Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Julaị 2013

“Ònye n’Ezie Bụ Ohu ahụ Kwesịrị Ntụkwasị Obi, Onye Nwekwara Uche?”

“Ònye n’Ezie Bụ Ohu ahụ Kwesịrị Ntụkwasị Obi, Onye Nwekwara Uche?”

“Ònye n’ezie bụ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, nke nna ya ukwu mere onye na-elekọta ezinụlọ ya?”—MAT. 24:45.

1, 2. Olee ndị Jizọs si n’aka ha na-akụziri anyị ihe taa? Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị mata ndị ahụ?

OTU nwanna nwaanyị degaara isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova akwụkwọ ma kwuo na obi dị ya ụtọ n’ihi ọrụ ụmụnna na-arụ n’ebe ahụ. O dere, sị: “Ụmụnna m, agaghị m agụtali ugboro ole m gụrụ isiokwu ndị unu bipụtara, ihe e dere na ha abaara m ezigbo uru.” Ọ̀ dịtụla gị otú ọ dị nwanna nwaanyị a? Ọ dịtụla ọtụtụ n’ime anyị otú ahụ. Ò kwesịrị iju anyị anya? Mbanụ.

2 Jizọs bụ Isi nke ọgbakọ Ndị Kraịst. Okwu Chineke a na-akụziri anyị n’oge kwesịrị ekwesị gosiri na ọ na-emezu nkwa ahụ o kwere na ya ga na-enye anyị nri. Olee ndị o si n’aka ha na-enye anyị nri ahụ? Mgbe Jizọs na-ekwu ihe a ga-eji mara oge ọnụnọ ya, o kwuru na ya ga-esi n’aka “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche,” na-enye ezinụlọ ya ‘nri n’oge kwesịrị ekwesị.’ * (Gụọ Matiu 24:45-47.) Ọ bụ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi ka Jizọs si n’aka ya na-akụziri ezigbo ndị na-eso ụzọ ya ihe n’oge ikpeazụ a. Ọ dị ezigbo mkpa ka anyị mata onye bụ́ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi. Ọ bụrụ na anyị amata ndị ha bụ ma na-ege ntị n’ihe ha na-akụziri anyị, ọ ga-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike, anyị na Chineke adịrịkwa ná mma.—Mat. 4:4; Jọn 17:3.

3. Gịnị ka akwụkwọ anyị kwuru n’oge gara aga banyere ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi Jizọs kwuru okwu ya?

3 Gịnịzi ka anyị kwesịrị ịghọta n’ihe atụ ahụ Jizọs nyere banyere ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi? N’oge gara aga, akwụkwọ anyị kwuru na ọ bụ na Pentikọst afọ 33 ka Jizọs họpụtara ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi ka ọ na-elekọta ezinụlọ ya. O kwuru na ndị bụ́ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ Ndị Kraịst niile e tere mmanụ ka nọ n’ụwa n’oge ọ bụla, kwuokwa na ndị bụ́ ezinụlọ ahụ bụ ndị e tere mmanụ, ma e lee ha anya otu otu. Akwụkwọ anyị kwukwara na  ọ bụ n’afọ 1919 ka Jizọs mere ka ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụrụ “onyeisi ihe niile o nwere,” ya bụ, ihe niile dị n’ụwa, ndị metụtara Alaeze Chineke. Ma, mgbe anyị lebara okwu ahụ anya nke ọma, kpee ekpere ma tụgharịa uche na ya, anyị chọpụtara na e kwesịrị ịgbanwe ihe anyị ghọtaburu n’ihe Jizọs kwuru gbasara ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi. (Ilu 4:18) Ka anyị tụlee ihe atụ ahụ Jizọs nyere na otú o si gbasa anyị ma ànyị nwere olileanya ịga eluigwe ma ọ̀ bụ ibi n’ụwa.

OLEE MGBE IHE ATỤ AHỤ GA-EMEZU?

4-6. Gịnị mere o ji doo anya na ọ bụ mgbe afọ 1914 gachara ka ihe atụ ahụ Jizọs nyere banyere ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi malitere imezu?

4 Amaokwu ndị ọzọ dị na Matiu isi iri abụọ na anọ gosiri na mgbe ihe atụ ahụ Jizọs nyere banyere ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi malitere imezu bụ n’oge ikpeazụ a, ọ bụghị na Pentikọst afọ 33. Ka anyị hụ otú Akwụkwọ Nsọ si nyere anyị aka ịghọta ihe a e kwuru.

5 Ihe atụ ahụ Jizọs nyere banyere ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi so n’amụma o buru banyere ‘ihe ịrịba ama nke ọnụnọ ya na nke ọgwụgwụ usoro ihe a.’ (Mat. 24:3) Ihe e dere na Matiu 24:4-22 bụ ihe Jizọs bu ụzọ kwuo n’amụma ahụ o buru. Ihe ahụ ga-emezu ugboro abụọ. O bu ụzọ mezuo n’agbata afọ 33 na afọ 70. Mmezu ya nke abụọ, nke ga-aka nke mbụ ahụ, ga-abụ n’oge anyị a. Ọ̀ pụtara na ihe Jizọs kwuru banyere ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi ga-emezukwa ugboro abụọ? Mba.

6 Malite na Matiu 24:29, ihe Jizọs kacha kwuo banyere ha bụ ihe ndị ga-eme n’oge anyị a. (Gụọ Matiu 24:30, 42, 44.) Mgbe ọ na-ekwu banyere ihe ndị ga-eme n’oké mkpagbu ahụ, o kwuru na ndị mmadụ ‘ga-ahụ Nwa nke mmadụ ka ọ na-abịa n’ígwé ojii nke eluigwe.’ Ọ gwaziri ndị bi n’oge ikpeazụ a ka ha mụrụ anya. O kwuru, sị: “Unu amaghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa,” nakwa “na ọ bụ n’oge awa unu na-echeghị na ọ ga-abụ ka Nwa nke mmadụ ga-abịa.” * Ọ bụ mgbe Jizọs kwuchara banyere ihe ndị ga-eme n’oge ikpeazụ a ka o nyere ihe atụ ahụ gbasara ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi. N’ihi ya, o doro anya na ihe Jizọs kwuru banyere ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi malitere imezu mgbe oge ikpeazụ malitechara n’afọ 1914. Ihe a e kwuru dabara adaba. N’ihi gịnị?

7. Olee ajụjụ dị mkpa e kwesịrị ịza mgbe oge owuwe ihe ubi malitere? N’ihi gịnị?

7 Chegodị banyere ajụjụ ahụ bụ́: “Ònye n’ezie bụ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche?” N’oge ndịozi, e nweghị ihe mere a ga-eji jụọ ajụjụ ahụ. N’isiokwu bu nke a ụzọ, anyị kwuru na ndịozi rụrụ ọrụ ebube dị iche iche. E sikwa n’aka ha na-enye ndị ọzọ ike ịrụ ọrụ ebube. Ihe ahụ niile gosiri na Chineke nọnyeere ha. (Ọrụ 5:12) N’ihi ya, o nweghị ihe kwesịrị ime ka a jụwa onye Kraịst họpụtara idu ndú. Ma, mgbe afọ 1914 ruru, ihe agbanweela. Ọ bụ n’afọ ahụ ka oge owuwe ihe ubi malitere, ya bụ, mgbe a ga-amata ihe dị iche n’ata ahụ na ọka wit ahụ. (Mat. 13:36-43) Mgbe oge owuwe ihe ubi ahụ malitere, ajụjụ dị mkpa e kwesịrị ịza bụ: Ebe ọ bụ na ọtụtụ Ndị Kraịst adịgboroja na-asị na ha bụ ezigbo ndị na-eso ụzọ Jizọs, olee otú a ga-esi mata ndị bụ́ ọka wit, ya bụ, Ndị Kraịst e tere mmanụ? A zara ajụjụ ahụ n’ihe atụ ahụ Jizọs nyere banyere ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi. Ọ bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ ka a ga-eji okwu Chineke na-azụ.

ÒNYE BỤ OHU AHỤ KWESỊRỊ NTỤKWASỊ OBI, ONYE NWEKWARA UCHE?

8. Gịnị mere o ji daba adaba na ọ bụ ndị so ná Ndị Kraịst e tere mmanụ bụ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi?

8 Ndị bụ́ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi ga-abụrịrị Ndị Kraịst e tere mmanụ ka nọ n’ụwa. A kpọrọ ha “òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze.” Ọrụ e nyere ha bụ ka ha ‘“kwusaa n’ebe niile ịdị mma” nke onye ahụ kpọpụtara ha n’ọchịchịrị wee kpọba ha n’ìhè ya dị ebube.’ (1 Pita 2:9) N’ihi ya, ọ dabara adaba na ọ bụ ndị so ‘n’òtù ndị nchụàjà ahụ bụ́ ndị eze’ ga  na-akụziri ụmụnna ha eziokwu Baịbụl.—Mal. 2:7; Mkpu. 12:17.

9. Ọ̀ bụ Ndị Kraịst niile e tere mmanụ bụ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi? Kọwaa.

9 Ọ̀ bụ ndị niile e tere mmanụ nọ n’ụwa bụ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi? Mba. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụghị ndị niile e tere mmanụ so ewepụta ihe a na-akụziri ụmụnna ha nọ n’ụwa niile. N’ime ndị e tere mmanụ, e nwere ma ndị bụ́ ohu na-eje ozi ma ndị bụ́ okenye n’ọgbakọ. Ha na-akụzi ihe ma n’ọgbakọ ma n’ụlọ n’ụlọ. Ha na-ejikwa obi ha niile akwado ihe ụmụnna nọ n’isi ụlọ ọrụ anyị kwuru ka e mee. Ma ha esoghị ewepụta ihe a na-akụziri ụmụnna ha n’ụwa niile. Ụfọdụ ndị e tere mmanụ bụkwa ụmụnna nwaanyị dị umeala n’obi. O nweghị ihe ga-eme ka ha chọwa ịbụ ndị na-akụzi ihe n’ọgbakọ.—1 Kọr. 11:3; 14:34.

10. Ònye bụ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche?

10 Oleezi onye bụ́ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche? Cheta na Jizọs si n’aka mmadụ ole na ole nye ọtụtụ ndị nri. Ọ bụkwa otú ahụ ka ndị bụ́ ohu ahụ si bụrụ mmadụ ole na ole n’ime ụmụnna nwoke e tere mmanụ. Ọ bụ ha na-ewepụta ihe a na-akụziri ọgbakọ dị iche iche n’oge ọnụnọ Kraịst. Kemgbe oge ikpeazụ a, ụmụnna ndị ahụ e tere mmanụ, ndị bụ́ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, na-ejekọ ozi n’isi ụlọ ọrụ anyị. N’afọ ndị na-adịbeghị anya, ndị bụ́ ohu ahụ bụ Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova. Ma, cheta na n’ihe atụ ahụ Jizọs nyere, otú o si kwuo banyere “ohu ahụ” dị ka à ga-asị na ọ bụ otu onye. Ọ pụtara na e nwere ndị ọ nọchiri anya ha. N’ihi ya, ndị so n’Òtù Na-achị Isi na-agbakọ aka ekpebi ihe ọ bụla a ga-eme.

OLE NDỊ BỤ EZINỤLỌ AHỤ A NA-ELEKỌTA?

11, 12. (a) Olee ọrụ abụọ Jizọs nyere ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche? (b) Olee mgbe Jizọs mere ka ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụrụ onye na-elekọta ezinụlọ ya? Oleekwa ndị ọ họpụtara?

11 Cheta na n’ihe atụ ahụ Jizọs nyere, e nwere ọrụ abụọ o nyere ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche. Nke mbụ bụ ilekọta ezinụlọ nna ya ukwu. Nke abụọ abụrụ ilekọta ihe niile nna ya ukwu nwere. Ebe ọ bụ na ihe atụ Jizọs ahụ na-emezu naanị n’oge ikpeazụ a, mgbe a ga-enye ohu ahụ ọrụ abụọ ahụ bụ mgbe Jizọs ghọchara Eze n’afọ 1914.

12 Olee mgbe Jizọs mere ka ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụrụ onye na-elekọta ezinụlọ ya? Ihe ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ a bụ ịtụle ihe mere n’afọ 1914. Ọ bụ mgbe ahụ ka oge owuwe ihe ubi ahụ malitere. Cheta na anyị kwuru na n’oge ahụ, e nwere ọtụtụ ndị sịrị na ha bụ Ndị Kraịst. Olee ndị Jizọs  ga-esi n’etiti ha họpụta ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi? A zara ajụjụ ahụ mgbe ya na Nna ya bịachara nyochaa ụlọ nsọ ahụ malite n’afọ 1914 ruo ná mmalite afọ 1919. Ụlọ nsọ ahụ bụ ndokwa Chineke mere nke ga-enyere ndị mmadụ aka ife ya. * (Mal. 3:1) Obi dị Jizọs na Nna ya ụtọ ịhụ na Ndị Mmụta Baịbụl ji obi ha niile na-egosi na ha hụrụ Jehova na Okwu ya n’anya n’agbanyeghị na ha adịghị ọtụtụ mgbe ahụ. O doro anya na e kwesịrị ime ka ha dịkwuo ọcha. Ma ha ji obi umeala kwe ka a gbazie ha n’oge a nwalere ha ma nụchaa ha otú e si anụcha ọlaọcha. (Mal. 3:2-4) Ọ bụ Ndị Mmụta Baịbụl ndị ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ ezigbo Ndị Kraịst yiri ọka wit. Mgbe ha malitekwara iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma n’afọ 1919, Jizọs si n’etiti ha họpụta ụmụnna ruru eru, bụ́ ndị e tere mmanụ, ka ha bụrụ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, meekwa ka ha na-elekọta ezinụlọ ya.

13. Ole ndị so n’ezinụlọ ahụ a na-enye nri? N’ihi gịnịkwa?

13 Oleezi ndị bụ́ ezinụlọ ya? Ọ bụ ndị a na-akụziri Okwu Chineke n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Mgbe oge ikpeazụ a malitere, ndị niile so n’ezinụlọ ahụ bụ ndị e tere mmanụ. Ka oge na-aga, ndị ọzọ so n’ezinụlọ ahụ bụ oké ìgwè mmadụ ndị so n’atụrụ ọzọ ahụ. Ọ bụzi atụrụ ọzọ ahụ kacha n’ọnụ ọgụgụ ‘n’otu ìgwè atụrụ’ ahụ Kraịst na-edu. (Jọn 10:16) Ụzọ ndị abụọ ahụ so na-eri nri ahụ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na-enye Ndị Kraịst n’oge kwesịrị ekwesị. Ebe ọ bụ ndị so n’Òtù Na-achị Isi bụ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi taa, è nwere ike ikwu na ha so n’ezinụlọ ahụ a na-enye nri? Ụmụnna ndị ahụ kwesịkwara ịna-eri nri ahụ. N’ihi ya, ha ghọtara na onye ọ bụla n’ime ha so ná ndị a na-akụziri okwu Chineke otú ahụ e si akụziri ndị niile bụ́ ezigbo ndị na-eso ụzọ Jizọs.

Ma ànyị nwere olileanya ịga eluigwe ma ọ̀ bụ ibi n’ụwa, anyị niile so n’ezinụlọ ahụ a na-enye nri. Anyị kwesịkwara iso na-eri nri ahụ a na-enye anyị n’oge kwesịrị ekwesị

14. (a) Olee ọrụ Jizọs nyere ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi? Olee ihe ndị so n’ọrụ ahụ? (b) Olee aka ná ntị Jizọs dọrọ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche? (Gụọ igbe bụ́ “Ọ Bụrụ na Ajọ Ohu Ahụ . . . ”)

14 Jizọs nyere ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, ọrụ dị ezigbo mkpa. N’oge Baịbụl, ọ bụ ohu a tụkwasịrị obi na-elekọta ụlọ nna ya ukwu. (Luk 12:42) N’ihi ya, ọ bụ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, ka e nyere ọrụ ilekọta ihe niile Jizọs nwere n’ụwa. Ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ bụ ego na ihe onwunwe, ozi ọma a na-ekwusa, ihe ndị a na-akụzi ná mgbakọ, na ibipụta Baịbụl anyị ga-eji na-ekwusa ozi ọma, na-amụkwa ihe ma n’ụlọ ma n’ọgbakọ. Ndị niile so n’ezinụlọ ahụ a na-elekọta na-eri nri ahụ niile ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na-enye ha.

 OLEE MGBE JIZỌS GA-EME OHU AHỤ ONYE NA-ELEKỌTA IHE NIILE O NWERE?

15, 16. Olee mgbe Jizọs ga-eme ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi onye na-elekọta ihe niile o nwere?

15 Olee mgbe Jizọs ga-enye ohu ahụ ọrụ nke abụọ ahụ, ya bụ, ‘ịna-elekọta ihe niile o nwere’? Jizọs sịrị: “Obi ụtọ na-adịrị ohu ahụ ma ọ bụrụ na nna ya ukwu abịarute wee hụ ya ka ọ na-eme otú ahụ. N’ezie, ana m asị unu, Ọ ga-eme ya onye na-elekọta ihe niile o nwere.” (Mat. 24:46, 47) Buru n’obi na mgbe Jizọs ga-enye ohu ahụ ọrụ nke abụọ ahụ bụ mgbe ọ bịarutere hụ na “ọ na-eme otú ahụ” kemgbe, ya bụ, ịna-akụziri ndị ezinụlọ ya okwu Chineke. N’ihi ya, e nyechaa ya ọrụ nke mbụ ahụ, ọtụtụ afọ ga-agacha tupu e nye ya ọrụ nke abụọ. Ihe ga-enyere anyị aka ịghọta otú Jizọs si mee ka ohu ahụ bụrụ onye na-elekọta ihe niile o nwere nakwa mgbe ọ ga-enye ya ọrụ ahụ bụ ịmata ihe abụọ dị mkpa. Nke mbụ bụ mgbe Jizọs bịarutere. Nke abụọ abụrụ ihe ndị so n’ihe o nwere.

16 Olee mgbe Jizọs bịarutere? Ihe Jizọs kwuru n’amaokwu ndị bu ụzọ zara ajụjụ a. Cheta na ‘ọbịbịa’ Jizọs e kwuru okwu ya n’amaokwu ndị ahụ pụtara mgbe ọ ga-abịa ikpe ikpe na ibibi ndị ajọ omume n’ọgwụgwụ usoro ihe ochie a. * (Mat. 24:30, 42, 44) N’ihi ya, n’ihe atụ ahụ Jizọs nyere banyere ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, mgbe Jizọs ‘ga-abịa’ ma ọ bụ ‘bịarute’ bụ n’oké mkpagbu ahụ.

17. Olee ihe so n’ihe ndị Jizọs nwere?

17 Olee ihe ndị so ‘n’ihe niile Jizọs nwere’? Otú Jizọs si kwuo “ihe niile o nwere” egosighị na ọ na-ekwu naanị banyere ihe ndị o nwere n’ụwa. Nke bụ́ eziokwu bụ na Jizọs nwere ike dị ukwuu n’eluigwe. O kwuru, sị: “E nyewo m ikike niile n’eluigwe na n’elu ụwa.” (Mat. 28:18; Efe. 1:20-23) Ihe so n’ihe ndị o nwere ugbu a bụ Alaeze Mesaya e nyere ya kemgbe afọ 1914. Ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ ga-esokwa ya chịa na ya.—Mkpu. 11:15.

18. Gịnị mere obi ga-eji dị Jizọs ụtọ ime ka ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na-elekọta ihe niile o nwere?

 18 Gịnị ka anyị kwesịrị ịghọta n’ihe a niile anyị tụlere? Mgbe Jizọs ga-abịa ikpe ikpe n’oké mkpagbu ahụ, ọ ga-ahụ na ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na-enye ezinụlọ ya nri n’oge kwesịrị ekwesị kemgbe. Obi ga-adị Jizọs ụtọ inye ya ọrụ nke abụọ, ya bụ, ịna-elekọta ihe niile o nwere. Mgbe a ga-enye ndị bụ́ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi ọrụ ahụ bụ mgbe a ga-enye ha ụgwọ ọrụ ha n’eluigwe, ha esoro Kraịst na-achị.

19. Ụgwọ ọrụ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi ga-enweta n’eluigwe ọ̀ ga-aka nke ndị ọzọ e tere mmanụ ga-enweta? Kọwaa.

19 Ụgwọ ọrụ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi ga-enweta n’eluigwe ọ̀ ga-aka nke ndị ọzọ e tere mmanụ ga-enweta? Mba. E nwere ike ikwe mmadụ ole na ole nkwa n’otu oge, ma e mechaa, ndị ọzọ esoro ná ndị ga-enweta ihe ahụ e kwere ná nkwa. Dị ka ihe atụ, chegodị banyere ihe Jizọs gwara ndịozi ya iri na otu kwesịrị ntụkwasị obi n’abalị bọtara ụbọchị ọ nwụrụ. (Gụọ Luk 22:28-30.) Jizọs kwere mmadụ ole na ole ahụ nkwa na ha ga-enweta ezigbo ụgwọ ọrụ n’ihi na ha kwesịrị ntụkwasị obi. Ha ga-eso ya bụrụ eze n’eluigwe. Ma mgbe ọtụtụ afọ gachara, o kwuru na ndị niile so n’otu narị puku mmadụ na iri puku anọ na puku anọ ahụ ga-anọkwasị n’ocheeze, soro ya na-achị. (Mkpu. 1:1; 3:21) N’otu aka ahụ, dị ka e kwuru na Matiu 24:47, Jizọs kwere nkwa na ya ga-eme ka mmadụ ole na ole na-elekọta ihe niile o nwere. Mmadụ ole na ole ahụ bụ ụfọdụ n’ime ụmụnna e tere mmanụ, ndị bụ́ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi. N’eziokwu, ndị niile so n’otu narị puku mmadụ na iri puku anọ na puku anọ ahụ ga-eso na-elekọta ihe niile Kraịst nwere.—Mkpu. 20:4, 6.

Ndị niile so n’otu narị puku mmadụ na iri puku anọ na puku anọ ahụ ga-eso Jizọs na-elekọta ihe niile o nwere (A ga-akọwa ya na paragraf nke 19)

20. Gịnị mere Jizọs ji họpụta ohu kwesịrị ntụkwasị obi? Gịnịkwa ka i kpebisiri ike ịna-eme?

20 Jizọs si n’aka ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, na-eme otú ahụ o mere n’oge ndịozi, ya bụ, isi n’aka mmadụ ole na ole na-enye ọtụtụ ndị nri. Ihe mere Jizọs ji họpụta ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ ka e nwee ike ịna-akụziri ezigbo ndị na-eso ụzọ ya okwu Chineke n’oge kwesịrị ekwesị n’oge ikpeazụ a, ma ndị e tere mmanụ ma ndị so n’atụrụ ọzọ. Ka anyị kpebisie ike ịna-egosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe Jizọs na-akụziri anyị. Otú anyị ga-esi eme ya bụ iji obi anyị niile na-akwado ụmụnna ndị ahụ e tere mmanụ, ndị bụ́ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche.—Hib. 13:7, 17.

 

^ para. 2 Paragraf nke 2: Tupu mgbe ahụ, Jizọs nyere ihe atụ yiri ya. Ọ kpọrọ “ohu ahụ” ‘onye na-elekọta ụlọ,’ kpọọkwa “ezinụlọ” ahụ “ìgwè ndị na-ejere ya ozi.”—Luk 12:42-44.

^ para. 6 Paragraf nke 6: Okwu Grik e si sụgharịta ‘ọbịbịa’ Kraịst bụ er′kho·mai. Ọ dị iche n’okwu Grik e si sụgharịta “ọnụnọ” ya, ya bụ, pa·rou·si′a. Ọnụnọ ya a na-agaghị ahụ anya ga-amalite tupu mgbe ọ ga-abịa ibibi ndị ajọ omume.

^ para. 12 Paragraf nke 12: Gụọ isiokwu bụ́ “Lee! M Nọnyeere Unu Ụbọchị Niile,” nke dị n’Ụlọ Nche a, peeji nke 10-12, paragraf nke 5-8.

^ para. 16 Paragraf nke 16: Gụọ isiokwu bụ́ “Gwa Anyị, Olee Mgbe Ihe Ndị A Ga-eme?” nke dị n’Ụlọ Nche a, peeji nke 7-8, paragraf nke 14-18.