Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) FEBỤWARỊ 2014

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Gịnị mere ndị Juu ji “na-atụ anya” Mesaya na narị afọ mbụ?

N’oge Jọn Onye Na-eme Baptizim, ‘ndị Juu nọ na-atụ anya, mmadụ niile nọkwa na-atụle n’obi ha banyere Jọn, sị: “Ọ̀ ga-abụ na ọ bụ ya bụ Kraịst?”’ (Luk 3:15) Gịnị mere ndị Juu ji na-atụ anya Mesaya n’oge ahụ? E nwere ihe ndị kpatara ya.

Mgbe a mụrụ Jizọs, mmụọ ozi Jehova pụtara n’ihu ndị na-azụ atụrụ n’ebe dị nso na Betlehem (1) Mmụọ ozi ahụ gwara ha, sị: “A mụụrụ unu Onye Nzọpụta taa, onye bụ́ Kraịst Onyenwe anyị, n’obodo Devid.” (Luk 2:8-11) Mgbe mmụọ ozi ahụ gwachara ha ihe a, “ndị mmụọ ozi bịakwutere mmụọ ozi ahụ n’ìgwè dị ka ụsụụ ndị agha, na-eto Chineke, sị: * ‘Ka otuto dịrị Chineke n’ebe kasị elu, ka udo dịkwa n’elu ụwa n’etiti ndị Chineke meere amara.’”—Luk 2:13, 14.

Ihe a mmụọ ozi ahụ gwara ndị ọzụzụ atụrụ ahụ dị umeala n’obi mere ka ha gawa Betlehem ozugbo. Mgbe ha ruru hụ Josef na Meri na nwa ọhụrụ ahụ bụ́ Jizọs, ha “mere ka a mara ihe a gwara ha banyere nwatakịrị a.” N’ihi ya, “ihe ndị ọzụzụ atụrụ ahụ kọọrọ ha jukwara ndị niile nụrụ ya anya.” (Luk 2:17, 18) Okwu bụ́ “ndị niile nụrụ ya” gosiri na e nwere ndị ọzọ ndị ọzụzụ atụrụ ahụ kọọrọ gbasara Jizọs ma e wepụ Josef na Meri. Mgbe ndị ọzụzụ atụrụ ahụ lara, ha nọ “na-enye Chineke otuto ma na-aja ya mma maka ihe niile ha nụrụ ma hụ, dị nnọọ ka a kọọrọ ha.” (Luk 2:20) Ndị ọzụzụ atụrụ ahụ kọọrọ ndị ọzọ ihe ọma ahụ ha nụrụ.

Mgbe Meri kuuru ọkpara ya gaa Jeruselem ka o chee ya n’ihu Jehova dị ka iwu Mozis kwuru, otu onye amụma nwaanyị aha ya bụ Ana malitere “inye Chineke ekele, na-agwakwa ndị niile na-echere nnapụta Jeruselem banyere nwatakịrị ahụ.” (2) (Luk 2:36-38; Ọpụ. 13:12) N’ihi ya, a kọọrọ akụkọ gbasara Mesaya na-aga.

Mgbe e mechara, “ndị na-agụ kpakpando, bụ́ ndị si n’ebe ọwụwa anyanwụ, bịara Jeruselem, sị: ‘Olee ebe onye ahụ a mụrụ ịbụ eze ndị Juu nọ? N’ihi na anyị hụrụ kpakpando ya mgbe anyị nọ n’ebe ọwụwa anyanwụ, anyị bịara ịkpọrọ ya isiala.’” (Mat. 2:1, 2) Mgbe Eze Herọd nụrụ ya, “ahụ́ erughị ya ala, ya na ndị niile nọ na Jeruselem. O wee kpọkọta ndị isi nchụàjà niile na ndị  odeakwụkwọ niile nke ndị Juu, malite ịjụ ha ebe a ga-amụ Kraịst.” (3) (Mat. 2:3, 4) N’ihi ya, ọtụtụ ndị nụrụ na a mụọla Mesaya a na-atụ anya ya. *

Ihe ahụ e kwuru na Luk 3:15 gosiri na ụfọdụ ndị Juu chere na Jọn Onye Na-eme Baptizim bụ Kraịst ahụ. Ma Jọn mere ka ha kwụsị iche otú ahụ. Ọ sịrị ha: “Onye ahụ nke na-abịa n’azụ m ka m ike, onye m na-erughị eru iyipụ akpụkpọ ụkwụ ya. Onye ahụ ga-eji mmụọ nsọ na ọkụ mee unu baptizim.” (Mat. 3:11) Ihe a Jọn kwuru gosiri na ọ dị umeala n’obi, meekwa ka ndị Juu tụsiwe anya Mesaya ahụ ike.

Ndị Juu hà ga-ejili izu iri asaa ahụ e buru n’amụma na Daniel 9:24-27 gbakọọ oge Mesaya ahụ ga-abịa? Ha ga-emeli ya, ma anyị ejighị n’aka na ha mere ya. Nke bụ́ eziokwu bụ na n’oge Jizọs, e nwere ọtụtụ ihe ndị mmadụ chere banyere otú e kwesịrị isi gbakọọ izu iri asaa ahụ. Ma, o nweghị nke n’ime ha dabara n’otú anyị sizi ghọta amụma ahụ e buru banyere izu iri asaa. *

E nwere ndị a na-akpọ ndị Esin. Ọtụtụ ndị kwuru na ha bụ otu n’ime òtù ndị e nwere n’okpukpe ndị Juu nakwa na ha bipụrụ iche, ya bụ, n’ala ịkpa. Ndị Esin kwuru na a ga-enwe Mesaya abụọ ná ngwụcha narị afọ anọ na iri itoolu. Ma, anyị ejighị n’aka na ha ji ihe dị n’amụma Daniel gbakọọ ya. Ọ bụrụgodị na ha ji ya gbakọọ ya, ọ dịghị ka ndị Juu hà ga-anabata ihe ndị Esin kwuru.

Na narị afọ nke abụọ nke Oge Ndị Kraịst, ụfọdụ ndị Juu kweere na izu iri asaa ahụ malitere n’afọ 607 Tupu Oge Ndị Kraịst, ya bụ, mgbe e bibiri ụlọ nsọ ha nke mbụ. Ha kwuru na ọ kwụsịrị n’afọ 70, mgbe e bibiri ụlọ nsọ ha nke abụọ. E nwekwara ndị Juu kwuru na o mezuru n’oge ndị Makabii, nke malitere n’ihe dị ka afọ 170 Tupu Oge Ndị Kraịst. N’ihi ya, ndị Juu enweghị otu olu n’otú a ga-esi gbakọọ izu iri asaa ahụ.

A sị na ndịozi Jizọs na Ndị Kraịst oge mbụ ghọtara amụma izu iri asaa ahụ nke ọma, ha gaara ekwu ya iji kwado na Jizọs Kraịst bụ Mesaya nakwa na ọ bịara n’oge e kwuru na ọ ga-abịa. Ma, e nweghị ihe gosiri na Ndị Kraịst oge mbụ mere otú ahụ.

E nwekwara ihe ọzọ anyị na-ekwesịghị ichefu. Oziọma Matiu, Mak, Luk, na Jọn kwuru ọtụtụ amụma e buru n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, bụ́ ndị mezuru n’isi Jizọs Kraịst. (Mat. 1:22, 23; 2:13-15; 4:13-16) Ma, o nweghị onye n’ime ha dere na amụma ahụ e buru banyere izu iri asaa gbasara Jizọs.

Ihe anyị na-ekwu bụ na anyị ejighị n’aka na ndị dịrị ndụ n’oge Jizọs ghọtara amụma ahụ e buru banyere izu iri asaa nke ọma. Ma, ihe ndị e dere n’Oziọma Matiu, Mak, Luk, na Jọn gosiri na e nwere ihe ndị ọzọ mere ndị Juu ji na-atụ anya ọbịbịa Mesaya.

^ para. 4 Baịbụl ekwughị na ndị mmụọ ozi ahụ ‘bụrụ abụ’ mgbe a mụrụ Jizọs.

^ para. 7 Anyị nwere ike ịjụ, sị, Olee otú ndị ahụ na-agụ kpakpando si mata na “kpakpando” ha hụrụ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ gosiri na a mụọla “eze ndị Juu”? Ọ̀ ga-abụ na ha nụrụ na a mụọla Jizọs mgbe ha gafere Izrel?

^ para. 9 Ị chọọ ịmata otú anyị sizi ghọta amụma ahụ e buru banyere izu iri asaa, gụọ akwụkwọ bụ́ Ṅaa Ntị nAmụma Daniel! isi nke 11.