Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Jenụwarị 2013

Ekwela Ka Ihe Ọ Bụla Mee Ka Ị Ghara Ịnọ Jehova Nso

Ekwela Ka Ihe Ọ Bụla Mee Ka Ị Ghara Ịnọ Jehova Nso

“Họrọnụ taa onye unu ga-efe.”—JỌSH. 24:15.

1-3. (a) Gịnị mere anyị ji kwesị iṅomi Jọshụa n’otú o si kpebie ime ihe ziri ezi? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị icheta mgbe anyị na-ekpebi ihe anyị ga-eme?

ỊHỌRỌ ihe ndị anyị ga-eme dị ezigbo mkpa. Anyị nwere ike iji aka anyị kpebie otú anyị ga-esi na-ebi ndụ. E nwere ike iji ya tụnyere mgbe mmadụ na-aga n’ụzọ, hụ ebe ụzọ gbara abụọ. Olee nke ọ ga-eso? Ọ bụrụ na e nwere ebe o bu n’obi ịga, ọ ga-esoro nke ga-eduga ya ebe ọ na-aga kama itinye isi na nke ga-edufu ya edufu.

2 Baịbụl kwuru banyere ọtụtụ ndị ji aka ha kpebie ihe ha chọrọ ime. Dị ka ihe atụ, o nwere mgbe Ken kwesịrị ikpebi ihe ọ ga-eme mgbe iwe na-ewe ya. (Jen. 4:6, 7) O nwekwara mgbe Jọshụa kwesịrị ikpebi ma ọ̀ ga-efe Chineke ka ọ̀ ga-efe chi ụgha. (Jọsh. 24:15) Jọshụa chọrọ ịnọ Jehova nso; ọ bụ ya mere o ji kpebie ime ihe ga-enyere ya aka ime otú ahụ. Ma Ken achọghị ime otú ahụ. N’ihi ya, o kpebiri ime ihe ga-eme ka ọ ghara ịnọ Jehova nso.

3 Mgbe ụfọdụ, ọ ga-adị mkpa ka anyị kpebie ihe ga-eme ka anyị nọsie ike n’ụzọ ziri ezi. Ụdị ihe ahụ mee, cheta ihe i bu n’obi ime, ya bụ, ime ihe ga-ewetara Jehova otuto n’ihe niile ị na-eme ma zere ihe ọ bụla ga-eme ka ị ghara ịnọ Jehova nso. (Gụọ Ndị Hibru 3:12.) N’isiokwu a nakwa na nke na-eso ya, anyị ga-atụle ihe asaa anyị na-ekwesịghị ikwe ka ha mee ka anyị ghara ịnọ Jehova nso.

ỌRỤ EGO

4. Gịnị mere ịrụ ọrụ ji dị mkpa?

4 Ndị Kraịst kwesịrị ịna-arụ ọrụ iji na-egboro ha na ezinụlọ ha mkpa ha. Ihe Baịbụl kwuru gosiri na ọ bụrụ na mmadụ achọghị ịna-egboro ndị ezinụlọ ya mkpa ha, ọ jọkarịrị onye na-ekweghị ekwe ná njọ.  (2 Tesa. 3:10; 1 Tim. 5:8) O doro anya na ịrụ ọrụ ego dị ezigbo mkpa. Ma ọ bụrụ na ị kpachapụghị anya, ọrụ gị nwere ike ime ka ị ghara ịnọ Jehova nso. Olee otú o nwere ike isi mee ya?

5. Gịnị na gịnị ka anyị kwesịrị ichebara echiche tupu anyị ekweta ịrụ ọrụ a chọrọ inye anyị?

5 Ka e were ya na ị na-achọ ọrụ. Ọ bụrụ na i bi n’ebe ọrụ dị ụkọ, i nwere ike ịchọ ikweta ịrụ ọrụ ọ bụla e nyere gị. Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ọrụ ahụ megidere ihe Baịbụl kwuru? Ọ́ bụrụkwanụ na ọrụ ahụ ga-eme ka ị ghara ịna-enwe efe ma ọ bụ mee ka ị na-aga ebe dị iche iche, nke ga-eme ka ị ghara ịna-agachi ọmụmụ ihe anya ma ọ bụ ka gị na ndị ezinụlọ gị ghara ịna-anọ? Ì kwesịrị ikweta ịrụ ọrụ ahụ, kwuo n’obi gị na ịrụ ya dị mma karịa ịnọ nkịtị? Cheta na ihe i kpebiri ime nwere ike inyere gị aka ịnọ Jehova nso ma ọ bụ mee ka ị ghara ịnọ ya nso. (Hib. 2:1) Ma ị̀ na-achọ ọrụ ma ị̀ na-eche ihe ị ga-eme banyere ọrụ ị na-arụ, olee otú ị ga-esi kpebie ime ihe ziri ezi?

6, 7. (a) Olee ihe abụọ nwere ike ime ka mmadụ kweta ịrụ ọrụ e nyere ya? (b) Olee nke ga-eme ka ị nọrọ Jehova nso, n’ihi gịnị?

6 Dị ka anyị kwuru ná mmalite, cheta ihe i bu n’obi ime. Jụọ onwe gị, sị, ‘Gịnị ka m chọrọ ka ọrụ a meere m?’ Ọ bụrụ na ị ghọta na ọrụ gị kwesịrị inyere gị aka ịna-egboro gị na ezinụlọ gị mkpa unu ka unu na-ejere Jehova ozi, Jehova ga-agọzi mbọ ị na-agba. (Mat. 6:33) A chụọ gị n’ọrụ ma ọ bụ ihe siere gị ike, Jehova ma otú ọ ga-esi nyere gị aka. (Aịza. 59:1) Ọ “maara otú o si anapụta ndị na-asọpụrụ Chineke n’ọnwụnwa.”—2 Pita 2:9.

7 Ọ́ bụrụkwanụ na ihe mere i ji chọọ ịrụ ọrụ bụ ka ị ghọọ aka ji akụ̀? I nwere ike ịkpata ezigbo ego. Ma, i megodị otú ahụ, cheta na ọ bụrụ ihe ahụ ka i bu n’obi na-arụ ọrụ, o nwere ike ịkpatara gị ezigbo nsogbu. (Gụọ 1 Timoti 6:9, 10.) Ọ bụrụ na ego na ọrụ abụrụ ihe kacha gị mkpa, ọ ga-eme ka ị ghara ịnọ Jehova nso.

8, 9. Gịnị ka ndị nne na nna kwesịrị ichebara echiche banyere otú ha si ele ọrụ ha anya? Kọwaa.

8 Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, cheta na ụmụ gị ga-amụta otú i si ekpebi ihe ị ga-eme. Gịnị ka ha chere bụ́ ihe kacha gị mkpa? Ọ̀ bụ ọrụ gị, ka ọ̀ bụ adịm ná mma gị na Jehova? Ọ bụrụ na ha achọpụta na ihe kacha gị mkpa bụ ịbụ onye a ma ama na ịbụ aka ji akụ̀, hà nwere ike ịmụta àgwà ọjọọ ahụ n’aka gị? Ò nwere ike ime ka ha ghara ịna-akwanyere gị ùgwù? Otu nwa agbọghọ bụ́ Onye Kraịst kwuru, sị: “Kemgbe m maara ihe, ihe kacha papa m mkpa bụ ọrụ ya. Na mbụ, o yiri ka ihe mere o ji arụsi ọrụ ike ọ̀ bụ na ọ chọrọ ka ezinụlọ anyị nweta ihe kacha mma. Ọ chọrọ ịna-elekọta anyị nke ọma. Ma ihe agbanweela kemgbe afọ ole na ole. Ọ na-arụ ọrụ mgbe niile, ma ihe ọ na-azụtara anyị bụ ihe ndị dị oké ọnụ, ndị na-adịghị anyị mkpa. N’ihi ya, ihe e ji mara ezinụlọ anyị bụ na anyị nwere ego, ọ bụghị na anyị na-agba ndị ọzọ ume ijere Jehova ozi. Obi ga-adị m mma ma a sị na papa m na-agbalịsi ike ka ezinụlọ anyị nọrọ Jehova nso kama ịna-achụ ego ọnwụ ọnwụ.”

9 Ndị nne na nna, unu ewerela ọrụ ego ka ihe kacha mkpa, nke ga-eme ka unu ghara ịnọ Jehova nso. Ka omume unu mee ka ụmụ unu ghọta na unu kwetara na akụ̀ kachanụ mmadụ nwere ike ịkpata bụ adịm ná mma ya na Jehova, ọ bụghị ego ma ọ bụ ihe a na-ahụ anya.—Mat. 5:3.

10. Gịnị ka onye na-eto eto kwesịrị ichebara echiche mgbe ọ na-ekpebi ụdị ọrụ ọ ga-arụ?

10 Ọ bụrụ na ị ka na-eto eto ma na-eche ụdị ọrụ ị ga na-arụ ma i too, olee otú ị ga-esi mata ihe i kwesịrị ime? Dị ka anyị kwurula, i kwesịrị ịmata ihe ị chọrọ iji ndụ gị mee. Ọ bụrụ na e nwere ihe ị na-amụ ma ọ bụ ọrụ ị chọrọ ịrụ, ọrụ  ahụ ọ̀ ga-enyere gị aka ime ka ozi Jehova bụrụ ihe kacha gị mkpa, ka ọ̀ ga-eme ka ị ghara ịnọ Jehova nso? (2 Tim. 4:10) Ị̀ chọrọ iṅomi ndị ụwa, bụ́ ndị na-enwe obi ụtọ naanị mgbe ha nwere ego ma ọ bụ akụ̀ buru ibu? Ka ị̀ ga-ekpebi ịtụkwasị Jehova obi otú ahụ Devid mere? O dere, sị: “Ọ dị mgbe m bụ nwata, emewokwa m agadi, ma ahụbeghị m ka a hapụrụ onye ọ bụla bụ́ onye ezi omume kpamkpam, ahụbeghịkwa m ụmụ ya ka ha na-arịọ nri.” (Ọma 37:25) Cheta na e nwere ụzọ ga-eme ka ị ghara ịnọ Jehova nso, nweekwa ụzọ ga-eme ka i nweta ndụ kacha mma. (Gụọ Ilu 10:22; Malakaị 3:10.) Olee nke ị ga-ahọrọ? *

NTỤRỤNDỤ NA EGWUREGWU

11. Gịnị ka Baịbụl kwuru banyere ntụrụndụ na egwuregwu? Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’obi?

11 Baịbụl ekwughị na mmadụ ekwesịghị inwe obi ụtọ. O kwughịkwa na ntụrụndụ bụ igbu oge. Pọl degaara Timoti akwụkwọ, sị: “Ọzụzụ nke ahụ́ bara ntakịrị uru.” (1 Tim. 4:8) Baịbụl kwudịrị na e nwere “oge ịchị ọchị” na “oge ịwụli elu,” kwuokwa na mmadụ kwesịrị ịna-ezu ike nke ọma. (Ekli. 3:4; 4:6) Ma, ọ bụrụ na ị kpacharaghị anya, ntụrụndụ na egwuregwu nwere ike ime ka ị ghara ịnọ Jehova nso. Olee otú ụdị ihe ahụ nwere ike isi mee? E nwere ihe abụọ nwere ike ime ka ọ kpatara gị nsogbu. Nke mbụ bụ ụdị ihe i kpebiri iji na-atụrụ ndụ. Nke abụọ abụrụ awa ole ị na-eji eme ya.

Ntụrụndụ ga-abara anyị uru ma ọ bụrụ nke dị mma ma ghara ịna-erikpọ oge anyị

12. Olee ihe ndị i kwesịrị ichebara echiche banyere ụdị ihe ndị i ji atụrụ ndụ?

12 Ka anyị buru ụzọ leba anya n’ụdị ihe anyị kwesịrị iji na-atụrụ ndụ. Ka obi sie gị ike na ntụrụndụ na egwuregwu ndị dị mma juru eju. Ma, ọtụtụ ihe ndị mmadụ ji atụrụ ndụ n’ụwa taa na-akwado ihe Chineke kpọrọ asị, dị ka ime ihe ike, mgbaasị, na mmekọahụ rụrụ arụ. N’ihi ya, i kwesịrị iche echiche nke ọma banyere ihe ị na-eji atụrụ ndụ. Olee uru ọ na-abara gị? Ọ̀ na-eme ka ị na-achọ ime ihe ike, ịsọ mpi, ma ọ bụ ịhụ mba unu n’anya? (Ilu 3:31) Ọ̀ na-erikpọ ego gị? Ò nwere ike ime ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ? (Rom 14:21) Olee ụdị ndị ọ na-eme ka gị na ha na-akpa? (Ilu 13:20) Ọ̀ na-eme ka ime ihe ọjọọ na-agụ gị agụụ?—Jems 1:14, 15.

13, 14. Gịnị ka i kwesịrị ichebara echiche n’ihe gbasara awa ole i ji atụrụ ndụ?

 13 Ihe ọzọ ị ga-echebara echiche bụ awa ole ị na-eji atụrụ ndụ. Jụọ onwe gị, sị, ‘Àna m eji ọtụtụ awa atụrụ ndụ ma ghara inwecha efe ime ihe gbasara ofufe Chineke?’ Ọ bụrụ na ị na-eji oge karịrị akarị atụrụ ndụ, ị ga-achọpụta na oge ahụ i ji atụrụ ndụ agaghị na-atọ gị ụtọ otú o kwesịrị. N’eziokwu, ndị na-anaghị ekwe ka ntụrụndụ na-erikpọ oge ha na-achọpụta na ntụrụndụ na-atọkwu ha ụtọ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ha ma na ha eburula ụzọ mee “ihe ndị ka mkpa.” N’ihi ya, obi anaghị ama ha ikpe mgbe ha na-atụrụ ndụ.—Gụọ Ndị Filipaị 1:10, 11.

14 Ọ bụ eziokwu na iji ọtụtụ awa atụrụ ndụ nwere ike iyi ihe na-atọ ụtọ, o nwere ike ime ka ị ghara ịnọ Jehova nso. Otu nwanna nwaanyị dị afọ iri abụọ aha ya bụ Kim si n’ihe mere ya mata na ihe a e kwuru bụ eziokwu. O kwuru, sị: “N’oge mbụ, m na-aga oriri na nkwari mgbe niile. A ga-enwerịrị nke m ga-aga ná ngwụcha izu ọ bụla, ma na Fraịdee ma na Satọdee ma na Sọnde. Ma achọpụtala m ugbu a na e nwere ọtụtụ ihe ka mkpa m kwesịrị ịna-eme. Dị ka ihe atụ, ugbu a m bụ ọsụ ụzọ, m na-eteta ụra n’elekere isii nke ụtụtụ ka m nwee ike ije ozi ọma. N’ihi ya, o nweghị otú m ga-esi gaa oriri ma nọrọ ebe ahụ ruo elekere mbụ ma ọ bụ abụọ nke ụtụtụ. Ama m na ọ bụghị oriri na nkwari niile dị njọ, ma o nwere ike ime ka mmadụ chefuo ihe o kwesịrị ime. Dịkwa ka ihe ndị ọzọ, anyị ekwesịghị ikwe ka o mee ka anyị ghara ịna-enwe efe.”

15. Olee otú ndị nne na nna ga-esi nyere ụmụ ha aka ịhọrọ ntụrụndụ ga-eme ha obi ụtọ?

15 Ndị nne na nna kwesịrị ịna-egboro ndị ezinụlọ ha mkpa ha. Ha kwesịkwara ịna-enyere ha aka ka ha na Jehova dị ná mma, meekwa ka obi na-adị ha ụtọ ma na-eru ha ala. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, abụla ihu atọ ọchị. Echekwala na ụdị ntụrụndụ niile dị njọ. Ma, i kwesịrị ịkpachara anya ma zere ndị nke na-adịghị mma. (1 Kọr. 5:6) I chee echiche nke ọma, i nwere ike inweta ụdị ntụrụndụ gị na ndị ezinụlọ gị ga-eji na-eme onwe unu obi ụtọ. * I mee otú ahụ, gị na ụmụ gị ga-ahọrọ ụzọ nke ga-eme ka unu na Jehova dịkwuo ná mma.

EZINỤLỌ

16, 17. Olee nsogbu na-agbawa ọtụtụ ndị nne na nna obi, oleekwa otú anyị si mara na Jehova ma otú obi dị ha?

16 Ndị nne na nna na-ahụ ụmụ ha n’anya. Otú ahụkwa ka ụmụ na-ahụ ndị mụrụ ha n’anya. Ọ bụ ya mere Jehova ji kwuo na ya hụrụ ndị ya n’anya otú ahụ nne si ahụ nwa ya n’anya. (Aịza. 49:15) N’ihi ya, ọ na-ewute anyị nke ukwuu ma onye si n’ezinụlọ anyị kwụsị ife Jehova. Otu nwanna nwaanyị a chụrụ nwa ya nwaanyị n’ọgbakọ kwuru, sị: “Obi gbawara m. M nọ na-eche, sị, ‘Gịnị mere o ji hapụ Jehova?’ Obi nọ na-ama m ikpe, mụ ana-ata onwe m ụta.”

17 Ụdị ihe ahụ mee gị, ghọta na Jehova ma otú obi dị gị. O ‘wutere ya’ mgbe onye mbụ o kere n’ụwa nupụụrụ ya isi. O wutekwara ya mgbe ọtụtụ ndị biri tupu Iju Mmiri nupụkwara isi. (Jen. 6:5, 6) Ọ bụrụ na ụdị ihe ahụ emetụbeghị mmadụ, o nwere ike isiri ya ike ịghọta otú o si afụ ụfụ n’obi. Ma ọ gaghị adị mma ka anyị kwe ka ihe ọjọọ onye ezinụlọ anyị a chụrụ n’ọgbakọ mere mee ka anyị ghara ịnọ Jehova nso. Ọ bụrụ na obi agbawaa anyị n’ihi na onye ezinụlọ anyị hapụrụ Jehova, olee otú anyị ga-esi die ya?

18. Gịnị mere na ndị nne na nna ekwesịghị ịta onwe ha ụta ma ọ bụrụ na nwa ha ahapụ Jehova?

 18 Atala onwe gị ụta maka ihe merenụ. Jehova hapụrụ ndị mmadụ ka ha jiri aka ha na-ekpebi ihe ha ga-eme. Onye ezinụlọ anyị ọ bụla nke raara onwe ya nye Jehova, e meekwa ya baptizim, “ga-ebu ibu nke ya,” ya bụ, ikpebi ma ọ̀ ga-efe Jehova. (Gal. 6:5) Mee elu mee ala, ọ bụ onye ahụ mere ihe ọjọọ ka Jehova ga-ajụ ajụjụ maka ihe o kpebiri ime, ọ bụghị gị. (Ezik. 18:20) Atakwala ndị ọzọ ụta. Kwanyere ndokwa Jehova mere maka ịdọ ndị ya aka ná ntị ùgwù. Guzogide Ekwensu, ọ bụghị ndị okenye, bụ́ ndị na-agbalị ichebe ọgbakọ.—1 Pita 5:8, 9.

Ọ bụghị ihe ọjọọ ma anyị nwee olileanya na onye anyị hụrụ n’anya ga-emecha laghachikwute Jehova

19, 20. (a) Gịnị ka ndị nne na nna a chụrụ ụmụ ha n’ọgbakọ ga-eme ka ha nwee ike idi mwute ha na-enwe? (b) Olee olileanya ndị nne na nna dị otú ahụ kwesịrị inwe?

19 Ma, ọ bụrụ na i kpebie iwesa Jehova iwe, ọ ga-eme ka ị ghara ịnọ ya nso. N’eziokwu, ihe dị mkpa bụ ka onye ahụ ị hụrụ n’anya mata na i kpebisiri ike ịhụ Jehova n’anya karịa onye ọ bụla ọzọ, ma ndị ezinụlọ unu. N’ihi ya, otú ị ga-esi die nsogbu ahụ bụ ịgbalịsi ike ka gị na Jehova na-adị ná mma. Ahapụla ụmụnna gị ma kpawa iche. (Ilu 18:1) Kpee ekpere gwa Jehova otú ọ dị gị n’obi. (Ọma 62:7, 8) Achọla ihe ị ga-akụdo aka na-ezigara onye ezinụlọ unu a chụrụ n’ọgbakọ ozi n’ekwentị ma ọ bụ ozi iimel. (1 Kọr. 5:11) Na-ejesi ozi Jehova ike. (1 Kọr. 15:58) Nwanna nwaanyị ahụ anyị kwuru okwu ya ná mmalite kwuru, sị, “Ama m na m kwesịrị ịna-arụsi ọrụ ike n’ozi Jehova ma mee ka okwukwe m sie ike ka m nwee ike inyere nwa m nwaanyị aka mgbe ọ ga-alaghachikwute Jehova.”

20 Baịbụl kwuru na ịhụnanya “na-enwe olileanya ihe niile.” (1 Kọr. 13:4, 7) Ọ dịghị njọ inwe olileanya na onye ahụ ga-alaghachikwute Jehova. Kwa afọ, ọtụtụ ndị mere ihe ọjọọ na-echegharị, a na-abata ha n’ọgbakọ. Ha chegharịa, Jehova anaghị eburu ha iwe n’obi. Kama, ọ ‘dị njikere ịgbaghara mmehie.’—Ọma 86:5.

KPEBIE IME IHE ZIRI EZI

21, 22. Gịnị ka i kpebiri ịna-eme?

21 Jehova kere ndị mmadụ ma hapụ ha ka ha jiri aka ha na-ekpebi ihe ha ga-eme. (Gụọ Diuterọnọmi 30:19, 20.) Ma ọ pụtara na anyị kwesịrị ịna-ekpebi ime ihe ziri ezi. Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘M̀ na-ekpebi ime ihe ziri ezi? Ọrụ ego, ntụrụndụ na egwuregwu, ma ọ bụ ezinụlọ ò meela ka m ghara ịnọ Jehova nso?’

22 O nweghị mgbe Jehova ga-akwụsị ịhụ ndị ya n’anya. Naanị ihe nwere ike ime ka anyị ghara ịnọ Jehova nso bụ ma ọ bụrụ na anyị ekpebie ịna-eme ihe ọjọọ. (Rom 8:38, 39) Ma, anyị ekwesịghị ime otú ahụ! Kpebisie ike na ị gaghị ekwe ka ihe ọ bụla mee ka ị ghara ịnọ Jehova nso. Isiokwu na-esonụ ga-atụle ihe anọ ndị ọzọ anyị na-ekwesịghị ikwe ka ha mee ka anyị ghara ịnọ Jehova nso.

^ para. 10 Ị chọọ ịgụkwu banyere ikpebi ọrụ ị ga-arụ, gụọ isi nke 38 n’akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2.

^ para. 15 Ị chọọ ịhụ aro ndị a tụrụ banyere ịhọrọ ntụrụndụ dị mma, gụọ Ụlọ Nche Ọktoba 15, 2011, peeji nke 8-12.