Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) DISEMBA 2013

Ị̀ Ga-eji Ihe Ndị I Nwere Na-ejekwuru Chineke Ozi?

Ị̀ Ga-eji Ihe Ndị I Nwere Na-ejekwuru Chineke Ozi?

“Chineke hụrụ onye na-eji obi ụtọ enye ihe n’anya.”—2 KỌR. 9:7.

1. Olee ihe ọtụtụ ndị na-emekarị? Ọ̀ bụ maka gịnị?

OBI na-adị ndị mmadụ ụtọ iji ihe ndị ha nwere eme ihe ha weere ka ihe dị mkpa. Dị ka ihe atụ, ndị nne na nna na-eji oge ha, ego ha, na ike ha eme ihe ga-abara ụmụ ha uru. Ọ bụrụ na mmadụ chọrọ ịga gbaa ọsọ n’egwuregwu Olimpik, ọ ga-eji ọtụtụ awa na-amụ ya kwa ụbọchị, ọ bụrụgodị na ndị enyi ya na-egwuri egwu ma ọ bụkwanụ na-eme ihe ndị ọzọ masịrị ha. Jizọs jikwa oge ya mee ihe dị ya mkpa. Ọ chọwaghị otú ọ ga-esi na-ebi ndụ okomoko ma ọ bụ mụọ ụmụ. Kama, o ji ike ya niile jeere Chineke ozi. (Mat. 4:17; Luk 9:58) Ndị na-eso ụzọ ya hapụkwara ọtụtụ ihe ha gaara eji oge ha mee ma jeere Chineke ozi. Ọ bụ Alaeze Chineke kacha ha mkpa. N’ihi ya, ha ji ike ha niile kwado ya. (Mat. 4:18-22; 19:27) Anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị, ‘Gịnị kacha m mkpa?’

2. (a) Olee ihe Onye Kraịst ọ bụla ga-emerịrị? (b) Olee ihe ndị ọzọ ụfọdụ ndị na-eme?

2 Onye Kraịst chọọ ka ya na Jehova na-adị ná mma, e nwere ihe ndị ọ ga na-eme. Ụfọdụ n’ime ha bụ ikpe ekpere, ịgụ Baịbụl, inwe ofufe ezinụlọ, ịga ọmụmụ ihe, na ikwusa ozi ọma. * Anyị kwesịrị iwepụta oge ma na-agba mbọ na-eme ihe ndị a. (Jọsh. 1:8; Mat. 28:19, 20; Hib. 10:24, 25) Mbọ anyị na-agba nakwa otú Jehova si agọzi anyị emeela ka ozi ọma anyị na-ekwusa na-aga n’ihu, ọtụtụ ndị ana-agbago ‘n’ugwu nke ụlọ Jehova’ ma na-efe ya. (Aịza. 2:2) Ọtụtụ ndị na-arụ ọrụ gbasara Alaeze Chineke. E nwere ndị na-eje ozi na Betel, ndị na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze na Ụlọ Mgbakọ, ndị na-ahazi mgbakọ, na ndị na-aga enyere ndị ọdachi dakwasịrị aka. Ọ bụghị iwu na anyị ga-eme ihe ndị a ka anyị nwee ike inweta  ndụ ebighị ebi, ma ha na-eme ka ọrụ Alaeze Chineke na-aga aga.

3. (a) Olee uru iji ihe ndị anyị nwere na-ejere Chineke ozi na-abara anyị? (b) Olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?

3 Ọ bụ ugbu a ka ọ kacha mkpa ka anyị jiri ike anyị niile na-arụsi ọrụ Alaeze Chineke ike. Obi dị anyị ụtọ na ọtụtụ ndị na-eji ihe ndị ha nwere arụ ọrụ a. (Gụọ Abụ Ọma 54:6.) Ọ bụrụ na anyị ana-eme otú ahụ, obi ga na-atọ anyị ezigbo ụtọ ka anyị na-eche ka Alaeze Chineke bịa. (Diut. 16:15; Ọrụ 20:35) Anyị niile kwesịrị ichebara onwe anyị echiche ma jụọ onwe anyị, sị: Ò nwere otú anyị nwere ike isi jekwuoro Chineke ozi? Olee ihe anyị ji oge anyị, ego anyị, ike anyị, na nkà anyị na-eme? Ka anyị ji ihe ndị anyị nwere na-ejere Chineke ozi, olee ihe anyị na-ekwesịghị ileghara anya? Ka anyị leba anya n’àjà ndị Izrel ji obi ha niile chụọrọ Chineke. Ihe ndị anyị ga-amụta ga-eme ka anyị nwekwuo obi ụtọ.

ÀJÀ NDỊ IZREL CHỤRỤ N’OGE OCHIE

4. Olee uru àjà ndị Izrel chụrụ baara ha?

4 N’oge ochie, ọ bụrụ na ndị Izrel emee mmehie, ha ga-achụrịrị àjà tupu Chineke agbaghara ha. Ịchụ àjà na-eme ka ha na Jehova dị ná mma. E nwere àjà ndị iwu kwuru na ha ga-achụrịrị, nweekwa ndị nke ha ga-achụ ma ha chọọ. (Lev. 23:37, 38) E nwere àjà a na-esurecha n’ọkụ mmadụ ga-eji aka ya ekpebi ma ọ̀ ga-achụ. Otu oge ndị Izrel chụụrụ Jehova àjà pụrụ iche bụ oge a na-enyefe ya ụlọ nsọ ahụ Sọlọmọn rụrụ.—2 Ihe 7:4-6.

5. Gịnị ka Jehova mere ka ndị ogbenye nwee ike ịchụrụ ya àjà?

5 Jehova ma na aka mmadụ niile ahaghị. N’ihi ya, ọ gwara ndị Izrel ka ha jiri ihe ha ga-ewetali chụọrọ ya àjà. Jehova kwuru n’iwu o nyere ha ka ha jiri anụmanụ na-achụrụ ya àjà nakwa ka ha wụpụ ọbara anụ ahụ n’ala. Àjà ndị a ha chụrụ gosiri ihe ọma Jehova ga-esi n’aka Jizọs meere ụmụ mmadụ. (Hib. 10:1-4) Ma, Jehova ekwughị na a ga-ejirịrị otu ụdị anụmanụ na-achụ àjà ahụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na mmadụ agaghị ewetali ebule ma ọ bụ ewu, Chineke ga-anabata àjà ya ma ọ bụrụ na o jiri nduru chụọ ya. N’ihi ya, ndị ogbenye ga-achụliri Jehova àjà, nweekwa obi ụtọ. (Lev. 1:3, 10, 14;  5:7) N’agbanyeghị na Jehova kwere ka ụmụ Izrel jiri anụmanụ ha ga-ewetali na-achụrụ ya àjà, e nwere ihe abụọ ọ chọrọ ka ndị niile chọrọ ịchụrụ ya àjà mee.

6. Olee ihe abụọ Jehova chọrọ ka ndị niile chọrọ ịchụrụ ya àjà mee? Gịnị mere ime ihe abụọ ahụ ji dị mkpa?

6 Nke mbụ bụ na onye ahụ ga-eji ihe kacha mma o nwere chụọrọ ya àjà. Ọ bụrụ na anụmanụ na-arịa ọrịa ma ọ bụ nwee nkwarụ, Jehova agaghị anabata ya. (Lev. 22:18-20) Nke abụọ bụ na onye na-achụ àjà ahụ ga-adị ọcha otú ahụ Chineke kwuru n’Iwu ahụ o nyere ha. Ọ bụrụ na mmadụ adịghị ọcha, ọ ga-ebugodị ụzọ chụọ àjà mmehie ma ọ bụ àjà ikpe ọmụma ka ya na Jehova dịghachi ná mma. Ọ bụ mgbe ahụ ka Jehova ga-anabata àjà ọ bụla o ji aka ya kpebie ịchụ. (Lev. 5:5, 6, 15) Ihe a Jehova gwara ha abụghị okwu egwuregwu. Jehova kwuru na ọ bụrụ na mmadụ adịghị ọcha gaa rie anụ e ji chụọ àjà udo, a ga-egbu ya. (Lev. 7:20, 21) Ma, ọ bụrụ na onye na-achụ àjà na Jehova dị ná mma, ya abụrụkwa na anụ ahụ o ji achụ àjà enweghị nkwarụ, ọ ga-eme ka obi dị onye ahụ ụtọ.—Gụọ 1 Ihe E Mere 29:9.

IHE NDỊ ANYỊ GA-EJI NA-EJERE CHINEKE OZI

7, 8. (a) Olee ụdị obi ụtọ ndị na-eji ihe ndị ha nwere ejere Chineke ozi na-enwe? (b) Olee ihe ndị anyị nwere ike iji jeere Jehova ozi?

7 Taa, ọtụtụ ụmụnna anyị na-ewepụta onwe ha ejere Jehova ozi. Ọ na-emekwa ka obi dị Jehova ụtọ. Ọ bụrụ na anyị na-agbalịsi ike inyere ụmụnna anyị aka, obi ga na-adị anyị ụtọ. E nwere otu nwanna so na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze, na-agakwa enyere ndị ọdachi dakwasịrị aka. O kwuru na ụdị obi ụtọ ya na-enwe abụghị ihe e ji ọnụ ekwu. O kwuru, sị, ‘Ụmụnna na-enwe obi ụtọ ma ha nọrọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị rụụrụ ha ma ọ bụkwanụ ma anyị nyere ha aka mgbe ọdachi dakwasịrị ha. Otú obi si atọ ha ụtọ na-eme ka m mara na mbọ niile anyị gbara efughị ọhịa.’

E nwere ọtụtụ àjà ụmụ Izrel na-eji aka ha ekpebi ịchụ. Anyịnwa ga-ejikwa aka anyị ekpebi ma ànyị ga-ejekwuru Jehova ozi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7 ruo na nke 13)

8 Nzukọ Jehova na-esi n’ụzọ dị iche iche akwado ozi Chineke. N’afọ 1904, Nwanna C. T. Russell kwuru na anyị niile kwesịrị ịna-agbalịsi ike ka anyị jiri oge anyị, ike anyị, ego anyị, na ihe ndị ọzọ anyị nwere na-eto Jehova. Ọ bụ eziokwu na ijere Jehova ozi na-efu anyị ihe, ọ na-eme ka Jehova na-agọzi anyị. (2 Sam. 24: 21-24) Ànyị nwere ike iji ihe ndị anyị nwere jekwuoro Jehova ozi?

Ụmụnna a na-eje ozi na Betel dị n’Ọstrelia

9. Gịnị ka anyị kwesịrị ịmụta n’ihe Jizọs kwuru na Luk 10:2-4 gbasara ihe anyị ga-eji oge anyị na-eme?

9 Oge anyị. A na-agba mbọ na-asụgharị akwụkwọ anyị, na-ebipụtakwa ha, na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze na Ụlọ Mgbakọ, na-ahazi mgbakọ, na-aga enyere ndị ọdachi dakwasịrị aka, na-emekwa ihe ndị ọzọ dị mkpa. Ihe a niile na-ewe ezigbo oge. Naanị ihe anyị nwere n’ụbọchị bụ iri awa abụọ na anọ. Ma, Jizọs kwuru ihe nwere ike inyere anyị aka iji oge anyị na-eme ihe bara uru. Mgbe ọ na-ezipụ ndị na-eso ụzọ ya ka ha gaa kwusaa ozi ọma, ọ gwara ha ka ha ghara ‘ịmakụ onye ọ bụla mgbe ha na-ekele ya n’okporo ụzọ.’ (Luk 10:2-4) Gịnị mere Jizọs ji nye ha ndụmọdụ ahụ? Taa, anyị chọọ ikele mmadụ, anyị nwere ike ikwe ya n’aka ma ọ bụ hulatatụ isi. Ma, otu onye na-akọwa Baịbụl kwuru na ọ bụghị otú ahụ ka ndị Izrel si ekele ekele. Ha chọọ ikele mmadụ, ha na-amakụ ya ọtụtụ ugboro, kpọọrọ ya isiala, ma ọ bụdị daara ya n’ala. Ihe a niile na-ewe ezigbo oge. Ihe ahụ Jizọs kwuru apụtaghị na ndị na-eso ụzọ ya agaghị na-ekele ndị ọzọ. Kama, ọ pụtara na ha enweghị oge buru ibu. N’ihi ya, ha kwesịrị iji oge ha na-eme ihe kacha mkpa. (Efe. 5:16) Ànyị nwere ike ime ihe ahụ Jizọs kwuru ka anyị nwee ike ijikwu oge anyị na-ejere Chineke ozi?

Ebe ndị nkwusa nọ n’otu Ụlọ Nzukọ Alaeze dị na Kenya, n’Afrịka

10, 11. (a) Olee ihe ụfọdụ a na-eji onyinye anyị nyere maka ọrụ zuru ụwa ọnụ eme? (b) Gịnị ka e kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 16:1, 2 nke ga-enyere anyị aka?

10 Ego anyị. A na-eji ego buru ibu akwado ọrụ anyị na-arụ n’ụwa niile. Kwa afọ, a na-eji ọtụtụ ijeri naịra elekọta ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, na ndị ozi ala ọzọ. Kemgbe afọ 1999, a rụọla ihe karịrị iri puku Ụlọ Nzukọ Alaeze abụọ na anọ, na narị ise ná mba ndị na-abaghị ọgaranya. Ma, Ụlọ Nzukọ Alaeze a ka ga-arụ fọrọ obere ka o ruo puku isii na narị anọ. Kwa ọnwa, a na-ebipụta ihe dị ka otu narị nde Ụlọ Nche na Teta! Ihe e ji akwado ihe a niile bụ onyinye si ndị mmadụ n’obi.

11 Pọl onyeozi si n’ike mmụọ nsọ kwuo otú e kwesịrị isi na-enye onyinye. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 16:1, 2.) Ọ gbara ụmụnna nọ na Kọrịnt ume ka ha ghara iche ruo ná ngwụcha izu ka ha mata ego ole ha mefufọrọ ha ga-eji enye onyinye. Kama, ọ bụ ná mmalite izu ka ha kwesịrị iwepụta ego ha ga-eji enye onyinye. Ụmụnna anyị na-eme otú ahụ e mere n’oge ndịozi. Tupu ha agawa ọmụmụ ihe ma ọ bụ mgbakọ, ha na-ewepụta ego ha ga-eji enye onyinye. Onye ọ bụla na-enyekwa otú ike kwere ya. (Luk 21:1-4; Ọrụ 4:32-35) Ime otú ahụ na-atọ Jehova ụtọ.

Nwanna a so Kọmitii Na-ahụ Maka Iwu Ihe Owuwu n’Ógbè na-arụ ọrụ n’obodo Tọksido dị na Niu Yọk dị n’Amerịka

12, 13. Olee ihe ndị nwere ike ime ka ụfọdụ ndị ghara iji ike ha na nkà ha jekwuoro Jehova ozi? Ma, olee otú Jehova ga-esi nyere ha aka?

12 Ike anyị na nkà anyị. Ọ bụrụ na anyị ejiri ike anyị na nkà anyị na-arụ ọrụ Chineke, Jehova ga na-akwado anyị. O kwere anyị nkwa na ya ga-enyere anyị aka ma ike gwụ anyị. (Aịza. 40:29-31) Ọ̀ na-adị anyị ka anyị enwechaghị nkà anyị ga-eji na-arụ ọrụ Chineke ma ọ bụkwanụ na ndị ọzọ ga-arụ ya karịa anyị? Cheta na Jehova nwere ike ime ka anyị nwekwuo nkà otú ahụ o meere Bezalel na Oholiab.—Ọpụ. 31:1-6; lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.

13 Jehova gwara anyị ka anyị ghara ikwe ka ihe ọ bụla mee ka anyị ghara inye ya ihe kacha mma anyị nwere. (Ilu 3:27) Mgbe a na-arụghachi ụlọ nsọ dị na Jeruselem, Jehova gwara ndị Juu ka ha chebara otú ha si na-akwado ọrụ ahụ echiche. (Hag. 1:2-5) E nwere ihe ndị megharịrị ha anya. Ha ejizighị ọrụ Jehova kpọrọ ihe. Onye ọ bụla n’ime anyị  kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘Ime uche Jehova ọ̀ dị m mkpa karịa ihe niile ọzọ m na-eme?’ Ànyị nwere ike ichebara onwe anyị echiche ma hazie otú anyị ga-esi na-ejekwuru Jehova ozi n’oge ikpeazụ a?

IHE ANYỊ KWESỊRỊ INYE BỤ IHE ANYỊ NWERE

14, 15. (a) Olee otú ihe ụmụnna anyị na-abaghị ọgaranya mere si gbaa gị ume? (b) Gịnị ka anyị niile kwesịrị ịna-eme?

14 Ọtụtụ ndị bi n’ebe ihe siri ezigbo ike nakwa n’ebe ọtụtụ ndị dara ogbenye. Nzukọ Jehova na-agbalịsi ike inyere ụmụnna bi ná mba ndị ahụ aka. (2 Kọr. 8:14) N’agbanyeghị nke ahụ, ụmụnna ndị na-abaghị ọgaranya anaghị eji inye onyinye egwu egwu. Obi na-adị Jehova ụtọ ịhụ ka ha ji obi ụtọ na-enye onyinye.—2 Kọr. 9:7.

15 E nwere otu mba dara ezigbo ogbenye n’Afrịka. Ụfọdụ ụmụnna bi n’ebe ahụ na-ewepụta otu ebe n’ubi ha. Ha ree ihe ọ bụla ha kụrụ na ya, ha ejiri ego ha retara nye onyinye maka ọrụ Chineke. Ná mba ahụ, e nwere otu oge a chọrọ ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ụmụnna chọrọ iso rụọ ya. Ma, ọ bụ n’oge e ji akụ ihe n’ubi. N’agbanyeghị nke ahụ, ha kpebisiri ike na ha ga-eso arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ. N’ụtụtụ, ha na-aga rụọ ọrụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ. O ruo ná mgbede, ha agaa kụchaa ihe ha kụfọrọ n’ubi. Ihe ahụ ha mere gosiri na ha na-eji oge ha ejere Chineke ozi. Ọ na-echetara anyị ụmụnna nọ na Masedonia n’oge ndịozi. Ha “dara ogbenye nke ukwuu.” Ma, ha rịọrọ Pọl ka o kwe ka ha nye ego a ga-eji nyere ụmụnna ha aka. (2 Kọr. 8:1-4) Ka anyị niile na-enye ihe anyị nwere ike inye iji gosi na obi dị anyị ụtọ maka otú Jehova si na-agọzi anyị.—Gụọ Diuterọnọmi 16:17.

16. Gịnị ka anyị ga-eme ka Jehova nabata ozi anyị na-ejere ya?

16 Ma, mgbe anyị wepụtara oge anyị na ihe ndị anyị nwere na-ejekwuru Chineke ozi, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ileghara ihe ndị kacha mkpa anya. Otu n’ime ha bụ ilekọta ndị ezinụlọ anyị. N’oge ochie, ndị Izrel gbara mbọ ka Chineke nabata àjà ha na-achụrụ ya. Anyịnwa kwesịkwara ịgba mbọ ka Jehova nabata ozi anyị na-ejere ya. Anyị kwesịrị icheta na ihe kacha mkpa anyị kwesịrị ime bụ ilekọta ezinụlọ anyị na ife Jehova. Iji oge anyị na ihe ndị anyị nwere enyere ndị ọzọ aka ekwesịghị ime ka anyị ghara ịna-enyere ndị ezinụlọ anyị aka ka ha na Jehova dị ná mma ma ọ bụkwanụ na-egboro ha mkpa ha. Ọ bụrụ na anyị anaghị emere ha ihe ndị a, ọ pụtara na anyị na-enye Jehova ihe anyị na-enweghị. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 8:12.) Anyị kwesịkwara ịgbalị ka anyị na Jehova na-adịkwu ná mma. (1 Kọr. 9:26, 27) Obi kwesịrị isi anyị ike na ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe Baịbụl kwuru, ihe ndị ahụ anyị na-arụ ga-eme ka obi na-atọ anyị ụtọ. Jehova ‘ga-anabatakwa’ ha.

OZI ANYỊ NA-EJEKWURU CHINEKE BARA EZIGBO URU

17, 18. Olee otú obi dị anyị maka ndị ji ihe ha nwere na-akwado Alaeze Chineke? Olee ihe onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ichebasiri echiche ike?

17 Ọtụtụ ụmụnna anyị na-ewepụta onwe ha ma jiri oge ha, ike ha, na ego ha na-arụ ọrụ ndị e ji na-akwado Alaeze Chineke. (Fil. 2:17) Obi dị anyị ụtọ maka ihe a ha na-eme. Obi dịkwa anyị ụtọ n’ihi otú ndị nwunye ha na ụmụ ha si jiri obi ha niile na-akwado ha n’ozi ha.

18 Ịkwado ihe ndị gbasara Alaeze Chineke abụghị obere ọrụ. Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ikpe ekpere ma chesie echiche ike otú o nwere ike isi jiri ihe o nwere jekwuoro Jehova ozi. Anyị mee otú ahụ, Jehova ga-agọzi anyị ugbu a, gọziekwa anyị “n’usoro ihe na-abịanụ.”—Mak 10:28-30.

^ para. 2 Gụọ isiokwu bụ́ “Jiri Mkpụrụ Obi Dum Na-achụrụ Jehova Àjà.” Ọ dị n’Ụlọ Nche Jenụwarị 15, 2012, peeji nke 21-25.