Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Febụwarị 2013

Nọsie Ike na Ndagwurugwu Jehova Ji Echebe Anyị

Nọsie Ike na Ndagwurugwu Jehova Ji Echebe Anyị

“Jehova ga-aga buso mba ndị ahụ agha dị ka ọ na-eme n’ụbọchị ọ na-ebu agha, n’ụbọchị ọgụ.”—ZEK. 14:3.

1, 2. Olee agha a ga-alụ n’oge na-adịghị anya, gịnị ka ndị ohu Chineke na-agaghị eme n’agha ahụ?

N’ABALỊ iri atọ n’ọnwa iri, n’afọ 1938, ọtụtụ nde ndị Amerịka nọ na-ege otu egwuregwu a na-eme na redio. Ndị na-eme egwuregwu ahụ kwuru na e nwere ihe ndị si n’ụwa ọzọ na-abịa ibibi ụwa anyị a. N’agbanyeghị na ebu ụzọ gwa ndị mmadụ na ihe ahụ bụ egwuregwu, ụjọ tụrụ ọtụtụ ndị n’ihi na ha chere na ọ bụ agha ka a na-alụ. Ụfọdụ malitere ime ihe ha ga-eji chebe onwe ha ka ndị agha ahụ ghara igbu ha.

2 N’oge anyị a, e nwere ezigbo agha na-eru ka mmiri. Ma, ọtụtụ ndị anaghị ejikere maka ya. Ebe e buru amụma banyere agha ahụ abụghị n’akwụkwọ akụkọ ifo, kama ọ bụ n’Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl. Agha ahụ bụ agha Amagedọn. Ọ bụ ya ka Chineke ga-eji bibie ụwa Setan. (Mkpu. 16:14-16) Ndị ohu Chineke agaghị alụ ọgụ n’agha ahụ iji chebe onwe ha. Ma, otú Jehova ga-esi jiri ike ya dị egwu kpaa ike ga-atụ ha n’anya.

3. Olee amụma anyị ga-atụle, gịnịkwa mere amụma ahụ ji gbasa anyị?

3 Otu amụma e buru n’akwụkwọ Zekaraya isi iri na anọ kwuru ọtụtụ ihe banyere agha Amagedọn. Amụma ahụ gbasara anyị n’agbanyeghị na e dere ya puku afọ abụọ na narị afọ ise gara aga. (Rom 15:4) Ọtụtụ n’ime ihe e kwuru n’amụma ahụ gbasara ihe mere ndị Chineke kemgbe Alaeze Mesaya malitere ịchị n’eluigwe n’afọ 1914 nakwa ihe ọma ndị ga-eme n’oge na-adịghị anya. Amụma ahụ kwukwara banyere “nnukwu ndagwurugwu” na “mmiri na-enye ndụ” nke ga-esi na Jeruselem na-asọpụta. (Zek. 14:4, 8) N’isiokwu a, anyị ga-amụta ihe ndagwurugwu  ahụ bụ nakwa otú Jehova ga-esi chebe ndị ya n’ebe ahụ. Anyị ga-amụtakwa ihe mmiri ahụ na-enye ndụ bụ, nakwa otú ọ ga-esi baara anyị uru. N’ihi ya, ọ bụghị naanị na anyị ga-aghọta na anyị kwesịrị ịna-aṅụ mmiri ahụ, kama anyị ga-achọkwa ịna-aṅụ ya. Ka anyị ṅaa ntị nke ọma mgbe a na-atụle amụma ahụ.—2 Pita 1:19, 20.

MGBE “ỤBỌCHỊ JEHOVA” MALITERE

4. (a) Olee mgbe “ụbọchị Jehova” malitere? (b) Ọtụtụ afọ tupu afọ 1914, gịnị ka ndị ohu Jehova gwara mba niile? Gịnị ka ndị ọchịchị na ndị ndú okpukpe mere?

4 Ihe mbụ e kwuru na Zekaraya isi iri na anọ bụ, “Ụbọchị na-abịa, bụ́ ụbọchị Jehova.” (Gụọ Zekaraya 14:1, 2.) Gịnị ka ụbọchị ahụ bụ? Ọ bụ ‘ụbọchị Onyenwe anyị,’ nke malitere mgbe ‘alaeze nke ụwa ghọrọ alaeze nke Onyenwe anyị na nke Kraịst ya.’ (Mkpu. 1:10; 11:15) Ụbọchị ahụ malitere n’afọ 1914 mgbe Alaeze Mesaya malitere ịchị n’eluigwe. Ọtụtụ afọ tupu afọ 1914, ndị na-efe Jehova gwara mba niile na “oge a kara aka nke ndị mba ọzọ” ga-agwụ n’afọ ahụ nakwa na a ga-amalite inwe nsogbu ndị na-enweghị atụ n’ụwa. (Luk 21:24) Gịnị ka mba dị iche iche mere? Kama ige ntị n’ihe ahụ e ji na-adọ ha aka ná ntị, ndị ọchịchị na ndị ndú okpukpe chịrị Ndị Kraịst ndị ahụ ọchị, na-akpagbukwa ha. Ha si otú ahụ kwaa Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile emo, n’ihi na Ndị Kraịst e tere mmanụ nọchiri anya “Jeruselem nke eluigwe,” ya bụ, Alaeze Mesaya, nke ha ga-eso chịa na ya.—Hib. 12:22, 28.

5, 6. (a) Gịnị ka mba dị iche iche mere “obodo ahụ” na ‘ndị amaala ya’ dị ka e buru n’amụma? (b) Ole ndị bụ “ndị fọdụrụ n’ime ha”?

5 Zekaraya buru amụma ihe mba dị iche iche ga-eme. Ọ sịrị: “A ga-ewegharakwa obodo ahụ [ya bụ, Jeruselem].” “Obodo ahụ” nọchiri anya Alaeze Mesaya. Ndị nọchiri anya ya n’ụwa bụ “ndị amaala” ya, ya bụ, Ndị Kraịst e tere mmanụ. (Fil. 3:20) ‘E weghaara’ obodo ahụ n’Agha Ụwa Mbụ mgbe a nwụchiri ụmụnna a ma ama ná nzukọ Jehova ma tụọ ha mkpọrọ n’Atlanta, Jọjia, dị n’Amerịka. Ndị iro mesiri Ndị Kraịst e tere mmanụ ike, machibido akwụkwọ ha iwu, gbalịakwa ịkwụsị ozi ọma ha na-ekwusa. Ọ dị ka à ga-asị na ndị iro “kwakọọrọ ihe dị n’ụlọ ndị dị n’ime” obodo ahụ.

6 Ndị iro ndị Chineke kpagburu ha, katọọkwa ha. Ndị iro ahụ kakwa ha n’ọnụ ọgụgụ. Ma, ihe a niile emeghị ka ha kwụsị ife Chineke. A ka nwere “ndị fọdụrụ n’ime ha,” bụ́ ndị so ná ndị e tere mmanụ. Dị ka Zekaraya kwuru, ha ekweghị ka ‘e bipụ ha n’obodo ahụ.’

7. Gịnị ka ihe Ndị Kraịst e tere mmanụ mere na-akụziri Ndị Kraịst niile taa?

7 Amụma ahụ ò mezuchara mgbe Agha Ụwa Mbụ biri? Mba. Mba dị iche iche ka ga-alụso ndị Chineke ọgụ, ma ndị fọdụrụ ná ndị e tere mmanụ ma ndị enyi ha, bụ́ ndị nwere olileanya ibi n’ụwa. (Mkpu. 12:17) Ihe ndị mere n’Agha Ụwa nke Abụọ gosiri na ihe a bụ eziokwu. Otú Ndị Kraịst e tere mmanụ si tachie obi n’ọnwụnwa ndị bịaara ha na-eme ka anyịnwa na-edi ọnwụnwa ọ bụla bịaara anyị taa. Ọnwụnwa ndị na-abịara anyị nwere ike ịbụ na ndị ikwu anyị ma ọ bụ ndị anyị na ha na-arụkọ ọrụ na-akpagbu anyị. O nwekwara ike ịbụ na ụmụ akwụkwọ ibe anyị na-akwa anyị emo. (1 Pita 1:6, 7) N’agbanyeghị ebe ezigbo Ndị Kraịst bi, ha na-ekpebisi ike ‘iguzosi ike,’ ghara ikwe ka ‘ndị na-emegide ha menye ha ụjọ.’ (Fil. 1:27, 28) Ma, olee ebe a ga-echebe ndị Jehova n’ụwa a kpọrọ ha asị?—Jọn 15:17-19.

 JEHOVA WEPỤTARA “NNUKWU NDAGWURUGWU”

8. (a) Na Baịbụl, gịnị ka ugwu na-anọchi anya ya? (b) Gịnị ka “ugwu osisi oliv” na-anọchi anya ya?

8 Ebe ọ bụ na Jeruselem, bụ́ “obodo ahụ,” na-anọchi anya Jeruselem nke eluigwe, “ugwu osisi oliv nke dị n’ihu Jeruselem” ga-enwerịrị ihe ọ na-anọchi anya ya. Gịnị ka ugwu ahụ nọchiri anya ya? Olee otú ọ ga-esi ‘gbawaa n’etiti,’ ka ọ ghọọ ugwu abụọ? Gịnị mere Jehova ji kpọọ ugwu abụọ ahụ “ugwu m”? (Gụọ Zekaraya 14:3-5.) Na Baịbụl, ugwu na-anọchi anya alaeze ma ọ bụ ọchịchị. Baịbụl na-ekwukwa na ugwu Chineke na-agọzi anyị, na-echebekwa anyị. (Ọma 72:3; Aịza. 25:6, 7) N’ihi ya, ugwu osisi oliv ahụ nke ụkwụ Chineke guzo n’elu ya, n’ebe ọwụwa anyanwụ nke Jeruselem dị n’ụwa, nọchiri anya ọchịchị Jehova nke na-achị ihe niile o kere eke.

9. Olee otú o si bụrụ na “Ugwu Oliv” gbawara n’etiti?

9 Amụma ahụ kwukwara na ‘ugwu osisi oliv ahụ ga-agbawa n’etiti.’ Gịnị ka ọ pụtara? Ọ pụtara na Jehova ga-ewepụta ọchịchị ọhụrụ nke ga-arụ ihe pụrụ iche. Ọchịchị ọhụrụ ahụ bụ Alaeze Mesaya nke Jizọs Kraịst ga-abụ Eze na ya. Ọ ka bụkwa Chineke nwe ya. Ọ bụ ya mere Jehova ji kpọọ ugwu abụọ ahụ e kewapụtara ‘n’Ugwu Oliv’ “ugwu m.” (Zek. 14:4, 5) * Ọ bụ ya nwe ha abụọ.

10. Gịnị ka “nnukwu ndagwurugwu” dị n’etiti ugwu abụọ ahụ nọchiri anya ya?

10 Amụma ahụ kwuru na mgbe ugwu osisi oliv ahụ gbawara, otu n’ebe ugwu, nke ọzọ n’ebe ndịda, ụkwụ Jehova ga-eguzo n’ugwu abụọ ahụ. Ugwu ahụ gbawaranụ ga-eme ka e nwee “nnukwu ndagwurugwu” n’okpuru ụkwụ Jehova. Ndagwurugwu ahụ nọchiri anya otú Chineke si echebe anyị. Otú ahụ e si echebe ndị nọ na ndagwurugwu dị n’etiti ugwu abụọ, ka Jehova ji ọchịchị ya na ọchịchị Ọkpara ya na-echebe ndị ohu ya. Jehova agaghị ekwe ka e kpochapụ ezi ofufe. Olee mgbe ugwu osisi oliv ahụ gbawara n’etiti? Ọ bụ mgbe Alaeze Mesaya malitere ịchị mgbe Oge Ndị Jentaịl gwụchara n’afọ 1914. Olee mgbe ndị na-efe ezi Chineke malitere ịgbaga na ndagwurugwu ahụ?

MGBE NDỊ CHINEKE MALITERE ỊGBAGA NA NDAGWURUGWU AHỤ

11, 12. (a) Olee mgbe ndị Chineke malitere ịgbaga na ndagwurugwu ahụ? (b) Gịnị gosiri na Jehova na-echebe ndị ya?

11 Jizọs dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị, sị: “Mba niile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m.” (Mat. 24:9) Asị ahụ a kpọrọ anyị akala njọ kemgbe afọ 1914, bụ́ mgbe oge ikpeazụ malitere. N’agbanyeghị ọgụ kpụ ọkụ n’ọnụ ndị iro lụsoro ndị fọdụrụ ná ndị e tere mmanụ n’Agha Ụwa Mbụ, e gbuchaghị ndị ahụ ji obi ha niile na-efe Jehova. N’afọ 1919, e si na Babịlọn Ukwu ahụ, nke bụ́ okpukpe ụgha niile dị n’ụwa, tọhapụ ha. (Mkpu. 11:11, 12) * Ọ bụ mgbe ahụ ka ndị Jehova malitere ịgbaga na ndagwurugwu nke ugwu Jehova.

12 Kemgbe afọ 1919, Jehova ji ndagwurugwu ahụ na-echebe ndị ya n’ụwa niile. Kemgbe ọtụtụ afọ, ndị ọchịchị na-agba mbọ n’ebe dị iche iche n’ụwa ka Ndịàmà Jehova kwụsị ozi ọma ha na-ekwusa. Ha na-amachibidokwa akwụkwọ ndị ha na-ebipụta iwu. A ka na-emekwa otú ahụ n’ọtụtụ mba taa. Ma, ihe ọ sọkwara mba dị iche iche ha mee,  ha agaghị ekpochapụli ezi ofufe. Jehova ga-eji ogwe aka ya dị ike na-echebe ndị ya.—Diut. 11:2.

13. Olee otú anyị ga-esi nọsie ike na ndagwurugwu ahụ Jehova ji echebe ndị ya? Gịnị mere o ji dị ezigbo mkpa ka anyị nọsie ike na ya ugbu a?

13 Ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile na-efe Jehova ma nọsie ike n’eziokwu ya, ya na Ọkpara ya agaghị ahapụ anyị. Chineke agaghị ekwe ka ihe ọ bụla ma ọ bụ onye ọ bụla dọkpụrụ anyị. (Jọn 10:28, 29) Jehova na-enyere anyị niile aka ka anyị nwee ike ịna-asọpụrụ ya, na-erubekwara ọchịchị Ọkpara ya isi. Anyị niile kwesịrị ịnọsi ike na ndagwurugwu ahụ o ji na-echebe anyị, n’ihi na ọ ga-abakwuru anyị uru n’oké mkpagbu ahụ na-abịa n’ike n’ike.

‘ỤBỌCHỊ JEHOVA GA-EBU AGHA’

14, 15. ‘N’ụbọchị Chineke ga-ebuso ndị iro ya agha,’ olee ihe ga-eme ndị na-anọghị na ndagwurugwu ahụ Jehova ji echebe ndị ya?

14 Ka ụwa ochie a na-agba egwú ụla, Setan ga na-alụsokwu ndị Jehova ọgụ. N’oge na-adịghị anya, Setan ga-alụso ha ọgụ ikpeazụ. N’ụbọchị ahụ, Jehova ga-alụso ndị iro niile na-emegide ndị ya ọgụ ma bibie ha niile. Ọ bụ ya ka Zekaraya kpọrọ ‘ụbọchị Jehova ga-ebu agha.’ N’agha ahụ, Jehova, bụ́ Ọkaakaa nke eluigwe na ụwa, ga-eme ka o dokwuo anya na ya bụ Dike n’agha.—Zek. 14:3.

15 N’ụbọchị Chineke ga-alụ agha, gịnị ga-eme ndị na-anọghị na “nnukwu ndagwurugwu” ahụ Jehova ji echebe ndị ya? Amụma Zekaraya kwuru na ha agaghị ahụ “ìhè nke dị oké ọnụ ahịa.” Ọ pụtara na Chineke agaghị ele ha anya ọma. Amụma ahụ kwukwara na n’ụbọchị agha ahụ, “ịnyịnya, jakị, kamel, oké ịnyịnya ibu, na ụdị anụ ụlọ ọ bụla” “ga-akpụkọ.” Ọ pụtara na ngwá agha ọ bụla agaghị aba uru n’ụbọchị ahụ. Zekaraya kwuru na Jehova ga-eji “ihe otiti” ma ọ bụ ọrịa taa ndị iro ya ahụhụ. N’ụbọchị ahụ, anya ha na ire ha ‘ga-erekasị.’ Anyị amaghị ma ihe a e kwuru ọ̀ bụ ọrịa nkịtị. Ma ihe anyị ma bụ na ngwá agha ndị iro Chineke agaghị eme anyị ihe ọ bụla, ha agaghị enwe ọnụ ha ga-eji kwujọọ Chineke. (Zek. 14:6, 7, 12, 15) “Ndị eze nke ụwa na ụsụụ ndị agha ha” ga-adụnyere Setan úkwù n’agha ahụ. Ma ebe ọ sọkwara ha ha nọrọ n’ụwa, a ga-ebibi ha. (Mkpu. 19:19-21) “N’ụbọchị ahụ, ndị Jehova gburu ga-atọgbọrọ malite n’otu nsọtụ ụwa ruo na nsọtụ ọzọ nke ụwa.”—Jere. 25:32, 33.

16. N’ihi ụbọchị Chineke ga-ebuso ndị iro ya agha n’oge na-adịghị anya, olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị? Gịnị ka anyị kwesịrị ime n’oké mkpagbu ahụ na-abịanụ?

16 Onye ukwu na onye nta na-ata ahụhụ n’oge agha, ma ndị meriri ma ndị e meriri. Nri nwere ike ịdị ụkọ. Ngwongwo ndị mmadụ nwere ike ịla n’iyi. Ihe nwere ike isiri ndị mmadụ ike. O nwere ike ime ka ndị mmadụ ghara inwe ike ime ihe niile ha chọrọ ime. Ọ bụrụ na ihe esiere anyị ike otú ahụ, gịnị ka anyị ga-eme? Ụjọ ọ̀ ga-atụ anyị? Ànyị ga-akwụsị ife Jehova? Ànyị ga-ada mbà, ike ụwa agwụ anyị? N’oké mkpagbu ahụ, anyị kwesịrị ịnọsi ike na ndagwurugwu ahụ Jehova ji echebe ndị ya. Otú anyị ga-esi eme ya bụ inwe obi ike na Jehova ga-echebe anyị ma jiri obi anyị niile na-efe ya!—Gụọ Habakọk 3:17, 18.

‘MMIRI NA-ENYE NDỤ GA NA-ASỌPỤTA’

17, 18. (a) Gịnị bụ ‘mmiri ahụ na-enye ndụ’? (b) Gịnị ka ‘oké osimiri dị n’ebe ọwụwa anyanwụ’ na ‘oké osimiri dị n’ebe ọdịda anyanwụ’ na-anọchi anya ya? (ch) Ka ị na-atụ anya ihe ga-eme n’ọdịnihu, gịnị ka i kpebiri ime?

17 A lụchaa agha Amagedọn, “mmiri na-enye ndụ” ga-esi n’Alaeze Mesaya na-asọpụta. ‘Mmiri ahụ na-enye ndụ’ na-anọchi anya ihe niile Jehova  meere ụmụ mmadụ ka ha nwee ike ịdị ndụ ebighị ebi. ‘Oké osimiri dị n’ebe ọwụwa anyanwụ’ bụ Oké Osimiri Nwụrụ Anwụ. ‘Oké osimiri dị n’ebe ọdịda anyanwụ’ bụ Oké Osimiri Mediterenian. Oké osimiri abụọ ahụ na-anọchi anya ndị mmadụ. Oké Osimiri Nwụrụ Anwụ na-anọchi anya ndị nọ n’ili. Ebe ọ bụ na e nwere azụ̀ na ihe ndị ọzọ dị ndụ n’Oké Osimiri Mediterenian, ọ na-anọchi anya “oké ìgwè mmadụ,” bụ́ ndị na-anwụghị n’agha Amagedọn. (Gụọ Zekaraya 14:8, 9; Mkpu. 7:9-15) Ma ndị nọ n’ili ma ndị na-anwụghị n’agha Amagedọn ga-aṅụ mmiri ahụ na-enye ndụ, nke si ‘n’osimiri nke mmiri nke ndụ’ na-asọpụta. Ọ ga-eme ka a gbapụta ha n’ọnwụ ahụ ha ketara n’aka Adam. Ha ga-adịkwa ndụ ebighị ebi.—Mkpu. 22:1, 2.

Kpebie ịnọ na ndagwurugwu ahụ Jehova ji echebe anyị

18 Mgbe Jehova ga-ebibi ụwa ochie a, ọ ga-echebe anyị, dubakwa anyị n’ụwa ọhụrụ nke ndị ezi omume ga-ebi na ya. N’agbanyeghị na mba niile kpọrọ anyị asị ugbu a, ka anyị kpebie iji obi anyị niile na-erubere ọchịchị Chineke isi, nọsiekwa ike na ndagwurugwu ahụ Jehova ji echebe anyị.

^ para. 9 N’amaokwu a, otú ọzọ e nwere ike isi sụgharịa “ugwu osisi oliv ahụ” bụ “Ugwu Oliv.”

^ para. 11 Gụọ akwụkwọ bụ́ Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso! peeji nke 169-170.