Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Ọgọst 2013

Ị̀ Na-ahụ Ụgbọ Ịnyịnya Na-acha Ọkụ Ọkụ Ịlaịsha Hụrụ?

Ị̀ Na-ahụ Ụgbọ Ịnyịnya Na-acha Ọkụ Ọkụ Ịlaịsha Hụrụ?

Eze ndị Sirịa nọ na-achọ onye amụma Chineke aha ya bụ Ịlaịsha ka o jide ya. Ọ nụrụ na Ịlaịsha nọ n’obodo Dotan, nke dị n’elu ugwu, nweekwa mgbidi gburugburu ya. N’abalị, o zigara ịnyịnya, ụgbọ agha, na ìgwè ndị agha n’obodo ahụ. Tupu chi abọọ, ndị agha ahụ agbaala obodo ahụ gburugburu.—2 Eze 6:13, 14.

Mgbe onye na-ejere Ịlaịsha ozi tetara, ọ pụrụ èzí ma hụ ndị bịara ịnwụchi ha. Ụjọ bịara ya, ya etie mkpu, sị: “Ewoo, nna m ukwu! Gịnị ka anyị ga-eme?” Ịlaịsha gwara ya, sị: “Atụla egwu, n’ihi na ndị anyị na ha nọ karịrị ndị ha na ha nọ.” Mgbe Ịlaịsha kwuchara ihe a, ya ekpee ekpere, sị: “Jehova, biko, meghee anya ya ka ọ hụ ụzọ.” Baịbụl gwara anyị ihe merenụ. Ọ sịrị: “Ozugbo, Jehova meghere anya onye ahụ na-eje ozi, o wee hụ; ma, lee! ógbè ahụ bụ́ ugwu ugwu jupụtara n’ịnyịnya na ụgbọ ịnyịnya agha na-acha ọkụ ọkụ gburugburu Ịlaịsha.” (2 Eze 6:15-17) Gịnị ka anyị akụkọ a na akụkọ ndị ọzọ a kọrọ gbasara Ịlaịsha na-akụziri anyị?

Ụjọ atụghị Ịlaịsha mgbe ahụ ndị agha Sirịa gbara ya gburugburu n’ihi na ọ tụkwasịrị Jehova obi, marakwa na Jehova agaghị ekwe ka aka kpara ya. Anyị anaghị atụ anya taa ka Jehova rụọrọ anyị ọrụ ebube, ma o doro anyị anya na ọ na-echebe ndị na-efe ya. Anyị nwere ike ikwu na ịnyịnya na ụgbọ ịnyịnya ndị na-acha ọkụ ọkụ gbara anyị gburugburu. Ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi ma nwee okwukwe na ọ na-echebe ndị na-efe ya, ụjọ agaghị atụ anyị. Ọ ga-agọzikwa anyị. (Ọma 4:8) Ka anyị tụlee otú ihe ndị ọzọ a kọrọ gbasara Ịlaịsha ga-esi baara anyị uru.

OTÚ ỊLAỊSHA SI MALITE IJERE ỊLAỊJA OZI

O nwere otu ụbọchị Ịlaịsha nọ na-akọ ugbo, Ịlaịja abịa wụkwasị ya uwe e ji mara ya. Ịlaịja ji ihe ahụ o mere gwa Ịlaịsha ka ọ bịa jewere ya ozi. N’ihi ya, Ịlaịsha mere oriri, gwa papa ya na mama ya ka ha nọrọ nke ọma, ma gawa ijere Ịlaịja ozi. (1 Eze 19:16, 19-21) Ịlaịsha wepụtara onwe ya ịrụ ọrụ ọ bụla Chineke sị ya rụọ. N’ihi ya, Jehova ji ya rụọ ọtụtụ ihe, mechaakwa họpụta ya ka ọ bụrụ onye amụma nọchiri Ịlaịja.

 Ịlaịsha jeere Ịlaịja ozi ihe dị ka afọ isii. Oge ahụ Ịlaịsha na-ejere ya ozi, ọ bụ ya ‘na-awụsa mmiri n’aka Ịlaịja.’ (2 Eze 3:11) N’oge ahụ, ndị mmadụ na-eji aka nkịtị eri nri. Ha anaghị eji fọk, mma, ma ọ bụ ngajị eri nri. Ọ na-abụkwa onye nwere ohu richaa nri, ohu ya awụsara ya mmiri ka ọ kwọọ aka. N’ihi ya, o nwere ike ịbụ na ọrụ ụfọdụ Ịlaịsha na-arụrụ Ịlaịja bụ ọrụ ndị mmadụ na-eleda anya. Ma, o weere ya na ozi ọ na-ejere Ịlaịja bụ ihe ùgwù.

Taa, ọtụtụ Ndịàmà Jehova na-ewepụtakwa onwe ha na-eje ozi oge niile. Ihe mere ha ji eme otú ahụ bụ na ha nwere okwukwe na Jehova, chọọkwa iji obi ha niile na-ejere ya ozi. Ụfọdụ n’ime ha na-ahapụ ụlọ ha gaa jewe ozi na Betel ma ọ bụkwanụ soro na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze, Ụlọ Mgbakọ, na alaka ụlọ ọrụ. Ha nwere ike ịna-arụ ọrụ ndị ọzọ ledara anya. Ma, anyị ekwesịghị ileda ọrụ ha anya n’ihi na Jehova anaghị eji ọrụ ha na-arụ egwu egwu.—Hib. 6:10.

ỊLAỊSHA AHAPỤGHỊ ỌRỤ YA

Tupu Chineke ‘eburu Ịlaịja n’oké ifufe gaa n’eluigwe,’ ọ gwara ya ka o si Gilgal gaa Betel. Ịlaịja gwara Ịlaịsha ka ọ ghara iso ya, ma Ịlaịsha gwara ya, sị: “Agaghị m ahapụ gị.” Mgbe ha nọ n’ụzọ, Ịlaịja gwara ya ugboro abụọ ọzọ ka ọ laghachi, ma o kweghị. (2 Eze 2:1-6) Ịlaịsha ekweghị ahapụ Ịlaịja otú ahụ Rut na-ahapụghị Neomi. (Rut 1:8, 16, 17) Gịnị mere na ọ hapụghị ya? Ịlaịsha weere na ijere Ịlaịja ozi bụ ihe ùgwù n’ihi na ọ bụ ọrụ Chineke nyere ya.

Anyị kwesịrị ịmụta ihe n’ihe Ịlaịsha mere. Ọ bụrụ na e nye anyị ọrụ n’ọgbakọ, anyị ga-eji obi anyị niile na-arụ ya ma ọ bụrụ na anyị echeta na ọ bụ Jehova ka anyị na-arụrụ ya. O nweghị ihe ùgwù ka ijere Jehova ozi.—Ọma 65:4; 84:10.

“RỊỌ IHE M GA-EMERE GỊ”

Ka Ịlaịja na Ịlaịsha nọ n’ụzọ na-aga Betel, Ịlaịja gwara Ịlaịsha, sị: “Rịọ ihe m ga-emere gị tupu e wepụ m n’ebe ị nọ.” Ịlaịsha rịọrọ ya otu ihe ga-enyere ya aka ịna-ejekwuru Jehova ozi, nke yiri ihe ahụ Sọlọmọn rịọrọ Jehova ọtụtụ afọ tupu mgbe ahụ. Ịlaịsha rịọrọ ya ka ‘ya nweta òkè abụọ nke mmụọ ya.’ (1 Eze 3:5, 9; 2 Eze 2:9) N’oge ochie, ọ bụrụ na onye Izrel ekewere ụmụ ya ndị nwoke ihe, ọ ga-enye ọkpara ya òkè abụọ n’ihe niile o nwere. (Diut. 21:15-17) N’ihi ya, Ịlaịsha na-arịọ Ịlaịja ka ya bụrụ onye amụma ga-anọchi ya. Ihe mere o ji rịọ ka ya nwee mmụọ Ịlaịja, ya bụ, ka ya na-akpa àgwà ka ya, bụ na ọ chọrọ inwe ụdị obi ike Ịlaịja nwere. Ọ chọkwara iji obi ya niile na-akwado ofufe Jehova otú ahụ Ịlaịja si kwado ya.—1 Eze 19:13, 14.

Gịnị ka Ịlaịja mere mgbe Ịlaịsha rịọrọ ya ihe ahụ? Ọ gwara ya, sị: “Ị rịọwo ihe siri ike. Ọ bụrụ na ị hụ m mgbe a na-ewepụ m n’ebe ị nọ, ọ ga-emere gị otú ahụ; ma ọ bụrụ na ị hụghị m, ọ gaghị eme otú ahụ.” (2 Eze 2:10) Ịlaịja bu ihe abụọ n’obi zaa ya ihe a ọ zara ya. Nke mbụ bụ na ọ bụ naanị Chineke nwere ike ikwu ma Ịlaịsha ọ̀ ga-enweta ihe a ọ rịọrọ Ịlaịja. Nke abụọ abụrụ na ọ bụrụ na Ịlaịsha chọrọ inweta ihe ahụ ọ rịọrọ, o kwesịghị ịhapụ Ịlaịja, ihe ọ sọkwara ya mee.

IHE ỊLAỊSHA HỤRỤ

Chineke ò meere Ịlaịsha ihe ahụ ọ rịọrọ? Baịbụl kwuru, sị: “O wee ruo na, ka ha nọ na-aga, na-ekwu okwu ka ha na-aga, lee! ụgbọ agha na-acha ọkụ ọkụ na ịnyịnya ndị na-acha ọkụ ọkụ, ha wee kewaa ha abụọ; Ịlaịja wee rịgoro n’eluigwe n’oké ifufe. N’oge ahụ, Ịlaịsha nọ na-ahụ ya.” * Ọ bụ otú a ka Jehova si meere Ịlaịsha ihe ahụ ọ rịọrọ. Ịlaịsha hụrụ mgbe a kpọpụrụ Ịlaịja. O nwetara òkè abụọ nke mmụọ Ịlaịja, mechaakwa bụrụ onye amụma nọchiri ya.—2 Eze 2:11-14.

Oge ahụ a na-akpọpụ Ịlaịja, uwe e ji mara ya dapụnahụrụ ya. Ịlaịsha chịịrị uwe ahụ yiri. Ọ bụ uwe ahụ ka ndị mmadụ ji mara na ọ bụzi onye amụma Chineke. O mechakwara mee ihe ọzọ gosiri na ọ bụ onye amụma Jehova. Ọ rụrụ ọrụ ebube, kewaa Osimiri Jọdan.

O doro anya na o nweghị ihe ga-eme ka Ịlaịsha chefuo ihe ọ hụrụ mgbe ahụ oké ifufe bupụrụ Ịlaịja. O nweghị onye ga-ahụ ụgbọ ịnyịnya agha na ịnyịnya na-acha ọkụ ọkụ, ya aghara iju ya anya. Ma, ihe ndị a Ịlaịsha hụrụ mere ka ọ ghọta na Jehova emeerela ya ihe ọ rịọrọ. Anyị anaghị ahụ ụgbọ ịnyịnya na ịnyịnya na-acha ọkụ ọkụ ma Chineke zaa ekpere anyị. Ma, anyị nwere ike ịghọta na Chineke ka na-eji ike ya na-enweghị atụ enyere anyị aka ime uche ya. Ọ bụrụkwa na anyị ahụ otú Jehova si na-agọzi nzukọ ya nke a na-ahụ anya, ọ dị ka à ga-asị na anyị  na-ahụ ụgbọ ịnyịnya ya ka ọ na-aga n’ihu n’ihu n’eluigwe.—Ezik. 10:9-13.

E nwere ọtụtụ ihe mere ka o doo Ịlaịsha anya na Jehova nwere ike na-enweghị atụ. Mmụọ nsọ Jehova nyeere ya aka, ya arụọ ọrụ ebube iri na isii. Ọrụ ebube ndị ọ rụrụ ka ndị nke Ịlaịja rụrụ okpukpu abụọ. * Mgbe ọzọ Ịlaịsha hụrụ ịnyịnya na ụgbọ ịnyịnya na-acha ọkụ ọkụ bụ mgbe ahụ ndị agha Sirịa gbara ya gburugburu na Dotan.

ỊLAỊSHA TỤKWASỊRỊ JEHOVA OBI

Ụjọ atụghị Ịlaịsha n’agbanyeghị na ndị iro gbara ya gburugburu na Dotan. Ọ bụ n’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na o nwere okwukwe siri ike na Jehova ga-anapụta ya. Anyị kwesịkwara inwe ụdị okwukwe ahụ. N’ihi ya, ka anyị na-ekpe ekpere ka Chineke nye anyị mmụọ nsọ ya ka anyị nwee ike ịna-enwe okwukwe ma na-akpa àgwà ndị ọzọ so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ.—Luk 11:13; Gal. 5:22, 23.

O doro anya na ihe ahụ mere na Dotan mere ka Ịlaịsha ghọta na ya kwesịrị ịna-atụkwasịkwu Jehova na ndị mmụọ ozi ya obi. Ịlaịsha ghọtara na ọ bụ Chineke zitere ndị mmụọ ozi ahụ gbara obodo Dotan gburugburu ma chebe ya ka ndị iro ya ghara ịnwụchi ya. Chineke rụrụ ọrụ ebube zọpụta Ịlaịsha na onye na-ejere ya ozi. O mere ka ndị iro Ịlaịsha kpuo ìsì. (2 Eze 6:17-23) Ma mgbe ahụ Ịlaịsha nọ ná nsogbu ma n’oge ndị ọzọ, o nwere okwukwe siri ike na Jehova ma tụkwasị ya obi.

Anyị kwesịrị ịtụkwasị Jehova Chineke obi otú ahụ Ịlaịsha tụkwasịrị ya obi. (Ilu 3:5, 6) Anyị mee otú ahụ, “Chineke ga-emere anyị amara wee gọzie anyị.” (Ọma 67:1) Ọ bụ eziokwu na ụgbọ ịnyịnya na ịnyịnya ndị na-acha ọkụ ọkụ agbaghị anyị gburugburu taa, Jehova na-echebe ndị na-efe ya. Ọ ga-echebekwa ha ‘n’oké mkpagbu’ ahụ na-abịanụ. (Mat. 24:21; Mkpu. 7:9, 14) Tupu oge ahụ eruo, ka anyị na-echeta mgbe niile na “Chineke bụụrụ anyị ebe mgbaba.”—Ọma 62:8.

^ para. 16 Ebe a kpọgara Ịlaịja abụghị eluigwe ebe Jehova na ndị mmụọ ozi ya bi. Gụọ Ụlọ Nche September 15, 1997, peeji nke 15.

^ para. 19 Gụọ Ụlọ Nche August 1, 2005, peeji nke 10.