Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Jun 2013

Kwe Ka Aka ná Ntị Jehova Na-adọ Gị Kpụzie Gị

Kwe Ka Aka ná Ntị Jehova Na-adọ Gị Kpụzie Gị

“Ị ga-eji ndụmọdụ gị na-edu m, n’ikpeazụ, ị ga-edu m ka m nweta ihe ùgwù.”—ỌMA 73:24.

1, 2. (a) Olee ihe ndị anyị kwesịrị ime ka anyị na Jehova dịrị ná mma? (b) Olee uru ọ ga-abara anyị ma anyị tụlee ihe Baịbụl kọrọ banyere ihe ụfọdụ ndị mere mgbe Chineke na-adọ ha aka ná ntị?

OTU ọbụ abụ kwuru, sị: “Ma mụ onwe m, ịbịaru Chineke nso dị m mma. Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ka m ji mere ebe mgbaba.” (Ọma 73:28) Ihe ọbụ abụ ahụ kwuru gosiri na ọ tụkwasịrị Chineke obi. Gịnị mere o ji kwuo ihe a? Tupu ya ekwuo ya, ihe ọ hụrụ mere ka o chee na ndị ajọ omume nwere udo. N’ihi ya, o ji iwe kwuo, sị: “Ọ bụ n’efu ka m meworo ka obi m dị ọcha, kwọọkwa aka m iji gosi na aka m dị ọcha.” (Ọma 73:2, 3, 13, 21) Ma, mgbe ọ banyere “ná nnukwu ebe nsọ Chineke,” ihe ndị ọ hụrụ mere ka ọ gbanwee echiche ya, meekwa ka ọ nọrọ Chineke nso. (Ọma 73:16-18) Ọbụ abụ ahụ mụtara ezigbo ihe. Ọ mụtara na ọ bụrụ na mmadụ chọrọ ka ya na Jehova dịrị ná mma, onye ahụ kwesịrị ịbụ ohu Chineke, na-ege ntị na ndụmọdụ Chineke na-enye ya ma na-erubere ya isi.—Ọma 73:24.

2 Anyịnwa chọkwara ka anyị na Jehova, bụ́ ezi Chineke dị ndụ, dị ná mma. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-ege ntị na ndụmọdụ Chineke na-enye anyị, na-anabatakwa aka ná ntị ọ na-adọ anyị. Ọ bụrụ na anyị na-eme otú ahụ, anyị na-ekwe ka Jehova na-akpụzi anyị, ya bụ, ka ọ na-enyere anyị aka ịbụ ụdị mmadụ ọ chọrọ ka anyị bụrụ. N’oge ochie, Chineke meere ma ndị mmadụ ma mba dị iche iche ebere. Otú o si mee ya bụ ịhapụ ha ka ha kpebie ma hà ga-anabata aka ná ntị ọ na-adọ ha. E dere ihe ndị ahụ mere eme na Baịbụl “iji nye anyị ntụziaka” nakwa “ka ha bụụrụ anyị ihe ịdọ aka ná ntị, anyị ndị ọgwụgwụ nke usoro ihe ndị a bịakwasịworo.” (Rom 15:4; 1 Kọr. 10:11) Anyị ga-atụle ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ,  mụtakwa otú Jehova si eche echiche na uru ọ ga-abara anyị ma ọ kpụzie anyị.

OTÚ JEHOVA SI AKPỤZI NDỊ MMADỤ

3. Olee otú Aịzaya 64:8 na Jeremaya 18:1-6 si gosi na Jehova nwere ikike ịkpụzi ndị mmadụ? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

3 Aịzaya 64:8 kwuru, sị: “Jehova, ị bụ Nna anyị. Anyị bụ ụrọ, ọ bụ gị kpụrụ anyị; anyị niile bụkwa ọrụ aka gị.” Ihe ahụ o kwuru gosiri na Jehova nwere ikike ịkpụzi ndị mmadụ na mba dị iche iche. Ọkpụite nwere ike iji ụrọ kpụọ ụdị arịa ọ bụla ọ chọrọ. Ụrọ ahụ enweghị ike ịgwa ya ihe ọ ga-akpụ. Otú ahụ ka ọ dị n’ihe gbasara mmadụ na Chineke. Mmadụ ekwesịghị ịgwa Chineke otú ọ ga-esi kpụzie ya, otú ahụ ụrọ na-enweghị ike ịgwa ọkpụite ụdị arịa ọ ga-eji ya kpụọ.—Gụọ Jeremaya 18:1-6.

4. Chineke ọ̀ na-amanye ndị mmadụ ka ọ kpụzie ha? Kọwaa.

4 Jehova kpụziri ndị Izrel oge ochie otú ọkpụite si eji ụrọ akpụ ihe. Ma, olee otú Jehova si dị iche n’ọkpụite? Jehova nyere ụmụ mmadụ na mba dị iche iche onyinye pụrụ iche. Ọ hapụrụ ha ka ha jiri aka ha na-ekpebi ihe ha ga-eme. O keghị ụfọdụ ka ha bụrụ ajọ mmadụ ma kee ndị ọzọ ka ha bụrụ ezigbo mmadụ. O nweghịkwa onye ọ na-amanye ka o rubere ya isi. Kama, ụmụ mmadụ ga-eji aka ha kpebie ma hà ga-ekwe ka Jehova, bụ́ Onye kere ha, kpụzie ha.—Gụọ Jeremaya 18:7-10.

5. Ọ bụrụ na ndị mmadụ ekweghị ka Jehova kpụzie ha, gịnị ka ọ ga-eme ha?

5 Ọ́ bụrụkwanụ na mmadụ agbaa isi akwara jụ ka Chineke kpụzie ya? Gịnịzi ka Chineke ga-eme onye ahụ? Chegodị ihe ọkpụite na-eme ma ọ bụrụ na ọ gaghị ejili ụrọ kpụọ ihe ọ chọrọ ịkpụ. O nwere ike iji ụrọ ahụ kpụta ụdị arịa ọzọ ma ọ bụkwanụ tụfuo ya. Ọ bụ ọkpụite ka a na-ata ụta ma ọ bụrụ na ihe ọ kpụrụ adịghị mma. Ma, Jehova na-akpụzi onye ọ bụla kwere ka ọ kpụzie ya. (Diut. 32:4) Ọ bụrụ na mmadụ ekweghị ka Jehova kpụzie ya, ọ bụ onye ahụ ka a ga-ata ụta. Jehova na-akpụzi onye kwere ka ọ kpụzie ya, onye na-ekweghị, ya ahapụ ya. Jehova na-eji ndị na-erubere ya isi eme ihe bara uru. Dị ka ihe atụ, Ndị Kraịst e tere mmanụ bụ “arịa ndị dịịrị ebere.” Chineke akpụziela ha ka ha bụrụ ‘arịa ndị e ji eme ihe kwesịrị nsọpụrụ.’ Ma, ndị na-ekweghị erubere Chineke isi bụ “arịa ndị dịịrị ọnụma, bụ́ ndị a ga-ebibi ebibi.”—Rom 9:19-23.

6, 7. Gịnị ka Eze Devid na Eze Sọl mere mgbe Jehova dọrọ ha aka ná ntị?

 6 Otu ụzọ Jehova si akpụzi ndị mmadụ bụ ịdụ ha ọdụ ma ọ bụ ịdọ ha aka ná ntị. Anyị ga-aghọta otú Jehova si akpụzi ndị mmadụ ma anyị mụọ ihe Baịbụl kọrọ banyere ndị eze abụọ mbụ chịrị Izrel, ya bụ, Sọl na Devid. Eze Devid kpataara onwe ya na ndị ọzọ ezigbo nsogbu mgbe ya na Bat-shiba kwara iko. N’agbanyeghị na Devid bụ eze mgbe ahụ, Jehova dọrọ ya ezigbo aka ná ntị. Chineke zigara Netan onye amụma ka ọ gaa gwa Devid na ihe o mere jọgburu onwe ya. (2 Sam. 12:1-12) Gịnị ka Devid mere mgbe a dọrọ ya aka ná ntị? O mere ihe gosiri na mmehie ya wutere ya, o chegharịkwara. N’ihi ya, Chineke meere Devid ebere.—Gụọ 2 Samuel 12:13.

 7 Ma, Eze Sọl dị iche. Ọ nabataghị aka ná ntị a dọrọ ya. Jehova gwara Samuel ka ọ gwa Sọl ka o gbuo ndị Amalek niile na anụ ụlọ ha. Sọl emeghị ihe ahụ Jehova kwuru. Ọ hapụrụ Egag bụ́ eze ndị Amalek na anụmanụ ndị kasị mma. Gịnị mere o ji hapụ ha? Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ọ chọrọ ime ka a sọpụrụ ya. (1 Sam. 15:1-3, 7-9, 12) N’ihi ya, Jehova zigara Samuel ka ọ dụọ Sọl ọdụ. Sọl  gaara ege ntị ma kwe ka Jehova kpụzie ya. Ma, o kweghị agbanwe. O chere na ya nwere ezigbo ihe mere o ji nupụrụ Jehova isi. O kwuru na ya chọrọ iji anụmanụ ndị ahụ chụọrọ Jehova àjà. Chineke jụrụ Sọl ka ọ ghara ịbụkwa eze. Sọl agbalịghịkwa ime ka ya na Jehova dịghachi ná mma.—Gụọ 1 Samuel 15:13-15, 20-23.

Sọl ledara aka ná ntị a dọrọ ya anya, jụkwa ịgbanwe. O kweghị ka a kpụzie ya! (Paragraf nke 7)

Devid mere ihe gosiri na mmehie ya wutere ya, nabatakwa aka ná ntị a dọrọ ya. O kwere ka Chineke kpụzie ya. Ị̀ na-ekwe ka ọ kpụzie gị? (Paragraf nke 6)

CHINEKE ADỊGHỊ ELE MMADỤ ANYA N’IHU

8. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe ụmụ Izrel mere mgbe Jehova chọrọ ịkpụzi ha?

8 Ọ bụghị naanị ndị mmadụ ka Jehova na-akpụzi, ọ na-akpụzikwa mba dị iche iche. Mgbe Jehova napụtachara ndị Izrel n’aka ndị Ijipt n’afọ 1513 Tupu Oge Ndị Kraịst, ha ghọrọ ndị pụrụ iche n’anya ya. Chineke kwere ha nkwa na ya ga-akpụzi ha. Ma, ha ekweghị ka Chineke kpụzie ha. Ha nọgidere na-eme ihe dị njọ n’anya Jehova. Ha fedịrị chi mba ndị gbara ha gburugburu. Jehova zigaara ndị Izrel ndị amụma ọtụtụ ugboro iji dọọ ha aka ná ntị, ma ha egeghị ha ntị. (Jere. 35:12-15) Jehova tara ha ezigbo ahụhụ n’ihi na ha kpọrọ ekwo nkụ. Ndị Asiria bibiri alaeze ebo iri nke dị n’ebe ugwu. Ndị Babịlọn mechakwara merie alaeze dị n’ebe ndịda. E nwere ezigbo ihe ihe a na-akụziri anyị. Otú Jehova si akpụzi anyị ga-abara anyị uru ma ọ bụrụ na anyị ekwe ka ọ kpụzie anyị.

9, 10. Olee ihe ndị Ninive mere mgbe Chineke dọrọ ha aka ná ntị?

9 Mgbe Jehova dọrọ ndị bi na Ninive, bụ́ isi obodo Asiria, aka ná ntị, ọ hapụrụ ha ka ha kpebie ma hà ga-echegharị.  Ọ gwara Jona, sị: “Bilie, gaa Ninive bụ́ obodo ukwu ma kwusaara ya na ihe ọjọọ ha erutewo n’ihu m.” Jehova kpebiri na e kwesịrị ibibi Ninive.—Jona 1:1, 2; 3:1-4.

10 Ma, mgbe Jona kwusara na a ga-ebibi ndị Ninive, ha malitere “inwe okwukwe n’ebe Chineke nọ, ha wee kpọsaa ibu ọnụ nakwa ka e yiri ákwà iru uju, malite n’onye kasị ukwuu n’ime ha ọbụna ruo n’onye kasị nta n’ime ha.” Eze ha “biliri n’ocheeze ya wee yipụ uwe eze ya ma yiri ákwà iru uju wee nọdụ ala ná ntụ.” Ndị Ninive kwetara ka Jehova kpụzie ha, ha echegharịa. N’ihi ya, Jehova ebibighị ha.—Jona 3:5-10.

11. Gịnị ka anyị na-amụta n’otú Jehova si meso ndị Izrel na ndị Ninive?

11 N’agbanyeghị na mba Izrel bụ mba Jehova họọrọ, ọ dọrọ ha aka ná ntị mgbe ha nupụụrụ ya isi. Ndị Ninive abụghị mba Jehova họọrọ, ma ha kwere ka Jehova kpụzie ha. Ọ bụ ya mere Jehova ji meere ha ebere, hapụ ibibi ha. Otú Jehova Chineke si meso mba abụọ ndị a gosiri n’eziokwu na ọ ‘dịghị ele onye ọ bụla anya n’ihu.’—Diut. 10:17.

JEHOVA MA MGBE O KWESỊRỊ ỊGBANWE IHE O KPEBIRI IME

12, 13. (a) Gịnị mere Chineke ji agbanwe ihe ọ chọrọ ime ma ndị mmadụ kwe ka ọ kpụzie ha? (b) Mgbe Jehova ‘gbanwere obi ya’ banyere Sọl, gịnị ka ọ pụtara? Mgbe ọ ‘gbanwere obi ya’ banyere ndị Ninive, gịnịkwa ka ọ pụtara?

12 Jehova nwere ike ịgbanwe ihe ọ chọrọ ime mmadụ ma onye ahụ gbanwee otú o si akpa àgwà. E nwere mgbe ụfọdụ Jehova kpebiri ibibi ụfọdụ ndị n’oge ochie. Ma o mechara gbanwee obi ya n’ihi na ha chegharịrị. Dị ka ihe atụ, Baịbụl gwara anyị na o wutere Jehova na o mere ka Sọl bụrụ eze. (1 Sam. 15:11) Ma, mgbe ndị Ninive chegharịrị, kwụsị àgwà ọjọọ ha na-akpa, Baịbụl sịrị: “Ezi Chineke wee gbanwee obi ya banyere ọdachi o kwuru na ya ga-ewetara ha; o wetaghịzi ya.”—Jona 3:10.

13 Mgbe Baịbụl kwuru na ihe ‘wutere’ Jehova, ma ọ bụ na ‘ọ gbanwere obi ya,’ ọ pụtara na ọ gbanwere otú o si ele mmadụ anya ma ọ bụ na ọ chọghịzi ime ihe o kpebiri ime. Jehova họpụtara Sọl ka ọ bụrụ eze. Ma, mgbe Sọl nupụụrụ ya isi, Jehova kpebiri na Sọl agaghịzi abụ eze. Ihe mere o ji wute Jehova na ya họpụtara Sọl ka ọ bụrụ eze abụghị na o kwesịghị ịhọpụta ya, kama, ọ bụ n’ihi na Sọl nupụụrụ ya isi. Mgbe ndị Ninive chegharịrị, Jehova gbanwere obi ya banyere ihe ọ chọrọ ime ha. Obi dị anyị ụtọ na Jehova bụ onye obiọma na onye obi ebere, nakwa na ọ na-agbanwe obi ya banyere ihe ọ chọrọ ime mmadụ ma onye ahụ gbanwee otú o si akpa àgwà.

KA ANYỊ GHARA ỊJỤ AKA NÁ NTỊ JEHOVA NA-ADỌ ANYỊ

14. (a) Olee otú Jehova si akpụzi anyị taa? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma Jehova kpụziwe anyị?

14 Taa, Jehova na-eji Baịbụl na nzukọ ya akpụzi anyị. (2 Tim. 3:16, 17) Anyị kwesịrị iji obi anyị niile na-anabata aka ná ntị ọ bụla Baịbụl na nzukọ Jehova dọrọ anyị. N’agbanyeghị afọ ole gaferelanụ kemgbe e mere anyị baptizim ma ọ bụkwanụ ihe ùgwù ndị anyị nwere n’ọgbakọ, anyị kwesịrị ịna-ege ntị na ndụmọdụ Jehova na-enye anyị. Ọ bụrụ na anyị ekwe ka Jehova na-akpụzi anyị, anyị ga-abụ ụdị mmadụ ọ chọrọ ka anyị bụrụ.

15, 16. (a) Olee otú obi nwere ike ịdị mmadụ ma a napụ ya ihe ùgwù o nwere? Nye ihe atụ. (b) Gịnị nwere ike inyere anyị aka idi ihere ma a dọọ anyị aka ná ntị?

15 Olee otú Jehova si adọ anyị aka ná ntị? Ọ na-agwa anyị ihe ọ chọrọ ka anyị  na-eme, na-agbazikwa otú anyị si eche echiche. Mgbe ụfọdụ, e nwere ike ịdọsi anyị aka ná ntị ike n’ihi na anyị mere ihe jọgburu onwe ya. E nwedịrị ike ịnapụ anyị ihe ùgwù anyị nwere n’ọgbakọ. Dị ka ihe atụ, otu nwanna anyị ga-akpọ Daniel * bụbu okenye n’ọgbakọ. O mere mmehie n’ihi iberiibe o mere n’ihe gbasara achụmnta ego. N’ihi ya, a dọrọ ya aka ná ntị. Olee otú obi dị Daniel n’ụbọchị a maara ọgbakọ ha ọkwa na ọ bụghịzi okenye? Ọ sịrị: “Ọ dị m ka o nweghịzi uru m bara. Kemgbe afọ iri atọ, enweela m ọtụtụ ihe ùgwù. Abụbu m ọsụ ụzọ oge niile. E nwekwara mgbe m jere ozi na Betel. A họpụtakwara m ka m bụrụ ohu na-eje ozi. E mechaakwa mee m okenye. M kwuru okwu mbụ m ná mgbakọ distrikti n’oge na-adịbeghị anya. Ihe ndị a niile funahụrụ m n’otu ntabi anya. Ihere onwe m na-eme m. Ọ dịkwa m ka e nweghịzi uru m bara ná nzukọ Jehova.”

16 Daniel mechara gbanwee, kwụsị àgwà ọjọọ ahụ mere ka a dọọ ya aka ná ntị. Gịnị nyeere ya aka mgbe ahụ a dọrọ ya aka ná ntị? O kwuru, sị: “M kpebisiri ike ịna-amụchi Baịbụl anya na ịna-agachi ọmụmụ ihe na ozi ọma anya. Ihe m na-agụta n’akwụkwọ anyị na ihe ụmụnna na-agwa m gbara m ume. Isiokwu bụ́ ‘Ì Nwetụla Ihe Ùgwù Ije Ozi? Ì Nwere Ike Inwe Ya Ọzọ?’ nke dị n’Ụlọ Nche August 15, 2009, dị nnọọ ka akwụkwọ ozi e ji za m ekpere. Ihe Ụlọ Nche ahụ kwuru nke kacha ruo m n’obi bụ: ‘Ebe ọ na-enweghị nnukwu ọrụ ị na-arụ n’ọgbakọ ugbu a, gbalịa mee ka gị na Jehova dịkwuo ná mma.’” Olee otú Daniel si rite uru n’aka ná ntị ahụ a dọrọ ya? Ka ọtụtụ afọ gachara, o kwuru, sị, “Jehova agọziela m ọzọ nye m ihe ùgwù ije ozi.”

17. Olee otú ịchụpụ onye mere mmehie n’ọgbakọ nwere ike isi nyere onye ahụ aka? Nye ihe atụ.

17 Otú ọzọ Jehova si adọ onye mere mmehie aka ná ntị bụ ịchụ ya n’ọgbakọ. Ọ na-eme ka ndị ọzọ ghara ịmụta àgwà ọjọọ onye ahụ, meekwa ka onye ahụ nwee ike ichegharị. (1 Kọr. 5:6, 7, 11) E nwere otu nwanna anyị ga-akpọ Richard. A chụrụ ya n’ọgbakọ. Ọ nọrọ ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ afọ iri na isii tupu a nabata ya. N’oge ahụ a chụrụ ya n’ọgbakọ, nne na nna ya na ụmụnne ya ekweghị ka ha na ya na-akpa, ha anaghịdị ekele ya n’ihi na ha kpebiri ime ihe Baịbụl kwuru banyere onye a chụrụ n’ọgbakọ. O ruola afọ ole na ole a nabatara ya n’ọgbakọ, ọ na-emekwa nke ọma ugbu a. Mgbe a nabatachara ya, a jụrụ ya ihe mere o ji lọghachi n’ọgbakọ n’agbanyeghị na o teela a chụrụ ya. Ya asị na ọ bụ maka na ndị ezinụlọ ha ekweghị ka ha na ya na-akpa. O kwuru na a sị na ndị ezinụlọ ha na-akpatụ ya nso ma ọ bụ na-ajụ ya otú o mere, ọ garaghị adị ya ka è nwere ihe na-efunahụ ya. O kwukwara na ihe ha mere nyeere ya aka ịlọghachikwute Jehova na nzukọ ya.

18. Olee ihe anyị kwesịrị ime ma Chineke dọọ anyị aka ná ntị?

18 O nwere ike a gaghị achụ anyị n’ọgbakọ iji dọọ anyị aka ná ntị. Ma, olee ụdị ụrọ anyị ga-abụ ma Chineke chọọ ịkpụzi anyị? Gịnị ka anyị ga-eme ma ọ dọọ anyị aka ná ntị? Ànyị ga-ekwe ka ọ kpụzie anyị? Ànyị ga-eme ka Devid, ka ànyị ga-eme ka Sọl? Ọ bụ Jehova na-akpụzi anyị, ọ bụkwa ya bụ Nna anyị. Echefukwala na ọ bụ “onye Jehova hụrụ n’anya ka ọ na-abara mba, ọbụna dị ka nna si abara nwa ya nke ihe ya dị ya mma mba.” N’ihi ya, ‘ajụla ịdọ aka ná ntị Jehova, akpọkwala ịba mba ya asị.’—Ilu 3:11, 12.

^ para. 15 Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.