Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) NỌVEMBA 2013

Ndị Ọzụzụ Atụrụ, Ṅomienụ Ndị Ọzụzụ Atụrụ Kacha Ukwuu

Ndị Ọzụzụ Atụrụ, Ṅomienụ Ndị Ọzụzụ Atụrụ Kacha Ukwuu

“Kraịst tara ahụhụ n’ihi unu, wee hapụrụ unu ihe nlereanya ka unu wee sochie nzọụkwụ ya anya.”—1 PITA 2:21.

1, 2. (a) Olee otú ahụ́ na-adị atụrụ ndị a na-elekọta nke ọma? (b) N’oge Jizọs, gịnị mere ọtụtụ ndị ji dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha?

AHỤ́ na-adị ụmụ atụrụ mma ma ọ bụrụ na onye na-azụ ha na-elekọta ha nke ọma. E nwere otu akwụkwọ kọwara otú e si akpa atụrụ. O kwuru na ọ bụrụ na ihe onye na-azụ atụrụ na-eme bụ naanị iduga ìgwè atụrụ ya n’ebe ha ga-ata nri, ma ọ naghị emere ha ihe ndị ọzọ o kwesịrị ịna-emere ha, ọ gaghị enwe atụrụ ndị ga-abara ya uru, ọrịa ga-abịakwa ha n’ime afọ ole na ole. Ma, ọ bụrụ na mmadụ ana-elekọta atụrụ ya nke ọ bụla nke ọma, ahụ́ ga na-adị ìgwè atụrụ ya mma.

2 Ọ bụrụ na ndị okenye ọgbakọ ana-elekọta atụrụ Chineke nke ọma, ọ ga-abara ọgbakọ dum uru. Ha na Jehova ga-adịkwu ná mma. I nwere ike icheta na Jizọs nwere ọmịiko n’ebe ìgwè mmadụ nọ n’ihi na “a gbara ha akpụkpọ, na-achụsakwa ha, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.” (Mat. 9:36) Gịnị mere ha ji dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha? Ọ bụ n’ihi na ndị kwesịrị ịna-akụziri ha Iwu Chineke dị obi ọjọọ, bụrụkwa ndị ihu abụọ. O nweghị ihe e mere na-adị ha mma. Kama inyere atụrụ Chineke aka ma na-azụ ha, ndị ndú okpukpe ndị ahụ na-adọkwasị “ibu dị arọ” n’ubu ha.—Mat. 23:4.

3. Gịnị ka ndị okenye kwesịrị ịna-echeta mgbe ha na-elekọta atụrụ Chineke?

3 N’ihi ya, ndị na-azụ atụrụ Chineke taa, ya bụ, ndị okenye ọgbakọ, na-arụ nnukwu ọrụ. Ọ bụ Jehova na Jizọs nwe atụrụ ha na-elekọta. Jizọs kpọrọ onwe ya “onye ọzụzụ atụrụ ọma.” (Jọn 10:11) Atụrụ ndị ahụ dị Jizọs ezigbo mkpa. Ọ bụ ya mere o ji nwụọ n’ihi ha, jiri ‘ọbara ya dị oké ọnụ ahịa’ zụta ha. (1 Kọr. 6:20; 1 Pita 1:18, 19) Ndị okenye kwesịrị ịna-echeta mgbe niile na ọ bụ Jizọs Kraịst bụ onyeisi ha. Ọ bụ ya bụ  “nnukwu onye ọzụzụ atụrụ ahụ.” N’ihi ya, ha ga-aza ya ajụjụ maka otú ha si emeso atụrụ ya.—Hib. 13:20.

4. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?

4 Olee otú ndị okenye ọgbakọ kwesịrị isi na-emeso atụrụ Chineke? Baịbụl gwara ndị niile nọ n’ọgbakọ ka ha ‘na-erubere ndị na-edu ndú n’etiti ha isi.’ Ma, Jehova gwakwara ndị okenye ka ha ghara ‘ịna-eme ndị bụ́ ihe nketa nke Chineke dị ka ọ̀ bụ ha nwe ha.’ (Hib. 13:17; gụọ 1 Pita 5:2, 3.) Olee otú ndị okenye ọgbakọ ga-esi na-eduzi atụrụ Chineke ma ghara ime ka ọ̀ bụ ha nwe ha? Ya bụ, olee otú ndị okenye ga-esi na-elekọta atụrụ Chineke ma ghara iji ike Chineke nyere ha na-eme ihe ha na-ekwesịghị ime?

“Ọ GA-EKURU HA N’OBI YA”

5. Gịnị ka ihe e kwuru n’Aịzaya 40:11 na-akụziri anyị banyere Jehova?

5 Aịzaya onye amụma kwuru banyere Jehova, sị: “Ọ ga-azụ ìgwè atụrụ ya dị ka onye ọzụzụ atụrụ. Ọ ga-eji ogwe aka ya chịkọta ụmụ atụrụ ya; ọ ga-ekuru ha n’obi ya. Ọ ga-eji nwayọọ na-edu ndị na-enye ụmụ ara.” (Aịza. 40:11) Ihe e kwuru n’amaokwu a mere ka o doo anya na Jehova na-elekọta ndị na-adịghị ike ma ọ bụ ndị e kwesịrị inyere aka n’ọgbakọ. Onye na-azụ atụrụ na-ama mkpa atụrụ ọ bụla nọ n’ìgwè atụrụ ya, na-elekọtakwa ha. Ọ bụ otú ahụ ka Jehova ma mkpa ndị nọ n’ọgbakọ. Obi na-adịkwa ya ụtọ ịna-elekọta ha. Mgbe ụfọdụ, onye na-azụ atụrụ na-ekuru atụrụ a mụrụ ọhụrụ n’obi ya. Otú ahụ ka Jehova, bụ́ “Nna nke obi ebere,” ga-esi enyere anyị aka mgbe ihe siiri anyị ike. Ọ ga-akasi anyị obi mgbe ọnwụnwa ma ọ bụ nsogbu tara akpụ bịaara anyị.—2 Kọr. 1:3, 4.

6. Olee otú ndị okenye ọgbakọ ga-esi na-eme ka Jehova?

6 Okenye ọgbakọ kwesịrị ịmụta ihe magburu onwe ya n’aka Nna anyị nke eluigwe. O kwesịrị ịna-echebara mkpa atụrụ Chineke echiche otú ahụ Jehova na-eme. Ọ bụrụ na okenye amata ụdị nsogbu bịaara ha, ọ ga-ama mgbe ọ ga-agba ha ume ma nyere ha aka, marakwa otú ọ ga-esi eme ya. (Ilu 27:23) O doro anya na okenye kwesịrị iwepụta oge ka ya na ụmụnna ya kparịta ụka. N’agbanyeghị na o kwesịghị ịna-etinye anya n’ihe na-agbasaghị ya, o kwesịghị ileghara ihe ọ hụrụ na ihe ọ nụrụ n’ọgbakọ anya. O kwesịrị iwepụta oge ‘na-enyere ndị na-adịghị ike aka.’—Ọrụ 20:35; 1 Tesa. 4:11.

7. (a) Gịnị ka e mere atụrụ Chineke n’oge Ezikiel na Jeremaya? (b) Olee ihe ndị okenye kwesịrị ịmụta n’otú Jehova si jụ ndị ọzụzụ atụrụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi?

7 Chegodị banyere ndị kwesịrị ịna-azụ ndị Chineke n’oge Ezikiel na Jeremaya. Jehova jụrụ ndị ọzụzụ atụrụ ahụ n’ihi na ha anaghị elekọta atụrụ ya ha kwesịrị ịna-elekọta. Ebe ọ bụ na o nweghị onye na-elekọta atụrụ ndị ahụ, anụ ọhịa nọ na-eri ha, a na-achụsakwa ha. Kama ndị ọzụzụ atụrụ ahụ ga na-enye atụrụ ndị ahụ nri, ha nọ na-erigbu ha, ‘na-azụkwa onwe ha.’ (Ezik. 34:7-10; Jere. 23:1) Ọ bụ ụdị ihe ahụ mere Chineke ji jụ ndị isi Krisendọm. Olee ihe ndị okenye ọgbakọ kwesịrị ịmụta n’otú ahụ Jehova si jụ ndị ọzụzụ atụrụ ahụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi? Ha kwesịrị ịna-elekọta atụrụ Jehova nke ọma.

“M NA-ENYE UNU IHE NLEREANYA”

8. Olee otú ndị okenye ga-esi na-eme ka Jizọs mgbe ha na-enye ụmụnna ha ndụmọdụ?

8 Ebe ọ bụ na ụmụ mmadụ ezughị okè, ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ nwere ike ha agaghị aghọtacha ihe Jehova chọrọ ka ha na-eme. Ma eleghị anya, ha agaghị eme ihe Baịbụl kwuru, ma ọ bụkwanụ ha akpaa àgwà gosiri na okwukwe ha esichabeghị ike. Gịnị ka ndị okenye kwesịrị ime? Ha kwesịrị inwere ụmụnna ndị ahụ  ndidi otú ahụ Jizọs nweere ndị na-eso ụzọ ya ndidi. Ndị na-eso ụzọ Jizọs rụrụ ụka ugboro ugboro banyere onye kacha ukwuu n’Alaeze Chineke, ma o nweghị mgbe Jizọs wesoro ha iwe. Kama ime otú ahụ, o weturu obi na-akụziri ha ihe, na-enyekwa ha ndụmọdụ otú ha ga-esi adị umeala n’obi. (Luk 9:46-48; 22:24-27) E nwedịrị mgbe ọ sara ha ụkwụ, jiri ya gosi ha ihe ịdị umeala n’obi pụtara. Taa, ndị okenye kwesịrị ịdị umeala n’obi.—Gụọ Jọn 13:12-15; 1 Pita 2:21.

9. Olee àgwà Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha nwee?

9 Ihe Jems na Jọn mere gosiri na ha chere na ịbụ onye ọzụzụ atụrụ pụtara ịchị ndị ọzọ. Ndịozi abụọ a rịọrọ Jizọs ka o nye ha nnukwu ọkwá n’Alaeze Chineke. Ma, Jizọs gbaziri ha olu, kụziere ha na ha ekwesịghị iche otú ahụ. Ọ sịrị ha: “Unu maara na ndị na-achị ndị mba ọzọ na-eme ha ka ọ̀ bụ ha nwe ha, ndị ukwu ha na-achịkwa ha n’aka ike. O kwesịghị ịdị otú ahụ n’etiti unu; kama onye ọ bụla nke na-achọ ịbụ onye ukwu n’etiti unu aghaghị ịbụ onye na-ejere unu ozi.” (Mat. 20:25, 26) Ndịozi Jizọs kwesịrị ịgbasi mbọ ike ka ha ghara ‘ịna-eme ka ọ̀ bụ ha nwe ụmụnna ha,’ ya bụ, ịna-atụrụ ha ihe ha ga na-eme.

10. Olee otú Jizọs chọrọ ka ndị okenye si na-emeso atụrụ ya? Olee otú Pọl si mee ihe ahụ Jizọs kwuru?

10 Jizọs chọrọ ka ndị okenye ọgbakọ na-emeso atụrụ ya otú ahụ yanwa si meso ya. Ha kwesịrị ịna-ejere ụmụnna ha ozi, kama ịbụ nna ha ukwu. Pọl onyeozi dị umeala n’obi ka Jizọs. Ọ bụ ya mere o ji gwa ndị okenye si n’ọgbakọ Efesọs, sị: “Unu maara nke ọma otú mụ na unu si nọrọ n’oge ahụ dum, malite n’ụbọchị mbụ m batara n’ógbè Eshia, eji m oké ịdị nwayọọ n’obi na anya mmiri na-agbara Onyenwe anyị ohu.” Pọl chọrọ ka ndị okenye ahụ dịrị umeala n’obi, na-agbalịsikwa ike inyere ụmụnna ha aka. Ọ gwara ha, sị: “Egosiwo m unu n’ihe niile na site n’ịdọgbu onwe unu n’ọrụ otú a, unu aghaghị inyere ndị na-adịghị ike aka.” (Ọrụ 20:18, 19, 35) Pọl gwara ndị Kọrịnt na ọ bụghị ya nwe okwukwe ha, kama na ya chọrọ ịna-enyere ha aka ka ha jiri ọṅụ na-ejere Chineke ozi. (2 Kọr. 1:24) O gosiri ndị okenye otú ha ga-esi na-adị umeala n’obi ma na-arụsi ọrụ ike.

‘JIDESIE OKWU AHỤ KWESỊRỊ NTỤKWASỊ OBI IKE’

11, 12. Olee otú okenye nwere ike isi nyere nwanna aka ikpebi ihe ọ ga-eme?

11 Ndụmọdụ ọ bụla okenye ọgbakọ nyere kwesịrị isi na Baịbụl, bụ́ ‘okwu kwesịrị ntụkwasị obi.’ (Taị. 1:9) Ma, o kwesịrị “iji mmụọ dị nwayọọ” na-enye ndụmọdụ. (Gal. 6:1) Ezigbo onye na-azụ atụrụ Chineke anaghị amanye ụmụnna ya ka ha mee ihe ọ chọrọ. Kama ime otú ahụ, ọ na-agba mbọ ikwu ihe ga-eru ha n’obi. Ọ bụrụ na nwanna chọrọ ikpebi ihe dị mkpa ọ ga-eme, okenye nwere ike ịgwa ya ihe Baịbụl kwuru o kwesịrị ichebara echiche. Okenye ahụ nwere ike ịgwa ya ihe e kwuru n’akwụkwọ anyị gbasara ihe ahụ ọ chọrọ ikpebi. O nwekwara ike ịgwa nwanna ahụ ka o chee otú ihe o kpebiri ime nwere ike isi mee ka ya na Jehova dịkwuo ná mma ma ọ bụkwanụ mee ka ya na ya ghara ịdị ná mma. Okenye ahụ nwekwara ike ime ka ọ ghọta na ọ dị ezigbo mkpa ka o kpee ekpere rịọ Chineke ka o duzie ya tupu ya ekpebie ihe ọ ga-eme. (Ilu 3:5, 6) Ọ bụrụ na okenye agwachaa nwanna ahụ ihe ndị a, ọ ga-ahapụ ya ka o jiri aka ya kpebie ihe ọ ga-eme.—Rom 14:1-4.

12 Mgbe ọ bụla ndị okenye chọrọ inye ụmụnna ha ndụmọdụ, ha kwesịrị ịgwa ha ihe Baịbụl kwuru. N’ihi ya, ọ dị ezigbo mkpa ka ha jiri Baịbụl na-akụzi ihe nke ọma, na-ekwukwa naanị ihe Baịbụl  kwuru. Ọ bụrụ na ndị okenye na-eme otú ahụ, ọ ga-eme ka ha ghara iji ike ha na-eme ihe ha na-ekwesịghị ime. A sị ka e kwuwe, ọ bụghị ha nwe atụrụ ha na-elekọta. Onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ ga-emecha zaa Jehova na Jizọs ajụjụ maka ihe o kpebiri ime.—Gal. 6:5, 7, 8.

“GHỌỌRỌNỤ ÌGWÈ ATỤRỤ AHỤ IHE NLEREANYA”

Ndị okenye na-enyere ndị ezinụlọ ha aka ịmụta ihe ha ga-ekwu ma ha gaa ozi ọma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13)

13, 14. Olee ụzọ ụfọdụ ndị okenye kwesịrị isi ghọọrọ ụmụnna ha ihe nlereanya?

13 Mgbe Pita onyeozi dụchara ndị okenye ọdụ ka ha ghara ịna-eme ụmụnna ha ‘dị ka ọ̀ bụ ha nwe ha,’ ọ gbara ha ume ka ha ‘ghọọrọ ìgwè atụrụ ahụ ihe nlereanya.’ (1 Pita 5:3) Olee otú okenye nwere ike isi mee otú ahụ? Chegodị banyere àgwà abụọ nwanna kwesịrị inwe tupu ya abụrụ okenye. Nke mbụ bụ na o kwesịrị ịbụ “onye uche ya zuru okè.” Ihe ọ pụtara bụ na o kwesịrị ịghọta ihe Baịbụl kwuru nke ọma, marakwa otú ọ ga-esi na-eme ya eme. E nwee nsogbu, ọ na-ejide onwe ya. Ọ na-echekwa echiche nke ọma tupu ya ekpebie ihe ọ ga-eme. Nke abụọ bụ na o kwesịrị ‘ịna-elekọta ezinụlọ ya nke ọma.’ Ọ pụtara na ọ bụrụ na okenye nwere nwunye na ụmụ, o kwesịrị ịbụ ma ezigbo di ma ezigbo nna n’ihi na “ọ bụrụ na onye ọ bụla amaghị otú ọ ga-esi lekọta ezinụlọ nke ya, olee otú ọ ga-esi lekọta ọgbakọ Chineke?” (1 Tim. 3:1, 2, 4, 5) Ọ bụrụ na ndị nọ n’ọgbakọ amata na okenye nwere àgwà abụọ ahụ, ha ga-atụkwasị ya obi.

14 Otú ọzọ ndị okenye nwere ike isi ghọọrọ ụmụnna ha ihe nlereanya bụ ịna-ebute ụzọ n’ikwusa ozi ọma otú ahụ Jizọs mere. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke bụ ihe kacha ya mkpa. Ọ kụzikwaara ndị na-eso ụzọ ya otú ha ga-esi na-ekwusa ya. (Mak 1:38; Luk 8:1) Taa, obi na-adị ndị nkwusa ụtọ mgbe ha na ndị okenye na-arụ n’ozi ọma, ha ana-ahụ otú ndị okenye si jiri ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ọrụ a dị mkpa. Ha na-amụtakwa ihe n’otú ndị okenye si akụzi Okwu Chineke. Ọ bụrụ na ndị okenye ana-ewepụta oge ma jiri ike ha niile na-aga ozi ọma mgbe niile n’agbanyeghị na ha nwere ọtụtụ ihe ha na-arụ, ọ ga-eme ka ụmụnna niile jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma. Otú ọzọ ndị okenye ga-esi na-akụziri ụmụnna ha ihe ha kwesịrị ịna-eme bụ ịna-akwado ihe a ga-amụ n’ọmụmụ ihe, ịna-aza ajụjụ, na ịna-arụ ọrụ ndị ọzọ dị ka idebe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha, na ịrụzi ya.—Efe. 5:15, 16; gụọ Ndị Hibru 13:7.

Ndị okenye na-akụziri ụmụnna ha otú e si ekwusa ozi ọma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14)

“NA-AKWADONỤ NDỊ NA-ADỊGHỊ IKE”

15. Olee ihe ụfọdụ mere ndị okenye ji aga eleta ụmụnna ha?

15 E nwee atụrụ merụrụ ahụ́ ma ọ bụ nke na-arịa ọrịa, ezigbo onye ọzụzụ atụrụ na-aga enyere ya aka ngwa ngwa. Otú ahụ ka ndị okenye na-eme. E nwee ụmụnna na-ata ahụhụ, ndị e kwesịrị ịdụ ọdụ ma ọ bụ gbaa ume, ndị okenye na-aga enyere ha aka ngwa ngwa. O nwere ike ịdị mkpa ka e gbooro ndị agadi na  ndị ọrịa mkpa ha, ma e kwesịrị iji Baịbụl na-agba ha ume, na-akasikwa ha obi. (1 Tesa. 5:14) E nwekwara ike inwe ihe na-enye ndị na-eto eto nsogbu. Dị ka ihe atụ, ha nwere ike ịna-agbalị ka ha “gbaara ọchịchọ a na-enwe n’oge ntorobịa ọsọ.” (2 Tim. 2:22) Ndị okenye na-enyere ndị niile nọ n’ọgbakọ aka. Otú ha si eme ya bụ ịga na-eleta ha n’ụlọ ha. Ha gaa ileta ha, ha na-agba mbọ ghọta nsogbu ndị ha na ha na-alụ ma jiri Baịbụl gbaa ha ume. Ọ bụrụ na ndị okenye agaa ngwa ngwa nyere ụmụnna ha aka, o nwere ike ime ka ụmụnna ha gbaara ọtụtụ nsogbu ọsọ.

16. Gịnị ka ndị okenye nwere ike ime ma ọ bụrụ na nwanna enwee ezigbo nsogbu?

16 Gịnị ka a ga-eme ma ọ bụrụ na nwanna enwee ezigbo nsogbu mere ka ya na Jehova ghara ịdị ná mma? Jems bụ́ onye so dee Baịbụl kwuru, sị: “È nwere onye ọ bụla na-arịa ọrịa n’etiti unu? Ka ọ kpọọ ndị okenye nke ọgbakọ, ka ha kpeekwara ya ekpere, teekwa ya mmanụ n’aha Jehova. Ekpere e ji okwukwe kpee ga-emekwa ka ahụ́ dị onye ahụ nke ahụ́ na-adịghị ike mma, Jehova ga-emekwa ka o bilie. Ọ bụrụkwa na o mewo mmehie, a ga-agbaghara ya.” (Jems 5:14, 15) Ọ bụrụgodị na nwanna ahụ nwere nsogbu ‘akpọghị ndị okenye,’ ha kwesịrị ịga nyere ya aka ozugbo ha matara na o nwere nsogbu. Ndị okenye ga-egosi na ha bụ ezigbo ndị ọzụzụ atụrụ na-agba ụmụnna ha ume ka ha jiri ọṅụ na-ejere Chineke ozi ma ọ bụrụ na ha na ụmụnna ha ekpekọọ ekpere ma ha gaa ileta ha. Otú ọzọ ha ga-esi egosi ya bụ ịna-echeta ha n’ekpere ma na-enyere ha aka mgbe nsogbu bịaara ha.—Gụọ Aịzaya 32:1, 2.

17. Ọ bụrụ na ndị okenye ana-eme ka “nnukwu onye ọzụzụ atụrụ ahụ,” olee uru ọ ga-abara ọgbakọ?

17 N’ihe niile ndị okenye na-eme n’ọgbakọ, ha na-agbasi mbọ ike ime ka Jizọs Kraịst, bụ́ “nnukwu onye ọzụzụ atụrụ ahụ.” Ndị okenye na-enyere ìgwè atụrụ Chineke aka ka okwukwe ha na-esikwu ike, ka ha jirikwa obi ha niile na-ejere Chineke ozi. N’ihi ihe a niile, anyị na-ekele Jehova, na-etokwa ya n’ihi na o nweghị onye ọzụzụ atụrụ dị ka ya.