Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) FEBỤWARỊ 2013

Ihe Nketa Jehova Nyere Anyị

Ihe Nketa Jehova Nyere Anyị

“Nke a bụ ihe nketa nke ndị ohu Jehova.”—AỊZA. 54:17.

1. Gịnị ka Jehova chebere ka ọ baara ụmụ mmadụ uru?

JEHOVA CHINEKE, bụ́ “onye dị ndụ ma na-adịru mgbe ebighị ebi,” chebere okwu ya na-enye ndụ ka o ruo ụmụ mmadụ aka. “Okwu Jehova” anaghị agbanwe agbanwe n’ihi na ọ “na-adịru mgbe ebighị ebi.” (1 Pita 1:23-25) Anyị na-ekele Jehova na o chebere ozi dị mkpa otú ahụ n’Okwu ya, bụ́ Baịbụl.

2. Gịnị ka Chineke chebeere ndị ya n’Okwu ya?

2 Chineke chebere aha ya na Baịbụl n’ihi na ọ chọrọ ka ndị na-efe ya mara aha ya. Ebe mbụ Baịbụl kpọrọ aha “Jehova bụ́ Chineke” bụ mgbe ọ na-ekwu otú Chineke si kee eluigwe na ụwa. (Jen. 2:4) Chineke ji ike mmụọ nsọ ya dee aha ya ọtụtụ ugboro ná mbadamba nkume ahụ o dere Iwu Iri ahụ. Dị ka ihe atụ, ihe e ji bido iwu nke mbụ bụ: “Abụ m Jehova Chineke gị.” (Ọpụ. 20:1-17) N’agbanyeghị mbọ niile Setan gbara ka ndị mmadụ ghara ịma aha Chineke, e nwere ndị ka ma aha ahụ n’ihi na Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova chebere Okwu ya na aha ya.—Ọma 73:28.

3. N’agbanyeghị na ozizi ụgha juru ụwa taa, gịnị ka Chineke chebeere anyị?

3 Jehova chebere eziokwu ya n’Okwu ya, bụ́ Baịbụl. N’agbanyeghị na ọtụtụ okpukpe n’ụwa niile na-akụzi ihe na-abụghị eziokwu, obi kwesịrị ịdị anyị ụtọ na Chineke mere ka anyị hụ ìhè ya ma mata eziokwu ya. (Gụọ Abụ Ọma 43:3, 4.) Ndị ụwa na-eje ije n’ọchịchịrị, ma anyị ji obi ụtọ na-eje ije n’ìhè Chineke nyere anyị.—1 Jọn 1:6, 7.

ANYỊ NWERE IHE NKETA ANYỊ KWESỊRỊ IJI KPỌRỌ IHE

4, 5. Olee ihe ọma Jehova meere anyị n’afọ 1931?

4 Ihe nketa bụ ihe ọ bụla mmadụ si n’aka ndị mụrụ ya ma ọ bụ ndị ezinụlọ ya nweta. Anyị nwere ihe nketa bara ezigbo uru Jehova nyere anyị. Ụfọdụ n’ime ha bụ na o meela ka anyị na-aghọta Baịbụl, mara yanwa,  marakwa nzube ya. Ọ kpọkwasịkwala anyị aha ya, nke a bụkwa ihe ọma pụrụ iche o meere anyị.

Ná mgbakọ anyị gara n’afọ 1931, obi dị anyị ụtọ na anyị malitere ịza Ndịàmà Jehova

5 Anyị malitere ịza Ndịàmà Jehova n’otu mgbakọ e mere na Kolọmbọs, Ohayo, dị n’Amerịka, n’afọ 1931. E nwere mkpụrụ akwụkwọ abụọ e dere n’usoro ihe omume mgbakọ ahụ. Ọtụtụ ndị bịara mgbakọ ahụ nọ na-eche ihe mkpụrụ akwụkwọ abụọ ahụ pụtara. Ụfọdụ ndị kwutere ihe ọ pụtara. Mkpụrụ akwụkwọ abụọ ahụ nọchiri anya aha ọhụrụ anyị. Anyị na-azabu Ndị Mmụta Baịbụl. Ma n’ụbọchị Sọnde, abalị iri abụọ na isii n’ọnwa Julaị n’afọ 1931, anyị niile kwetara ịzawa Ndịàmà Jehova. Obi dị anyị ụtọ na anyị malitere ịza aha ahụ si na Baịbụl. (Gụọ Aịzaya 43:12.) Otu nwanna kwuru, sị: “Agaghị m echefu otú olu ndị mmadụ si dasie ụda ike nakwa aka a kụrụ n’ebe ahụ anyị zukọrọ.” E nweghị ndị ọzọ n’ụwa chọrọ ịza aha ahụ, ma Chineke agọziela anyị kemgbe ihe karịrị iri afọ asatọ anyị zawara ya. Obi dị anyị ezigbo ụtọ na anyị bụ Ndịàmà Jehova.

6. Olee ụfọdụ ihe ndị a kụziiri anyị, bụ́ ihe nketa Jehova nyere anyị?

6 Ihe ọzọ so n’ihe nketa anyị bụ ihe ndị bụ́ eziokwu na ndị dị ezigbo mkpa Baịbụl kọọrọ anyị banyere ndị fere Chineke n’oge ochie. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kọọrọ anyị banyere Ebreham, Aịzik, na Jekọb. Ọ ga-abụrịrị na ha na ndị ezinụlọ ha kwurịtara banyere otú ha ga-esi mee ihe dị Jehova mma. N’ihi ya, o jughị anyị anya na Josef jụrụ ịkwa iko ka ọ ghara “imehie Chineke.” (Jen. 39:7-9) Na narị afọ mbụ, Ndị Kraịst ji okwu ọnụ ha na omume ha na-akụziri ndị ibe ha ihe banyere Chineke. Ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ bụ ihe gbasara Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, bụ́ ihe Pọl onyeozi nyefere ọgbakọ dị iche iche. (1 Kọr. 11:2, 23) Ihe ahụ niile so n’ihe e dere na Baịbụl ka anyị nwee ike ịma otú anyị ga-esi na-efe Chineke “n’ime mmụọ na n’eziokwu.” (Gụọ Jọn 4:23, 24.) Baịbụl na-akụziri ụmụ mmadụ ihe, ma anyị bụ́ ndị na-efe Jehova kwesịrị iji ya kpọrọ ihe karịsịa.

7. Olee nkwa Chineke kwere anyị, nke so n’ihe nketa anyị?

7 Ihe ọzọ so n’ihe nketa Jehova nyere anyị bụ ihe ndị e biri n’akwụkwọ anyị n’oge na-adịbeghị anya. Ihe ndị ahụ na-egosi na ‘Jehova nọnyeere anyị.’ (Ọma 118:7) Ha na-eme ka obi sie anyị ike, ọ bụrụgodị na a na-akpagbu anyị. Ihe ọzọ so n’ihe nketa anyị bụ nkwa Chineke kwere anyị, nke na-eme ka obi sie anyị ike. Jehova kwuru, sị: “Ngwá ọgụ ọ bụla a ga-akpụ iji lụso gị ọgụ agaghị aga nke ọma, ire ọ bụla nke ga-ekwu okwu megide gị n’ikpe ka ị ga-ama ikpe. Nke a bụ ihe nketa nke ndị ohu Jehova, ezi omume ha si n’ebe m nọ.” (Aịza. 54:17) O nweghị ngwá ọgụ ọ bụla Setan kpụrụ nke nwere ike ịkpatara anyị nsogbu ga-adịru mgbe ebighị ebi.

8. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a nakwa na nke na-eso ya?

 8 Setan agbalịala ibibi Baịbụl, gbalịa ka ndị mmadụ ghara ịma aha Jehova, gbalịakwa ka ha ghara ịma eziokwu banyere Chineke. Ma, Jehova ka ya ike. Ọ bụ ya mere o ji mee ka mbọ niile Setan gbara kụọ afọ n’ala. N’isiokwu a nakwa na nke na-eso ya, e nwere ihe atọ anyị ga-atụle. Nke mbụ bụ otú Chineke si chebe Okwu ya. Nke abụọ abụrụ otú Jehova si mee ka ndị mmadụ ka mara aha ya. Nke atọ abụrụ otú Nna anyị nke eluigwe si chebe eziokwu ya, meekwa ka anyị mata ya.

JEHOVA CHEBEERE ANYỊ OKWU YA

9-11. Olee ihe ndị gosiri na Jehova chebere Baịbụl n’agbanyeghị mbọ ndị a gbara ibibi ya?

9 Jehova chebere Okwu ya n’agbanyeghị mbọ niile a gbara ibibi ya. Otu akwụkwọ kwuru, sị: “N’afọ 1229, ndị Fada nwere otu nnọkọ na Toluz dị na Frans. Ná nnọkọ ahụ, ha nyere iwu na onye na-abụghị ụkọchukwu ekwesịghị imetụ Baịbụl ọ bụla na-abụghị nke Latịn aka. Ihe mere ha ji nye iwu ahụ bụ ka ha hụ na e nweghị onye ga-agụ Baịbụl Waldo sụgharịrị ma ọ bụ gee ndị ọzọ na-akụzi ihe megidere okpukpe ndị Katọlik ntị. Ná nnọkọ ọzọ e nwere na Taragona dị na Spen, Jems nke Mbụ nyere iwu yiri nke ahụ ndị Fada nyere na Toluz. N’afọ 1559, Poopu Pọl nke Anọ nyere iwu ka onye ọ bụla ghara ibipụta ma ọ bụ nwee Baịbụl n’asụsụ na-abụghị Latịn ma ọ bụrụ na o nyeghị onye ahụ ikike.”

10 Jehova chebere Baịbụl n’agbanyeghị mbọ niile ndị mmadụ gbara ibibi ya. N’ihe dị ka afọ 1382, Jọn Wiklif (John Wycliffe) na ndị òtù ya sụgharịrị Baịbụl mbụ e nwere n’asụsụ Bekee. Onye ọzọ sụgharịrị Baịbụl bụ nwoke aha ya bụ Wiliam Tindel (William Tyndale), bụ́ onye e gburu n’afọ 1536. A kọrọ na mgbe e kegidere ya n’osisi, o tiri mkpu, sị, “Onyenwe anyị, mepee anya eze ndị Ingland.” A kwụgburu ya ma kpọọ ozu ya ọkụ.

11 N’agbanyeghị ihe ahụ niile, Baịbụl ka dịkwa. Dị ka ihe atụ, n’afọ 1535, otu nwoke aha ya bụ Maịlz Kọvadel sụgharịrị otu Baịbụl Bekee. Ihe ụfọdụ Kọvadel ji sụgharịa Baịbụl ya bụ “Agba Ọhụrụ” na “Agba Ochie” Tindel sụgharịrị, malite na Jenesis ruo n’Ihe E Mere. O si na Latịn nakwa na Baịbụl Matịn Luta sụgharịrị n’asụsụ Jaman sụgharịa ebe ndị ọzọ na Baịbụl. Taa, anyị nwere Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ. Obi dị anyị ụtọ na ọ na-ekwu ihe doro anya na ihe ziri ezi. Ọ naghịkwa esiri ndị mmadụ ike nghọta ma anyị gụọ ya n’ozi ọma. Obi dịkwa anyị ụtọ na Setan na ndị òtù ya enweghị ike ime ka Jehova ghara ichebe Okwu ya.

OTÚ JEHOVA SI MEE KA NDỊ MMADỤ KA MARA AHA YA

Ndị dị ka Tindel kwere ka e gbuo ha n’ihi Okwu Chineke

12. Olee otú Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ si na-enyere ndị mmadụ aka ịmata aha Chineke?

12 Jehova Chineke mere ka a ghara iwepụcha aha ya na Baịbụl niile.  Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ so na-eme ka aha Chineke ghara ifu. N’Okwu Mmalite ya, ndị sụgharịrị ya dere, sị: “Ihe kasị pụta ìhè ná nsụgharị a bụ mweghachi e weghachiri aha Chineke n’ebe o kwesịrị ịdị n’ihe odide Baịbụl. A sụgharịrị ya “Jehova” ugboro puku isii na narị itoolu na iri asaa na atọ n’Akwụkwọ Nsọ Hibru nakwa ugboro narị abụọ na iri atọ na asaa n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, dị ka ọtụtụ mmadụ si akpọ ya n’asụsụ Igbo.” E nwere Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ ugbu a, ma nke nwere Akwụkwọ Nsọ Hibru na Akwụkwọ Nsọ Grik ma nke bụ naanị Akwụkwọ Nsọ Grik, n’asụsụ 116. Ọnụ ọgụgụ Baịbụl e bipụtarala karịrị 178,545,862.

13. Gịnị mere e nwere ike iji kwuo na kemgbe e kere ụmụ mmadụ, ha ma aha Chineke?

13 Kemgbe e kere ụmụ mmadụ, ha ma aha Chineke. Adam na Iv ma ya. Ihe Baịbụl kwuru gosiri na ha kpọrọ aha ahụ. Mgbe Noa na-agọzi nwa ya bụ́ Shem, o kwuru, sị: “Ka Jehova, bụ́ Chineke Shem, bụrụ onye a gọziri agọzi.” (Jen. 4:1; 9:26) Chineke n’onwe ya kwuru, sị: “Abụ m Jehova. Ọ bụ ya bụ aha m; agaghị m enye onye ọzọ nsọpụrụ m.” O kwukwara, sị: “Abụ m Jehova, e nweghị onye ọzọ. E wezụga m, ọ dịghị Chineke ọzọ dịnụ.” (Aịza. 42:8; 45:5) Jehova echebela aha ya ma mee ka ndị mmadụ mara aha ya n’ụwa niile. Obi dị anyị ụtọ na anyị ma aha Jehova ma bụrụ Ndịàmà ya. E nwere ike ikwu na anyị na-eti mkpu, sị: ‘Anyị ga-ebuli ọkọlọtọ anyị n’aha Chineke anyị.’—Ọma 20:5.

14. E wezụga Baịbụl, olee ebe ọzọ e dere aha Chineke?

14 Ọ bụghị naanị na Baịbụl ka e dere aha Chineke. Dị ka ihe atụ, e dere ya na Nkume Moab a hụrụ na Daịbọn, nke dị iri kilomita abụọ na otu n’ebe ọwụwa anyanwụ Oké Osimiri Nwụrụ Anwụ. E dere aha eze Izrel bụ́ Ọmraị na nkume ahụ nakwa ihe eze Moab bụ́ Misha kwuru banyere agha ọ lụsoro ndị Izrel. (1 Eze 16:28; 2 Eze 1:1; 3:4, 5) Ma ihe e dere na Nkume Moab ahụ nwere uru ọzọ ọ baara anyị. E dere mkpụrụ akwụkwọ anọ bụ́ YHWH na ya. E dekwara ya ugboro ugboro n’Akwụkwọ Ozi Lekish. Akwụkwọ Ozi Lekish bụ ibe eju ndị e gwutere n’Izrel.

15. Gịnị bụ Septuagint, gịnịkwa mere e ji sụgharịa ya?

15 Ndị mbụ sụgharịrị Baịbụl so mee ka ndị mmadụ mara aha Chineke. Ndị Babịlọn dọọrọ ndị Juu n’agha n’afọ 607 Tupu Oge Ndị Kraịst. Ma, ha hapụrụ ha n’afọ 537. Mgbe a hapụrụ ha, ọtụtụ n’ime ha alaghachighị Juda na Izrel. N’ihe dị ka narị afọ abụọ na iri asatọ Tupu Oge Ndị Kraịst, ọtụtụ ndị Juu gara biri n’Alegzandria, dị n’Ijipt. E kwesịrị ịsụgharịrị ha Akwụkwọ Nsọ Hibru n’asụsụ Grik, bụ́ asụsụ a na-asụ mgbe ahụ n’ọtụtụ mba. A sụgharịchara ya n’ihe dị ka narị afọ abụọ Tupu Oge Ndị Kraịst, ma kpọọ ya Akwụkwọ Nsọ Septuagint. E dere aha Chineke n’ụfọdụ n’ime ha otú ndị Hibru si ede ya.

16. Nye ihe atụ gosiri ebe e dere aha Chineke n’akwụkwọ e biri nke mbụ ya n’afọ 1640.

16 Akwụkwọ mbụ e biri n’Amerịka mgbe ndị Ingland na-achị ha bụ akwụkwọ Abụ Ọma. E si na Hibru sụgharịa ya na Bekee. E dere aha Chineke na ya. E biri nke mbụ ya n’afọ 1640. Otu n’ime ebe e dere aha Chineke na ya bụ n’Abụ Ọma 1:1, 2. Ebe ahụ kwuru na onye a gọziri agọzi anaghị eje ije na ndụmọdụ ndị ajọ omume, ma ihe na-atọ ya ụtọ bụ iwu “Iehova.” Ị chọọ ịmatakwu banyere aha Chineke, gụọ broshọ bụ́ Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi.

 JEHOVA EMEELA KA ANYỊ NWEE IKE ỊMATA EZIOKWU

17, 18. (a) Gịnị bụ “eziokwu”? (b) Olee ihe ndị so ‘n’eziokwu nke ozi ọma ahụ’?

17 Anyị ji ọṅụ na-efe ‘Jehova bụ́ Chineke nke eziokwu.’ (Ọma 31:5) Gịnị bụ eziokwu? Ọ bụ ikwu ihe otú o si mee, kama ichepụta otu ihe kọọrọ ndị mmadụ. N’asụsụ Hibru e ji dee Baịbụl, okwu e si sụgharịta “eziokwu” bụ ihe na-abụghị ụgha, ihe e kwesịrị ịtụkwasị obi, ma ọ bụ ihe mere eme. Okwu Grik e si sụgharịta “eziokwu” pụtara ihe kwesịrị ekwesị na ihe ziri ezi.

18 Jehova emeela ka anyị nwee ike ịmata eziokwu ya taa. Ọ na-enyekwara anyị aka ịna-amụtakwu banyere eziokwu ahụ. (2 Jọn 1, 2) Anyị ji nwayọọ nwayọọ na-aghọtakwu eziokwu ya, n’ihi na “ụzọ ndị ezi omume yiri ìhè nke na-enwupụ enwupụ ka chi na-abọwanye ruo mgbe chi bọchara.” (Ilu 4:18) N’eziokwu, anyị ji obi anyị niile kweta ihe ahụ Jizọs gwara Chineke n’ekpere. Jizọs sịrị: “Okwu gị bụ eziokwu.” (Jọn 17:17) Ihe dị na Baịbụl bụ “eziokwu nke ozi ọma ahụ,” nke bụ́ ihe niile Ndị Kraịst na-akụzi. (Gal. 2:14) Ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ bụ eziokwu banyere aha Jehova, ọchịchị ya, àjà ahụ Jizọs chụrụ, mbilite n’ọnwụ, nakwa Alaeze Chineke. Ka anyị tụlee otú Chineke si chebe eziokwu ya n’agbanyeghị mbọ niile Setan gbara ka ndị mmadụ ghara ịma ya.

JEHOVA MERE KA MBỌ SETAN NA-AGBA KỤỌ AFỌ N’ALA

19, 20. Ònye bụ Nimrọd? Olee mbọ ndị mmadụ gbara n’oge ya nke kụrụ afọ n’ala?

19 Mgbe Iju Mmiri gachara, a na-ekwukarị, sị: “Dị nnọọ ka Nimrọd bụ́ dinta dị ike nke na-emegide Jehova.” (Jen. 10:9) Nimrọd nọ na-emegide Jehova Chineke. N’ihi ya, ọ pụtara na Nimrọd fere Setan. Àgwà ya yiri nke ndị ahụ Jizọs gwara, sị: “Unu sitere ná nna unu bụ́ Ekwensu, unu na-achọkwa ime ihe nna unu chọrọ. . . . O guzosighịkwa ike n’eziokwu.”—Jọn 8:44.

20 Nimrọd chịrị Bebel na obodo ndị ọzọ dị n’agbata osimiri Taịgris na Yufretis. (Jen. 10:10) Ọ dị ka ọ̀ bụ ya nyere iwu ka a rụọ obodo Bebel. A malitere ịrụ ụlọ elu ya n’afọ 2269 Tupu Oge Ndị Kraịst. Jehova chọrọ ka ụmụ mmadụ gbasaa n’ụwa. Ma ndị na-ewu obodo Bebel kwuru, sị: “Ngwanụ! Ka anyị wuoro onwe anyị obodo na ụlọ elu nke elu ya ga-eru n’eluigwe, ka anyị meekwara onwe anyị aha na-ewu ewu, ka anyị wee ghara ịgbasa n’ebe niile n’ụwa.” Ma ha hapụrụ ihe ahụ niile ha chọrọ ịrụ n’ihi na Chineke “ghagburu asụsụ ụwa dum.” (Jen. 11:1-4, 8, 9) Ọ bụrụ na ihe Setan bu n’obi bụ ịmalite otu okpukpe ga-eme ka mmadụ niile na-efe ya, atụmatụ ya kụrụ afọ n’ala. Kemgbe ụwa, Jehova ekwebeghị ka e bibie ofufe ya. Kwa ụbọchị, a na-enwekwu ndị na-ekpebi ife Jehova.

21, 22. (a) Gịnị mere na okpukpe ụgha agaghị emerili ezi ofufe? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

21 Okpukpe ụgha enweghị ike imeri ezi ofufe. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Onye Ozizi Ukwu anyị echebela Okwu ya, bụ́ Baịbụl, mee ka ndị mmadụ mata aha ya na eziokwu ya. (Aịza. 30:20, 21) Ife Chineke otú ọ chọrọ na-eme ka anyị nwee ọṅụ. Ma, ka anyị nwee ike mee otú ahụ, anyị kwesịrị ịmụrụ anya, na-atụkwasị Jehova obi anyị niile, kwekwa ka mmụọ nsọ ya na-eduzi anyị.

22 N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-atụle otú ozizi ụgha dị iche iche si malite. Anyị ga-achọpụta na ozizi ụgha ndị ahụ esighị na Baịbụl. Anyị ga-ahụkwa otú Jehova, bụ́ Onye na-echebe eziokwu, sirila gọzie anyị, mee ka anyị ghọta ozizi ndị bụ́ eziokwu. Ihe ahụ niile so n’ihe nketa o nyere anyị anyị ji kpọrọ ihe.