Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Mach 2013

Jehova Bụ Ebe Obibi Anyị

Jehova Bụ Ebe Obibi Anyị

“Jehova, gị onwe gị aghọworo anyị ezigbo ebe obibi site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.”—ỌMA 90:1.

1, 2. Olee otú ndị ohu Chineke si ele onwe ha anya n’ụwa ochie a? Olee ebe obibi ha nwere?

 OBI ò ruru gị ala n’ụwa ochie a? Ọ bụrụ na obi erughị gị ala, mara na ọ bụghị naanị gị! Kemgbe ụwa, ndị niile hụrụ Jehova n’anya n’eziokwu ghọtara na ha bụ ndị mbịarambịa ma ọ bụ ndị ọbịa n’ụwa ochie a. Dị ka ihe atụ, mgbe ndị ji obi ha niile na-efe Chineke na-ama ụlọikwuu n’ebe dị iche iche n’ala Kenan, ha ‘kwusara n’ihu ọha na ha bụ ndị bịara abịa na ndị bi nwa oge.’—Hib. 11:13.

2 Ndị Kraịst e tere mmanụ bụ ‘ndị amaala n’eluigwe.’ Ha ghọtakwara na ha bụ “ndị bịara abịa na ndị bi nwa oge” n’ụwa a. (Fil. 3:20; 1 Pita 2:11) ‘Atụrụ ọzọ’ nke Kraịst ‘abụghịkwa nke ụwa, dị nnọọ ka Jizọs na-abụghị nke ụwa.’ (Jọn 10:16; 17:16) Ma, ọ pụtaghị na ndị Chineke enweghị “ebe obibi.” N’eziokwu, anyị nwere ụdị ebe obibi kacha mma anyị ga-anọ, obi esie anyị ike na o nweghị ihe ga-eme anyị. Ọ bụ naanị ndị nwere okwukwe na-ahụ ya. Mozis dere, sị: “Jehova, gị onwe gị aghọworo anyị ezigbo ebe obibi site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.” (Ọma 90:1) Olee otú Jehova si bụụrụ ndị ji obi ha niile fee ya n’oge ochie “ezigbo ebe obibi”? Olee otú o si bụụrụ ndị a kpọkwasịrị aha ya taa “ezigbo ebe obibi”? Oleekwa otú ọ ga-esi abụrụ ha ebe nchebe n’ọdịnihu?

JEHOVA BỤỤRỤ NDỊ OHU YA N’OGE OCHIE “EZIGBO EBE OBIBI”

3. Gịnị ka e ji Jehova tụnyere n’Abụ Ọma 90:1, n’ihi gịnịkwa?

3 Mgbe ụfọdụ, Baịbụl na-eji Jehova atụnyere ihe ndị anyị na-ahụ anya ka anyị nwee ike ịghọtakwu àgwà ya. Dị ka ihe atụ, Abụ Ọma 90:1 ji Jehova tụnyere ebe obibi. E kwuo banyere ebe obibi, ihe na-abata anyị n’obi bụ ebe e nwere ịhụnanya, udo, na ebe obi ruru mmadụ ala. Gịnị mere e ji jiri Jehova  tụnyere ebe obibi? Ọ bụ n’ihi na Baịbụl kwuru na Jehova bụ ịhụnanya. (1 Jọn 4:8) O kwukwara na ọ bụ Chineke nke udo, nke na-eme ka ndị ya “nọrọ n’obi iru ala.” (Ọma 4:8) Dị ka ihe atụ, ka anyị tụlee otú Jehova si chebe ndị ya kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie dị ka Ebreham, Aịzik, na Jekọb.

4, 5. Olee otú Chineke si bụụrụ Ebreham “ezigbo ebe obibi”?

4 Chegodị echiche otú obi dị Ebreham mgbe Jehova gwara ya, sị: “Si n’obodo gị, n’etiti ndị ikwu gị . . . kwapụ gaa n’obodo m ga-egosi gị.” Ọ bụrụ na ọ nọ na-echegbu onwe ya maka ihe a Jehova gwara ya, o doro anya na obi siri ya ike mgbe Jehova gwakwara ya, sị: “M ga-emekwa ka ị ghọọ mba ukwu, m ga-agọzikwa gị, m ga-emekwa ka aha gị dị ukwuu . . . M ga-agọzi ndị na-agọzi gị, onye na-akọchakwa gị ka m ga-abụ ọnụ.”—Jen. 12:1-3.

5 Jehova ji nkwa ahụ o kwere Ebreham gosi na ya kpebisiri ike ịbụrụ ya na ụmụ ya ezigbo ebe obibi. (Jen. 26:1-6) Jehova mezuru nkwa ahụ. Dị ka ihe atụ, o kweghị ka Fero, bụ́ eze Ijipt, na Abimelek, bụ́ eze Gira, dinaa Sera ma gbuo Ebreham. Otú ahụkwa ka o si chebe Aịzik na Ribeka. (Jen. 12:14-20; 20:1-14; 26:6-11) Baịbụl kwuru, sị: ‘Jehova ekweghị ka mmadụ ọ bụla rigbuo ha, kama ọ baara ndị eze mba n’ihi ha, sị: “Unu akpala ndị m tere mmanụ aka, unu emekwala ndị amụma m ihe ọjọọ ọ bụla.”’—Ọma 105:14, 15.

“Agaghị m ahapụ gị”

6. Gịnị ka Aịzik gwara Jekọb ka o mee? Olee otú ọ ga-abụ na obi dị Jekọb?

6 Jekọb, bụ́ nwa nwa Ebreham, so ná ndị amụma ahụ e kwuru okwu ha. Mgbe oge ruru ka Jekọb lụọ nwaanyị, nna ya, bụ́ Aịzik, gwara ya, sị: “Esila n’etiti ndị inyom Kenan lụta nwaanyị. Bilie gaa Padan-eram n’ụlọ Betuel nna nne gị ma lụrụ nwaanyị n’ebe ahụ site ná ndị inyom Leban nwanne nne gị.” (Jen. 28:1, 2) Jekọb rubeere Aịzik isi ozugbo. Ọ hapụrụ ndị ezinụlọ ya n’ala Kenan, bụ́ ebe obi ruru ya ala, gaa ọtụtụ narị kilomita ruo n’ala Heran. Ọ dị ka ọ̀ bụ naanị ya so gawa. (Jen. 28:10) Ọ ga-abụ na o chere, sị: ‘Olee mgbe m ga-alọta? Nwanne mama m, bụ́ Leban, ọ̀ ga-anabata m nke ọma ma kpọnye m nwaanyị na-atụ egwu Chineke?’ Ọ bụrụ na ihe ndị ahụ churu Jekọb ụra, o doro anya na obi siri ya ike mgbe o ruru obodo Lọz, nke dị ihe dị ka otu narị kilomita ma é si Bia-shiba gawa ya. Gịnị mere na Lọz?

7. Olee otú Chineke si mee ka obi sie Jekọb ike ná nrọ?

7 N’obodo Lọz, Jehova gwara Jekọb ná nrọ, sị: “Lee, m nọnyeere gị, m ga-echebekwa gị n’ụzọ niile ị na-aga, m ga-akpọghachikwa  gị n’ala a, n’ihi na agaghị m ahapụ gị ruo mgbe m meworo ihe m gwara gị.” (Jen. 28:15) Ọ ga-abụrịrị na nkwa ahụ Chineke kwere Jekọb mesiri ya obi ike, kasiekwa ya obi! Weregodị ya na ị na-ahụ ya ka ọ na-agasi ike, na-atụsi anya ike ịhụ otú Chineke ga-esi mezuo nkwa ya. Ọ bụrụ na ị hapụrụ ụlọ unu, ma eleghị anya gaa na-eje ozi ná mba ọzọ, i nwere ike ịghọta otú obi dị Jekọb. Ma, o doro anya na ị hụla ihe gosiri na Jehova na-elekọta gị.

8, 9. Olee ụzọ dị iche iche Jehova si gosi na ya bụụrụ Jekọb “ezigbo ebe obibi”? Gịnị ka anyị kwesịrị ịmụta banyere Jehova?

8 Mgbe Jekọb ruru Heran, Leban ji obiọma nabata ya ma kpọnye ya Lia na Rechel ka ha bụrụ ndị nwunye ya. Ma, Leban mechara gbalịa ịghọgbu Jekọb, gbanwee ụgwọ ọrụ ya ugboro iri! (Jen. 31:41, 42) Ma Jekọb diri arụrụala ahụ niile. Obi siri ya ike na Jehova ga na-elekọta ya. Jehova mekwara otú ahụ! N’eziokwu, mgbe Chineke gwara Jekọb ka ọ laghachi Kenan, Jekọb nwere “ìgwè anụ ụlọ dị ukwuu na ndị inyom na-eje ozi na ndị ikom na-eje ozi na kamel na ịnyịnya ibu.” (Jen. 30:43) Obi dị Jekọb ezigbo ụtọ. Ọ bụ ya mere o ji gwa Jehova, sị: “Erughị m eru inweta obiọma niile na ikwesị ntụkwasị obi niile i gosiworo ohu gị, n’ihi na ọ bụ naanị mkpara m ka m ji gafee Jọdan a, ugbu a, adịzi m ìgwè abụọ.”—Jen. 32:10.

9 Ihe ndị ahụ gosiri na ihe ahụ Mozis kwuru bụ eziokwu. Ọ sịrị: “Jehova, gị onwe gị aghọworo anyị ezigbo ebe obibi site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.” (Ọma 90:1) Ihe ahụ o kwuru gbasara ndị ohu Jehova taa, n’ihi na Jehova ka bụụrụ ndị ji obi ha niile na-efe ya ezigbo ebe obibi. Baịbụl kwuru na Jehova ‘adịghị agbanwe agbanwe nakwa na ọ dịghị ka onyinyo nke na-atụgharị atụgharị.’ (Jems 1:17) Ka anyị tụlee otú o si bụrụ eziokwu.

JEHOVA BỤỤRỤ ANYỊ “EZIGBO EBE OBIBI” TAA

10. Gịnị mere obi ji kwesị isi anyị ike na Jehova bụụrụ ndị ohu ya ezigbo ebe obibi?

10 Ka e were ya na ị nọ n’ụlọikpe na-ekwu arụrụala otu òtù ọjọọ zuru ụwa ọnụ na-arụ. Onyeisi ha ma ihe nke ukwuu, sie ezigbo ike, bụrụkwa onye ụgha obi tara mmiri, na-egbukwa mmadụ. Ahụ́ ọ̀ ga-eru gị ala ma i si n’ụlọikpe ahụ pụta mgbe e kpechara ikpe ahụ? Mbanụ! N’eziokwu, o nweghị onye ọ ga-eju anya ma ị sị ka e chebe gị. Otú ahụ ka ọ dị ndị ohu Jehova taa, bụ́ ndị ji obi ike na-agbara Jehova àmà ma na-agba ihe ọjọọ niile Setan na-eme n’anwụ n’atụghị egwu. (Gụọ Mkpughe 12:17.) Ma, Setan ò meela ka ndị ohu Chineke kwụsị ikwusa ozi ọma? Mbanụ! N’eziokwu, anyị ka na-ekwusara ndị dị iche iche ozi ọma n’ụwa niile. Olee otú anyị si nwee ike ịna-eme otú ahụ? O nweghị ihe ọzọ ma ọ́ bụghị na Jehova bụụrụ anyị “ezigbo ebe obibi.” Ọ bụ ya na-echebe anyị, karịchaa n’oge ikpeazụ a. (Gụọ Aịzaya 54:14, 17.) Ma, Jehova agaghị abụrụ anyị ezigbo ebe obibi ma ọ bụrụ na anyị ekwe ka Setan rafuo anyị, mee ka anyị hapụ ebe obibi ahụ.

Ndị mmụọ ozi na-akwado ndị ohu Chineke, na-echebekwa ha

11. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’aka Ebreham, Aịzik, na Jekọb?

11 Ka anyị tụlee ihe ọzọ anyị kwesịrị ịmụta n’aka Ebreham, Aịzik, na Jekọb. N’agbanyeghị na ha bi n’ala Kenan, ha esoghị ndị obodo ahụ na-eme ihe ọjọọ ndị ha na-eme. Ha kpọrọ ihe ndị ahụ asị. (Jen. 27:46) Ha bụ ndị na-eme ihe ziri ezi. Ha echeghị ka e depụtara ha ihe niile ha kwesịrị ịna-eme na ihe ha na-ekwesịghị ịna-eme. Ihe ha ma banyere Jehova mere ka ha mara ihe ọ hụrụ n’anya na ihe ọ kpọrọ asị. Ha achọghị ka ha na ụwa bụrụ otu, ebe ọ bụ na Jehova bụụrụ ha ebe obibi. Ha ekweghịkwa ebi ụdị ndụ ndị ụwa na-ebi. Anyị kwesịrị  ịmụta ihe n’aka ha. Mgbe ị na-ekpebi ndị ga-abụ ndị enyi gị na ụdị ihe ị ga-eji na-atụrụ ndụ, ị̀ na-agbalị ịṅomi ndị ahụ kwesịrị ntụkwasị obi? Ọ dị mwute na n’ọgbakọ Ndị Kraịst, e nwere ndị omume ha na-egosi na obi ruru ha ala n’ụwa Setan a. Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ, kpee ekpere ka Jehova nyere gị aka. Cheta na ihe a bụ ụwa Setan. Omume juru na ya yiri nke Setan, ma enweghị ịhụnanya ma mmadụ ịchọ naanị ọdịmma onwe ya.—2 Kọr. 4:4; Efe. 2:1, 2.

12. (a) Olee otú Jehova si enyere ndị ohu ya aka? (b) Olee otú obi dị gị n’ihi aka ọ na-enyere anyị?

12 Ọ bụrụ na anyị achọghị ka Setan ghọgbuo anyị, anyị kwesịrị ịna-erite uru ná ndokwa ndị Jehova mere maka ezinụlọ nke okwukwe ya, ya bụ, maka ndị ji ya mere ebe obibi ha. Ụfọdụ n’ime ndokwa ndị ahụ bụ ọmụmụ ihe Ndị Kraịst, ofufe ezinụlọ, na “onyinye n’ụdị mmadụ,” bụ́ ndị okenye ọgbakọ. Ọ bụ ha ka Chineke họpụtara ka ha na-azụ anyị, na-akasi anyị obi, na-enyekwara anyị aka ná nsogbu ndị anyị na ha na-alụ. (Efe. 4:8-12) Nwanna George Gangas, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi ruo ọtụtụ afọ, dere, sị: “Ọ na-abụ, m nọrọ n’etiti [ndị Chineke], obi na-eru m ala ka à ga-asị na mụ na ndị ezinụlọ m nọ. Ọ dị m ka m̀ nọ na paradaịs.” Ọ̀ na-adị gị otú ahụ?

13. Olee ihe dị mkpa anyị nwere ike ịmụta ná Ndị Hibru 11:13?

13 Àgwà ọzọ Ebreham, Aịzik, na Jekọb kpara, nke anyị kwesịrị ịmụta, bụ na ụjọ atụghị ha ime ihe dị iche n’ihe ndị ọzọ na-eme. Dị ka e kwuru na  paragraf nke mbụ, ha ‘kwusara n’ihu ọha na ha bụ ndị bịara abịa na ndị bi nwa oge n’ala ahụ.’ (Hib. 11:13) Ì kpebisiela ike ịdị iche ka ha? N’eziokwu, ime otú ahụ anaghị adị mfe mgbe niile. Ma, ị ga-emeli ya ma Chineke nyere gị aka, ụmụnna gị akwadokwa gị. Cheta na ị nọghị naanị gị. E nwere mgba ndị niile chọrọ ijere Jehova ozi na-agba! (Efe. 6:12) Ma, anyị ga-emeri ma ọ bụru na anyị atụkwasị Jehova obi, meekwa ka ọ bụụrụ anyị ezigbo ebe obibi.

14. Olee “obodo” Ebreham na ndị ọzọ fere Jehova nọ na-echere?

14 Ihe ọzọ dị mkpa bụ na anyị kwesịrị iṅomi Ebreham ma buru ụgwọ ọrụ Chineke ga-enye anyị n’obi. (2 Kọr. 4:18) Pọl onyeozi kwuru na Ebreham “nọ na-echere obodo ahụ nke nwere ezi ntọala, bụ́ obodo nke ọ bụ Chineke bụ onye wuru ma mee ya.” (Hib. 11:10) “Obodo” ahụ bụ Alaeze Mesaya. N’eziokwu, Ebreham nọ na-echere “obodo” ahụ. E nwere ike ikwu na anyị anaghịzi eche ka ọ malite ịchị n’ihi na ọ na-achị ugbu a n’eluigwe. Ihe ọzọ bụ na anyị ahụla ọtụtụ ihe gosiri na ọ ga-amalite ịchị ụwa a n’oge na-adịghị  anya. Ì kwetara na Alaeze Chineke bụ ọchịchị dị adị n’eziokwu? Otú i si ebi ndụ na ihe ndị i kpebiri ime ò gosiri na i kwetara na Alaeze Chineke na-abịa nakwa na i kwesịrị ịdị iche n’ụwa?—Gụọ 2 Pita 3:11, 12.

JEHOVA GA-ABỤ “EZIGBO EBE OBIBI” ANYỊ KA ỌGWỤGWỤ NA-ERU NSO

15. Gịnị ga-eme ndị tụkwasịrị ụwa ochie a obi n’ọdịnihu?

15 Ka ọgwụgwụ ụwa Setan na-eru nso, “nhụjuanya” ọ na-akpata ga na-aka njọ. (Mat. 24:7, 8) Ihe ga-esikwu ike n’oké mkpagbu na-abịanụ. Ihe ndị e ji enyere ndụ aka ga-ala n’iyi, ụjọ ana-atụ ndị mmadụ ma hà ga-adịkwa ndụ. (Hab. 3:16, 17) Baịbụl kwuru na ha agaghị ama ihe ha ga-eme eme. N’ihi ya, ha ga-agbaba “n’ọgba nakwa n’oké nkume ndị dị n’ugwu.” (Mkpu. 6:15-17) Ma, o nweghị ọgba ma ọ bụ òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ nnukwu ụlọ ọrụ achụmnta ego ga-echebe ha.

16. Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ọgbakọ Ndị Kraịst anya, n’ihi gịnịkwa?

16 Ma, Jehova Chineke ga-echebe ndị ya n’ihi na ọ ga-abụrụ ha “ezigbo ebe obibi.” Dị ka Habakọk onye amụma, ha “ga-aṅụrị ọṅụ n’ime Jehova.” Ha “ga-enwe aṅụrị n’ime Chineke nke nzọpụta” ha. (Hab. 3:18) Olee ụzọ dị iche iche Jehova ga-esi bụrụ “ezigbo ebe obibi” n’oge ahụ ga-esi ezigbo ike? Anyị ga-amata ma o ruo mgbe ahụ. Ma, obi kwesịrị isi anyị ike na “oké ìgwè mmadụ” ga-abụ ndị a haziri nke ọma otú ahụ e si hazie ndị Izrel mgbe ha si n’Ijipt na-apụ. Ha ga na-emekwa ihe Chineke gwara ha. (Mkpu. 7:9; gụọ Ọpụpụ 13:18.) Jehova ga-eme ka anyị mata ihe anyị kwesịrị ime. O nwere ike ịbụ na ọ ga-esi n’ọgbakọ gwa anyị ihe anyị ga-eme. Aịzaya 26:20 kwuru banyere ‘ọnụ ụlọ dị n’ime,’ nke Chineke ga-eji echebe ndị ya. O nwere ike ịbụ na ọ na-ekwu banyere ọtụtụ puku ọgbakọ Ndị Kraịst e nwere n’ụwa niile. (Gụọ Aịzaya 26:20.) Ì ji ọmụmụ ihe ọgbakọ kpọrọ ihe? Ọ bụrụ na Jehova esi n’ọgbakọ ya kwuo ihe a ga-eme, ị̀ na-eme ya ozugbo?—Hib. 13:17.

17. Olee otú Jehova si bụụrụ ndị ji obi ha niile fee ya ruo n’ọnwụ “ezigbo ebe obibi”?

17 Ụfọdụ ndị ji obi ha niile na-efe Jehova nwere ike ịnwụ tupu oké mkpagbu ahụ amalite. Ma Jehova ka ga-abụrụ ha “ezigbo ebe obibi.” Olee otú ọ ga-esi eme ya? Mgbe Ebreham, Aịzik, na Jekọb nwụchara, ọtụtụ afọ agaa, Jehova gwara Mozis, sị: “Abụ m . . . Chineke Ebreham, Chineke Aịzik na Chineke Jekọb.” (Ọpụ. 3:6) Mgbe Jizọs kwughachiri ihe ahụ Mozis kwuru, o kwukwara, sị: “Ọ bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ, kama nke ndị dị ndụ, n’ihi na n’ebe ọ nọ, ha niile dị ndụ.” (Luk 20:38) N’eziokwu, n’anya Jehova, ndị niile ji obi ha niile fee ya ruo n’ọnwụ ka dị ndụ; ọ ga-akpọliterịrị ha n’ọnwụ.—Ekli. 7:1.

18. N’ụwa ọhụrụ, olee ụzọ pụrụ iche Jehova ga-esi bụụrụ ndị ya “ezigbo ebe obibi”?

18 N’ụwa ọhụrụ ahụ dị ezigbo nso, e nwere otú ọzọ Jehova ga-esi bụụrụ ndị ya “ezigbo ebe obibi.” Mkpughe 21:3 kwuru, sị: “Lee! Ụlọikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ, ya na ha ga-ebikwa.” Ná mmalite, Jehova ga-esi n’aka Kraịst Jizọs binyere ndị ọchịchị ya na-achị n’ụwa. Jizọs chịchaa otu puku afọ, ọ ga-enyefe Alaeze ahụ n’aka Nna ya, mgbe o mechara ihe Chineke bu n’obi maka ụwa. (1 Kọr. 15:28) Jizọs agaghịzi abụ onye ogbugbo n’etiti Jehova na ndị mmadụ; Jehova ga-anọnyere ha. Ọ bụ oge magburu onwe ya anyị ga-ahụ n’ọdịnihu! Ka ọ dị ugbu a, ka anyị na-agbalịsi ike iṅomi ndị ji obi ha niile fee Jehova n’oge ochie. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ime ka Jehova bụrụ “ezigbo ebe obibi” anyị.