Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Jenụwarị 2014

Olee Mgbe ‘Alaeze Chineke Ga-abịa’?

Olee Mgbe ‘Alaeze Chineke Ga-abịa’?

“Mgbe unu na-ahụ ihe ndị a niile, maranụ na ọ nọ nso n’ọnụ ụzọ.”—MAT. 24:33.

1, 2. (a) Olee ihe nwere ike ime ka mmadụ ghara ịhụ ihe ụfọdụ? (b) Gịnị ka anyị ma banyere Alaeze Chineke?

O NWERE ike ịbụ na ị chọpụtala na ọ bụrụ na ihe emee, otú ndị mmadụ si akọ gbasara ya anaghị abụ otu. Ọ bụrụkwa na mmadụ agaa ụlọ ọgwụ ka dọkịta lee ya ahụ́, o nwere ike isiri ya ike ichetacha ihe dọkịta gwara ya. Nwa kii mmadụ ma ọ bụ enyo anya ya nwere ike ịdị ya n’ihu, ma ọ gaghị ahụ ya. Ndị ọkachamara kwuru na ọ bụrụ na mmadụ ana-eme ihe abụọ otu mgbe, uche ya agaghị adịcha na ha abụọ. Chineke kere ụbụrụ anyị ka o nwee ike iche naanị otu ihe otu mgbe.

2 Ọ bụrụ na anyị echee banyere ihe ndị na-eme n’ụwa taa, anyị ga-amata na ụdị ihe ahụ na-eme ọtụtụ ndị. Ha nwere ike ikweta na ọtụtụ ihe agbanweela n’ụwa kemgbe afọ 1914, ma ha amaghị ihe ihe ndị a pụtara. Ebe anyị na-amụ Baịbụl, anyị ma na Alaeze Chineke malitere ịchị n’afọ 1914 mgbe e chiri Jizọs Eze n’eluigwe. Ma, anyị ma na a zachabeghị ekpere ahụ Jizọs kụziiri anyị, ya bụ, “Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” (Mat. 6:10) A ga-azacha ya mgbe a ga-ebibi ụwa ochie a. Ọ bụ mgbe ahụ ka uche Chineke ga-eme n’ụwa otú ahụ ọ na-eme n’eluigwe.

3. Olee ihe anyị mụtara na Baịbụl?

 3 Baịbụl anyị na-amụ mgbe niile emeela ka anyị ghọta na amụma ndị e buru na ya na-emezu ugbu a. Ma, ọtụtụ ndị bi n’ụwa amaghị na amụma ndị ahụ na-emezu. Mere nke a mere nke a ekweghị ha hụ ihe gosiri na Kraịst na-achị kemgbe afọ 1914 nakwa na Chineke ga-ebibi ụwa ọjọọ a n’oge na-adịghị anya. Ọ bụrụ na ị na-efe Jehova kemgbe ọtụtụ afọ, jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ ka kwetasiri ike na ọ fọrọ obere ka e bibie ụwa ochie a nakwa na ihe ndị na-eme n’ụwa gosiri na a ga-ebibi ya n’oge na-adịghị anya?’ Ọ bụrụgodị na o tebeghị ị batara n’ọgbakọ, olee ihe kacha gị mkpa? N’agbanyeghị ihe ị zara, ka anyị leba anya n’ihe atọ dị mkpa mere obi ji sie anyị ike na uche Chineke ga-eme n’ụwa n’oge na-adịghị anya.

NDỊ ỊNYỊNYA AHỤ APỤTACHAALA

4, 5. (a) Gịnị ka Jizọs na-eme kemgbe 1914? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Gịnị ka ndị ịnyịnya atọ ahụ nọchiri anya ha? Olee otú ihe ndị ahụ Baịbụl buru n’amụma sirila mezuo?

4 N’afọ 1914, e kpuwere Jizọs Kraịst okpueze n’eluigwe. Amụma ahụ e dere ná Mkpughe isi isii kwuru na Jizọs nọ n’elu ịnyịnya ọcha. Ozugbo ọ ghọrọ Eze, ọ gbaara gawa ka o merie ụwa Setan. (Gụọ Mkpughe 6:1, 2.) Amụma ahụ kwuru na Jizọs chịwa n’eluigwe, ihe ga-aka njọ n’ụwa. A ga-enwe agha, ụkọ nri, ọrịa, na ihe ndị ọzọ na-akpata ọnwụ otú a na-enwetụbeghị ha. Ndị ịnyịnya atọ ahụ sochiri Jizọs Kraịst nọchiri anya nsogbu ndị a.—Mkpu. 6:3-8.

5 Baịbụl buru amụma na agha ‘wepụrụ udo n’ụwa,’ n’agbanyeghị na mba dị iche iche ekweela nkwa na ha ga na-emekọ ihe ọnụ, na-agbakwa mbọ ka udo dị. Kemgbe a lụchara Agha Ụwa Mbụ, e nweela agha ndị ọzọ a lụrụ, bụ́ ndị gburu ọtụtụ ndị, meekwa ka udo ghara ịdị. Kemgbe 1914, ọtụtụ mba enweela ego, ndị ọkà mmụta sayensị arụpụtakwala ọtụtụ ihe. Ma, ụkọ nri ka so n’ihe na-akpata esemokwu na agha n’ụwa. O nweghị onye ga-ekwu na ọtụtụ nde mmadụ anaghị anwụ kwa afọ n’ihi ụdị ọrịa dị iche iche, ọdachi ndị na-emere onwe ha, na nsogbu ndị ọzọ. E nwetụbeghị mgbe ihe ndị a mere otú ha na-eme taa. Ha na-emezi n’ọtụtụ ebe, na-egbukwa ọtụtụ ndị. Ị̀ ghọtara ihe ihe a na-emenụ pụtara?

Ebe ọ bụ na ndị ịnyịnya ahụ ka na-agba, ihe ndị na-eme n’ụwa ga na-aka njọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4 na nke 5)

6. Ole ndị matara na amụma Baịbụl emezuola? Oleekwa ihe ha mere mgbe amụma ahụ mezuru?

6 Agha Ụwa Mbụ na oké ahụ́ ọkụ si Spen megharịrị ọtụtụ ndị anya. Ma, Ndị Kraịst e tere mmanụ nọ na-atụsi anya 1914 ike na ọ bụ mgbe Oge Ndị Jentaịl ma ọ bụ “oge a kara aka nke ndị mba ọzọ” ga-agwụ. (Luk 21:24) Ha amachaghị otú amụma Baịbụl ga-esi mezuo. Ma, ha ma na ihe dị mkpa gbasara Alaeze Chineke ga-eme n’afọ 1914. Ozugbo ha ghọtara na amụma ahụ emezuola, ha ji obi ike na-agwa ndị ọzọ na Alaeze Chineke achịwala. A malitere ịkpagbu ọtụtụ ndị kwusara banyere Alaeze Chineke. Mkpagbu ahụ a kpagburu ha n’ọtụtụ mba mezuru amụma dị na Baịbụl. Ruo ọtụtụ afọ, ndị iro Alaeze Chineke tiri iwu dị iche iche iji mee ka a kwụsị ikwusa ozi ọma. Ha kụrụ ụmụnna anyị isi aba okpu ma tụọ ụfọdụ n’ime ha mkpọrọ. E nwere ndị a kwụgburu, nwee ndị a gbagburu, nweekwa ndị e gbupụrụ isi.—Ọma 94:20; Mkpu. 12:15.

7. Gịnị mere ọtụtụ ndị aghọtaghị ihe ihe ndị na-eme n’ụwa pụtara?

7 Ebe ọ bụ na e nwere ọtụtụ ihe gosiri na Alaeze Chineke achịwala n’eluigwe,  gịnị mere na ọtụtụ ndị ekwetaghị na ọ bụ ihe ọ pụtara? Gịnị mere na ha aghọtaghị na ihe ndị na-eme n’ụwa na-emezu amụma Baịbụl otú ahụ ndị Chineke na-ekwu kemgbe na ihe ndị ahụ ga-eme? Ọ̀ ga-abụ na uche ha dị naanị n’ihe ha na-ahụ anya? (2 Kọr. 5:7) Ọ̀ ga-abụ na ihe ha ji oge ha niile na-achụ ekweghị ha hụ ihe Chineke na-eme? (Mat. 24:37-39) Ihe ndị a na-akụzi n’ụwa Setan na ihe ndị mmadụ na-achụ hà emegharịala ụfọdụ ndị anya? (2 Kọr. 4:4) Tupu anyị aghọta ihe Alaeze Chineke na-eme, anyị ga-enwerịrị okwukwe, matakwa ihe ihe ndị na-eme n’ụwa pụtara. Obi dị anyị ụtọ na anyị ghọtara ihe ihe ndị na-eme ugbu a pụtara.

ÀGWÀ NDỊ MMADỤ AKALA NJỌ

8-10. (a) Olee otú amụma e buru na 2 Timoti 3:1-5 si na-emezu? (b) Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo na àgwà ndị mmadụ akala njọ?

8 O nwere ihe nke abụọ mere anyị ji mara na Alaeze Chineke ga-abịa chịwa ụwa n’oge na-adịghị anya. Ihe nke abụọ ahụ bụ na àgwà ndị mmadụ akala njọ. Ọ ka ga na-aka njọ. Amụma e buru na 2 Timoti 3:1-5 emezuwela kemgbe ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ otu narị afọ. Àgwà ọjọọ Baịbụl kwuru na ndị mmadụ ga na-akpa eruola ebe niile. Ị̀ chọpụtara na ọ bụ eziokwu? Ka anyị leba anya n’ụfọdụ n’ime àgwà ndị ahụ.—Gụọ 2 Timoti 3:1, 13.

9 N’agbata afọ 1941 na 1959, e nwere ụdị omume na-awụ ndị mmadụ akpata oyi n’ahụ́. Weregodị ya tụnyere ihe na-eme ugbu a n’ebe a na-arụ ọrụ, ná ntụrụndụ, n’egwuregwu, nakwa n’ejiji ndị mmadụ na-eji. A na-eme ihe ike na omume rụrụ arụ jọgburu onwe ha n’ebe niile. Ọ dịzi ka ndị mmadụ hà na-agbalị igosi na ha ka ndị ọzọ n’ime ihe ike, n’ime omume rụrụ arụ nakwa n’ịdị obi ọjọọ. N’agbata afọ 1951 na 1959, e nwere ihe ndị a na-egosi na tiivi ndị mmadụ weere na ha adịghị mma. Taa, ndị mmadụ weziiri na o nweghị ihe o mere ma ezinụlọ lee ha. Ọtụtụ ndị achọpụtala na ndị na-edina nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ha so ná ndị ọnụ  ha na-eru n’okwu n’ihe gbasara ntụrụndụ na ejiji. Ha na-agbalị iji ihe ndị ahụ akụziri onye ọ bụla na omume ha dị mma. Obi dị anyị ụtọ na anyị ma otú Chineke si ele ụdị omume ahụ anya.—Gụọ Jud 14, 15.

10 Werekwa otú ndị na-eto eto si enupụ isi n’oge gara aga tụnyere otú ha si enupụ isi ugbu a. Dị ka ihe atụ, tupu afọ 1960, ndị nne na nna na-echegbu onwe ha na ụmụ ha nwere ike ịna-aṅụ sịga, ịna-aṅụ mmanya na-aba n’anya, ma ọ bụ ịna-agba egwú otú na-adịghị mma. Ma, taa anyị na-anụkarị akụkọ na-awụ akpata oyi n’ahụ́. Dị ka ihe atụ, nwa akwụkwọ dị afọ iri na ise gbagburu ụmụ klas ha abụọ, merụọ mmadụ iri na atọ ahụ́. Ụmụaka dị afọ iri na ụma ṅụchara mmanya gaa gbuo nwata nwaanyị dị afọ itoolu, kụọkwa papa ya na nwa nwanne papa ya ihe. N’otu mba dị n’Eshia, e kwuru na e kee arụ niile a kpara kemgbe afọ iri ụzọ abụọ, ọ bụ ndị na-eto eto kpara ọkara n’ime ha. Ò nwere onye ga-ekwu na ihe akabeghị njọ taa?

11. Gịnị mere na ọtụtụ ndị amaghị na ihe na-aka njọ?

11 Pita onyeozi kwuru eziokwu mgbe ọ sịrị: “N’oge ikpeazụ, ndị na-akwa emo ga-eji ịkwa emo ha bịa, na-agbaso ọchịchọ nke onwe ha, na-asị: ‘Olee ebe nkwa a nke ọnụnọ ya dị? Leenụ, site n’ụbọchị nna nna anyị hà dara n’ụra ọnwụ, ihe niile ka dị kpọmkwem otú ha dị site ná mmalite okike.’” (2 Pita 3:3, 4) Gịnị mere ụfọdụ ndị ji ekwu otú ahụ? Ọ dị ka ọ̀ na-abụ ihe mekarịa, ndị mmadụ anaghịzi eji ya akpọrọ ihe. Ọ bụrụ na àgwà ezigbo enyi anyị anọkata gbanwee, o nwere ike ịwụ anyị akpata oyi n’ahụ́. Ma, ọ bụrụ na omume ndị mmadụ ejiri nwayọọ nwayọọ na-eretọ, e nwere ike anyị agaghị achọpụta. O nwedịrị ike ọ gaghị awụcha anyị akpata oyi n’ahụ́. Ma, ọ pụtaghị na o nweghị ihe o mere.

12, 13. (a) Gịnị mere na anyị ekwesịghị ikwe ka ihe ndị na-eme n’ụwa mee ka anyị daa mbà? (b) Olee ihe anyị ga-echeta, ya enyere anyị aka ịtachi obi n’oge ikpeazụ a “tara akpụ”?

12 Pọl onyeozi dọrọ anyị aka ná ntị na ‘n’oge ikpeazụ, a ga-enwe oge tara akpụ.’ (2 Tim. 3:1) Ma, ọ pụtaghị na anyị ga-esi n’ụwa gbaa ọsọ. Anyị nwere ike ịnọsi ike n’ozi Chineke n’agbanyeghị ihe ndị mere otú anyị na-atụghị anya ha ma ọ bụ ụjọ na-atụ anyị. Jehova ga-eji mmụọ nsọ ya na ọgbakọ Ndị Kraịst nyere anyị aka. Ọ ga-enye anyị “ike karịrị ike nkịtị.”—2 Kọr. 4:7-10.

13 Cheta na ihe Pọl bu ụzọ kwuo n’amụma ahụ o buru banyere oge ikpeazụ bụ “mara nke a.” Ihe a o kwuru gosiri na amụma ahụ ga-emezurịrị. O doro anya na ụwa ochie a ga na-aka njọ ruo mgbe Jehova ga-ebibi ya. Ihe ndị na-eme kemgbe ụwa emeela ka anyị mata na ọ bụrụ na ọtụtụ ndị bi n’obodo ana-eme ihe ọjọọ, obodo ahụ ga-emecha daa. O nwetụbeghị mgbe ụwa retọrọ otú a. Ọtụtụ ndị nwere ike ha achọghị ịma ihe ihe ndị a na-emenụ pụtara. Ma, ihe ndị na-eme kemgbe 1914 kwesịrị ime ka obi sie anyị ike na Alaeze Chineke ga-abịa bibie ndị ọjọọ niile n’oge na-adịghị anya.

ỌGBỌ A AGAGHỊ AGABIGA

14-16. Olee ihe nke atọ mere obi ji sie anyị ike na Alaeze Chineke ‘ga-abịa’ n’oge na-adịghị anya?

14 Akụkọ gbasara ndị Chineke bụ ihe nke atọ mere obi ji sie anyị ike na Chineke ga-ebibi ụwa ochie a n’oge na-adịghị anya. Dị ka ihe atụ, tupu Alaeze Chineke achịwa n’eluigwe, e nwere  Ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ ji obi ha niile na-ejere Chineke ozi. Mgbe ụfọdụ ihe ha tụrụ anya ga-eme n’afọ 1914 na-emezughị, gịnị ka ha mere? Ọtụtụ n’ime ha akwụsịghị ife Jehova n’agbanyeghị ọnwụnwa bịaara ha na mkpagbu a kpagburu ha. Kemgbe ọtụtụ afọ, ọtụtụ n’ime ndị ahụ e tere mmanụ ejirila obi ha niile na-ejere Jehova ozi ruo mgbe ha nwụrụ.

15 N’amụma Jizọs buru banyere oge ikpeazụ, o kwuru, sị: “Ọgbọ a agaghị agabiga ma ọlị ruo mgbe ihe ndị a niile mere.” (Gụọ Matiu 24:33-35.) Mgbe Jizọs kwuru “ọgbọ a,” anyị ghọtara na ọ na-ekwu banyere ụzọ Ndị Kraịst abụọ e tere mmanụ. Ndị nke mbụ bụ ndị nọ ndụ n’afọ 1914 ma ghọta na Kraịst malitere ịchị n’afọ ahụ. E ji mmụọ nsọ tee ha mmanụ tupu afọ 1914 ma ọ bụkwanụ na 1914.—Rom 8:14-17.

16 Ndị nke abụọ so ‘n’ọgbọ a’ bụ ndị e tere mmanụ mgbe ụfọdụ ndị so ná ndị nke mbụ ka nọ ndụ n’ụwa. Ihe ọ pụtara bụ na ọ bụghị onye ọ bụla e tere mmanụ dị ndụ taa so n’ọgbọ ahụ Jizọs kwuru okwu ya. Taa, ndị so ná ndị nke abụọ ahụ akawala nká. Ma, ihe Jizọs kwuru na Matiu 24:34 mere ka obi sie anyị ike na ma ó nweghị ihe ọzọ, a ga-enwe ndị so n’ọgbọ a ga-adị ndụ oké mkpagbu amalite. Ihe a kwesịrị ime ka obi sikwuo anyị ike na Eze nke Alaeze Chineke ga-ebibi ndị ọjọọ n’oge na-adịghị anya ma weta ụwa ọhụrụ ezi omume.—2 Pita 3:13.

KRAỊST GA-ENWEZU MMERI YA N’OGE NA-ADỊGHỊ ANYA

17. Gịnị ka anyị mụtara n’amụma Baịbụl ndị anyị tụlere?

17 Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’amụma Baịbụl ndị ahụ anyị tụlerela? Jizọs kwuru na anyị amaghị ụbọchị ma ọ bụ oge awa a ga-ebibi ụwa. (Mat. 24:36; 25:13) Ma, anyị ma “oge ahụ a kara aka” Pọl kwuru okwu ya, ya bụ, oge ikpeazụ a. (Gụọ Ndị Rom 13:11.) Ọ bụ ya bụ oge a anyị bi na ya ugbu a. Ọ bụrụ na anyị ana-echebara amụma Baịbụl na ihe Jehova Chineke na Jizọs Kraịst na-eme echiche nke ọma, anyị ga-ahụ ihe gosiri na mgbe a ga-ebibi ụwa ochie a adịla ezigbo nso.

18. Gịnị ga-eme ndị na-ekweghị anabata ọchịchị Jizọs Kraịst?

18 N’oge na-adịghị anya, ndị na-ekweghị anabata ọchịchị Jizọs Kraịst, bụ́ Onye nọ n’elu ịnyịnya ọcha ahụ, ga-amata na ha mejọrọ. Ha agaghị agbanahụ ikpe a ga-ama ha. N’oge ahụ, ọtụtụ ndị ga-eji ụjọ na-eti mkpu, sị: “Ònye pụrụ iguzo?” (Mkpu. 6:15-17) Mkpughe isi nke asaa zara ajụjụ ahụ. Ndị e tere mmanụ na ndị nwere olileanya ibi n’ụwa ‘ga-eguzo,’ ya bụ na Chineke ga na-ele ha anya ọma. Mgbe ahụ, “oké ìgwè mmadụ,” bụ́ ndị so n’atụrụ ọzọ ahụ, ga-alanahụ oké mkpagbu ahụ.—Mkpu. 7:9, 13-15.

19. Ebe ọ bụ na obi siri gị ike na a ga-ebibi ụwa ochie a n’oge na-adịghị anya, olee ihe ị na-atụ anya ya?

19 Ọ bụrụ na anyị emee ka uche anyị dịrị n’amụma Baịbụl ndị na-emezu n’oge anyị a, ụwa Setan agaghị emegharị anyị anya. Mkpọtụ ụwa Setan na-eme agaghị eme ka anyị ghara ịma ihe ihe ndị na-eme n’ụwa pụtara. N’oge na-adịghị anya, Kraịst ga-enwezu mmeri ọ na-emeri ụwa ochie a. Otú ọ ga-esi eme ya bụ ịlụ agha ezi omume a na-akpọ Amagedọn. (Mkpu. 19:11, 19-21) Chegodị ụdị obi ụtọ Baịbụl kwuru na anyị ga-enwe ma a lụchaa ya.—Mkpu. 20:1-3, 6; 21:3, 4.