Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Ọgọst 2013

Ka Anyị Na-echebara Ibe Anyị Echiche, Na-agbarịtakwa Ibe Anyị Ume

Ka Anyị Na-echebara Ibe Anyị Echiche, Na-agbarịtakwa Ibe Anyị Ume

‘Ka anyị na-echebara ibe anyị echiche iji kpalie ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ.’—HIB. 10:24.

1, 2. Mgbe ọ fọrọ obere ka Agha Ụwa nke Abụọ bie, gịnị nyeere narị Ndịàmà Jehova abụọ na iri atọ aka iji ụkwụ gaa ọtụtụ kilomita ma ghara ịnwụ?

MGBE ọ fọrọ obere ka Agha Ụwa nke Abụọ bie, ndị ọchịchị Nazi nyere iwu ka e gbuo ọtụtụ puku mmadụ fọrọ n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche. E meriwela ndị agha Hitler mgbe ahụ. Ha chọrọ ịkpọga ndị mkpọrọ nọ n’ogige ịta ahụhụ Saksenhaụsen n’ọdụ ụgbọ mmiri. Ha ruo n’ebe ahụ, e tinye ha n’ụgbọ mmiri ma mee ka o kpuo n’oké osimiri. E mechara na-akpọ ihe a merenụ ije ọnwụ.

2 Ndị mkpọrọ ahụ dị puku mmadụ iri atọ na atọ. A chọrọ ka ha jiri ụkwụ gaa narị kilomita abụọ na iri ise ruo n’ọdụ ụgbọ mmiri dị na Lubek, nke dị na Jamanị. Narị Ndịàmà Jehova abụọ na iri atọ so ná ndị mkpọrọ ahụ. Ha sikwa ná mba isii. Ndị agha ahụ nyere Ndịàmà Jehova iwu ka ha na-agakọ ọnụ. Ike gwụrụ ndị mkpọrọ ahụ niile n’ihi agụụ na ọrịa. Ma, o nweghị nwanna anyị nwụrụ n’ụzọ. Gịnị nyeere ha aka? Otu n’ime ha kwuru, sị: “Anyị na-agba ibe anyị ume ka onye ọ bụla jisie ike na-aga.” Ihe ọzọ nyeere ha aka bụ na ha hụrụ ibe ha n’anya. Chineke nyekwara ha “ike karịrị ike nkịtị.”—2 Kọr. 4:7.

3. Olee ihe mere o ji dị mkpa ka anyị na-agba ibe anyị ume?

3 Ọ bụ eziokwu na anyị anaghị aga ụdị ije ahụ taa, ọtụtụ nsogbu na-abịara anyị. Mgbe Alaeze Chineke malitere ịchị n’afọ 1914, a chụpụrụ Setan n’eluigwe, chụdata ya n’ụwa. Ezigbo iwe ji ya n’ihi na ọ ma na “o nwere oge dị mkpirikpi.” (Mkpu. 12:7-9, 12) Ka agha Amagedọn na-eru nso, Setan na-agbalị iji ọnwụnwa dị iche iche eme ka anyị na Chineke ghara ịdị ná mma. Ihe ọzọ na-akpa anyị aka ọjọọ bụ nchegbu. (Job 14:1; Ekli. 2:23) Nsogbu ndị a nwere ike ime ka ike na-agwụ anyị, obi ana-ajọkwa anyị njọ n’agbanyeghị na anyị  na-agbalị ka anyị jiri obi ụtọ na-ejere Jehova ozi. Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwanna nwoke nyeerela ọtụtụ ndị aka ka ha nọsie ike n’ofufe Jehova. Ma, mgbe o mewere agadi, ya na nwunye ya rịawara ọrịa, ya emezie ka obi na-ajọ ya njọ. Ihe ga-enyere nwanna a aka bụ “ike karịrị ike nkịtị” nke naanị Jehova na-enye. E kwesịkwara ịna-agba ya ume. Ihe ndị a ga-enyekwara anyị aka ịna-edi nsogbu anyị.

4. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-agba ndị ọzọ ume, olee ihe dị mkpa Pọl onyeozi kwuru anyị kwesịrị ime?

4 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-agba ndị ọzọ ume, anyị kwesịrị ime ihe Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru. Ọ sịrị: “Ka anyị na-echebakwara ibe anyị echiche iji kpalie ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ, ka anyị ghara ịhapụ nzukọ anyị, dị ka ụfọdụ ndị na-emekarị, kama ka anyị na-agbarịta ibe anyị ume, na-emekwa otú ahụ karị, ka unu na-ahụ ụbọchị ahụ ka ọ na-eru nso.” (Hib. 10:24, 25) Olee otú anyị ga-esi eme ihe a dị mkpa Pọl gwara ha?

‘KA ANYỊ NA-ECHEBARA IBE ANYỊ ECHICHE’

5. Olee ihe ga-enyere anyị aka ‘ịna-echebara ibe anyị echiche’? Olee otú anyị ga-esi eme ya?

5 Ihe ga-enyere anyị aka ‘ichebara ndị ọzọ echiche’ bụ ịma mkpa ha. Ànyị ga-ama mkpa ụmụnna anyị ma ọ bụrụ na ụka anyị na ha na-akparịta bụ ikele ha elu elu n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụkwanụ na-akọ ihe ndị na-adịghị mkpa? Mba. Ma, anyị kwesịrị ịkpachara anya ‘na-elekwasị anya n’ihe anyị na-eme,’ kama ‘ịna-etinye ọnụ n’ihe na-agbasaghị anyị.’ (1 Tesa. 4:11; 1 Tim. 5:13) Ka anyị nwee ike ịgba ụmụnna anyị ume, anyị kwesịrị ịmaru ha ala. Anyị kwesịrị ịma otú ihe si dịrị ha, àgwà ha, otú ha si eme n’ọgbakọ, ebe ha na-eme nke ọma, na ebe ha na-anaghị eme nke ọma. Anyị kwesịrị ime ka ha ghọta na anyị bụ enyi ha nakwa na anyị hụrụ ha n’anya. Anyị kwesịrị ịna-ewepụta oge ka anyị na ha na-anọ, ma mgbe ha nwere nsogbu, obi ajọwa ha njọ, ma n’oge ndị ọzọ.—Rom 12:13.

6. Gịnị ga-enyere okenye aka ‘ịna-echebara’ ndị ọ na-elekọta echiche?

6 Baịbụl gwara ndị okenye ka ha jiri obi ha niile na ịnụ ọkụ n’obi ‘na-azụ ìgwè atụrụ Chineke nke ha na-elekọta.’ (1 Pita 5:1-3) Ihe ga-enyere ndị okenye aka ịrụ ọrụ a nke ọma bụ ịma ụmụnna ha nke ọma. (Gụọ Ilu 27:23.) Ọ bụrụ na ndị okenye na-ewepụtara ụmụnna ha oge, na-emekwa ka ha ghọta na obi na-adị ha ụtọ ma ha na ha nọrọ, ọ ga-eme ka ụmụnna na-abịakwute ha ka ha nyere ha aka. Ọ ga-adịkwara ụmụnna mfe ịkọrọ ndị okenye otú obi dị ha na ihe na-echu ha ụra. Ndị okenye ga-enwezi ike ịma otú ha ga-esi nyere onye nke ọ bụla aka.

7. Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’obi gbasara “okwu nzuzu” ndị dara mbà n’obi na-ekwu?

7 Pọl gwara ọgbakọ dị na Tesalonaịka, sị: “Na-akwadonụ ndị na-adịghị ike.” (Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 5:14.) E nwere ike ikwu na ndị “dara mbà” adịghị ike. Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ na-adị ndị obi na-ajọ njọ. Ilu 24:10 kwuru, sị: “Ì nwewo obi ịda mbà n’ụbọchị ahụhụ? Ike gị ga-adị ntakịrị.” Ndị obi na-adịghị mma nwere ike ikwu “okwu nzuzu.” (Job 6:2, 3) N’ihi ya, anyị chọọ inyere ha aka, anyị kwesịrị icheta na ha nwere ike ikwu ihe na-esighị ha n’obi. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Rachelle chọpụtara na ihe a bụ eziokwu mgbe mama ya dara mbà n’obi. O kwuru, sị: “Ọtụtụ mgbe, mama m na-ekwu okwu ọjọọ. Ma, m na-agwakarị onwe m na ọ bụghị otú a ka mama m dị n’eziokwu. Ọ hụrụ ndị ọzọ n’anya, nwee obiọma, na-emesapụkwa aka. Ihe a mere ka m ghọta na ọ bụghị ihe niile ndị dara mbà n’obi na-ekwu si ha n’obi. Anyị ekwesịghị ịgwagwara ha okwu ọjọọ ha gwara anyị ma ọ bụ megwara ha ihe ha mere anyị.” Ilu 19:11 kwuru, sị: “Nghọta mmadụ nwere na-eme ka ọ ghara iwe iwe ọsọ ọsọ, ileghara mmejọ anya bụkwaara ya ịma mma.”

8. Ole ndị ka anyị kwesịrị ịkacha “gosi” na anyị hụrụ ha n’anya? Ọ̀ bụ maka gịnị?

 8 Olee otú anyị ga-esi ‘echebara’ mmadụ echiche ma ọ bụrụ na ọ dara mbà n’obi n’ihi ihe ndị o mejọrọ n’oge gara aga? Ihere ka nwere ike ịna-eme ya n’agbanyeghị na o meziela ihe o mejọrọ. Pọl degaara ụmụnna nọ na Kọrịnt akwụkwọ banyere onye mere mmehie ma mechaa chegharịa. Ọ gwara ha, sị: “Jirinụ obiọma gbaghara ya ma kasie ya obi, ka onye dị otú ahụ wee ghara ịda mbà n’ụzọ ọ bụla n’ihi inwebiga mwute ókè. Ya mere, ana m agba unu ume ka unu gosi ya na unu hụrụ ya n’anya.” (2 Kọr. 2:7, 8) Otu akwụkwọ kwuru na n’amaokwu a, ‘igosi’ pụtara ‘ime ka a mata ihe’ ma ọ bụ ‘ime ka ihe doo anya.’ Ụmụnna anyị agaghị ama na anyị hụrụ ha n’anya nakwa na ihe banyere ha na-emetụ anyị n’obi ma ọ bụrụ na anyị agwaghị ha ma ọ bụ gosi ya n’àgwà anyị.

‘KA ANYỊ NA-ECHEBARA IBE ANYỊ ECHICHE IJI KPALIE ỊHỤNANYA NA ỊRỤ EZI ỌRỤ’

9. Gịnị ka ‘ichebara ibe anyị echiche iji kpalie ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ’ pụtara?

9 Pọl dere, sị: “Ka anyị na-echebakwara ibe anyị echiche iji kpalie ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ.” Ihe ọ pụtara bụ na anyị kwesịrị ime ka ụmụnna anyị mụta ịna-ahụ ndị ọzọ n’anya ma na-emere ha ihe ọma. Ọkụ chọọ ịnyụ, anyị nwere ike itinyekwu ya nkụ ma fụnwuo ya. (2 Tim. 1:6) Ọ bụkwa otú ahụ ka anyị nwere ike isi nyere ụmụnna anyị aka ka ha hụkwuo ma Chineke ma mmadụ ibe ha n’anya. Otu ụzọ anyị nwere ike isi mee ya bụ ịna-aja ụmụnna anyị mma ma ha mee ihe dị mma.

10, 11. (a) Ole ndị ka e kwesịrị ịna-aja mma? (b) Nye ihe atụ otú ịja ‘onye zọhiere ụkwụ’ mma ga-esi enyere ya aka.

10 E kwesịrị ịna-agba anyị niile ume ma ànyị dara mbà n’obi ma ọ̀ bụ na anyị adaghị. Otu okenye dere, sị: “Mgbe m dị obere, e nweghị mgbe m mere ihe, papa m agwa m na m metara ya. N’ihi ya, mgbe m toro, ọ na-adị m ka o nweghị ihe m ma eme. . . . N’agbanyeghị na adị m iri afọ ise ugbu a, obi na-adị m ụtọ ma ụmụnna gwa m na m na-arụ ọrụ okenye m nke ọma. . . . Ihe mere m emeela ka m ghọta na m kwesịrị ịna-agba ndị ọzọ ume. M na-agbakwa mbọ na-eme otú ahụ.” O nweghị onye ịja mma na-adịghị atọ ụtọ, ma ndị  ọsụ ụzọ ma ndị agadi ma ndị dara mbà n’obi.—Rom 12:10.

11 Mgbe ‘ndị ruru eru n’ụzọ ime mmụọ na-agbazi onye zọhiere ụkwụ,’ onye ahụ nwere ike ịgbanwe mewe ihe ziri ezi ma ọ bụrụ na ha ajaa ya mma ma jiri obiọma dụọ ya ọdụ. (Gal. 6:1) Ọ bụ ya nyeere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Miriam aka. O dere, sị: “Obi gbawara m mgbe ụfọdụ ndị enyi m pụrụ n’ọgbakọ. N’oge ahụ, ndị dọkịta chọpụtakwara na ọbara na-agba papa m n’ụbụrụ. Ihe a niile mere ka obi na-ajọ m njọ. M metara otu nwa okorobịa bụ́ onye ụwa enyi n’ihi na m nọ na-achọ otú m ga-esi mee ka obi na-adị m mma.” Ihe a mere ka nwanna nwaanyị a chewe na Jehova ekwesịghị ịhụ ya n’anya. O chewekwara echiche ịhapụ ọgbakọ. Ma, otu okenye chetaara ya otú o si emebu nke ọma n’ọgbakọ, gwakwa ya na Jehova ka hụrụ ya n’anya. Ihe ndị okenye gwara ya mere ka ọ hụkwuo Jehova n’anya. Ọ hapụrụ enyi ya nwoke ma fesiwe Jehova ike.

12. Gịnị nwere ike ime ma ọ bụrụ na anyị na-eji nwanna atụnyere ụmụnna ndị ọzọ, na-abara ya mba ma ọ bụ mee ka obi na-ama ya ikpe?

12 Anyị kwesịrị ịkpachara anya n’otú anyị chọrọ isi ‘kpalie’ ụmụnna anyị ka ha jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ejere Jehova ozi. Anyị ekwesịghị iji ha na-atụnyere ndị ọzọ ma ọ bụ na-abara ha mba maka na ha emeghị ihe anyị chere. Anyị ekwesịghịkwa ime ka obi na-ama ha ikpe maka na ha ewepụtakwughị oge jeere Chineke ozi. Anyị mee otú ahụ, o nwere ike ime ka ha nụwa ọkụ n’obi naanị nwa oge, e mechaa, ha anyụọ ka ọkụ. Ụzọ kacha mma anyị ga-esi mee ka nwanna nụwa ọkụ n’obi bụ ịja ya mma ma mee ka ọ ghọta na ihe mere o ji kwesị iji obi ya niile na-ejere Chineke ozi bụ na ọ hụrụ Chineke n’anya.—Gụọ Ndị Filipaị 2:1-4.

‘KA ANYỊ NA-AGBARỊTA IBE ANYỊ UME’

13. Gịnị ka ịgba ndị mmadụ ume pụtara? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

13 Anyị kwesịrị ‘ịna-agbarịta ibe anyị ume, na-emekwa otú ahụ karị, ka anyị na-ahụ ụbọchị ahụ ka ọ na-eru nso.’ Ịgba ụmụnna anyị ume pụtara ịna-enyere ha aka ka ha na-ejesi ozi Chineke ike. Ịkpali ndị ọzọ inwe ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ yiri ịfụnwu ọkụ chọrọ ịnyụ anyụ. Ịgba ndị ọzọ ume yikwara itinye nkụ n’ọkụ ka ọ ghara ịnyụ ma ọ bụ ka o nwusie ike. Otú anyị ga-esi na-agba ndị ọzọ ume bụ ime ka obi sie ndị dara mbà ike, na-akasikwa ha obi. Mgbe anyị na-agba onye dara mbà ume, anyị kwesịrị iwetu obi na-agwa ya okwu. (Ilu 12:18) Anyị kwesịkwara ‘ịna-anụ ihe ngwa ngwa,’ gharakwa ‘ịna-ekwu okwu ngwa ngwa.’ (Jems 1:19) Ọ bụrụ na anyị egee nwanna ntị nke ọma, ma gbalịa ịghọta otú obi dị ya, anyị nwere ike ịchọpụta ihe mere obi ji ajọ ya njọ ma gwa ya ihe ga-enyere ya aka.

14. Olee otú otu okenye si nyere otu nwanna nwoke dara mbà n’obi aka?

14 Ka anyị tụlee otú otu okenye si nyere otu nwanna nwoke na-agabeghị ozi ọma kemgbe ọtụtụ afọ aka. Okenye ahụ  weturu obi gee nwanna ahụ ntị ma chọpụta na ọ ka hụrụ Jehova n’anya n’eziokwu. Ọ na-amụ Ụlọ Nche ọ bụla e bipụtara, na-agbalịkwa ịgachi ọmụmụ ihe anya. Ma, otú ụmụnna ụfọdụ si kpaa àgwà wutere ya, obi ana-ajọkwa ya njọ. Okenye ahụ weturu obi gee ya ntị, ọ gaghị kpewe ya ikpe. O mere ka nwanna ahụ ghọta na ya hụrụ ya na ezinụlọ ya n’anya. Ka oge na-aga, nwanna ahụ ghọtara na ya kwere ka ihe ọjọọ e mere ya n’oge gara aga mee ka ya ghara ịna-efe Chineke ọ hụrụ n’anya. Okenye ahụ gwara ya ka ha abụọ soro gaa ozi ọma. Okenye ahụ nyeere ya aka, ya amaliteghachi ịga ozi ọma, mechaakwa bụrụ okenye ọgbakọ ọzọ.

15. Gịnị ka anyị kwesịrị ịmụta n’otú Jehova si agba ndị dara mbà n’obi ume?

15 Anyị gaa inyere onye dara mbà n’obi aka, anyị ekwesịghị iche na obi ga-adị ya mma ozugbo ma ọ bụkwanụ na ọ ga-ekwe ozugbo ka anyị nyere ya aka. O nwere ike ịdị mkpa ka anyị na-enyere ya aka ugboro ugboro. Pọl kwuru, sị: “Na-akwadonụ ndị na-adịghị ike, na-enwenụ ogologo ntachi obi n’ebe mmadụ niile nọ.” (1 Tesa. 5:14) Ike ekwesịghị ịgwụ anyị ngwa ngwa mgbe anyị na-enyere ndị na-adịghị ike aka. Anyị kwesịrị ịna-akwado ha. N’oge ochie, ụfọdụ ndị ohu Jehova dara mbà n’obi, ma Jehova nweere ha ndidi. Dị ka ihe atụ, Chineke meere Ịlaịja amara, ọ ghọtakwara otú obi dị ya. Jehova nyekwara Ịlaịja ihe nyeere ya aka ịna-ejere ya ozi. (1 Eze 19:1-18) Onye ọzọ Jehova meere amara bụ Devid. Jehova gbaghaara ya mmehie ya n’ihi na o ji obi ya niile chegharịa. (Ọma 51:7, 17) Chineke nyekwaara onye dere Abụ Ọma nke iri asaa na atọ aka mgbe ọ fọrọ obere ka ọ kwụsị ife ya. (Ọma 73:13, 16, 17) Jehova na-emere anyị ebere, na-emekwara anyị amara mgbe anyị dara mbà n’obi. (Ọpụ. 34:6) Ebere Jehova “na-adị ọhụrụ kwa ụtụtụ,” ọ ‘gaghịkwa agwụ agwụ.’ (Ákwá 3:22, 23) Jehova chọrọ ka anyị na-eme ka ya. Ọ chọrọ ka anyị na-emere ndị dara mbà n’obi ebere.

KA ANYỊ NA-AGBA IBE ANYỊ UME KA ANYỊ GHARA ỊHAPỤ ỤZỌ AHỤ NA-EDUBA NÁ NDỤ

16, 17. Olee ihe anyị kwesịrị ime ugbu a ọ fọrọ obere ka e bibie ụwa Setan? Olee ihe mere o ji dị mkpa ka anyị mee otú ahụ?

16 Ọtụtụ n’ime puku mmadụ iri atọ na atọ ahụ si n’ogige ịta ahụhụ Saksenhaụsen pụọ nwụrụ. Ma, o nweghị onye nwụrụ n’ime narị Ndịàmà Jehova abụọ na iri atọ so gaa ije ahụ. Ihe nyeere ha aka n’oge ahụ bụ na ha na-agba ibe ha ume, na-enyekwara ibe ha aka.

17 Taa, anyị na-eje ije n’ụzọ “nke na-eduba ná ndụ.” (Mat. 7:14) N’oge na-adịghị anya, ndị niile na-efe Jehova ga-abanye n’ụwa ọhụrụ, bụ́ ebe ezi omume ga-ebi. (2 Pita 3:13) Ebe ọ fọrọ obere ka e bibie ụwa Setan, ka anyị na-enyere ibe anyị aka ịna-eje ije n’ụzọ ahụ na-eduba ná ndụ ebighị ebi.

Soro ndị ọzọ na-aga ozi ọma

Na-ege ntị nke ọma mgbe mmadụ na-akọrọ gị mkpa ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14 na 15)