Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Ọktoba 2013

Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha na Filipinz

Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha na Filipinz

E NWERE otu nwanna aha ya bụ Gregorio. N’ihe dị ka afọ iri gara aga, ya na Marilou nwunye ya akarịala afọ iri atọ. Ha bụ ndị ọsụ ụzọ mgbe ahụ n’obodo Manila, na-arụkwa ọrụ na-eri ha oge. O siiri ha ike, ma ha akwụsịghị ịsụ ụzọ. E mere Marilou onyeisi n’ụlọ akụ̀ ọ na-arụ ọrụ. O kwuru, sị: “Ezigbo ọrụ mụ na di m na-arụ mere ka anyị na-ebi ndụ ndị oké ozu.” N’eziokwu, otú ha si nwee ego mere ka ha kpebie ịrụ ọmarịcha ụlọ n’ebe mepere emepe. Isi n’ebe ha bi na Manila ruo ebe ahụ dị ihe dị ka kilomita iri na itoolu. Ha gwara otu ụlọ ọrụ na-arụ ụlọ ka ha rụọrọ ha ya ma kweta ịna-akwụ ha ụgwọ n’ọnwa n’ọnwa. Ha ga-akwụ ụgwọ a afọ iri.

“Ọ DỊ M KA M̀ NA-EZU JEHOVA OHI”

Marilou kwuru, sị: “Ana m eji oge m niile na ike m niile na-arụ ọrụ ọhụrụ m nwetara, ya emezie ka m ghara iji ofufe Jehova kpọrọ ihe. Ọ dị m ka m̀ na-ezu Jehova ohi.” O kwukwara, sị: “Anaghị m ejizi oge m kwuru na m ga-eji ejere Jehova ozi na-ejere ya ozi.” Gregorio na Marilou enweghị obi ụtọ. N’ihi ya, ha nọdụrụ ala otu ụbọchị kwurịta ihe ha ji ndụ ha na-eme. Gregorio kwuru, sị: “Anyị chọrọ  ịgbanwe, ma anyị amaghị ihe anyị ga-eme. Anyị kwurịtara otú anyị nwere ike isi na-ejekwuru Jehova ozi, ebe ọ bụ na anyị enweghị ụmụ. Anyị kpere ekpere ka Jehova nyere anyị aka.”

N’oge ahụ, ha nụrụ okwu ndị e kwuru gbasara ije ozi n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Gregorio kwuru, sị: “Mgbe anyị gechara okwu ndị ahụ, ọ dị anyị ka Jehova ọ̀ zala ekpere anyị.” Nwanna a na nwunye ya kpere ekpere ka Jehova nyere ha aka inwekwu okwukwe ka ha nwee ike ịkata obi mee mkpebi dị mma. Otu nsogbu ha nwere bụ ụlọ ahụ ha na-arụ. Ha akwụọla ụlọ ọrụ ahụ ụgwọ ruo afọ atọ. Ma, gịnị ka ha ga-eme? Marilou kwuru, sị: “Ọ bụrụ na anyị agwa ụlọ ọrụ ahụ na anyị achọghịzi ịrụ ụlọ ahụ, ego niile ahụ anyị kwụrụla ha ga-efu. Ego anyị kwụrụla ha abụghị obere ego. Ma, anyị chere na anyị kwesịrị ikpebi ma ànyị ga-ebute ime uche Jehova ụzọ ka ọ̀ bụ ime ihe masịrị anyị.” Ha chetara na Pọl onyeozi kwuru na ya ‘kwere ka ihe niile funahụ ya.’ N’ihi ya, ha kwụsịrị ụlọ ahụ ha na-arụ, gbaa arụkwaghịm n’ọrụ ha, ree ọtụtụ ihe ha nwere ma kwaga otu ime obodo dị n’obodo Palawan. Isi ebe ha bi na Manila ruo ebe ahụ dị ihe dị ka narị kilomita anọ na iri asatọ.—Fil. 3:8.

HA MỤTARA IHE BARA URU

Tupu Gregorio na Marilou akwaga ebe ahụ, ha ejikerela ibi ndụ otú ndị bi n’ime obodo si ebi, ma ha amaghị otú ihe ga-adị n’ebe ahụ. Ọ bụ mgbe ha ruru ka ha matara. Marilou kwuru, sị: “Ihe anyị hụrụ ebe ahụ riri anyị ọnụ. Ọkụ eletrik adịghị. E nweghị ihe ndị ọzọ e ji enyere ndụ aka. Mgbe anyị bi n’obodo mepere emepe, anyị na-eji ọkụ eletrik esi nri. Ma, ugbu a, anyị na-awa nkụ, jiri ya sie nri. Anyị anaghị ekpori ndụ otú anyị sibu ekpori.” Ma, ihe nyeere nwanna a na nwunye ya aka bụ na ha nọ na-echetara ibe ha ihe mere ha ji bịa n’obodo ahụ. Obere oge, ebe ahụ maara ha ahụ́. Marilou kwuru, sị: “Ugbu a, obi na-atọ m ụtọ ịhụ ihe ndị Chineke kere eke, dị ka kpakpando ndị a na-ahụ n’abalị. Ihe kacha enye m obi ụtọ bụ mgbe m na-ahụ otú obi si na-atọ ndị mmadụ ụtọ ma anyị na-ezi ha ozi ọma. Ebe a anyị na-eje ozi ugbu a emeela ka anyị mụta otú ihe anyị nwere ga-esi na-eju anyị afọ.”—Fil. 4:12.

“E nweghị ihe e nwere ike iji tụnyere obi ụtọ anyị na-enwe mgbe anyị na-ahụ otú ọtụtụ ndị si na-abata n’ọgbakọ. Obi dị anyị ụtọ ugbu a na anyị jizi ndụ anyị na-eme ihe ka baa uru.”—Gregorio na Marilou

Gregorio kwuru, sị: “Mgbe anyị rutere ebe a, e nwere naanị Ndịàmà Jehova anọ. Obi dị ha ụtọ mgbe m malitere ikwu okwu ihu ọha kwa izu, na-akpọkwa ụbọ m mgbe a na-abụ abụ n’ọmụmụ ihe.” N’ime otu afọ ha rutere, ndị nkwusa nọ n’ọgbakọ ha ruru iri abụọ na anọ. Gregorio kwuru, sị: “Otú ụmụnna anyị na ha nọ n’ọgbakọ si na-egosi anyị na ha hụrụ anyị n’anya ruru anyị n’obi.” Taa, mgbe ha chetara ihe ndị mere kemgbe afọ isii ha jerela ozi n’obodo a, ha kwuru, sị: “E nweghị ihe e nwere ike iji tụnyere obi ụtọ anyị na-enwe mgbe anyị na-ahụ otú ọtụtụ ndị si na-abata n’ọgbakọ. Obi dị anyị ụtọ ugbu a na anyị jizi ndụ anyị na-eme ihe ka baa uru.”

 ‘EDETỤLA M JEHOVA IRE MA HỤ NA Ọ DỊ MMA’!

N’obodo Filipinz, ihe fọrọ obere ka o ruo puku ụmụnna atọ na–eje ozi n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Ihe dị ka narị ise n’ime ha bụ ụmụnna nwaanyị na-alụbeghị dị. Otu n’ime ha bụ Karen.

Karen

Karen dị ihe dị ka afọ iri abụọ na ise ugbu a. O toro n’obodo Bagao, nke dị na Kagayan. Mgbe ọ ka na-eto eto, ọ na-echekarị otú ọ ga-esi jekwuoro Jehova ozi. O kwuru, sị: “Ebe ọ bụ na m ma na oge agwụla agwụ nakwa na ọtụtụ ndị kwesịrị ịnụ ozi ọma Alaeze Chineke, m chọrọ ije ozi n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma.” Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ndị ezinụlọ ha gwara ya ka ọ gaa mahadum kama ịga na-ekwusa ozi ọma n’ime obodo, o kpegaara Jehova ekpere ka o nyere ya aka ka ya mata ihe ya ga-eme. Ọ kọkwaara ya ụmụnna ndị na-eje ozi n’ime ime obodo. Mgbe ọ gbara afọ iri na asatọ, ọ kwagara n’otu ime obodo na-ekwusa ozi ọma. Isi n’ụlọ ha ruo ebe ahụ dị kilomita iri isii na anọ.

Ọ bụ obere ọgbakọ Karen gara inyere aka na-ekwusakwa ozi ọma n’obodo ndị dị n’akụkụ Oké Osimiri Pasifik. Obodo ndị ahụ bụ ugwu ugwu. Karen kwuru, sị: “Anyị ji ụkwụ si na Bagao gaa ije abalị atọ tupu anyị eruo n’ọgbakọ ahụ m gara inyere aka. Anyị rịrị ugwu, gafeekwa ihe karịrị mmiri iri atọ.” O kwukwara, sị: “M na-eji ụkwụ aga awa isii iji ruo n’ụlọ ụfọdụ ndị mụ na ha na-amụ Baịbụl. Anyị mụchaa ihe, mụ ehie n’ụlọ otu n’ime ha. Chi bọọ, mụ agaa awa isii ọzọ lọta.” Olee uru ihe a ọ na-eme baara ya? Karen kwuru, sị: “M gachaa ije lọta, ụkwụ na-egbu m mgbu.” Ma, o ji obi ụtọ kwuo, sị, “Mụ na mmadụ iri na asatọ na-amụ Baịbụl. Edetụla m Jehova ire ma hụ na ọ dị mma!”—Ọma 34:8.

“AMỤTARA M ỊTỤKWASỊ JEHOVA OBI”

Sukhi

E nwere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Sukhi. Ọ dị ihe dị ka iri afọ anọ na atọ, ma ọ lụbeghị di. O si n’ebe o bi n’Amerịka kwaga Filipinz. Gịnị mere o ji kwaga Filipinz? Ọ gara otu mgbakọ sekit e nwere n’afọ 2011. Ná mgbakọ ahụ, a gbara otu nwanna na nwunye ya ajụjụ ọnụ. Ha kọrọ otú ha si ree ọtụtụ ihe ha nwere ma kwaga Meksiko, ka ha nwee ike ikwusara ndị mmadụ ozi ọma. Sukhi kwuru, sị: “Ajụjụ ọnụ ahụ mere ka m chewe otú m ga-esi mee ihe ndị m na-echetụbeghị n’echiche.” Sukhi bụ onye India bi n’Amerịka. Mgbe ọ nụrụ na a chọrọ ndị ga na-ezi ndị na-asụ asụsụ Punjabi n’obodo Filipinz ozi ọma, o kpebiri ịga nyere ha aka. Punjabi so n’asụsụ ndị India. Ihe ọ̀ gaara ya siriri werere ebe ahụ?

Sukhi kwuru, sị: “O siiri m ike ikpebi ihe ndị m ga-ahapụ n’ụlọ na ndị m ga-ere ere. Mgbe naanị m bichara afọ iri na atọ n’ọmarịcha ụlọ nke m, m kwakwuuru otu ezinụlọ. Ebe ahụ abachaghị anyị aba. Ọ bụ eziokwu na ọ dịcharaghị m mfe, o nyeere m  aka ịmata otú m ga-esi ghara ịna-ebi ndụ okomoko.” Olee ihe ndị mere ka ibi n’obodo Filipinz siere ya ike ná mmalite? O kwuru, sị: “Ihe kacha mee ka o siere m ike bụ na m na-atụ ihe ọ bụla na-arị arị ụjọ, ọ na-agụsikwa m ike ịga hụ ndị ezinụlọ anyị. Amụtara m ịtụkwasị Jehova obi m niile karịa otú m na-emebu.” Ọ̀ kwara mmakwaara n’ihe a o mere? Sukhi ji obi ụtọ kwuo na Jehova na-agwa anyị, sị: ‘Nwaleenụ m, ma ḿ gaghị awụsa unu ngọzi.’ Mgbe ọ bụla m zichara mmadụ ozi ọma, ya ajụọ m, sị, ‘Olee mgbe ọzọ ị ga-abịa? Enwere m ọtụtụ ajụjụ m ga-ajụ gị,’ m na-aghọta na ihe ahụ Jehova kwuru bụ eziokwu. Obi na-atọ m ụtọ inyere ndị chọrọ ịmụta gbasara Jehova aka.” (Mal. 3:10) Sukhi kwukwara, sị: “Ihe kacha siere m ike bụ ikpebi ịkwapụ. Mgbe m kpebichara ịkwapụ, obi dị m ụtọ na Jehova mere ka ihe niile gaara m nke ọma.”

“M KWỤSỊRỊ ỊTỤ ỤJỌ”

E nwere otu nwanna nwoke aha ya bụ Sime. Ọ hapụrụ obodo ya bụ́ Filipinz gaa na-arụ ezigbo ọrụ n’otu obodo dị n’Eshia. Nwanna a dị ihe dị ka afọ iri atọ na asatọ, ọ lụọkwala nwaanyị. Mgbe ọ nọ ebe ahụ, okwu onye nlekọta sekit gwara ya nakwa okwu otu onye so n’Òtù Na-achị Isi kwuru mere ka ọ malite ibu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke. Sime kwuru, sị: “Ihe churu m ụra bụ otú m ga-esi gbaa arụkwaghịm n’ọrụ m.” Ma, o mechara hapụ ezigbo ọrụ ahụ ọ na-arụ, laghachi Filipinz. Taa, Sime na nwunye ya bụ́ Haidee na-eje ozi n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma n’ebe ndịda Filipinz. Aha obodo ahụ bụ Davao del Sọọ. Sime kwuru, sị: “Obi dị m ụtọ na m kwụsịrị ịtụ ụjọ ihe ga-eme ma m gbaa arụkwaghịm nakwa na m bu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke. E nweghị ihe bara uru n’ụwa a karịa mmadụ iji ndụ ya niile na-ejere Jehova ozi!”

Sime and Haidee

“Ọ NA-EME KA OBI NA-ATỌ ANYỊ EZIGBO ỤTỌ”

Ramilo na Juliet nwunye ya bụ ndị ọsụ ụzọ dị ihe dị ka afọ iri atọ na abụọ. Mgbe ha nụrụ na ọgbakọ dị ha nso chọrọ ndị nkwusa ga-enyere ha aka, ha wepụtara onwe ha ịga nyere ha aka. Isi n’ụlọ ha gaa n’ebe ọgbakọ a dị dị ihe dị ka kilomita iri atọ. N’izu ọ bụla, ma anwụ ọ̀ na-acha ma mmiri ọ̀ na-ezo, ha na-eji ọgba tum tum ha aga ọmụmụ ihe na ozi ọma. N’agbanyeghị na ịgba ọgba tum tum n’ụzọ mebiri emebi nakwa n’àkwà mmiri e ji osisi rụọ adịghị mfe, obi dị ha ụtọ na ha wepụtakwuru oge na-ejere Jehova ozi. Ramilo kwuru, sị: “Mụ na nwunye m na-amụrụ mmadụ iri na otu Baịbụl. Anyị hapụrụ ọtụtụ ihe ka anyị nwee ike ije ozi n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma, ma ọ na-eme ka obi na-atọ anyị ezigbo ụtọ.”—1 Kọr. 15:58.

Juliet and Ramilo

Ị̀ chọrọ ịmatakwu otú i nwere ike isi jee ozi n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma n’obodo unu ma ọ bụ n’obodo ọzọ? Ọ bụrụ na ị chọrọ, kọọrọ ya onye nlekọta sekit unu, gụọkwa isiokwu bụ́ “Ì Nwere Ike ‘Ịgafe na Masedonia’?” n’Ozi Alaeze Anyị nke ọnwa Nọvemba 2011.

GỤKWUO GBASARA YA

OLE NDỊ NA-EME UCHE JEHOVA TAA?

Ònye Bụ Onye Ozi Ala Ọzọ?

Olee otú onye ozi ala ọzọ si eje ozi ya? Olee ụlọ akwụkwọ pụrụ iche ha na-aga?