Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) MEE 2013

 IHE SI N’EBE ANYỊ NA-EDEBE IHE OCHIE

Ha Kwụsiri Ike “n’Oge Awa nke Ule”

Ha Kwụsiri Ike “n’Oge Awa nke Ule”

MGBE a malitere ịlụ Agha Ụwa Mbụ n’afọ 1914, ọtụtụ ndị chọpụtara na Ndị Mmụta Baịbụl anaghị eso alụ agha. (Aịza. 2:2-4; Jọn 18:36; Efe. 6:12) Gịnị ka e mere ndị Jehova nọ na Briten mgbe ha na-ekweghị aga agha?

Henry Hudson

N’afọ 1916, ndị Briten nyere iwu na ụmụ nwoke na-alụbeghị nwaanyị, ndị nọ n’agbata afọ iri na asatọ na iri anọ, kwesịrị ịga agha ma ọ bụ bụrụ ndị agha. Iwu ahụ kwukwara na e nwere ike ịhapụ onye akọnuche ya ma ọ bụ ihe o kweere na-ekweghị ya bụrụ onye agha. Ndị ọchịchị Briten họpụtara ndị ga na-ekpebi onye a ga-ahapụ na onye a na-agaghị ahapụ.

Obere oge ka e tichara iwu a, a tụrụ ihe dị ka ụmụnna iri anọ mkpọrọ n’ihi na ha ekweghị aga agha, kpụrụkwa ụmụnna asatọ gaa n’ebe a na-alụ agha na Frans. N’ihi ihe a e mere, ụmụnna ndị nọ na Briten degaara Praịm Minista obodo ahụ, aha ya bụ Herbert Asquith, akwụkwọ ozi. N’akwụkwọ ozi ahụ, ha kwuru na ihe e mere ụmụnna ndị ahụ adịghị mma, puku mmadụ ise na narị ise bịanyekwara aka na ya.

E mechara nụ na a mara ụmụnna asatọ ahụ a kpọgara Frans ikpe ọnwụ maka na ha jụrụ ịlụ agha. Ma, mgbe a kpụpụtara ha ka a gbagbuo ha, e kpebiziri ịtụ ha mkpọrọ afọ iri. N’ihi ya, a kpọghachiri ha n’Ingland, tinyezie ha n’ụlọ mkpọrọ ndị nkịtị.

James Frederick Scott

Ka a nọkwa na-alụ agha ahụ, e tiri iwu na ụmụ nwoke ndị lụrụ nwaanyị ga-esozi na-aga agha. Na Manchesta dị n’Ingland, ndị ọchịchị gbara otu nwanna nwoke akwụkwọ. Aha nwanna ahụ bụ Henry Hudson, ọ bụkwa dọkịta. N’abalị atọ n’ọnwa asatọ n’afọ 1916, e kpegburu ya, rie ya iwu, kpọrọ ya kpọnye ndị agha. E kpekwara nwanna ọzọ ikpe n’otu obodo dị na Skọtland, ma e kpegbughị ya. Aha nwanna ahụ bụ James Frederick Scott. Ọ dị afọ iri abụọ na ise, bụrụkwa kọpọtụa ma ọ bụ ọsụ ụzọ oge niile. Ndị ọchịchị chọburu ka e kpegharịa ikpe nwanna a, ma mechaa hapụ ya maka ikpe ha chọrọ ka e kpee nwanna ọzọ na Lọndọn. Aha nwanna ha chọrọ ka e kpee ikpe bụ Herbert Kipps. Ha kpegburu nwanna ahụ, rie ya iwu, kpọrọ ya kpọnyekwa ndị agha.

N’ọnwa itoolu n’afọ 1916, a chọpụtara na narị ụmụnna abụọ na iri isii na anọ edegarala ndị ọchịchị akwụkwọ ka a gụpụ ha ná ndị ga-aga agha. A hapụrụ mmadụ ise n’ime ha, ma nye otu narị mmadụ na iri ise na anọ n’ime ha ọrụ ịrụ ụzọ na ọrụ ndị ọzọ yiri ya. E zigara iri mmadụ abụọ na atọ ebe ha ga na-arụrụ ndị agha ọrụ ma ghara ịga agha. A kpọọrọ iri mmadụ asatọ na abụọ fọrọnụ kpọnye ndị agha, ha ekpee ụfọdụ n’ime ha ikpe, tụọkwa ha mkpọrọ. Ọtụtụ ndị gosiri na obi adịghị ha mma  maka otú e si echi ụmụnna anyị ọnụ n’ala. N’ihi ya, ndị ọchịchị si n’ụlọ mkpọrọ ndị agha kpọpụta ha, tinyezie ha n’ụlọ mkpọrọ ndị nkịtị.

Pryce Hughes

Nwanna Edgar Clay na Nwanna Pryce Hughes so rụọ ihe e ji gbochie mmiri n’obodo Wels. Nwanna Pryce Hughes mechara bụrụ onye nlekọta alaka ụlọ ọrụ dị na Briten. A tụrụ otu n’ime ụmụnna asatọ ndị ahụ a kpọgaburu Frans mkpọrọ n’ụlọ mkpọrọ dị na Yọkshịa n’Ingland. Aha nwanna ahụ bụ Herbert Senior. A tụkwara ụmụnna ndị ọzọ mkpọrọ na Datmọọ dị n’Ingland, bụ́ ebe e chiri ha ọnụ n’ala. Ọ bụ n’ụlọ mkpọrọ a ka a kacha tụọ ụmụnna anyị mkpọrọ n’ihi na ha jụrụ ịbụ ndị agha.

Nwanna ọzọ aha ya bụ Frank Platt kwetara ịrụrụ ndị agha ọrụ, ma ọ sịrị na ya agaghị eso lụọ agha. Mgbe a kpọgara ya n’ihu agha, ya ajụ ịlụ agha, a tara ya ezigbo ahụhụ. Otu nwoke aha ya bụ Atkinson Padgett natara eziokwu obere oge e denyechara aha ya ná ndị agha. Ndị agha chikwara ya ọnụ n’ala mgbe ọ jụrụ ịga agha.

Herbert Senior

N’agbanyeghị na n’oge ahụ, o nwere ike ịbụ na ụmụnna anyị aghọtachaghị ihe niile gbasara ịnọpụ iche, ha kpebisiri ike ime ihe dị Jehova Chineke mma. Ụmụnna ndị a kọrọ akụkọ ha ebe a kwụsiri ike “n’oge awa nke ule,” n’agbanyeghị na ọ tara ezigbo akpụ. Anyị kwesịkwara iṅomi ha. (Mkpu. 3:10)—Ihe si n’ebe anyị na-edebe ihe ochie na Briten.