Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Mach 2014

Otú Anyị Ga-esi Jiri Obi Ụtọ Na-ejere Jehova Ozi

Otú Anyị Ga-esi Jiri Obi Ụtọ Na-ejere Jehova Ozi

“Ọ bụrụ na mmadụ adị ndụ ọbụna ọtụtụ afọ, ya ṅụrịa ọṅụ n’ime afọ niile ahụ.”—EKLI. 11:8.

1. Olee ihe ọma Jehova meere anyị, bụ́ ndị ga-eme ka obi na-atọ anyị ụtọ?

JEHOVA chọrọ ka anyị na-enwe obi ụtọ. O nyela anyị ọtụtụ ihe ọma kwesịrị ime ka obi na-atọ anyị ụtọ. Dị ka ihe atụ, o nyere anyị ndụ. Anyị nwere ike iji ndụ anyị too Chineke n’ihi na o mere ka anyị bata n’ọgbakọ ma na-efe ya. (Ọma 144:15; Jọn 6:44) Jehova mere ka anyị mara na ya hụrụ anyị n’anya. Ọ na-enyekwara anyị aka ka anyị ghara ịkwụsị ijere ya ozi. (Jere. 31:3; 2 Kọr. 4:16) N’ọgbakọ, anyị na ụmụnna anyị dị n’udo, dịrịkwa n’otu. A na-akụziri anyị Okwu Chineke, ụmụnna anyị hụkwara anyị n’anya. Ihe ọzọ bụ na anyị nwere olileanya na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu.

2. Gịnị ka ụfọdụ ndị ohu Jehova na-eche?

2 N’agbanyeghị na e nwere ọtụtụ ihe kwesịrị ime ka obi na-atọ anyị ụtọ, ọ ka na-adị ụfọdụ ndị ohu Jehova ka ha abaghị uru. Ha nwere ike iche na ha abachaghị uru n’anya Jehova nakwa na ozi ha abachaghị uru. Ndị na-eche mgbe niile na ha abachaghị uru nwere ike ịna-eche na ha agaghị enweli obi ụtọ “ọtụtụ afọ.” O nwere ike ịdị ha ka o nweghị ihe ọma na-emere ha.—Ekli. 11:8.

3. Gịnị na gịnị nwere ike ime ka Onye Kraịst chee na ya abaghịzi uru?

3 E nwere ihe ụfọdụ nwere ike ime ka ụmụnna ndị a na-eche na ha abaghịzi uru. O nwere ike ịbụ ihe ha tụrụ anya ya na-emezughị, ọrịa, ma ọ bụkwanụ nká. (Ọma 71:9; Ilu 13:12; Ekli. 7:7)  Ihe ọzọ bụ na Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ịghọta na “obi dị aghụghọ” nakwa na o nwere ike ịna-ama anyị ikpe, ọ bụrụgodị na ihe anyị dị Chineke mma. (Jere. 17:9; 1 Jọn 3:20) Ekwensu na-ebo ndị na-efe Chineke ebubo ụgha. Ndị na-eche echiche otú Setan si eche nwere ike ịgbalị ka anyị kweta ihe Elifaz kwuru, ya bụ na o nweghị uru anyị baara Chineke. Elifaz enweghị okwukwe. Ihe ahụ o kwuru abụghị eziokwu ma n’oge Job ma n’oge anyị a.—Job 4:18, 19.

4. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?

4 N’Akwụkwọ Nsọ, Jehova mere ka obi sie anyị ike na ya ga-anọnyere ndị na-eche na ha abaghị uru. (Ọma 23:4) Otu n’ime ihe ndị o ji enyere anyị aka bụ Okwu ya. Chineke mere ka Baịbụl ‘dị ike, ka e jiri ya kụghasịa ihe ndị gbanyesiri mgbọrọgwụ ike.’ Ọ pụtara na Baịbụl nwere ike ime ka anyị kwụsị ịna-eche na anyị abaghị uru. (2 Kọr. 10:4, 5) N’ihi ya, ka anyị tụlee otú Baịbụl nwere ike isi mee ka anyị kwụsị ịna-eche na anyị abaghị uru ma jiri obi ụtọ na-ejere Chineke ozi. I nwere ike ịmụta ihe ga-abara gị uru n’ihe a anyị ga-atụle, chọpụtakwa otú i nwere ike isi jiri ya gbaa ndị ọzọ ume.

JIRI BAỊBỤL MỤTA OTÚ Ị GA-ESI JIRI OBI ỤTỌ NA-EJERE JEHOVA OZI

5. Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị nwee ike iji obi ụtọ na-ejere Chineke ozi?

5 Pọl onyeozi kwuru ihe ụfọdụ nwere ike inyere anyị aka iji obi ụtọ na-ejere Chineke ozi. Ọ gwara ọgbakọ dị na Kọrịnt, sị: “Na-anwalenụ ma ùnu nọ n’okwukwe ahụ.” (2 Kọr. 13:5) ‘Okwukwe’ Pọl na-ekwu okwu ya bụ ihe niile Ndị Kraịst kweere, bụ́ ndị dị na Baịbụl. Ọ bụrụ na ihe ndị anyị na-ekwu na ihe ndị anyị na-eme dabara n’ihe ndị Baịbụl kwuru, ọ pụtara na anyị na-eme nke ọma nakwa na anyị nọ “n’okwukwe ahụ.” Ma, anyị agaghị na-eme ihe ụfọdụ a na-akụziri anyị ma hapụ ndị ọzọ. Anyị kwesịrị ịna-eme ihe niile dị na Baịbụl Ndị Kraịst na-akụzi.—Jems 2:10, 11.

6. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-anwale ma ànyị “nọ n’okwukwe ahụ”? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

6 O nwere ike obi agaghị aka gị ịnwale ma ị̀ nọ n’okwukwe ahụ, nke ka nke, ma ọ bụrụ na ụjọ na-atụ gị na i nwere ike ịchọpụta na ị naghị eme nke ọma. Ma, otú Jehova si were anyị dị mkpa karịa otú anyị si were onwe anyị n’ihi na ọ ma ihe karịa anyị. (Aịza. 55:8, 9) Ihe mere Jehova ji na-enyocha ndị ohu ya abụghị ka ọ maa ha ikpe, kama ọ bụ ka ọ hụ àgwà ọma ndị ha nwere ma nyere ha aka. I jiri Okwu Chineke na-anwale ma ị̀ “nọ n’okwukwe ahụ,” ọ ga-eme ka ị na-ele onwe gị anya otú Chineke si ele gị anya. Ọ ga-eme ka ị ghara ịna-eche na ị baghị uru. Ọ ga-enyekwara gị aka icheta otú Chineke si ele gị anya, ya bụ na ị bara ezigbo uru n’anya ya. I mee otú ahụ, ọ ga-adị ka ebe i mepere windo ka ìhè bata n’ụlọ gbara ọchịchịrị.

7. Olee uru anyị ga-erite ma anyị tụlee ihe Baịbụl kwuru banyere ndị ji obi ha niile fee Chineke n’oge ochie?

7 Otu ụzọ anyị nwere ike isi nwalee ma ànyị nọ n’okwukwe ahụ bụ ịtụgharị uche n’ihe Baịbụl kwuru gbasara ndị ji obi ha niile fee Chineke n’oge ochie. Jiri otú ihe si dịrị ha tụnyere otú o si dịrị gị, jirikwa otú obi dị ha tụnyere otú obi dị gị ma mara ihe ị gaara eme ma ọ bụrụ gị ka ihe mere ha mere. Ka anyị leba anya n’ihe atụ atọ gosiri otú anyị nwere ike isi jiri Baịbụl nwalee ma ànyị “nọ n’okwukwe ahụ.” Ọ ga-eme ka anyị mụta iji obi ụtọ na-ejere Chineke ozi.

NWAANYỊ DI YA NWỤRỤ NKE DARA OGBENYE

8, 9. (a) Olee otú ihe si dịrị nwaanyị ahụ di ya nwụrụ nke dara ogbenye? (b) Olee ihe nwaanyị a nwere ike ịna-eche?

8 N’oge Jizọs nọ n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem, ọ hụrụ otu nwaanyị di ya nwụrụ  nke dara ogbenye. Ihe nwaanyị a mere ga-enyere anyị aka ịkwụsị iche na anyị abaghị uru ọ bụrụgodị na e nwere ihe ndị anyị na-anaghị emeli. (Gụọ Luk 21:1-4.) Chebara otú ihe si dịrị nwaanyị a echiche. Ọ na-eru uju na di ya anwụọla, na-edikwa ihe ndị isi okpukpe na-eme. Ha ‘na-eripịa ụlọ ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ’ kama ịna-enyere ha aka. (Luk 20:47) Nwaanyị a dara ogbenye nke na naanị ihe o nwere ike inye n’ụlọ nsọ bụ ihe onye ọrụ ga-arụta ná nkeji ole na ole.

9 Gbalịa ghọta otú obi dị nwaanyị a mgbe o ji mkpụrụ ego abụọ ya bata n’ụlọ nsọ. Ọ̀ na-eche na ihe a ọ bịara inye aharughị ka ihe ọ gaara enye mgbe di ya nọ ndụ? Mgbe ọ hụrụ nnukwu ego ndị ọzọ na-atụnye, ihere ò mewere ya, ya echewe na nke ya abaghị uru? Ọ bụrụgodị na o chere otú ahụ, ọ ka nyere ihe o nwere iji kwado ezi ofufe.

10. Olee ihe Jizọs kwuru nke gosiri na nwaanyị ahụ di ya nwụrụ bara uru n’anya Chineke?

10 Jizọs kwuru ihe gosiri na nwaanyị a na onyinye ya bara uru n’anya Jehova. Ọ sịrị na nwaanyị a tụnyere ihe karịrị ihe ndị ọgaranya niile tụnyere. Ego nwaanyị ahụ ga-abanye n’otu igbe ahụ ndị ọzọ tụnyere nke ha. Ma, ọ bụ nwaanyị ahụ ka Jizọs jara mma. Ndị na-agụkọta ego e ji nye onyinye n’ụlọ nsọ agaghị ama na mkpụrụ ego abụọ nwaanyị ahụ tụnyere bara ezigbo uru n’anya Jehova. Ha agaghịkwa ama na Jehova ji nwaanyị ahụ kpọrọ ihe. Ma, ọ bụ otú Chineke si lee nwaanyị ahụ na onyinye ya anya ka mkpa, ọ bụghị ihe ndị ọzọ chere ma ọ bụkwanụ ihe nwaanyị ahụ chere banyere onwe ya. Ì nwere ike iji akụkọ a nwalee ma ị̀ nọ n’okwukwe ahụ?

Gịnị ka ị mụtara n’ihe nwaanyị a di ya nwụrụ nke dara ogbenye mere? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8 ruo 10)

 

11. Gịnị ka ị mụtara n’akụkọ banyere nwaanyị ahụ di ya nwụrụ?

11 Otú ihe si dịrị gị nwere ike ime ka ị ghara imecha ihe ndị ị chọrọ ime n’ozi Jehova. Nká ma ọ bụ ọrịa nwere ike ha agaghị ekwe mmadụ jee ozi ọma otú o bu n’obi. Ma, ò kwesịrị ime ka mmadụ chee na ya ekwesịghị inye akụkọ ozi ya maka na ihe ọ rụtara dị obere? Ọ bụrụgodị na  ahụ́ ka gbasiri gị ike, i nwere ike iche na mbọ ị na-agba enweghị ihe ọ bụ ma e jiri ya tụnyere awa niile ndị Chineke ji na-ejere ya ozi n’ụwa niile kwa afọ. Ma, akụkọ nwaanyị ahụ di ya nwụrụ nke dara ogbenye na-akụziri anyị na Jehova na-ahụ ihe ọ bụla anyị meere ya nakwa na o ji ya kpọrọ ihe, karịchaa ma ọ bụrụ na anyị mere ya n’agbanyeghị na ihe siiri anyị ike. Chebara otú i si jeere Jehova ozi n’afọ gara aga echiche. Ò nwere otu awa ị rụtara nke furu gị ezigbo ihe tupu gị arụta ya? Ọ bụrụ na o nwere, mara na Chineke ji ozi i jeere ya n’awa ahụ kpọrọ ihe. Ị ga-egosi na ị “nọ n’okwukwe ahụ” ma ọ bụrụ na i meere Jehova ihe niile i nwere ike imere ya, otú ahụ nwaanyị ahụ di ya nwụrụ nke dara ogbenye mere.

“WEPỤ MKPỤRỤ OBI M”

12-14. (a) Gịnị ka Ịlaịja mere mgbe o chere na ya abaghị uru? (b) Olee ihe ọ ga-abụ ya mere o ji dị Ịlaịja otú ahụ?

12 Ịlaịja onye amụma ji obi ya niile fee Jehova, okwukwe ya sikwara ike. Ma, o nwere mgbe ihe ọ tụrụ anya ya na-emezughị, ya arịọ Jehova ka o gbuo ya. Ọ sịrị: “O zuwo! Ugbu a, Jehova, wepụ mkpụrụ obi m.” (1 Eze 19:4) Ndị ụdị ihe a mere Ịlaịja na-emetụbeghị nwere ike ikwu na ihe a o kwuru bụ “okwu nzuzu.” (Job 6:3) Ma ihe ahụ o kwuru si ya n’obi. Cheta na Jehova ewesaghị ya iwe maka na ọ chọrọ ịnwụ, kama o nyeere ya aka.

13 Gịnị mere Ịlaịja ji rịọ ka ya nwụọ? Tupu Ịlaịja ekwuo ihe a, ọ rụrụ ọrụ ebube nke gosiri na Jehova bụ ezi Chineke. Mgbe ọ rụchara ọrụ ebube ahụ, e gburu ndị amụma Bel dị narị anọ na iri ise. (1 Eze 18:37-40) O nwere ike ịbụ na Ịlaịja chere na ndị Izrel ga-efewezi Chineke. Ma, ha emeghị otú ahụ. Eze nwaanyị ọjọọ aha ya bụ Jezibel ziri Ịlaịja na ya ga-egbu ya. Ịlaịja gbara ọsọ ndụ. O si Izrel gbara gawa n’ebe ndịda. Ọ gbagara Juda, si ya banye n’ala ịkpa.—1 Eze 19:2-4.

14 Mgbe Ịlaịja nọ naanị ya n’ebe ahụ, o bidoro iche na amụma ọ na-ebu abaghị uru. Ọ gwara Jehova, sị: “Akaghị m nna nna m hà mma.” Ihe ọ na-ekwu bụ na ya abaghị uru otú ahụ ájá na ọkpụkpụ nna nna ya hà nwụrụ anwụ na-abaghị uru. Ọ dị ya ka ya achịtaghị ájá nakwa na o nweghị uru ya baara Jehova ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ.

15. Gịnị ka Chineke mere ka obi nwee ike isi Ịlaịja ike na ọ ka baara ya uru?

15 Ma otú Onye Pụrụ Ime Ihe Niile si were Ịlaịja dị iche n’otú Ịlaịja si were onwe ya. Ịlaịja ka baara Jehova uru, Jehova mekwara ka o doo ya anya. Chineke dunyere mmụọ ozi ya ka ọ gbaa Ịlaịja ume. Jehova nyekwara Ịlaịja nri na mmiri ga-eme ka o nwee ume ọ ga-eji gaa n’Ugwu Horeb nke dị n’ebe ndịda. Ịga ebe ahụ ga-ewe ya ụbọchị iri anọ. Jehova ji obiọma gbazie Ịlaịja mgbe o chere na o nweghị onye Izrel ọzọ na-efe Jehova. O nyekwara Ịlaịja ọrụ ọhụrụ ndị ọ ga-arụ, ya ekweta ịrụ ha. Jehova nyeere Ịlaịja aka. N’ihi ya, o nwetara ume ọ ga-eji rụwa ọrụ ibu amụma ọ na-arụ.—1 Eze 19:5-8, 15-19.

16. Olee ụzọ ụfọdụ Chineke sirila nyere gị aka?

16 I nwere ike iji ihe mere Ịlaịja mara ma ị̀ “nọ n’okwukwe ahụ” ma kwụsị iche na ị baghị uru. Olee otú ị ga-esi eme ya? Nke mbụ, cheta ụzọ dị iche iche Jehova sirila nyere gị aka. Ò nwere mgbe ihe siiri gị ike, okenye ọgbakọ ma ọ bụ Onye Kraịst ọzọ ma nke a na-akọ enyere gị aka? (Gal. 6:2) Ò nweela mgbe Baịbụl, akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl, na ọmụmụ ihe ọgbakọ mere ka ị mara na Jehova hụrụ gị n’anya? Mgbe ọ bụla e si otú ahụ nyere gị aka, cheta kelee Jehova n’ihi na ọ bụ ya nyeere gị aka.—Ọma 121:1, 2.

17. Olee ihe banyere anyị Jehova na-anaghị eji egwu egwu?

17 Nke abụọ, cheta na mmadụ iche na  ya abaghị uru nwere ike iduhie ya. Ihe ka mkpa bụ otú Chineke si were anyị. (Gụọ Ndị Rom 14:4.) Jehova ejighị ofufe anyị na-efe ya na otú anyị si eji obi anyị niile ejere ya ozi egwu egwu. Ọ bụghị otú ihe anyị mere n’ozi Jehova hà ka o ji ama ma ànyị bara uru. O nwere ike ịbụ na e nwere ihe ndị i mere n’ozi Jehova ị na-amaghị. O nwere mgbe ọ dị Ịlaịja otú ahụ. O nwere ike i nyerela ndị nọ n’ọgbakọ aka ma ị maghị. O nwekwara ike ịbụ na otú i si agbasi mbọ ike emeela ka ndị bi n’ókèala unu nụ ozi ọma.

18. Olee ihe ọrụ ọ bụla Jehova nyere gị na-egosi?

18 Nke atọ, mgbe ọ bụla Jehova nyere gị ọrụ, mara na ọ na-egosi na ọ nọnyeere gị. (Jere. 20:11) O nwere ike ịbụ na ọ dị gị ka ọ̀ bụ gị kwụsị ijere Jehova ozi n’ihi na i chere na o nweghị ezigbo ihe ị rụpụtara n’ozi gị otú ahụ Ịlaịja chere. O nwekwara ike ịbụ na e nwere ihe ndị ị chọrọ ime n’ozi Jehova na-adababeghị. Ma, ị ka nwere ihe ùgwù kachanụ onye ọ bụla n’ime anyị nwere, ya bụ, ikwusa ozi ọma na ịza Onyeàmà Jehova. Nọsie ike n’ofufe Jehova. I mee otú ahụ, ị ga-eso “nna gị ukwu ṅụrịa ọṅụ.”—Mat. 25:23.

“EKPERE ONYE NỌ N’AHỤHỤ NA-EKPE”

19. Olee otú obi dị onye dere Abụ Ọma nke 102?

19 Onye dere Abụ Ọma nke 102 nọ n’ezigbo nsogbu. Ọ “nọ n’ahụhụ,” ya bụ, obi adịghị ya mma, e nwekwara ihe ndị na-echegbu ya. O nweghị ike ọ ga-eji die nsogbu ndị bịaara ya. (Okwu mmeghe Abụ Ọma nke 102) Naanị ihe ọ na-eche bụ ahụhụ ọ na-ata, otú o si nọrọ naanị ya, na otú obi dị ya. (Ọma 102:3, 4, 6, 11) Ọ dị ya ka Jehova ọ̀ chọrọ ịjụ ya.—Ọma 102:10.

20. Olee uru ekpere ga-abara onye na-eche na ya abaghị uru?

20 Ma, ọbụ abụ ahụ ka nwere ike ito Jehova. (Gụọ Abụ Ọma 102:19-21.) Ihe e dere n’Abụ Ọma nke 102 gosiri na ndị na-efe Jehova nwere ike inwe nsogbu, ha ana-echekwa banyere ya mgbe niile. Ọ dị ọbụ abụ ahụ ka ọ̀ bụ “nnụnụ nke naanị ya nọ n’elu ụlọ,” ya bụ na ọ dị ya ka ọ̀ bụ naanị ya nọ, nsogbu ezuokwa ya ahụ́. (Ọma 102:7) E nwee mgbe ọ dị gị otú ahụ, gwa Jehova otú obi dị gị otú ahụ ọbụ abụ ahụ mere. Ekpere ga-enyere gị aka ịkwụsị iche na ị bazighị uru. Jehova kwere nkwa na ya “ga-eche ntị nụrụ ekpere nke ndị a napụrụ ihe niile, ọ gaghịkwa eleghara ekpere ha anya.” (Ọma 102:17) Ka obi sie gị ike na Jehova ga-eme ihe a o kwuru.

21. Olee otú onye chere na ya abaghịzi uru ga-esi jiri obi ụtọ na-ejere Chineke ozi?

21 Abụ Ọma nke 102 gosikwara na i nwere ike iji obi ụtọ na-ejere Chineke ozi. Ọbụ abụ ahụ mere otú ahụ. Otú o si mee ya bụ na ọ malitere ichebara otú ya na Jehova si dị ná mma echiche. (Ọma 102:12, 27) Ihe kasiri ya obi bụ na ọ ma na Jehova nọ ya mgbe niile inyere ndị na-efe ya aka ka ha die ọnwụnwa ndị bịaara ha. N’ihi ya, ọ bụrụ na ị naghị ejechara Jehova ozi ugbu a otú ọ dị gị n’obi n’ihi na i chere na ị baghị uru, kpee ekpere banyere ya. Rịọ Chineke ka ọ nụ ekpere gị, ọ bụghị naanị ka i nwee ike ikuru ume ndụ, kamakwa ka e nwee ike “kọsaa aha Jehova.”—Ọma 102:20, 21.

22. Olee otú onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike isi mee ihe dị Jehova mma?

22 N’eziokwu, Baịbụl nwere ike ime ka o doo anyị anya na anyị nọ n’okwukwe ahụ nakwa na anyị bara uru n’anya Jehova. N’ụwa Setan a, ọ gaghị ekwe omume iwepụcha ihe niile na-eme ka obi na-ajọ anyị njọ ma ọ bụ ihe ndị na-eme ka anyị na-eche na anyị abaghị uru. Ma, anyị niile nwere ike ime ihe dị Jehova mma ma nweta ndụ ebighị ebi ma ọ bụrụ na anyị atachie obi na-ejere ya ozi.—Mat. 24:13.