Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) FEBỤWARỊ 2013

Kpachara Anya Maka Ihe Ndị I Bu n’Obi

Kpachara Anya Maka Ihe Ndị I Bu n’Obi

Baịbụl kwuru, sị: “Obi dị aghụghọ karịa ihe ọ bụla ọzọ, o sikwara ike njite.” (Jere. 17:9) Ọ bụrụ na e nwere ihe dị anyị n’obi anyị chọrọ ime, anyị na-enwekarị ihe anyị na-akụdo aka eme ihe ahụ, ya sọkwa ya ya bụrụ na ihe ahụ adịghị mma.

Baịbụl dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “N’obi ka echiche ọjọọ, igbu ọchụ, ịkwa iko nke di ma ọ bụ nwunye, ịkwa iko, izu ohi, ịgba akaebe ụgha, nkwulu, si apụta.” (Mat. 15:19) Obi anyị nwere ike ịghọgbu anyị, mee ka anyị mee ihe megidere uche Chineke. Anyị nwere ike anyị agaghị ama na obi anyị aghọgbuola anyị ruo mgbe anyị mechara ihe ahụ na-adịghị mma. Gịnị nwere ike inyere anyị aka ịmata ihe anyị bu n’obi tupu anyị emee ihe na-adịghị mma?

OLEE OTÚ Ị GA-ESI MATA IHE I BU N’OBI?

Olee otú ịgụ Baịbụl kwa ụbọchị si enyere anyị aka ịmata ihe anyị bu n’obi?

Na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị, na-atụgharịkwa uche n’ihe o kwuru.

Pọl onyeozi dere, sị: “Okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike, dịkwa nkọ karịa mma agha ihu abụọ ọ bụla, ọ na-amabakwa ọbụna ruo n’ikewa mkpụrụ obi na mmụọ.” Ihe Chineke kwuru na Baịbụl nwere ike ime ka a mata ‘echiche mmadụ na ihe o bu n’obi.’ (Hib. 4:12) Mgbe anyị na-amụ Baịbụl, anyị kwesịrị ịna-eche echiche banyere ihe anyị bu n’obi nakwa omume anyị. Ime otú ahụ ga-enyere anyị aka ịmata ihe dị anyị n’obi. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-agụ Baịbụl kwa ụbọchị, na-atụgharịkwa uche n’ihe o kwuru. Anyị mee otú ahụ, anyị ga-amata otú Jehova si ele ihe anya.

Ọ bụrụ na anyị na-ege ntị na ndụmọdụ ndị dị na Baịbụl, na-emekwa ihe Baịbụl kwuru, ọ ga-eme ka akọnuche anyị na-arụ ọrụ nke ọma. Ọ ga ‘na-agbara anyị àmà’ ihe anyị kwesịrị ime. (Rom 9:1) Akọnuche anyị nwere ike ime ka anyị ghara ịchọwa ihe anyị  ga-akụdo aka mee ihe ọjọọ. Na Baịbụl, e nwere ọtụtụ ndị ihe ha mere nwere ike ‘ịbụrụ anyị ihe ịdọ aka ná ntị.’ (1 Kọr. 10:11) Ọ bụrụ na anyị amụta ihe n’akụkọ ha, anyị nwere ike izere ikpebi ime ihe na-adịghị mma. Gịnịkwanụ ka onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ime?

Ekpere na-enyere anyị aka ịmata ihe dị anyị n’obi

Kpee ekpere ka Chineke nyere gị aka ịmata ihe i bu n’obi.

Jehova “na-enyocha obi.” (1 Ihe 29:17) Ọ “karịrị obi anyị, marakwa ihe niile.” (1 Jọn 3:20) Anyị enweghị ike ịghọgbu Chineke. Ọ bụrụ na anyị ekpee ekpere gwa Jehova ihe na-echu anyị ụra, otú obi dị anyị, na ihe anyị chọrọ ime, Jehova nwere ike inyere anyị aka ịmata ihe anyị bu n’obi. Anyị nwekwara ike ịrịọ Chineke ka o ‘mee ka anyị nwee obi dị ọcha.’ (Ọma 51:10) N’ihi ya, ekpere bụ ụzọ dị ezigbo mkpa Jehova nwere ike isi mee ka anyị mata ihe anyị bu n’obi.

Ọmụmụ ihe na-enyere anyị aka ịghọta ihe anyị bu n’obi

Na-ege ntị ma ị gaa ọmụmụ ihe.

Ige ntị nke ọma n’ihe a na-ekwu n’ọmụmụ ihe nwere ike inyere anyị aka ichebara obi anyị echiche, ya bụ, ichebara ụdị ndị anyị bụ echiche. Ọ bụ eziokwu na ọ bụghị mgbe niile anyị gara ọmụmụ ihe ka anyị ga-anụ ihe ọhụrụ, ịga ọmụmụ ihe ga-enyere anyị aka ịghọtakwu ihe Baịbụl kwuru, meekwa ka e chetara anyị ihe ga-enyere anyị aka ịmata ihe anyị bu n’obi. Ihe ụmụnna anyị kwuru n’ọmụmụ ihe nwekwara ike ime ka anyị na-akpakwu àgwà ọma. (Ilu 27:17) Anyị na ụmụnna anyị kwesịrị ịna-anọ n’ọmụmụ ihe. Ma ọ bụrụ na anyị anaghị agachi ọmụmụ ihe anya, o nwere ike ịkpatara anyị nsogbu. O nwere ike ime ka anyị ‘chọwa ihe na-agụ naanị onwe anyị.’ (Ilu 18:1) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị, ‘M̀ na-aga ọmụmụ ihe niile, na-egekwa ntị n’ihe a na-ekwu?’—Hib. 10:24, 25.

OLEE OTÚ OBI ANYỊ NWERE IKE ISI DUHIE ANYỊ?

Obi anyị dị aghụghọ nwere ike iduhie anyị n’ọtụtụ ihe ndị mmadụ na-eme. Ka anyị tụlee ihe anọ n’ime ha: ịchụ akụ̀, ịṅụ mmanya na-aba n’anya, ụdị ndị anyị na-emete enyi, na ihe ndị anyị ji atụrụ ndụ.

Ịchụ akụ̀.

Onye dị ndụ ga-eri nri, yie ákwà, birikwa n’ụlọ. Onye na-agbalị otú ọ ga-esi nweta ihe ndị a emeghị ihe ọjọọ. Ma, Jizọs dọrọ anyị aka ná ntị ka anyị ghara iwere akụ̀ ka ihe kacha mkpa. N’otu ihe atụ Jizọs nyere, o kwuru banyere ọgaranya ụlọ ebe ọ na-akwakọba ihe ọ kọtara n’ugbo juru n’ọnụ. Ihe ndị ọ kụrụ n’ubi mere nke ọma. N’ihi ya, o nweghị ebe ọ ga-edewe ha. Nwoke ahụ kpebiri ịkụtu ụlọ ebe ọ na-akwakọba ihe o nwetara n’ubi ma rụọ ndị ka ya. O kwuru n’obi ya, sị: “N’ebe ahụ ka m ga-achịkọta mkpụrụ m niile na ezi ihe m niile; m ga-asịkwa mkpụrụ obi m: ‘Mkpụrụ obi, i nwere ọtụtụ ezi ihe m kpakọbara maka ọtụtụ afọ; tụsara ahụ́, na-eri, na-aṅụ, mee onwe gị obi ụtọ.’” Ma ihe dị ezigbo mkpa ọgaranya ahụ chefuru bụ na o nwere ike ịnwụ n’abalị ahụ.—Luk 12:16-20.

Ka afọ na-aga, anyị nwere ike ichegbuwe onwe anyị banyere otú anyị ga-esi nweta ego anyị ga-eji lee onwe anyị nká. O nwere ike ime ka anyị jiri ọtụtụ awa na-arụ ọrụ. Nke ga-eme ka anyị na-agha ọmụmụ ihe na ozi ọma ma ọ bụkwanụ na-eleghara ihe ndị ọzọ Onye Kraịst kwesịrị ịna-eme anya. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịkpachara anya maka ụdị echiche ahụ? O nwere ike ịbụ na anyị ka na-eto eto, ghọtakwa na ije ozi oge niile bụ ihe kacha  mma mmadụ nwere ike ime. Ma, ànyị na-eche na anyị kwesịrị ibu ụzọ kpata ezigbo ego tupu anyị amalite ịsụ ụzọ? Anyị kwesịrị ime ihe niile anyị nwere ike ime ugbu a ka anyị bụrụ ọgaranya n’ebe Chineke nọ, n’ihi na anyị amaghị echi.

Ịṅụ mmanya na-aba n’anya.

Ilu 23:20 kwuru, sị: “Anọla n’etiti ndị na-aṅụ oké mmanya.” Ọ bụrụ na ịṅụ mmanya na-agụsi mmadụ ike, onye ahụ nwere ike ịna-ekwu na ịṅụ ya mgbe niile abụghị ihe ọjọọ. O nwere ike ikwu na ya ji ya ezu ike, na ya anaghị aṅụ ya otú ọ ga-egbuwe ya egbu. Ọ bụrụ na ahụ́ anaghị eru anyị ala ma ọ bụrụ na anyị aṅụghị mmanya, anyị kwesịrị ileru onwe anyị anya, mata ihe anyị bu n’obi.

Ụdị ndị anyị na-emete enyi.

N’eziokwu, anyị ga na-ahụ ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova, ma n’ụlọ akwụkwọ ma n’ebe anyị na-arụ ọrụ ma n’ozi ọma. Ma, ọ gaghị adị mma ka anyị na ha na-anọ mgbe niile ma ọ bụ ka anyị mete ha enyi. Anyị nwere ike ikwu na ihe mere anyị na ha ji akpa bụ na ha na-akpa ezigbo àgwà. Baịbụl dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “Unu ekwela ka e duhie unu. Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà ọma.” (1 Kọr. 15:33) Obere mmiri na-adịghị mma a wụnyere ná mmiri dị ọcha ga-emebi mmiri ahụ. Ọ bụ otú ahụ ka imete ndị na-anaghị asọpụrụ Chineke enyi nwere ike isi mee ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma. O nwekwara ike ime ka anyị mụta otú ha si eche echiche, otú ha si eji ejiji, otú ha si ekwu okwu, na otú ha si akpa àgwà.

Ihe ndị anyị ji atụrụ ndụ.

Nkà na ụzụ ọgbara ọhụrụ emeela ka ọ dị mfe inweta ụdị ihe dị iche iche e ji atụrụ ndụ. Ma, Ndị Kraịst kwesịrị izere ọtụtụ n’ime ha. Pọl onyeozi dere, sị: ‘Ka a ghara ịkpọtụdị ụdị adịghị ọcha ọ bụla aha n’etiti unu.’ (Efe. 5:3) Ọ́ bụrụkwanụ na ihe na-agụ obi anyị agụụ bụ ile ma ọ bụ igere ihe rụrụ arụ? Obi anyị nwere ike ịna-agwa anyị na onye ọ bụla kwesịrị ịna-ezurutụ ike ma ọ bụ na-atụrụ ndụ nakwa na otú mmadụ chọrọ isi mee ya enweghị onye ọ gbasara. Ma anyị kwesịrị ịna-echeta ndụmọdụ ahụ Pọl nyere ma ghara ikwe ka anya anyị hụ ihe rụrụ arụ ma ọ bụ ka ntị anyị nụ ya.

ANYỊ NWERE IKE ỊGBANWE

Ọ bụrụ na obi anyị aghọgbuola anyị, nke mere ka anyị na-akụdo ihe aka na-eme ihe ọjọọ, anyị kwesịrị ịgbanwe àgwà ahụ. (Efe. 4:22-24) Ka anyị tụlee mmadụ abụọ mere otú ahụ n’oge anyị a.

Otu nwanna aha ya bụ Okafọ * chọpụtara na o kwesịrị ịgbanwe otú o si ele akụ̀ anya. O kwuru, sị: “Mụ na nwunye m na nwa m nwoke bi n’obodo ebe ndị mmadụ chere na ihe kacha mkpa bụ inweta ihe ndị pụtara ọhụrụ na ihe ndị kacha mma e ji ekpori ndụ, bụ́ ndị nkà na ụzụ mepụtara. O nwere mgbe m ji oge m niile na-achụ akụnụba. M chere na ọ gaghị eme ka m hụ akụnụba n’anya. N’oge na-adịghị anya, aghọtara m na ọ bụrụ na mmadụ na-achụ akụ̀ ọnwụ ọnwụ, akụ̀ agaghị eju ya afọ. M kpere ekpere gwa Jehova otú m si ele ihe anya nakwa ihe m bu n’obi. M gwara ya na ezinụlọ anyị chọrọ iji obi anyị niile na-efe ya. Anyị mechara kpebie ịhapụ ihe ndị na-eri anyị oge, kwaga n’ebe a chọkwuru ndị ga na-ekwusa ozi ọma. N’oge na-adịghị anya, anyị malitere ịsụ ụzọ. Anyị achọpụtala na ibi ezigbo ndụ nke ga-eme anyị obi ụtọ apụtaghị na anyị ga-abụrịrị aka ji akụ̀.”

Nwanna ọzọ aha ya bụ Lekwa nwere ndị enyi na-anaghị akpa ezi àgwà. Akụkọ ya gosiri na ihe nyeere ya aka ịhapụ ndị enyi ọjọọ bụ ichebara onwe ya echiche. O kwuru, sị: “Ụdị ọrụ m na-arụ mere ka mụ na ndị si mba ọzọ m si n’aka ha atụbata ngwá ahịa na-anọrị mgbe niile. Ama m na ha na-aṅụ oké mmanya. Ma, obi na-adị m ụtọ ma mụ na ha nọrọ. Ọtụtụ mgbe, ọ fọrọ obere ka m ṅụbiga mmanya ókè, ma m mechara kwaa ụta. Echebaara m onwe m echiche iji mata ihe m bu n’obi. Ndụmọdụ si n’Okwu Chineke nakwa aro ndị okenye tụụrụ m nyeere m aka ịghọta na ndị mụ na ha na-akpa bụ ndị na-ahụghị Jehova n’anya. Ọtụtụ mgbe, ọ bụzi ekwentị ka mụ na ha na-eji akparịta. M na-agbalịsikwa ike ka mụ na ha ghara ịna-ahụ anya mgbe niile.”

Anyị kwesịrị ịgwa onwe anyị eziokwu ma mata ihe anyị bu n’obi. Ka anyị na-eme otú ahụ, anyị kwesịrị ikpe ekpere rịọ Jehova ka o nyere anyị aka. Anyị kwesịkwara icheta na “ọ maara ihe nzuzo niile nke obi.” (Ọma 44:21) Chineke nyekwara anyị Okwu ya bụ́ Baịbụl, nke anyị nwere ike iji na-enyocha onwe anyị. (Jems 1:22-25) Ndụmọdụ ndị anyị na-enweta n’akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl na ihe anyị na-amụta n’ọmụmụ ihe na-abakwara anyị uru. Ihe ndị a niile nwere ike inyere anyị aka ichebe obi anyị ma na-eme ihe ziri ezi.

^ para. 18 Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.