Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Septemba 2013

Na-eme Mkpebi Ziri Ezi

Na-eme Mkpebi Ziri Ezi

“Jiri obi gị dum tụkwasị Jehova obi, adaberekwala ná nghọta gị.”—ILU 3:5.

1, 2. Ime mkpebi ọ̀ na-atọ gị ụtọ? Olee otú i si ele mkpebi ụfọdụ i mere anya?

KWA ụbọchị, anyị na-ekpebi ọtụtụ ihe anyị ga-eme. Olee otú i si ele ime mkpebi anya? Ụfọdụ ndị na-achọ iji aka ha kpebie ihe niile ha chọrọ ime. Ha chere na ha kwesịrị iji aka ha kpebie ihe ha ga-eme. Ha achọghị ka onye ọ bụla kpebiere ha ihe ha ga-eme. Ma, ụjọ na-atụ ụfọdụ ndị ma ha chọwa ime mkpebi ndị dị mkpa. Ọ na-abụ, ụfọdụ chọọ ime mkpebi, ha agaa gụọ akwụkwọ ma ọ bụ gakwuru ndị ọkachamara. Ha nwedịrị ike imefu ezigbo ego ebe ha na-achọ onye ga-enyere ha aka ime mkpebi.

2 Ọtụtụ n’ime anyị ma na n’agbanyeghị na e nwere ụfọdụ ihe anyị na-agaghị ejili aka anyị ekpebi, e nwere ọtụtụ ihe anyị ga-ejili aka anyị kpebie. (Gal. 6:5) Ma, o nwere ike anyị ma na ọ bụghị mkpebi niile anyị mere na-abara anyị uru.

3. Olee ihe ndị nwere ike inyere anyị aka ikpebi ihe anyị ga-eme? Gịnị mere ime mkpebi anaghị adị mfe mgbe niile?

3 Ebe anyị bụ ndị na-efe Jehova, obi kwesịrị ịdị anyị ụtọ na ọ gwara anyị otú anyị ga-esi na-eme ọtụtụ ihe dị mkpa ga-abara anyị uru. Anyị ma na ọ bụrụ na anyị emee ihe ọ gwara anyị, anyị ga-eme mkpebi ga-eme ya obi ụtọ ma baara anyị uru. Ma, ọ bụghị nsogbu niile ka Baịbụl gwara anyị otú anyị nwere ike isi dozie ha. Ọ bụghịkwa ihe niile merenụ ka Baịbụl gwara anyị ihe anyị ga-eme banyere ha. Oleezi otú anyị ga-esi ekpebi ihe anyị ga-eme ma ụdị ihe a mee? Dị ka ihe atụ, anyị ma na anyị ekwesịghị izu ohi. (Efe. 4:28) Ma, gịnị na gịnị bụ izu ohi? Ụfọdụ chere na ọ bụghị ihe ọjọọ ma mmadụ were ihe na-abụghị nke ya ma ọ bụrụ na ihe ahụ abachaghị uru ma ọ bụkwanụ na ọ dị onye ahụ ezigbo mkpa. Olee otú anyị ga-esi kpebie ihe anyị ga-eme n’ihe ụfọdụ ndị chere na Baịbụl ekwughị ihe e kwesịrị ime? Olee ihe ga-enyere anyị aka?

 NA-ECHE ECHICHE NKE ỌMA

4. Olee ihe nwanna nwere ike ịgwa anyị mgbe anyị chọrọ ime mkpebi?

4 Anyị gwa nwanna na anyị chọrọ ime mkpebi dị mkpa, o nwere ike ịgwa anyị na anyị kwesịrị iche echiche nke ọma tupu anyị ekpebie ihe anyị ga-eme. Ihe ahụ ọ gwara anyị mee dị mma. Baịbụl gwara anyị ka anyị ghara ime mkpebi ọkụ ọkụ. O kwuru, sị: “Onye ọ bụla ọ na-adị ngwa ngwa aghaghị ịdaba n’ụkọ.” (Ilu 21:5) Ma, ihe anyị kwesịrị ime ọ̀ bụ naanị iwetu obi chebara ihe anyị chọrọ ime echiche, ghọta ihe anyị kwesịrị ime tupu anyị emee ya? Ime otú ahụ ga-enyere anyị aka ime mkpebi dị mma. Ma, e nwere ihe ọzọ anyị kwesịrị ime.—Rom 12:3; 1 Pita 4:7.

5. Gịnị mere na ọ bụghị mgbe niile ka anyị na-eche echiche nke ọma?

5 O doro anya na ọ bụghị mgbe niile ka anyị na-eche echiche nke ọma. Gịnị kpatara ya? Ihe kpatara ya bụ na mmehie dị anyị niile n’ọbara. O nweghị onye n’ime anyị zuru okè. (Ọma 51:5; Rom 3:23) Ihe ọzọ kpatara ya bụ na o nwere mgbe Setan mere ka ọtụtụ n’ime anyị “kpuo ìsì.” N’oge ahụ, anyị amaghị Jehova na ihe ndị ọ chọrọ ka anyị na-eme. (2 Kọr. 4:4; Taị. 3:3) N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị ewere ihe anyị chere bụ́ ihe ọma kpebie ihe anyị ga-eme, anyị nwere ike iduhie onwe anyị n’agbanyeghị abalị ole anyị chere echiche tupu anyị emee ihe ahụ.—Ilu 14:12.

6. Gịnị ga-enyere anyị aka ịna-eche echiche nke ọma?

6 Ọ bụ eziokwu na anyị ezughị okè, Jehova bụ́ Nna anyị nke eluigwe zuru okè n’ụzọ niile. (Diut. 32:4) Obi dị anyị ụtọ na o mere ka anyị nwee ike ịgbanwe obi anyị ma mụta ịna-eche echiche nke ọma. (Gụọ 2 Timoti 1:7.) Ebe anyị bụ Ndị Kraịst, anyị kwesịrị ịna-eche echiche nke ọma ma na-akpa àgwà ka ndị ma ihe. Anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ka anyị ghara ịna-eche ihe ọjọọ. Kama, anyị kwesịrị ịna-eche echiche ka Jehova, na-akpakwa àgwà ka ya.

7, 8. Kọọ ihe otu nwaanyị mere nke gosiri na mmadụ nwere ike ime mkpebi dị mma n’agbanyeghị nsogbu ndị ọzọ na-enye ya ma ọ bụ na ihe siiri ya ike.

7 Ka anyị tụlee otu ihe atụ. E nwere ọtụtụ ndị bi ná mba ọzọ. Ọ na-abụ, ụfọdụ n’ime ha mụọ nwa, ha akpọlaara ya nne ha na nna ha ka ha zụọrọ ha ya. Ihe mere ha ji eme otú ahụ bụ na ha achọghị ka nwa ahụ gbochie ha ịrụ ọrụ na ịkpata ego. * Otu nwaanyị ya na di ya bi ná mba ọzọ mụrụ agadaga nwa nwoke. N’oge na-adịchaghị anya, ya na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl, ya ana-emekwa ihe ọ na-amụta. Ndị ikwu na ibe malitere inye ya na di ya nsogbu ka ha kpọlaa nwa ahụ ka nna nna ya na nne nna ya zụọ ya. Ma, ihe nwaanyị ahụ mụtara na Baịbụl mere ka ọ ghọta na ọ bụ nne na nna ka Chineke nyere ọrụ ịzụ nwa ha. (Ọma 127:3; Efe. 6:4) Nwaanyị ahụ ọ̀ ga-eso omenala ndị obodo ha n’ihi na onye ọ bụla chere na ọ bụ ihe e kwesịrị ime? Ka ọ̀ ga-eme ihe ọ na-amụta na Baịbụl n’agbanyeghị na o nwere ike ime ka ọ ghara ịna-akpata ego buru ibu, meekwa ka ndị ọzọ na-akparị ya? Ọ bụrụ na ị bụ nwaanyị ahụ, gịnị ka ị ga-eme?

8 Obi kooro nwaanyị ahụ n’elu n’ihi na ndị ọzọ na-enye ya nsogbu. N’ihi ya, ọ gwara Jehova otú obi dị ya ma rịọ ya ka o nyere ya aka ka ọ mata ihe ọ ga-eme. Ọ kọọrọ ya onye na-amụrụ ya Baịbụl na ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ. Ihe ha gwara ya nyeere ya aka ka ọ ghọta ihe Jehova chọrọ ka o mee. Ọ ghọtakwara na ọ bụrụ na ya na di ya akpọnye onye ọzọ nwa ahụ, o nwere ike ime ka obi ghara ịdị ya mma ma o too. Mgbe o chechara ihe Baịbụl kwuru banyere okwu ahụ, o kpebiri na ọ dịghị mma ịkpọnye onye ọzọ nwa  ahụ. Di ya hụrụ otú ndị nọ n’ọgbakọ si na-enyere ha aka, hụkwa otú obi si adị nwa ha ụtọ, ahụ́ ana-adịkwa ya mma. N’ihi ya, o kwere ka Ndịàmà Jehova mụwara ya Baịbụl, ya esorokwa nwunye ya gawa ọmụmụ ihe.

9, 10. Gịnị ka iche echiche ka Jehova pụtara? Olee otú anyị nwere ike isi eme ya?

9 Ụdị ihe ahụ anaghị eme mgbe niile. Ma, akụkọ ahụ gosiri na mgbe anyị chọrọ ikpebi ihe anyị ga-eme, ihe anyị kwesịrị ime abụghị naanị ihe anyịnwa ma ọ bụ ndị ọzọ chere na ọ dị mma ma ọ bụ ihe kacha mfe. E nwere ike iji uche anyị na obi anyị na-ezughị okè tụnyere elekere na-agba oké ọsọ ma ọ bụ elekere na-aga nwayọọ nwayọọ. Ọ bụrụ na anyị ejiri ya na-agụ oge, ọ ga-akpatara anyị ezigbo nsogbu. (Jere. 17:9) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịgbara nsogbu ọsọ, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike na-eche echiche otú Chineke chọrọ.—Gụọ Aịzaya 55:8, 9.

10 Ọ bụ ya mere Baịbụl ji dụọ anyị ọdụ, sị: “Jiri obi gị dum tụkwasị Jehova obi, adaberekwala ná nghọta gị. N’ụzọ gị niile, mara ya, ya onwe ya ga-emekwa ka ụzọ gị kwụrụ ọtọ.” (Ilu 3:5, 6) Cheta na o kwuru na anyị ekwesịghị ‘ịdabere ná nghọta anyị.’ Ihe ọzọ o kwuru bụ na anyị kwesịrị ‘ịmara Jehova.’ Ọ bụ naanị ya ka uche ya zuru okè. N’ihi ya, mgbe ọ bụla anyị chọrọ ikpebi ihe anyị ga-eme, anyị kwesịrị ịgụ Baịbụl ka anyị mata ihe Chineke kwuru gbasara ihe ahụ, ka anyị nwee ike ime ihe ọ chọrọ ka anyị mee. Ọ bụ otú ahụ ka anyị ga-esi na-eche echiche ka Jehova.

NA-AZỤ IKIKE NGHỌTA GỊ

11. Gịnị ka mmadụ kwesịrị ime ka o nwee ike ime mkpebi ziri ezi?

11 Ọ dịghị mfe ịmụta ikpebi ime ihe ziri ezi ma mee ihe anyị kpebiri ime. Ndị ọ na-akacha esiri ike bụ ndị e mere baptizim ọhụrụ ma ọ bụ ndị ka malitere ime nke ọma n’ọgbakọ. Ma, ha nwere ike ịna-emekwu nke ọma n’ọgbakọ. Baịbụl kpọrọ ha ‘ụmụ ọhụrụ’ n’ihi na ha dị ka ụmụaka na-amụ ịga ije. Otú nwata si amụ ịga ije bụ ịzọpụ otu ụkwụ. Ya daa, ya ebilie, zọpụkwa ụkwụ nke ọzọ. Ndị na-amụ ime mkpebi ziri ezi nwere ike ime ụdị ihe  ahụ. Cheta na Pọl onyeozi kwuru na ndị tozuru okè bụ “ndị zụworo ikike nghọta ha azụ, site n’iji ya eme ihe, ịmata ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi.” Ihe mere Pọl ji kwuo “site n’iji ya eme ihe” na ‘ịzụ ikike nghọta anyị azụ’ bụ na anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike mgbe niile ka anyị na-eme mkpebi dị mma. Ọ bụ ihe ndị ọhụrụ kwesịrị ịna-eme.—Gụọ Ndị Hibru 5:13, 14.

Ọ bụrụ na anyị emee ezigbo mkpebi n’ihe ndị anyị na-eme kwa ụbọchị, o nwere ike inyere anyị aka ịzụ ikike nghọta anyị azụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)

12. Olee otú anyị ga-esi mụta ime mkpebi ziri ezi?

12 Dị ka e kwuru ná mmalite, kwa ụbọchị, anyị na-ekpebi ọtụtụ ihe anyị ga-eme. O nwere ike ịbụ obere ihe ma ọ bụ nnukwu ihe. Otu nchọpụta e mere gosiri na e kee mkpebi niile anyị na-eme ụzọ abụọ, ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na anyị anaghị eche echiche nke ọma eme otu ụzọ, kama anyị na-eme ha n’ihi àgwà ụfọdụ maara anyị ahụ́. Dị ka ihe atụ, kwa ụtụtụ, ị ga-ekpebi uwe ị ga-eyi. I nwere ike iche na ọ bụghị nnukwu ihe nakwa na i kwesịghị ichere ya echiche, nke ka nke, ma ọ bụrụ na ọ dị gị ngwa ngwa. Ma, i kwesịrị iche echiche ma uwe i yi ọ̀ bụ ihe onye na-efe Jehova kwesịrị iyi. (2 Kọr. 6:3, 4) Ị gaa ịzụ uwe, i nwere ike iche otú e si kwaa ya, ma ọ̀ bụ uwe na-ewu ewu. Ma, ị̀ na-eche ma Onye Kraịst ò kwesịrị iyi ụdị uwe ahụ nakwa ma ì nwere ego ị ga-eji zụọ ya? Ọ bụrụ na anyị na-eme ezigbo mkpebi n’obere ihe, o nwere ike inyere anyị aka ịzụ ikike nghọta anyị azụ, nke ga-eme ka anyị na-eme mkpebi ziri ezi n’ihe ndị ka mkpa.—Luk 16:10; 1 Kọr. 10:31.

KPEBISIE IKE IME IHE ZIRI EZI

13. Olee ihe ga-enyere anyị aka ime ihe anyị kpebiri ime?

13 Anyị niile ma na anyị kpebigodị ime ihe ziri ezi, ọ naghị adị mfe mgbe niile ime ihe anyị kpebiri. Dị ka ihe atụ, e nwere ụfọdụ chọrọ ịkwụsị ịṅụ sịga, ma ha ekpebisibeghị ike ịkwụsị ya. Anyị kwesịrị ijisi ike na-eme ihe anyị kpebiri ime. Ọ bụrụkwa na mmadụ amụọ ọrụ ma na-arụ ya, ọrụ ahụ ga na-edokwu ya anya. Ma ọ bụrụ na ọ mụchaa ya, ma ọ naghị arụ ya, o nwere ike ichefu ya. Gịnịkwanụ ga-enyere anyị aka ịgbalịsi ike ime ihe anyị kpebiri ime? Ọ bụ ịrịọ Jehova ka o nyere anyị aka.—Gụọ Ndị Filipaị 2:13.

14. Gịnị mere ka Pọl nwee ike ime ihe ndị ọ ma na ya kwesịrị ime?

14 Pọl si n’ihe mere ya mata na ime ihe ziri ezi anaghị adị mfe. O nwere mgbe o kwuru, sị: “Enwere m ike ịchọ ime ihe, ma enweghị m ike ịrụpụta ihe dị mma.” Ọ ma ihe ọ chọrọ ime ma ọ bụ ihe o kwesịrị ime. Ma mgbe ụfọdụ, otu ihe ma ọ bụ ihe ọzọ na-egbochi ya ime ya. O kwuru, sị: “N’ezie, iwu Chineke na-eme m obi ụtọ, dị ka mmadụ m bụ n’ime si dị, ma ana m ahụ n’ahụ́ m iwu ọzọ nke na-alụso iwu nke uche m agha, na-adọrọkwa m n’agha gaa n’iwu nke mmehie nke dị n’ahụ́ m.” Ọ̀ pụtara na mbọ niile ọ gbara kụrụ afọ n’ala? Mbanụ. O kwuru, sị: “Ekele dịrị Chineke site n’aka Jizọs Kraịst Onyenwe anyị!” (Rom 7:18, 22-25) O dekwara, sị: “N’ihe niile, enwere m ike site n’aka onye ahụ nke na-enye m ike.”—Fil. 4:13.

15. Gịnị mere anyị kwesịrị iji kpebisie ike na anyị ga na-eme ihe ziri ezi?

15 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ime uche Chineke, anyị kwesịrị ikpebi na anyị ga-eme ihe ziri ezi, gbalịsiekwa ike ka anyị na-eme ya. Anyị kwesịrị icheta ihe Ịlaịja nọ n’Ugwu Kamel gwa ndị Izrel kwụsịrị ife Chineke na ndị na-efe Bel. Ọ gwara ha, sị: “Ruo ole mgbe ka unu ga na-enwe echiche abụọ dị iche? Ọ bụrụ na ọ bụ Jehova bụ ezi Chineke, sowenụ ya; ma ọ bụrụ na ọ bụ Bel, sowenụ ya.” (1 Eze 18:21) Ụmụ Izrel ma na ha kwesịrị ife naanị Jehova. Ha “na-enwe echiche abụọ dị iche” n’ihi na ha chọrọ ịna-efe ma Jehova ma Bel. Ma, Jọshụa emeghị otú ahụ. Ọtụtụ  afọ tupu mgbe ahụ, ọ gwara ndị Izrel, sị: “Ọ bụrụ na ọ dị njọ n’anya unu ife Jehova, họrọnụ taa onye unu ga-efe . . . Ma mụ onwe m na ezinụlọ m, anyị ga-efe Jehova.” (Jọsh. 24:15) Olee uru Jọshụa na ndị ọzọ fere Jehova ritere? Jehova kwere ka ha banye n’Ala Nkwa ahụ, “bụ́ ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.”— Jọsh. 5:6.

JEHOVA GA-AGỌZI GỊ MA I MEE MKPEBI ZIRI EZI

16, 17. Olee uru anyị ga-erite ma ọ bụrụ na anyị ekpebie ime ihe Jehova chọrọ ka anyị na-eme?

16 Ka anyị tụlee ihe mere n’oge anyị a. E nwere otu nwanna nwoke e mere baptizim ọhụrụ. Ya na nwunye ya nwere ụmụ atọ ka dị obere. A naghị akwụ nwanna ahụ ezigbo ụgwọ n’ọrụ ya. Ma o kpebiri na ya ga na-arụ ọrụ ahụ ka ya na ezinụlọ ya nwee ike ịna-aga ọmụmụ ihe na ozi ọma ná ngwụcha izu. Otu ụbọchị, onye ya na ya na-arụkọ ọrụ gwara ya ka ha gaa rụwara ụlọ ọrụ ọzọ ọrụ n’ihi na ha ga na-akwụ ha ezigbo ụgwọ, na-emekwara ihe ndị ọzọ. Nwanna a chebaara ya echiche ma rịọ Jehova ka o nyere ya aka ka ya mata ihe ya ga-eme. Ọ ghọtara na ya rụwa ọrụ ahụ, o nwere ike iwe ezigbo oge tupu a gwa ya arụkwala ọrụ ná ngwụcha izu. A sị na ị bụ nwanna a, gịnị ka ị ga-eme?

17 Mgbe o chechara otú mkpebi ya nwere ike isi mee ka ya na Jehova ghara ịdị ná mma, ọ jụrụ ịrụ ọrụ ahụ. Ì chere na nwanna ahụ mechara kwaa mmakwaara? Mbanụ. Ọ ghọtara na ngọzi Jehova ga-abara ya na ezinụlọ ya uru karịa nnukwu ego a gaara akwụ ya. Obi tọrọ nwanna ahụ na nwunye ya ụtọ mgbe nwa ha nwaanyị dị afọ iri kwuru na ya hụrụ ma ha ma ụmụnna nọ n’ọgbakọ ma Jehova n’anya. Nwa ahụ kwuru na ya chọrọ inyefe Jehova onwe ya, ka e mee ya baptizim. Ihe nyeere ya aka bụ mkpebi ahụ papa ya mere, ya bụ, ibu ụzọ na-achọ ihe gbasara ofufe Jehova.

Na-eme mkpebi ziri ezi ka obi nwee ike ịna-atọ gị ụtọ mgbe gị na ụmụnna gị nọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 18)

18. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-eme mkpebi ziri ezi kwa ụbọchị?

18 Jizọs Kraịst na-edu ndị ohu Chineke kemgbe ọtụtụ afọ n’ụwa Setan a otú ahụ Mozis si duo ụmụ Izrel n’ala ịkpa. Jehova ga-ebibi ụwa Setan a n’oge na-adịghị anya. Otú ahụ Jọshụa dubara ndị Izrel n’Ala Nkwa, Jizọs ga-edubakwa ndị na-eso ụzọ ya n’ụwa ọhụrụ Jehova kwere anyị ná nkwa, bụ́ ebe ezi omume ga-ebi. (2 Pita 3:13) Ebe ọ bụ na oge Chineke ga-ebibi ụwa a dị ezigbo nso, anyị ekwesịghị ichewe echiche otú anyị sibu eche. Anyị ekwesịghịkwa ịna-akpa àgwà otú anyị sibu akpa, ma ọ bụ na-eme ihe na-adịghị mma anyị na-emebu. Ọ bụ ugbu a ka anyị kwesịrị ịghọtakwu otú Chineke chọrọ ka anyị si na-ebi ndụ. (Rom 12:2; 2 Kọr. 13:5) Gbalịa na-eme mkpebi ziri ezi. I mee otú ahụ, Jehova ga-agọzi gị ruo mgbe ebighị ebi.—Gụọ Ndị Hibru 10:38, 39.

^ para. 7 Ihe ọzọ mere ụfọdụ ji eme ya bụ ka ndị mụrụ ha nwee ike ịna-egosi ndị ikwu na ibe ha ụmụ ụmụ ha.