Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) MACH 2014

Ihe Ị Ga-eme Ka Ị Ghara Ịna-achọ Naanị Ọdịmma Onwe Gị

Ihe Ị Ga-eme Ka Ị Ghara Ịna-achọ Naanị Ọdịmma Onwe Gị

“Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m n’azụ, ya jụ onwe ya.”—MAT. 16:24.

1. Olee otú Jizọs si gosi na ya anaghị achọ naanị ọdịmma onwe ya?

MGBE Jizọs nọ n’ụwa, o gosiri na ọ naghị achọ naanị ọdịmma onwe ya. Ime uche Chineke dị ya mkpa karịa ikpori ndụ na ime ihe yanwa chọrọ. (Jọn 5:30) Jizọs kwesịrị ntụkwasị obi ruo mgbe ọ nwụrụ n’elu osisi ịta ahụhụ. O si otú ahụ gosi na ya ga-eme ihe ọ bụla ya nwere ike ime ka ndị ọzọ rite uru.—Fil. 2:8.

2. Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị anaghị achọ naanị ọdịmma onwe anyị? Gịnị mere anyị kwesịrị iji mee otú ahụ?

2 Ebe anyị bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, anyị kwesịrị ịna-eme ka ya, ya bụ, ịna-egosi na anyị anaghị achọ naanị ọdịmma onwe anyị. E kwuo na mmadụ anaghị achọ naanị ọdịmma onwe ya, gịnị ka ọ pụtara? Ọ pụtara na onye ahụ na-adị njikere ịhapụ ihe ndị na-amasị ya ka o nwee ike nyere ndị ọzọ aka. E nwere ike ikwu na onye ahụ na-eme ihe ga-abara ndị ọzọ uru. (Gụọ Matiu 16:24.) Ọ bụrụ na anyị anaghị achọ naanị ọdịmma onwe anyị, o nwere ike inyere anyị aka ịghọta na ọdịmma ndị ọzọ na ihe ga-eme ha obi ụtọ dị mkpa karịa ọdịmma anyị. (Fil. 2:3, 4) Ihe Jizọs kụziri gosiri na anyị agaghị efeli Chineke ma ọ bụrụ na anyị na-achọ naanị ọdịmma onwe anyị. N’ihi gịnị? N’ihi na ihe mere Ndị Kraịst anaghị achọ naanị ọdịmma onwe ha bụ na ha hụrụ ndị ọzọ n’anya. Ọ bụ ịhụnanya ka e ji ama ezigbo ndị na-eso ụzọ Jizọs.  (Jọn 13:34, 35) Chegodị uru ọ baara anyị na anyị nọ n’ọgbakọ zuru ụwa ọnụ, bụ́ ebe ụmụnna anyị na-anaghị achọ naanị ọdịmma onwe ha.

3. Gịnị nwere ike ime ka anyị jiri nke nta nke nta mụtawa ịchọ naanị ọdịmma onwe anyị?

3 Ma, anyị nwere onye iro nke nwere ike iji nke nta nke nta mee ka anyị chọwazie naanị ọdịmma onwe anyị. Onye iro ahụ bụ na anyị na-achọkarị ime ihe ga-adị naanị anyị mma. Cheta otú Adam na Iv si gosi na ha na-achọ naanị ọdịmma onwe ha. Iv mere ihe gosiri na ọ chọrọ ịdị ka Chineke. Adam emee ihe nwunye ya chọrọ kama ime ihe Chineke chọrọ. (Jen. 3:5, 6) Kemgbe Ekwensu mechara ka Adam na Iv kwụsị ife Chineke, ọ ka na-anwa ndị mmadụ ka ha chọwa naanị ọdịmma onwe ha. Ọ nwara Jizọs ka o mee otú ahụ. (Mat. 4:1-9) Taa, Setan eduhiela ọtụtụ ndị, mee ka ha si n’ụzọ dị iche iche na-achọ naanị ọdịmma onwe ha. Ma anyị akpacharaghị anya, anyị nwere ike ịmụta àgwà ọjọọ a ọtụtụ ndị na-akpa.—Efe. 2:2.

4. (a) Ànyị nwere ike kwụsịchaa ịchọ naanị ọdịmma onwe anyị ugbu a? Kọwaa. (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle?

4 E nwere ike iji mmadụ ịchọ naanị ọdịmma onwe ya tụnyere nchara. Ọ bụrụ na a hapụ ihe e ji ígwè rụọ, mmiri ana-ama ya, anwụ ana-achakwa ya, o nwere ike malite ịta nchara. Ọ dịghị mma ka a gbachi ya nkịtị ka ọ tara nchara na-aga n’ihi na o nwere ike imebi ya. Ụdị ihe ahụ nwere ike ime anyị. Ka ọ dị ugbu a, anyị agaghị ewepụli ezughị okè anyị ma ọ bụ kwụsịchaa ịna-achọ naanị ọdịmma onwe anyị. Ma, anyị kwesịrị ịna-agbalịsi ike ka anyị ghara ịna-achọ naanị ọdịmma onwe anyị. Ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, anyị nwere ike imewe otú ahụ. (1 Kọr. 9:26, 27) Olee otú anyị ga-esi amata ma ànyị achọwala naanị ọdịmma onwe anyị? Oleekwa otú anyị ga-esi na-emekwu ihe ga-abara ndị ọzọ uru?

JIRI BAỊBỤL MARA MA Ị̀ NA-ACHỌ NAANỊ ỌDỊMMA ONWE GỊ

5. (a) Olee otú Baịbụl si dị ka enyo? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Anyị chọọ ịma ma ànyị na-achọ naanị ọdịmma onwe anyị, gịnị ka anyị na-ekwesịghị ime?

5 Anyị nwere ike iji enyo lee otú anyị dị. Ọ bụ otú ahụ ka anyị nwere ike isi jiri Baịbụl lee àgwà anyị ma mezie ihe ndị anyị kwesịrị imezi. (Gụọ Jems 1:22-25.) Ma, ọ bụ naanị mgbe anyị jiziri enyo ejizi ka anyị ga-eji ya mara otú anyị dị. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị elee anya n’enyo wepụ anya ozugbo, o nwere ike anyị agaghị ahụ obere ihe dị anyị n’ihu anyị kwesịrị iwepụ. Ma ọ bụkwanụ, anyị nọrọ n’akụkụ lee anya n’enyo, anyị nwere ike ịhụ onye ọzọ. Ọ bụrụ na anyị chọrọ iji Baịbụl mara ma ànyị na-achọ naanị ọdịmma onwe anyị ma ọ bụ na-akpa àgwà ọzọ na-adịghị mma, anyị ekwesịghị ịna-agụ ya ka onye a na-achụ ọsọ, ma ọ bụkwanụ jiri ya na-ahụta ihe onye ọzọ na-emejọ.

6. Olee otú anyị ga-esi ‘nọgide’ n’iwu ahụ zuru okè?

6 Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ịna-agụ Baịbụl kwa ụbọchị ma ghara ịhụ ihe ndị gosiri na anyị achọwala naanị ọdịmma onwe anyị. N’ihi gịnị? Chegodị echiche: N’ihe ahụ Jems kwuru banyere onye “na-ekiri onwe ya” n’enyo, okwu Grik o dere pụtara ileru ihe anya. N’ihi ya, onye ahụ na-eleru onwe ya anya n’enyo. Ma, o nwere ihe ọ na-emeghị. Jems kwuru na ‘ọ pụrụ ma chefuo ụdị mmadụ ọ bụ ozugbo.’ Ọ gawara n’emeghị ihe ọ bụla gbasara ihe ọ hụrụ n’enyo. Ma, onye na-eme okwu Chineke “na-enyocha iwu ahụ zuru okè” ma ‘nọgide n’ime ya.’ Kama ịhapụ iwu zuru okè dị n’Okwu Chineke, ọ nọgidere na ya, na-eme ihe dị na ya. Jizọs kwuru ihe yiri ya mgbe ọ sịrị: “Ọ bụrụ na unu anọgide n’okwu m, unu bụ n’ezie ndị na-eso ụzọ m.”—Jọn 8:31.

7. Olee otú anyị ga-esi jiri Baịbụl mata ma ànyị achọwala naanị ọdịmma onwe anyị?

7 N’ihi ya, ọ bụrụ na ị chọghị ịna-achọ  naanị ọdịmma onwe gị, ihe mbụ ị ga-eme bụ ịna-agụ Okwu Chineke nke ọma. O nwere ike inyere gị aka ịchọpụta ebe i kwesịrị imekwu nke ọma. Ma, e nwere ihe ọzọ i kwesịrị ime. Ọ bụ ime nchọnchọ. Mgbe ị na-agụ akụkọ dị na Baịbụl, were ya na ị nọ mgbe ihe ahụ ị na-agụ mere. Jụọ onwe gị ajụjụ ndị dị ka: ‘Olee ihe m gaara eme ma ọ bụrụ m? M̀ gaara eme ihe ziri ezi?’ Ị tụgharịchaa uche n’ihe ị gụrụ, gbalịsie ike mee ya. Ọ bụ ya kacha mkpa. (Mat. 7:24, 25) Ka anyị tụlee otú ihe Baịbụl kọrọ banyere Eze Sọl na Pita onyeozi ga-esi nyere anyị aka ka anyị ghara ịna-achọ naanị ọdịmma onwe anyị.

MỤTA IHE N’IHE EZE SỌL MERE

8. Olee àgwà Sọl nwere mgbe e mere ya eze? Olee otú o si gosi na o nwere àgwà ahụ?

8 Akụkọ gbasara Eze Sọl kwesịrị ime ka anyị kpachara anya. O nwere ike ime ka anyị mata otú ịchọ naanị ọdịmma onwe anyị ga-esi mee ka anyị ghara ịna-eme ihe ga-abara ndị ọzọ uru. Mgbe e mere Sọl eze, ọ dị umeala n’obi. O bulighị onwe ya elu. (1 Sam. 9:21) Ụfọdụ ndị Izrel katọrọ ya mgbe ọ ghọrọ eze. Ma o kweghị ata ha ahụhụ n’agbanyeghị na ihe ha kwuru gosiri na eze Chineke mere ya adịghị ha mma. (1 Sam. 10:27) Mgbe Eze Sọl du ndị Izrel gaa lụso ndị Amọn agha, o kwere ka mmụọ nsọ Chineke duzie ya. Mgbe o merichara ha, o nyere Jehova otuto maka mmeri ahụ, nke gosiri na ọ dị umeala n’obi.—1 Sam. 11:6, 11-13.

9. Olee otú Sọl si malite ịchọ naanị ọdịmma onwe ya?

9 Sọl mechara chọwa naanị ọdịmma onwe ya ma kwe ka mpako mebie obi ya otú ahụ nchara si emebi ígwè. Mgbe o meriri ndị Amalek n’agha, o mere ihe dị ya n’obi kama irubere Jehova isi. Anyaukwu mere ka Sọl kwakọrọ ihe ndị Amalek kama ibibi ya otú ahụ Chineke gwara ya mee. Mpako mere ka Sọl rụọrọ onwe ya ihe ncheta. (1 Sam. 15:3, 9, 12) Mgbe Samuel onye amụma gwara ya na obi adịghị Jehova mma, ọ gbalịrị ịzọ onwe ya. O kwuru ihe ndị o mere n’iwu ahụ Chineke nyere ya, taakwa ndị ọzọ ụta maka ihe o mejọrọ. (1 Sam. 15:16-21) Mpako mekwara ka ùgwù a ga-akwanyere ya dị ya mkpa karịa ime ihe ga-adị Chineke mma. (1 Sam. 15:30) Olee otú anyị nwere ike isi jiri akụkọ banyere Sọl mere enyo ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ịna-achọ naanị ọdịmma onwe anyị?

10, 11. (a) Olee ihe akụkọ Sọl na-akụziri anyị banyere mmadụ ịchọ naanị ọdịmma onwe ya? (b) Ọ bụrụ na anyị achọghị ime ka Sọl, gịnị ka anyị kwesịrị ime?

10 Ihe mbụ akụkọ Sọl na-akụziri anyị bụ na anyị ekwesịghị iche na ọ bụrụ na anyị anaghị achọ naanị ọdịmma onwe anyị, na anyị emekataghị mụta ya. (1 Tim. 4:10) Cheta na Sọl nọ na-eme nke ọma ná mbido. Ya na Chineke dịkwa ná mma mgbe ahụ. Ma o ji nwayọọ nwayọọ malite ịchọ naanị ọdịmma onwe ya. Jehova mechara jụ Sọl maka inupụrụ ya isi.

11 Ihe nke abụọ akụkọ Sọl na-akụziri anyị bụ na anyị ekwesịghị ịna-eche naanị banyere ebe anyị na-eme nke ọma ma leghara ebe anyị na-emejọ anya. Ime otú ahụ dị ka ebe anyị na-ele onwe anyị n’enyo, obi ana-atọ anyị ụtọ na anyị yi uwe ọhụrụ, ma anyị ahụghị na e nwere unyi dị anyị n’ihu. Ọ bụrụgodị na onwe anyị anaghị ebu anyị isi ka Sọl, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ime ihe ọ bụla ga-eme ka anyị kpawa àgwà ka ya. Ọ bụrụ na e nye anyị ndụmọdụ, anyị ekwesịghị ịzọwa onwe anyị, kwuwe na ihe anyị mere adịchaghị njọ ma ọ bụkwanụ tawa onye ọzọ ụta. Kama ime ka Sọl, anyị kwesịrị iji obi anyị niile nabata ndụmọdụ.—Gụọ Abụ Ọma 141:5.

12. Ọ bụrụ na anyị anaghị achọ naanị ọdịmma onwe anyị, gịnị ka anyị ga-eme ma anyị mee mmehie dị oké njọ?

12 Ọ́ bụrụkwanụ na anyị emee mmehie  dị oké njọ? Sọl chọrọ ka a kwanyere ya ùgwù. Ọ bụ ya mere ọ gbalịghị ka ya na Jehova dịghachi ná mma. Ma, ọ bụrụ na anyị anaghị achọ naanị ọdịmma onwe anyị, ọ ga-eme ka anyị ga-agakwuru ndị okenye ka ha nyere anyị aka n’agbanyeghị na o nwere ike ịna-eme anyị ihere. (Ilu 28:13; Jems 5:14-16) Dị ka ihe atụ, otu nwanna nwoke malitere ile ndị gba ọtọ mgbe ọ dị afọ iri na abụọ. Ihe a ka o megidere na nzuzo ruo ihe karịrị afọ iri. Ọ sịrị: “O siiri m ezigbo ike ịgwa nwunye m na ndị okenye na ọ bụ ihe m na-eme. Ma, mgbe m gwara ha, ọ dị m ka è bupụrụ ibu na-anyịgbu m. Mgbe a napụrụ m ohu na-eje ozi, ụfọdụ ndị enyi m weere ya na m mechuru ha ihu. Ma, ama m na ozi m na-ejere Jehova ugbu a na-eme ya obi ụtọ karịa mgbe m na-ele ndị gba ọtọ. Ihe ka mkpa bụ otú Jehova si were m.”

PITA GBALỊSIRI IKE ỊKWỤSỊ ỊCHỌ NAANỊ ỌDỊMMA ONWE YA

13, 14. Olee otú Pita si chọọ naanị ọdịmma onwe ya?

13 Pita onyeozi gosiri na ọ naghị achọ naanị ọdịmma onwe ya mgbe Jizọs na-azụ ya. (Luk 5:3-11) Ma, Pita nwere ihe ndị ọ ka ga-emezi n’àgwà ya. Dị ka ihe atụ, ezigbo iwe were ya mgbe ndịozi Jizọs aha ha bụ Jems na Jọn rịọrọ Jizọs ka o nye ha ọkwá dị elu n’Alaeze Chineke. O nwere ike ịbụ na Pita chere na ọ bụ ya ka e kwesịrị inye otu n’ime ọkwá ndị ahụ ebe ọ bụ na Jizọs ebula ụzọ kwuo na a ga-enye ya ọrụ pụrụ iche. (Mat. 16:18, 19) Jizọs dọrọ Jems, Jọn, Pita, na ndịozi ndị ọzọ aka ná ntị ka ha ghara ịna-achọ naanị ọdịmma onwe ha, gharakwa ịna-eme ka “ọ̀ bụ ha nwe” ụmụnna ha.—Mak 10:35-45.

14 Mgbe Jizọs dọchara Pita aka ná ntị, o nwere mgbe ụfọdụ Pita chọrọ naanị ọdịmma onwe ya. Mgbe Jizọs gwara ndịozi ya na ha ga-ahapụ ya gbaa ọsọ, Pita kwuru na ya agaghị ahapụ Jizọs, a sịgodị na ndị ọzọ ahapụ ya. O si otú ahụ bulie onwe ya elu ma wetuo ndị ọzọ ala. (Mat. 26:31-33) O kwesịghị iche na ya emekataghị hapụ Jizọs n’ihi na n’abalị ahụ, ọ chọrọ naanị ọdịmma onwe ya. Mgbe ọ na-azọ isi ya, ọ gọnahụrụ Jizọs ugboro atọ.—Mat. 26:69-75.

15. Gịnị mere otú Pita si bie ndụ ji agba anyị ume?

15 N’agbanyeghị ihe ndị ahụ Pita mejọrọ  mgbe ụfọdụ, otú o si bie ndụ na-agba anyị ume. Pita gbasiri mbọ ike, Chineke ejirikwa mmụọ nsọ ya nyere ya aka. Ọ bụ ya mere o ji kwụsị ịchọ naanị ọdịmma onwe ya ma mụta ịna-ejide onwe ya na ịhụ ndị ọzọ n’anya. (Gal. 5:22, 23) O meriri ọnwụnwa ndị ọ na-agaraghị emerili n’oge mbụ. Dị ka ihe atụ, mgbe Pọl onyeozi nọ n’ihu ndị mmadụ baara ya mba, o mere ihe gosiri na ọ dị umeala n’obi. (Gal. 2:11-14) Mgbe Pọl bachaara ya mba, o buurughị ya iwe n’obi ma ọ bụ chee na mba ahụ Pọl baara ya ga-eme ka e ledawa ya anya. O mechara kpọọ Pọl “nwanna anyị a hụrụ n’anya.” (2 Pita 3:15) Ihe Pita mere nwere ike inyere anyị aka ka anyị ghara ịna-achọ naanị ọdịmma onwe anyị.

Olee ihe Pita mere mgbe a bachaara ya mba? Ànyị ga-eme ka Pita? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15)

16. Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị anaghị achọ naanị ọdịmma onwe anyị mgbe ihe siri ike?

16 Gịnị ka ị na-eme mgbe ihe siri ike? Mgbe a tụrụ Pita na ndịozi ndị ọzọ mkpọrọ ma tie ha ihe maka na ha na-ekwusa ozi ọma, ha ṅụrịrị ọṅụ “n’ihi na a gụwo ha ná ndị ruru eru ịbụ ndị a ga-emenye ihere n’ihi aha [Jizọs].” (Ọrụ 5:41) Gịnwakwa nwere ike iwere oge a na-akpagbu gị ka ohere ị ga-eji mee ka Pita ma ghara ịchọ naanị ọdịmma onwe gị. Ị ga-esi otú a gosi na ị na-eso nzọụkwụ Jizọs. (Gụọ 1 Pita 2:20, 21.) Ime otú a nwedịrị ike inyere gị aka ma ndị okenye dọọ gị aka ná ntị. Kama iwesa ha iwe, i kwesịrị ime ka Pita.—Ekli. 7:9.

17, 18. (a) Olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị banyere ihe ndị anyị chọrọ imekwu n’ozi Jehova? (b) Gịnị ka anyị ga-eme ma anyị chọpụta na e nwere ihe gosiri na anyị na-achọ naanị ọdịmma onwe anyị?

17 Ihe Pita mere nwekwara ike inyere gị aka ikpebi ijekwuru Jehova ozi. I nwere ike ime otú ahụ ma ghara ịna-achọ naanị ọdịmma onwe gị. Ma kpachara anya ka ihe mere i ji chọọ ijekwuru Jehova ozi ghara ịbụ na ị chọrọ ịbụ onye a ma ama. Jụọ onwe gị, sị, ‘Gịnị mere m ji chọọ imekwu nke ọma n’ọgbakọ ma ọ bụkwanụ jekwuoro Jehova ozi? Ọ̀ bụ maka na m chọrọ ka ndị ọzọ na-eto m, ka ọ̀ bụ ka e nyekwuo m ikike otú ahụ Jems na Jọn chọrọ ka e nye ha?’

18 Ọ bụrụ na ị chọpụta na e nwere ihe ndị gosiri na ị na-achọ naanị ọdịmma onwe gị, rịọ Jehova ka o nyere gị aka iwepụ ọchịchọ ahụ n’obi gị. Gbalịsizie ike ịna-eme ka e too Jehova, ọ bụghị ka e too gị. (Ọma 86:11) I nwekwara ike ime ihe ndị na-agaghị eme ka a nụwa aha gị. Dị ka ihe atụ, e nwee àgwà ndị so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ na-esiri gị ike ịkpa, i nwere ike ịgbalị mụtakwuo ha. Ma ọ bụkwanụ, ọ bụrụ na ị na-akwado ihe omume e nyere gị n’ọmụmụ ihe, ma ya abụrụ na ị naghị enwecha mmasị iso dewe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha, i nwere ike mee ihe Pọl kwuru ná Ndị Rom 12:16.—Gụọ ya.

19. Ọ bụrụ na anyị ejiri Okwu Chineke leruo onwe anyị anya, gịnị ka anyị ga-eme ka ihe anyị hụrụ ghara ime ka anyị daa mbà?

19 Ọ bụrụ na anyị ejiri Okwu Chineke leruo onwe anyị anya ma hụ ebe ndị anyị na-anaghị eme nke ọma, o nwere ike ime ka anyị daa mbà. Ọ bụrụ na o mee gị, cheta onye ahụ na-eme okwu Chineke Jems kwuru okwu ya. Jems ekwughị oge o were ya imezi ihe ndị ọ chọpụtara. O kwughịkwa na o meziri ihe niile ọ hụrụ n’enyo. Kama, ihe Jems kwuru bụ na onye ahụ ‘nọgidere na-eme iwu ahụ zuru okè.’ (Jems 1:25) O chetara ihe ọ hụrụ n’enyo ma na-agbalị ka o mezie ya. N’ihi ya, na-ele onwe gị anya otú kwesịrị ekwesị ma na-echeta na o nweghị onye zuru okè. (Gụọ Ekliziastis 7:20.) Jehova ga-enyere gị aka otú ahụ o sirila nyere ọtụtụ ụmụnna gị n’agbanyeghị na ha ezughị okè. Ọ bụrụ na ị na-eme ihe Baịbụl kwuru ma na-egosi na ị naghị achọ naanị ọdịmma onwe gị, gị na Jehova ga-adị ná mma. Ọ ga-agọzikwa gị.