Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) ỌGỌST 2013

 IHE SI N’EBE ANYỊ NA-EDEBE IHE OCHIE

Obi Tọrọ Eze Ezigbo Ụtọ

Obi Tọrọ Eze Ezigbo Ụtọ

O NWERE ihe mere n’obí eze ndị Swaziland n’ọnwa asatọ n’afọ 1936. Aha eze ahụ bụ Sobhuza nke Abụọ. Nwanna Robert Nisbet na George nwanne ya ji ụgbọala a rụnyere ígwè okwu na-akpọ abụ. Mgbe ha kpọchara, ha akpọnye okwu Nwanna J. F. Rutherford. Obi tọrọ eze ahụ ụtọ mgbe ọ nụrụ ya. George kwuru, sị: “Eze mere ihe juru anyị anya. Ọ chọrọ ịzụ ma rekọd ahụ ma ihe e ji akpọ ya ma ígwè okwu ya.”

Robert weturu obi gwa ya na ha achọghị ire ha n’ihi na ọ bụ onye ọzọ nwe ha. Eze jụrụ ha onye nwe ihe ndị ahụ.

Robert asị ya na “ọ bụ Eze ọzọ.” Eze Sobhuza ajụzie ya onye Eze ahụ bụ. Robert sịrị ya: “Ọ bụ Jizọs Kraịst, Eze nke Alaeze Chineke.”

Mgbe Eze Sobhuza nụrụ ihe a, ya ewetuo obi kwuo, sị: “Ọ bụ nnukwu Eze. Achọghị m iwere ihe ọ bụla o nwe.”

Robert dere, sị: ‘Àgwà eze ahụ kpara tọrọ m ụtọ. Ọ na-asụ ezigbo Bekee, ma ọ dị obi umeala. Ọ naghị aghọ aghụghọ, ọ na-enyekwa ndị mmadụ ihu. Mụ na ya nọrọ ihe dị ka nkeji iri anọ na ise n’obí ya, George anọrọ n’èzí na-akpọ abụ.

Robert kwukwara, sị: ‘N’ụbọchị ahụ, anyị mechara gaa n’otu ụlọ akwụkwọ sekọndịrị dị n’obodo ahụ. Ihe mere n’ebe ahụ kacha tọọ anyị ụtọ. Anyị ziri onyeisi ụlọ akwụkwọ ahụ ozi ọma, ya egeekwa anyị ntị nke ọma. Obi tọrọ ya ezigbo ụtọ mgbe anyị gwara ya gbasara rekọd ahụ nakwa na anyị chọrọ ka mmadụ niile nọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ gere ya. Ọ kpọkọrọ ihe fọrọ obere ka o ruo otu narị ụmụ akwụkwọ ka ha nọrọ ọdụ n’elu ahịhịa gere ya. A gwara anyị na ihe a na-akụziri ụmụ nwoke n’ụlọ akwụkwọ ahụ bụ otú e si akọ ugbo na otú e si azụ ụmụ anụmanụ, otú e si akụ osisi n’ebe a na-anọ atụrụ ndụ na otú e si elekọta ya. A na-akụzikwara ha ịkwa nkà, ịrụ ụlọ, asụsụ Bekee, na mgbakọ na mwepụ. Ihe a na-akụziri ụmụ nwaanyị bụ ọrụ ndị nọọsụ, otú e si arụ ọrụ n’ụlọ, nakwa ihe ndị ọzọ ga-abara ha uru.’ Ọ bụ nne nne Eze Sobhuza mepere ụlọ akwụkwọ ahụ. *

Ụmụ akwụkwọ sekọndịrị, ndị gere okwu ihu ọha na Swaziland n’afọ 1936

Malite n’afọ 1933, Eze Sobhuza na-ege ntị nke ọma mgbe ọ bụla ndị ọsụ ụzọ bịara izi ya ozi ọma n’obí ya. O nwedịrị mgbe ọ kpọkọtara otu narị ndị agha na-eche ya nche ka ha gere ozi ọma ahụ e tinyere na rekọd. Ọ tụrụ ọda ka a na-ewetara ya  magazin anyị. Ọ na-anarakwa akwụkwọ anyị ndị ọzọ. Ọ dịghị anya, ya afọ obere ka eze ahụ nweta akwụkwọ anyị niile. Ihe ọzọ bụ na o kweghị ka ihe ọ bụla mee akwụkwọ ndị ahụ n’agbanyeghị na ọchịchị Briten, nke na-achị Swaziland mgbe ahụ, machibidoro akwụkwọ anyị iwu mgbe a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ.

O nweghị mgbe Eze Sobhuza nke Abụọ kwụsịrị ịnabata Ndịàmà Jehova n’obí ya dị na Lobamba. Ọ na-akpọdị ndị ụkọchukwu ka ha bịa gere okwu ha si na Baịbụl. E nwere otu nwanna bụ́ onye obodo ahụ. Aha ya bụ Helvie Mashazi. Otu ụbọchị, ka ọ na-akọwa Matiu isi nke 23, ụfọdụ ndị ụkọchukwu ji iwe malie ma manyewe ya ka ọ nọrọ ala. Ma, eze ahụ ekweghị ha. Ọ gwara Nwanna Mashazi ka ọ na-ekwu ihe ọ na-ekwu. Ọ gwakwara ndị niile nọ n’ebe ahụ ka ha na-ede amaokwu Baịbụl niile nwanna ahụ kwuru banyere ha n’okwu ya.

O nwere mgbe otu nwanna bụ́ ọsụ ụzọ kwuchara okwu, ndị ụkọchukwu anọ nọ n’ebe ahụ ewepụ ihe ndị ụkọchukwu na-etinye n’olu uwe ha. Ha kwuru, sị: “Anyị abụghịzi ndị ụkọchukwu. Anyị bụzi Ndịàmà Jehova.” Ha jụrụ nwanna ahụ ma ò nwere ụdị akwụkwọ ndị ahụ Eze Sobhuza nwere.

Malite n’ihe dị ka n’afọ 1933 ruo n’afọ 1982 eze ahụ nwụrụ, ọ kwanyeere Ndịàmà Jehova ùgwù. O kweghịkwa ka ndị obodo ya mesie ha ike maka na ha esoghị eme ememme ha. N’ihi ya, obi dị Ndịàmà Jehova nọ na Swaziland n’oge ahụ ụtọ maka ihe ndị ọ na-emere ha. Ọnwụ ya wutekwara ha.

Ná mmalite afọ 2013, e nwere ihe karịrị puku ndị nkwusa atọ na Swaziland. Ndị bi n’obodo ahụ ji obere gafee otu nde mmadụ. N’ihi ya, onye nkwusa ọ bụla ketara izi narị mmadụ atọ na iri asatọ na anọ ozi ọma. N’afọ 2012, e nwere ihe karịrị narị ndị ọsụ ụzọ abụọ na iri isii, nweekwa ọgbakọ iri itoolu. Puku mmadụ asaa, narị anọ na iri itoolu na isii gakwara Ncheta Ọnwụ Jizọs. O doro anya na ọtụtụ ndị ka ga-abata n’ọgbakọ. N’eziokwu, ụmụnna ndị gara kwusaa ozi ọma na Swaziland n’ihe dị ka n’afọ 1933 rụrụ ezigbo ọrụ.—Ihe si n’ebe anyị na-edebe ihe ochie na Saụt Afrịka.

^ para. 8 A kọrọ ihe a n’akwụkwọ bụ́ The Golden Age, June 30, 1937, peeji nke 629.