Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) Julaị 2013

Ụlọ Nche a kwuru gbasara otú anyị sizi ghọta mgbe ihe ndị Jizọs buru n’amụma gbasara oge ikpeazụ ga-eme nakwa onye bụ́ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche.

“Gwa Anyị, Olee Mgbe Ihe Ndị A Ga-eme?”

Olee ihe ọhụrụ anyị ghọtara banyere mgbe ihe ndị ahụ Jizọs buru n’amụma na Matiu isi iri abụọ na anọ na iri abụọ na ise ga-emezu?

“Lee! M Nọnyeere Unu Ụbọchị Niile”

Ilu ọka wit na ata na-ekwu banyere oge ịkụ mkpụrụ, mgbe mkpụrụ na-eto, na oge owuwe ihe ubi. Gịnị ka anyị ghọtara ugbu a banyere oge owuwe ihe ubi?

Jizọs Si n’Aka Mmadụ Ole na Ole Nye Ọtụtụ Ndị Nri

Olee otú Jizọs si na-akụziri ọgbakọ Ndị Kraịst ihe n’oge ndịozi? Otú o si mee ya n’oge ahụ ọ̀ bụ otú o si eme ya taa?

“Ònye n’Ezie Bụ Ohu ahụ Kwesịrị Ntụkwasị Obi, Onye Nwekwara Uche?”

Isiokwu a ga-eme ka anyị ghọtakwuo ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche. Mata otú ihe ohu ahụ na-akụziri anyị si eme ka okwukwe anyị sie ike.

Onye A Họpụtara Ọhụrụ Ka O Soro n’Òtù Na-achị Isi

A họpụtara Mark Sanderson ka o soro n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova malite n’abalị mbụ n’ọnwa itoolu, n’afọ 2012.

AKỤKỌ NDỤ

Anyị Kpebisiri Ike Ijere Jehova Ozi n’Agbanyeghị Ebe Ọ Bụ

Gụọ otú di na nwunye bụ́ ndị Nedalandz si mụta ịtụkwasị Jehova obi ha niile n’agbanyeghị ihe ndị siiri ha ike na ọrụ a gbanweere ha ugboro ugboro.

“Ihe Osise A Mara Ezigbo Mma!”

Ihe ndị e sere n’akwụkwọ anyị na-akụziri anyị ihe, na-emekwa ka anyị chee echiche. Olee otú ihe osise ndị ahụ magburu onwe ha ga-esi baara anyị uru?