Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Mach 2013

Ì Nwere ‘Obi Ị Ga-eji Mara’ Jehova?

Ì Nwere ‘Obi Ị Ga-eji Mara’ Jehova?

“M ga-enye ha obi ha ga-eji mara m, na mụ onwe m bụ Jehova; ha ga-abụ ndị m.”—JERE. 24:7.

1, 2. Gịnị mere ụfọdụ ndị nwere ike iji chọọ ịma ihe gbasara fig?

Ị̀ RACHATỤLA mkpụrụ osisi a na-akpọ fig? O so ná mkpụrụ osisi ndị na-atọ ndị Izrel oge ochie ụtọ. (Nehọ. 3:12; Luk 13:6-9) A na-akụ fig n’ọtụtụ ebe n’ụwa taa. Ọ na-enye ezigbo ihe n’ahụ́; ụfọdụ ndị na-ekwu na ọ na-eme ka obi mmadụ na-arụ ọrụ nke ọma.

2 O nwere mgbe Jehova ji ndị mmadụ tụnyere fig. Ihe Chineke gwara ndị ahụ abụghị ihe fig ga-enye ha n’ahụ́. O si n’ọnụ Jeremaya kwuo banyere ihe dị n’obi ha. Ihe ahụ o kwuru gbasara ma obi anyị ma obi ndị anyị hụrụ n’anya. Ka anyị na-atụle ihe ahụ o kwuru, chee echiche banyere ihe Ndị Kraịst kwesịrị ịmụta na ya.

3. Gịnị ka fig ndị ahụ e kwuru okwu ha na Jeremaya isi iri abụọ na anọ nọchiri anya ya?

3 Ka anyị buru ụzọ leba anya n’ihe Chineke kwuru banyere fig n’oge Jeremaya. N’afọ 617 Tupu Oge Ndị Kraịst, mba Juda na-eme ihe jọgburu onwe ya n’anya Chineke. Chineke mere ka Jeremaya hụ ihe ga-eme ha n’ọdịnihu. O ji ụzọ fig abụọ mee ihe atụ, ya bụ, nke “dị ezigbo mma” na nke “mebiri emebi.” (Gụọ Jeremaya 24:1-3.) Fig ndị ahụ mebiri emebi nọchiri anya Eze Zedekaya na ndị ọjọọ dị ka ya, bụ́ ndị Eze Nebukadneza na ndị agha ya ga-ata ahụhụ. Ma e nwere ndị yiri fig ndị ahụ dị mma. Ụfọdụ n’ime ha bụ Ezikiel, Daniel na ndị enyi ya atọ nọ na Babịlọn, na ụfọdụ ndị Juu ndị ọzọ a ga-adọrọ n’agha n’oge na-adịghị anya laa Babịlọn. Ndị fọdụrụ n’ime ha ga-alaghachi Jeruselem, gaa wughachi obodo ahụ na ụlọ nsọ ya. Ha mere otú ahụ mgbe oge ruru.—Jere. 24:8-10; 25:11, 12; 29:10.

4. Gịnị mere ihe Chineke kwuru banyere ndị ahụ bụ́ ezigbo fig ji agba anyị ume?

4 Jehova kwuru banyere ndị ahụ ezigbo fig ndị ahụ nọchiri anya ha, sị: “M ga-enye ha obi ha ga-eji mara m, na mụ onwe m bụ Jehova; ha ga-abụ ndị m.”  (Jere. 24:7) Ọ bụ n’amaokwu a ka e si nweta isiokwu a. Ihe e kwuru na ya na-agbakwa anyị ezigbo ume! Chineke chọrọ inye ndị mmadụ ‘obi ha ga-eji mara’ ya. “Obi” a na-ekwu okwu ya ebe a gbasara otú mmadụ si ele ihe anya. N’eziokwu, i kwesịrị inwe ụdị obi ahụ ma soro ná ndị na-efe Chineke. Ihe ndị ga-enyere gị aka ime otú ahụ bụ ịmụ Okwu Chineke na ime ihe ị mụtara, ichegharị na ichigharị, inyefe Chineke onwe gị, na ịbụ onye e mere baptizim n’aha nke Nna, Ọkpara, na mmụọ nsọ. (Mat. 28:19, 20; Ọrụ 3:19) O nwere ike ịbụ na i meela ihe ndị ahụ, ma ọ bụkwanụ na ị na-aga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova, ya afọkwa obere ka i mechaa ihe ndị ahụ.

5. Olee ndị Jeremaya kacha dee banyere ha?

5 Ma ànyị emeela ihe ndị ahụ niile ma ọ bụ ụfọdụ n’ime ha, anyị ka kwesịrị ịna-eleru omume anyị anya nakwa otú anyị si eche echiche. Ihe ọzọ Jeremaya dere banyere obi nwere ike ime ka ị ghọta ihe mere anyị ji kwuo otú ahụ. Ebe ụfọdụ n’akwụkwọ Jeremaya kwuru banyere mba ndị gbara Juda gburugburu. Ma ndị Jeremaya kacha dee banyere ha bụ mba Juda mgbe ndị eze ise ya dị iche iche chịrị. (Jere. 1:15, 16) N’eziokwu, ndị Jeremaya dere banyere ha bụ ụmụ nwoke, ụmụ nwaanyị, na ụmụaka ndị nyeferela Jehova onwe ha. Ndị nna nna ha ji obi ha niile kpebie ịbụ mba pụrụ iche nke Chineke. (Ọpụ. 19:3-8) N’oge Jeremaya, ndị Juda kwetara na ha enyefeela Chineke onwe ha. Ha kwuru, sị: “Anyị abịakwutewo gị, n’ihi na ọ bụ gị, Jehova, bụ Chineke anyị.” (Jere. 3:22) Ma, ì chere na ha nwere ezigbo obi?

È KWESỊRỊ ỊWA HA OBI?

6. Gịnị mere anyị ji kwesị inwe mmasị n’ihe Chineke kwuru banyere obi?

6 Ndị dọkịta na-eji ígwè ọgbara ọhụrụ ahụ obi mmadụ na otú o si arụ ọrụ. Ma, ihe Jehova na-eme karịrị ya, dị ka o mere n’oge Jeremaya. Ihe o kwuru gosiri na o ruru eru ịma ihe anyị bu n’obi. O kwuru, sị: “Obi dị aghụghọ karịa ihe ọ bụla ọzọ, o sikwara ike njite. Ònye pụrụ ịmara ya? Mụ onwe m bụ́ Jehova na-enyocha obi, . . . ịkwụ onye ọ bụla ụgwọ dị ka ụzọ ya si dị, dị ka ihe o metara si dị.” (Jere. 17:9, 10) ‘Inyocha obi’ apụtaghị iji ígwè ọgbara ọhụrụ lee obi mmadụ, nke na-akụ ihe dị ka ijeri ugboro atọ n’ime afọ iri asaa ma ọ bụ afọ iri asatọ. Kama, Jehova na-ekwu banyere obi ihe atụ. Obi a na-ekwu okwu ya bụ ụdị onye mmadụ bụ, ihe na-agụ ya agụụ, ihe ọ na-eche n’echiche, otú o si akpa àgwà, otú o si ele ihe anya, na ihe ndị o kpebiri ime. I nwere ụdị obi ahụ. Chineke na-enyocha ya. Gịnwa nwekwara ike ịgbalị ịmata ihe dị gị n’obi.

7. Gịnị ka Jeremaya kwuru banyere obi ọtụtụ ndị Juu bi n’oge ya?

7 Ihe ga-enyere anyị aka ijikere maka inyocha obi anyị bụ ịjụ onwe anyị, sị, ‘Olee otú obi ihe atụ ọtụtụ ndị Juu n’oge Jeremaya dị?’ Ihe ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ a bụ ihe Jeremaya kwuru, nke nwere ike iju ndị mmadụ anya. O kwuru, sị: ‘Ụlọ Izrel dum bụ ndị a na-ebighị úgwù n’obi.’ Ihe ọ na-ekwu abụghị úgwù a na-ebi nwoke ọ bụla bụ́ onye Juu, n’ihi na o kwuru, sị: “‘Lee! Ụbọchị na-abịa,’ ka Jehova kwuru, ‘mgbe m ga-eme ka ha zaa ajụjụ, ya bụ, ndị niile e biri úgwù ma ka bụrụ ndị a na-ebighị úgwù.’” N’ihi ya, ndị Juu e biri úgwù ka bụ “ndị a na-ebighị úgwù n’obi.” (Jere. 9:25, 26) Gịnị ka ihe a e kwuru pụtara?

8, 9. Gịnị ka ọtụtụ ndị Juu n’oge Jeremaya kwesịrị ime obi ha?

8 Ihe Chineke gbara ndị Juu ume ka ha mee nyeere anyị aka ịmata ihe ịbụ “ndị a na-ebighị úgwù n’obi” pụtara. Ọ gwara ha, sị: “Bienụ . . . obi unu úgwù, unu ndị Juda na ndị bi na Jeruselem; ka ọnụma m ghara inwuru dị ka ọkụ . . . n’ihi omume ọjọọ unu.” Olee ebe omume ọjọọ ha si? O si n’obi ha. (Gụọ Mak 7:20-23.)  N’eziokwu, Chineke si n’ọnụ Jeremaya kwuo ebe omume ọjọọ ndị Juu ahụ si. Ha nupụụrụ Jehova isi n’ihi na obi ha jọrọ njọ. Ihe ha chọrọ ime na ihe ha na-eche n’echiche adịghị Chineke mma. (Gụọ Jeremaya 5:23, 24; 7:24-26.) Chineke gwara ha, sị: “Bienụ onwe unu úgwù maka Jehova, biekwanụ obi unu úgwù.”—Jere. 4:4; 18:11, 12.

9 N’ihi ya, ọ dị ka à ga-asị na e kwesịrị ịwa ndị Juu bi n’oge Jeremaya obi, ya bụ, ‘ibi obi ha úgwù’ otú ahụ ndị Izrel mere n’oge Mozis. (Diut. 10:16; 30:6) ‘Ibi obi ha úgwù’ pụtara iwepụ ihe mere ha ji kpọchie obi ha, ya bụ, echiche ha, ihe na-agụ ha agụụ, ma ọ bụ ihe ha chọrọ ime, bụ́ ihe ndị mere ka ha leghara iwu Chineke anya.—Ọrụ 7:51.

‘OBI ANYỊ GA-EJI MARA’ CHINEKE

10. Olee otú Devid si nyochaa obi ya? Olee otú anyị ga-esi mee ihe ahụ o mere?

10 Anyị kwesịrị ịna-ekele Chineke maka na ọ na-enyere anyị aka ịghọta ihe dị anyị n’obi! Ma ụfọdụ nwere ike iche, sị, ‘Gịnịkwanụ mere ihe a ji gbasa Ndịàmà Jehova taa?’ Ihe a na-ekwu abụghị na ọtụtụ Ndị Kraịst n’ọgbakọ dị iche iche na-eme ihe ọjọọ ma ọ bụ na ha bụ ‘fig mebiri emebi’ dị ka ọtụtụ ndị Juu n’oge ochie. Ndị Chineke taa ji obi ha niile na-ejere Jehova ozi. Ha na-emekwa omume ọma. Ma, chee echiche banyere arịrịọ Devid rịọrọ Jehova. Devid rịọrọ ya, sị: “Chineke, biko, nyochaa m, marakwa obi m. Nyochaa m, marakwa nchegbu m, lee ma m̀ na-eje ije n’ụzọ ọ bụla nke na-eweta ihe mgbu.”—Ọma 17:3; 139:23, 24.

11, 12. (a) Gịnị mere onye ọ bụla n’ime anyị ji kwesị ịna-enyocha obi ya? (b) Gịnị ka Chineke na-agaghị eme?

11 Jehova chọrọ ka onye ọ bụla n’ime anyị mara ya, ya bụ, ka anyị bụrụ ndị enyi ya ma na-eme ihe ọ chọrọ. Jeremaya kwuru banyere onye ezi omume, sị: “Gị onwe gị, Jehova nke ụsụụ ndị agha, na-enyocha onye ezi omume; ị na-ahụ akụrụ na obi.” (Jere. 20:12) Ebe ọ bụ na Onye Pụrụ Ime Ihe Niile na-enyocha ma obi onye ezi omume, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịna-agbalị ịchọpụta ihe dị anyị n’obi? (Gụọ Abụ Ọma 11:5.) Ka anyị na-eme otú ahụ, anyị nwere ike ịmata otú anyị si ele ihe anya, ihe anyị kpebiri ime, ma ọ bụ ihe dị anyị n’obi nke anyị kwesịrị ịgbanwe. Anyị nwere ike ịchọpụta ihe na-eme ka anyị na-akpọchi obi, ya bụ, ihe kwesịrị ime ka anyị bie obi anyị úgwù ma wepụ ihe ahụ na-adịghị mma. E nwere ike ikwu na ime otú ahụ dị ka ịwa anyị obi. Ọ bụrụ na i kwetara na ọ ga-adị mma ka i nyochaa obi gị, gịnị ka i nwere ike ile ma ị̀ ga-ahụ? Oleekwa otú i nwere ike isi gbanwee ihe ọ bụla i kwesịrị ịgbanwe?—Jere. 4:4.

12 Otu ihe doro anya bụ na anyị ekwesịghị ibu n’obi na Jehova ga-amanye anyị ịgbanwe. Ihe o kwuru banyere ndị ahụ bụ́ “fig ndị dị mma” bụ na ya “ga-enye ha obi ha ga-eji mara” ya. O kwughị na ya ga-amanye ha ka ha gbanwee obi ha. Ha kwesịrị ịchọ inwe obi ha ga-eji mara Chineke. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ime otú ahụ?

Ọ bụrụ na anyị na-enyocha obi anyị ma na-ewepụ ọchịchọ ọjọọ, Jehova ga-agọzi anyị

13, 14. Olee otú ihe dị Onye Kraịst n’obi nwere ike isi kpatara ya nsogbu?

13 Jizọs kwuru, sị: “N’obi ka echiche  ọjọọ, igbu ọchụ, ịkwa iko nke di ma ọ bụ nwunye, ịkwa iko, izu ohi, ịgba akaebe ụgha, nkwulu, si apụta.” (Mat. 15:19) O doro anya na ọ bụrụ na nwanna akpọchie obi kwaa iko ma ghara ichegharị, o nwere ike ime ka ya na Chineke ghara ịdị ná mma ruo mgbe ebighị ebi. Ma, o nwere ike ịbụ na mmadụ emeghị ụdị ihe ọjọọ ahụ, ma ya abụrụ na o kwela ka ọchịchọ ọjọọ gbawa mgbọrọgwụ n’obi ya. (Gụọ Matiu 5:27, 28.) O nwere ike ịbara onye ahụ uru ma o nyochaa obi ya. I nyochaa obi gị nke ọma, ị̀ ga-achọpụta na i nwere mmasị na-ekwesịghị ekwesị n’ebe onye na-abụghị nwoke ibe gị ma ọ bụ nwaanyị ibe gị nọ, bụ́ ihe Chineke kpọrọ asị, nke i kwesịkwara iwepụ n’obi gị?

14 Nwanna nke ‘na-egbughị ọchụ’ nwere ike iburu nwanna ya iwe n’obi, nke ga-eme ka ọ kpọọ nwanna ahụ asị. (Lev. 19:17) Ọ̀ ga-agbalịsi ike iwepụ ụdị obi ọjọọ ahụ nwere ike ime ka ọ kpọchie obi ya?—Mat. 5:21, 22.

15, 16. (a) Nye ihe atụ otú nwanna nwere ike isi gosi na o ‘bighị obi ya úgwù.’ (b) Gịnị mere i ji chee na ‘obi a na-ebighị úgwù’ na-ewe Jehova iwe?

15 Obi dị anyị ụtọ na ọtụtụ Ndị Kraịst enweghị ụdị obi ahụ jọgburu onwe ya. Ma, Jizọs kwukwara banyere “echiche ọjọọ.” Echiche ọjọọ pụtara otú mmadụ si ele ihe anya, nke nwere ike ime ka onye ahụ na-eme omume ọjọọ dị iche iche. Dị ka ihe atụ, mmadụ nwere ike ịna-eche na ịdụnyere ndị ikwu ya úkwù dị mkpa karịa ihe ọ bụla ọzọ. N’eziokwu, Ndị Kraịst kwesịrị ịhụ ndị ikwu ha n’anya, kama ịna-akpa àgwà ka ọtụtụ ndị ‘n’oge ikpeazụ a,’ bụ́ “ndị na-enweghị obi mmadụ.” (2 Tim. 3:1, 3) Ma, anyị nwere ike ịna-adụnyere ndị ikwu anyị úkwù n’agbanyeghị ihe ha mere. Ọtụtụ ndị na-ekwukarị na “ọbara siri ike.” N’ihi ya, a kpasuo onye ikwu ha iwe, ezigbo iwe nwere ike iwe ha, ha agbachitere ya n’agbanyeghị ihe o mere. Chegodị otú ụdị iwe ahụ si mee ka ụmụnne Daịna gbuo ọchụ. (Jen. 34:13, 25-30) Cheekwa ụdị iwe Absalọm bu n’obi, nke mere ka o gbuo nwanne ya, bụ́ Amnọn. (2 Sam. 13:1-30) Ọ́ bụghị “echiche ọjọọ” kpatara nsogbu ahụ niile?

16 O doro anya na ezi Ndị Kraịst anaghị egbu ọchụ. Ma, hà nwere ike iburu nwanna ha iwe n’obi n’ihi na o mejọrọ onye ikwu ha ma ọ bụ n’ihi na ha chere na nwanna ahụ mejọrọ onye ikwu ha? Ha nwere ike ịna-eze nwanna ahụ eze. Ha agaghị ekwe aga n’ụlọ ya. Ha agaghịkwanụ akpọ  ya ka ọ bịa n’ụlọ ha. (Hib. 13:1, 2) Ma Onye Kraịst nke hụrụ ụmụnna ya n’anya agaghị eme otú ahụ. N’eziokwu, Jehova, bụ́ Onye na-enyocha obi, nwere ike ịchọpụta na onye ahụ ‘ebibeghị obi ya úgwù.’ (Jere. 9:25, 26) Ma, cheta ndị ahụ Jehova gwara, sị: ‘Bienụ obi unu úgwù.’—Jere. 4:4.

NWEE ‘OBI E JI AMA CHINEKE’

17. Olee otú ịtụ egwu Jehova nwere ike isi nyere anyị aka inwe ụdị obi ga-eme ka anyị na-eme ihe Chineke chọrọ?

17 Gịnị ka ị ga-eme ma i nyochaa obi gị ma hụ na ị naghị erubere iwu Jehova isi ozugbo nakwa na e nwere ihe gosiri na i ‘bighị obi gị úgwù’? I nwere ike ịchọpụta na ị na-atụ egwu mmadụ, ma ọ bụ na ị chọrọ ịbụ onye a ma ama ma ọ bụ ibi ndụ okomoko, ma ọ bụkwanụ na ị na-emetụ isi ike ma ọ bụ na-eme ihe sọrọ gị. Ọ bụghị naanị gị nwere ụdị nsogbu ahụ. (Jere. 7:24; 11:8) E nwere ihe Jeremaya kwuru banyere ndị Juu na-ekwesịghị ntụkwasị obi n’oge ya. Ọ sịrị na obi ha ‘kpọchiri akpọchi, na ha na-enupụkwa isi.’ O kwukwara, sị: “Ha ekwughị n’obi ha, sị: ‘Ka anyị tụọ egwu Jehova bụ́ Chineke anyị, Onye na-eme ka e nwee nnukwu mmiri ozuzo na ụbịa mmiri na ụla mmiri n’oge ha.’” (Jere. 5:23, 24) Ihe ahụ ó gosighị na ọ bụ ịtụ egwu Jehova na ịkwanyere ya ùgwù ga-enyere anyị aka ‘ibi obi anyị úgwù’? Ịtụ egwu Jehova nwere ike inyere onye ọ bụla n’ime anyị aka inwe ụdị obi ga-eme ka anyị na-eme ihe Chineke chọrọ.

18. Olee nkwa Jehova kwere ndị so n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ?

18 Ka anyị na-agbalịsi ike ime uche Jehova, ọ ga-enye anyị ‘obi anyị ga-eji mara’ ya. N’eziokwu, ọ bụ ihe o kwere nkwa imere ndị e tere mmanụ, bụ́ ndị so n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ. O kwuru, sị: “M ga-etinye iwu m n’ime ha, m ga-edekwa ya n’obi ha. M ga-abụ Chineke ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị m.” Gịnị ka o kwuru banyere ịmara ya? O kwuru, sị: “Onye ọ bụla n’ime ha agakwaghị akụziri enyi ya na nwanne ya, sị, ‘Maranụ Jehova!’ n’ihi na ha niile ga-amara m, malite n’onye kasị nta n’ime ha ruo n’onye kasị ukwuu n’ime ha . . . N’ihi na m ga-agbaghara ha njehie ha, agakwaghị m echeta mmehie ha.”—Jere. 31:31-34. *

19. Olee olileanya magburu onwe ya Ndị Kraịst nwere?

19 Ma ị̀ na-atụ anya irite uru n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa, i kwesịrị ịchọ ịmara Jehova, sorokwa ndị ya na-efe ya. Ihe ga-eme ka i rite ụdị uru ahụ bụ Chineke ịgbaghara gị mmehie gị n’ihi àjà Kraịst chụrụ. Ebe ọ bụ na Chineke nwere ike ịgbaghara gị mmehie gị, i kwesịrị ịna-agbaghara ndị ọzọ, ma ndị mere ihe na-ewe gị ezigbo iwe. Ọ bụrụ na ị kwụsị ibu iwe n’obi, ọ ga-eme ka obi ruo gị ala. Ọ ga-egosi na ị chọrọ ife Jehova nakwa na ị na-amatakwu ya nke ọma. Ị ga-adị ka ndị ahụ Jehova si n’ọnụ Jeremaya gwa, sị: “Unu ga-achọ m wee chọta m, n’ihi na unu ga-eji obi unu dum chọọ m. M ga-ekwe ka unu chọta m.”—Jere. 29:13, 14.

^ para. 18 A kọwara ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ n’isi nke iri na anọ n’akwụkwọ bụ́ Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị.