Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JULAỊ 2013

 AKỤKỌ NDỤ

Anyị Kpebisiri Ike Ijere Jehova Ozi n’Agbanyeghị Ebe Ọ Bụ

Anyị Kpebisiri Ike Ijere Jehova Ozi n’Agbanyeghị Ebe Ọ Bụ

Naanị m ekwusatụbeghị ozi ọma. Mgbe ọ bụla m gara ozi ọma, ụkwụ na-ama m jijiji n’ihi na ahụ́ anaghị eru m ala. Nke ka njọ bụ na ọtụtụ ndị bi n’ókèala anyị anaghị achọ ịnụ ozi ọma. Ụfọdụ n’ime ha na-achọkarị ịlụso anyị ọgụ. Ha kwudịrị na ha ga-eti m ihe. N’ọnwa m malitere ịsụ ụzọ, ọ bụ naanị otu akwụkwọ nta ka m nyere mmadụ!—Ihe Markus kwuru.

IHE ahụ mere n’afọ 1949, ihe karịrị afọ iri isii gara aga. Ma, ka m buru ụzọ kọọ ihe mere ọtụtụ afọ tupu mgbe ahụ. Aha papa m bụ Hendrik. Ọ na-arụzi akpụkpọ ụkwụ, na-elekọtakwa ihe ndị a kụrụ n’otu ogige dị na Donderen, nke bụ́ obere obodo dị n’ebe ugwu Drenta, na Nedalandz. A mụrụ m n’ebe ahụ n’afọ 1927. Abụ m nwa nke anọ n’ime ụmụ asaa nne m mụrụ. Ụlọ anyị dị n’ime ime obodo. E teghị ụzọ e si aga ya korota. Ọtụtụ n’ime ndị agbata obi anyị bụ ndị ọrụ ugbo, ịrụ ọrụ ugbo na-atọkwa m ụtọ. N’afọ 1947, mgbe m dị afọ iri na itoolu, esi m n’aka otu onye agbata obi anyị aha ya bụ Theunis Been mụta banyere Jehova. Mgbe mbụ m hụrụ Theunis, ihe ya amasịghị m. Ma, obere oge ka a lụchara Agha Ụwa nke Abụọ, ọ ghọrọ Onyeàmà Jehova. M chọpụtara na ọ na-enyezi ndị mmadụ ihu karịa otú ọ na-emebu. Otú àgwà ya si gbanwee masịrị m. N’ihi ya, mgbe ọ gwara m banyere nkwa Chineke kwere ime ka ụwa ghọọ paradaịs, m gere ya ntị. M ghọrọ Onyeàmà Jehova n’oge na-adịghị anya, anyị abụọ abụrụ ezigbo enyi. *

M malitere ikwusa ozi ọma n’ọnwa Mee afọ 1948. E mekwara m baptizim n’ọnwa na-eso ya, ya bụ, n’abalị iri abụọ n’ọnwa Jun, n’otu mgbakọ e mere na Yutrekt. M malitere ịsụ ụzọ n’abalị mbụ n’ọnwa Jenụwarị afọ 1949. E zigara m n’otu obere ọgbakọ dị n’obodo Bọkulo, nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Nedalandz. M ga-aga otu narị kilomita na iri atọ tupu mụ eruo ebe ahụ. N’ihi ya, ekpebiri m ịgba ígwè gaa. Echere m na iru ebe ahụ ga-ewe m ihe dị ka awa isii.  Ma n’ihi nnukwu mmiri ozuzo na oké ifufe, o weziri m awa iri na abụọ n’agbanyeghị na m ji ụgbọ okporo ígwè gaa kilomita iri itoolu. Ná mgbede ụbọchị ahụ, eruru m ebe m na-aga, ya bụ, n’ụlọ otu ezinụlọ bụ́ Ndịàmà Jehova. Ebi m n’ụlọ ha mgbe m na-asụ ụzọ n’ebe ahụ.

N’oge ahụ, ọ dịbeghị anya a lụchara Agha Ụwa nke Abụọ. Ndị mmadụ enweghị ọtụtụ ngwongwo. Naanị ihe m nwere bụ otu kootu na otu traụza. Kootu ahụ ka m, traụza ahụ agbadaghị agbada. Dị ka m kwuru ná mmalite, ọnwa mbụ m nọrọ na Bọkulo adịghịrị m mfe, ma Jehova gọziri ozi m, mee ka m nweta ọtụtụ ndị m na-amụrụ Baịbụl. Mgbe ọnwa itoolu gachara, e zigara m n’obodo Amstadam.

M SI N’IME IME OBODO GAA OBODO MEPERE EMEPE

Etoro m n’ebe a na-arụ ọrụ ugbo. Ma m kwagara n’Amstadam, nke bụ́ obodo kacha ibu na Nedalandz. Ọtụtụ ndị gere ntị nke ọma n’ozi ọma anyị kwusara n’ebe ahụ. N’ọnwa mbụ m jere ozi n’ebe ahụ, akwụkwọ m nyere ndị mmadụ karịrị akwụkwọ niile m nyere kemgbe ọnwa itoolu. N’oge na-adịghị anya, ndị m na-amụrụ Baịbụl ruru mmadụ asatọ. Mgbe a họpụtachara m ka m bụrụ ohu ọgbakọ (nke a na-akpọzi onye na-ahaziri òtù ndị okenye ọrụ), a gwara m na m ga-ekwu okwu ihu ọha. Ọ dị m ka agaghị m emeli ya n’ihi na ekwutụbeghị m okwu ihu ọha. N’ihi ya, obi ruru m ala mgbe e zigara m ọgbakọ ọzọ tupu oge m ga-ekwu okwu ihu ọha ahụ eruo. Ma, amaghị m na m ga-emecha kwuo okwu karịrị puku ise!

(N’isi isi aka nri) Ebe Markus na-ezi ozi ọma n’okporo ámá dị nso n’Amstadam n’afọ 1950

N’ọnwa Mee afọ 1950, e zigara m n’obodo Halem. A kpọrọ m ka m bịa bụrụ onye nlekọta sekit. Ụra agaghị m n’anya abalị atọ. Agwara m Robert Winkler, bụ́ onye na-eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ, na echeghị m na m ruru eru ịrụ ọrụ ahụ. Ma, ọ sịrị m: “Dejupụta akwụkwọ ahụ e nyere gị. Ị ga-amụta ya.” N’oge na-adịghị anya, e nyere m ọzụzụ otu ọnwa, mụ aghọọ ohu sekit (nke a na-akpọzi onye nlekọta sekit). Mgbe m na-eleta otu ọgbakọ, ahụrụ m otu nwa agbọghọ bụ́ ọsụ ụzọ aha ya bụ Janny Taatgen. Ihu na-abụ ya ọchị ọchị. O jikwa obi ya niile hụ Jehova n’anya, na-enyekwara ndị ọzọ aka. Mụ na ya lụrụ n’afọ 1955. Ma, tupu mụ akọwa ihe ndị ọzọ, ka Janny kọọ otú o si ghọọ ọsụ ụzọ nakwa otú mụ na ya si mata.

OZI ANYỊ JERE MGBE ANYỊ LỤCHARA

Ihe Janny kwuru: Mama m ghọrọ Onyeàmà Jehova n’afọ 1945 mgbe m dị afọ iri na otu. Ọ ghọtara ozugbo na ịmụrụ ụmụ ya atọ Baịbụl dị ezigbo mkpa. Ma, papa m anaghị ekwe ka anyị mụọ Baịbụl. N’ihi ya, ọ bụ mgbe ọ na-anọghị ya ka mama m na-akụziri anyị Baịbụl.

Mgbe mbụ m so Ndịàmà Jehova mụọ ihe bụ ná mgbakọ e mere n’obodo Heg n’afọ 1950. Mgbe otu izu gara, m mechara gaa ọmụmụ ihe mbụ m n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị n’obodo Asen, nke dị na Drenta. Iwe juru papa m obi, ya achụpụ m n’ụlọ anyị. Mama m gwara m, sị: “Ị ma ebe i nwere ike ibi.” Ama m na ọ na-ekwu banyere ibi na nke ụmụnna. E nwere otu nwanna ya na ezinụlọ ya bi anyị nso.  Ọ bụ n’ụlọ ha ka m bu ụzọ bie. Ma, nna m ka nọkwa na-enye m nsogbu. N’ihi ya, agafere m n’ọgbakọ dị n’obodo Deventa, nke dị n’Ovaraịsel. Isi n’ebe anyị bi gawa ya dị ihe dị ka iri kilomita itoolu na ise. Ma, m ka dị obere mgbe ahụ. N’ihi ya, ndị ọchịchị malitere inye papa m nsogbu maka na ọ chụpụrụ m n’ụlọ anyị. Ọ bụ ya mere papa m ji gwa m ka m lọta. N’agbanyeghị na o nweghị mgbe papa m natara eziokwu, o mechara hapụ m ka m na-aga ọmụmụ ihe niile nakwa ozi ọma.

(N’isi isi aka nri) Mgbe Janny na-asụ ụzọ inyeaka n’afọ 1952

Mgbe m laghachitere n’ụlọ anyị, a nọtụ obere, mama m malitere ịrịa ezigbo ọrịa. Ọ bụzi m na-arụ ọrụ niile dị n’ụlọ. N’agbanyeghị nsogbu ahụ niile, anọ m na-emekwu nke ọma n’ọgbakọ, e mee m baptizim n’afọ 1951 mgbe m dị afọ iri na asaa. N’afọ 1952, mgbe mama m gbakechara n’ọrịa ya, eso m ụmụnna nwaanyị atọ bụ́ ndị ọsụ ụzọ sụọ ụzọ inyeaka ọnwa abụọ. Anyị bi n’ụgbọ mmiri anyị ji mere ụlọ, na-ekwusakwa ozi ọma n’obodo abụọ dị na Drenta. Aghọrọ m ọsụ ụzọ oge niile n’afọ 1953. Mgbe otu afọ gara, otu onye nlekọta sekit bịara leta ọgbakọ anyị. Aha ya bụ Markus. Mụ na ya lụrụ n’ọnwa ise n’afọ 1955 n’ihi na anyị ghọtara na anyị ga na-ejekwuru Jehova ozi ma anyị lụọ.—Ekli. 4:9-12.

Ụbọchị anyị gbara akwụkwọ n’afọ 1955

Ihe Markus kwuru: Mgbe anyị gbachara akwụkwọ, e bu ụzọ kenye anyị ịsụ ụzọ n’obodo Vendam, nke dị na Groningen. Anyị biri n’otu obere ọnụ ụlọ nke dị ihe dị ka amaụkwụ iri n’ogologo nakwa amaụkwụ asaa n’uhiè. Ma, Janny mere ka ọnụ ụlọ ahụ maa mma. Kwa abalị, anyị na-ebupụ tebụl anyị na obere oche abụọ anyị ka anyị nwee ike ibutu àkwà anyị.

Mgbe ọnwa isii gara, a kpọrọ anyị ka anyị bịa Beljọm ka m bụrụ onye nlekọta sekit. N’afọ 1955, e nwere ihe dị ka naanị puku ndị nkwusa anọ n’obodo ahụ. Ndị nkwusa e nwere ugbu a dịzi okpukpu isii. N’obodo Flandas, nke dị n’ebe ugwu Beljọm, ndị mmadụ na-asụ asụsụ ndị Nedalandz. Ma, otú ndị Beljọm si asụ ya dị ezigbo iche. N’ihi ya, anyị bugodị ụzọ mụwa ịsụ asụsụ ahụ otú ha si asụ ya.

Ihe Janny kwuru: Onye nlekọta sekit kwesịrị ịmụta iwepụta onwe ya na-ejere ndị ọzọ ozi. Anyị na-agba ígwè aga eleta ọgbakọ dị iche iche. Anyị na-anọkwa n’ụlọ ụmụnna anyị. Ebe ọ bụ na anyị enweghị ụlọ nke anyị, bụ́ ebe anyị ga-aga ma anyị letachaa ọgbakọ, anyị na-anọrọ n’ebe anyị letara ọgbakọ ruo n’ụtụtụ Tuzdee tupu anyị agawazie n’ọgbakọ ọzọ anyị ga-eleta. Ma, anyị ghọtara na ozi anyị na-ejere Jehova so n’ihe ọma o meere anyị.

Ihe Markus kwuru: Ná mmalite, e nweghị nwanna ọ bụla anyị ma n’ọgbakọ ndị ahụ anyị na-eleta, ma ha dị obiọma, na-elekwa anyị ọbịa. (Hib. 13:2) N’afọ ndị ahụ, anyị letara ọgbakọ niile ji asụsụ Dọch amụ ihe na Beljọm ugboro ugboro. O mere ka anyị nweta ọtụtụ ngọzi. Dị ka ihe atụ, ọ fọrọ obere ka anyị mata ụmụnna niile ji asụsụ Dọch amụ ihe n’obodo ahụ. Anyị hụkwara ha n’anya nke ukwuu. Anyị ejirila anya anyị hụ ka ọtụtụ ụmụaka toro ma na-eme nke ọma n’ọgbakọ, rara onwe ha nye Jehova, burukwa ụzọ na-achọ ihe gbasara Alaeze ya. Obi dị anyị  ezigbo ụtọ ịhụ ka ọtụtụ n’ime ha ji obi ha niile na-ejere Jehova ozi oge niile. (3 Jọn 4) Otú anyị na ha si ‘agbarịta ibe anyị ume’ emeela ka ọ dịrị anyị mfe iji obi anyị niile na-eje ozi anyị.—Rom 1:12.

IHE SIIRI ANYỊ IKE, MA CHINEKE GỌZIRI ANYỊ

Ihe Markus kwuru: Malite n’ụbọchị ahụ anyị lụrụ, ọ na-agụ anyị agụụ ịga Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Kwa ụbọchị, anyị na-eji otu awa ma ọ dịkarịa ala amụ Bekee. Ma, ọ dịrịghị anyị mfe isi n’akwụkwọ e dere ede amụta otú e si asụ Bekee. N’ihi ya, anyị kpebiri iji oge ezumike anyị gaa Ingland, ka anyị nwee ike iji Bekee anyị mụtara na-ezi ndị mmadụ ozi ọma n’ebe ahụ. N’afọ 1963, anyị mechara nweta otu envelopu si n’isi ụlọ ọrụ anyị dị na Bruklin. Ihe dị na ya bụ akwụkwọ ozi abụọ. Otu bụ nke m, nke ọzọ abụrụ nke nwunye m. E ji akwụkwọ ozi ahụ e ziteere m kpọọ m ka m bịa klas pụrụ iche, nke ga-ewe ọnwa iri n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied. A ga-anọ na ya nye ụmụnna nwoke ọzụzụ, kụziekwara ha otú e si ahazi ihe ná nzukọ Jehova. N’ihi ya, n’ime otu narị ụmụnna a kpọrọ ka ha bịa ụlọ akwụkwọ ahụ, mmadụ iri asatọ na abụọ bụ ụmụ nwoke.

Ihe Janny kwuru: N’akwụkwọ ozi ahụ m nwetara n’ụbọchị ahụ, a gwara m ka m kpee ekpere ma kpebie ma m̀ ga-anọrọ na Beljọm mgbe di m ga-aga Ụlọ Akwụkwọ Gilied. N’eziokwu, ihe ahụ wutere m ná mmalite. O yiri ka Jehova agọzighị mbọ niile m gbara ka m nwee ike ịga Gilied. Ma, agwara m onwe m na ihe mere e ji malite Ụlọ Akwụkwọ Gilied bụ ka e nyere ndị gara ya aka ka ha nwee ike ịga na-ekwusa ozi ọma n’ebe ọ bụla e zigara ha. N’ihi ya, ekwetara m ịnọrọ na Beljọm. Ọrụ e nyere m bụ ịbụ ọsụ ụzọ pụrụ iche n’obodo Gent dị na Beljọm. Ndị mụ na ha jekọrọ ozi bụ ụmụnna nwaanyị abụọ aha ha bụ Anna Colpaert na Maria Colpaert. Ha bụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche kemgbe ọtụtụ afọ.

Ihe Markus kwuru: Ebe ọ bụ na amụtachabeghị m Bekee, a gwara m ka m bịa Bruklin ọnwa ise tupu ụlọ akwụkwọ ahụ ebido. Arụrụ m ọrụ na Ngalaba Na-ezipụ Akwụkwọ nakwa na Ngalaba Ije Ozi. M nyere aka na-ezigara ụmụnna nọ n’Eshia, Yurop, na Ebe Ndịda Amerịka akwụkwọ. Ihe a niile mere ka m ghọtakwuo na ụmụnna anyị nọ n’ụwa niile. Onye m kacha echeta bụ Nwanna A. H. Macmillan, onye bụbu onye pilgrim (ya bụ, onye nlekọta sekit) mgbe Nwanna Russell ka dị ndụ. Ọ kaala nká mgbe ahụ. Ọ naghịkwa anụcha ihe. Ma, ọ na-agachi ọmụmụ ihe anya. Anaghị m echefu àgwà ya echefu. O mere ka m mụta na anyị ekwesịghị iji ọmụmụ ihe Ndị Kraịst na-egwu egwu.—Hib. 10:24, 25.

Ihe Janny kwuru: N’oge ahụ di m gara ụlọ akwụkwọ Gilied, mụ na ya na-ederịta akwụkwọ ozi ọtụtụ ugboro n’izu. Ọ gụsiri anyị agụụ ike ịhụ ibe anyị. Ma, ihe a nọ na-akụziri ya n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied tọrọ ya ụtọ. Ozi ọma m na-eje tọkwara mụnwa ezigbo ụtọ. Mgbe o si Amerịka lọta, m na-amụrụ mmadụ iri na asaa Baịbụl. Otu afọ na ọnwa atọ ahụ mụ na ya na-anọghị siiri anyị ezigbo ike. Ma, aghọtara m na Jehova gọziri anyị maka na anyị diri ihe isi ike ndị ahụ. N’ụbọchị di m lọtara, ụgbọelu ha gburu oge. Echekatara m ya, ọtụtụ awa agaa. N’ihi ya, mgbe o mechara lọta, mụ na ya makụrụ ma bee ezigbo ákwá. Kemgbe ahụ, anyị abụọ na-eso aga ebe ọ bụla anyị chọrọ ịga.

ANYỊ JI OBI ỤTỌ RỤỌ ỌRỤ Ọ BỤLA E NYERE ANYỊ

Ihe Markus kwuru: Mgbe m si Ụlọ Akwụkwọ Gilied lọta na Disemba afọ 1964, a kpọrọ anyị ka anyị bịa jewe ozi na Betel. Ma, anyị amaghị mgbe ahụ na  anyị agaghị anọ ebe ahụ ọtụtụ afọ. Mgbe naanị ọnwa atọ gara, e zigara anyị n’obodo Flandas ka m bụrụ onye nlekọta distrikti. E mechara zite ndị ozi ala ọzọ, bụ́ Aalzen na Els Wiegersma, na Beljọm. Mgbe e mere Nwanna Aalzen Wiegersma onye nlekọta distrikti, anyịnwa gaghachiri Betel, mụ arụwa ọrụ na Ngalaba Ije Ozi. Malite n’afọ 1968 ruo n’afọ 1980, a gbanweere anyị ọrụ ugboro ugboro. Anyị nọtụ na Betel, anyị agaa na-eleta ọgbakọ. N’ikpeazụ, malite n’afọ 1980 ruo n’afọ 2005, aghọrọ m onye nlekọta distrikti ọzọ.

N’agbanyeghị na a gbanwere ọrụ anyị ọtụtụ ugboro, anyị echefughị na anyị kwere Jehova nkwa iji obi anyị niile na-ejere ya ozi. Anyị na-eji obi ụtọ arụ ọrụ ọ bụla e nyere anyị n’ihi na obi siri anyị ike na ihe mere e ji agbanwe ọrụ anyị bụ ka e nwee ike ịna-akwado Alaeze Chineke.

Ihe Janny kwuru: Obi dị m ezigbo ụtọ mgbe m so di m gaa Bruklin n’afọ 1977 nakwa mgbe anyị gara Patasịn n’afọ 1997 ka e nyekwuo ya ọzụzụ a na-enye ndị so na Kọmitii Alaka.

JEHOVA MA MKPA ANYỊ

Ihe Markus kwuru: N’afọ 1982, a wara nwunye m ahụ́, ya emechaa gbakee. Mgbe afọ atọ gara, ọgbakọ dị n’obodo Luvan gwara anyị bịa biri n’ụlọ dị n’elu Ụlọ Nzukọ Alaeze ha. Ọ bụ ya bụ nke mbụ anyị nwere ụlọ nke anyị kemgbe iri afọ atọ. N’ụbọchị Tuzdee ọ bụla, ọ na-abụ, anyị kwakọtachaa ngwongwo anyị, m na-eburu ibu anyị si n’ụlọ elu ahụ gbadaa ala. M na-eme ya ugboro ugboro. Obi dị anyị ụtọ na e mere ndokwa n’afọ 2002 ka anyị birizie n’ala. Mgbe m ruru afọ iri asaa na asatọ, a gwara anyị ka anyị gaa bụrụ ndị ọsụ ụzọ n’obodo Lokeren. Obi dị anyị ezigbo ụtọ na anyị na-eje ụdị ozi a nakwa na anyị ka na-aga ozi ọma kwa ụbọchị.

“Obi siri anyị ike na ihe dị mkpa abụghị ebe anyị na-eje ozi ma ọ bụ ụdị ọrụ e nyere anyị, kama ọ bụ onye anyị na-ejere ozi”

Ihe Janny kwuru: A gụkọta afọ niile anyị abụọ jirila jee ozi oge niile, ọ karịala otu narị afọ na iri abụọ. Ihe ndị anyị ji anya anyị hụ gosiri na nkwa Jehova kwere bụ eziokwu. O kwere nkwa na ‘ya agaghị ahapụ anyị ma ọlị,’ nakwa na ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile na-efe ya, ‘ọ dịghị ihe ga-akọ anyị.’—Hib. 13:5; Diut. 2:7.

Ihe Markus kwuru: Mgbe anyị ka na-eto eto, anyị nyefere Jehova onwe anyị. O nweghị mgbe anyị chọwaara onwe anyị ihe ukwu. Anyị ji obi anyị niile kweta ịrụ ọrụ ọ bụla e nyere anyị n’ihi na obi siri anyị ike na ihe dị mkpa abụghị ebe anyị na-eje ozi ma ọ bụ ụdị ọrụ e nyere anyị, kama ọ bụ onye anyị na-ejere ozi.

^ para. 5 Ka oge na-aga, papa m, mama m, nwanne m nwaanyị tọrọ m, na ụmụnne m ndị nwoke abụọ m tọrọ ghọrọ Ndịàmà Jehova.