Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Febụwarị 2013

Ekwela Ka Ihe Ọ Bụla Mee Ka Ị Ghara Inweta Otuto

Ekwela Ka Ihe Ọ Bụla Mee Ka Ị Ghara Inweta Otuto

“Onye dị umeala na mmụọ ya ga-enweta otuto.”—ILU 29:23.

1, 2. (a) Gịnị ka okwu Hibru e si sụgharịta “otuto” pụtara? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle n’isiokwu a?

Ị NỤ okwu bụ́ “ebube” ma ọ bụ “otuto,” gịnị na-agbata gị n’obi? Ị̀ na-echeta otú ihe ndị Chineke kere si maa mma? (Ọma 19:1) Ka ọ̀ bụ otú e si eto ndị aka ji akụ̀, ndị ma ihe ma ọ bụ ndị mepụtara ihe? N’Akwụkwọ Nsọ, okwu e si sụgharịta “otuto” na “ebube” bụ okwu e ji akọwa ihe na-anyị arọ. N’oge ochie, mgbe e ji ọlaọcha ma ọ bụ ọlaedo akpụ ego, otú ego nyịruru n’arọ ka a ga-eji mata ihe e nwere ike iji ya zụta. N’ihi ya, okwu ndị e si sụgharịta “otuto” nwere ike ịpụta ihe bara ezigbo uru ma ọ bụ ihe dị ebube.

2 Ndị mmadụ na-asọpụrụ ndị nọ ná nnukwu ọkwá ma ọ bụ ndị a ma ama. Ma, gịnị ka mmadụ ga-eme ka Chineke bulie ya elu? Baịbụl kwuru banyere otuto Chineke na-eme ka mmadụ nweta. Dị ka ihe atụ, Ilu 22:4 kwuru, sị: “Ihe ịdị umeala n’obi na ịtụ egwu Jehova na-arụpụta bụ akụnụba na otuto na ndụ.” Jems, bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs, kwukwara, sị: “Wedanụ onwe unu ala n’anya Jehova, ọ ga-ebulikwa unu elu.” (Jems 4:10) Olee otuto Jehova na-eme ka ndị mmadụ nweta? Gịnị nwere ike ime ka anyị ghara inweta ya? Olee otú anyị ga-esi nyere ndị ọzọ aka inweta otuto ahụ?

3-5. Olee otú Jehova ga-esi kwanyere anyị ùgwù?

3 Ihe ọbụ abụ kwuru gosiri na obi siri ya ike na Jehova ga-ejide aka nri ya, na-edu ya ka o nweta ezigbo ùgwù. (Gụọ Abụ Ọma 73:23, 24.) Olee otú Jehova si eme ya? Jehova na-edu ndị ohu ya dị umeala n’obi ka ha nweta otuto. Otú o si eme ya bụ isi n’ụzọ dị iche iche na-eme ka ha nweta ùgwù. Ọ na-agọzi ha, na-eme ka ha ghọta ihe bụ́ uche ya. (1 Kọr. 2:7) Ọ na-akwanyere ndị na-ege ya ntị na ndị na-erubere ya isi ùgwù. Ihe ọ pụtara bụ na ha na ya dị ná mma.—Jems 4:8.

 4 Jehova nyekwara ndị ohu ya akụ̀ bara ezigbo uru, ya bụ, ozi ọma ha na-ekwusa. (2 Kọr. 4:1, 7) Ozi ọma ahụ na-eme ka anyị nweta otuto. Mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma ma na-eto Jehova, ọ na-akwanyere anyị ùgwù, ndị ọzọ na-eritekwa uru. N’ihi ya, Jehova kwere anyị nkwa, sị: “Ndị na-asọpụrụ m ka m ga-akwanyere ùgwù.” (1 Sam. 2:30) Otú Jehova si akwanyere ndị na-ekwusa ozi ọma ùgwù bụ na ọ na-ele ha anya ọma. Ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ga na-ekwukwa okwu ọma banyere ha.—Ilu 11:16; 22:1.

5 Gịnị ka Jehova ga-emere ndị na-erubere ya isi n’ọdịnihu? Baịbụl kwere ha nkwa na Jehova ga-ebuli ha elu inweta ụwa nakwa na mgbe a ga-ebibi ndị na-eme ihe ọjọọ, ha ga-ahụ ya. (Ọma 37:34) Ha na-atụsi anya ike ịhụ mgbe Jehova ga-akwanyere ha ùgwù na-enweghị atụ, nke bụ́ ịdị ndụ ebighị ebi.—Ọma 37:29.

“ADỊGHỊ M ANABATA OTUTO SI N’AKA MMADỤ”

6, 7. Gịnị mere ọtụtụ ndị Juu ekweghị na Jizọs bụ Mesaya?

6 Gịnị nwere ike ime ka anyị ghara inweta otuto Jehova chọrọ ka anyị nweta? Otu n’ime ha bụ iwere na ihe ndị na-amaghị Chineke kwuru bụ ihe kacha mkpa. Dị ka ihe atụ, Jọn onyeozi dere banyere ụfọdụ ndị ọchịchị n’oge Jizọs nọ n’ụwa. Ọ sịrị: “N’etiti ndị na-achị achị, ọtụtụ ndị nwere okwukwe n’ezie n’ebe [Jizọs] nọ, ma n’ihi ndị Farisii, ha adịghị ekwupụta ya, ka e wee ghara ịchụpụ ha n’ụlọ nzukọ; n’ihi na ha hụrụ otuto mmadụ n’anya karịa ọbụna otuto Chineke.” (Jọn 12:42, 43) Ọ gaara aka mma ma a sị na ndị ọchịchị ahụ ewereghị na ihe kacha mkpa bụ otú ndị Farisii ga-esi na-ele ha anya.

7 Tupu mgbe ahụ, Jizọs ekwuola hoo haa ihe mere ọtụtụ ndị anabataghị ya ma ọ bụ kweta na ya bụ Mesaya. (Gụọ Jọn 5:39-44.) Ndị Izrel na-atụ anya Mesaya kemgbe ọtụtụ narị afọ. Mgbe Jizọs malitere izi ihe, ọ ga-abụ na amụma Daniel buru mere ka ụfọdụ ghọta na oge Kraịst ga-abịa eruola. Mgbe Jọn Onye Na-eme Baptizim malitere ikwusa ozi ọma ọnwa ole na ole tupu mgbe ahụ, ọtụtụ ndị nọ na-ekwu, sị: “Ọ̀ ga-abụ na ọ bụ ya bụ Kraịst?” (Luk 3:15) Ma mgbe Mesaya ahụ ha na-atụ anya ya kemgbe nọ na-akụzi ihe n’etiti ha, ndị ahụ na-akụzi Iwu Mozis anabataghị ihe ọ na-akụzi. N’ihi gịnị? Jizọs kwuru ihe kpatara ya. Ọ jụrụ ha, sị: “Olee otú unu pụrụ isi kwere, mgbe unu na-anara otuto n’aka ibe unu, unu adịghịkwa achọ otuto nke si n’aka onye ahụ naanị ya bụ Chineke?”

8, 9. Olee otú otuto mmadụ nwere ike isi dị mmadụ mkpa karịa otuto si n’aka Jehova? Jiri ọkụ eletrik mee ihe atụ.

8 Anyị nwere ike ịghọta otú otuto mmadụ nwere ike isi dị mmadụ mkpa karịa otuto si n’aka Chineke ma ọ bụrụ na anyị ejiri ebube tụnyere ìhè. Ọtụtụ ihe Chineke ji chọọ mbara igwe mma na-egosi ebube ya. Ì chetara mgbe ikpeazụ i lere anya na mbara igwe n’abalị ma hụ ọtụtụ kpakpando? “Ebube nke kpakpando” enweghị atụ. (1 Kọr. 15:40, 41) Ma, i lee anya n’eluigwe n’obodo ebe e nwere ọkụ eletrik, olee otú mbara igwe na-adị? Ọkụ eletrik nwere ike ime ka ị ghara ịhụ ìhè kpakpando ndị ahụ. Ọ̀ bụ n’ihi na ọkụ na-enwu n’okporo ụzọ, n’ámá egwuregwu nakwa n’ụlọ dị iche iche na-enwusi ike ma ọ bụ maa mma karịa kpakpando? Mbanụ! Ihe mere na ị gaghị ahụ ebube kpakpando ndị ahụ bụ na ọkụ na-enwu n’obodo dị anyị nso karịa ìhè kpakpando. Ha nwekwara ike ime ka anyị ghara ịhụcha otú ihe Jehova kere si dị ebube. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịhụ otú kpakpando si ama mma n’abalị, anyị kwesịrị ịga n’ebe ọkụ eletrik na-adịghị.

9 N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na anyị chọrọ inweta otuto na-ekwesịghị ekwesị, o nwere  ike ime ka anyị ghara ịghọta na otuto ga-adịru mgbe ebighị ebi nke Jehova na-enye anyị bara ezigbo uru. Ọtụtụ ndị anaghị ege ntị n’ozi ọma n’ihi na ha na-atụ ụjọ otú ndị enyi ha ma ọ bụ ndị ezinụlọ ha nwere ike isi lewe ha anya. Ndị Chineke hà nwere ike ịchọwa otuto n’aka mmadụ? Ka e were ya na a gwara nwa okorobịa ka ọ gaa kwusaa ozi ọma n’ebe ndị mmadụ ma ya, ma ha amaghị na ọ bụ Onyeàmà Jehova. Ụjọ ọ̀ ga-eme ka ọ ghara ịga? Ọ́ bụrụkwanụ na a na-akwa mmadụ emo maka na o kpebiri iwepụtakwu oge jeere Chineke ozi? Ọ̀ ga-ekwe ka ndị na-ejighị ozi Chineke kpọrọ ihe mee ka ọ gbanwee ihe o kpebiri ime? Ọ́ bụrụkwanụ na Onye Kraịst mere mmehie dị oké njọ? Ọ̀ ga-ezochi ihe ọjọọ ahụ o mere n’ihi na ọ chọghị ka a napụ ya ọrụ ọ na-arụ n’ọgbakọ ma ọ bụ ka ọ ghara imechu ndị ezinụlọ ya na ndị enyi ya ihu? Ọ bụrụ na onye mere ihe ọjọọ chọrọ ka ya na Jehova dị ná mma, ọ ‘ga-akpọ ndị okenye ọgbakọ,’ gwa ha ka ha nyere ya aka.—Gụọ Jems 5:14-16.

10. (a) Olee ihe nwere ike ime ma ọ bụrụ na ihe kacha anyị mkpa bụ ihe ndị ọzọ nwere ike iche banyere anyị? (b) Gịnị ka anyị ga-enweta ma ọ bụrụ na anyị dị umeala n’obi?

10 Nwanna nwere ike inye anyị ndụmọdụ n’agbanyeghị na anyị na-agbalịsi ike ịkpa àgwà ka ezigbo Ndị Kraịst. Ihe ọ chọpụtara nwere ike inyere anyị aka ma ọ bụrụ na anyị esiweghị ọnwụ n’ihi mpako ma ọ bụ ka a ghara ilewe anyị anya ọjọọ ma ọ bụ ka anyị gosi na ihe anyị mere dị mma. Ka e were ya na e nwere ọrụ e nyere gị na nwanna rụọ. Ihe ga-adị gị mkpa ọ̀ bụ onye a ga-eto ma ị tachaa ahụhụ chepụta otú a ga-esi rụọ ọrụ ahụ? Mgbe ọzọ mmadụ dụrụ gị ọdụ ma ọ bụkwanụ ya bụrụ na e nyere gị na nwanna ọzọ ọrụ n’ọgbakọ, cheta na ọ bụ “onye dị umeala na mmụọ ya ga-enweta otuto.”—Ilu 29:23.

11. Gịnị ka anyị kwesịrị iche n’obi anyị mgbe ndị ọzọ jara anyị mma? Ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

11 Ndị nlekọta na ndị ‘na-agbalị ka ha ruo eru ịbụ ndị nlekọta’ kwesịkwara ịkpachara anya ka ha ghara ịna-achọ otuto mmadụ. (1 Tim. 3:1; 1 Tesa. 2:6) Gịnị ka nwanna kwesịrị ime ma ọ bụrụ na a jaa ya mma maka ezigbo ọrụ ọ rụrụ? Anyị ma na ọ gaghị ewuru onwe ya ihe a ga-eji na-echeta ya otú ahụ Eze Sọl mere. (1 Sam. 15:12) Ma, onye ahụ kwesịrị icheta na ọ bụ Jehova nyeere ya aka ime ihe ndị ahụ o mere. O kwesịkwara icheta na ihe ga-agara ya nke ọma n’ọdịnihu ma o nyere ya aka ma gọzie ya. (1 Pita 4:11) Ihe anyị na-eche n’obi anyị mgbe ndị ọzọ jara anyị mma ga-egosi ụdị otuto anyị chọrọ n’eziokwu.—Ilu 27:21.

‘UNU NA-ACHỌ IME IHE NNA UNU CHỌRỌ’

12. Gịnị mere na ụfọdụ ndị Juu egeghị Jizọs ntị?

12 Ihe ọzọ nwere ike ime ka anyị ghara inweta otuto Chineke na-enye anyị bụ ihe na-agụ anyị agụụ. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe ọjọọ, o nwere ike ime ka anyị ghara ịnụ eziokwu. (Gụọ Jọn 8:43-47.) Jizọs gwara ụfọdụ ndị Juu na ihe mere na ha achọghị ige ya ntị bụ na ‘ha chọrọ ime ihe nna ha bụ́ Ekwensu chọrọ.’

13, 14. (a) Gịnị ka ndị ọkachamara kwuru banyere ụbụrụ mmadụ na ihe mmadụ na-ekwu? (b) Olee otú anyị si ahọrọ onye anyị ga-ege ntị?

13 Mgbe ụfọdụ, ihe anyị na-anụ bụ naanị ihe anyị chọrọ ịnụ. (2 Pita 3:5) Otú Jehova si kee ụbụrụ anyị na-eme ka anyị nwee ike ileghara mkpọtụ ụfọdụ anya. Chegodị echiche banyere ụdị mkpọtụ dị iche iche ị na-anụ ugbu a. O nwere ike ịbụ na ị naghị anụbu ọtụtụ n’ime ha ná nkeji ole na ole gara aga. N’agbanyeghị na ụbụrụ gị nwere ike ime ka ị nụ ha niile, o nyeere gị aka ime ka uche gị dịrị naanị n’otu ihe. Ma, ọ na-esiri ụbụrụ anyị ike ime otú ahụ mgbe anyị na-ege ihe ndị mmadụ  na-ekwu. Ndị ọkachamara achọpụtala na ọ bụ naanị otu onye ka anyị nwere ike ige ntị n’otu oge. Ọ pụtara na ọ bụrụ na mmadụ abụọ na-agwa gị okwu otu mgbe, ị ga-ekpebi onye ị ga-anụ nke ya. Onye ị ga-ege ntị bụ onye ị chọrọ ịnụ ihe ọ na-ekwu. Ndị Juu ahụ, bụ́ ndị chọrọ ime ihe nna ha bụ́ Ekwensu chọrọ, egeghị Jizọs ntị.

14 Baịbụl gosiri na e nwere ike ikwu na “amamihe” na “nzuzu” na-agbalị mgbe niile ime ka anyị gee ha ntị. (Ilu 9:1-5, 13-17) N’ihi ya, ọ bụ anyị ga-ekpebi nke anyị ga-ege ntị. Ọ̀ bụ amamihe ka ọ̀ bụ nzuzu? Ihe anyị chọrọ ime ga-ekpebi nke anyị ga-ege ntị. Atụrụ Jizọs na-ege ya ntị, na-esokwa ya. (Jọn 10:16, 27) Ha ‘dịnyeere eziokwu.’ (Jọn 18:37) “Ha amaghị olu ndị bịara abịa.” (Jọn 10:5) Ndị dị umeala n’obi otú ahụ ga-enweta otuto.—Ilu 3:13, 16; 8:1, 18.

IHE “NDỊ A PỤTAARA UNU OTUTO”

15. Olee otú mkpagbu Pọl si ‘pụtara ndị Efesọs otuto’?

15 Ọ bụrụ na anyị na-eme uche Jehova mgbe niile, anyị ga-enyere ndị ọzọ aka inweta otuto. Pọl degaara ọgbakọ dị n’Efesọs akwụkwọ, sị: “M na-arịọ unu ka unu ghara ịda mbà n’ihi mkpagbu ndị a m na-enwe maka unu, n’ihi na mkpagbu ndị a pụtaara unu otuto.” (Efe. 3:13) Gịnị mere Pọl ji kwuo na mkpagbu ya ‘pụtaara ndị Efesọs otuto’? Ọ bụ maka na otú Pọl si na-ejere ụmụnna ya ozi n’agbanyeghị ọnwụnwa ndị bịaara ya mere ka ụmụnna bi n’Efesọs mata na ife Chineke bụ ihe kacha mkpa ná ndụ Onye Kraịst. A sị na Pọl dara mbà mgbe ọnwụnwa ndị ahụ bịaara ya, ọ gaara eme ka ụmụnna ndị ahụ chee na ha na Jehova ịdị ná mma abaghị uru. Ha ga-echekwa na olileanya ha nwere na ozi ọma ha na-ekwusa abaghịkwa uru? Otú Pọl si tachie obi mere ka ụmụnna ghọta na ihe ọ bụla mmadụ hapụrụ iji bụrụ Onye Kraịst efughị ọhịa.

16. Olee ahụhụ a tara Pọl na Listra?

16 Chegodị uru ụmụnna ritere n’ihi na Pọl ji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma, tachiekwa obi ná nsogbu ndị bịaara ya. Ọrụ Ndịozi 14:19, 20 gwara anyị, sị: “Ndị Juu si Antiọk na Aịkoniọm bịa wee rụgide ìgwè mmadụ ahụ, ha wee tụọ Pọl nkume ma dọkpụpụ ya n’azụ obodo [Listra], na-eche na ọ nwụọla. Otú ọ dị, mgbe ndị ahụ na-eso ụzọ Jizọs gbara ya gburugburu, o biliri ma banye n’ime obodo. N’echi ya, ya na Banabas gawara Dabe.” Mgbe a tụchara Pọl nkume ma chee na ọ nwụọla, chegodị otú ọ ga-esi siere ya ike n’echi ya iji ụkwụ gaa otu narị kilomita.

17, 18. (a) Olee otú o nwere ike isi bụrụ na Timoti ma ahụhụ Pọl tara na Listra? (b) Otú Pọl si tachie obi, olee otú o si baara Timoti uru?

17 Timoti ò so ná “ndị na-eso ụzọ Jizọs” ndị gbataara Pọl ọsọ enyemaka? Akwụkwọ  Ọrụ Ndịozi ekwughị hoo haa na o so. Ma ọ ga-abụ na o so. Chegodị banyere ihe Pọl gwara Timoti n’akwụkwọ ozi nke abụọ o degaara ya. Ọ gwara Timoti, sị: “Ị gbasochiwo ozizi m anya, ya na ụzọ ndụ m, . . . ụdị ihe ndị mere m n’Antiọk [ya bụ, nchụpụ a chụpụrụ ya], n’Aịkoniọm [ya bụ, nkume a chọrọ ịtụ ya], na Listra [ya bụ, nkume a tụrụ ya], ụdị mkpagbu ndị m diri; ma Onyenwe anyị napụtara m na ha niile.”—2 Tim. 3:10, 11; Ọrụ 13:50; 14:5, 19.

18 Timoti ‘gbasochiri’ ihe ndị ahụ merenụ anya, marakwa otú Pọl si tachie obi. Timoti echefughị ihe ndị ahụ echefu. Mgbe Pọl gara Listra, ọ hụrụ na Timoti bụ Onye Kraịst e ji ama atụ, nakwa na ‘ụmụnna nọ na Listra na Aịkoniọm kọrọ akụkọ ọma banyere ya.’ (Ọrụ 16:1, 2) Ka oge na-aga, Timoti ruru eru ịrụ ọrụ n’ọgbakọ.—Fil. 2:19, 20; 1 Tim. 1:3.

19. Ọ bụrụ na anyị atachie obi, olee otú ọ ga-esi baara ndị ọzọ uru?

19 Ọ bụrụ na anyị atachie obi na-eme uche Chineke, o nwere ike inyere ndị na-eto eto aka ịmata na ijere Chineke ozi bara ezigbo uru. Ndị na-eto eto na-ele anyị anya ma na-amụta ihe n’otu anyị si agwa ndị mmadụ okwu n’ozi ọma. Ha na-amụtakwa ihe karịchaa n’ihe anyị na-eme mgbe ihe siiri anyị ike. Pọl ‘nọgidere na-atachi obi n’ihe niile’ ka ndị niile ji obi ha na-efe Chineke ‘wee nweta nzọpụta na ebube ebighị ebi.’—2 Tim. 2:10.

Ndị na-eto eto nwere ike ịmụta ihe n’otú Ndị Kraịst merela agadi si atachi obi

20. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-achọ otuto nke si n’aka Chineke?

20 Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ‘ịna-achọ otuto nke si n’aka onye ahụ naanị ya bụ Chineke’? (Jọn 5:44; 7:18) Ọ bụ ihe anyị kwesịrị ịgbalịsi ike na-eme. (Gụọ Ndị Rom 2:6, 7.) Jehova ga-enye “ndị na-achọ ebube” ndụ ebighị ebi. Ihe ọzọ bụ na ọ bụrụ na anyị ‘na-atachi obi n’ọrụ dị mma,’ ọ ga-eme ka ndị ọzọ jiri obi ha niile na-efe Chineke, nwetakwa ndụ ebighị ebi. N’ihi ya, ekwela ka ihe ọ bụla mee ka ị ghara inweta otuto nke Chineke na-enye anyị.