Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Ọktoba 2013

“Bụrụnụ Ndị Ohu Jehova”

“Bụrụnụ Ndị Ohu Jehova”

“Unu adịla umengwụ n’ihe unu na-eme. . . . Bụrụnụ ndị ohu Jehova.”—ROM 12:11.

1. Gịnị na-abata ọtụtụ ndị n’obi ma e kwuo banyere ohu? Oleekwa otú ịbụ ohu e kwuru okwu ya ná Ndị Rom 12:11 si dị iche?

E KWUO gbasara ohu, ihe na-abata ọtụtụ ndị n’obi bụ onye nna ya ukwu na-atụrụ ihe ọ na-eme na onye a na-emegbu emegbu. Ma Chineke anaghị eme ndị ohu ya otú ahụ. Baịbụl kwuru na Onye Kraịst nwere ike ikpebi na ya ga-abụ ohu Nna ya ukwu hụrụ ya n’anya. N’eziokwu, mgbe Pọl onyeozi gbara Ndị Kraịst ume ka ha ‘bụrụ ndị ohu Jehova,’ ọ na-agwa ha ka ha na-ejere Chineke ozi n’ihi na ha hụrụ ya n’anya. (Rom 12:11) Gịnị ka ịbụ ohu Jehova pụtara? Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị ghara ịbụ ndị ohu Setan na ụwa ya? Olee uru anyị ga-erite ma anyị bụrụ ndị ohu Jehova, jirikwa obi anyị niile na-ejere ya ozi?

‘AHỤRỤ M NNA M UKWU N’ANYA’

2. (a) Gịnị nwere ike ime ka onye Izrel bụ́ ohu kpebie na ya agaghị ahapụ nna ya ukwu? (b) Ọ bụrụ na ohu ekwe ka a hapuo ya ntị, gịnị ka ọ na-egosi?

2 Iwu Chineke nyere ụmụ Izrel na-enyere anyị aka ịmata ihe Jehova chọrọ ka ndị ohu ya na-eme. Onye Hibru bụ́ ohu na-enwere onwe ya n’afọ nke asaa. (Ọpụ. 21:2) Ma, ọ bụrụ na ohu ahụ achọghị ịla n’ihi na ọ hụrụ nna ya ukwu n’anya, o nwere ike ịnọrọ. Iwu Jehova kwuru na o nwere ike ime otú ahụ. Nna ya ukwu ga-akpọrọ ya bịa n’ọnụ ụzọ ma ọ bụ n’awara ụzọ ma jiri ahà hapuo ya ntị. (Ọpụ. 21:5, 6) Gịnị mere nna ya ukwu ga-eji eme ya ụdị ihe a? N’asụsụ Hibru, e si n’ịnụ ihe na ige ntị nweta okwu e ji akọwa nrubeisi. N’ihi ya, ọ bụrụ na ohu ekwe ka a hapuo ya ntị, ọ na-egosi na ọ chọghị ịhapụ nna ya ukwu. E nwere ike iji ya tụnyere otú anyị si rara onwe anyị nye Jehova. Mgbe anyị raara onwe anyị nye ya, ihe anyị gwara ya bụ na anyị ga-eji obi anyị niile na-erubere ya isi n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya.

3. Gịnị mere anyị ji rara onwe anyị nye Chineke?

3 Tupu e mee anyị baptizim, anyị kpebiri ịna-ejere Jehova ozi ma ọ bụ ịbụ ndị ohu ya. Mgbe anyị raara onwe anyị nye ya, anyị gwara ya na anyị ga na-erubere ya isi ma na-eme uche ya. A manyeghị anyị amanye. Otú ahụ ka  ọ dịkwa ndị na-eto eto. Ihe mere e ji eme ha baptizim bụ na ha ararala onwe ha nye Jehova, ọ bụghị ka ha mee ihe ga-atọ ndị mụrụ ha ụtọ. Ihe mere anyị ji rara onwe anyị nye Jehova, bụ́ Nna anyị ukwu nke eluigwe, bụ na anyị hụrụ ya n’anya. Jọn onyeozi dere, sị: “Nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara, ka anyị na-edebe ihe o nyere n’iwu.”—1 Jọn 5:3.

ANYỊ NWEERE ONWE ANYỊ, MA ANYỊ BỤ NDỊ OHU JEHOVA

4. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ka anyị bụrụ “ndị ohu nke ezi omume”?

4 Anyị na-ekele Jehova n’ihi na o kwere ka anyị bụrụ ndị ohu ya. Okwukwe anyị nwere n’àjà ahụ Kraịst chụrụ mere ka anyị ghara ịbụ ohu mmehie, ya bụ, ka anyị ghara ikwe ka mmehie na-atụrụ anyị ụka. N’ihi ya, ọ bụ eziokwu na anyị ka bụ ndị na-ezughị okè, anyị kpebiri na Jehova na Jizọs ga-abụ Nna anyị ukwu, anyị ana-erubere ha isi. Pọl kọwara ya nke ọma n’otu n’ime akwụkwọ ozi ya. O kwuru, sị: “Na-agụnụ onwe unu ná ndị nwụrụ anwụ n’ezie n’ebe mmehie dị, ma bụrụ ndị na-adịrị Chineke ndụ site n’aka Kraịst Jizọs.” Ọ dọziri aka ná ntị, sị: “Ọ̀ bụ na unu amaghị na ọ bụrụ na unu na-enyefe onwe unu n’aka onye ọ bụla ka unu bụrụ ndị ohu ya irubere ya isi, unu bụ ndị ohu ya n’ihi na unu na-erubere ya isi, ma ọ̀ bụ nke mmehie nke na-eweta ọnwụ ma ọ̀ bụ nke nrubeisi nke na-eweta ezi omume? Ma ekele dịrị Chineke na unu bụbu ndị ohu nke mmehie ma unu ghọrọ ndị si n’obi ha na-erube isi n’ụdị ozizi ahụ nke e nyefere unu n’aka. Ee, ebe e mere ka unu si ná mmehie pụọ nwere onwe unu, unu ghọrọ ndị ohu nke ezi omume.” (Rom 6:11, 16-18) Cheta na Pọl kwuru na anyị kwesịrị ‘isi n’obi anyị na-erube isi.’ N’ihi ya, mgbe anyị raara onwe anyị nye Chineke, anyị bụzi “ndị ohu nke ezi omume.”

5. Gịnị ka anyị niile kwesịrị ịna-alụso ọgụ? Ọ̀ bụ n’ihi gịnị?

5 Ebe ọ bụ na anyị ararala onwe anyị nye Chineke ma bụrụ ndị ohu ya, e nwere ihe abụọ anyị ga na-alụso ọgụ. Nke mbụ bụ ezughị okè anyị. Pọl lụkwara ụdị ọgụ a. O kwuru, sị: “N’ezie, iwu Chineke na-eme m obi ụtọ, dị ka mmadụ m bụ n’ime si dị, ma ana m ahụ n’ahụ́ m iwu ọzọ nke na-alụso iwu nke uche m agha, na-adọrọkwa m n’agha gaa n’iwu nke mmehie nke dị n’ahụ́ m.” (Rom 7:22, 23) Ebe anyị bụ ndị na-ezughị okè, anyị kwesịrị ịna-alụso ihe ọjọọ na-agụ anụ ahụ́ anyị ọgụ, ya bụ, ihe ndị ahụ Chineke sịrị na ha adịghị mma. Pita onyeozi gbara anyị ume, sị: “Na-ebinụ ndụ dị ka ndị nweere onwe ha, ma ka nnwere onwe unu ghara ịbụ ihe unu ga-eji na-ekpuchi ihe ọjọọ, kama nwerenụ onwe unu dị ka ndị ohu Chineke.”—1 Pita 2:16.

6, 7. Olee otú Setan si eme ka ụwa na-adọ anyị akpịrị?

6 Ihe nke abụọ anyị na-alụso ọgụ bụ ụwa a ndị mmụọ ọjọọ na-achị. Ebe ọ bụ na ụwa a dị n’aka Setan, ọ na-eji ngwá ọgụ ya niile agbalị ka anyị nupụrụ Jehova na Jizọs isi. Ọ chọrọ ka anyị bụrụ ndị ohu ya. Ọ na-anwa anyị ka anyị na-eme ka ndị ụwa. Ọ bụ otú ọ chọrọ isi mee ka anyị bụrụ ndị ohu ya. (Gụọ Ndị Efesọs 6:11, 12.) Otu ụzọ o si eme ya bụ na ọ na-eme ka ihe ndị dị n’ụwa na-adọ anyị akpịrị. Jọn onyeozi dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla ahụ ụwa n’anya, ịhụnanya maka Nna anyị adịghị n’ime ya; n’ihi na ihe niile dị n’ụwa, ya bụ, ọchịchọ nke anụ ahụ́ na ọchịchọ nke anya na oké ngosi nke ihe mmadụ ji ebi ndụ, esighị n’ebe Nna anyị nọ, kama o si n’ụwa.”—1 Jọn 2:15, 16.

7 N’ụwa niile, ndị mmadụ chọrọ ịna-akpatakwu akụ̀. Setan na-eme ka ndị mmadụ chee na ọ bụ inwe ego ga-eme ka ha na-enwe obi ụtọ. E nwere ọtụtụ nnukwu ụlọ ahịa ebe a na-ere ụdị ihe dị iche iche. Ndị na-akpọsa ngwá ahịa na-eme ka ndị mmadụ na-eche na ihe kacha mkpa bụ ịkpatakwu akụ̀ na ikporikwu ndụ. Dị ka ihe atụ, e nwere ụlọ ọrụ ndị na-enyere mmadụ aka ịga ebe dị iche iche mara mma ọ ga-aga kporie ndụ. Ndị onye  ahụ ga-eso gaa na-abụkarị ndị na-eche echiche otú ụwa si eche. N’eziokwu, e ji ihe ndị a niile na-arata anyị ka anyị biwe ndụ ka ndị ụwa.

8, 9. Olee ihe nwere ike ime ma ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya? Ọ̀ bụ n’ihi gịnị?

8 N’oge ndịozi, Pita dọrọ Ndị Kraịst aka ná ntị gbasara ndị nọ n’ọgbakọ malitere iche echiche ka ndị ụwa. O kwuru, sị: “Ha na-ewere ibi ndụ okomoko n’oge ehihie dị ka ihe ụtọ. Ha bụ ntụpọ na mmerụ, jiri oké obi ụtọ na-emikpu onwe ha n’ozizi nduhie ha mgbe unu na ha na-erikọ oriri. N’ihi na ha na-ekwu oké okwu ndị na-abaghị uru, ha na-ejikwa ọchịchọ anụ ahụ́ na àgwà rụrụ arụ na-arata ndị ka si n’etiti ndị na-eme omume njehie pụta. Ọ bụ ezie na ha na-ekwe ha nkwa nnwere onwe, ha onwe ha bụ ndị ohu nke ire ure. N’ihi na onye ọ bụla nke onye ọzọ meriri bụ ohu onye ahụ.”—2 Pita 2:13, 18, 19.

9 Ọ bụrụ na anyị na-agbalịsi ike imezu “ọchịchọ nke anya,” ya bụ, inweta ihe ọ bụla anyị chọrọ, anyị agaghị enwere onwe anyị. Kama, ọ ga-eme ka anyị bụrụ ndị ohu Setan bụ́ Ekwensu. Ọ bụ ya na-achị ụwa a n’agbanyeghị na a naghị ahụ ya anya. (1 Jọn 5:19) Ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, anyị nwere ike ịbụ ohu akụnụba. Ụdị ihe ahụ mee, ọ ga-esiri anyị ike isi na ya pụta.

ỤDỊ ỌRỤ GA-EME KA NDỤ ANYỊ BAA URU

10, 11. Olee ndị Setan na-achọkarị inweta? Olee nsogbu ịga mahadum nwere ike ịkpatara Ndị Kraịst na-eto eto?

10 Taa, Setan na-eme ihe ahụ o mere n’ogige Iden. Ndị ọ na-anwakarị ọnwụnwa bụ ndị na-amaghị nke a na-akọ. Ndị ọ na-achọkarị inweta bụ ndị na-eto eto. Obi anaghị adị ya ụtọ ma onye na-eto eto ma ọ bụ onye ọzọ kpebie ịbụ ohu Jehova. Setan chọrọ ka ndị raara onwe ha nye Jehova ghara iji obi ha niile na-efe Jehova, gharakwa ịna-erubere ya isi.

11 Ka anyị laghachi n’ihe e kwuru gbasara ohu ahụ kwere ka nna ya ukwu hapuo ya ntị. Ntị ahụ a hapuru ya ga-egbu ya mgbu mgbe ahụ. E mechaa, onye lere ya anya ná ntị ga-aghọta na o kpebiela na ya agaghị ahapụ nna ya ukwu. O nwere ike isiri ndị na-eto eto ezigbo ike ikpebi na ha agaghị na-eme ihe ndị ọzọ na-eme. Dị ka ihe atụ, Setan na-eme ka ndị mmadụ chee na ihe ga-eme ka ndụ ha baa uru bụ iji oge ha niile na-arụ ọrụ n’ụwa a ma ọ bụ ịgụ oké akwụkwọ ka ha nwee ike inweta ezigbo ọrụ. Ma naanị ihe ga-eme ka ndụ anyị baa ezigbo uru bụ ma anyị mee ka ofufe Jehova bụrụ ihe kacha anyị mkpa ná ndụ anyị. Jizọs kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha.” (Mat. 5:3) Ndị Kraịst raara onwe ha nye Chineke ime uche ya, ọ bụghị ime uche Setan. Ha na-agụ  Baịbụl ma na-atụgharị uche na ya “ehihie na abalị.” (Gụọ Abụ Ọma 1:1-3.) Ma, ọtụtụ ihe a na-amụ na mahadum taa ga-eme ka onye na-efe Chineke ghara inwecha ohere ịtụgharị uche n’Okwu Chineke na ijere Jehova ozi.

12. Gịnị ka ọtụtụ ndị na-eto eto nwere ike ikpebi ime?

12 Nna ukwu bụ́ onye ụwa nwere ike ime ka ihe na-esiri ohu ya bụ́ Onye Kraịst ike. N’akwụkwọ ozi mbụ Pọl degaara ndị Kọrịnt, ọ sịrị: “À kpọrọ gị mgbe ị bụ ohu? Echegbula onwe gị n’ihi ya; ma ọ bụrụkwa na ị pụrụ inwere onwe gị, ọ dị mma ka i jiri ohere ahụ mee ihe.” (1 Kọr. 7:21) Ọ ga-akara ohu mma inwere onwe ya. N’ọtụtụ mba, e nwere afọ ole iwu kwuru ụmụaka ga-ejirịrị gaa ụlọ akwụkwọ. Ha gụchaa, ha nweziri ike ikpebi ma hà ga-agụkwu akwụkwọ ma ọ bụ na ha agaghị agụkwu. Ọ bụrụ na Onye Kraịst ekpebie ịgụkwu akwụkwọ ka o nwee ike iji oge ya niile na-arụ ọrụ n’ụwa a, ọ ga-esiri ya ike ịbanye n’ozi oge niile.—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 7:23.

Olee nna ukwu ị ga-abụ ohu ya?

ỊGA MAHADUM NA JEHOVA ỊKỤZIRI MMADỤ IHE, OLEE NKE KA MMA?

13. Olee ụdị agụmakwụkwọ na-akacha abara ndị ohu Jehova uru?

13 Pọl dọrọ Ndị Kraịst nọ na Kọlọsi aka ná ntị, sị: “Nọrọnụ na nche: ma eleghị anya, a pụrụ inwe onye ga-eburu unu dị ka anụ oriri ya site na nkà ihe ọmụma na aghụghọ efu, dị ka ọdịnala mmadụ si dị, dị ka ihe ndị mbụ nke ụwa si dị, ọ bụghị dị ka Kraịst si dị.” (Kọl. 2:8) Ọtụtụ ndị nkụzi na-akụzi “nkà ihe ọmụma na aghụghọ efu, dị ka ọdịnala mmadụ si dị.” A na-akụzikarị ihe ndị a na mahadum. Ma, ọtụtụ mgbe, a naghị akụziri ndị gara ya ihe ga-abara ha uru. O nwere ike ime ka ha ghara ịmụta ihe ga-enyere ha aka ịna-egbo mkpa ha kwa ụbọchị. Ma, Ndị Kraịst na-ekpebi ịgụ akwụkwọ ga-eme ka ha mụta ihe ga-enyere ha aka ịna-ejere Jehova ozi ma ghara ịna-ebi ndụ okomoko. Ha anaghị eji ndụmọdụ a Pọl nyere Timoti egwuri egwu. Ọ gwara ya, sị: “N’ezie, nsọpụrụ Chineke a, ya na inwe afọ ojuju, bụ ụzọ isi rite uru dị ukwuu. Ya mere, ebe anyị nwere ihe oriri na uwe, anyị ga-enwe afọ ojuju n’ihe ndị a.” (1 Tim. 6:6, 8) Kama ezigbo Ndị Kraịst ga-agawa mahadum ka ha nweta akara ugo mmụta ma na-aza oké aha, ha na-agba mbọ ka ha ‘nata akwụkwọ ozi nkọwa.’ Otú ha si anata ya bụ iji ike ha niile na-aga ozi ọma.—Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 3:1-3.

14. Anyị gụọ Ndị Filipaị 3:8, gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’otú Pọl si were ijere Chineke na Kraịst ozi?

14 Anyị nwere ike ịmụta ihe n’aka Pọl. Onye kụziiri ya ihe bụ onye Juu na-akụzi iwu aha ya bụ Gameliel. E nwere ike iji ihe ọ kụziiri ya tụnyere akwụkwọ a na-agụ na  mahadum taa. Ma olee otú Pọl si were akwụkwọ ahụ ọ gụrụ ma o cheta ozi ọ na-ejere Chineke na Kraịst, nke bụ́ ihe ọma Chineke meere ya? O dere, sị: “Ana m agụ ihe niile . . . dị ka ihe na-abaghị uru n’ihi uru na-enweghị atụ nke ihe ọmụma banyere Kraịst Jizọs Onyenwe m bara.” O kwukwara, sị: “N’ihi ya, ekwerewo m ka ihe niile funahụ m, ana m agụkwa ha dị ka nnukwu ihe e kpofuru ekpofu, ka m wee rite uru n’ime Kraịst.” (Fil. 3:8) Otú Pọl si were akwụkwọ ahụ ọ gụrụ nwere ike inyere Ndị Kraịst na-eto eto na ndị mụrụ ha aka ime mkpebi dị mma n’ihe gbasara agụmakwụkwọ. (Lee foto ndị ahụ dị na peeji nke 14 na 15.)

RITE URU N’IHE KACHA MMA JEHOVA NA-AKỤZIRI ANYỊ

15, 16. Olee otú Jehova si akụziri anyị ihe ná nzukọ ya? Gịnị mere o ji akụziri anyị ihe?

15 Olee ihe ndị na-eme n’ọtụtụ mahadum ndị e nwere n’ụwa taa? Ọ̀ bụ na ọtụtụ ụmụ akwụkwọ anaghị eme omume rụrụ arụ, na-aṅụ oké mmanya, a na-akụzikwara ha na mmadụ na ihe ndị ọzọ dị ndụ n’ụwa nọkatara pụta? (Efe. 2:2) Ma, Jehova na-akụziri anyị ihe kacha mma n’ọgbakọ Ndị Kraịst, bụ́ ebe anyị na-anọ obi eruo anyị ala. Onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike irite uru n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke kwa izu. E nwekwara ụlọ akwụkwọ ndị ọzọ Jehova ji na-akụziri anyị ihe. Dị ka ihe atụ, e nwere ụlọ akwụkwọ ụmụnna bụ́ ndị ọsụ ụzọ na-alụbeghị nwaanyị na-aga. A na-akpọ ya Ụlọ Akwụkwọ Ọmụmụ Baịbụl Maka Ụmụnna Na-alụbeghị Nwaanyị. E nwekwara nke ndị di na nwunye bụ́ ndị ọsụ ụzọ a na-akpọ Ụlọ Akwụkwọ Ọmụmụ Baịbụl Maka Ụmụnna Lụrụ Di na Nwunye. Ụlọ akwụkwọ niile a na-enyere anyị aka irubere Jehova, bụ́ Nna anyị ukwu nke eluigwe, isi.

16 Anyị nwere ike iji Watchtower Library nke dị na siidi nakwa ọ́bá akwụkwọ anyị nke dị n’Ịntanet chọta eziokwu Baịbụl ndị magburu onwe ha. Ihe mere anyị ji amụ Baịbụl bụ ka anyị na-efe Jehova. Ọ na-akụziri anyị otú anyị nwere ike isi na-enyere ndị ọzọ aka ịbụ enyi Chineke. (2 Kọr. 5:20) Anyị kụzichaara ha ihe, ha ga-enwe ike ịkụziri ndị ọzọ.—2 Tim. 2:2.

ỤGWỌ A GA-AKWỤ OHU

17. Ọ bụrụ na anyị ekwe ka Jehova na-akụziri anyị ihe, olee uru anyị ga-erite?

17 N’ihe atụ Jizọs mere gbasara ndị ohu e nyere talent, nna ha ukwu jara ndị ohu abụọ mma n’ihi na ha gbara mbọ. Obi tọrọ ha na nna ha ukwu ụtọ. O nyekwuru ha ọrụ iji gosi na obi dị ya ụtọ maka ọrụ ha rụụrụ ya. (Gụọ Matiu 25:21, 23.) Ọ bụrụ na anyị ekwe ka Jehova na-akụziri anyị ihe, anyị ga na-enwe obi ụtọ, ndụ anyị ga-abakwa ezigbo uru. Dị ka ihe atụ, otu nwanna aha ya bụ Michael mere nke ọma n’ụlọ akwụkwọ. Mgbe ndị nkụzi ya kpọrọ ya ka ọ bịa ka ha na ya kwurịta otú o nwere ike isi gaa mahadum, o juru ha anya na ọ chọghị ịga mahadum. Kama ịga mahadum, o ji obere oge gaa mụọ ọrụ aka nke ga-enyere ya aka ịkpata ihe ọ ga-eji na-egbo mkpa ya ma na-asụ ụzọ. Ọ̀ kwara mmakwaara na ya agaghị mahadum? O kwuru, sị: “Ihe Jehova kụziiri m kemgbe m bụ ọsụ ụzọ nakwa ugbu a m bụ okenye n’ọgbakọ abaarala m ezigbo uru.” O kwukwara, sị: “Otú Chineke si gọzie m na ọrụ ndị m na-arụ n’ọgbakọ karịrị ego m gaara enweta. Obi dị m ụtọ na agaghị m mahadum.”

18. Gịnị mere i ji kwere ka Chineke na-akụziri gị ihe?

18 Ihe kacha mma Jehova na-akụziri anyị na-eme ka anyị mata ihe bụ́ uche ya, na-enyekwara anyị aka ịbụ ndị ohu ya. Ọ na-eme ka anyị nwee olileanya na anyị ‘ga-enwere onwe anyị pụọ n’ịbụ ohu nke ire ure’ ma mechaa “nweta nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.” (Rom 8:21) Nke kacha mkpa bụ na ọ bụ ụzọ kacha mma anyị si egosi na anyị hụrụ Jehova, bụ́ Nna anyị ukwu nke eluigwe, n’anya.—Ọpụ. 21:5.