Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) NỌVEMBA 2013

“Mụrụnụ Anya Ka Unu Wee Na-ekpe Ekpere”

“Mụrụnụ Anya Ka Unu Wee Na-ekpe Ekpere”

“Nweenụ uche zuru okè, mụrụnụ anya ka unu wee na-ekpe ekpere.”—1 PITA 4:7.

1, 2. (a) Gịnị mere o ji dị ezigbo mkpa ka anyị ‘mụrụ anya ka anyị wee na-ekpe ekpere’? (b) Olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị banyere ekpere?

OTU nwoke na-arụbu ọrụ n’abalị kwuru, sị: “Ọ bụ mgbe ọ fọrọ obere ka chi bọọ ka ịmụ anya n’abalị na-akacha esi ike.” Ndị ọzọ na-amụ anya n’abalị nwere ike ikweta ihe a o kwuru. Ọ bụ otú ahụ ka ọ na-esiri Ndị Kraịst ike ịmụrụ anya ugbu a ọ fọrọ obere ka e bibie ụwa Setan. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike ka anyị mụrụ anya. (Rom 13:12) Ọ bụrụ na anyị ehiwe ụra n’oge ikpeazụ a, ọ ga-akpatara anyị nsogbu. Ọ dị ezigbo mkpa ka anyị ‘nwee uche zuru okè’ ma ‘mụrụ anya ka anyị wee na-ekpe ekpere.’—1 Pita 4:7.

2 Ebe ọ bụ na anyị bi n’oge ikpeazụ, onye ọ bụla kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘Èji m ekpere kpọrọ ihe? Àna m ekpe ụdị ekpere niile, na-ekpekwa ya mgbe niile? M̀ na-echeta ụmụnna m n’ekpere, ka m̀ na-ekpe ekpere naanị maka mkpa m? Olee otú ekpere ga-esi mee ka a zọpụta m?’

NA-EKPE ỤDỊ EKPERE Ọ BỤLA

3. Olee ụdị ekpere ndị anyị kwesịrị ịna-ekpe?

3 N’akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Efesọs, o kwuru banyere “ụdị ikpe ekpere ọ bụla.” (Efe. 6:18) Mgbe anyị na-ekpe ekpere, anyị nwere ike ịna-arịọ Jehova ka o gbooro anyị mkpa anyị ma nyere anyị aka imeri nsogbu anyị. Baịbụl kpọrọ Jehova “Onye na-anụ ekpere.” Ọ na-ege ntị n’arịrịọ anyị n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya. (Ọma 65:2) Ihe anyị kwesịrị ịna-ekpe n’ekpere abụghị naanị ihe anyị chọrọ ka Chineke meere anyị. Anyị kwesịkwara ịna-eto ya, na-ekele ya, na-arịọsikwa ya arịrịọ ike.

4. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-eto Jehova n’ekpere anyị?

4 E nwere ọtụtụ ihe mere anyị ji kwesị ịna-eto Jehova n’ekpere anyị. Dị ka ihe atụ, mgbe ọ bụla  anyị chetara “oké ọrụ ya” na “oké ịdị ukwuu ya,” ọ na-eme ka anyị na-eto ya. (Gụọ Abụ Ọma 150:1-6.) Legodị anya n’Abụ Ọma nke 150. Amaokwu nke mbụ ruo na nke isii kwuru banyere ito Jehova ugboro iri na atọ. Onye ọzọ so dee Abụ Ọma kwuru ihe gosiri na ọ hụrụ Jehova n’anya nke ukwuu. Ọ bụrụ abụ, sị: “Ana m eto gị ugboro asaa n’ụbọchị n’ihi mkpebi ikpe gị ziri ezi.” (Ọma 119:164) N’eziokwu, e kwesịrị ịna-eto Jehova. N’ihi ya, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịna-eto ya n’ekpere anyị ugboro asaa n’ụbọchị, ya bụ, ugboro ugboro?

5. Olee uru anyị ga-erite ma ọ bụrụ na anyị na-ekele Chineke n’ekpere anyị?

5 Ụdị ekpere ọzọ dị mkpa bụ ikele Chineke. Pọl gbara Ndị Kraịst bi n’obodo Filipaị ume, sị: “Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọ bụla, kama n’ihe niile, jirinụ ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike na inye ekele mee ka Chineke mara ihe unu na-arịọ.” (Fil. 4:6) Ebe anyị bi n’oge ikpeazụ, ọtụtụ ndị bụ “ndị na-enweghị ekele.” Ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile na-ekele Jehova n’ekpere anyị, ọ ga-eme ka anyị ghara ịna-eme ka ndị ụwa. (2 Tim. 3:1, 2) Ọtụtụ ndị n’ụwa taa anaghị ekele onye meere ha ihe ọma. Ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, anyị nwere ike ịmụta ụdị omume ahụ. Ma, ọ bụrụ na anyị na-ekele Chineke mgbe anyị na-ekpe ekpere, obi ga na-adị anyị ụtọ. Anyị agaghị na-atamu ntamu ma ọ bụ na-akwa ụwa. (Jud 16) Ọ bụrụkwa na ndị isi ezinụlọ na-ekele Chineke mgbe ha na ezinụlọ ha na-ekpe ekpere, ọ ga-eme ka ndị nwunye ha na ụmụ ha na-ekelekwa Chineke.

6, 7. Gịnị bụ ịrịọsi arịrịọ ike? Olee ihe ndị anyị nwere ike ịrịọsi Jehova arịrịọ ike banyere ha?

6 Ụdị ekpere ọzọ bụ ịrịọsi arịrịọ ike, ya bụ, mmadụ isi n’ala ala obi ya na-ekpesi ekpere ike. Olee ihe anyị nwere ike ịrịọsi Jehova arịrịọ ike banyere ya? Anyị nwere ike ịrịọ Jehova ka o nyere anyị aka mgbe a na-akpagbu anyị ma ọ bụ mgbe anyị na-arịasi ọrịa ike. N’ụdị oge ahụ, o doro anya na anyị ga-arịọsi Chineke ike ka o nyere anyị aka. Ma, ọ̀ gwụla ya bụ mgbe anyị kwesịrị ịrịọsi Jehova arịrịọ ike?

7 Ka anyị tụlee ihe Jizọs kwuru gbasara aha Chineke, Alaeze ya, na uche ya n’ekpere ahụ ọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya. (Gụọ Matiu 6:9, 10.) Ihe ọjọọ juru n’ụwa taa, ndị ọchịchị anaghịkwa enye ndị ha na-achị ihe ndị kacha ha mkpa. Ihe ndị a kwesịrị ime ka anyị na-ekpe ekpere ka e doo aha Chineke nsọ nakwa ka Alaeze ya bịa bibie ọchịchị Setan. Anyị kwesịkwara ịna-arịọsi Jehova arịrịọ ike ka o mee ka uche ya mee n’ụwa otú ahụ o si eme n’eluigwe. N’ihi ya, ka anyị mụrụ anya, na-ekpekwa ụdị ekpere niile.

“NA-EKPE EKPERE MGBE NIILE”

8, 9. Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịma Pita na ndịozi ibe ya ikpe maka na ụra buuru ha n’ogige Getsemeni?

8 Pita degaara Ndị Kraịst akwụkwọ ka ha ‘mụrụ anya ka ha wee na-ekpe ekpere.’ Ma, ọ dịkarịa ala, o nwere otu oge ọ na-amụghị anya. O so ná ndị na-eso ụzọ Jizọs ụra buuru mgbe Jizọs na-ekpe ekpere n’ogige Getsemeni. Ụra buuru ha n’agbanyeghị na Jizọs gwara ha ‘na-eche nche ma na-ekpe ekpere mgbe niile.’—Gụọ Matiu 26:40-45.

9 Kama ịma Pita na ndịozi ibe ya ikpe maka na ha amụghị anya, anyị kwesịrị icheta na ike gwụchara ha n’ihi ihe niile ha mere n’ụbọchị ahụ. Ha so hazie otú a ga-esi eme Ememme Ngabiga ahụ, sorokwa mee ya ná mgbede ahụ. Jizọs malitere Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị ka ndị na-eso ụzọ ya mata otú ha ga-esi na-echeta ọnwụ ya. (1 Kọr. 11:23-25) Baịbụl kwuru na ‘mgbe ha bụsịrị abụ otuto,  ha gara n’Ugwu Oliv,’ bụ́ ebe na-adịchaghị anya. Ha gafere okporo ámá ndị dị na Jeruselem. (Mat. 26:30, 36) O nwere ike ịbụ na ọ gafeela etiti abalị mgbe ahụ. A sị na anyịnwa nọ n’ogige Getsemeni n’abalị ahụ, anyị nwekwara ike ihi ụra. Ma, Jizọs akatọghị ndịozi ya ndị ahụ ike gwụrụ. Kama ime otú ahụ, o kwuru na “mmụọ dị njikere, ma anụ ahụ́ adịghị ike.”

N’agbanyeghị na Pita mejọrọ ihe, ọ mụtara otú ọ ga-esi ‘amụrụ anya ka o wee na-ekpe ekpere’ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10 na 11)

10, 11. (a) Gịnị ka Pita mụtara n’ihe mere ya n’ogige Getsemeni? (b) Gịnị ka ị mụtara n’ihe ahụ mere Pita?

10 O wutere Pita na ya amụghị anya n’ogige Getsemeni, ma ọ mụtara ezigbo ihe na ya. Tupu mgbe ahụ, Jizọs gwara ha, sị: “Unu niile ga-asụ ngọngọ n’ihi m n’abalị a.” Ma, Pita zara, sị: “Ọ bụrụgodị na ndị ọzọ niile asụọ ngọngọ n’ihi gị, m gaghị asụ ngọngọ ma ọlị!” Jizọs gwara ya na ọ ga-agọnahụ ya ugboro atọ. Ma, Pita ekwetaghị ihe a o kwuru. Ọ gwara Jizọs, sị: “Ọ bụrụgodị na m ga-eso gị nwụọ, agaghị m agọnahụ gị ma ọlị.” (Mat. 26:31-35) Ihe ahụ Jizọs kwuru mechara mee mgbe Pita kwuru na ya amaghị onye Jizọs bụ. Mgbe Pita ghọtara ihe o mere, o wutere ya, ya ‘akwaa ákwá nke ukwuu.’—Luk 22:60-62.

11 Ihe ahụ mere Pita mere ka ọ ghọta na ya ekwesịghị ịtụkwasị onwe ya obi. O doro anya na ekpere nyeere ya aka. Olee otú anyị si mara? Otú anyị si mara bụ na ọ bụ Pita dere na anyị kwesịrị ‘ịmụrụ anya ka anyị wee na-ekpe ekpere.’ Ànyị na-eme ihe a Baịbụl kwuru? Ànyị na-ekpe ekpere mgbe niile, si otú ahụ na-egosi na anyị tụkwasịrị Jehova obi? (Ọma 85:8) Anyị kwesịkwara iburu ihe Pọl onyeozi kwuru n’obi. Ọ sịrị: “Ka onye chere na ya guzosiri ike lezie anya ka ọ ghara ịda.”—1 Kọr. 10:12.

CHINEKE ZARA NEHEMAYA EKPERE YA

12. Gịnị ka anyị kwesịrị ịmụta n’ihe Nehemaya mere?

12 Onye ọzọ anyị ga-atụle ihe o mere bụ Nehemaya. N’ihe dị ka narị afọ anọ na iri ise Tupu Oge Ndị Kraịst, ọ bụ ya na-eburu eze ndị Peshia bụ́ Atazaksis ihe ọṅụṅụ. Nehemaya ji obi ya niile kpegara Jehova ekpere. Baịbụl kwuru na ruo ọtụtụ ụbọchị, ọ ‘nọ na-ebu ọnụ ma na-ekpe ekpere n’ihu Chineke’ n’ihi nsogbu ndị Juu bi na Jeruselem nọ na ya. (Nehe. 1:4) Mgbe Atazaksis jụrụ Nehemaya ihe mere ihu ya ji gbarụọ, Nehemaya gwara ya otú Jeruselem dị. Eze ajụọ ya, sị: “Gịnị ka ị na-achọ ka e meere gị?” ‘Ozugbo ahụ, Nehemaya kpekuru Chineke nke eluigwe ekpere.’ (Nehe. 2:2-4) Gịnịzi mere? Jehova zara ekpere ya otú baara ndị ya uru. (Nehe. 2:5, 6) Ọ ga-abụrịrị  na ekpere ahụ Jehova zara ya mere ka okwukwe ya sie ike.

13, 14. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka okwukwe anyị sie ike, anyị agharakwa ikwe ka Setan mee ka anyị daa mbà?

13 Ọ bụrụ na anyị ana-ekpe ekpere mgbe niile otú ahụ Nehemaya mere, ọ ga-eme ka okwukwe anyị sie ike. Obi tara Setan mmiri. Ọ na-alụsokarị anyị ọgụ mgbe anyị na-adịghị ike. Dị ka ihe atụ, mgbe anyị na-arịa ọrịa ma ọ bụ mgbe obi na-adịghị anyị mma, anyị nwere ike ichewe na oge anyị ji ekwusa ozi ọma kwa ọnwa abaghị uru n’anya Chineke. Ụfọdụ n’ime anyị nwere ike ịna-echegbu onwe ha n’ihi ihe ọjọọ ndị ha mere n’oge gara aga. Setan chọrọ ime ka anyị chewe na anyị abaghị uru. Ihe mere o ji alụso anyị ọgụ na-abụkarị ka obi na-ajọ anyị njọ, nke ga-eme ka okwukwe anyị ghara isi ike. Ma, ọ bụrụ na anyị ‘amụrụ anya ka anyị wee na-ekpe ekpere,’ okwukwe anyị ga-esi ike. Baịbụl kwuru na okwukwe anyị yiri ọta ukwu ga-enyere anyị aka “imenyụ akụ́ ụta niile na-ere ọkụ nke ajọ onye ahụ.”—Efe. 6:16.

Ọ bụrụ na anyị ‘amụrụ anya ka anyị wee na-ekpe ekpere,’ anyị ga-emeri ụdị ọnwụnwa ọ bụla (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13 na 14)

14 Ọ bụrụ na anyị ‘amụrụ anya ka anyị wee na-ekpe ekpere,’ anyị ga-ejikere ejikere tupu ọnwụnwa abịara anyị, anyị agaghịkwa enupụrụ Jehova isi. Mgbe ọ bụla ọnwụnwa bịaara anyị, anyị kwesịrị icheta ihe Nehemaya mere, kpeekwa ekpere ozugbo ka Chineke nyere anyị aka. Naanị ihe ga-eme ka anyị merie ọnwụnwa bụ ma Jehova nyere anyị aka.

NA-ECHETA NDỊ ỌZỌ N’EKPERE

15. Olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị banyere icheta ndị ọzọ n’ekpere?

15 Jizọs kpesiri ekpere ike ka Pita onyeozi ghara ịda mbà n’okwukwe ya. (Luk 22:32) N’oge ndịozi, otu Onye Kraịst aha ya bụ Epafras mere otú ahụ  Jizọs mere. Ọ gbasiri mbọ ike na-ekpe ekpere maka ụmụnna ya nọ na Kọlọsi. Ọ bụ ya mere Pọl ji degara ha akwụkwọ, sị: “Ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ mgbe niile n’ekpere ya n’ihi ọdịmma unu, ka unu wee bụrụ ndị zuru ezu n’ikpeazụ, na-ekwenyesikwa ike n’ihe niile bụ́ uche Chineke.” (Kọl. 4:12) Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘M̀ na-ekpesi ekpere ike maka ụmụnna m nọ n’ụwa niile? M kpewe ekpere, ugboro ole ka m na-echeta ụmụnna ọdachi dakwasịrị? Olee mgbe ikpeazụ m gbalịsiri ike cheta ndị na-edu ndú ná nzukọ Jehova n’ekpere? Ò nwere onye ihe na-esiri ike n’ọgbakọ anyị m chetara n’ekpere n’oge na-adịbeghị anya?’

16. Icheta ndị ọzọ n’ekpere ọ̀ bara uru? Kọwaa.

16 Icheta ndị ọzọ n’ekpere nwere ike inyere ha aka n’eziokwu. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 1:11.) Iwu ejighị Jehova ịza ekpere naanị n’ihi na ọtụtụ ndị ohu ya ekpeela ya ugboro ugboro. Ma, mgbe ọ zara ekpere ha, obi na-adị ya ụtọ ịhụ na ha bu ibe ha n’obi, jirikwa obi ha niile hụ ibe ha n’anya. N’ihi ya, icheta ndị ọzọ n’ekpere bụ ihe ùgwù Chineke nyere anyị. Anyị ekwesịghị iji ya gwurie egwu. Anyị kwesịrị ịna-eme otú ahụ Epafras mere. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịgbasi mbọ ike na-echeta ụmụnna anyị niile n’ekpere. Ọ bụrụ na anyị na-eme otú ahụ, ọ ga-egosi na anyị hụrụ ha n’anya, meekwa ka anyị nwekwuo obi ụtọ n’ihi na “a na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.”—Ọrụ 20:35.

‘NZỌPỤTA ANYỊ DỊ NSO’

17, 18. Olee uru anyị ga-erite ma ọ bụrụ na anyị ‘amụrụ anya ka anyị wee na-ekpe ekpere’?

17 Tupu Pọl ekwuo na “chi ejimiwo; chi abọwala,” o dere, sị: “Unu maara oge ahụ a kara aka, na oge awa ahụ eruwo ka unu teta n’ụra, n’ihi na nzọpụta anyị dị nso ugbu a karịa mgbe anyị ghọrọ ndị kwere ekwe.” (Rom 13:11, 12) Ụwa ọhụrụ ahụ Chineke kwere anyị ná nkwa adịla nso. Nzọpụta anyị adịla nso karịa otú anyị chere. Anyị kwesịrị ịmụrụ anya. Anyị ekwesịghị ikwe ka ihe ndị dị n’ụwa mee ka anyị ghara inwe ohere anyị ga-eji na-ekpegara Jehova ekpere. Kama, ka anyị ‘mụrụ anya ka anyị wee na-ekpe ekpere.’ Anyị mee otú ahụ, ọ ga-eme ka anyị na-akpa ‘àgwà dị nsọ, na-asọpụkwara Chineke’ ka anyị na-echere ụbọchị ya. (2 Pita 3:11, 12) Otú anyị si ebi ndụ ga-egosi ma ànyị mụ anya nakwa ma ànyị kwetara na Chineke ga-ebibi ụwa ochie a n’oge na-adịghị anya. N’ihi ya, ka anyị ‘na-ekpe ekpere n’akwụsịghị akwụsị.’ (1 Tesa. 5:17) Anyị kwesịrị ịna-eme ka Jizọs. Anyị gụrụ gụrụ, anyị agaa ebe naanị anyị ga-anọ kpegara Jehova ekpere. Anyị ekwesịghị ịna-ekpe ekpere ka onye a na-achụ ọsọ. Ọ bụrụ na anyị ewetuo obi kpee ekpere, ọ ga-eme ka anyị na Jehova dịkwuo ná mma. (Jems 4:7, 8) Ọ ga-emekwa ka Jehova gọzie anyị.

18 Baịbụl kwuru, sị: “N’oge Kraịst bụ anụ ahụ́, o ji ibesi ákwá ike na anya mmiri kpesie ekpere ike ma rịọ Onye ahụ nke nwere ike ịzọpụta ya n’ọnwụ arịrịọ, a nụkwara olu ya n’ihi na ọ tụrụ egwu Chineke.” (Hib. 5:7) Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ rịọsiri Jehova arịrịọ ike, kpesiekwa ekpere ike ma jiri obi ya niile jeere ya ozi ruo mgbe ọ nwụrụ. Ọ bụ ya mere Jehova ji kpọlite Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya n’ọnwụ, meekwa ka ọ bụrụ onye na-agaghị anwụ anwụ n’eluigwe. Anyịnwa nwekwara ike iji obi anyị niile na-ejere Nna anyị nke eluigwe ozi n’agbanyeghị ọnwụnwa ndị nwere ike ịbịara anyị n’ọdịnihu. Ọ bụrụ na anyị ‘amụrụ anya ka anyị wee na-ekpe ekpere,’ Chineke ga-enye anyị ndụ ebighị ebi.