Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Mach 2014

Okwu Gị Ọ̀ Bụ “Ee ma Bụrụ Ee e”?

Okwu Gị Ọ̀ Bụ “Ee ma Bụrụ Ee e”?

Tụlee ihe atụ a: Otu okenye ọgbakọ nke so na Kọmitii Na-ahụ Maka Mmekọrịta Anyị na Ndị Ụlọ Ọgwụ kwetara na ya na nwanna nwoke na-eto eto ga-arụ n’ozi ọma n’ụtụtụ Sọnde. N’ụtụtụ ahụ, otu nwanna nwaanyị nwere ihe mberede ụgbọala, e buru ya gaa ụlọ ọgwụ. Di ya kpọrọ okenye ahụ n’ekwentị gwa ya ka o nyere ya aka chọta dọkịta ga-ekwe agwọ nwunye ya n’ejighị ọbara. Okenye ahụ kagburu ozi ọma ya na nwanna nwoke ahụ kpebiri na ha ga-aga ka o nwee ike nyere ezinụlọ a aka.

Tụlee ihe atụ ọzọ: Otu nwanna na nwunye ya gwara otu nwanna nwaanyị nọ n’ọgbakọ ha ka ya na ụmụ ya bịa n’otu mgbede ka ha na ha nọrịa. Ọ bụ naanị nwaanyị a na-azụ ụmụ ya abụọ. Obi tọrọ ụmụaka ahụ ụtọ mgbe mama ha gwara ha banyere ya. Ha tụsiwere anya ike ka ụbọchị ahụ ruo eruo. Ma, n’ụbọchị ga-abọta ụbọchị ha ga-abịa, nwanna ahụ na nwunye ya gwara nwanna nwaanyị ahụ na o nwere ihe ha na-atụghị anya ya merenụ nakwa na òkù ahụ ha kpọrọ ha agazighị adaba. Nwanna nwaanyị ahụ mechara chọpụta ihe mere e ji sị ha abịazila. Mgbe di na nwunye ahụ gwachara ha ka ha bịa na nke ha, ndị enyi ha kpọrọ ha ka ha bịa n’otu mgbede ahụ nwanna nwaanyị ahụ kwesịrị ịbịa na nke ha, ha ekweta ịga.

Ebe anyị bụ Ndị Kraịst, anyị kwesịrị ịna-emezu nkwa anyị kwere. Anyị ekwesịtụghị ịsị ‘ee ma ya abụrụ ee e.’ (2 Kọr. 1:18) Ma, ihe atụ abụọ a gosiri na ihe na-eme ka ndị mmadụ ghara ime ihe ha kwuru na-adị iche iche. Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị ka o nweghị ihe ọzọ anyị ga-eme ma ọ́ bụghị ịkagbu ihe anyị kpebiri ime. O nwere mgbe ụdị ihe a mere Pọl onyeozi.

E BORO PỌL EBUBO NA Ọ NAGHỊ EMEZU NKWA O KWERE

N’afọ 55, Pọl gara Efesọs n’oge ọ na-eje ozi ala ọzọ ya nke atọ. O bu n’obi iji ụgbọ mmiri gafee Oké Osimiri Ejiyan, gaa Kọrịnt, sizie Kọrịnt gaa Masedonia. Ọ laghachiwa Jeruselem, o bu n’obi ileta ọgbakọ dị na Kọrịnt nke ugboro abụọ ka o nwee ike were onyinye obiọma ha wegara ụmụnna nọ na Jeruselem. (1 Kọr. 16:3) Otú anyị si mata bụ na 2 Ndị Kọrịnt 1:15, 16 kwuru, sị: “N’ihi obi ike a, ebu m n’uche ịbịakwute unu, ka unu wee nwee oge ịṅụrị ọṅụ nke ugboro abụọ, mgbe m kwụsịtụchara na nke unu, m ga-aga Masedonia, sikwa na Masedonia lọghachikwute unu, unu ewee dupụtụ m ka m gaa Judia.”

 Ọ dị ka Pọl ò bula ụzọ degara ndị Kọrịnt akwụkwọ ozi, gwa ha na ya na-abịa ileta ha. (1 Kọr. 5:9) Obere oge Pọl degachaara ha ya, ndị ụlọ Kloi mere ka ọ mata na e nwere esemokwu n’ọgbakọ ha. (1 Kọr. 1:10, 11) Pọl gbanweziri ihe o bu n’obi. Ọ gazighị leta ọgbakọ Kọrịnt mgbe ahụ o kwuru. O deziri akwụkwọ ozi a na-akpọ Ndị Kọrịnt nke Mbụ. N’akwụkwọ ozi a, Pọl dụrụ ha ọdụ ma gbazie ha olu. Ọ gwakwara ha na ya agbanweela otú ya ga-esi bịa, na ya ga-ebu ụzọ gaa Masedonia, sizie Masedonia bịa Kọrịnt.—1 Kọr. 16:5, 6. *

O nwere ike ịbụ na mgbe ndị nọ n’ọgbakọ Kọrịnt natara akwụkwọ ozi ahụ, ụfọdụ boro ya ebubo na ọ naghị emezu nkwa ya. Ha chere na ha ka Pọl mma. Ọ bụ ya mere Pọl ji kpọọ ha “ndịozi ọkasị mma.” Mgbe Pọl na-azara ọnụ ya, ọ jụrụ ha, sị: “Mgbe m bu ihe dị otú ahụ n’uche, emeghị m omume ọ bụla na-egosi ejighị ihe kpọrọ ihe, ka m̀ mere? Ka ihe ndị m chọrọ ime, m̀ chọrọ ime ha dị ka anụ ahụ́ si dị, wee sị, ‘Ee, Ee,’ sịkwa ‘Ee e, Ee e’?”—2 Kọr. 1:17; 11:5.

Anyị nwere ike ịjụ, sị: Ihe a Pọl mere ò gosiri na ‘o jighị ihe kpọrọ ihe’? Mba. A na-eji okwu e si na ya sụgharịta “ejighị ihe kpọrọ ihe” akọwa onye ire abụọ. E nwekwara ike iji ya kọwaa onye na-anaghị emezu nkwa ya. Pọl jụrụ, sị, “Ihe ndị m chọrọ ime, m̀ chọrọ ime ha dị ka anụ ahụ́ si dị?” Ajụjụ a ọ jụrụ kwesịrị ime ka Ndị Kraịst nọ na Kọrịnt ghọta na ihe mere o ji gbanwee obi ya abụghị na ọ bụ onye ire abụọ.

Pọl mere ka ha ghọta na ihe ahụ ha boro ya bụ ebubo ụgha. O dere, sị: “Ma a pụrụ ịdabere n’ebe Chineke nọ na okwu anyị na-agwa unu abụghị Ee ma bụrụ Ee e.” (2 Kọr. 1:18) Ihe mere Pọl ji gbanwee obi ya bụ na ime otú ahụ ga-abara ụmụnna ya nọ na Kọrịnt uru. Ná 2 Ndị Kọrịnt 1:23, Pọl kwuru na ọ bụ ka ya ‘zọọ ha mere na ya abịabeghị Kọrịnt.’ Ihe a Pọl mere mere ka ha nwee ohere ime ihe ọ gwara ha mee tupu ya abịa ileta ha. Ihe Pọl tụrụ anya ya mere n’ihi na mgbe ọ nọ na Masedonia, Taịtọs gwara ya na akwụkwọ ozi ya emeela ka ndị Kọrịnt ghọta na ihe ha na-eme adịghị mma, ha echegharịa. Ihe a Pọl nụrụ mere ka obi tọọ ya ụtọ.—2 Kọr. 6:11; 7:5-7.

E SI NA YA NA-ASỊ CHINEKE “AMEN”

Mgbe “ndịozi ọkasị mma” kwuru na Pọl anaghị emezu nkwa ya, o nwekwara ike ịbụ na ihe ha na-ekwu bụ na e kwesịghị ịtụkwasị ozi ọma ọ na-ekwusa obi. Ma, Pọl chetaara ha na ya kwusaara ha ozi ọma banyere Jizọs Kraịst. Ọ sịrị: “Ọkpara Chineke, bụ́ Kraịst Jizọs, onye e kwusara n’etiti unu site n’ọnụ anyị, ya bụ, site n’ọnụ mụ na Silvenọs na Timoti, abụghị Ee ma bụrụkwa Ee e, kama Ee abụrụwo Ee n’ebe ọ nọ.” (2 Kọr. 1:19) Jizọs Kraịst ọ̀ bụ onye a na-ekwesịghị ịtụkwasị obi? Mba. Jizọs kwuru eziokwu n’oge niile ọ dịrị ndụ n’ụwa ma jee ozi ya. (Jọn 14:6; 18:37) Ọ bụrụ na ihe Jizọs kwusara bụ eziokwu na ihe e kwesịrị ịtụkwasị obi, Pọl ekwusaakwa otu ihe ahụ, ọ pụtara na e kwesịkwara ịtụkwasị ihe Pọl kwusara obi.

Jehova bụ “Chineke nke eziokwu.” (Ọma 31:5) Ihe ọzọ Pọl dere kwadoro ya. Ọ sịrị: “N’agbanyeghị ole nkwa Chineke dị, ha abụrụwo Ee site na ya,” ya bụ, site na Kraịst. Ebe ọ bụ na Jizọs fere Chineke n’oge niile ọ nọ n’ụwa, obi kwesịrị isi anyị ike na nkwa Jehova kwere ga-emezu. Pọl kwukwara, sị: ‘Ọ bụ site na ya ka a na-asị Chineke “Amen” ka e wee site n’ọnụ anyị nye ya otuto.’ (2 Kọr. 1:20) Gịnị mere e ji kwuo na Jizọs bụ “Amen”? N’ihi na ọ bụ Jizọs ka Jehova si n’aka ya mee ka o doo anya na nkwa ya niile ga-emezu.

Pọl na-ekwu eziokwu mgbe niile otú ahụ Jehova na Jizọs si ekwu eziokwu. (2 Kọr. 1:19) Ọ bụghị okwu ọzọ eme ọzọ; ọ naghị  ekwe nkwa “dị ka anụ ahụ́ si dị.” (2 Kọr. 1:17) Kama, mmụọ nsọ Chineke na-edu ya. (Gal. 5:16) Ihe ọ bụla Pọl mere gosiri na ọ chọrọ ka ihe dịrị ụmụnna ya mma. Ee ya bụ Ee n’eziokwu.

EE GỊ Ọ̀ BỤ EE N’EZIOKWU?

Ihe a na-ahụkarị taa bụ na ndị na-anaghị eme ihe Baịbụl kwuru na-ekwe nkwa ma ghara imezu ya ma obere ihe metụhaala ma ọ bụkwanụ ma ha hụ ihe ka mma. “Ee” ndị ahịa anaghị abụkarị “ee,” ọ bụrụgodị na e dere ihe ha kwekọrịtara ede. Ọtụtụ ndị chere na ha nwere ike ịhapụ di ha ma ọ bụ nwunye ha mgbe ọ bụla ha chọrọ n’agbanyeghị na di na nwunye kwesịrị ibi mgbe niile. Ọtụtụ ndị na-agba alụkwaghịm. Nke a gosiri na ọtụtụ di na nwunye weere nkwa ha kwere ibe ha ka ihe na-adịghị mkpa na ihe e nwere ike imebi mgbe ọ bụla ha chọrọ.—2 Tim. 3:1, 2.

Gịnwa kwanụ? Ee gị ọ̀ bụ Ee n’eziokwu? Dị ka anyị kwuru ná mmalite isiokwu a, anyị nwere ike ịkagbu ihe anyị bu n’obi ime. Ọ bụghị n’ihi na anyị ejighị ihe kpọrọ ihe, kama, ọ bụ n’ihi ihe bịaara anyị nke ọ na-enweghị ihe ọzọ anyị ma anyị ga-eme. Ma, ọ bụrụ na i kwee nkwa, i kwesịrị ime ihe niile i nwere ike ime ka i mezuo ya. (Ọma 15:4; Mat. 5:37) I mee otú ahụ, a ga-amara na i kwesịrị ntụkwasị obi, na-emezu ihe i kwuru ma na-ekwu eziokwu mgbe niile. (Efe. 4:15, 25; Jems 5:12) Mgbe ndị mmadụ chọpụtara na e nwere ike ịtụkwasị gị obi n’ihe ọ bụla ị na-eme, ha ga na-egekwu gị ntị ma i ziwe ha ozi ọma banyere Alaeze Chineke. N’ihi ya, ka anyị gbalịsie ike na-eme ka Ee anyị bụrụ Ee n’eziokwu.

^ para. 7 Obere oge Pọl dechara Ndị Kọrịnt nke Mbụ, o si Troas gaa Masedonia. Ọ nọ na Masedonia dee Ndị Kọrịnt nke Abụọ. (2 Kọr. 2:12; 7:5) O mechara gaa Kọrịnt.