Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Mach 2014

Otú Ị Ga-esi Nweta Obi Ndị Ikwu Gị Na-abụghị Ndịàmà Jehova

Otú Ị Ga-esi Nweta Obi Ndị Ikwu Gị Na-abụghị Ndịàmà Jehova

JIZỌS KRAỊST gwara otu nwoke chọrọ ịbụ onye na-eso ụzọ ya, sị: “Lakwuru ndị ikwu gị, kọọkwara ha ihe niile Jehova meere gị nakwa ebere o meere gị.” O nwere ike ịbụ na Jizọs nọ na Gadara mgbe ahụ, n’agbata ebe ndịda na ebe ọwụwa anyanwụ Oké Osimiri Galili. Ihe a Jizọs gwara nwoke a gosiri na Jizọs ma na ndị mmadụ na-achọkarị ịkọrọ ndị ikwu ha ihe ndị dị mkpa na-eme ha obi ụtọ.—Mak 5:19.

Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị taa. Ma, ndị obodo ụfọdụ na-aka agwa ndị ọzọ ihe na-eme ha obi ụtọ karịa ka ndị obodo ọzọ na-eme. N’ihi ya, ọ bụrụ na mmadụ efewe ezi Chineke, bụ́ Jehova, ọ na-achọkarị ịkọrọ ndị ikwu ya ihe ndị o kweere. Ma, olee otú ọ ga-esi akọrọ ha ya? Olee otú ọ ga-esi enweta obi ndị ikwu ya na-ekpe okpukpe ọzọ ma ọ bụdị ndị na-enweghị nke ha na-ekpe? Baịbụl gwara anyị otú dị mma anyị ga-esi eme ya. Anyị ga-emelikwa ya.

“ANYỊ AHỤWO MESAYA AHỤ”

Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, Andru so ná ndị mbụ ghọtara na ọ bụ Mesaya. Olee onye ọ gwara ozugbo banyere ihe a ọ chọpụtara? ‘Ihe mbụ Andru mere bụ ịchọta nwanne ya, bụ́ Saịmọn, wee sị ya: “Anyị ahụwo Mesaya ahụ” (nke pụtara, ma a sụgharịa ya, Kraịst).’ Andru duuru Pita gakwuru Jizọs. O si otú ahụ nyere Pita aka ya aghọọ onye na-eso ụzọ Jizọs.—Jọn 1:35-42.

Mgbe ihe dị ka afọ isii gachara, ya bụ, n’oge Pita bi na Jọpa, a gwara ya gaa Sesaria, n’ụlọ onyeisi ndị agha aha ya bụ Kọnịliọs. Sesaria dị n’ebe ugwu Jọpa. Mgbe Pita rutere n’ụlọ Kọnịliọs, olee ndị ọ hụrụ gbakọtaranụ? Baịbụl kwuru, sị: “Kọnịliọs nọkwa na-atụ anya [Pita na ndị so ya], ọ kpọkọwokwa ndị ikwu ya na ezigbo ndị enyi ya.” Kọnịliọs si otú ahụ mee ka  ndị ikwu ya nụ okwu Pita, ma jiri aka ha kpebie ihe ha ga-eme.—Ọrụ 10:22-33.

Olee ihe anyị ga-amụta n’otú Andru na Kọnịliọs si mesoo ndị ikwu ha?

Andru na Kọnịliọs gbara mbọ tupu ndị ikwu ha aghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Andru ji aka ya kpọrọ Pita bịakwute Jizọs. Kọnịliọs akpọkọta ndị ikwu ya ka ha nụ ihe Pita ga-ekwu. Ma Andru ma Kọnịliọs amanyeghị ndị ikwu ha ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Kraịst. Ha ejighịkwanụ aghụghọ mee otú ahụ. Ò nwere ihe ị mụtara n’ihe a? Anyị kwesịrị ime ka ha. Anyị nwere ike ịgwa ndị ikwu anyị ihe Baịbụl kwuru, na-emekwa ihe ga-eme ka ha nwee mmasị ịmụta eziokwu. Anyị nwekwara ike ime ka ha mata ụfọdụ Ndịàmà Jehova ibe anyị. Ma, anyị kwesịrị ịkwanyere ha ùgwù, hapụ ha ka ha jiri aka ha kpebie ihe ha ga-eme. Anyị ekwesịghị ịna-enye ha nsogbu. Ka anyị tụlee banyere Jürgen na Petra, bụ́ di na nwunye bi na Jamanị. Ọ ga-eme ka anyị mata otú anyị nwere ike isi nyere ndị ikwu anyị aka.

Petra na Ndịàmà Jehova mụrụ Baịbụl, e mechaakwa mee ya baptizim. Jürgen di ya bụ onyeisi ndị agha. Ná mmalite, obi adịghị ya mma na nwunye ya bụ Onyeàmà Jehova. Ma ka oge na-aga, ọ ghọtara na Ndịàmà Jehova na-akụzi eziokwu dị na Baịbụl. O nyefere Jehova onwe ya. Ọ bụ okenye ọgbakọ ugbu a. Olee ihe o kwuru mmadụ nwere ike ime iji nweta obi onye ikwu ya na-abụghị Onyeàmà Jehova?

Jürgen kwuru, sị: “Anyị ekwesịghị ịna-ezi ndị ikwu anyị ozi ọma mgbe niile ma ọ bụ na-amanye ha ka ha gee anyị ntị. Anyị mee otú ahụ, o nwere ike imekwu ka ha ghara inwe mmasị. O nwere ike ịka mma ma anyị gụrụ gụrụ, anyị agwatụ ha ihe Baịbụl kwuru. Ọ dịkwa mma ime ka ndị ikwu anyị mata ụmụnna anyị ha na ha bụ ọgbọ na ndị ihe na-amasị ha na-amasị. Anyị mee otú a, o nwere ike ime ka ha na-ege ntị n’ozi ọma.”

“Anyị ekwesịghị ịna-ezi ndị ikwu anyị ozi ọma mgbe niile ma ọ bụ na-amanye ha ka ha gee anyị ntị.”—Jürgen

Pita onyeozi na ndị ikwu Kọnịliọs nabatara ozi ọma si na Baịbụl ozugbo. Ma, e nwere ndị ọzọ nụrụ eziokwu si na Baịbụl n’oge ndịozi, ya ewee ha oge tupu ha ekpebie ihe ha ga-eme.

ỤMỤNNE JIZỌS KWANỤ?

N’oge Jizọs na-eje ozi ya n’ụwa, e nwere ndị ikwu ya nwere okwukwe na ya. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na Salomi bụ nwanne Meri nne Jizọs nakwa na ọ bụ ya mụrụ ndịozi Jizọs aha ha bụ Jems na Jọn. O nwekwara ike ịbụ na Salomi so ‘n’ọtụtụ ụmụ nwaanyị ndị ọzọ, ndị ji ihe ha nwere na-ejere Jizọs na ndịozi ya ozi.’—Luk 8:1-3.

Ma, ndị ikwu Jizọs ndị ọzọ enweghị okwukwe na ya ozugbo. Dị ka ihe atụ, mgbe e mechara Jizọs baptizim, ihe dị ka otu afọ agaa, ìgwè mmadụ gbakọtara n’otu ụlọ ka ha nụ okwu ya. “Ma mgbe ndị ikwu ya nụrụ ya, ha pụrụ ka ha gaa jide ya, n’ihi na ha nọ na-ekwu, sị: ‘Isi emebiela ya.’” N’oge ọzọ, mgbe ụmụnne Jizọs kwuru gbasara Judia ọ chọrọ ịga, ọ gwaghị ha hoo haa mgbe ọ ga-aga. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na “ụmụnne ya ndị ikom enweghị okwukwe n’ebe ọ nọ.”—Mak 3:21; Jọn 7:5.

Olee ihe anyị ga-amụta n’otú Jizọs si mesoo ndị ikwu ya? O wesaghị ha iwe mgbe ụfọdụ n’ime ha kwuru na isi emebiela ya. Mgbe a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, o mere ihe ọzọ gbara ndị ikwu ya ume. Ọ pụtara n’ihu Jems nwanne ya. O nwere ike ịbụ na ihe a Jizọs mere nyeere Jems na ụmụnne Jizọs ndị ọzọ aka, ha ekweta na Jizọs bụ Mesaya n’eziokwu. Ọ bụ ya mere ha ji soro ndịozi Jizọs na ndị ọzọ nọrọ n’ụlọ elu dị na Jeruselem. Ọ dịkwa ka hà so nata mmụọ nsọ. Ka oge na-aga, Jems na Jud, bụ́ ụmụnne  Jizọs, nwere ihe ùgwù ndị ọzọ.—Ọrụ 1:12-14; 2:1-4; 1 Kọr. 15:7.

Ọ GA-EWE ỤFỌDỤ NDỊ OGE BURU IBU

“Ọ bụrụ na anyị ana-enwe ndidi, ọ ga-aba ezigbo uru.”—Roswitha

Otú ahụ ọ dị n’oge ndịozi bụ otú ọ dị taa. O nwere ike iwe ụfọdụ ndị ikwu anyị oge buru ibu tupu ha abata n’ọgbakọ. Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwaanyị aha ya bụ Roswitha. Ọ na-ekpesi chọọchị Roman Katọlik ike mgbe e mere di ya baptizim n’afọ 1978, ya abụrụ Onyeàmà Jehova. Roswitha kwetasiri ike na ya na-ekpe ezi okpukpe. N’ihi ya, o kweghị di ya ṅụrụ mmiri tọgbọ iko. Ma ka oge na-aga, ọ kwụsịlatara inye di ya nsogbu, ghọtakwa na Ndịàmà Jehova na-akụzi eziokwu. E mere ya baptizim n’afọ 2003. Gịnị so mee ka ọ gbanwee? Di ya ewesaghị ya iwe na ọ na-emegide ya, kama, o mere ihe ndị nyeere ya aka ịgbanwe obi ya. Olee ihe Roswitha kwuru? Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na anyị ana-enwe ndidi, ọ ga-aba ezigbo uru.”

E nwere otu nwaanyị a na-akpọ Monika. O mere baptizim n’afọ 1974. Mgbe ihe dị ka afọ iri gachara, ụmụ ya nwoke abụọ mekwara baptizim. N’agbanyeghị na di ya aha ya bụ Hans enyeghị ha nsogbu maka na ha bụ Ndịàmà Jehova, ọ ghọghị Onyeàmà Jehova n’oge ahụ. Ọ bụ n’afọ 2006 ka e mere ya baptizim. Mgbe ezinụlọ a chetara ihe ndị mere n’oge ahụ, gịnị ka ha kwuru? Ha sịrị: “Akwụsịla ife Jehova. Emekwala ihe Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị.” Ma, otú ha si emeso Hans mgbe niile mere ka ọ mara na ha hụrụ ya n’anya. Obi sikwara ha ike na otu ụbọchị, ọ ga-aghọ Onyeàmà Jehova.

EZIOKWU DỊ NA BAỊBỤL MERE KA OBI TỌỌ HA ỤTỌ

O nwere mgbe Jizọs ji eziokwu tụnyere mmiri nke na-enye ndụ ebighị ebi. (Jọn 4:13, 14) Anyị chọrọ ka ndị ikwu anyị mụta eziokwu dị na Baịbụl n’ihi na ọ ga-eme ka ha nwee obi ụtọ. Ma anyị ekwesịghị ịgba ha mmiri nke eziokwu si na Baịbụl agba, n’ihi na o nwere ike ịgbagbu ha. Ọ bụ otú anyị si agwa ha ihe ndị anyị kweere ga-eme ka ọ tọọ ha ụtọ ma ọ bụ ya adị ha ka à chọrọ ịgbagbu ha. Baịbụl sịrị na “obi onye ezi omume na-atụgharị uche iji zaa okwu” nakwa na “onye nwere obi amamihe na-eme ka ọnụ ya na-ekwupụta nghọta, ọ na-emekwa ka egbugbere ọnụ ya na-ekwu okwu na-eru n’obi.” Olee otú anyị nwere ike isi mee ihe a Baịbụl kwuru?—Ilu 15:28; 16:23.

Nwaanyị nwere ike ịchọ ịgwa di ya ihe o kweere. Ọ bụrụ na ọ “na-atụgharị uche iji zaa okwu,” ọ ga-akpachara anya n’ụdị okwu ọ ga-agwa di ya ma ghara ikwu ya ngwa ngwa. O kwesịghị ime ihe ga-eme ka di ya chee na ọ bụ onye oké ezi omume ma ọ bụkwanụ na ọ ka di ya mma. Okwu o chere echiche nke ọma kwuo ga-eme di ya obi ụtọ, meekwa ka ha dị n’udo. O kwesịrị ịma mgbe o nwere ike ịgwa di ya okwu, uche ya adịrị n’ihe ọ na-agwa ya. Olee ụdị ihe ọ na-ekwukarị ma ọ bụ na-agụkarị? Ọ̀ bụ gbasara sayensị, ọchịchị, ka ọ̀ bụ egwuregwu? Olee ihe ọ ga-eme ka di ya nwee mmasị ige ntị mgbe ọ na-akọrọ ya gbasara Baịbụl? Oleekwa otú ọ ga-esi gosi na ya na-akwanyere di ya ùgwù nakwa na ya anaghị amanye ya ka o kwere ihe yanwa kweere? Ọ bụrụ na o chebara ihe ndị a echiche, ọ ga-eme ka okwu ya na omume ya gosi na o nwere nghọta.

Anyị chọọ ka ndị ikwu anyị ghọọ Ndịàmà Jehova, ihe anyị ga-eme abụghị naanị ịna-akọrọ ha ihe anyị kweere obere obere. Anyị kwesịkwara ịna-akpa àgwà ọma.

NA-AKPA ÀGWÀ ỌMA

Nwanna Jürgen e kwuru okwu ya na mbụ sịrị: “Na-eme ihe Baịbụl kwuru n’ihe ọ bụla ị na-eme n’ụbọchị. Ọ bụ otú dị mma ị ga-esi eme ka ndị ikwu gị nwee mmasị ma mata na ị na-ekpe ezi okpukpe n’agbanyeghị na o nwere ike ha agaghị ekwu ya.” Ì chetara nwoke ahụ a na-akpọ Hans, onye e mere baptizim ihe karịrị iri afọ atọ e mechara nwunye ya? O kwetara ihe a Jürgen kwuru. Ọ sịrị: “Ọ dị mkpa ịna-akpa àgwà ọma e ji mara Ndị Kraịst n’ihi na ọ ga-eme ka ndị ikwu gị hụ uru eziokwu Baịbụl baara gị.” Anyị kwesịrị ime ka ndị ikwu anyị ghọta na ihe anyị kweere mere ka anyị dị iche n’ihi na anyị na-eme ihe ziri ezi, ọ bụghị ihe na-ezighị ezi.

“Ọ dị mkpa ịna-akpa àgwà ọma e ji mara Ndị Kraịst n’ihi na ọ ga-eme ka ndị ikwu gị hụ uru eziokwu Baịbụl baara gị.”—Hans

Pita onyeozi gwara ụmụ nwaanyị di ha na-ekweghị ekwe, sị: “Otú ahụkwa, unu ndị bụ́ nwunye, doonụ onwe unu n’okpuru di unu, ka e wee rite ha n’uru n’ekwughị okwu ọ bụla site n’omume nwunye ha, ma ọ bụrụ na ụfọdụ n’ime ha adịghị erube isi n’okwu Chineke, ebe ha ji anya ha hụ omume unu nke dị ọcha, ya na nkwanye ùgwù dị ukwuu. Unu ekwekwala ka mma unu na-achọ bụrụ ịkpa isi  efu na iyi ihe ịchọ mma ọlaedo ma ọ bụ iyi uwe elu, kama ka ọ bụrụ mmadụ zoro ezo nke dị n’ime obi, nke yi uwe na-apụghị imebi emebi, bụ́ mmụọ dị jụụ, nke dịkwa nwayọọ, nke bara uru nke ukwuu n’anya Chineke.”—1 Pita 3:1-4.

Pita kwuru na àgwà ọma onye bụ́ nwunye nwere ike ime ka di ya chegharịa. Ọ bụ ya mere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Christa ji na-agbalị iji àgwà ọma ya nweta obi di ya kemgbe e mechara ya baptizim n’afọ 1972. Ọ bụ eziokwu na di ya na Ndịàmà Jehova amụbuola Baịbụl, o jighị eziokwu ahụ kpọrọ ihe. Ọ bịatụla ọmụmụ ihe anyị, ya na ndị nọ n’ọgbakọ dịkwa ná mma. Ndị nọ n’ọgbakọ hapụrụ ya ka o jiri aka ya kpebie ihe ọ ga-eme. Olee ihe Christa mere iji nweta obi ya?

Ọ sịrị: “M kpebisiri ike na m ga na-eme ihe otú Jehova kwuru. M kpebikwara iji àgwà ọma m nweta obi di m ‘n’ekwughị okwu.’ Ọ bụrụhaala na o nweghị iwu Baịbụl m ga-ada, m na-eme ihe ọ chọrọ ka m mee. M hapụkwara ya ka o jiri aka ya kpebie ihe ọ ga-eme, ma hapụrụ Jehova nke fọrọnụ.”

Ihe Christa mere gosiri na ọ baghị uru ịna-esi ọnwụ na ihe ga-adịrịrị otú anyị chọrọ ya. O nweghị mgbe ọ kwụsịrị ime ihe gbasara ofufe Jehova, dị ka ịna-agachi ọmụmụ ihe na ozi ọma anya. Ma, ọ ghọtara na ya kwesịrị ịna-echebara di ya echiche, hụ ya n’anya ma wepụta oge ka ya na ya na-anọ. Mgbe anyị na-emeso onye ikwu anyị na-abụghị Onyeàmà Jehova ihe, anyị kwesịrị ịna-echebara ya echiche ma ghara ịna-esi ọnwụ na a ga-emerịrị ihe anyị chọrọ. Baịbụl kwuru na “e nwere oge a kara aka maka ihe ọ bụla.” Ọ pụtara na anyị ga-ewepụta oge ka anyị na ndị ezinụlọ anyị na-abụghị Ndịàmà Jehova na-anọrị, karịchaa, di anyị ma ọ bụ nwunye anyị. Ọ bụrụ na anyị na ha ana-anọrị, ọ ga-eme ka anyị na ha na-ekwurịta okwu nke ọma. Ihe ndị mere eme gosiri na ọ bụrụ na di na nwunye na-ekwurịta okwu nke ọma, ọ ga-eme ka otu n’ime ha ghara ịna-anọ naanị ya, na-eche na a jụrụ ya ajụ, ma ọ bụ na a chọrọ ịnara ya di ya ma ọ bụ nwunye ya.—Ekli. 3:1.

IKE AGWỤLA GỊ

E nwere otu nwanna nwoke aha ya bụ Holger. Nna ya mere baptizim afọ iri abụọ ndị ezinụlọ ha mechara. Holger sịrị: “Anyị kwesịrị ime ka onye ezinụlọ anyị ahụ mata na anyị hụrụ ya n’anya nakwa na anyị na-echeta ya n’ekpere.” Christa kwuru na ‘ya agaghị akwụsị ịtụ anya na di ya ga-anata eziokwu ma ghọọ onye na-efe Jehova.’ Anyị kwesịrị ịna-akpaso ndị ikwu anyị àgwà ọma ma nwee olileanya na ha ga-emecha fewe Jehova.

Ihe mere anyị ji eme ihe a niile bụ ka anyị na ndị ikwu anyị na-adị ná mma nakwa ka anyị nyere ha aka ịmụta eziokwu, meekwa ka ozi ọma ruo ha n’obi. Anyị kwesịrị ‘iji obi dị nwayọọ na nkwanye ùgwù dị ukwuu’ na-eme ihe a niile.—1 Pita 3:15.