Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) ỌGỌST 2013

Ndị Nne na Nna, Malitenụ Mgbe Nwa Unu Bụ Nwa Ọhụrụ Kụziwere Ya Okwu Chineke

Ndị Nne na Nna, Malitenụ Mgbe Nwa Unu Bụ Nwa Ọhụrụ Kụziwere Ya Okwu Chineke

BAỊBỤL kwuru, sị: “Lee! Ụmụ bụ ihe nketa si n’aka Jehova; mkpụrụ nke afọ bụ ụgwọ ọrụ.” (Ọma 127:3) Obi na-adị nwoke na nwaanyị ụtọ ma ha mụọ nwa.

Ọ bụ eziokwu na ha na-enwe obi ụtọ ma ha mụta nwa, ha makwa na ha nwere ọrụ dị mkpa ha ga-arụ. Ọ bụrụ na ha chọrọ ka nwa ahụ too nke ọma, ha kwesịrị ịna-enye ya nri ga-enye ya ihe n’ahụ́. Ọ bụrụkwa na ha chọrọ ka nwa ahụ nọsie ike n’ọgbakọ, ha kwesịrị ịna-akụziri ya Okwu Chineke. (Ilu 1:8) Olee mgbe ha kwesịrị ịmalite kụziwere ya ihe? Oleekwa ihe ndị ha kwesịrị ịna-akụziri ya?

 NDỊ NNE NA NNA KWESỊRỊ ỊRỊỌ JEHOVA KA O NYERE HA AKA

Baịbụl kọọrọ anyị gbasara otu nwoke bụ́ onye Izrel aha ya bụ Manoa. O si n’ebo Dan, birikwa n’obodo Zora. Ya na nwunye ya enweghị nwa. Ma otu ụbọchị, mmụọ ozi Jehova gwara nwunye ya na ọ ga-amụ nwa nwoke. (Ikpe 13:2, 3) N’agbanyeghị na obi dị Manoa na nwunye ya ụtọ mgbe ha nụrụ ihe a, mkpa ha bụ otú ha ga-esi azụ nwa ahụ. N’ihi ya, Manoa kpere ekpere, sị: “Biko, Jehova. Onye nke ezi Chineke ahụ i zitere, biko, ya bịakwute anyị ọzọ ma gwa anyị ihe anyị ga-eme nwa ahụ a ga-amụ.” (Ikpe 13:8) Ihe ka Manoa na nwunye ya mkpa bụ otú ha ga-esi zụọ Samsịn nwa ha nwoke. O doro anya na ha kụziiri ya iwu Chineke, ya emeekwa ihe ha kụziiri ya. Baịbụl kwuru, sị: “Ka oge na-aga, mmụọ Jehova malitere ịkpa ike n’ahụ́ [Samsịn].” Mmụọ Jehova mere ka ọ rụọ ọtụtụ ọrụ dị ike mgbe ọ bụ onyeikpe n’Izrel.—Ikpe 13:25; 14:5, 6; 15:14, 15.

Manoa rịọrọ Jehova ka ọ gwa ya na nwunye ya otú ha ga-esi azụ nwa ha ga-amụ

Olee mgbe ga-akacha mma ka ndị nne na nna malite ịkụziri nwa ha ihe? A malitere n’oge Timoti bụ “nwa ọhụrụ” kụziwere ya ‘ihe odide ndị dị nsọ.’ Ọ bụ nne ya bụ́ Yunis na nne nne ya bụ́ Lọịs kụziiri ya ihe. (2 Tim. 1:5; 3:15) Ha malitere ịkụziri Timoti ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ mgbe ọ bụ nwa ọhụrụ.

Ndị nne na nna kwesịrị ịrịọ Jehova ka o nyere ha aka ka ha malite mgbe nwa ha bụ “nwa ọhụrụ” kụziwere ya ihe. Ha kwesịkwara ikpebi otú ha ga-esi akụziri nwa ha ihe tupu ha amụọ ya. Ilu 21:5 kwuru, sị: “Atụmatụ onye dị uchu aghaghị iweta uru.” O doro anya na nne na nna na-akwado nke ọma tupu ha amụọ nwa. Ha nwedịrị ike ide ihe niile ha ga-azụtara nwa ha n’akwụkwọ. Ma, ha kwesịkwara ikpebi otú ha ga-esi na-akụziri nwa ahụ Okwu Chineke. Ha kwesịrị ịmalite mgbe ọ bụ nwa ọhụrụ kụziwere ya ihe.

E nwere otu akwụkwọ kọwara otú ụmụaka si eto ghọọ dimkpa. O kwuru na ọnwa ole na ole a mụchara nwatakịrị, ụbụrụ ya na-amalite ịrụ ọrụ nke ọma ma jiri nwayọọ nwayọọ na-aka. N’ihi ya, ọ bụ mgbe ahụ ka ndị nne na nna kwesịrị ịmalite na-akụziri nwa ha ihe gbasara Jehova na iwu ya.

Otu nwanna nwaanyị na-asụ ụzọ oge niile kwuru, sị: “Ọ bụ mgbe nwa m nwaanyị dị otu ọnwa ka m malitere ịkpọ ya aga ozi ọma. N’agbanyeghị na o nweghị ihe ọ ma n’oge ahụ, aghọtala m na otú ahụ m si malite n’oge na-akpọ ya aga ozi ọma baara ya uru. Tupu ya agbaa afọ abụọ, ụjọ anaghị atụ ya inye ndị mmadụ traktị ma anyị gaa ozi ọma.”

Ịmalite mgbe nwatakịrị dị obere kụziwere ya ihe na-aba uru. Ma, ndị nne na nna ma na ịkụziri nwa ha Okwu Chineke mgbe ahụ ọ dị obere anaghị adị mfe.

‘NA-AZỤTARANỤ ONWE UNU OGE KWESỊRỊ EKWESỊ’

O nwere ike isiri ndị nne na nna ike ịna-akụziri ụmụ ha ihe n’ihi na obere ihe na-eme ka uche ha pụọ n’ihe a na-amụ. Ha na-achọkarị ịma gbasara ihe ọ bụla ha hụrụ. Gịnị ka nne na nna ga-eme ka nwa ha nwee ike ịna-ege ntị n’ihe ha na-akụziri ya?

Ka anyị tụlee ihe Mozis kwuru. Diuterọnọmi 6:6, 7 kwuru, sị: “Okwu ndị a m na-enye gị n’iwu taa ga-adị n’obi gị; kụnye ha n’ime ụmụ gị, kwuokwa okwu banyere ha mgbe ị nọ ọdụ n’ụlọ gị na mgbe ị na-eje ije n’okporo ụzọ na mgbe i dina ala nakwa mgbe i biliri ọtọ.” Gịnị ka ‘ịkụnye’ Okwu Chineke n’ime nwatakịrị pụtara? Ọ pụtara na e nwee ihe ndị nne na nna chọrọ ịkụziri nwa ha, ha kwesịrị ịkụzi ya ugboro ugboro. Ụmụaka yiri osisi puru ọhụrụ e kwesịrị ịna-agba mmiri mgbe niile. Ọ na-adịrị ndị torola eto mfe ịmụtakwu ihe ma ọ bụrụ na a na-echetara ha ihe ugboro ugboro. Otú ahụkwa ka ụmụaka ga-esi mụta ihe ma ọ bụrụ na a na-akụziri ha ihe ugboro ugboro.

Ndị nne na nna na ụmụ ha kwesịrị ịna-anọ ka ha nwee ike ịkụziri ha Okwu Chineke. Ma, ọ naghị adị mfe n’ihi na ọtụtụ ndị nne na nna anaghị enwe efe. Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst ka ha ‘na-azụtara onwe ha oge kwesịrị ekwesị’ ha ga-eji na-eme ihe ndị dị mkpa. (Efe. 5:15, 16) Olee otú ndị nne na nna ga-esi eme ihe a o kwuru? O nwere otu nwanna nwoke bụ́ okenye n’ọgbakọ, nwunye ya abụrụkwa ọsụ ụzọ oge niile. Ha anaghị enwe efe. Ma, ha ghọtara na ha kwesịrị iwepụta oge ha ga-eji na-arụ ọrụ ọgbakọ, oge ha ga-eji na-akpata ihe ha ga-eri, na oge ha ga-eji na-akụziri nwa ha  nwaanyị ihe. Olee otú ha si ewepụta oge akụziri ya ihe? Nwanna nwoke ahụ kwuru, sị: “Tupu mụ agawa ọrụ n’ụtụtụ ọ bụla, mụ na nwunye m na-agụrụ ya Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible ma ọ bụ akwụkwọ Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị. Anyị lọta ná mgbede, anyị na-agba mbọ gụọrọ ya akwụkwọ tupu ya alakpuo. Anyị na-akpọkwa ya aga ozi ọma. Anyị chọrọ iji oge a ọ ka dị obere kụziere ya Okwu Chineke.”

‘ỤMỤ DỊ KA AKỤ́’

Anyị chọrọ ka ụmụ anyị bụrụ ndị ezigbo mmadụ ma ha too. Ma, ihe kacha mkpa mere anyị ji akụziri ha ihe bụ ka ha na-ahụ Chineke n’anya.—Mak 12:28-30.

Abụ Ọma 127:4 kwuru, sị: “Dị ka akụ́ nke dị n’aka dike, otú ahụ ka ụmụ a mụrụ n’okorobịa dị.” Baịbụl ji ụmụ anyị tụnyere akụ́. A chọọ ka akụ́ gaa ebe a tụrụ ya, e kwesịrị ijizi ejizi. Onye na-agba akụ́ gbapụhaala akụ́ ya, ọ gbapụchaala ya. Ụmụaka ga-emecha hapụ ndị muṛụ ha gaa biri nke onwe ha. N’ihi ya, ndị nne na nna kwesịrị iji oge ha na ha ka nọ kụziere ha ka ha hụ Chineke n’anya ma na-erube isi n’iwu ya.

Jọn onyeozi kwuru gbasara ndị o nyeere aka ha aghọọ Ndị Kraịst, sị: “Ọ dịghị ihe ọzọ ga-eme ka m nwee obi ekele karịa ihe a, ya bụ, na m ga na-anụ na ụmụ m na-eje ije n’eziokwu ahụ.” (3 Jọn 4) Obi ga-adịkwa ndị nne na nna ụtọ ma ụmụ ha “na-eje ije n’eziokwu ahụ.”