Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Mach 2014

Ofufe Ezinụlọ—Ì Nwere Ike Ime Ka Ọ Na-atọkwu Unu Ụtọ?

Ofufe Ezinụlọ—Ì Nwere Ike Ime Ka Ọ Na-atọkwu Unu Ụtọ?

O nwere otu nwanna nwoke bi na Brazil. O kwuru, sị: “Ihe ndị anyị na-ekwurịta n’ofufe ezinụlọ anyị na-atọ anyị ezigbo ụtọ nke na m hapụ nwunye m na ụmụ m, anyị ga-enwegide ya ruo n’ime abalị.” Otu nna bi na Japan kwuru na ọ dị ka nwa ya dị afọ iri anaghị ama na oge agaala. Ọ na-achọ ka ha nwere ya na-aga. Gịnị mere o ji dị nwa ahụ otú ahụ? Nwoke ahụ kwuru, sị: “Anyị na-eme ka ofufe ezinụlọ anyị na-atọ nwa anyị ụtọ. Ọ bụ ya mere obi ji adị ya mma ma anyị na-enwe ya.”

Nke bụ́ eziokwu bụ na ụmụaka ụfọdụ anaghị achọ ka e nwee ofufe ezinụlọ. O nwedịrị ụmụaka ọ na-anaghị atọ ụtọ. Gịnị kpatara ya? Otu nna bi na Togo kwuru ihe ọ chọpụtara. Ọ sịrị: “Ofufe Jehova ekwesịghị ịna-agwụ ike.” Ọ bụrụ na ọ na-agwụ unu ike, o nwere ike ịbụ na e kwesịrị ịgbanwe ihe ụfọdụ n’otú unu si enwe ofufe ezinụlọ. Ọtụtụ ezinụlọ achọpụtala na ofufe ezinụlọ nwere ike ịbụ “ihe na-enye obi ụtọ” otú ahụ Aịzaya kwuru banyere ụbọchị izu ike.—Aịza. 58:13, 14.

Ndị Kraịst bụ́ nna kwesịrị ịhụ na ahụ́ ruru ndị ezinụlọ ha ala n’oge ha na-enwe ofufe ezinụlọ. Ọ bụrụ na ha emee otú ahụ, ofufe ezinụlọ ga na-atọkwu ndị ezinụlọ ha ụtọ. E nwere otu nwanna aha ya bụ Ralf. Ọ mụrụ ụmụ nwaanyị atọ na otu nwoke. O kwuru na ofufe ezinụlọ ha na-adị ka ebe a na-akparịta ụka, ọ naghị adị ka ebe a bịara ọmụmụ ihe. Onye ọ bụla na-etinye ọnụ. Mgbe ụfọdụ, ọ naghị adị mfe ime ka onye ọ bụla nwee mmasị n’ihe a na-amụ, uche onye ọ bụla adịrịkwa na ya. Otu nne kwuru, sị: “Ọ bụghị mgbe niile ka ike na-adị m ime ka ofufe ezinụlọ anyị na-atọ ụtọ otú m chọrọ.” Ị̀ ga-emeli ka ofufe ezinụlọ unu na-atọkwu ụtọ?

NA-AGBANWENỤ IHE UNU NA-AMỤ NA OTÚ UNU SI AMỤ YA

E nwere otu nwanna nwoke bi na Jamanị. Ọ mụrụ ụmụ abụọ. O kwuru, sị: “Anyị na-agbanwekarị otú anyị si amụ ihe n’ofufe ezinụlọ anyị.” Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Natalia mụrụ ụmụ abụọ. O kwuru, sị: “Ihe kacha  ezinụlọ anyị mkpa bụ ịna-amụ ihe dị iche iche n’ofufe ezinụlọ anyị.” Ọtụtụ ezinụlọ na-eke oge ofufe ezinụlọ ha eke ma jiri oge nke ọ bụla mụọ ihe dị iche. Otu nna bi na Brazil nke aha ya bụ Cleiton nwere ụmụaka abụọ. O kwuru na isi otú ahụ enwe ofufe ezinụlọ na-eme ka ọ dịkwuo ụtọ, meekwa ka mmadụ niile tinye ọnụ. Ọ bụrụ na ndị nne na nna emee ka a mụọ ihe dị iche iche n’ofufe ezinụlọ ha, ọ ga-eme ka ha lebara mkpa nwa ha nke ọ bụla anya, ma ndị nke ka dị obere ma ndị nke toro eto. Ndị nne na nna nwere ike ịgbanwe akwụkwọ ha ga-amụ n’ofufe ezinụlọ nakwa otú ha ga-esi na-amụ ya.

Olee ihe ezinụlọ ụfọdụ na-eme ka ha ghara ịna-amụ naanị otu ihe n’ofufe ezinụlọ ha? Ụfọdụ ndị na-eji abụ Alaeze amalite. Otu nna bi na Meksiko aha ya bụ Juan kwuru, sị: “Ọ na-eme ka ahụ́ ruo onye ọ bụla ala, meekwa ka uche anyị dịrị n’ihe anyị ga-amụ.” Ndị ezinụlọ ya na-ahọta abụ dabara n’ihe ha ga-amụ ná mgbede ahụ.

Siri Lanka

Ọtụtụ ezinụlọ na-ahọrọ ebe ha ga-agụkọ ọnụ na Baịbụl. Ka ọ tọọ ụtọ, a na-ekenye onye nke ọ bụla onye ọ ga-agụ ihe o kwuru. Otu nna bi na Japan kwuru na ná mmalite, isi otú ahụ agụ Baịbụl nwere otú ọ dị ya. Ma, obi dị ụmụ abụọ ha mụrụ ụtọ na ndị mụrụ ha kwere ka e si otú ahụ na-enwe ofufe ezinụlọ ha. Ụfọdụ ezinụlọ na-eji akụkọ Baịbụl eme ihe nkiri. Otu nwanna nwoke bi na Saụt Afrịka nke mụrụ ụmụ nwoke abụọ kwuru, sị: “O nwee ihe a kọrọ na Baịbụl anyị na-echetaghị, ụmụ anyị na-echetakarị ya.”

Saụt Afrịka

Otú ọzọ ezinụlọ nwere ike isi gbanwee ihe ha na-amụ n’ofufe ezinụlọ ha bụ ịrụkọ ihe ụfọdụ ọnụ, dị ka ịrụ ụgbọ Noa ma ọ bụ ụlọ nsọ Sọlọmọn. Ịrụ ụdị ihe a ga-eme ka ezinụlọ mee nchọnchọ ga-atọ ha ụtọ. Dị ka ihe atụ, n’Eshia, otu nwata nwaanyị dị afọ ise na papa ya, mama ya, na nne papa ya mere ụdị ihe ahụ. Ha niile nọ na palọ ha mee ihe ezinụlọ ha ga-eji na-azụ okwe. Ha sere ebe dị iche iche Pọl gara ozi ala ọzọ na kaadị. Ha jiri ya na-azụ okwe, ya adị ha ka hà so Pọl na-aga ebe ndị ahụ. O nweekwala ezinụlọ ndị ọzọ mere ụdị ihe ahụ. Ha sere ebe dị iche iche ndị Izrel gara n’ala ịkpa otú ahụ e si kọọ ya n’akwụkwọ Ọpụpụ. Na Togo, otu nwa okorobịa dị afọ iri na itoolu aha ya bụ Donald kwuru na ịgbanwetụ ihe n’ofufe ezinụlọ ha ‘emeela ka ọ na-atọ ha ụtọ, meekwa ka ezinụlọ ha na-enwe obi ụtọ.’ Ò nwere ihe ọzọ i chetara unu ga-eme ka ofufe ezinụlọ unu tọkwuo ụtọ?

Amerịka

ỊKWADO AKWADO DỊ EZIGBO MKPA

Ọ bụ eziokwu na ịgbanwe ihe a na-amụ na otú e si amụ ya na-eme ka ofufe ezinụlọ na-atọ ụtọ, mmadụ niile kwesịrị ịkwado akwado ma ọ bụrụ na ha chọrọ ka ọ baara ha uru. Mgbe ụfọdụ, ọ na-esiri ụmụaka ike ịnọ ọdụ mụọ ihe ruo ogologo oge. N’ihi ya, nna kwesịrị ịhọrọ ihe ọ ga-abụ ha mụọ, ya atọọ ụmụaka ụtọ. Ọ ga-ewepụtakwa oge kwado ya nke ọma. Otu nna kwuru, sị, “M kwado akwado tupu anyị enwee ofufe ezinụlọ, ọ na-abara onye ọ bụla uru.” Na Jamanị, otu nna na-agwa ezinụlọ ya ihe ha ga-amụ n’ọnwa ọzọ. Na Bene, e nwere otu nwoke mụrụ ụmụaka isii. Mgbe ụfọdụ, ha na-ele diiviidi anyị n’ofufe ezinụlọ ha. Olee otú ha si akwado? Tupu ha elee ya, ọ na-enye ụmụ ya ajụjụ ha ga-eji tụlee ihe ha ga-ele. Ịkwado akwado na-eme ka ofufe ezinụlọ bakwuo uru.

Ọ bụrụ na ndị nọ n’ezinụlọ amata ihe ha ga-amụ tupu ha amụọ ya, ọ ga-eme ka ha na-ekwurịta banyere ya n’izu ahụ, meekwa ka ha na-atụsi anya ofufe ezinụlọ ha ike. Ọ bụrụkwa na e nye onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ ihe ọ ga-eme n’ofufe ezinụlọ, ọ ga-ewere ofufe ezinụlọ ahụ ka nke ya.

NA-ENWECHINỤ YA ANYA

Ọ na-esiri ọtụtụ ezinụlọ ike ịna-enwe ofufe ezinụlọ ha kwa izu. N’ihi gịnị?

Ọ bụ n’ihi na ọtụtụ ndị nna na-arụgide ọrụ ruo n’abalị ka ha nwee ike ịna-egboro ezinụlọ ha mkpa ha. Dị ka ihe atụ, na Meksiko, otu nna na-aga ọrụ n’elekere isii nke ụtụtụ ma lọta n’elekere asatọ nke abalị. Mgbe ụfọdụ, ezinụlọ nwere ike iyigharị ụbọchị ha ji enwe ofufe ezinụlọ n’ihi ọbịbịa onye nlekọta sekit ma ọ bụ mgbakọ.

Ma, anyị kwesịrị ikpebisi ike ịna-enwe ofufe ezinụlọ kwa izu. Na Togo, otu nwata nwaanyị dị afọ iri na otu aha ya bụ Loïs kwuru banyere otú ezinụlọ ha si kpebisie ike ịna-enwe ofufe ezinụlọ kwa izu. Ọ sịrị: “Anyị na-enwe ofufe ezinụlọ anyị kwa izu n’agbanyeghị na mgbe ụfọdụ, ihe mere n’ụbọchị nwere ike ime ka anyị ghara ibido ya n’oge.” Ọ bụ ya mere o ji dị mma itinye ofufe ezinụlọ ná mbido izu. O nwee ihe mere na e nweghị ya n’ụbọchị ahụ, e nwee ya n’ụbọchị ọzọ n’izu ahụ.

Gịnị mere anyị ji akpọ ya “ofufe ezinụlọ”? Ọ bụ maka na ọ bụ otu ụzọ anyị si efe Jehova. Ka ndị niile nọ n’ezinụlọ unu na-enye Jehova “ụmụ ehi,” ya bụ, ịna-eto ya kwa izu. (Hos. 14:2) Ka ofufe ezinụlọ na-atọ unu niile ụtọ “n’ihi na ọṅụ Jehova bụ ebe unu e wusiri ike.”—Nehe. 8:9, 10.