Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Jun 2013

Ndị Okenye, Ùnu Ga-eme Ka “Mkpụrụ Obi Ike Gwụrụ Nwee Ume”?

Ndị Okenye, Ùnu Ga-eme Ka “Mkpụrụ Obi Ike Gwụrụ Nwee Ume”?

E nwere otu nwanna nwaanyị na-alụbeghị di, nke dị ihe karịrị afọ iri atọ. Aha ya bụ Angela. * Ahụ́ eruchaghị ya ala. Ọ na-eche ndị okenye na-abịa ileta ya. Gịnị ka ha ga-agwa ya? N’eziokwu, e nweela ugboro ole na ole ọ na-agaghị ọmụmụ ihe. Ọ na-abụ, o lekọtachaa ndị agadi n’ụbọchị, ike agwụ ya. Ihe ọzọ na-echu ya ụra bụ ọrịa nne ya na-arịa.

Ọ bụrụ na ọ bụ gị na-aga ileta Angela, olee otú ị ga-esi gbaa ‘mkpụrụ obi a ike gwụrụ’ ume? (Jere. 31:25) Oleekwa otú ị ga-esi jikere tupu gị agawa ileta ụdị onye ahụ ka ị gbaa ya ume?

CHEBARA ỌNỌDỤ NWANNA AHỤ ECHICHE

Mgbe ụfọdụ, ike na-agwụcha anyị n’ihi ọrụ anyị ji akpata ego ma ọ bụ n’ihi ihe anyị na-arụ n’ọgbakọ. Dị ka ihe atụ, e nwere mgbe “ike gwụrụ” Daniel onye amụma mgbe e gosiri ya ọhụụ na-ekweghị ya nghọta. (Dan. 8:27) N’oge ọzọ, Chineke zitere mmụọ ozi Gebriel ka ọ bịa nyere Daniel aka. Mmụọ ozi ahụ mere ka ọ ghọta ọhụụ ahụ, meekwa ka obi sie ya ike na Jehova anụla ekpere ya. Ọ gwara Daniel na ọ bụ “onye a hụrụ n’anya nke ukwuu.” (Dan. 9:21-23) E nwekwara mgbe mmụọ ozi ọzọ bịakwutere Daniel mgbe ike gwụrụ ya ma gwa ya ụdị okwu ahụ iji gbaa ya ume.—Dan. 10:19.

Tupu ị gawa ileta nwanna, chebara ọnọdụ ya echiche

I nwere ike ime otú ahụ mgbe ị gara ileta nwanna ike gwụrụ ma ọ bụ onye dara mbà n’obi. Tupu ị gawa, wepụta oge chebara ọnọdụ onye ahụ echiche. Olee nsogbu ndị bịaara ya? Olee otú nsogbu ndị ahụ nwere ike isi na-eme ka ike na-agwụ ya? Olee àgwà ọma ndị o nwere? E nwere otu nwanna aha ya bụ Richard. Ọ bụ okenye kemgbe ihe karịrị afọ iri  abụọ. O kwuru, sị: “M na-agbalị iche banyere àgwà ọma ụmụnna m na-akpa. Tupu mụ agawa ileta nwanna ọ bụla, m na-ebu ụzọ chebara ọnọdụ ya echiche. Ọ na-eme ka ọ dịrị m mfe ịmata otú m ga-esi gbaa ya ume otú kwesịrị ekwesị.” Ọ bụrụ na okenye ọzọ ga-eso gị aga, ọ ga-adị mma ka gị na ya chebara ọnọdụ nwanna ahụ echiche tupu unu agawa.

MEE KA OBI RUO NWANNA AHỤ ALA

I nwere ike ikweta na ihere nwere ike ịna-eme mmadụ ịkọrọ onye ọzọ ihe dị ya n’obi. Dị ka ihe atụ, o nwere ike isiri nwanna ike ịgwa ndị okenye bịara ileta ya ihe bụ́ nsogbu ya. Olee otú ị ga-esi mee ka obi ruo ya ala? Ọ bụrụ na ị mụmụọrọ ya ọnụ ọchị ma gwa ya okwu ga-eme ka obi sie ya ike, o nwere ike ịba ezigbo uru. E nwere otu nwanna aha ya bụ Michael. Ọ bụ okenye kemgbe ihe karịrị afọ iri anọ. E nwee nwanna ọ gara ileta, ihe ọ na-ebukarị ụzọ ekwu bụ: “Otu n’ime ihe ùgwù kacha mma ndị okenye nwere bụ ịga n’ụlọ ụmụnna ha ka ha matakwuo ha. N’ihi ya, m nọ na-atụsi anya ike ịbịa leta gị taa.”

Unu nwere ike iji ekpere si n’ala ala obi malite. N’ekpere ahụ, i nwere ike ikwu àgwà ọma nwanna ahụ nwere, dị ka okwukwe, ịhụnanya, na ntachi obi. Ọ bụ ihe Pọl onyeozi mere mgbe o chetara ụmụnna ya n’ekpere. (1 Tesa. 1:2, 3) Mgbe ị na-ekpe ụdị ekpere ahụ, ị na-akwadebe obi gị na obi onye ahụ maka ezigbo mkparịta ụka unu ga-enwe. Ihe ị ga-agwa ya nwekwara ike ịgba ya ume. Otu nwanna aha ya bụ Ray, onye bụ́ okenye kemgbe ọtụtụ afọ, kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, anyị na-echefukarị ihe ọma ndị anyị na-arụ n’ozi Chineke. N’ihi ya, ọ bụrụ na mmadụ echetara anyị ya, ọ ga-eme ka mkpụrụ obi anyị nwee ume.”

JIRI BAỊBỤL GBAA ONYE AHỤ UME

Pọl nyere Ndị Kraịst ibe ya “onyinye ime mmụọ.” I nwekwara ike ime otú ahụ ma i jiri Baịbụl gbaa nwanna ume. O nwedịrị ike ịbụ naanị otu amaokwu Baịbụl ka ị ga-agụrụ ya. (Rom 1:11) Dị ka ihe atụ, nwanna nke dara mbà n’obi nwere ike iche na ya abaghị uru otú ahụ ọbụ abụ si jiri onwe ya tụnyere “karama  akpụkpọ a kwụwara n’uko ọkụ.” (Ọma 119:83, 176) Mgbe ị kọwachara ihe ahụ ọbụ abụ kwuru, i nwere ike ịgwa nwanna ahụ na obi siri gị ike na o ‘chefubeghị’ ihe Chineke nyere n’iwu.

E nwee nwanna nwaanyị nke hapụrụ ọg̣bakọ kpafuo ma ọ bụ nke na-anaghịzi anụ ọkụ n’obi n’ozi Chineke, ọ̀ bụ na ihe atụ ahụ Jizọs ji mkpụrụ ego drakma furu efu mee agaghị eru ya n’obi? (Luk 15:8-10) O nwere ike ịbụ na mkpụrụ ego ahụ furu efu so n’ọtụtụ mkpụrụ ego ọlaọcha ndị e ji rụọ ọmarịcha ihe olu. Ka ị na-akọwara nwanna nwaanyị ahụ ihe atụ ahụ, i nwere ike inyere ya aka ịghọta na ọ baara ọgbakọ ezigbo uru. I nwekwara ike ime ka o doo ya anya na o so n’ụmụ atụrụ Jehova hụrụ n’anya.

Obi na-adịkarị ụmụnna anyị ụtọ ikwu banyere ihe ha mụtara na Baịbụl. N’ihi ya, naanị gị ekwula ihe niile. Mgbe ị gụchara amaokwu Baịbụl gbasara onye ahụ, i nwere ike ịhọrọ otu okwu ma ọ bụ ahịrịokwu ma gwa ya ka o kwuo ihe o chere banyere ya. Dị ka ihe atụ, mgbe okenye gụchara 2 Ndị Kọrịnt 4:16, o nwere ike ịjụ, sị, “Ị̀ hụla ụzọ ụfọdụ Jehova sirila mee ka ị na-adị ọhụrụ kwa ụbọchị?” Ụdị ajụjụ a nwere ike ime ka mkparịta ụka ahụ gbaa gị na onye ahụ ume.—Rom 1:12.

Obi na-adịkarị ụmụnna anyị ụtọ ikwu banyere ihe ha mụtara na Baịbụl

Otú ọzọ i nwere ike isi gbaa nwanna gị ume bụ ịgwa ya banyere onye Baịbụl kọrọ akụkọ ya nke nwere ụdị nsogbu yanwa nwere. Ọ bụrụ onye dara mbà n’obi, o nwere ike ịdị ya otú ahụ ọ dị Hana ma ọ bụ Epafrọdaịtọs. Obi dara ha mbà mgbe ụfọdụ. Ma, o meghị ka Chineke ghara iji ha kpọrọ ihe. (1 Sam. 1:9-11, 20; Fil. 2:25-30) E nwere ọtụtụ ndị ọzọ Baịbụl kọrọ akụkọ ha. I nwere ike iji ihe mere ha gbaa onye ụdị ihe ahụ mere ume.

NA-EGOSI NA Ị HỤRỤ NWANNA GỊ N’ANYA

I letachaa nwanna, na-egosi na ihe banyere ya na-emetụ gị n’obi. (Ọrụ 15:36) Tupu ị lawa, o nwere ike ịdị mma ka gị na ya kpebie mgbe unu ga-eso gaa ozi ọma. E nwere otu nwanna bụ́ okenye kemgbe ọtụtụ afọ. Aha ya bụ Bernard. Ọ na-abụ, ọ hụ nwanna o letara n’oge na-adịbeghị anya, ya ejiri akọ jụọ ya banyere ndụmọdụ e nyere ya, sị, “Biko, ndụmọdụ ahụ ò mechara baara gị uru?” Ọ bụrụ na ị na-esi otú ahụ egosi na ihe banyere nwanna gị na-emetụ gị n’obi, ị ga-enwe ike ịmata ma ì kwesịrị inyekwuru ya aka.

Ọ bụ ugbu a ka ọ kacha dị mkpa ka ndị okenye mee ka ụmụnna ha ghọta na ihe banyere ha na-emetụ ha n’obi nakwa na ndị okenye ghọtara nsogbu ha ma hụ ha n’anya. (1 Tesa. 5:11) N’ihi ya, tupu ị gawara nwanna gị nleta ọzụzụ atụrụ, wepụta oge chebara ọnọdụ ya echiche. Tinye ya n’ekpere. Họrọ amaokwu Baịbụl ndị ị ga-agụrụ onye ahụ. I mee ihe ndị a, ị ga-amata ihe i kwesịrị ikwu iji mee ka “mkpụrụ obi ike gwụrụ” nwee ume.

^ para. 2 Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.