Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Nke 2 n'Afọ 2016

Ònye Tinyere Isiakwụkwọ na Amaokwu Ndị Dị́ na Baịbụl?

Ònye Tinyere Isiakwụkwọ na Amaokwu Ndị Dị́ na Baịbụl?

WEREGODI ya na ị bụ Onye Kraịst n’oge ndịozi Jizọs, ya abụrụkwa na ọgbakọ unu ka natachara akwụkwọ ozi Pọl onyeozi detaara unu. Ka a na-agụ ya, gị achọpụta na Pọl na-ekwukarị ihe dị́ ‘n’ihe odide ndị ahụ dị nsọ,’ ya bụ, ihe ndị e dere n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. (2 Timoti 3:15) I nwere ike ịsị n’obi gị, ‘M ga-achọ ịhụ ebe e dere ihe ndị ahụ n’Akwụkwọ Nsọ Hibru.’ Ma, ọ ga-esiri gị ike ịchọta ha. Maka gịnị?

O NWEGHỊ ISIAKWỤKWỌ NA AMAOKWU

Legodị otú mpịakọta akwụkwọ e ji dee “ihe odide ndị ahụ dị nsọ,” dị n’oge Pọl. Nke a e sere na peeji a bụ nke akwụkwọ Aịzaya e nwetara n’Osimiri Nnu. Gịnị ka ị na-ahụ? O nweghị ebe ị ga-ahụ rịkọm ma ọ bụ kpọm ma ọ bụkwanụ isi na amaokwu Baịbụl otú e nwere ha na Baịbụl ndị anyị na-agụ taa.

Ndị dere Baịbụl etinyeghị isi na amaokwu na ya mgbe ha na-ede ya. Naanị ihe ha mere bụ ide ihe niile Chineke gwara ha dee, ka ndị ga-agụ ya wee gụọ ya otú ahụ ọ dị, ọ bụghị n’iberibe n’iberibe. Ọ́ bụghị otú ahụ ka i si agụ akwụkwọ ozi onye gị na ya dị n’ezigbo mma detaara gị? Ị na-esi n’isi gụrụ ya gbadaa, ọ bụghị ị gụtụ ebe a, ị mafee n’ebe ọzọ.

Ma, o nwere otu nsogbu Baịbụl ndị oge ochie ahụ na-enweghị isi na amaokwu kpatara. Ọ na-abụ Pọl chọọ ịkpọ ebe ihe ọ na-ekwu si, naanị ihe o nwere ike ikwu bụ “dị nnọọ ka e dere, sị” ma ọ bụ “dịkwa nnọọ ka Aịzaya kwuru.” (Ndị Rom 3:10; 9:29) Ọ ga-esikwara mmadụ ike ịchọta ebe ihe ahụ o kwuru si, ọ gwụla ma onye ahụ ọ̀ ma “ihe odide ndị ahụ dị nsọ” nke ọma.

Ihe ọzọ bụ na “ihe odide ndị ahụ dị nsọ” Chineke mere ka e dee dị ọtụtụ. Tupu oge ndịozi Jizọs agafee, Akwụkwọ Nsọ dum dịzi akwụkwọ iri isii na isii. Ọ bụ ya mere obi ji adị ọtụtụ ndị na-agụ Baịbụl ndị e nwere taa ụtọ na ha nwere isi na amaokwu ndị na-enyere ha aka ịchọta ihe ha na-achọ, dị ka ịchọta ebe Pọl si nweta ọtụtụ ihe ndị o kwuru n’akwụkwọ ozi ndị o dere.

I nweziri ike ịna-eche ugbu a, sị, ‘Ònyedị tinyere isi na amaokwu ndị dị na Baịbụl ndị anyị na-agụ taa?’

ÒNYE TINYERE ISIAKWỤKWỌ NDỊ DỊ́ NA BAỊBỤL?

Ọ bụ onye ụkọchukwu Bekee aha ya bụ Stephen Langton, onye mechara bụrụ Achịbishọp ndị Anglịkan, kerisịrị Baịbụl n’isi n’isi. O kerisịrị ya n’ihe dị ka n’agbata afọ 1204 na afọ 1205, mgbe ọ na-akụzi na Mahadum Paris dị́ na Frans.

Tupu oge Langton, e nweela ụzọ dị iche iche ọtụtụ ndị gụrụ oké akwụkwọ si kerisịa Baịbụl ná nkebi ná nkebi nakwa n’isi n’isi, ikekwe, iji mee ka ọ dịtụrụ onye na-achọ ihe na Baịbụl mfe nchọta. Ị manụ na ọ gaara akara ha mfe ịchọta ihe ha na-achọ n’akwụkwọ Aịzaya ma a gwa ha otu isiakwụkwọ ha ga-aga chọta ihe ahụ karịa ịgwa ha ka ha chọwa ya n’akwụkwọ Aịzaya dum nke dị́ isi iri isii na isii.

Ma, a ka nwekwara nsogbu dịnụ. Ndị ahụ gụrụ oké akwụkwọ kerisịrị Baịbụl n’ụzọ dị iche iche. Dị ka ihe atụ, e nwere ndị nke kerisịrị akwụkwọ Mak ihe fọrọ  obere ka ọ bụrụ isi iri ise, ọ bụghị isi iri na isii ọ dị taa. N’obodo Paris, n’oge Langton, ọtụtụ ụmụ akwụkwọ e nwere ebe ahụ si obodo dị iche iche bịa. Ha ji Baịbụl ndị e nwere n’obodo ha bịa. Ma, ọ na-abụ onye nkụzi ha kpọọ isiakwụkwọ Baịbụl, ụmụ akwụkwọ ahụ agaghị ahụ ya na nke ha. Gịnị kpatara ya? Ọ bụ n’ihi na otú e si kerisịa Baịbụl ha dum ji n’isi n’isi abụghị otu.

Ọ bụ ihe a mere Langton ji chepụta ụzọ ọzọ isi kerisịa Baịbụl n’isi n’isi. Otu akwụkwọ a na-akpọ The Book—A History of the Bible kwuru na otú ahụ o si kerisịa ya “masịrị ọtụtụ ndị na-agụ akwụkwọ na ndị edemede.” O kwukwara na ‘ọtụtụ ndị nabatara ya n’ebe niile na Yurop n’egbughị oge.’ Anyị si n’aka ya nweta isi nke a na isi nke ọzọ dị n’ọtụtụ Baịbụl taa.

ÒNYE TINYERE AMAOKWU NDỊ DỊ́ NA BAỊBỤL?

Mgbe ihe dị ka narị afọ atọ gachara, otu ọkachamara ná mba Frans aha ya bụ Robert Estienne, onye na-ebikwa akwụkwọ, mere ka ihe dịkwuo mfe. O bu n’obi ka ọtụtụ ndị mụwa Baịbụl. Ọ chọpụtara na ọ ga-aba ezigbote uru ma e nwee naanị otu ụzọ a ga na-esi ekerisị Baịbụl n’isi n’isi nakwa n’amaokwu n’amaokwu.

Ma, ọ bụghị nwoke a chepụtara ikerisị Baịbụl n’amaokwu n’amaokwu. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ narị afọ tupu a mụọ ya, ndị Juu bụ́ ọkà n’idepụta ihe ekerisịala Akwụkwọ Nsọ Hibru, nke ọtụtụ ndị na-akpọ Agba Ochie, n’amaokwu n’amaokwu, ọ bụghị n’isi n’isi. Ma otu nsogbu ahụ dị́ n’ikerisị Baịbụl n’isi n’isi dịkwa n’ikerisị ya n’amaokwu n’amaokwu n’ihi na e nweghị naanị otu ụzọ mmadụ niile nabatara.

Estienne kerisịrị Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, nke a na-akpọkwa Agba Ọhụrụ, n’amaokwu n’amaokwu ma jikọta ya na nke dị adị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. N’afọ 1553, o bipụtara Baịbụl mbụ zuru ezu (n’asụsụ French) nke nwere isi na amaokwu ndị yitewere nnọọ ndị nke dị na Baịbụl ndị anyị nwere taa. Ụfọdụ ndị katọrọ ya, na-asị na o gbujasịrị ihe dị na Baịbụl, ma si otú ahụ mee ka à ga-asị na ọ bụghị otu ihe ka ha niile na-ekwu. Ma ndị ọzọ na-ebi akwụkwọ egbughị oge ịnabata otú ahụ o si mee nke ya.

Ọ BAARA NDỊ NA-AMỤ BAỊBỤL EZIGBOTE URU

Ikerisị Baịbụl n’isi n’isi na n’amaokwu n’amaokwu magburu onwe ya. O mere ka ọ dị mfe mmadụ ịchọta ebe ọ chọrọ ịgụ na Baịbụl otú ahụ e si eji adres ụlọ achọta ebe ụlọ dị. N’eziokwu, ikerisị Baịbụl otú a esighị n’aka Chineke, otú e si kerisịa ya nwekwara ike ịgbagwoju mmadụ anya n’ebe ụfọdụ. Ma, ọ na-eme ka ọ dịrị anyị mfe ịma ebe e kwuru ihe e kwuru ma ọ bụ ịgwa mmadụ ebe anyị gụtara ihe tọrọ anyị ezigbo ụtọ, otú ahụ anyị nwere ike ịkanye ihe n’akwụkwọ ma anyị gụta ihe masịrị anyị.

Ọ bụ eziokwu na otú a e si kerisịa Baịbụl mara mma, ma anyị kwesịrị iburu n’obi mgbe niile na ọ dị ezigbo mkpa ịghọta ihe niile Chineke na-agwa anyị n’Okwu ya. Kama ịgụ naanị otu amaokwu ebe a na otu amaokwu ebe ọzọ, mee ka ọ mara gị ahụ́ ịgụ amaokwu ndị dị gburugburu ebe ọ bụla ị na-agụ. Ọ ga-eme ka ị matakwuo “ihe odide ndị ahụ dị nsọ, bụ́ ndị nwere ike ime ka ị mara ihe iji nweta nzọpụta.”—2 Timoti 3:15.

GỤKWUO GBASARA YA

OZI ỌMA SI N’AKA CHINEKE!

Baịbụl Ọ̀ Na-ekwu Eziokwu?

Ọ bụrụ na Baịbụl bụ okwu Chineke, ọ ga-adị iche n’akwụkwọ ọ bụla ọzọ e detụrụla.

AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA

Olee Ihe Ndị Ga-enyere Gị Aka Ịghọta Ihe Ị Na-agụ na Baịbụl?

Ma ị̀ gụrụ akwụkwọ ma ị́ gụghị, ị ga-aghọtali ihe Chineke na-agwa anyị n’Akwụkwọ Nsọ.