Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Jun 2013

Ghọta na Jehova Na-emesapụ Aka, Nweekwa Ezi Uche

Ghọta na Jehova Na-emesapụ Aka, Nweekwa Ezi Uche

“Jehova dị mma n’ebe ihe niile o kere eke nọ, ebere ya na-erutekwa ọrụ ya niile.”—ỌMA 145:9.

1, 2. Olee ihe ndị enyi Jehova ga-enwe ike ime ruo mgbe ebighị ebi?

OTU nwanna nwaanyị aha ya bụ Monika kwuru, sị: “Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na mụ na di m ebiela afọ iri atọ na ise. Anyị abụọ ma ibe anyị nke ọma. Ma, n’agbanyeghị na ọtụtụ afọ agaala, anyị ka na-amụta ihe ndị anyị na-amabughị banyere ibe anyị!” O doro anya na ọ bụ otú ahụ ka ọ dị ọtụtụ di na nwunye na ndị enyi.

2 Obi na-adị anyị ụtọ ịmatakwu ndị anyị hụrụ n’anya. Ma, anyị na Jehova ịbụ enyi dị mkpa karịa anyị na mmadụ ọ bụla ịbụ enyi. Anyị agaghị enwe ike ịmatacha ihe niile banyere Jehova. (Rom 11:33) Anyị ga-enwe ike ịmụ banyere àgwà Jehova ruo mgbe ebighị ebi. Anyị ga na-enwekwa ọṅụ ka anyị na-amụta uru àgwà ndị ahụ bara.—Ekli. 3:11.

3. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?

3 Isiokwu bu nke a ụzọ nyeere anyị aka ịghọta na Jehova dị mfe mbịakwute nakwa na ọ naghị ele mmadụ anya n’ihu. Ka anyị tụlee àgwà abụọ ọzọ magburu onwe ha Jehova nwere, ya bụ, na Jehova na-emesapụ aka nakwa na o nwere ezi uche. Ịtụle àgwà ndị a ga-eme ka anyị mata na “Jehova dị mma n’ebe ihe niile o kere eke nọ, ebere ya na-erutekwa ọrụ ya niile.”—Ọma 145:9.

JEHOVA NA-EMESAPỤ AKA

4. Gịnị ka imesapụ aka pụtara?

4 Gịnị ka imesapụ aka pụtara? Ihe Jizọs kwuru nke e dere n’Ọrụ Ndịozi isi iri abụọ, amaokwu iri atọ na ise, ga-enyere anyị aka ịghọta ihe ọ pụtara. Ebe ahụ kwuru, sị: “A na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.” Onye na-emesapụ aka bụ onye obi na-adị ụtọ iji ego ya ma ọ bụ ike ya ma ọ bụkwanụ ihe ọzọ o nwere enyere ndị ọzọ  aka. N’eziokwu, ihe e ji ama onye na-emesapụ aka abụghị ihe ole o nyere, kama ọ bụ ihe o bu n’obi nye mmadụ ihe. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 9:7.) E nweghị onye na-emesapụ aka ka Jehova, bụ́ ‘Chineke obi ụtọ.’—1 Tim. 1:11.

5. Olee otú Jehova si emesapụrụ ụmụ mmadụ aka?

5 Olee otú Jehova si emesapụ aka? Ọ na-enye mmadụ niile ihe na-akpa ha, ma ndị na-efe ya ma ndị na-adịghị efe ya. Baịbụl kwuru, sị: “Jehova dị mma n’ebe ihe niile o kere eke nọ.” Ọ “na-eme ka anyanwụ ya waara ndị ọjọọ na ndị ọma, na-emekwa ka mmiri zooro ndị ezi omume na ndị ajọ omume.” (Mat. 5:45) Ọ bụ ya mere Pọl onyeozi ji gwa ndị na-abụghị Ndị Kraịst na Jehova ‘na-eme ihe ọma, na-enye ha mmiri ozuzo site n’eluigwe, na oge mkpụrụ ji amị, na-enye ha nri n’ụba, na-emekwa ka ha nwee obi ụtọ.’ (Ọrụ 14:17) O doro anya na Jehova na-emesapụrụ mmadụ niile aka.—Luk 6:35.

6, 7. (a) Olee ndị obi na-akacha adị Jehova ụtọ igboro mkpa ha? (b) Nye ihe atụ gosiri otú Chineke si egboro ndị ji obi ha niile na-efe ya mkpa ha.

6 Obi na-akacha adị Jehova ụtọ igboro ndị ji obi ha niile na-efe ya mkpa ha. Eze Devid kwuru, sị: “Ọ dị mgbe m bụ nwata, emewokwa m agadi, ma ahụbeghị m ka a hapụrụ onye ọ bụla bụ́ onye ezi omume kpamkpam, ahụbeghịkwa m ụmụ ya ka ha na-arịọ nri.” (Ọma 37:25) Ọtụtụ Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi achọpụtala na Jehova na-egboro ha mkpa ha. Ka anyị tụlee otu ihe atụ.

7 E nwere otu nwanna nwaanyị bụ́ ọsụ ụzọ aha ya bụ Nancy. Ihe siiri ya ike afọ ole na ole gara aga. Ọ chọrọ dọla iri isii na isii [ya bụ, ihe dị ka puku naịra iri] ọ ga-eji kwụọ ụgwọ ụlọ n’echi ya. Ma ọ maghị otú ọ ga-esi nweta ego ahụ. O kwuru, sị: “Etinyere m ya n’ekpere, gaa rụwa ọrụ m n’ebe a na-ere nri. Atụghị m anya ịnata onyinye buru ibu ná mgbede ahụ n’ihi na ọtụtụ ndị anaghị abịakarị eri nri n’ebe ahụ n’ụdị oge ahụ n’izu. O juru m anya na ọtụtụ ndị bịara rie nri ná mgbede ahụ n’ebe ahụ. Mgbe m mechiri ọrụ, gụkọọ ego niile ndị mmadụ nyere m, ha niile dị dọla iri isii na isii.” Obi siri nwanna nwaanyị a ike na Jehova meere ya amara, mee ka o nweta ego ole dị ya mkpa.—Mat. 6:33.

8. Olee onyinye kachanụ Jehova nyere anyị?

8 E nwere onyinye kachanụ Jehova nyere mmadụ niile. Gịnị ka ọ bụ? Ọ bụ àjà ahụ o ji Ọkpara ya chụọ. Jizọs kwuru, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) “Ụwa” e kwuru okwu ya n’amaokwu a bụ ụmụ mmadụ. N’eziokwu, ndị niile chọrọnụ ga-enweta onyinye ahụ kachanụ Jehova nyere anyị. Ndị nwere okwukwe na Jizọs ga-enweta ndụ na-agaghị agwụ agwụ, ya bụ, ndụ ebighị ebi. (Jọn 10:10) N’eziokwu, ọ bụ ihe a Jehova mere kacha gosi na ọ na-emesapụ aka.

 NA-EMESAPỤ AKA KA JEHOVA

Jehova gbara ndị Izrel ume ka ha na-emesapụ aka ka ya (Paragraf nke 9)

9. Olee otú anyị ga-esi na-emesapụ aka ka Jehova?

 9 Olee otú anyị ga-esi na-emesapụ aka ka Jehova? Jehova “na-enye anyị ihe niile n’ụba ka anyị wee nwee ọṅụ.” N’ihi ya, anyị kwesịrị ‘ịdị njikere inye ndị ọzọ ihe.’ Anyị ga-esi otú ahụ mee ka ha nwee ọṅụ. (1 Tim. 6:17-19) Obi na-adị anyị ụtọ iji ihe anyị nwere nye ndị anyị hụrụ n’anya onyinye, jirikwa ya na-enyere ndị ihe na-esiri ike aka. (Gụọ Diuterọnọmi 15:7.) Gịnị ga-enyere anyị aka icheta ịna-emesapụ aka? Ihe ụmụnna ụfọdụ na-eme bụ: Mgbe ọ bụla e nyere ha onyinye, ha na-achọ otú ha ga-esi nye onye ọzọ onyinye. N’ọgbakọ Ndị Kraịst, e nwere ọtụtụ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị na-emesapụ aka.

10. Olee ụzọ kacha mma anyị nwere ike isi na-emesapụ aka?

10 Otu ụzọ kacha mma anyị ga-esi na-emesapụ aka bụ iwepụta onwe anyị inyere ndị ọzọ aka ma n’okwu ọnụ ma n’omume. Olee otú anyị ga-esi mee ya? Ọ bụ iji oge anyị na ike anyị na-enyere ndị ọzọ aka, na-agbakwa ha ume. (Gal. 6:10) Anyị chọọ ịma ma ànyị na-emekwa otú ahụ, anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘Ndị ọzọ hà ghọtara na m na-ewepụta onwe m inyere ndị ọzọ aka, na-egekwa ha ntị? Ọ bụrụ na mmadụ arịọ m ka m nyere ya aka ma ọ bụ gaara ya ozi, m̀ na-ekwe eme ya ma ọ bụrụ na m ga-emeli ya? Olee mgbe ikpeazụ m ji obi m niile jaa onye ezinụlọ anyị ma ọ bụ nwanna ọzọ mma?’ Ọ bụrụ na anyị ‘na-enye’ ndị ọzọ ihe, ọ ga-eme ka anyị na Jehova na ndị enyi anyị dịkwuo ná mma.—Luk 6:38; Ilu 19:17.

11. Olee ụzọ ụfọdụ anyị nwere ike isi na-emesapụrụ Jehova aka?

 11 Anyị kwesịkwara ịna-emesapụrụ Jehova aka. Baịbụl gbara anyị ume ka anyị ‘jiri ihe anyị ndị dị oké ọnụ ahịa sọpụrụ Jehova.’ (Ilu 3:9) ‘Ihe ndị ahụ dị oké ọnụ  ahịa’ bụ ma oge anyị ma ike anyị ma akụ̀ anyị, bụ́ ihe ndị anyị nwere ike iji jeere ya ozi. Ụmụaka nwedịrị ike ịmụta ịna-emesapụrụ Jehova aka. Otu nna aha ya bụ Jason kwuru, sị: “Mgbe ọ bụla ezinụlọ anyị chọrọ itinye ego n’igbe onyinye dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, anyị na-enye ya ụmụ anyị ka ha tinye ya. Ọ na-atọ ha ụtọ itinye ego n’ebe ahụ n’ihi na ha kwuru na ha ‘na-enye Jehova ihe.’” Ọ bụrụ na ụmụaka aghọta na inye Jehova onyinye na-eme ka ha nwee obi ụtọ, ha ga na-emesapụrụ Jehova aka ma ha too.—Ilu 22:6.

JEHOVA NWERE EZI UCHE

12. Gịnị ka inwe ezi uche pụtara?

12 Àgwà ọzọ magburu onwe ya Jehova nwere bụ ezi uche. Gịnị ka inwe ezi uche pụtara? Okwu Grik e si sụgharịta “ezi uche” pụtara esighị ọnwụ. (Taị. 3:1, 2) Onye nwere ezi uche anaghị esi ọnwụ ka e mee ihe niile e dere n’iwu. Ọ bụghị ekwe ekwe, ihu atọ ọchị ma ọ bụ onye aka ike. Kama, ọ na-agbalị iji nwayọọ emeso ndị ọzọ, na-echebakwara otú ihe dịịrị ndị ọzọ echiche. Ọ na-adị njikere ige ndị ọzọ ntị. Mgbe ọ bụla o kwere omume, ọ na-ekwekwa ka ha nweta ma ọ bụ mee ihe ha chọrọ.

13, 14. (a) Olee otú Jehova si egosi na ya nwere ezi uche? (b) Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta banyere ezi uche n’ihe Chineke meere Lọt?

13 Olee otú Jehova si egosi na ya nwere ezi uche? Ọ na-echebara otú obi dị ndị ohu ya echiche. Ọtụtụ mgbe, ọ na-emere ha ihe ha rịọrọ ya. Dị ka ihe atụ, chegodị ihe Jehova meere Lọt bụ́ onye ezi omume. Mgbe Jehova kpebiri ibibi obodo Sọdọm na Gọmọra, ọ gwara Lọt ka ọ gbaga n’ebe bụ́ ugwu ugwu. Ma, Lọt rịọrọ Jehova ka o kwe ka ya gbaga ebe ọzọ. Chegodị echiche. Ihe Lọt kwuru bụ ka Jehova gbanwee iwu o nyere ya.—Gụọ Jenesis 19:17-20.

14 Mmadụ gụọ akụkọ ahụ, o nwere ike iche na okwukwe Lọt esighị ike ma ọ bụ na ọ na-enupụ isi. A sị ka e kwuwe, o doro anya na Jehova ga-echebe Lọt n’ebe ọ bụla ọ nọ. N’ihi ya, o kwesịghị ịtụwa ụjọ. Ma, ụjọ tụrụ Lọt. Jehova ghọtakwara otú obi dị Lọt ma kwe ka ọ gbaga n’obodo ọzọ n’agbanyeghị na ọ chọburu ibibi obodo ahụ. (Gụọ Jenesis 19:21, 22.) O doro anya na Jehova abụghị ekwe ekwe, ọ dịghịkwa aka ike. O nwere ezi uche. Ọ naghị esi ọnwụ.

15, 16. Olee otú iwu Mozis si gosi na Jehova nwere ezi uche? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

15 Ka anyị tụlee ihe Jehova kwuru n’Iwu Mozis, nke bụ́ ihe ọzọ gosiri na o nwere ezi uche. Ọ bụrụ na onye Izrel dara ogbenye nke na ọ gaghị ejili nwa atụrụ ma ọ bụ ewu chụọ àjà, o nwere ike iweta nduru abụọ ma ọ bụ kpalakwukwu abụọ. Gịnịkwanụ ka onye Izrel bụ́ ogbenye ga-eme ma ọ bụrụ na ọ gaghị ewetali kpalakwukwu abụọ? Jehova kwuru na o nwere ike iweta obere ntụ ọka. Ma, echefula otu ihe dị mkpa Baịbụl kwuru banyere ntụ ọka ahụ. O kwuru na o kwesịrị ịbụ ‘ntụ ọka e gwere nke ọma,’ nke a na-eji ele ndị ọbịa pụrụ iche ọbịa, ọ bụghị ụdị ntụ ọka ọ bụla. (Jen. 18:6) Gịnị mere ihe a e kwuru ji dị mkpa?—Gụọ Levitikọs 5:7, 11.

16 Ka e were ya na ị bụ onye Izrel dara ogbenye. Ka i ji obere ntụ ọka bịa ịchụ àjà n’ụlọikwuu, ị hụrụ ndị Izrel ndị ọzọ bara ọgaranya ka ha kpụ anụ ụlọ bịa. Ntụ ọka gị ahụ nwere ike ịna-eme gị ihere. Ma, i chetara ozugbo na ntụ ọka ahụ ị chọrọ iji chụọ àjà bara uru n’anya Jehova. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na iwu Jehova kwuru na ntụ ọka ahụ kwesịrị ịbụ nke kacha mma. Ọ dị ka à ga-asị na Jehova na-agwa ndị dara ogbenye n’Izrel, sị: ‘Aghọtara m na ị gaghị ewetali ihe ndị ọzọ na-eweta. Ma, amakwa m na ihe ị na-enye m bụ ihe kacha mma i nwere.’ Ihe a gosiri na Jehova nwere ezi uche. Ọ na-eme ihe gosiri na ọ ma ihe ndị ohu ya  na-agaghị emeli nakwa otú ihe dịịrị ha.—Ọma 103:14.

17. Olee ụdị ofufe Jehova na-anabata?

 17 Obi na-adị anyị ụtọ na Jehova nwere ezi uche nakwa na ọ na-anabata ofufe anyị ji obi anyị niile na-efe ya. (Kọl. 3:23) E nwere otu nwanna nwaanyị merela agadi aha ya bụ Constance. Ọ bụ onye Ịtali. O kwuru, sị: “Ihe na-akacha atọ m ụtọ kemgbe ụwa bụ ịgwa ndị ọzọ banyere Onye kere m. Ọ bụ ya mere m ji na-ekwusa ozi ọma, na-amụkwara ndị mmadụ Baịbụl. Ọ na-ewute m mgbe ụfọdụ na ọrịa anaghị ekwe m jekwuoro Chineke ozi. Ma, ama m na Jehova ma ihe m na-agaghị emeli nakwa na ọ hụrụ m n’anya, ozi m na-ejere ya na-emekwa ya obi ụtọ.”

NWEE EZI UCHE KA JEHOVA

18. Olee otu ụzọ ndị nne na nna nwere ike isi gosi na ha nwere ezi uche ka Jehova?

18 Olee otú anyị nwere ike isi nwee ezi uche ka Jehova? Chegodị echiche ọzọ banyere ihe ahụ Jehova meere Lọt. Ọ bụ Jehova kwesịrị ịgwa Lọt ebe ọ ga-agbaga. Ma, o weturu obi gee Lọt ntị ka ọ na-ekwu otú obi dị ya, kwekwa ka Lọt gaa ebe ọ chọrọ ịga. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, ì nwere ike ime ụdị ihe ahụ Jehova mere? Ì nwere ike ige ntị n’ihe ụmụ gị na-arịọ gị ma kwe ka ha mee ya ma ọ bụrụ na ọ bụghị ihe ọjọọ? Olee otú ị ga-esi mee ya? Ụlọ Nche September 1, 2007, kwuru na ndị nne na nna nwere ike ịgwa ụmụ ha ka ha tinye ọnụ mgbe ha na-ekpebi iwu onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ ha ga na-erubere isi. Dị ka ihe atụ, ndị nne na nna nwere ike ikpebi mgbe ụmụ ha ga na-alọta. N’eziokwu, ọ bụ ha kwesịrị ikpebi mgbe ụmụ ha ga na-alọta ná mgbede. Ma, ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst nwere ike ige ntị n’ihe ụmụ ha chọrọ ikwu banyere oge ha kwesịrị ịna-alọta. Mgbe ụfọdụ, ha nwere ike ịgbanwe mgbe ha gwara ụmụ ha ka ha na-alọta ma ọ bụrụ na o kwesịrị ekwesị. Tupu ndị nne na nna emee iwu onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ ga na-erubere isi, ọ ga-adị mma ka ha na ụmụ ha buru ụzọ kwurịta ya. O nwere ike ime ka ụmụ ha ghọta ihe mere e ji nye iwu ahụ, ha erubekwara ya isi.

19. Olee otú ndị okenye si agbalị inwe ezi uche ka Jehova?

19 Ndị okenye ọgbakọ na-agbalị inwe ezi uche ka Jehova. Otú ha si eme ya bụ ịna-echebara otú ihe dịịrị ụmụnna ha echiche. Cheta na Jehova ji àjà ndị ogbenye chụrụ n’Izrel oge ochie kpọrọ ihe. Otú ahụkwa ka ọ dị taa. E nwere ụmụnna ndị na-anaghị eji ọtụtụ awa aga ozi ọma, ikekwe n’ihi ọrịa ma ọ bụ nká. Gịnị ka a ga-eme ma ọ bụrụ na obi na-ada ụmụnna ndị ahụ mbà n’ihi na nsogbu ekweghị ha jeere Chineke ozi otú ha chọrọ? Ndị okenye nwere ike iwetu obi mesie ha obi ike na Jehova hụrụ ha n’anya ma ọ bụrụhaala na ha ji obi ha niile na-ejere ya ozi.—Mak 12:41-44.

20. Inwe ezi uche ọ̀ pụtara ịhapụ ihe anyị kwesịrị ime n’ozi Chineke? Kọwaa.

20 N’eziokwu, anyị ekwesịghị iche na inwe ezi uche pụtara ịhapụ ime ihe anyị kwesịrị ime n’ozi Chineke, na-emere onwe anyị ebere. (Mat. 16:22) Anyị ekwesịghị ịdị umengwụ n’ozi Jehova ma na-ekwu na o nweghị ihe o mere, na ihe anyị na-eme gosiri na anyị nwere ezi uche. Kama ime otú ahụ, anyị niile kwesịrị ‘ịgbalịsi ike’ na-akwado ihe gbasara Alaeze Chineke. (Luk 13:24) N’eziokwu, e nwere ihe abụọ anyị kwesịrị iburu n’obi. Nke mbụ bụ na anyị kwesịrị ịna-agbasi mbọ ike, n’ahapụghị ihe anyị kwesịrị ime n’ozi Chineke. Nke abụọ abụrụ na Jehova anaghị agwa anyị mee ihe ọ ma na anyị agaghị emeli. Ọ bụrụ na anyị ejiri ike anyị niile na-ejere ya ozi, obi kwesịrị isi anyị ike na obi ga-adị ya ụtọ. Ọ̀ bụ na obi adịghị anyị ụtọ na anyị na-efe Chineke, bụ́ onye nwere ezi uche? N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-atụle àgwà abụọ ọzọ magburu onwe ha Jehova nwere.—Ọma 73:28.

“Jiri ihe gị ndị dị oké ọnụ ahịa sọpụrụ Jehova.”—Ilu 3:9 (Paragraf nke 11)

“Ihe ọ bụla unu na-eme, jirinụ mkpụrụ obi dum na-eme ya.”—Kọl. 3:23 (Paragraf nke 17)