova mere ka ọ ghara ịtụ egwu mmadụ. N’afọ 1949, Ndị Uwe Ojii Nzuzo nke Mba Sọviet Yuniọn nwụchiri ya n’Estonia, gbaa ya ọtọ, ụmụ okorobịa bụ́ ndị uwe ojii ana-ele ya. O kwuru, sị: “Ihere mere m. Ma, mgbe m kpechara ekpere, obi ruru m ala.” A kpọgara Ella n’ụlọ mkpọrọ gbara ọchịchịrị, ya anọọ naanị ya ụbọchị atọ. O kwuru, sị: “Ndị uwe ojii baara m mba. Ha sịrị: ‘Anyị ga-eme ka a ghara ichetazi aha Jehova n’Estonia! A ga-atụ gị mkpọrọ, chụga ndị ọzọ Saịberịa.’ Ha kwara m emo, jụọ m, sị, ‘Ebee ka Jehova unu nọ?’” Ella ọ̀ ga-atụkwasị Jehova obi, ka ọ̀ ga-atụ egwu mmadụ? Mgbe ndị na-akwa ya emo gbara ya ajụjụ, ọ gwara ha, sị: “M chebarala ya echiche. Ọ kaara m mma ibi n’ụlọ mkpọrọ mụ na Chineke adịrị ná mma karịa na m nweere onwe m ma ghọọ onye iro ya.”  Ọ dị Ella ka ọ̀ na-ahụ Jehova anya, otú ahụ ọ na-ahụ ndị uwe ojii ahụ guzo n’ihu ya. Okwukwe o nwere mere ka o rubere Jehova isi.

8, 9. (a) Gịnị ga-eme ka anyị ghara ịna-atụ egwu mmadụ? (b) Ọ bụrụ na ndị mmadụ chọrọ ime ka ị tụọ ụjọ, ònye ka obi gị kwesịrị ịdị n’ebe ọ nọ?

8 Ọ bụrụ na i nwee okwukwe na Jehova, ọ ga-eme ka ị ghara ịtụ egwu. Ọ bụrụ na ndị ọchịchị anwaa ime ka ị kwụsị ife Chineke, o nwere ike ịdị ka ndụ gị na ihe niile gbasara gị dị ha n’aka. I nwedịrị ike chewe ma ọ̀ ga-abara gị uru ịna-efe Jehova ma kpasuo ndị ọchịchị iwe. Cheta na inwe okwukwe na Chineke ga-eme ka ị ghara ịtụ egwu mmadụ. (Gụọ Ilu 29:25.) Jehova jụrụ, sị: “[Gịnị] mere ị ga-eji na-atụ mmadụ efu nke ga-anwụ anwụ egwu, na-atụkwa nwa nke mmadụ bụ́ onye a ga-eme ka ọ dị ka ahịhịa ndụ egwu?”—Aịza. 51:12, 13.

9 Ka obi gị dịrị n’ebe Nna gị pụrụ ime ihe niile nọ. Ọ na-ahụ ndị niile a na-emegbu emegbu. Ọ na-emetere ha ebere ma na-enyere ha aka. (Ọpụ. 3:7-10) Ọ bụrụgodị na ị ga-anọ n’ihu ndị ọchịchị kọwaa ihe i kweere, ‘echegbula onwe gị banyere otú ị ga-esi ekwu okwu ma ọ bụ ihe ị ga-ekwu; n’ihi na a ga-enye gị ihe ị ga-ekwu n’oge awa ahụ.’ (Mat. 10:18-20) O nweghị ebe ike ndị ọchịchị ruru nke Jehova. Ọ bụrụ na i mee ka okwukwe gị sie ike ugbu a, ọ ga-adị gị ka ị̀ na-ahụ Jehova, ghọtakwa na ọ chọrọ inyere gị aka.

O NWERE OKWUKWE NÁ NKWA CHINEKE

10. (a) Gịnị ka Jehova gwara ndị Izrel ka ha mee n’ọnwa Naịsan nke afọ 1513 Tupu Oge Ndị Kraịst? (b) Gịnị mere Mozis ji rubere Chineke isi?

10 N’ọnwa Naịsan nke afọ 1513 Tupu Oge Ndị Kraịst, Jehova gwara Mozis na Erọn ka ha gaa gwa ndị Izrel ka ha mee ihe ha na-emetụbeghị, ya bụ, ka ha gbuo ebule ma ọ bụ mkpi ahụ́ dị mma, fesa ọbara ya n’awara ụzọ ha. (Ọpụ. 12:3-7) Gịnị ka Mozis mere? Pọl onyeozi mechara dee banyere Mozis, sị: “Ọ bụ okwukwe ka o ji mee ememme ngabiga, fesakwa ọbara n’awara ụzọ, ka onye mbibi ahụ wee ghara ibitụ ndị ha e bu ụzọ mụọ aka.” (Hib. 11:28) Mozis ma na Jehova na-emezu nkwa ọ bụla o kwere, ya enwee okwukwe na ụmụ ndị Ijipt niile e bu ụzọ mụọ ga-anwụ.

11. Gịnị mere Mozis ji gwa ndị Izrel ihe ha ga-eme?

11 Ọ ga-abụ na ụmụ Mozis nọ na Midian mgbe ahụ. O nweghị ihe ga-eme ha n’ebe ahụ. * (Ọpụ. 18:1-6) Ma, Mozis rubeere Chineke isi, gwa ndị isi ezinụlọ ọ bụla ihe ha ga-eme ka “onye mbibi ahụ” ghara igbu ụmụ ha e bu ụzọ mụọ. Mozis hụrụ ndị Izrel ibe ya n’anya. N’ihi ya, o mere ngwa ngwa kpọọ ndị okenye Izrel niile, gwa ha ka ha gbuo anụ ememme ngabiga.—Ọpụ. 12:21.

12. Olee ozi dị mkpa Jehova gwara anyị kwusaa?

12 Ndị mmụọ ozi na-enyere ndị Jehova aka, ha ana-ekwusa ozi dị mkpa, ya bụ, “Tụọnụ egwu Chineke, nyekwa ya otuto, n’ihi na oge awa nke ikpe si n’aka ya eruwo, n’ihi ya, feenụ Onye ahụ nke kere eluigwe na ụwa na oké osimiri na isi mmiri niile.” (Mkpu. 14:7) Ọ bụ ugbu a ka anyị ga-ekwusa ya. Anyị kwesịrị ịdọ ndị agbata obi anyị aka ná ntị ka ha si na Babịlọn Ukwu ahụ pụta, ka ha ghara “ịnata ụfọdụ n’ime ihe otiti ya.” (Mkpu. 18:4) “Atụrụ ọzọ” so Ndị Kraịst e tere mmanụ na-arịọ ndị ha na Chineke na-adịghị ná mma ka ha mee ka ha na ya “dị ná mma.”—Jọn 10:16; 2 Kọr. 5:20.

I nwee okwukwe ná nkwa Jehova, ọ ga na-agụ gị agụụ ikwusa ozi ọma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13)

13. Gịnị ga-eme ka ọ na-agụkwu anyị agụụ ikwusa ozi ọma?

13 Obi siri anyị ike na ugbu a bụ “oge  awa nke ikpe” Chineke. Obi sikwara anyị ike na e kwesịrị ikwusa ozi ọma ngwa ngwa otú ahụ Jehova kwuru. N’ọhụụ, Jọn onyeozi hụrụ “ndị mmụọ ozi anọ ndị guzo na nkuku anọ nke ụwa, ha jidesiri ifufe anọ nke ụwa ike.” (Mkpu. 7:1) Okwukwe i nwere ò mere ka ị ghọta na ọ fọrọ obere ka ndị mmụọ ozi ahụ hapụ ifufe ahụ ha ji, nke ga-eme ka oké mkpagbu ahụ malite n’ụwa? Ọ bụrụ na okwukwe i nwere mere ka ị na-ahụ ndị mmụọ ozi ahụ, obi ga-esi gị ike ịna-ekwusa ozi ọma.

14. Gịnị mere anyị ji ‘adọ ndị ajọ omume aka ná ntị ka ha hapụ ụzọ ọjọọ ha’?

14 Anyị na Jehova adịla ná mma, anyị nwekwara olileanya na anyị ga-adị ndụ ebighị ebi. Ma, anyị ma na anyị kwesịrị ‘ịdọ ndị ajọ omume aka ná ntị ka ha hapụ ụzọ ọjọọ ha wee dị ndụ.’ (Gụọ Ezikiel 3:17-19.) Ma ihe mere anyị ji ekwusa ozi ọma abụghị naanị ka ọbara ndị mmadụ ghara ịdị anyị n’isi. Anyị hụrụ Jehova na ndị agbata obi anyị n’anya. Jizọs ji akụkọ gbasara ezigbo onye Sameria mee ka anyị ghọta ihe ịhụ ndị mmadụ n’anya na imere ha ebere pụtara. Onye ọ bụla kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘M̀ na-eme ka onye Sameria ahụ “nwere ọmịiko,” ka m̀ na-eme ka onye nchụàjà ahụ na onye Livaị ahụ, bụ́ ndị “si n’akụkụ nke ọzọ gafere”? M̀ na-adị njikere izi ndị mmadụ ozi ọma, ka m̀ na-achọ ihe m ga-akụdo aka ghara izi ha ozi ọma?’ (Luk 10:25-37) Ọ bụrụ na anyị enwee okwukwe ná nkwa Chineke, hụ ndị agbata obi anyị n’anya, ọ ga-eme ka anyị jiri ike anyị niile na-ezi ha ozi ọma tupu oge agaa.

 NDỊ IZREL ‘GAFERE OKÉ OSIMIRI UHIE’

15. Gịnị mere o ji dị ụmụ Izrel ka hà tọrọ atọ?

15 Okwukwe Mozis nwere ‘n’Onye a na-apụghị ịhụ anya’ nyeere ya aka mgbe ndị Izrel pụtachara n’Ijipt ma nọrọ ná nsogbu. Baịbụl sịrị: “Ụmụ Izrel malitere ilepụ anya, ma, lee, ndị Ijipt na-abịa n’azụ ha; ụmụ Izrel wee tụọ nnọọ egwu ma malite itiku Jehova.” (Ọpụ. 14:10-12) Ihe a ò kwesịrị iju ha anya? Mba. Jehova ebula ụzọ kwuo, sị: “M ga-ekwe n’ezie ka obi Fero kpọchie, ọ ga-achụwakwa ha, m ga-enwetara onwe m otuto site n’imeri Fero na ìgwè ndị agha ya niile; ndị Ijipt ga-amara na mụ onwe m bụ Jehova.” (Ọpụ. 14:4) N’agbanyeghị ihe ahụ Jehova gwara ndị Izrel, ha enweghị okwukwe. Ha hụrụ naanị ihe anya mmadụ nwere ike ịhụ, ya bụ, Oké Osimiri Uhie nọchiiri ha ụzọ, ụgbọ ịnyịnya agha Fero chụ ha na-abịa, na onye ọzụzụ atụrụ dị afọ iri asatọ nke na-edu ha. Ọ dị ha ka hà tọrọ atọ.

16. Olee otú okwukwe Mozis si mee ka obi sie ya ike mgbe ha rutere n’Oké Osimiri Uhie?

16 Ma, Mozis atụghị ụjọ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ hụrụ ihe ka Oké Osimiri Uhie na ndị agha Fero ike. Ọ ‘hụrụ nzọpụta Jehova,’ marakwa na Chineke ga-alụrụ ndị Izrel ọgụ. (Gụọ Ọpụpụ 14:13, 14.) Okwukwe Mozis nwere mere ka obi sie ndị Izrel ike. Baịbụl sịrị: “Ọ bụ okwukwe ka ha ji gafee Oké Osimiri Uhie dị ka à ga-asị na ọ bụ n’ala akọrọ, ma mgbe ndị Ijipt nwara ịgafe ya, mmiri riri ha.” (Hib. 11:29) Mgbe ihe a mechara, ‘ndị Izrel malitere ịtụ egwu Jehova na inwe okwukwe n’ebe Jehova nọ nakwa n’ebe Mozis ohu ya nọ.’—Ọpụ. 14:31.

17. Olee ihe ga-eme n’ọdịnihu nke ga-eme ka a mata ma ànyị nwere okwukwe?

17 N’oge na-adịghị anya, ọ ga-adị ka ànyị nọ ná nsogbu. Tupu Amagedọn amalite, ndị ọchịchị ụwa ga-ebibicha nnukwu okpukpe dị iche iche, bụ́ ndị siri ike karịa anyị. (Mkpu. 17:16) Jehova buru amụma na anyị ga-adị ka “obodo na-enweghị mgbidi” na ebe na-enweghị “ihe ntụchi ụzọ na ibo ụzọ.” (Ezik. 38:10-12, 14-16) Ọ ga-adị ndị na-enweghị okwukwe ka o nweghị ihe ga-eme ka a ghara ikpochapụ anyị. Gịnị ka ị ga-eme?

18. Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịtụ ụjọ oké mkpagbu ahụ na-abịanụ?

18 Anyị ekwesịghị ịtụ ụjọ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Jehova ebula ụzọ kwuo na a ga-alụso ndị ya ọgụ nakwa na ya ga-azọpụta ha. “‘Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ, n’ụbọchị Gọg ga-abata n’ala Izrel,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘na ọnụma m ga-adị ọkụ nke ukwuu. M ga-eji ekworo m na iwe m dị ọkụ kwuo okwu.’” (Ezik. 38:18-23) Chineke ga-ebibizi ndị niile chọrọ imesi ndị ya ike. Ọ bụrụ na i nwee okwukwe na Jehova ga-echebe gị ‘n’oké ụbọchị ahụ dị egwu,’ ị ‘ga-ahụ nzọpụta Jehova,’ nọsiekwa ike n’ofufe ya.—Joel 2:31, 32.

19. (a) Olee otú Mozis na Jehova dịruru ná mma? (b) Ọ bụrụ na ị na-erubere Jehova isi n’ihe niile ị na-eme, olee ihe ọ ga-emere gị?

19 Kwadowe ugbu a maka ihe ndị a ga-emenụ. Otú ị ga-esi eme ya bụ ‘iguzosi ike dị ka à ga-asị na ị na-ahụ onye ahụ anya bụ́ Onye a na-apụghị ịhụ anya.’ Na-amụchi ihe anya ma na-ekpechi ekpere anya ka gị na Jehova Chineke nwee ike ịdị n’ezigbo mma. Mozis na Jehova dị n’ezigbo mma. Otú Jehova si jiri ya kpaa ike mere ka Baịbụl kwuo na Jehova maara ya “ihu na ihu.” (Diut. 34:10) Mozis bụ onye amụma pụrụ iche. Ọ bụrụ na i nwee okwukwe, gị na Jehova ga-adị n’ezigbo mma nke na ọ ga-adị gị ka ị̀ na-ahụ ya anya. Ọ bụrụ na ị na-erubere Jehova isi n’ihe niile ị na-eme otú ahụ Baịbụl gwara gị mee, ọ ga-eme ka “ụzọ gị kwụrụ ọtọ.”—Ilu 3:6.

^ para. 11 Jehova dunyere ndị mmụọ ozi ya ka ha gaa gbuo ụmụ ndị Ijipt e bu ụzọ mụọ.—Ọma 78:49-51.