Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Eprel 2013

Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha na Meksiko

Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha na Meksiko

OBI na-adị anyị ụtọ ịhụ ka ọtụtụ ndị na-eto eto bụ́ Ndịàmà Jehova na-ahapụ ihe ụfọdụ na-eri ha oge ka ha nwee ike iwepụtakwu oge na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. (Mat. 6:22) Olee otú ha si eme ya? Olee nsogbu ndị ha na-enwe? Ka anyị si n’aka ụfọdụ ndị na-eje ozi ugbu a na Meksiko mata azịza ajụjụ ndị a.

‘ANYỊ GBANWERE IHE ỤFỌDỤ ANYỊ NA-EME’

Dustin na Jassa, bụ́ ndị Amerịka, gbara akwụkwọ n’ọnwa mbụ n’afọ 2007. Ka obere oge gachara, ha zụtara ihe ha na-atụ anya ya kemgbe, ya bụ, ụgbọ mmiri nke ha ga-ebi n’ime ya mgbe niile n’afọ. Ha kedoro ya n’ebe dị nso n’obodo Astoria, nke dị n’Oregọn, n’Amerịka. Obodo ahụ mara mma, ọ dịghịkwa anya n’Oké Osimiri Pasifik. Ọhịa na ugwu gbara ya gburugburu. E nwekwara ugwu ndị snoo kpuchiri elu ha. Dustin kwuru, sị: “I legharịa anya, ihe ị ga-ahụ ga-eju gị anya!” Di na nwunye a chere na ha anaghị ebi ndụ okomoko, na ha tụkwasịrị Jehova obi. Ha chere, sị: ‘A sị ka e kwuwe, anyị bi n’ụgbọ mmiri na-ebughị nnukwu ibu, na-arụ ọrụ na-anaghị ewekọrọ oge anyị, nọrọ n’ọgbakọ ji asụsụ mba ọzọ amụ ihe, na-asụkwa ụzọ inyeaka mgbe ụfọdụ.’ Ma n’oge na-adịghị anya, ha kwuru na ha na-aghọgbu onwe ha. Dustin kwuru, sị: “Kama ịna-akwado ọgbakọ anyị, anyị na-eji ọtụtu awa arụzi ụgbọ mmiri anyị. Anyị ma na ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ka ozi Jehova bụrụ ihe  kacha mkpa ná ndụ anyị, anyị kwesịrị ịgbanwe ihe ụfọdụ anyị na-eme.”

Jassa kwuru, sị: “Tupu mụ alụọ di, m biri na Meksiko ma nọrọ n’ọgbakọ na-eji asụsụ Bekee amụ ihe. Obi dị m ụtọ mgbe m na-eje ozi ọma n’ebe ahụ, ọ na-agụkwa m agụụ ịlaghachi ebe ahụ.” Dustin na Jassa malitere iji oge ofufe ezinụlọ ha na-agụ akụkọ banyere ụmụnna ndị kwagara n’ebe e nwere ọtụtụ ndị chọrọ ịnụ ozi ọma. Ihe mere ha ji na-eme ya bụ ka obi sie ha ike ịga kwusawa ozi ọma ná mba ọzọ. Ebe ndị ahụ yiri ubi charala acha maka owuwe ihe ubi. (Jọn 4:35) Dustin kwuru, sị: “Anyị chọkwara inwe ụdị ọṅụ ụmụnna ndị ahụ na-enwe.” Mgbe ndị enyi Dustin na Jassa nọ na Meksiko gwara ha na e nwere ụmụnna ndị bi n’ebe a na-enwebeghị ọgbakọ e kwesịrị inyere aka, ha kpebiri ịkwaga ebe ahụ. Ha gbara arụkwaghịm n’ọrụ ha, ree ụgbọ mmiri ha ma kwaga Meksiko.

“IHE KACHA MMA METỤỤRỤLA ANYỊ”

Dustin na Jassa gara biri n’obodo Tekoman, nke dị nso n’Oké Osimiri Pasifik. Ọ dị ihe dị ka puku kilomita anọ na narị atọ na iri anọ na ise ma é si n’ebe ndida Astoria gawa ya. Dustin kwuru, sị: “Ikuku ndụ na-eku n’obodo ebe anyị si bịa. E nwekwara ugwu ndị gbara anyị gburugburu. Ma, ebe a anyị bi ugbu a na-ekpo ọkụ. Ihe anyị na-ahụkwa bụ naanị úkwù osisi oroma lemọn.” Ha enwetaghị ọrụ ozugbo ha kwagara ebe ahụ. Ebe ọ bụ na ha enweghị ego, ọ bụ otu ụdị nri ka ha na-eri ugboro abụọ n’ụbọchị. Jassa kwuru, sị: “Ma mgbe o yiri ka ànyị agaghịzi edili ụdị nri ahụ, ndị anyị na-amụrụ Baịbụl malitere inye anyị mango, unere, pọpọ, na akpa oroma!” Ka oge na-aga, ha nwetara ọrụ n’ụlọ akwụkwọ dị na Taịwan nke na-anọ n’Ịntanet akụziri ndị mmadụ asụsụ. Ego ha na-arụta ugbu a na-ezuru ha igbo mkpa ha kwa ụbọchị.

Gịnị ka Dustin na Jassa kwuru banyere mgbanwe ndị ahụ ha mere? Ha kwuru, sị: “Nkwafeta anyị kwafetara ebe a bụ ihe kacha mma metụụrụla anyị. O meela ka anyị na Jehova dịkwuo ná mma, anyị abụọ adịkwuokwa ná mma karịa mgbe mbụ. Anyị na-emekọ ọtụtụ ihe ọnụ kwa ụbọchị, dị ka ịga ozi ọma, ịkparịta otú anyị ga-esi nyere ndị anyị na-amụrụ Baịbụl aka, na ịkwado ihe a ga-amụ n’ọmụmụ ihe. Uru ọzọ anyị na-erite bụ na anyị anaghịzi enwe ụdị nsogbu ndị anyị nwere n’oge gara aga.” Ha kwukwara, sị: “Anyị aghọtala ihe anyị na-aghọtabughị nke ọma, ya bụ na nkwa ahụ e kwere n’Abụ Ọma 34:8 bụ eziokwu. Ebe ahụ kwuru, sị: ‘Detụnụ Jehova ire ma hụ na ọ dị mma.’”

GỊNỊ MERE ỌTỤTỤ PUKU NDỊ ỌRỤ JI EWEPỤTA ONWE HA?

Ihe karịrị puku ụmụnna abụọ na narị itoolu akwagala n’ebe dị iche iche na Meksiko, bụ́ ebe a chọkwuru ndị ga na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Ha bụ ma ndị lụrụ di na nwunye ma ndị na-alụbeghị. Ọtụtụ n’ime ha nọ n’agbata afọ iri abụọ na otu na afọ iri atọ  na itoolu. Gịnị mere ụmụnna ndị a niile ji kweta ịrụ ọrụ a siri ike? Mgbe a jụrụ ụfọdụ n’ime ha ajụjụ a, ha kwuru na e nwere ihe atọ mere ha ji eme ya. Gịnị bụ ihe ndị ahụ?

Leticia na Hermilo

Igosi na ha hụrụ Jehova na mmadụ ibe ha n’anya. E mere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Leticia baptizim mgbe ọ dị afọ iri na asatọ. O kwuru, sị: “Mgbe m nyefere Jehova onwe m, aghọtara m na ọ pụtara na m ga-eji obi m niile na mkpụrụ obi m niile na-ejere ya ozi. N’ihi ya, achọrọ m ijikwu oge m na ike m na-ejere Jehova ozi iji gosi na m ji mkpụrụ obi m niile hụ ya n’anya.” (Mak 12:30) Di Leticia bụ Hermilo. Mgbe ọ dị ihe dị ka iri afọ abụọ na atọ, ọ kwagara n’ebe a chọkwuru ndị ga na-ekwusa ozi ọma. Ọ sịrị: “Aghọtara m na otú kacha mma m ga-esi gosi na m hụrụ ndị agbata obi m n’anya bụ inyere ha aka ịmata Chineke.” (Mak 12:31) N’ihi ya, o si n’obodo Mọnteree kwaga n’otu obere obodo. Mgbe o bi na Mọnteree, ọ na-arụ ọrụ n’ụlọ akụ̀, nweekwa ihe ndị e ji enyere ndụ aka.

Essly

Inwe ezigbo ọṅụ nke na-adịte aka. Obere oge ka e mechara Leticia baptizim, o so otu nwanna nwaanyị bụ́ ọsụ ụzọ kemgbe ọtụtụ afọ gaa otu obodo dịpụrụ adịpụ. Ha kwusara ozi ọma ebe ahụ otu ọnwa. Leticia kwuru, sị: “O juru m anya. Obi tọrọ m ezigbo ụtọ ịhụ otú ndị mmadụ si ege ntị n’ozi ọma anyị na-ezi ha. Mgbe ọnwa ahụ gwụrụ, agwara m onwe m, sị, ‘Ọ bụ ihe a ka m chọrọ iji ndụ m eme!’” Essly bụ nwanna nwaanyị ọzọ na-alụbeghị di nke na-eje ozi n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa. Ọ dị ihe dị ka afọ iri abụọ na atọ ugbu a. Ihe mere o ji kpebie ịga na-ekwusa ozi ọma n’ebe ahụ bụ na ọ hụrụ na ndị na-ekwusa ozi ọma n’ụdị ebe ahụ na-enwe obi ụtọ. Mgbe ọ na-aga ụlọ akwụkwọ sekọndrị, ọ matara ọtụtụ ụmụnna ndị na-anụ ọkụ n’obi, bụ́ ndị na-eje ozi n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa. O kwuru, sị, ‘Ahụrụ m na ihu na-abụ ụmụnna ndị ahụ ọchị ọchị. Ọ bụ ya mere m ji chọọ ime ihe ahụ ha na-eme.’ Ọtụtụ ụmụnna nwaanyị emeela ka Essly. Na Meksiko, ihe karịrị narị ụmụnna nwaanyị isii na iri asatọ na-eje ozi ugbu a n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa. Ma ndị na-eto eto ma ndị torola eto kwesịrị iṅomi ha.

Ibi ezigbo ndụ nke na-eme obi ụtọ. Mgbe Essly gachara ụlọ akwụkwọ sekọndrị, e nyere ya ohere agụmakwụkwọ n’efu na mahadum. Ndị ọgbọ ya gwara ya ka o kweta ịga nakwa ka o nwee ike ibi ụdị ndụ ndị ọzọ na-ebi, ya bụ, ka o nweta akara ugo mmụta, ọrụ, ụgbọala, na-agakwa mba dị iche iche. Ma, Essly emeghị ihe ha gwara ya. O kwuru, sị: “Ọtụtụ ndị enyi m bụ́ Ndị Kraịst na-achụ ihe ndị ahụ. Ma achọpụtara m na ihe kacha ha mkpa abụghịzi ihe gbasara ofufe Chineke. Achọpụtakwara m na ka ha na-etinyekwu isi n’ihe nke ụwa, nsogbu ndị na-abịara ha na-emecha mee ka obi koro ha n’elu. Achọrọ m iji oge m niile na-ejere Jehova ozi ugbu a m na-eto eto.”

Racquel na Phillip

 Essly gara mụọ ọrụ nyeere ya aka inweta ọrụ ọ ga-eji na-egbo mkpa ya ma na-asụ ụzọ. O mechara kwaga n’ebe a chọsiri ndị ga na-ekwusa ozi ọma ike. N’agbanyeghị na ịmụ asụsụ adịghị mfe, ọ malitere ịmụ asụsụ ndị Otomi na nke ndị Tilapaneko. O kwusaala ozi ọma n’ebe ndị dịpụrụ adịpụ ruo afọ atọ. O kwuru, sị: “Ikwusa ozi ọma n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa emeela ka obi dị m ụtọ, meekwa ka m na-ebi ezigbo ndụ. Nke kachanụ bụ na o meela ka mụ na Jehova dịkwuo ná mma.” Phillip na Racquel bụ di na nwunye si Amerịka. Ha dị ihe dị ka iri afọ atọ na atọ. Ha kwetara ihe ahụ Essly kwuru. Ha kwuru, sị: “Otú ihe si na-agbanwe n’ụwa emeela ka obi koro ọtụtụ ndị n’elu. Ma, ije ozi ọma n’ebe anyị na-ahụ ọtụtụ ndị chọrọ ịnụ ozi si na Baịbụl na-eme ka obi sie anyị ike na anyị na-eme ihe bara uru. Ọ na-eme ka obi dị anyị ụtọ!”

OTÚ E SI EMERI IHE ISI IKE

Verónica

N’eziokwu, ije ozi n’ebe a chọkwuru ndị ga na-ekwusa ozi ọma adịghị mfe. Ihe nwere ike isiri mmadụ ike bụ ịkpata ego ọ ga-eji na-egbo mkpa ya. Ihe ga-enyere gị aka bụ ime ka ebe ahụ mara gị ahụ́. E nwere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Verónica. Ọ bụ ọsụ ụzọ kemgbe ọtụtụ afọ. O kwuru, sị: “N’otu ebe m jere ozi, m na-esi nri ndị dị ọnụ ala ma na-ere ya. N’ebe ọzọkwa, ihe m na-eme bụ ire ákwà na ịkpụ ndị mmadụ isi. Ugbu a, m na-ehichara ndị mmadụ ụlọ, na-akụzikwara ndị mụrụ ụmụ mbụ ha otú ha na ụmụ ha ga-esi na-ekwurịta okwu.”

Ọ bụrụ na mmadụ kwagara obodo ọzọ, o nwere ike isiri ya ike ime ka omume ndị ebe ahụ na omenala ha mara ya ahụ́, nke ka nke, ma ọ bụrụ na onye ahụ bi n’etiti ndị na-asụ otu asụsụ n’ebe dịpụrụ adịpụ. Ọ bụ otú ahụ ka ọ dị Phillip na Racquel mgbe ha na-eje ozi n’ebe a na-asụ asụsụ Nawatụl. Phillip kwuru, sị: “Omenala ndị ebe ahụ dị ezigbo iche.” Gịnị nyeere ha aka ime ka ebe ahụ mara ha ahụ́? O kwuru, sị: “Ihe dị anyị mkpa bụ ihe ọma ndị anyị hụrụ ndị Nawatụl na-eme, dị ka otú ezinụlọ ha si dị n’otu, otú ha si akwụwa aka ọtọ mgbe ha na ndị ọzọ na-emekọ ihe, na otú ha si emesapụ aka.” Nwunye ya bụ́ Racquel kwukwara, sị: “Anyị mụtara ọtụtụ ihe n’ebe ahụ anyị biri, mụtakwa ihe n’aka ụmụnna anyị ndị anyị na ha jekọrọ ozi n’ebe ahụ.”

OTÚ Ị GA-ESI JIKERE

Ọ bụrụ na ị chọrọ ije ozi n’ebe ndị dịpụrụ adịpụ a chọkwuru ndị ga na-ekwusa ozi ọma, gịnị ka ị ga-eme ugbu a ka i nwee ike ijikere? Ụmụnna ndị jetụrụla ụdị ozi a kwuru, sị: ‘Tupu gị akwaga ebe ahụ, hapụ ibi ndụ okomoko, meekwa ka ihe ndị i nwere ju gị afọ.’ (Fil. 4:11, 12) Olee ihe ọzọ i nwere ike ime? Leticia kọrọ, sị: “Ekweghị m arụ ụdị ọrụ ga-eke m agbụ n’otu ebe ruo ọtụtụ afọ. Achọrọ m inwe ike ịkwapụ mgbe ọ bụla, kwaga ebe ọ bụla e nwere mkpa.” Hermilo kwuru, sị: “M mụtara otú e si esi nri, otú e si asa ákwà, na otú e si ede ya ayọn.” Verónica kọrọ, sị: “Mgbe mụ na papa m na mama m na ụmụnne m ka bi, m na-enye aka ehicha ụlọ, mụtakwa otú e si eji obere ego esi nri na-enye ihe n’ahụ́. M mụtakwara otú e si eji ego eme ihe bara uru.”

Amelia na Levi

Levi na Amelia bụ ndị Amerịka. Ha bụ di na nwunye kemgbe afọ asatọ. Ha kọrọ otú ịkpọ okwu aha n’ekpere si nyere ha aka ijikere ịga jewe ozi na Meksiko. Levi kwuru, sị: “Anyị gbakọrọ ego ole ga-ezuru anyị ije ozi ná mba ọzọ ruo otu afọ. Anyị kpekwara ekpere rịọ Jehova ka o nyere anyị aka ịkpata ego ole ahụ.” Ha ji ọnwa ole na ole kpata ego ahụ ha gwara Jehova n’ekpere. Ha kwapụkwara n’egbughị oge. Levi kwuru, sị: “Jehova meere anyị ihe anyị rịọrọ ya. N’ihi ya, anyịnwa kwesịrị imezu nkwa anyị kwere ya.” Nwunye ya bụ́ Amelia kwuru, sị: “Anyị chere na anyị ga-anọ naanị otu afọ. Ma, anyị ebiela ebe a afọ asaa. Anyị echetụbeghịkwa echiche ịla! Ibi ebe a emeela ka anyị jiri anya anyị hụ otú Jehova si enyere anyị aka. Kwa ụbọchị, anyị na-ahụ ihe gosiri na Jehova dị mma.”

Adam na Jennifer

Adam na Jennifer bụkwa ndị Amerịka. Ha na-eje ozi ugbu a n’ebe a na-asụ Bekee n’obodo Meksiko. Ekpere nyeere ha ezigbo aka. Aro ha tụrụ bụ: “Echela ka ihe niile zuoro gị. Kpee ekpere, gwa Jehova na ị chọrọ ịga jeere ya ozi ná mba ọzọ. Mee ihe gosiri na ekpere ahụ si gị n’obi. Kwụsị ihe ndị na-eri gị oge. Degara alaka ụlọ ọrụ dị ná mba ahụ ị chọrọ ịkwaga akwụkwọ. Ị gụkọchaa ihe ọ ga-ewe gị, kwaga ebe ahụ!” * I mee otú ahụ, ị ga-ebi ezigbo ndụ nke ga-atọ gị ụtọ n’ozi Chineke n’ebe ahụ.

^ para. 21 Ị chọọ ịgụkwu banyere ije ozi ná mba ọzọ, gụọ isiokwu bụ́ “Ì Nwere Ike ‘Ịgafe na Masedonia’?” n’Ozi Alaeze Anyị nke Nọvemba 2011.

GỤKWUO GBASARA YA

OLE NDỊ NA-EME UCHE JEHOVA TAA?

Ònye Bụ Onye Ozi Ala Ọzọ?

Olee otú onye ozi ala ọzọ si eje ozi ya? Olee ụlọ akwụkwọ pụrụ iche ha na-aga?