Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Disemba 2013

‘Ekwela Ka E Mee Ka Ị Maa Jijiji Ọsọ Ọsọ Wee Bụrụ Onye Na-enweghị Uche’

‘Ekwela Ka E Mee Ka Ị Maa Jijiji Ọsọ Ọsọ Wee Bụrụ Onye Na-enweghị Uche’

‘Ụmụnna anyị, unu ekwela ka e mee ka unu maa jijiji ọsọ ọsọ wee bụrụ ndị na-enweghị uche.’—2 TESA. 2:1, 2.

1, 2. Gịnị mere ndị mmadụ ji eduhiekarị ndị ọzọ taa? Olee otú ha si eme ya? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

ỌTỤTỤ ndị n’ụwa taa na-eduhie ndị ọzọ, na-atụkwa asị. O kwesịghị iju anyị anya n’ihi na Baịbụl kwuru na Setan bụ́ Ekwensu bụ aka ochie n’iduhie ndị mmadụ nakwa na ọ bụ ya na-achị ụwa a. (1 Tim. 2:14; 1 Jọn 5:19) Ka oge a ga-ebibi ụwa ọjọọ a ji ọsọ na-abịa, iwe na-ewekwu Ekwensu n’ihi na “o nwere oge dị mkpirikpi.” (Mkpu. 12:12) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịtụ anya na ndị Setan na-achị ga-achọ ịna-eduhiekwu ndị ọzọ, karịchaa ndị na-efe Jehova.

2 Mgbe ụfọdụ, ụlọ ọrụ mgbasa ozi na-ekwu ihe ndị na-abụchaghị eziokwu banyere Ndịàmà Jehova na ihe ndị ha kweere. Ha nwekwara ike kwuo ihe na-abụtụdịghị eziokwu gbasara ha. Ha na-eji akwụkwọ akụkọ, televishọn, na Ịntanet ekwu ihe ndị na-abụghị eziokwu banyere anyị. Ụfọdụ anaghịdị ebu ụzọ chọpụta ma ihe ndị ahụ ha na-ekwu hà bụ eziokwu. Ha na-ekwere ha, ya emezie ka obi na-ajọ ha njọ ma ha hụ Ndịàmà Jehova.

3. Gịnị nwere ike inyere anyị aka ka a ghara iduhie anyị?

3 E nwere ihe nwere ike inyere anyị aka ka Setan ghara iduhie anyị. Obi dị anyị ụtọ na anyị nwere Baịbụl, bụ́ nke ‘bara uru iji mee ka ihe guzozie.’ (2 Tim. 3:16) Ihe Pọl gwara Ndị Kraịst nọ na Tesalonaịka gosiri na e duhiere ụfọdụ n’ime ha, ha ekweta ihe na-abụghị eziokwu. Ọ gwara ha ka ha ghara ‘ikwe ka e mee ka ha maa jijiji ọsọ ọsọ wee bụrụ ndị na-enweghị uche.’ (2 Tesa. 2:1, 2) Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe a Pọl gwara ha, oleekwa otú anyị nwere ike isi mee ihe a o kwuru?

 NDỤMỌDỤ PỌL NYERE HA KWESỊRỊ EKWESỊ

4. Olee otú e si dọọ Ndị Kraịst nọ na Tesalonaịka aka ná ntị na “ụbọchị Jehova” na-abịa? Olee otú e si adọ anyịnwa aka ná ntị?

4 N’akwụkwọ ozi mbụ Pọl degaara ọgbakọ dị na Tesalonaịka, ọ gwara ha na “ụbọchị Jehova” na-abịa. Ọ chọghị ka ụmụnna ya nọrọ n’ọchịchịrị ma ọ bụ ka ha ghara ijikere ejikere. Kama, ọ gwara ha na ha bụ “ụmụ nke ìhè” nakwa ka ha “mụrụ anya ma nwee uche ziri ezi.” (Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 5:1-6.) Taa, anyị na-eche ka e bibie Babịlọn Ukwu ahụ, ya bụ, okpukpe ụgha niile e nwere n’ụwa. Mbibi ahụ ga-egosi na oké ụbọchị Jehova amalitela. Obi dị anyị ụtọ na anyị aghọtakwuola otú Jehova ga-esi mezuo nzube ya. Ihe ọzọ bụ na nzukọ Jehova na-agwa anyị mgbe niile ihe ndị ga-enyere anyị aka ijikere maka ụbọchị Jehova. Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe ndị a a na-agwa anyị, ọ ga-eme ka anyị kpebisikwuo ike iji ‘ike iche echiche anyị na-ejere Chineke ozi.’—Rom 12:1.

Pọl dere akwụkwọ ozi abụọ o ji nye Ndị Kraịst ndụmọdụ kwesịrị ekwesị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4 na nke 5)

5, 6. (a) Olee ihe Pọl dere banyere ya n’akwụkwọ ozi nke abụọ o degaara ndị Tesalonaịka? (b) Gịnị ka Chineke ga-esi n’aka Jizọs mee n’oge na-adịghị anya? Olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?

5 Obere oge Pọl degachaara Ndị Kraịst nọ na Tesalonaịka akwụkwọ ozi nke mbụ, o degaara ha akwụkwọ ozi nke abụọ. N’akwụkwọ ozi nke abụọ ahụ, o dere banyere mkpagbu na-abịanụ, bụ́ mgbe Jizọs ga-abọ ọbọ “n’ahụ́ ndị na-amaghị Chineke, na ndị na-adịghị erube isi n’ozi ọma.” (2 Tesa. 1:6-8) Ihe Pọl kwuru n’isi nke abụọ n’akwụkwọ ozi ahụ gosiri na ụjọ ji ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ Tesalonaịka, ha echee na ụbọchị Jehova dị ezigbo nso. (Gụọ 2 Ndị Tesalonaịka 2:1, 2.) Ndị Kraịst oge ahụ amachaghị otú Jehova ga-esi emezu nzube ya. Ọ bụ ya mere Pọl ji mechaa kwuo banyere ibu amụma, sị: “Anyị nwere ihe ọmụma na-ezughị ezu, anyị na-ebukwa amụma n’ụzọ na-ezughị ezu; ma mgbe ihe ahụ nke zuru ezu bịarutere, a ga-ewepụ ihe ahụ nke na-ezughị ezu.” (1 Kọr. 13:9, 10) Ma, ọ bụrụ na ha emee ihe Pọl onyeozi, Pita onyeozi, na ụmụnna ndị ọzọ e ji mmụọ nsọ tee mmanụ gwara ha, ọ ga-eme ka ha ghara ịkwụsị ijere Chineke ozi.

6 Pọl chọrọ ịgbazi ha olu. Ọ bụ ya mere o ji si n’ike mmụọ nsọ gwa ha na tupu ụbọchị Jehova abịa, a ga-enwe ndị si n’ezi ofufe dapụ, a matakwa “onye  ahụ na-emebi iwu.” * E mechazie, mgbe oge Chineke ruru, Onyenwe anyị Jizọs ‘ga-ebibi’ ndị niile e duhiere. Pọl onyeozi kwuru na ihe mere a ga-eji bibie ha bụ na ha “anabataghị ịhụnanya maka eziokwu ahụ.” (2 Tesa. 2:3, 8-10) Anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘M̀ ji eziokwu a na-akụziri anyị kpọrọ ihe? M̀ na-agụ Ụlọ Nche na akwụkwọ ndị ọzọ a na-eji akụziri ndị Chineke ihe n’ụwa niile ka m nwee ike ịmata ihe nzukọ Jehova na-akụzi ugbu a?’

LEZIE ANYA MGBE Ị NA-AHỌ NDỊ GỊ NA HA GA NA-AKPA

7, 8. (a) Olee nsogbu ụfọdụ Ndị Kraịst oge mbụ nwere? (b) Olee nsogbu Ndị Kraịst nwere taa?

7 Ọ bụghị naanị ndị si n’ezi ofufe dapụ na ihe ndị ha na-akụzi bụ nsogbu Ndị Kraịst nwere. Pọl gwara Timoti na “ịhụ ego n’anya bụ mgbọrọgwụ nke ụdị ihe ọjọọ niile.” Ọ gwakwara ya na ụdị ịhụnanya ahụ emeela ka ‘e duhie ụfọdụ, ha wee dapụ n’okwukwe. Ha wee jiri ọtụtụ ihe mgbu maa onwe ha aghara aghara dị ka mma.’ (1 Tim. 6:10) Ndị Kraịst na “ọrụ nke anụ ahụ́” ga na-alụkwa mgbe niile.—Gal. 5:19-21.

8 Pọl dọsiri ndị Tesalonaịka aka ná ntị ike banyere ndị ọ kpọrọ “ndịozi ụgha.” Ụfọdụ n’ime ha kwuru “ihe gbagọrọ agbagọ iji dọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs ka ha sowe ha.” (2 Kọr. 11:4, 13; Ọrụ 20:30) Jizọs mechara jaa ọgbakọ dị n’Efesọs mma n’ihi na ha anabataghị “ndị ọjọọ” n’ọgbakọ. Ndị Efesọs chọpụtara na ndị ahụ bụ ndịozi ụgha. (Mkpu. 2:2) N’akwụkwọ ozi nke abụọ Pọl degaara ndị Tesalonaịka, ọ gwara ha, sị: “Ụmụnna anyị, anyị na-enye unu iwu n’aha Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, ka unu zere nwanna ọ bụla nke na-adịghị agazi agazi.” Mgbe ọ gwachara ha ihe a, ọ gwara ha gbasara Ndị Kraịst na-achọghị “ịrụ ọrụ.” (2 Tesa. 3:6, 10) Ọ bụrụ na ha na ndị umengwụ ekwesịghị ịna-akpa, ọ dị ezigbo mkpa ka ha na-eze ndị na-akpa àgwà ka ndị si n’ezi ofufe dapụ eze. Ọ bụrụ na ha na ndị dị otú ahụ na-akpa, ha ga-etinye ha ná nsogbu. Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị taa.—Ilu 13:20.

9. Gịnị mere anyị ji kwesị ilezi anya ma ọ bụrụ na mmadụ ekwuwe banyere ihe Baịbụl na-ekwughị ma ọ bụ katọwa ndị nọ n’ọgbakọ?

9 Ọ fọrọ obere ka oké mkpagbu malite nakwa ka e bibie ụwa ọjọọ a. N’ihi ya, ndụmọdụ ahụ Jehova nyere Ndị Kraịst oge mbụ kacha baara anyị uru taa. Anyị achọghị ‘ịnara obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ ma nzube ya efunahụ anyị.’ Ọ bụrụ na ụdị ihe a emee, anyị agaghị enweta ndụ ebighị ebi Chineke kwere nkwa inye anyị, ma ọ̀ bụ n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa. (2 Kọr. 6:1) Ọ bụrụ na onye na-abịa ọmụmụ ihe achọọ ka anyị kwuwe gbasara ihe Baịbụl na-ekwughị ma ọ bụkwanụ ka anyị katọwa ndị nọ n’ọgbakọ, anyị kwesịrị ilezi anya ka ọ ghara iduhie anyị.—2 Tesa. 3:13-15.

‘JIDESIENỤ OMENALA NDỊ A KỤZIIRI UNU IKE’

10. Olee omenala a gwara Ndị Kraịst nọ na Tesalonaịka ka ha jidesie ike?

10 Pọl gwara ụmụnna nọ na Tesalonaịka ka ha ‘guzosie ike’ ma jidesie ihe a kụziiri ha ike. (Gụọ 2 Ndị Tesalonaịka 2:15.) Gịnị bụ ‘omenala ndị a kụziiri ha’? Ọ bụghị omenala ndị ahụ a na-akụzi n’okpukpe ụgha. Kama, ọ bụ ihe Jizọs kụziri na ihe Chineke mere ka Pọl na ndị ọzọ si n’ike mmụọ nsọ dee. Ọtụtụ  n’ime ha dị na Baịbụl ugbu a. Pọl jara ụmụnna ya nọ n’ọgbakọ Kọrịnt mma n’ihi na ‘ha bu ya n’uche n’ihe niile, jidesiekwa omenala ndị o nyefere ha ike.’ (1 Kọr. 11:2) Omenala ndị ahụ si n’aka Jehova na Jizọs Kraịst. N’ihi ya, e kwesịrị ịtụkwasị ha obi.

11. Olee ụzọ abụọ e nwere ike isi duhie ụfọdụ ndị?

11 N’akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Hibru, o kwuru ụzọ abụọ Onye Kraịst nwere ike isi kwụsị inwe okwukwe ma ghara iguzosi ike. (Gụọ Ndị Hibru 2:1; 3:12.) O kwuru banyere “ịkpafu” na ‘ịhapụ Chineke.’ Dị ka ihe atụ, mmiri nwere ike iji nwayọọ nwayọọ bufuo ụgbọ dị n’akụkụ mmiri. Mmadụ nwekwara ike iji aka ya kwaba ụgbọ ya n’ime mmiri, mmiri ebufuo ya. Ihe atụ abụọ a gosiri ihe nwere ike ime mmadụ ma ọ bụrụ na onye ahụ ekwe ka e duhie ya, eziokwu ọ mụtara emewezie ya obi abụọ.

12. Olee ihe ndị nwere ike ime ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma?

12 O nwere ike ịbụ na ụfọdụ Ndị Kraịst nọ na Tesalonaịka kwere ka e duhie ha. Ma, ụdị ihe ahụ ò nwere ike ime anyị taa? E nwere ọtụtụ ihe nwere ike ịna-eri oge anyị. Chegodị banyere ọtụtụ awa ndị mmadụ na-eji atụrụ ndụ, na-aga n’Ịntanet, na-agụ ozi ndị e ziteere ha n’ekwentị, na-ezigara ndị ọzọ ozi ma ọ bụkwanụ na-agba mbọ ịmata nke na-eme n’ụdị egwuregwu dị iche iche. Nke ọ bụla n’ime ihe ndị a nwere ike imegharị Onye Kraịst anya, meekwa ka ọ ghara iji obi ya niile na-ejere Jehova ozi. Olee nsogbu o nwere ike ịkpatara ya? O nwere ike ime ka ọ ghara isi n’ala ala obi ya na-ekpe ekpere. Ọ gaghị enwecha oge ọ ga-eji na-amụ Baịbụl, na-aga ọmụmụ ihe na ozi ọma. Gịnị ka anyị ga-eme ka a ghara ime ka anyị maa jijiji ọsọ ọsọ wee bụrụ ndị na-enweghị uche?

IHE ANYỊ GA-EME KA A GHARA IME KA ANYỊ MAA JIJIJI

13. Olee ihe Baịbụl kwuru na ọtụtụ ndị ga na-eme? Gịnị ka anyị ga-eme ka okwukwe anyị sie ike?

13 Anyị kwesịrị icheta na ọ fọrọ obere ka e bibie ụwa Setan nakwa na ọ bụrụ na anyị na ndị na-ekweghị na anyị bi “n’oge ikpeazụ” ana-akpa, o nwere ike itinye anyị ná nsogbu. Pita onyeozi kwuru gbasara oge anyị a, sị: “Ndị na-akwa emo ga-eji ịkwa emo ha bịa, na-agbaso ọchịchọ nke onwe ha, na-asị: ‘Olee ebe nkwa a nke ọnụnọ ya dị? Leenụ, site n’ụbọchị nna nna anyị hà dara n’ụra ọnwụ, ihe niile ka dị kpọmkwem otú ha dị site ná mmalite okike.’” (2 Pita 3:3, 4) Ọ bụrụ na anyị ana-agụ Baịbụl kwa ụbọchị ma na-amụ ya mgbe niile, ọ ga-eme ka anyị na-echeta na anyị bi “n’oge ikpeazụ.” Ọ dịla anya ndị mmadụ siwere n’ezi ofufe na-adapụ otú ahụ Baịbụl buru n’amụma. Ha ka na-adapụkwa taa. A ka nwere “onye ahụ na-emebi iwu.” Ọ ka na-emegidekwa ndị na-efe Chineke. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-echeta mgbe niile na ụbọchị Jehova dị nso.—Zef. 1:7

Ọ bụrụ na anyị eburu ụzọ mụọ ihe anyị ga-ekwu n’ozi ọma, na-agakwa ozi ọma, ọ ga-eme ka a ghara ime ka anyị maa jijiji ọsọ ọsọ wee bụrụ ndị na-enweghị uche (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14 na nke 15)

14. Olee uru ịgachi ozi ọma anya baara anyị?

14 Ihe ọzọ anyị ga-eme ka a ghara ime ka anyị maa jijiji ma ghọọ ndị na-enweghị uche bụ ịna-agachi ozi ọma anya. Ọ bụ ya mere Kraịst Jizọs ji gwa ụmụazụ ya ka ha gaa mee ka ndị mba niile bụrụ ndị na-eso ụzọ ya ma na-akụziri ha ka ha na-edebe ihe ndị o nyere n’iwu. (Mat. 28:19, 20) Otú anyị ga-esi eme ihe a Jizọs kwuru bụ ịna-agachi ozi ọma anya. Ì chere na obi ga-adị Ndị Kraịst nọ na Tesalonaịka ụtọ ma ọ bụrụ na ihe mere ha ji ekwusa ozi ọma ma na-akụzi Okwu Chineke bụ ka ha mezuo iwu? Cheta ihe Pọl gwara ha. Ọ sịrị: “Unu emenyụla ọkụ nke mmụọ nsọ. Unu eledala okwu amụma anya.” (1 Tesa. 5:19, 20) Obi  na-atọ anyị ezigbo ụtọ na anyị na-amụ amụma ndị dị na Baịbụl ma na-akọrọ ha ndị ọzọ.

15. Gịnị na gịnị ka anyị nwere ike ịmụ n’ofufe ezinụlọ?

15 Anyị chọrọ inyere ndị ezinụlọ anyị aka ka ha na-ekwusa ozi ọma nke ọma. Otú ọtụtụ ezinụlọ si eme ya bụ iwepụta oge mgbe ha na-enwe ofufe ezinụlọ na-amụ otú ha ga-esi na-ezi ozi ọma. Unu nwere ike ịmụ otú unu ga-esi eme nletaghachi. Dị ka ihe atụ, unu nwere ike ịmụ ihe unu ga-ekwu ma unu gaa nletaghachi na isiokwu ga-eme ka onye unu gara nletaghachi na nke ya nwee mmasị ka unu na ya mụwa Baịbụl. Unu nwekwara ike ịtụle mgbe ọ ga-akacha mma ka unu gaa nletaghachi na nke mmadụ. Ọtụtụ ndị na-ewepụtakwa oge mgbe ha na-enwe ofufe ezinụlọ mụọ ihe ndị a ga-amụ n’ọmụmụ ihe. Gị na ndị ezinụlọ gị ùnu ga-emeli ya? Ọ bụrụ na unu ana-aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe, ọ ga-eme ka okwukwe unu sikwuo ike, unu agaghịkwa ama jijiji wee bụrụ ndị na-enweghị uche. (Ọma 35:18) Inwe ofufe ezinụlọ ga-eme ka anyị ghara ikwu ihe Baịbụl na-ekwughị. Ọ ga-emekwa ka obi sie anyị ike na ihe dị na Baịbụl bụ eziokwu.

16. Olee ihe na-eme ka Ndị Kraịst e tere mmanụ ghara ịma jijiji wee bụrụ ndị na-enweghị uche?

16 Kemgbe ọtụtụ afọ, Jehova emeela ka ndị na-efe ya ghọta ọtụtụ amụma dị na Baịbụl. N’ihi ya, obi siri anyị ike na Chineke ga-akwụ anyị ụgwọ magburu onwe ya n’ọdịnihu. Ndị e tere mmanụ nwere olileanya iso Kraịst nọrọ n’eluigwe. Olileanya a na-eme ka ha ghara ịma jijiji wee bụrụ ndị na-enweghị uche. Ihe Pọl degaara ndị Tesalonaịka gbasara Ndị Kraịst e tere mmanụ. O dere, sị: “Anyị aghaghị ịdị na-ekele Chineke mgbe niile n’ihi unu, ụmụnna anyị ndị Jehova hụrụ n’anya, n’ihi na Chineke họọrọ unu . . . site n’iji mmụọ nsọ doo unu nsọ, sitekwa n’okwukwe unu nwere n’eziokwu ahụ.”—2 Tesa. 2:13.

17. Olee otú ihe Pọl kwuru ná 2 Ndị Tesalonaịka 3:1-5 si gbaa gị ume?

17 Ndị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa kwesịkwara ịna-agba mbọ ka a ghara ime ka ha maa jijiji ọsọ ọsọ wee bụrụ ndị na-enweghị uche. Ọ bụrụ na i nwere olileanya ibi n’ụwa, na-eme ihe Pọl gwara Ndị Kraịst ibe ya e tere mmanụ, bụ́ ndị bi na Tesalonaịka. (Gụọ 2 Ndị Tesalonaịka 3:1-5.) Obi kwesịrị ịdị onye ọ bụla n’ime anyị ụtọ na Pọl nyere anyị ezigbo ndụmọdụ ahụ. Akwụkwọ ozi abụọ ahụ o degaara ndị Tesalonaịka dọrọ anyị aka ná ntị ka anyị ghara ikwu ihe Baịbụl na-ekwughị na ikweta ihe na-abụchaghị eziokwu. Ebe ọ bụ na ọ fọrọ obere ka e bibie ụwa ochie a, obi dị anyị ụtọ na a na-enye anyị ndụmọdụ ndị a.

^ para. 6 N’Ọrụ Ndịozi 20:29, 30, Pọl dọrọ ọgbakọ Ndị Kraịst aka ná ntị, sị: ‘Ndị ikom ga-esi n’etiti unu onwe unu bilie, na-ekwu ihe gbagọrọ agbagọ iji dọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs ka ha sowe ha.’ Ka oge na-aga, a malitere inwe ihe dị iche ná ndị na-edu ndú na ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ. Mgbe narị afọ abụọ gachara, ọ bịara doo anya na ọ bụ ndị ụkọchukwu Krisendọm bụ “onye ahụ na-emebi iwu.”—Gụọ Ụlọ Nche February 1, 1990, peeji nke 10-14.