Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) MEE 2013

Ị̀ “Na-anụ Ọkụ n’Obi Ịrụ Ezi Ọrụ”?

Ị̀ “Na-anụ Ọkụ n’Obi Ịrụ Ezi Ọrụ”?

“Kraịst Jizọs . . . nyere onwe ya n’ihi anyị ka o wee . . . sachaara onwe ya ndị bụ́ ndị nke ya pụrụ iche, ndị na-anụ ọkụ n’obi ịrụ ezi ọrụ.”—TAỊ. 2:13, 14.

1, 2. Olee ihe ọma Chineke meere naanị Ndịàmà ya? Olee otú obi dị gị maka ihe ọma a?

Ọ NA-ABỤ e nye ọtụtụ ndị onyinye maka ihe ha mere, ha ewere ya na ihe ọma meere ha. Dị ka ihe atụ, e nweela ndị e nyere onyinye pụrụ iche maka otú ha si mee ka mba abụọ na-ese okwu kpezie. Ma, onye ihe ọma kacha meere bụ onye Chineke zipụrụ ka ọ gaa nyere ndị mmadụ aka ka ha na ya dịrị ná mma.

2 Ọ bụ naanị anyị bụ́ Ndịàmà Jehova ka Chineke meere ụdị ihe ọma a. Chineke na Jizọs Kraịst gwara anyị ka anyị na-arịọ ndị mmadụ ka ha ‘mee ka ha na Chineke dị ná mma.’ Ọ bụkwa ihe anyị na-eme. (2 Kọr. 5:20) Jehova si n’aka anyị adọtara onwe ya ndị mmadụ. Ọ dọtala ọtụtụ nde mmadụ ndị bi n’ihe karịrị narị ala abụọ na iri atọ na ise ka ha na ya dịrị ná mma. Ha nwekwara olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. (Taị. 2:11) Anyị ji ịnụ ọkụ n’obi na-akpọ ‘onye ọ bụla nke chọrọ, ka ọ bịa nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.’ (Mkpu. 22:17) N’eziokwu, anyị bụ ndị “na-anụ ọkụ n’obi ịrụ ezi ọrụ” n’ihi na anyị ji ozi a kpọrọ ihe ma jiri obi anyị niile na-eje ya. (Taị. 2:14) Ịnụ ọkụ n’obi maka ezi ọrụ na-enyere anyị aka ịdọtara Jehova ndị mmadụ. Ugbu a, ka anyị hụ otú anyị si eme ya. Ozi ọma anyị na-ekwusa bụ otu ụzọ anyị si eme ya.

ṄOMIE OTÚ JEHOVA NA JIZỌS SI ANỤ ỌKỤ N’OBI

3. Olee otú “ekworo Jehova” si eme ka obi sie anyị ike?

3 Mgbe Aịzaya na-ekwu gbasara ihe Jizọs ga-eme mgbe ọ ga-achị, ọ sịrị: “Ekworo Jehova nke ụsụụ ndị agha ga-emezu ihe a.” (Aịza. 9:7) Ihe a o kwuru gosiri na ọ dị Nna anyị nke eluigwe ọkụ n’obi ịzọpụta ụmụ mmadụ. Otú Jehova si anụ ọkụ n’obi na-egosi na anyị kwesịrị iji obi anyị niile na-arụ ọrụ o nyere anyị, jirikwa ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ya. Ọ bụrụ na anyị ji ịnụ ọkụ n’obi na-enyere ndị mmadụ aka ka ha mata Chineke, anyị na-eṅomi Jehova. Ebe anyị bụ ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ, ànyị na-eji ike anyị niile ekwusa ozi ọma?—1 Kọr. 3:9.

4. Gịnị mere anyị ji kwesị iṅomi otú Jizọs si kwusaa ozi ọma?

 4 Jizọs bụkwa onye ọzọ anyị kwesịrị iṅomi otú o si nụọ ọkụ n’obi. N’agbanyeghị na ọtụtụ ndị megidere ya, chọọkwa igbu ya, o ji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma ruo mgbe ọ nwụrụ. (Jọn 18:36, 37) Ka oge ọ ga-eji ndụ ya chụọ àjà na-eru, ọ gbasiri mbọ ike inyere ndị ọzọ aka ka ha mara Jehova.

5. Olee otú Jizọs si yie onye ọrụ ubi vaịn o kwuru okwu ya n’ihe atụ ahụ?

5 N’afọ 32, Jizọs mere ihe atụ banyere otu nwoke nke nwere osisi fig a kụrụ n’ubi vaịn ya, ma osisi ahụ amịbeghị mkpụrụ kemgbe afọ atọ. Mgbe onye nwe osisi fig ahụ gwara onye ọrụ ubi vaịn ya ka o gbutuo osisi fig ahụ, onye ọrụ ubi vaịn ahụ gwara ya ka a hapụkwuo osisi ahụ ka ya tinye nsị anụ gburugburu ya. (Gụọ Luk 13:6-9.) Ọ bụ naanị mmadụ ole na ole na-eso ụzọ Jizọs n’oge ahụ. Ma, ihe atụ ahụ Jizọs mere gosiri na ya chọrọ iji obere oge fọrọ rụsie ọrụ ike tupu ya anwụọ. N’ihi ya, o ji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma na Judia na Peria ruo ihe dị ka ọnwa isii. Ụbọchị ole na ole tupu Jizọs anwụọ, o beere ndị obodo ha ákwá n’ihi na ha ekweghị anabata ozi ọma o ziri ha.—Mat. 13:15; Luk 19:41.

6. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-ekwusasi ozi ọma ike?

6 Ebe ọ bụ na anyị bi n’oge ikpeazụ, anyị kwesịrị ịna-eme ihe niile anyị nwere ike ime iji na-ekwusasi ozi ọma ike. (Gụọ Daniel 2:41-45.) O nweghị ihe ùgwù karịrị ịbụ Onyeàmà Jehova. Ọ bụ naanị anyị na-agwa ụmụ mmadụ nke bụ́ eziokwu gbasara otú nsogbu ụmụ mmadụ ga-esi bie. Otu onye na-ede akwụkwọ akụkọ kwuru na e nwebeghị onye nwere ike ịza ajụjụ bụ́, “Gịnị mere ihe ọjọọ ji eme ndị ezigbo mmadụ?” Ma, Baịbụl gwara anyị ihe kpatara ya, ọ bụkwa ọrụ anyịnwa bụ́ Ndị Kraịst ịgwa ya ndị chọrọ ịnụ. Ọrụ a Jehova nyere anyị bụ ihe ùgwù. N’ihi ya, anyị kwesịrị iji ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ya. (Rom 12:11) Ọ bụrụ na anyị e jiri ịnụ ọkụ n’obi na-eje ozi ọma, Jehova ga-agọzi ozi anyị ma mee ka anyị nwee ike inyere ndị mmadụ aka ịmata ya ma hụ ya n’anya.

OTÚ ANYỊ SI EWEPỤTA ONWE ANYỊ NA-EME KA E TOO JEHOVA

7, 8. Olee otú mmadụ iwepụta onwe ya si eme ka e too Jehova?

7 Pọl onyeozi diri ọtụtụ nsogbu mgbe ọ na-ekwusa ozi ọma. Dị ka ihe atụ, e nwere mgbe ọ mụrụ “anya abalị” na mgbe ọ nọrọ “ọtụtụ ugboro n’erighị nri.” (2 Kọr. 6:5) Ụmụnna anyị nọ ebe dị iche iche na-edikwa ụdị nsogbu ndị ahụ. Ikwusa ozi ọma bụ ọrụ kacha mkpa ndị ọsụ ụzọ oge niile na-arụ, ma, ọtụtụ n’ime ha nwekwara ọrụ ha ji akpata ego. Chegodị banyere ndị ozi ala ọzọ bụ́ ndị na-agbasi mbọ ike ikwusa ozi ọma n’ebe e zigara ha. E nwere ike ịsị na ha ‘na-awụsa onwe ha dị ka àjà ihe ọṅụṅụ.’ (Fil. 2:17) E nwekwara oge ndị okenye na-akwụ agụụ ma ọ bụ mụọ anya abalị ka ha nwee ike ilekọta atụrụ Jehova. Ndị agadi na ndị ahụ́ na-adịghị na-agbalịkwa ịbịa ọmụmụ ihe ma na-aga ozi ọma. Ịhụ otú ụmụnna ndị a si ewepụta onwe ha eje ozi na-agba anyị ume. Ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova na-ahụkwa mbọ a anyị na-agba.

8 Otu nwoke na-abụghị Onyeàmà Jehova degaara otu ụlọ ọrụ na-ebipụta akwụkwọ akụkọ na Briten akwụkwọ ozi. Ọ sịrị: ‘Ọtụtụ ndị atụkwasịzighị obi n’okpukpe. Oleedị ihe ndị isi chọọchị na-eme kwa ụbọchị? O doro anya na ha anaghị aga ezi ndị mmadụ ozi ọma otú ahụ Kraịst mere. Naanị ndị yiri ka hà na-eche banyere ndị mmadụ bụ Ndịàmà Jehova. Ha na-aga n’ụlọ ndị mmadụ akụziri ha eziokwu si na Baịbụl.’ Ọtụtụ ndị achọghị ịna-ewepụta onwe ha imere ndị ọzọ ihe. Ma, anyị na-eme ka e too Jehova Chineke n’ihi na anyị na-ewepụta onwe anyị ezi ndị ọzọ ozi ọma.—Rom 12:1.

Naanị anya ndị mmadụ hụrụ gị n’ozi ọma na-agbara ha àmà

9. Gịnị nwere ike inyere anyị aka iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma?

9 Ma, gịnị ka anyị nwere ike ime ma ọ bụrụ na anyị anaghịzi eji ịnụ ọkụ n’obi  ekwusa ozi ọma otú anyị na-emebu? Ịtụgharị uche n’ihe Jehova ji ọrụ ikwusa ozi ọma arụpụta ga-enyere anyị aka. (Gụọ Ndị Rom 10:13-15.) Ọ bụ ndị nwere okwukwe na Jehova ma na-akpọku aha ya ka a ga-azọpụta. Ma, ndị mmadụ agaghị akpọkuli aha Jehova ma ọ bụrụ na anyị ezighị ha ozi ọma. Ebe ọ bụ na anyị ma na e kwesịrị izi ndị mmadụ ozi ọma, anyị kwesịrị iji ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ezi ọrụ ma jiri ike anyị niile na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke.

ÀGWÀ ỌMA ANYỊ NA-EME KA NDỊ MMADỤ CHỌỌ ỊMATA CHINEKE

Ndị mmadụ na-ahụ gị mgbe ị na-akwụwa aka ọtọ ma na-arụsi ọrụ ike

10. Gịnị mere a ga-eji kwuo na àgwà ọma anyị na-eme ka ndị mmadụ chọọ ife Jehova?

10 Anyị kwesịrị iji ịnụ ọkụ n’obi na-ezisa ozi ọma, ma, ọ bụghị naanị ya ga-eme ka ndị mmadụ chọọ ịmata Chineke. Àgwà ọma Ndị Kraịst na-akpa bụ ihe ọzọ so adọta ndị mmadụ n’ebe Chineke nọ. Pọl onyeozi kwuru ihe mere àgwà anyị ji dị mkpa. O kwuru, sị: “Anyị adịghị eme ihe ịsụ ngọngọ n’ụzọ ọ bụla, ka e wee ghara ịhụta mmejọ n’ozi anyị.” (2 Kọr. 6:3) Okwu ọma anyị na àgwà ọma anyị na-achọ ozizi Chineke mma, na-emekwa ka ndị ọzọ chọọ ife Jehova. (Taị. 2:10) Anyị na-anụkarị gbasara ndị ghọrọ Ndịàmà Jehova n’ihi na ha hụrụ na anyị na-akpa àgwà ọma.

11. Gịnị mere anyị ji kwesị ichebara àgwà anyị echiche?

11 Otú ahụ àgwà ọma anyị nwere ike ime ka ndị mmadụ chọọ ịmụta eziokwu ka àgwà ọjọọ anyị nwekwara ike ime ka ha ghara ịchọ ịmụta eziokwu. N’ihi ya, ma ànyị nọ n’ebe anyị na-arụ ọrụ ma ànyị nọ n’ụlọ anyị ma ànyị nọ n’ụlọ akwụkwọ, anyị kwesịrị ịhụ na anyị anaghị eme ihe ọ bụla ga-eme ka ndị mmadụ ghara ịchọ ịmụta banyere Jehova. Ọ bụrụ na anyị akpachara anya na-eme mmehie, o nwere ike ime ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma ruo mgbe ebighị ebi. (Hib. 10:26, 27) N’ihi ya, anyị kwesịrị ichebara ụdị àgwà anyị na-akpa echiche, na-ariọkwa Jehova ka o nyere anyị aka ịna-akpa àgwà ga-eme ka ndị ọzọ chọọ ife ya. Ebe ọtụtụ ndị na-akpa  àgwà ọjọọ taa, ọ ga-adịrị ndị chọrọ ife Chineke mfe ịhụ “ihe dị iche n’etiti . . . onye na-ejere Chineke ozi na onye na-adịghị ejere ya ozi.” (Mal. 3:18) N’eziokwu, àgwà ọma anyị so enyere ndị mmadụ aka ka ha na Chineke dịrị ná mma.

12-14. Ọ bụrụ na anyị atachie obi mgbe a na-akpagbu anyị, gịnị ka o nwere ike ime ka ndị na-anaghị efe Jehova mee? Nye ihe atụ.

12 N’akwụkwọ ozi nke abụọ Pọl onyeozi degaara ndị Kọrịnt, o kwuru na a kpagburu ya, tie ya ihe, tụọkwa ya mkpọrọ n’ihi ozi ọma ọ nọ na-ekwusa. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 6:4, 5.) Ọ bụrụ na anyị na-atachi obi mgbe a na-akpagbu anyị, o nwere ike ime ka ndị ọzọ malite ife Jehova. Dị ka ihe atụ: Afọ ole na ole gara aga, ụfọdụ ndị n’Angola chọrọ igbuchapụ Ndịàmà Jehova. Otu ụbọchị, ha kpụụrụ ụmụnna abụọ e mere baptizim na mmadụ iri atọ ndị ọzọ bịara ọmụmụ ihe, pịawa ha ihe. Ha pịagidere ha ihe ọbara agbawa ha n’ahụ́. Ha kpọkọkwara ndị obodo ahụ ka ha hụ ahụhụ a na-ata ụmụnna ndị a aka ha dị ọcha. Ha pịadịrị ụmụ nwaanyị na ụmụaka ihe. Ihe mere ha ji kpọkọọ ndị obodo ahụ bụ ka ụjọ ghara ikwe onye ọ bụla gee Ndịàmà Jehova ntị. Ma, mgbe a pịachara ụmụnna anyị ndị ahụ ihe, ọtụtụ n’ime ndị obodo ahụ gwara ha ka ha mụwara ha Baịbụl. N’ihi ya, ụmụnna kwusasiwara ozi ọma ike, ọtụtụ ndị aghọọ Ndịàmà Jehova, Jehova agọziekwa ụmụnna anyị.

13 Ihe a mere n’obodo a na-egosi na ọ bụrụ na ndị mmadụ hụ otú anyị si tachie obi mgbe a na-akpagbu anyị, o nwere ike ime ka ha ghọọ Ndịàmà Jehova. Ọ ga-abụ na ọtụtụ ndị malitere ife Jehova oge ahụ Pita na ndịozi ndị ọzọ katara obi na-ekwusasi ozi ọma ike n’agbanyeghị otú e si kpagbuo ha. (Ọrụ 5:17-29) Ụmụ akwụkwọ ibe anyị, ma ọ bụ ndị ọrụ ibe anyị, ma ọ bụkwanụ ndị ezinụlọ anyị nwekwara ike ịbata n’ọgbakọ ma ha hụ na anyị kwụdosiri ike mgbe a na-akpagbu anyị.

14 E nweghị mgbe a na-anaghị akpagbu ụmụnna anyị. Dị ka ihe atụ, n’obodo a na-akpọ Aminia, ihe dị ka ụmụnna iri anọ nọ n’ụlọ mkpọrọ ugbu a n’ihi na ha jụrụ ịbụ ndị agha. A ka nwekwara ike ịtụ ọtụtụ ụmụnna ndị ọzọ mkpọrọ n’obodo ahụ ka oge na-aga. N’Eritria, ụmụnna iri ise na ise nọkwa n’ụlọ mkpọrọ, ụfọdụ n’ime ha akarịakwala afọ iri isii. Na Saụt Koria, ihe dị ka narị ụmụnna asaa nọkwa n’ụlọ mkpọrọ n’ihi na ha jụrụ ịbụ ndị agha. O ruokwala iri afọ isii a malitere ịtụ ụmụnna anyị mkpọrọ n’obodo a. Anyị niile kwesịrị ịna-ekpe ekpere ka ụmụnna ndị a kwụsie ike n’okwukwe ha nakwa ka àgwà ha mee ka e too Chineke, meekwa ka ndị ọzọ malite ife Jehova.—Ọma 76:8-10.

15. Kọọ ihe mere eme nke gosiri na ndị mmadụ nwere ike ifewe Jehova ma ọ bụrụ na anyị na-akwụwa aka ọtọ.

15 Ndị mmadụ nwekwara ike ịchọ ịmụta eziokwu ma ọ bụrụ na anyị na-akwụwa aka ọtọ. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 6:4, 7.) Dị ka ihe atụ, otu ụbọchị, otu nwanna nwaanyị na enyi ya bara ụgbọala ga-ebuga ha ebe na-adịchaghị anya. Mgbe nwanna nwaanyị ahụ chọrọ inye onye na-akwọ ụgbọala ahụ ego, enyi ya gwara ya na ọ baghị uru ịkwụwa ụgwọ n’ihi na ebe e bu ha aga adịghị anya. Nwanna nwaanyị ahụ kọwaara enyi ya na o kwesịrị ịna-akwụ ụgwọ mgbe ọ bụla ọ bara ụgbọala, ọ sọkwa ya ya bụrụ na e buteghị ya aka. Mgbe ha gbatụrụ obere, enyi ya ahụ si n’ụgbọala ahụ rituo. Mgbe ahụ ka onye na-akwọ ụgbọala ahụ tụgharịrị, jụọ nwanna nwaanyị ahụ ma ọ̀ bụ Onyeàmà Jehova. Nwanna nwaanyị ahụ sịrị ya ee, ma jụọ ya ihe mere o ji na-ajụ. Nwoke ahụ asị na ya nụrụ ihe nwanna nwaanyị ahụ na enyi ya nọ na-ekwu. O kwukwara na ya ma na Ndịàmà Jehova so ná mmadụ ole na ole na-akwụ ụgwọ ụgbọala mgbe niile, nakwa na ha na-akwụwa aka ọtọ n’ihe ọ bụla ha na-eme. Ka ọnwa ole na ole gachara, otu nwoke bịakwutere nwanna nwaanyị ahụ n’ọmụmụ ihe, sị ya, ‘Ị̀ matara m? Abụ m ọkwọ  ụgbọala gị na ya kwuru banyere ịkwụ ụgwọ ụgbọala. Otú ahụ i si kwụwa aka ọtọ mere ka m gwa Ndịàmà Jehova ka ha mụwara m Baịbụl.’ Ọ bụrụ na ndị mmadụ hụ na anyị na-akwụwa aka ọtọ, ha ga-ekweta na ihe anyị na-ezi ha n’ozi ọma bụ eziokwu.

HỤ NA OMUME GỊ NA-EME KA E TOO CHINEKE

16. Gịnị ka ndị mmadụ nwere ike ime ma ọ bụrụ na anyị na-atachi obi, hụ ndị mmadụ n’anya ma na-emere ha obiọma? Kwuo ihe ndị isi chọọchị na-eme.

16 Ọ bụrụ na anyị na-atachi obi, hụ ndị mmadụ n’anya ma na-emere ha obiọma, anyị nwere ike ime ka ha chọọ ife Jehova. Ụfọdụ ndị nwere ike chọọ ịmụta gbasara Jehova, nzube ya, nakwa gbasara ndị na-ejere ya ozi ma ha hụ àgwà ọma anyị na-akpa. Otú ezigbo Ndị Kraịst si emeso ndị ọzọ na otú ha si akpa àgwà na-eme ka ndị mmadụ too Chineke. Ụfọdụ ndị isi chọọchị na-eme ka à ga-asị na ha bu ihe ọma n’obi. Ma, ha na-aghara ndị chọọchị ha ụgha iji napụta ha ego. Ụfọdụ na-ejidị ego ndị chọọchị tụkọtara arụrụ onwe ha ụlọ ndị oké ozu, zụrụkwa ụgbọala ndị dị oké ọnụ. Otu onyeisi chọọchị rụdịịrị nkịta ya ụlọ e tinyere ntụ oyi. Ndị isi chọọchị ndị a anaghị eme ihe Kraịst kwuru, nke bụ́ “na-enyenụ n’efu.” (Mat. 10:8) Kama, ha yiri ndị nchụàjà arụrụala e nwere n’Izrel oge ochie. Ha “anaghị ezi ihe ma ọ bụrụ na a kwụghị ha ụgwọ,” ihe ha na-ezikwa abụghị ihe Chineke kwuru. (Maị. 3:11) Ụdị omume a anaghị eme ka Chineke na mmadụ dịrị ná mma.

17, 18. (a) Olee otú àgwà ọma anyị si eme ka e too Jehova? (b) Gịnị mere i ji arụ ezi ọrụ?

17 Ma, ndị mmadụ na-achọ ịbụ ndị enyi Chineke ma ha hụ na ihe anyị na-akụzi bụ eziokwu nakwa na anyị na-emere ndị mmadụ obiọma. Dị ka ihe atụ, mgbe otu nwanna nwoke bụ́ ọsụ ụzọ na-aga ozi ụlọ n’ụlọ, ọ kụrụ aka n’ụlọ otu nwaanyị merela agadi nke di ya nwụrụla. Mgbe nwaanyị ahụ pụtara, ọ gwara nwanna ahụ na ya enweghị efe n’ihi na ya na-agbanwe ọkụ mebiri n’usekwu ya. Nwanna ahụ gwara ya na o nwere ike imerụ ahụ́ ma o jiri aka ya mee ya. Ọ gara gbanweere ya ọkụ ahụ, gawazie n’ụlọ ọzọ. Mgbe nwaanyị ahụ kọọrọ nwa ya nwoke ihe merenụ, o metụrụ ya n’ahụ́ nke ukwuu, ya achọwakwa nwanna ahụ ka o kelee ya. Nwa nwaanyị ahụ mechara malite ịmụ Baịbụl.

18 Olee ihe mere i ji kpebie ịna-arụ ezi ọrụ? O nwere ike ịbụ n’ihi na ị ma na ndị mmadụ ga-eto Jehova ma ọ bụrụ na anyị ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma ma na-eme ihe otú Chineke chọrọ. Anyị ga-esikwa otú ahụ nyere ndị mmadụ aka ka a zọpụta ha. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 10:31-33.) Ihe ọzọ mere anyị ji jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma ma na-akpa àgwà ọma bụ na anyị chọrọ igosi na anyị ji obi anyị niile hụ Chineke na mmadụ ibe anyị n’anya. (Mat. 22:37-39) Anyị ga-enwe ọṅụ, obi ga-erukwa anyị ala ma ọ bụrụ na anyị ji ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ezi ọrụ. Anyị ga na-atụkwa anya mgbe ụmụ mmadụ niile ga-eji obi ụtọ na-efe Onye kere anyị, bụ́ Jehova, na-etokwa ya ruo mgbe ebighị ebi.