Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Mee 2013

Ndị Nne na Nna na Ndị Bụ́ Ụmụ, Jirinụ Ịhụnanya Na-ekwurịta Okwu

Ndị Nne na Nna na Ndị Bụ́ Ụmụ, Jirinụ Ịhụnanya Na-ekwurịta Okwu

“Onye ọ bụla aghaghị ịbụ onye na-anụ ihe ngwa ngwa, onye na-adịghị ekwu okwu ngwa ngwa, onye na-adịghị ewe iwe ngwa ngwa.”—JEMS 1:19.

1, 2. Olee otú ndị nne na nna na ụmụ ha si ele ibe ha anya, ma olee ihe nwere ike ịna-esiri ha ike mgbe ụfọdụ?

A JỤRỤ ọtụtụ ụmụaka bi n’Amerịka, sị: “E nwee otú i si mata na nne gị na nna gị ga-anwụ echi, gịnị ka ị ga-agwa ha taa?” Ọtụtụ n’ime ha kwuru na ha agaghị ekwute okwu nsogbu ma ọ bụ nghọtahie ọ bụla ha na ha nwere. Kama ha kwuru na ha ga-asị ha, “Unu ewela iwe,” nakwa “Ahụrụ m unu n’anya nke ukwuu.”—Akwụkwọ bụ́ For Parents Only, nke Shaunti Feldhahn na Lisa Rice dere.

2 Ụmụaka na-ahụkarị nne ha na nna ha n’anya. Ndị nne na nna na-ahụkwa ụmụ ha n’anya. Ọ na-adị otú ahụ karịchaa n’ezinụlọ ezi Ndị Kraịst. Ọ bụ eziokwu na ọ na-agụkarị ndị nne na nna na ụmụ ha agụụ ịna-adị ná mma, ikwurịta okwu na-esiri ha ike mgbe ụfọdụ. Ọ bụrụgodị mgbe ha nwere ike ịna-ekwurịta okwu nke ọma, onye ọ bụla ana-ekwu otú ọ dị ya n’obi n’eziokwu, gịnị mere na ha anaghị ekwu banyere ihe ụfọdụ? Olee ihe ụfọdụ na-eme ka ndị nne na nna na ụmụ ha ghara ịna-ekwurịta okwu nke ọma? Olee otú ha nwere ike isi merie nsogbu ndị ahụ?

Ekwela ka ihe ọ bụla mee ka unu ghara ịna-ekwurịta okwu n’ezinụlọ unu; anọpụla iche

WEPỤTANỤ OGE UNU GA-EJI NA-EKWURỊTA OKWU

3. (a) Gịnị mere o ji esiri ọtụtụ ezinụlọ ike ịna-akparịta ụka nke ọma? (b) N’Izrel oge ochie, gịnị mere o ji dịrị ezinụlọ dị iche iche mfe ịna-anọrị?

3 Ọtụtụ ezinụlọ na-achọpụta na ọ na-esiri ha ike inwe oge ha ga-eji na-ekwurịta okwu nke ọma. Ma, ọ dịghị otú ahụ n’oge ndị Izrel. Mozis gwara ndị Izrel bụ́ nna, sị: “Kụnye [okwu Chineke] n’ime ụmụ gị, kwuokwa okwu banyere ha mgbe ị nọ ọdụ n’ụlọ gị na mgbe ị na-eje ije n’okporo ụzọ na mgbe i dina ala nakwa mgbe i biliri ọtọ.” (Diut. 6:6, 7) N’oge ahụ, ụmụaka na nne ha na-anọ n’ụlọ n’ehihie ma ọ bụ ha esoro nna ha gaa n’ubi ma ọ bụ n’ebe ọ na-arụ ọrụ. O mere ka ndị nne na nna na  ụmụ ha na-enwe oge buru ibu ha ga-eji na-anọrị ma na-akparịta ụka. N’ihi ya, ọ dịịrị ndị nne na nna mfe ịmata ihe dị ụmụ ha mkpa, ihe ha chọrọ ime, na ụdị àgwà ha na-akpa. Ọ dịkwaara ndị bụ́ ụmụ mfe ịmata nne ha na nna ha nke ọma.

4. Gịnị mere o ji esiri ọtụtụ ezinụlọ ike ịna-ekwurịta okwu?

4 Ihe agbanweela taa! N’ọtụtụ obodo, ụmụaka na-amalite ịga ụlọ akwụkwọ mgbe ha ka dị ezigbo obere, mgbe ụfọdụ mgbe ha dị naanị afọ abụọ. Ọtụtụ ndị nne na nna na-ahapụ ụlọ ha kwa ụbọchị gaa ebe ha na-arụ ọrụ. Mgbe ha na ụmụ ha nọ n’ụlọ, ha anaghị ekwurịta okwu nke ọma n’ihi na ha na-eji oge ha ele tiivi, apị kọmputa ma ọ bụ ekwentị. N’ọtụtụ ezinụlọ, ụmụaka na ndị mụrụ ha anaghị ama ihe ibe ha na-eme; ha na-eme ka hà amaghị ibe ha. Ọ na-afọ obere ka ọ bụrụ na ha anaghị ekwurịta okwu.

5, 6. Olee otú ụfọdụ ndị nne na nna si ewepụtakwu oge ka ha na ụmụ ha na-anọrị?

5 Ì nwere ike isi n’ihe ndị ọzọ ị na-eme ‘zụta oge’ gị na ndị ezinụlọ gị ga-eji na-anọrị? (Gụọ Ndị Efesọs 5:15, 16.) Ụfọdụ ezinụlọ na-ekwekọrịta iselata aka n’oge ha ji ele tiivi ma ọ bụ apị kọmputa. E nwekwara ezinụlọ ndị na-agbalị ka ha na-erikọ nri ọnụ otu ugboro n’ụbọchị ma ọ dịkarịa ala. Ofufe ezinụlọ bụ oge magburu onwe ya ndị nne na nna na ụmụ ha kwesịrị iji matakwuo ibe ha, wetuokwa obi na-ekwurịta ihe gbasara ofufe Chineke! Otú ha nwere ike isi malite bụ ịna-ewepụta ihe dị ka otu awa n’izu na-amụkọ Baịbụl ọnụ. Ma ọ bụrụ na ha chọrọ ịna-ekwurịta okwu nke ọma, ha kwesịrị ịna-eme karịa otú ahụ. Ha kwesịrị ịna-ekwurịta okwu mgbe niile. Tupu nwa gị agawa ụlọ akwụkwọ, gwa ya ihe ga-agba ya ume, gị na ya tụlee ihe mmụta dịịrị ụbọchị, ma ọ bụ gị na ya ekpekọọ ekpere. I mee otú ahụ, o nwere ike inyere ya ezigbo aka n’ụbọchị ahụ.

6 Ụfọdụ ndị nne na nna agbanweela otú ha si ebi ndụ ka ha nwee ike iwepụtakwu oge ka ha na ụmụ ha na-anọrị. Dị ka ihe atụ, ọ bụ ụdị ihe a mere otu nwaanyị nke mụrụ ụmụ abụọ ji gbaa arụkwaghịm n’ọrụ ọ na-eji oge ya niile arụ. Aha nwaanyị ahụ bụ Laura. * O kwuru, sị: “N’ụtụtụ, onye  ọ bụla na-agba kpurukpuru ka o nwee ike ịga ọrụ ma ọ bụ ụlọ akwụkwọ n’oge. Tupu mụ alọta ọrụ n’abalị, onye na-ekuru m nwa emeela ka ụmụ m hie ụra. Ebe ọ bụ na mụ agbaala arụkwaghịm, ego m na-arụta ebughịzi ibu. Ma o meela ka m na-ama ihe dị n’obi ụmụ m na ihe bụ́ nsogbu ha. Ana m ege ntị n’ihe ha na-ekpe n’ekpere, na-eduzi ha, na-agba ha ume, na-akụzikwara ha ihe.”

‘BỤRỤ ONYE NA-ANỤ IHE NGWA NGWA’

7. Gịnị ka ndị nne na nna na ụmụ ha na-ekwukarị?

7 Mgbe ndị dere akwụkwọ ahụ a kpọrọ aha ya ná mmalite gbachara ọtụtụ ndị na-eto eto ajụjụ ọnụ, ha chọpụtara ihe ọzọ na-eme ka ndị mụrụ ụmụ na ụmụ ha ghara ịna-ekwurịta okwu. Ha kwuru, sị: “Ihe ọtụtụ ụmụaka ndị ahụ kwukarịrị banyere ndị mụrụ ha bụ, ‘Ha anaghị ege anyị ntị.’” Ọ bụghị naanị ụmụaka na-ekwu ya. Ndị nne na nna na-ekwukwa ọtụtụ mgbe na ụmụ ha anaghị ege ha ntị. Ọ bụrụ na ndị nọ n’ezinụlọ chọrọ ịna-ekwurịta okwu nke ọma, onye ọ bụla kwesịrị ịna-ege ibe ya ntị nke ọma.Gụọ Jems 1:19.

8. Olee otú ndị nne na nna nwere ike isi na-ege ụmụ ha ntị nke ọma?

8 Ndị nne na nna, ùnu na-ege ụmụ unu ntị n’eziokwu? O nwere ike isiri unu ike mgbe ike gwụrụ unu ma ọ bụ mgbe unu chere na ihe ụmụ unu na-ekwu abachaghị uru. Ma ihe unu chere na ọ baghị uru nwere ike ịbụ ihe dị nwa unu ezigbo mkpa. ‘Ịbụ onye na-anụ ihe ngwa ngwa’ pụtara ige ntị nke ọma ọ bụghị naanị n’ihe nwa gị na-ekwu kama n’otú o si ekwu ya. Olu nwa gị ji ekwu ihe ọ na-ekwu na ihe ọ na-eme mgbe ọ na-ekwu ya ga-eme ka ị mata otú obi dị ya. Ịjụ ajụjụ dịkwa mkpa. Baịbụl kwuru, sị: “Echiche nke dị n’obi mmadụ yiri mmiri miri emi, ma, ọ bụ onye nwere nghọta ga-esepụta ya.” (Ilu 20:5) Nghọta ga-enyere gị aka ịchọpụta ihe ụmụ gị bu n’obi, nke ka nke, ma ọ bụrụ na ahụ́ eruchaghị ha ala ikwu ya.

9. Gịnị mere ndị bụ́ ụmụ ji kwesị ịna-ege ndị mụrụ ha ntị?

9 Ndị bụ́ ụmụ, ùnu na-erubere ndị mụrụ unu isi? Baịbụl kwuru, sị: “Nwa m, ṅaa ntị n’ịdọ aka ná ntị nna gị, ahapụkwala iwu nne gị.” (Ilu 1:8) Chetanụ na ndị mụrụ unu hụrụ unu n’anya, na-echekwara unu echiche ọma. N’ihi ya, unu kwesịrị ịna-ege ha ntị, na-erubekwara ha isi. (Efe. 6:1) Ọ ga-adịrị gị mfe irubere ha isi ma ọ bụrụ na gị na ha na-ekwurịta okwu nke ọma, gị amarakwa na ha hụrụ gị n’anya. Na-agwa ha otú i si ele ihe ụfọdụ anya. Ọ ga-enyere ha aka ịghọta gị. N’eziokwu, i kwesịkwara ịgbalị na-aghọta ha.

10. Gịnị ka anyị kwesịrị ịmụta n’ihe Baịbụl kọrọ banyere Rehoboam?

10 I kwesịrị ịkpachara anya ma ị chọwa ime ihe ụmụaka ibe gị dụrụ gị ọdụ ka i mee. Ha nwere ike ịgwa gị ihe ị chọrọ ịnụ. Ma, o nwere ike ịbụ na ndụmọdụ ha agaghị abara gị uru. O nwedịrị ike ịkpatara gị nsogbu. Ndị na-eto eto amaghị ihe ka ndị torola eto. Ha ahụbeghịkwa ihe ndị mere okenye hụrụla. N’ihi ya, ọtụtụ ndị na-eto eto anaghị eche banyere ọdịnihu mgbe ha na-ekpebi ihe ha ga-eme. O nwekwara ike ịbụ na ha amaghị nsogbu ihe ha kpebiri ime ugbu a ga-akpatara ha. Cheta ihe Rehoboam, bụ́ nwa Eze Sọlọmọn, mere. Mgbe ọ ghọrọ eze Izrel, ọ gaara abara ya uru ma a sị na o mere ihe ndị okenye gwara ya. Kama ige ha ntị, o mere ihe nzuzu ụmụ okorobịa ibe ya ha na ya tokọrọ gwara ya. Ọ bụ ya mere ọtụtụ ndị ọ na-achị ji nupụrụ ya isi. (1 Eze 12:1-17) Kama izuzu nzuzu ka Rehoboam, gbalịsie ike ka gị na ndị mụrụ gị na-akparịta ụka mgbe niile. Na-agwa ha ihe i bu n’obi. Ndị mụrụ gị ma ihe. Na-eme ihe ha gwara gị, na-amụtakwa ihe n’aka ha.—Ilu 13:20.

11. Gịnị nwere ike ime ma ọ bụrụ na ọ na-esiri ụmụaka ike ịgwa ndị mụrụ ha okwu?

11 Ndị nne na nna, ọ bụrụ na unu achọghị ka ụmụ unu na-agakwuru ụmụaka ibe ha ka ha nye ha ndụmọdụ, meenụ ka ọ dịrị  ha mfe ịbịa kọọrọ unu ihe ha bu n’obi. Otu nwanna nwaanyị na-eto eto dere, sị: “Ọ na-abụ, m kwuhaala banyere nwa okorobịa, obi anaghịzi eru papa m na mama m ala. Ọ na-eme ka obi ghara iru m ala, meekwa ka m mechie ọnụ.” Nwanna nwaanyị ọzọ na-eto eto dere, sị: “Ọtụtụ ndị na-eto eto chọrọ ka ndị mụrụ ha na-enye ha ndụmọdụ. Ma, ọ bụrụ na ndị mụrụ ha anaghị eji ihe ụmụ ha gwara ha kpọrọ ihe, ụmụ ha ga-agakwuru ndị ga-ege ha ntị. O nwedịrị ike ịbụ ndị na-amabeghị ihe.” Ọ bụrụ na unu ewetuo obi na-ege ụmụ unu ntị n’ihe ọ bụla ha chọrọ ikwu, o nwere ike ime ka obi na-eru ha ala ịkọrọ unu ihe ha bu n’obi, na-emekwa ihe unu gwara ha.

BỤRỤ “ONYE NA-ADỊGHỊ EKWU OKWU NGWA NGWA”

12. Olee otú àgwà ndị nne na nna nwere ike isi mee ka ụmụ ha ghara ịna-akọrọ ha ihe dị ha n’obi?

12 Ọ bụrụ na ndị nne na nna ewee iwe n’ihi ihe ụmụ ha kọọrọ ha, o nwere ike ime ka o siere ụmụ ha ike ịna-agwa ha okwu. O doro anya na ndị nne na nna chọrọ ịna-echebe ụmụ ha. E nwere ụdị nsogbu dị iche iche “n’oge ikpeazụ” a, ma nsogbu ndị nwere ike ịkpa okwukwe anyị aka ọjọọ ma ụdị nsogbu ndị ọzọ. (2 Tim. 3:1-5) Ma, ndị nne na nna nwere ike ịna-agbalị ichebe ụmụ ha, ụmụ ha echee na ha na-eke ha agbụ.

13. Gịnị mere ndị nne na nna ji kwesị ịkpachara anya ka ha ghara ịna-ekwu ihe ha chere ngwa ngwa?

13 Ndị nne na nna kwesịrị ịkpachara anya ka ha ghara ịna-ekwu ihe ha chere ngwa ngwa. N’eziokwu, ọ naghị adị mfe mgbe niile ịgba nkịtị mgbe nwa gị na-akọrọ gị ihe na-agbawa obi. Ma, i kwesịrị ibu ụzọ gee ntị nke ọma tupu gị amara ihe ị ga-aza ya. Sọlọmọn, bụ́ eze maara ihe, dere, sị: “Mgbe onye ọ bụla na-aza okwu tupu ya anụ ya, ọ bụụrụ ya nzuzu na mmechuihu.” (Ilu 18:13) Ọ bụrụ na i jide onwe gị, ụmụ gị ga-akọcha ihe ha chọrọ ịkọ, gị anụkwuo ihe merenụ. I kwesịrị ibu ụzọ ghọta ihe merenụ ka i nwee ike ịma otú ị ga-esi enyere ha aka. O nwere ike ịbụ na ihe mere nwa gị ji kwuo “okwu nzuzu” ahụ bụ na e nwere ihe na-enye ya nsogbu n’obi. (Job 6:1-3) Ebe ọ bụ na ị hụrụ ụmụ gị n’anya, gee ha ntị ma gbalịa ịghọta ha, na-agwakwa ha ihe ga-enyere ha aka.

14. Gịnị mere ndị bụ́ ụmụ ekwesịghị ịna-ekwu okwu ngwa ngwa?

14 Ndị bụ́ ụmụ, unu ekwesịghịkwa ‘ịna-ekwu okwu ngwa ngwa.’ Chetanụ na ọ bụ ndị mụrụ unu ka Chineke nyere ọrụ ịzụ unu. N’ihi ya, unu arụla ha ụka ozugbo ha gwara unu ihe unu ga-eme. (Ilu 22:6) O nwere ike ịbụ na ha enwetụla ụdị nsogbu ndị unu nwere ugbu a. Ihe ọzọ bụ na ha na-akwa mmakwaara ma ha cheta ihe ha mejọrọ mgbe ha na-eto eto, ha chọkwara inyere unu aka ka unu ghara ime ụdị ihe ahụ ha mere. N’ihi ya, ghọtanụ na ha bụ ndị enyi unu. Ha abụghị ndị iro unu. Ha na-enye unu ndụmọdụ ga-abara unu uru, ọ bụghị nke ga-egbu unu. (Gụọ Ilu 1:5.) ‘Na-asọpụrụnụ nna unu na nne unu.’ Na-egosikwanụ ha na unu hụrụ ha n’anya otú ahụ ha hụrụ unu. Ọ ga-eme ka ọ dịrị ha mfe ‘ịzụlite unu n’ọzụzụ na nduzi echiche nke si n’aka Jehova.’—Efe. 6:2, 4.

BỤRỤ “ONYE NA-ADỊGHỊ EWE IWE NGWA NGWA”

15. Olee ihe ga-enyere anyị aka ịna-ejide onwe anyị ma ghara iweso ndị anyị hụrụ n’anya iwe?

15 Ọ bụghị mgbe niile ka anyị na-enwere ndị anyị hụrụ n’anya ndidi. N’akwụkwọ ozi Pọl onyeozi degaara “ndị nsọ na ụmụnna kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ ndị nọ na Kọlọsi,” ọ gwara ha, sị: “Unu ndị bụ́ di, na-ahụnụ nwunye unu n’anya, unu ewesola ha oké iwe. Unu ndị bụ́ nna, unu adịla na-akpasu ụmụ unu iwe, ka ha wee ghara ịda mbà n’obi.” (Kọl. 1:1, 2; 3:19, 21) Pọl gbara ndị Efesọs ume, sị: “Wepụnụ obi ilu niile na iwe na ọnụma na iti mkpu na okwu mkparị, tinyere ihe ọjọọ niile, n’etiti unu.” (Efe. 4:31) Ọ bụrụ na anyị amụta àgwà ndị so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke,  dị ka ogologo ntachi obi, ịdị nwayọọ, na njide onwe onye, ọ ga-adịrị anyị mfe ijide onwe anyị mgbe nsogbu bịaara anyị.—Gal. 5:22, 23.

16. Olee otú Jizọs si gbazie ndị na-eso ụzọ ya olu? Gịnị mere ihe ahụ o mere ji pụọ iche?

16 Ka anyị tụlee ihe Jizọs mere. Chegodị otú o si na-echegbu onwe ya mgbe ya na ndịozi ya na-eri nri anyasị ikpeazụ. Jizọs ma na ọ fọrọ awa ole na ole ka a taa ya ahụhụ ma gbuo ya. Ọ makwa na ihe ga-eme ka e doo aha Nna ya nsọ ma zọpụta ụmụ mmadụ bụ ma o kwesị ntụkwasị obi. Ma, n’oge ahụ ha na-eri ihe, ndịozi ya malitere ịrụ ụka banyere onye ga-abụ onye kasị ukwuu. Jizọs abaaraghị ha mba ma ọ bụ jiri iwe gwa ha okwu. Kama ime otú ahụ, o weturu obi gwa ha ihe ga-eme ka ha chee echiche. Jizọs chetaara ha na ha ahapụghị ya mgbe nsogbu bịaara ya. N’agbanyeghị na Setan na-achọ iyọcha ha otú ahụ e si ayọcha ọka wit, Jizọs gwara ha na obi siri ya ike na ha ga-ekwesị ntụkwasị obi. Ọ bụdị mgbe ahụ ka ya na ha gbara ndụ.—Luk 22:24-32.

Ị̀ na-ege ụmụ gị ntị nke ọma?

17. Olee ihe ga-enyere ndị bụ́ ụmụ aka ịna-ejide onwe ha?

17 Ndị bụ́ ụmụ kwesịkwara ịna-ejide onwe ha. Ha nwere ike iche na ihe mere ndị mụrụ ha ji agwa ha ihe ha ga-eme bụ na ha atụkwasịghị ha obi, karịchaa mgbe ha topụtawara okorobịa ma ọ bụ agbọghọbịa. N’agbanyeghị na i nwere ike iche otú ahụ mgbe ụfọdụ, cheta na ihe mere ha ji eme otú ahụ bụ na ha hụrụ gị n’anya. Ọ bụrụ na i wetuo obi gee ha ntị ma na-erubere ha isi, ha ga na-akwanyere gị ùgwù. Ọ ga-edokwa ha anya na ị naghịzi akpa àgwà ụmụaka. O nwekwara ike ime ka ha hapụ gị ka i jiri aka gị na-ekpebi ihe ụfọdụ ị na-eme. Ọ bụrụ na ị na-ejide onwe gị, ọ ga-egosi na ị ma ihe. Otu ilu dị na Baịbụl kwuru, sị: “Onye nzuzu adịghị ejide mmụọ ya ma ọlị, ma onye maara ihe na-ejideru ya n’isi.”—Ilu 29:11.

18. Olee otú ịhụnanya si eme ka a na-ekwurịta okwu nke ọma n’ezinụlọ?

18 N’ihi ya, ndị nne na nna na ndị bụ́ ụmụ, unu adala mbà ma ọ bụrụ na unu anaghị ekwurịta okwu nke ọma n’ezinụlọ unu otú unu chọrọ. Na-agbalịnụ ka unu na-ekwurịta okwu, na-ejekwanụ ije n’eziokwu. (3 Jọn 4) N’ụwa ọhụrụ, anyị niile ga-ezu okè, nweekwa ike ịna-ekwurịta okwu nke ọma n’eseghị okwu, n’enweghịkwa nghọtahie. Ma, ka ọ dị ugbu a, anyị niile na-emecha kwaa mmakwaara n’ihi ihe anyị mere. N’ihi ya, onye mejọọ, ya rịọ ibe ya mgbaghara. Na-agbagharanụ ibe unu kpamkpam. Ka ịhụnanya mee ka unu dị n’otu. (Kọl. 2:2) Ịhụnanya na-akpa ike. ‘O nwere ogologo ntachi obi na obiọma. Ọ dịghị abụ nke a kpasuru iwe. Ọ dịghị agụkọ ihe ọjọọ. Ọ na-edi ihe niile, na-ekwere ihe niile, na-enwe olileanya ihe niile, na-atachi obi n’ihe niile.’ (1 Kọr. 13:4-7) Ọ bụrụ na unu na-egosi na unu hụrụ ibe unu n’anya, unu ga na-ekwurịta okwu nke ọma n’ezinụlọ unu. Ọ ga-eme ka unu na-enwe obi ụtọ, meekwa ka a na-eto Jehova.

^ para. 6 Ọ bụghị ezigbo aha ya.