Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JUN 2013

 AKỤKỌ NDỤ

Irubere Jehova Isi Emeela Ka M Nweta Ọtụtụ Ngọzi

Irubere Jehova Isi Emeela Ka M Nweta Ọtụtụ Ngọzi

M ka chetara ụbọchị papa m nọ na-agwa mụ na ụmụnne m, sị: “Ihe Noa mere na-akụziri anyị ezigbo ihe. Noa rubeere Jehova isi, hụkwa ezinụlọ ya n’anya. Iju Mmiri ahụ egbughị onye ọ bụla n’ime ha n’ihi na ha niile banyere n’ụgbọ ahụ.”

IHE a so n’ihe ndị m ji anya ụmụaka echeta banyere papa m. Papa m bụ nwoke dị umeala n’obi, ọ na-arụsikwa ọrụ ike. Ọ naghị achọ ka e megbuo mmadụ. N’ihi ya, mgbe ọ nụrụ ozi ọma si na Baịbụl n’afọ 1953, ọ nabatara ya ozugbo. Malite mgbe ahụ, ọ gbalịsiri ike ịkụziri mụ na ụmụnne m ihe ndị ọ na-amụta. Mgbe ahụ, mama m achọghị ịhapụ chọọchị Katọlik. Ma ka oge na-aga, ọ malitere ikweta ihe Baịbụl na-akụzi.

Mama m amachaghị agụ ihe, papa m na-arụsikwa ọrụ ike n’ugbo ruo ọtụtụ awa kwa ụbọchị. N’ihi ya, ọ naghị adịrị ha mfe ịmụrụ anyị ihe. Oge ụfọdụ, ụra na-eburu papa m mgbe anyị na-amụ ihe n’ihi otú ike si gwụ ya. Ma, mgbalị ya niile efughị ọhịa. M nyere aka kụziere nwanne m nwaanyị na ụmụnne m ndị nwoke abụọ ihe n’ihi na ọ bụ m tọrọ ha. Anyị na-amụkarị otú Noa si hụ ezinụlọ ya n’anya ma rubere Chineke isi. Akụkọ ahụ na-atọgbu m atọgbu. Obere oge anyị malitechara ịmụ Baịbụl n’ezinụlọ anyị, anyị niile malitere ịga ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị n’obodo Rozeto delyi Abrọtsi, nke dị n’Ịtali, n’ụsọ Oké Osimiri Edria.

N’afọ 1955, mụ na mama m rịrị ọtụtụ ugwu gaa mgbakọ mbụ anyị na Rom. Adị m naanị afọ iri na otu mgbe ahụ. Kemgbe ahụ, ịga mgbakọ so n’ihe ndị na-atọ m ezigbo ụtọ ná nzukọ Jehova.

E mere m baptizim n’afọ 1956. Amalitere m ịsụ ụzọ oge niile ka obere oge gachara. Mgbe m dị afọ iri na asaa, aghọrọ m ọsụ ụzọ pụrụ iche n’obodo Latina nke dị n’ebe ndịda Rom. Isi n’ebe anyị bi gaa Latina dị ihe dị ka narị kilomita atọ. N’oge ahụ, ọtụtụ ndị ka kwafetara ọhụrụ n’obodo ahụ. Ọ bụ ya mere na ha anaghị eche maka ihe ndị agbata obi ha ga-ekwu ma ha nabata eziokwu. N’ihi ya, ọ dịịrị ndị mmadụ mfe ịnara mụ na ọsụ ụzọ mụ na ya na-ejekọ ozi akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl. N’agbanyeghị na ozi m na-eje n’ebe ahụ na-atọ m ụtọ, m ka na-eto eto n’oge ahụ, ụlọ anyị na-agụkwa m agụụ. Ma, ihe nyeere m aka bụ icheta na Jehova chọrọ ka m nọrọ ebe ahụ, achọkwara m irubere ya isi.

Ụbọchị anyị gbara akwụkwọ

E mechara ziga m n’obodo Milan ka m gaa nye aka kwadebe ebe a ga-anọ mee mgbakọ mba niile n’afọ 1963, nke isiokwu  ya bụ “Ozi Ọma Ebighị Ebi.” Ná mgbakọ ahụ, mụ na ọtụtụ ụmụnna ndị ọzọ wepụtara onwe anyị rụọ ọrụ. Otu n’ime ha bụ otu nwanna nwoke aha ya bụ Paolo Piccioli. O si n’obodo a na-akpọ Flọrens. N’ụbọchị nke abụọ ná mgbakọ ahụ, o kwuru ọmarịcha okwu gbasara otú ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye nwere ike isi na-ewepụtakwu oge ejere Jehova ozi. Ihe m nọ na-eche mgbe ahụ bụ: ‘O doro anya na nwanna a agaghị alụ nwaanyị.’ Ma mgbe mgbakọ ahụ mechiri, anyị malitere idegara ibe anyị akwụkwọ ozi. Mụ na ya chọpụtara na ihe anyị kpebiri ime n’ozi Chineke bụ otu ihe, na anyị abụọ ji obi anyị niile hụ Jehova n’anya nakwa na anyị chọrọ ịna-erubere ya isi. N’ihi ya, mụ na Paolo gbara akwụkwọ n’afọ 1965.

MKPARỊTA ỤKA ANYỊ NA NDỊ ỤKỌCHUKWU

Asụrụ m ụzọ n’obodo Flọrens ruo afọ iri. Obi tọrọ m ezigbo ụtọ ịhụ ka ọtụtụ ndị na-abata n’ọgbakọ. Ihe kacha mee m obi ụtọ bụ ịhụ ka ọtụtụ ndị na-eto eto na-eme nke ọma n’ọgbakọ. Mụ na Paolo na ndị na-eto eto na-ekwurịta ihe ndi dị na Baịbụl, na-atụrụkwa ndụ. Ha na Paolo na-agbakarị bọl. N’eziokwu, m na-achọ ka mụ na di m na-anọrị, ma m ghọtara na oge ya na ndị ahụ na-eto eto na ezinụlọ ndị e nwere n’ọgbakọ anyị ji anọrị na-abara ha uru, ha chọkwara ka ọ na-enyere ha aka.

Obi ka na-atọ m ezigbo ụtọ ma m cheta ọtụtụ ndị anyị mụụrụ Baịbụl. Otu n’ime ha bụ otu nwaanyị aha ya bụ Adriana. Ọ gwara ezinụlọ abụọ ọzọ ihe ọ na-amụta na Baịbụl. Ezinụlọ abụọ ahụ mere ndokwa ka ha na otu ụkọchukwu nọkọọ ma kwurịta banyere ụfọdụ ihe a na-akụziri ha na chọọchị, dị ka ozizi Atọ n’Ime Otu nakwa na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ. Ndị ụkọchukwu atọ bịara nnọkọ ahụ. Otú ha si kọwaa ozizi ndị ahụ gbara ndị ahụ anyị na-amụrụ ihe gharịị, meekwa ka ọ dịrị ha mfe ịghọta na ihe ndị ụkọchukwu ahụ na-akụziri ha dị iche n’ihe Baịbụl na-akụzi. N’eziokwu, nnọkọ ahụ mere ka anya doo ndị ahụ. Ka oge na-aga, ihe dị ka mmadụ iri na ise, ndị si n’ezinụlọ ndị ahụ, ghọrọ Ndịàmà Jehova.

Otú anyị si ekwusa ozi ọma ugbu a agbanweela. N’oge ahụ, Paolo na ndị ụkọchukwu kwurịtara ihe gbasara Baịbụl ugboro ugboro. Ọ ghọkwara “aka ochie” n’ụdị mkparịta ụka ahụ. M chetara otu mgbe ya na ha kparịtara ụdị ụka ahụ n’ebe ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova juru. O mechara doo anya na ndị ụkọchukwu ahụ gwara ụfọdụ ndị ka ha jụọ ajụjụ ga-emenye Paolo ihere. Ma, egwú dagharịrị. Otu onye jụrụ ma ndị chọọchị hà kwesịrị ịna-etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị otú ahụ ha na-eme kemgbe ọtụtụ narị afọ. O doro anya na ndị ụkọchukwu ahụ amaghị otú ha ga-esi zaa ajụjụ ahụ. Ọkụ eletrik nyụrụ na mberede, mee ka a gbasaa nnọkọ ahụ n’ike. Ka afọ ole na ole gara, anyị chọpụtara na e nwere onye ndị ụkọchukwu ahụ gwara ka ọ gbanyụọ  ọkụ ma ọ bụrụ na nnọkọ ahụ agaghị otú ha chọrọ.

ỌRỤ ỌHỤRỤ NDỊ E NYERE ANYỊ

Afọ iri ka mụ na di m lụchara, a kpọrọ ya ka ọ bụrụ onye nlekọta sekit. Ikweta ịrụ ọrụ ahụ adịrịghị anyị mfe n’ihi na Paolo na-arụ ọrụ na-enye ya ezigbo ego. Ma, mgbe anyị kpere ekpere ọtụtụ ugboro, anyị kpebiri ịrụ ya. E nwere ọtụtụ ezinụlọ anyị na-anọ n’ụlọ ha. Obi na-adị anyị ụtọ mgbe anyị na ha na-anọrị. Ná mgbede, anyị niile na-amụkọ ihe ọnụ. Anyị mụchaa, Paolo na-enyere ụmụ ha aka rụọ ọrụ onye nkụzi ha nyere ha rụọ n’ụlọ, nke ka nke, ma ọ bụrụ mgbakọ na mwepụ. Ịgụ akwụkwọ na-atọ di m ụtọ. Ọ na-akọkwara ndị ọzọ ihe ndị ọ gụtara, ma ihe ndị tọrọ ya ụtọ ma ihe ndị gbara ya ume. N’ụbọchị Mọnde, anyị na-agakarị ozi ọma n’obodo ebe a na-enweghị Ndịàmà Jehova, kpọọkwa ndị mmadụ ka ha bịa gere okwu a ga-ekwu ná mgbede.

Obi na-adị anyị ụtọ ma anyị na ndị na-eto eto nọrọ. Ha na Paolo na-agbakarị bọl

Mgbe mụ na di m letara ọgbakọ dị iche iche ruo naanị afọ abụọ, a kpọrọ anyị ka anyị bịa jewe ozi na Betel dị na Rom. Paolo rụrụ ọrụ na ngalaba na-ahụ maka okwu iwu, mụnwa arụọ na ngalaba na-ahụ maka magazin. Ọrụ ọhụrụ ahụ e nyere anyị adịrịghị anyị mfe, ma anyị kpebiri irube isi. Obi tọrọ anyị ezigbo ụtọ ịhụ ka alaka ụlọ ọrụ anyị bukwuru ibu, hụkwa ka ọtụtụ ndị na-aghọ Ndịàmà Jehova n’Ịtali. N’oge ahụ, ndị ọchịchị Ịtali nyere Ndịàmà Jehova ikike ịbụ okpukpe iwu kwadoro. Ozi anyị jere na Betel tọrọ anyị ezigbo ụtọ.

Ọrụ Paolo rụrụ na Betel tọrọ ya ụtọ

N’ihe dị ka afọ 1982, mgbe anyị ka na-eje ozi na Betel, otu ikpe e kpere n’Ịtali mere ka ọtụtụ ndị mata na anyị anaghị ekwe ka a mịnye anyị ọbara. E boro otu nwanna na nwunye ya ebubo ụgha na ha kpatara ọnwụ nwa ha nwaanyị n’ihi na ha ekweghị ka a mịnye ya ọbara. Nke bụ́ eziokwu bụ na ihe gburu nwa ha nwaanyị bụ ọrịa ọjọọ si ya n’ọbara, nke ọtụtụ ndị Ịtali na mba ndị gbara ha gburugburu na-arịakarị. Ụmụnna ndị nọ na Betel kwadoro ndị ọkàiwu na-ekwuchitere nwanna ahụ na nwunye ya ọnụ ha n’ụlọikpe. E bipụtara otu traktị na otu Teta! n’asụsụ Ịtalian iji nyere ndị mmadụ aka ịmata nke bụ́ eziokwu nakwa ihe Baịbụl kwuru banyere ọbara. N’ọnwa ndị ahụ, Paolo na-arụkarị ọrụ ruo awa iri na isii n’ụbọchị n’akwụsịghị akwụsị. M gbalịsiri ike na-enyere ya aka n’ọrụ ahụ dị mkpa ọ na-arụ.

IHE ANYỊ NA-ATỤGHỊ ANYA YA

Mgbe mụ na di m birila afọ iri abụọ, ihe anyị na-atụghị anya ya mere. M gwara di m na ọ dị ka m̀ dị ime. Adị m afọ iri anọ na otu mgbe ahụ, di m adịrị afọ iri anọ na itoolu. Ihe di m dere n’akwụkwọ ya n’ụbọchị ahụ bụ: ‘Ekpere m kpere: Ọ bụrụ na ọ bụ eziokwu, nyere anyị aka ka anyị nọrọkwa n’ozi oge niile, ka anyị ghara ịla azụ n’ọgbakọ, nyekwara anyị aka ka anyị bụrụ ezigbo nne na nna na-akpa àgwà  ọma. Karịchaa, nyere m aka ime ọ dịkarịa ala ụfọdụ n’ime ihe niile m gwara ndị ọzọ n’okwu ndị m kwuru kemgbe iri afọ atọ.’ M cheta ihe ahụ o dere, obi siri m ike na Jehova zara ekpere ya, zakwa nke m.

Ọtụtụ ihe gbanwere mgbe m mụchara ada anyị bụ́ Ilaria. N’eziokwu, obi na-ada mụ na di m mbà mgbe ụfọdụ, dị ka e kwuru n’Ilu 24:10, sị: “Ì nwewo obi ịda mbà n’ụbọchị ahụhụ? Ike gị ga-adị ntakịrị.” Ma anyị na-enyere ibe anyị aka, na-echetakwa na ịgba ibe anyị ume na-abara anyị uru.

Taa, Ilaria na-ekwukarị na obi dị ya ezigbo ụtọ na nne ya na nna ya na-eje ozi oge niile mgbe ọ na-eto eto. E nweghị mgbe ọ dị ya ka è leghaara ya anya. O toro n’ezigbo ezinụlọ. Mụ na ya na-anọ n’ehihie. Papa ya lọta ná mgbede, ọ na-enwekarị ihe o kwesịrị ịrụ. Ma, ọ na-ewepụta oge ya na Ilaria ga-eji gwurie egwu, ya enyekwara ya aka ịrụ ihe onye nkụzi nyere ya ka ọ rụọ. Di m na-eme otú ahụ n’agbanyeghị na o nwere ike ime ka ọ mụrụ anya ruo n’elekere abụọ ma ọ bụ atọ n’ime abalị ka o nwee ike ịrụcha ọrụ nke ya. Ihe Ilaria na-ekwukarị bụ, “Papa m bụ ezigbo enyi m.”

N’eziokwu, otú anyị si nyere Ilaria aka ịmụta ịkpa àgwà Ndị Kraịst bụ ịdọsi ya aka ná ntị ike mgbe ụfọdụ. Echetara m otu mgbe ya na enyi ya na-egwu egwu, ya emee enyi ya ahụ ihe na-adịghị mma. Mụ na di m ji Baịbụl kọwaara ya ihe mere na o kwesịghị ịkpa ụdị àgwà ahụ. Anyị mere ka ọ nọrọ n’ihu anyị rịọ enyi ya ahụ mgbaghara.

Ilaria na-ekwukarị na obi dị ya ụtọ na nne ya na nna ya anaghị eji ịga ozi ọma egwuri egwu. Ugbu a ya na di ya bi, ọ ghọtakwuola na mmadụ kwesịrị ịna-erubere Jehova isi ma na-eme ihe o kwuru.

IRUBERE CHINEKE ISI MGBE IHE ỌJỌỌ MERE

N’afọ 2008, Paolo matara na ya na-arịa ọrịa kansa. Ná mmalite, anyị chere na ọ ga-agbake, ọ gbakwara m ume nke ukwuu. Anyị gbalịrị ịchọta ụzọ kacha mma a ga-esi gwọọ ya. Anyị na Ilaria kpere ekpere ugboro ugboro rịọ Jehova ka o nyere anyị aka inwe obi ike ma die ihe ọ bụla nwere ike ime. Di m bụ nwoke gbasiri ike. Ma, o wutere m ịhụ ka ike na-agwụ ya nwayọọ nwayọọ. Obi gbawara m mgbe ọ nwụrụ n’afọ 2010. Ma, ihe na-akasi m obi bụ icheta ihe ndị anyị rụrụ n’afọ iri anọ na ise mụ na ya biri. Anyị ji ike anyị niile jeere Jehova ozi. Ama m na ihe anyị rụrụ ga-aba uru ruo mgbe ebighị ebi. Ana m atụsi anya ike ịhụ mgbe a ga-akpọlite di m n’ọnwụ, dị ka Jizọs kwuru na Jọn 5:28, 29.

“N’ime obi m, m ka bụ nwata nwaanyị ahụ akụkọ Noa na-atọ ụtọ. M ka kpebisiri ike ime uche Jehova”

N’ime obi m, m ka bụ nwata nwaanyị ahụ akụkọ Noa na-atọ ụtọ. M ka kpebisiri ike ime uche Jehova. Achọrọ m ịna-erubere ya isi n’agbanyeghị ihe ọ chọrọ ka m mee. Obi siri m ike na nsogbu ndị bịaara anyị, ihe ndị anyị hapụrụ ma ọ bụ ihe ndị mere anyị enweghị ihe ha bụ ma e jiri ha tụnyere ngọzi ndị magburu onwe ha Chineke hụrụ anyị n’anya na-enye anyị. Achọpụtala m na ihe a bụ eziokwu. Ka obi sie gị ike na irubere Jehova isi bara ezigbo uru.